-
Obodo Ọma AhụMkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
-
-
9. Olee ụzọ Jọn si kọwaa ngwá ọrụ ndị e ji wuo obodo ahụ?
9 Jọn gara n’ihu ná nkọwa ya, sị: “Ihe e ji rụọ mgbidi ahụ bụ jasper: obodo ahụ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha, dị ka enyo na-enwu enwu. E werewo nkume nile ọ bụla dị oké ọnụ ahịa chọọ ntọala nke mgbidi obodo ahụ mma. Ntọala mbụ bụ jasper; nke abụọ bụ sapphire; nke atọ bụ chalcedony; nke anọ bụ emerald; nke ise bụ sardonyx; nke isii bụ sardius; nke asaa bụ chrysolite; nke asatọ bụ beryl; nke iteghete bụ topaz; nke iri bụ chrysoprase; nke iri na otu bụ jacinth; nke iri na abụọ bụ amethyst. Ọnụ ụzọ ámá iri na abụọ ahụ bụ pearl iri na abụọ; e ji otu pearl mee ọnụ ụzọ ámá ọ bụla n’ime ọnụ ụzọ ámá ahụ nile: ámá obodo ahụ bụ ọlaedo a nụchara anụcha, dị ka enyo na-ahụ ụzọ.”—Mkpughe 21:18-21.
10. Gịnị ka eziokwu ahụ bụ na e ji jasper, ọlaedo, na “nkume nile ọ bụla dị oké ọnụ ahịa” wuo obodo ahụ na-egosi?
10 Owuwu nke obodo ahụ mara oké mma n’ezie. Kama iji ngwá ọrụ nkịtị ndị a na-enweta n’elu ala dị ka ájá ụrọ ma ọ bụ nkume, anyị na-agụ banyere jasper, ọlaedo a nụchara anụcha, na “nkume nile ọ bụla dị oké ọnụ ahịa.” Lee nnọọ ka ihe ndị a si see onyinyo kwesịrị ekwesị nke ngwá ọrụ ndị si n’eluigwe bịa! Ọ dịghị ihe ọ bụla pụrụ ịdị ebube karịa ya. E ji ezi ọlaedo machie igbe ọgbụgba ndụ oge ochie ahụ, n’ime Bible, ihe ndị a na-anọchitekarị anya ihe ndị dị mma, baakwa ezi uru. (Ọpụpụ 25:11; Ilu 25:11; Aịsaịa 60:6, 17) Ma Jerusalem Ọhụrụ ahụ dum, na ọbụna ámá ya, bụ nke e jiri “ọlaedo a nụchara anụcha, dị ka enyo na-enwu enwu” rụọ, na-egosipụta ịma mma na ịdị oké ọnụ ahịa nke dị ịtụnanya.
-
-
Obodo Ọma AhụMkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
-
-
12. Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu ahụ bụ na (a) e ji nkume 12 dị oké ọnụ ahịa chọọ ntọala obodo ahụ mma? (b) ọnụ ụzọ ámá nke obodo ahụ bụ pearl?
12 Ọbụna ntọala nile nke obodo ahụ mara mma, ebe e ji nkume 12 dị oké ọnụ ahịa chọọ ha mma. Nke a na-echetara anyị onyeisi nchụàjà ndị Juu oge ochie, bụ́ onye na-eyi ephod n’ụbọchị ememe, nke e ji nkume 12 dị iche iche ndị dị oké ọnụ ahịa chọọ mma, bụ́ ndị yitụrụ ndị a kọwara n’ebe a. (Ọpụpụ 28:15-21) N’ezie nke a abụghị ihe ndaba efu! Kama nke ahụ, ọ na-emesi ike ọrụ onye nchụàjà nke Jerusalem Ọhụrụ ahụ na-arụ, nke Jisọs, bụ́ Onyeisi Nchụàjà dị ukwuu, bụ “oriọna” ya. (Mkpughe 20:6; 21:23; Ndị Hibru 8:1) Ọ bụkwa site na Jerusalem Ọhụrụ ahụ ka a na-ezitere ihe a kpọrọ mmadụ abamuru nile nke ije ozi Jisọs dị ka onyeisi nchụàjà. (Mkpughe 22:1, 2) Ọnụ ụzọ ámá 12 nke obodo ahụ, nke nke ọ bụla n’ime ha bụ pearl mara oké mma, na-echetara anyị ilu Jisọs nke ji Alaeze ahụ tụnyere pearl nke dị oké ọnụ ahịa. Ọ ga-abụ na ndị nile si n’ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ gabiga egosiwo ezi nghọta nke uru ihe ime mmụọ.—Matiu 13:45, 46; tụlee Job 28:12, 17, 18.
-