Mmiri nke Ndụ
“ONYE na-anụ, ya sịkwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17) “Mmiri nke ndụ”—nke ahụ pụtara ndokwa nile Chineke na-eme maka nzọpụta anyị ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs Kraịst. E nwere ndokwa ndị a, ha bụkwa n’efu. Lee aha mmesapụ aka dị ebube nke a bụ n’akụkụ nke Chineke anyị! Ma, n’ihi gịnị ka e ji jiri mmiri mee ihe atụ ha?
Ọ dị mma, mmiri nkịtị na-eme ka o kwe mee ihe a kụrụ n’ala ito, nke ahụ na-emekwa ka mmadụ nwee ike ịdị ndụ. Ma e nweghị mmiri, ndụ ihe ọkụkụ, nakwa n’otu aka ahụ ndụ mmadụ, apụghị ịdị adị. Ọzọ, 65 pasent nke ihe dị gị n’ahụ bụ mmiri. Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike ọbụna na-atụ aro ịhụ na ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ na-adịgide site n’ịṅụ ihe dị ka 2.4 lita mmiri kwa ụbọchị. Usoro ọrụ nile na-ewere ọnọdụ n’ime ahụ gị—malite n’igweri nri ruo n’iwepụ ihe ndị ahụ na-achọghị—chọrọ mmiri. Nọọ otu izu n’aṅụghị mmiri, ị ga-anwụkwa.
N’otu aka ahụ, “mmiri nke ndụ” na-eme ka ndụ ime mmụọ kwe omume, na-azụkwa ya. Ọ bụrụ na anyị ajụ mmiri nke ndụ, anyị enweghị ọdịnihu ọ bụla na-adịgide adịgide. (Jọn 3:36) Ọ bụrụ na anyị anakwere ya, anyị pụrụ inweta ndụ ebighị ebi. Ka a sịkwa ihe mere nwanyị Sameria ahụ ji zaghachi n’ịnụ ọkụ n’obi mgbe Jisọs gwara ya: “Onye ọ bụla nke ga-aṅụ mmiri ahụ nke mụ onwe m ga-enye ya, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi; kama mmiri ahụ nke mụ onwe m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi mmiri na-asọpụta hie nne ruo ndụ ebighị ebi”! (Jọn 4:14) Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ nakwere ma ṅụọ mmiri nke ndụ ahụ n’efu.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]
Garo Nalbandian