-
Ijidesi Aha Jisọs IkeMkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
-
-
‘Manna E Zoro Ezo na Nkume Ọcha’
17. Ụgwọ ọrụ dị aṅaa na-echere ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị ‘nwere mmeri,’ gịnịkwa ka ọ dị mkpa ka ndị Kraịst nọ na Pagamọm merie?
17 Oké nkwụghachi ụgwọ na-echere ndị nile na-ege ntị na ndụmọdụ Jisọs nke e nyere site ná nduzi nke mmụọ nsọ Jehova. Gee ntị! “Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst. Onye na-emeri emeri, ya ka m ga-enye ụfọdụ n’ime manna ahụ nke e zobeworo, m ga-enyekwa ya nkume ọcha, n’elu nkume ahụ ka e dewokwara aha ọhụrụ, nke ọ na-adịghị onye ọ bụla matara ma ọ bụghị onye na-anata ya.” (Mkpughe 2:17) Otú a, a gbara ndị Kraịst ahụ nọ na Pagamọm ume ‘inwe mmeri’ dị ka a gbakwara ndị Kraịst nọ na Smụana. Ka ha wee nwee ihe ịga nke ọma, ndị ahụ nọ Pagamọm, bụ́ ebe ocheeze Setan dị, aghaghị ịjụ ikpere arụsị. Ha aghaghị imeri adịghị ọcha, ịrọ òtù, na ndapụ n’ezi ofufe nke e jikọtara ya na Belak, Belam, na ndị Nikọlaịtan. N’ime otú a, a ga-akpọ ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ òkù iri ụfọdụ n’ime “manna ahụ nke e zobeworo.” Gịnị ka nke a pụtara?
18, 19. (a) Gịnị bụ manna ahụ nke Jehova nyere ndị Israel? (b) Olee manna nke e zobeworo ezobe? (ch) Gịnị ka iri manna ahụ e zobeworo sere onyinyo ya?
18 N’oge Mosis, Jehova nyere manna iji zụọ ndị Israel n’oge njem ha n’ime ọzara. E zoghị manna nke ahụ ezo, n’ihi na n’ụtụtụ ọ bụla—e wezụga n’ụbọchị Sabat—ọ pụtara n’ụzọ ọrụ ebube, dị ka ụfụfụ ọcha nke kpuchiri ala. Ọ bụ onyinye sitere n’aka Chineke iji debe ndị Israel ndụ. Dị ka ihe ncheta, Jehova nyere Mosis iwu ka o tinye ụfọdụ n’ime “achịcha” nke a n’ime ite e ji ọlaedo mee nke dị n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ ruo “ọgbọ nile [nke Israel].”—Ọpụpụ 16:14, 15, 23, 26, 33; Ndị Hibru 9:3, 4.
19 Lee nnọọ ihe atụ kwesịrị ekwesị ọ bụ! E zobere manna nke a n’ime Ebe Kasị Nsọ nke ụlọ ikwuu ahụ, ebe ìhè ahụ nke ji ụzọ ọrụ ebube na-enwu n’elu Igbe ọgbụgba ndụ ahụ bụ ihe atụ nke ọnụnọ Jehova n’onwe ya. (Ọpụpụ 26:34) Ọ dịghị onye e kwere ka ọ banye n’ime ebe ahụ dị nsọ iri manna ahụ e zobeworo na ya. Otú ọ dị, Jisọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya, ndị meririnụ, ga-eri “manna ahụ nke e zobeworo.” Dị ka Kraịst mere tupu ha, ha na-abanye, ‘ọ bụghị n’ebe nsọ e ji aka mee, bụ ihe atụ yiri ebe nke bụ ebe nsọ n’ezie, kama ọ bụ n’eluigwe n’onwe ya.’ (Ndị Hibru 9:12, 24) Mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ, ha na-eyikwasị ereghị ure na anwụghị anwụ—bụ́ onyinye dị ebube nke Jehova nyere, nke e mere ihe atụ ya site n’inye ha “manna ahụ nke e zobeworo” nke na-adịghị emebi emebi. Lee nnọọ ka o si bụrụ oké ihe ùgwù nye ìgwè nta nke ndị ahụ na-enwe mmeri!—1 Ndị Kọrint 15:53-57.
20, 21. (a) Gịnị ka inye ndị Kraịst e tere mmanụ nkume ọcha sere onyinyo ya? (b) Ebe e nwere nanị 144,000 nkume ọcha, olileanya dị aṅaa ka oké ìgwè mmadụ ahụ nwere?
