Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 4/1 p. 30
  • “Nwanyị ahụ, bụ́ Jezebel”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Nwanyị ahụ, bụ́ Jezebel”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 4/1 p. 30

“Nwanyị ahụ, bụ́ Jezebel”

“ENWERE m nke a imegide gị, na i kwere nwanyị ahụ, bụ́ Jezebel onye na-akpọ onwe ya onye amụma nwanyị; ọ na-ezikwa ndị ohu m ihe, na-eduhiekwa ha, ka ha kwaa iko, riekwa ihe a chụrụ n’àjà nye arụsị.” (Mkpughe 2:20) Otú ahụ ka Jisọs gwara ndị okenye bụ ndị Kraịst nọ na Taịataịra. Ọgbakọ ahụ nọ na-arụsi ọrụ ike, gosipụtakwa ịhụnanya, okwukwe, na inwe ntachi obi. Ma o kwerewo ka ike na-emerụ emerụ nke Jezebel dịgide n’ime ya. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ihe dị otú ahụ ọ pụkwara ime taa?—Mkpughe 2:19.

O yiri ka ọ dịghị onye ọ bụla dị adị n’ezie na Taịataịra nke aha ya bụ Jezebel. Jisọs jiri aha ahụ mee ihe iji chetara anyị Eze Nwanyị Jezebel ahụ dị n’akụkọ ihe mere eme, bụ́ nwunye Eze Ehab. Nwanyị ahụ kwesiri olu ike merụrụ ndị Chineke kpam kpam mgbe o webatara ofufe Beal rụrụ arụ n’Israel, na-eme mgbalị siri ike ikpocha-pụ ofufe dị ọcha.—1 Ndị Eze 16:31-33; 21:1-7.

Jezebel ahụ nke nọ na Taịataịra—ma ọ̀ bụ otu nwanyị ma ọ bụ ìgwè ndị inyom—gbakwara omume ịkwa iko na ikpere arụsị ume n’otu aka ahụ n’etiti ndị Chineke. Ụfọdụ ndị nọ n’ime ọgbakọ ahụ gere ya ntị, ebe Jisọs kwuru okwu banyere “ụmụ ya,” nke yiri ka hà bụ ndị na-eso ụzọ ya. (Mkpughe 2:22, 23) Ike o nwere yiri egwu ime ka ọgbakọ ahụ dị na Taịataịra rụọ arụ dị ka Israel rụrụ n’oge Ehab.

N’ihi gịnị ka Jezebel ahụ nke nọ na Taịataịra ji nwee ike dị ukwuu otú a? N’ile anya ná myirịta dị n’etiti ya na Jezebel nke oge ochie, ụfọdụ ndị echewo na ọ bụ nwunye nke onye okenye bụ isi na Taịataịra. Otú ọ dị, Bible ekwughị otú ahụ. O yikarịrị ka eziokwu ahụ nke bụ na ọ bụ onye a na-anụkarị olu ya, na ọ na-azọrọkwa na ya bụ onye amụma nwanyị mere ka ọ bụrụ onye nọ n’ọnọdụ pụtara ìhè n’ime ọgbakọ ahụ.

A tụwo aro na àgwà ọjọọ ndị ọ na-akwalite metụtara òtù azụmahịa dị iche iche. Dị ka Dr. W. M. Ramsay si kwuo, “a maara ihe banyere ọtụtụ òtù azụmahịa ndị dị na Taịataịra karịa ka a maara banyere obodo ọ bụla ọzọ dị n’Esia. Banyere òtù ndị a, akwukwọ bụ The Interpreter’s Dictionary of the Bible na-ekwu, sị: “Òtù nke ọ bụla n’ime ndị ahụ nwere chi na-elekọta ya, nnọkọ oriri ndị nke ya, ihe omume ọha na eze ndị nke ya, ndị pụrụ ịghọ oriri oké mkpọtụ ebe a na-eme omume rụrụ arụ. Ọ pụrụ ịbụ na ‘Jezebel’ ahụ rụrụ ụka na . . . ọ dịghị mkpa ịkatọ oriri oké mkpọtụ ndị a ebe ọ bụ na onye ọrụ ọ bụla, iji chọta ihe ọ ga-eri, aghaghị isonyere otu òtù.” Akwụkwọ bụ The Expositor’s Greek Testament kwenyere na nke a, na-atụ aro na ndị ahụ na-ejeso Jezebel “ji mmepeanya ha nke onye ọ bụla imere otú masịrị ya na-eme mpako.”

N’eziokwu, ozizi nke Jezebel na Taịataịra yiri “ozizi Belam” na Pagamọm. (Mkpughe 2:14) Ọgbakọ ahụ dị na Pagamọm anagidewo mkpagbu dị ukwuu, ma ụfọdụ ndị nọ n’ebe ahụ nọ na-eṅomi Belam nke oge ochie n’ịkwalite ịkwa iko na ikpere arụsị. A tụwo aro na n’obodo Pagamọm, mmetụta nke Belam gbara ndị mmadụ ume imebi okwukwe ha iji zere mkpagbu siri oké ike, ebe ọ bụ na n’obodo Taịataịra, Jezebel gbara ha ume imebi okwukwe ha maka ihe metụtara akụ na ụba. N’agbanyeghị ihe ọ bụ ya kpatara ya, ozizi abụọ ahụ bụcha ndapụ n’ezi ofufe nke na-eweta ọnwụ.

À pụrụ inwe mmetụta nke Jezebel—ma ọ bụ Belam—taa? Ee, a pụrụ inwe ya n’ezie. Ọtụtụ ndị ndú Krisendom na-eṅomi Jezebel n’ịgbachi nkịtị ka ndị nọ na-enwe mmekọahụ nwoke na nwoke na nke nwanyị na nwanyị, ndị na-akwa iko, ndị na-akwa iko, bụ ndị nwere di na na nwunye, nọgide n’òtù ha, isikwopụ afo ime, na ihe ndị yiri ndị ahụ, ndị Chineke katọrọ. Ọbụna n’ime ọgbakọ ndị Kraịst, ụfọdụ ndị akwalitewo echiche nke “ịgbasapụ aka” n’ihe banyere ezi ofufe, na-agba ndị Kraịst ume ka ha ghara ịdị na-emesibiga ihe ike ókè n’ihe banyere ịgbaso ụkpụrụ Bible dị iche iche, obụna na-akwalite omume rụrụ arụ.

Ndị nile chọrọ ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ kwesịrị izere echiche ndị dị otú a, ọbụna ma a sị na ọ bụ ndị mmadụ wepụtara ba—ndị ikom ma ọ bụ ndị inyom—ndị mara mma ile anya ma ọ bụ ndị ọdịdị mmadụ ha na-adọrọ mmasị. Echiche nke a bụ ihe na-egbu egbu taa dịkwa ka ọ dị n’ime narị afọ mbụ ahụ.—Mkpughe 2:22, 23.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya