-
Aha Gị Ọ̀ Dị n’Akwụkwọ nke Ndụ?Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
-
-
3. (a) N’ihi gịnị ka “mmụọ ozi nke nzukọ Kraịst dị na Sadis” kwesịrị iji rịba ama n’ụzọ pụrụ iche na Jisọs nwere “kpakpando asaa ahụ”? (b) Ndụmọdụ siri ike dị aṅaa ka Jisọs nyere ọgbakọ ahụ dị na Sadis?
3 Jisọs chetakwaara “mmụọ ozi nke nzukọ Kraịst dị na Sadis” na ọ bụ Ya onwe ya bụ onye ahụ ji “kpakpando asaa ahụ.” O ji ndị okenye ọgbakọ ndị ahụ n’aka nri ya, na-enwe ikike iduzi ha n’ọrụ ọzụzụ atụrụ ha. Ha kwesịrị ịtụkwasị uche ha ‘n’ịmara ihu ìgwè atụrụ ahụ.’ (Ilu 27:23) N’ihi nke a, ọ ga-akara ha mma ige ntị nke ọma n’ihe ọzọ Jisọs kwuru: “Ghọọ onye na-eche nche, meekwa ka ihe fọdụrụ guzosie ike, bụ́ nke gaje ịnwụ anwụ: n’ihi na ọ dịghị ọrụ gị m hụworo nke zuworo ezu n’ihu Chineke m. Ya mere, na-echeta otú ị nataworo, ya na otú ị nụrụ; na-edebekwa ya, chegharịakwa. Ya mere, a sị na i cheghị nche, m ga-abịa dị ka onye ohi, ị gaghị amarakwa oge hour m ga-abịakwasị gị ma ọlị.”—Mkpughe 3:2, 3.
-
-
Aha Gị Ọ̀ Dị n’Akwụkwọ nke Ndụ?Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
-
-
5. (a) Gịnị meworo mmasị nke ndị Kraịst nọ na Sadis? (b) Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị Kraịst nọ na Sadis anakwereghị ndụmọdụ Jisọs?
5 Ka ọ dị mgbe ahụ, mmasị na ịhụnanya ha nwere n’eziokwu ahụ yiri ọkụ nke fọdụrụ ihe nta ka ọ bụrụ na ọ nyụwo. Nanị unyi ole na ole ka nọ na-acha ọkụ. Jisọs gbara ha ume ka ha fụnwuo ọkụ ahụ, mee ka ọ maliteghachi inwu enwu, chegharịa site ná mmehie nke nlefuru anya ha dubaworo ha na ya, wee ghọghachikwa ọgbakọ nke dị ndụ n’ime mmụọ. (Tụlee 2 Timoti 1:6, 7.) Ma ọ bụghị otú ahụ, mgbe Jisọs bịara na mberede—“dị ka onye ohi”—imezu ihe e kpere n’ikpe, ọgbakọ ahụ dị na Sadis agaghị adị njikere.—Matiu 24:43, 44.
Ịbịa “dị ka Onye Ohi”
6. Jisọs si aṅaa bịa “dị ka onye ohi” na 1918, ọnọdụ dịkwa aṅaa ka ọ hụrụ ndị na-asị na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya n’ime ya?
6 Ịdọ aka ná ntị Jisọs nke bụ na ya ga-abịa “dị ka onye ohi” dị irè ruo oge anyị a. O nwere mmetụta pụrụ iche n’ebe ndị Kraịst nọ, bụ́ ndị dịrị ndụ banye n’ime ụbọchị Onyenwe anyị. N’oge na-adịghị anya mgbe 1914 gasịrị, e nwere mmezu nke amụma Malakaị, nke sị: “Onyenwe unu ahụ unu onwe unu na-achọ ga-abịaru ụlọ ukwu ya na mberede; ọbụna onye ozi ọgbụgba ndụ ahụ, onye ihe ya na-atọ unu ụtọ, lee, ọ na-abịa, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” (Malakaị 3:1; Mkpughe 1:10) Dị ka “onye ozi ọgbụgba ndụ ahụ,” Jisọs bịara ime nnyocha na ikpe ndị ahụ sị na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya ikpe. (1 Pita 4:17) N’oge ahụ, na 1918, Krisendọm mikpuru n’ịwụfu ọbara n’Agha Ụwa Mbụ, bụrụkwa nke nwụrụ anwụ kpam kpam n’ụzọ ime mmụọ. Ọbụna ezi ndị Kraịst, ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme nkwusa tupu agha ahụ, banyere n’oge nke ịda mbà n’ime mmụọ. A tụbara ụfọdụ n’ime ndị okenye ha bụ isi n’ụlọ mkpọrọ, ọ fọdụkwara nke nta ka a kwụsị ọrụ nkwusa ahụ kpam kpam. Mgbe mmụọ Jehova metere ndị Kraịst ndị a n’ụra n’afọ so ya, ọ bụghị ha nile dị njikere. Ụfọdụ n’ime ha, dị ka ụmụ agbọghọ nzuzu dị n’ilu Jisọs, adịghị njikere n’ụzọ ime mmụọ maka ihe ùgwù ahụ nke ijere Jehova ozi. Otú ọ dị, ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na e nwere ọtụtụ ndị, dị ka ụmụ agbọghọ ahụ maara ihe, ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị Jisọs, nke bụ: “Na-echenụ nche, n’ihi na unu amataghị ụbọchị ma ọ bụ oge hour ahụ.”—Matiu 25:1-13.