20 Ndị a na-anatakwa “nkume ọcha.” N’ụlọikpe ndị Rom, a na-eji nkume eme ihe n’ikpebi ikpe.b Nkume ọcha pụtara na a tọhapụwo onye ahụ, ebe nkume ojii pụtara na a mawo ya ikpe, nke na-abụkarị ikpe ọnwụ. Jisọs inye ndị Kraịst ahụ nọ na Pagamọm “nkume ọcha” ga-egosi na ọ gụrụ ha ná ndị na-emeghị ihe ọjọọ, ndị dịkwa ọcha. Ma okwu Jisọs pụrụ inwekwa ihe ọzọ ọ pụtara. N’oge ndị Rom, a na-ejikwa nkume eme ihe dị ka ihe na-enye mmadụ ikike ịbanye n’ebe a na-eme ihe omume dị mkpa. N’ihi ya, nkume ọcha ahụ pụrụ igosi ihe pụrụ nnọọ iche nye onye Kraịst ahụ e tere mmanụ nke na-enwe mmeri—ya ịbụ onye a nabatara n’ebe dị ùgwù n’eluigwe n’oge alụmdi na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ. Nanị 144,000 nkume ndị ahụ ka e nyere.—Mkpughe 14:1; 19:7-9.
21 Nke a ọ̀ pụtara na a ga-agbaba gị aka ma ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime oké ìgwè mmadụ ahụ nke ndị so na-efe ofufe? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ bụ ezie na ị gaghị anata nkume ọcha nke nnabata n’eluigwe, ọ bụrụ na i nwee ntachi obi, i nwere ike isi n’oké mkpagbu ahụ pụta ikere òkè n’ọrụ ahụ na-enye ọṅụ nke iweghachi Paradaịs n’elu ala. Ndị ga-eso gị kere òkè na nke a bụ ndị bilitere n’ọnwụ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge ndị Kraịst na ndị ahụ so n’atụrụ ọzọ ahụ ndị ọ pụrụ ịbụ na ọ dịbeghị oké anya ha nwụrụ. A ga-emesị gosi ndị ọzọ nile a gbapụtaworo ihu ọma site n’ịkpọlite ha n’ọnwụ baa ná ndụ n’elu ala bụ paradaịs.—Abụ Ọma 45:16; Jọn 10:16; Mkpughe 7:9, 14.
22, 23. Gịnị ka aha ahụ e dekwasịrị n’elu nkume ahụ e nyere ndị Kraịst e tere mmanụ pụtara, agbamume dịkwa aṅaa ka nke a kwesịrị inye?
22 Gịnị bụ aha ọhụrụ ahụ a na-edekwasị n’elu nkume ahụ? Aha bụ ihe e ji amara mmadụ na ihe e ji egosi ọdịiche dị n’etiti onye ahụ na ndị ọzọ. Ndị Kraịst ndị a e tere mmanụ na-anata nkume ahụ mgbe ha jezuworo ozi elu ala ha dị ka ndị nwere mmeri. Ya mere, o doro anya na aha ahụ a na-edekwasị n’elu nkume ahụ metụtara ihe ùgwù ha nke ịbụ ndị e jikọtara ha na Jisọs n’eluigwe—bụ́ ọnọdụ dị oké mma nke ije ozi dị ka eze, nke ọ bụ nanị ndị ahụ ketara Alaeze eluigwe ga-aghọta, marakwa ụtọ ya. Ya mere, ọ bụ aha, ma ọ bụ ọkwa ọrụ, “nke ọ na-adịghị onye ọ bụla matara ma ọ bụghị onye na-anata ya.”—Tụlee Mkpughe 3:12.
23 Lee nnọọ ihe mkpali ọ bụụrụ òtù Jọn ahụ ‘ịnụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst’ ma tinye ha n’ọrụ! Leekwa ka nke a si akpali ndị na-esonyere ha, bụ́ oké ìgwè mmadụ iji ikwesị ntụkwasị obi soro ha na-eje ozi mgbe ha na ha ka nwere ike ịnọkọ n’elu ala ebe a, sorokwa ha kere òkè n’ime ka a mara Alaeze Jehova!
-
-
Ijidesi Aha Jisọs IkeMkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
-
-
[Foto dị na peeji nke 45]
E zobere manna ụfọdụ n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ịbụ ndị e nyere manna ihe atụ e zobeworo pụtaara ndị ahụ e tere mmanụ nwere mmeri na ha na-anata anwụghị anwụ
[Foto dị na peeji nke 45]
Nkume ọcha ahụ bụ maka ndị ahụ a nabatara n’ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ
-