7. N’ihi gịnị ka o ji dị ndị Kraịst taa mkpa ịnọ na nche?
7 Mkpa nke ndị Kraịst ịnọ na nche agwụsịghị ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị. N’oké amụma ya banyere “ihe ịrịba ama mgbe ọ bụla a gaje imezu ihe ndị a nile,” Jisọs dọsiri aka ná ntị ike, sị: “Ma ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge hour ahụ . . . Lezienụ anya, mụrụnụ anya, na-ekpekwanụ ekpere: n’ihi na unu amataghị mgbe oge ahụ bụ. Ma okwu m na-agwa unu ka m na-agwa mmadụ nile, Na-echenụ nche.” (Mak 13:4, 32, 33, 37) Ee, ruo kpọmkwem oge hour nke a, onye ọ bụla n’ime anyị, ma ànyị so ná ndị e tere mmanụ ma ọ bụ n’oké ìgwè mmadụ ahụ, aghaghị ịnọgide na-eche nche, na-alụkwa ọgụ megide ịdaba n’ụra ime mmụọ. Mgbe ụbọchị Jehova bịara na mberede “dị ka onye ohi na-abịa n’abalị,” ka anyị bụrụkwa ndị mụ anya, ka ikpe wee ghara ịma anyị.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 3; Luk 21:34-36; Mkpughe 7:9.
8. Olee ụzọ òtù Jọn nke oge a siworo kpalie ndị Chineke ịmụrụ anya n’ime mmụọ?
8 Òtù Jọn nke oge a n’onwe ya nọ na nche banyere mkpa ọ dị ịkpali ndị Chineke ịmụrụ anya n’ime mmụọ. Iji mezuo nke a, ha na-eme ndokwa maka mgbakọ ndị pụrụ iche gburugburu ụwa ọtụtụ ugbo n’afọ. N’otu afọ na-adịbeghị anya gara aga, ngụkọta nke ndị bịara 2,981 mgbakọ distriktị e nwere bụ 10,953,744, e mekwara 122,701 ndị ọhụrụ kwere ekwe baptism. Ruo ihe karịrị otu narị afọ, òtù Jọn ahụ ejiwo magazin Ụlọ Nche na-eme ihe n’ịkpọsa aha na nzube Jehova. Mgbe ha nwesịrị ajọ mkpagbu n’oge agha ụwa abụọ ahụ, Ụlọ Nche kpaliri Ndịàmà Jehova inweghachi ịnụ ọkụ n’obi site n’ibipụta isiokwu ndị dị ka “Ngọzi Na-adịrị Ndị Na-adịghị Atụ Egwu” (1919), “Ọkpụkpọ Òkù Ime Ihe” (1925), na “Inwe Mmeri Megide Mkpagbu” (1942).
9. (a) Gịnị ka ndị Kraịst nile kwesịrị ịnọ na-ajụ onwe ha? (b) Agbamume dị aṅaa ka Ụlọ Nche nyeworo?
9 Dị ka ọ dị na Sadis, otú ahụkwa ka ọ dị n’ọgbakọ nile taa, ọ dị mkpa ka ndị Kraịst nọgide na-enyocha onwe ha. Anyị nile kwesịrị ịnọgide na-ajụ onwe anyị, sị: Ànyị ‘na-arụzu ọrụ anyị nke ọma’ n’ihu Chineke? N’ekpeghị ndị ọzọ ikpe, ànyị na-ewulite mmụọ nke iji onwe onye chụọ àjà, na-agbalịkwa iji obi anyị nile jeere Chineke ozi n’onwe anyị? N’ikwekọ na nke a, magazin Ụlọ Nche enyewo agbamume site n’ịtụle isiokwu ndị dị ka “Nọgidenụ Na-anwapụta Ihe Unu Onwe Unu Bụ” na “Ịghara Ịdị Ndụ Ọzọ Maka Onwe Anyị.”a Ebe anyị nwere enyemaka Akwụkwọ Nsọ dị otú ahụ, ka anyị nyochaa onwe anyị nke ọma mgbe anyị na-agbalị iji obi umeala na ekpere na-eje ije n’ikwesị ntụkwasị obi n’ihu Jehova.—Abụ Ọma 26:1-3; 139:23, 24.
-