Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Zụrụ Ọlaedo nke A Nụchaworo n’Ọkụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 2 Taa, ị ga-ahụ mkpọmkpọ ebe nke Leọdisia n’ebe dị nso Denizli, ihe dị ka 90 kilomita n’ọwụwa anyanwụ nke ndịda Alasehir. N’ime narị afọ mbụ, Leọdisia bụ obodo nwere nnọọ ihe ịga nke ọma. Ebe ọ dị n’ebe ụzọ abụọ zukọtara, ọ bụ obodo bụ isi maka nchekwa ego na azụmahịa. Orire a na-ere otu ụdị ọgwụ anya a ma ama n’ebe ahụ mere ka ihe onwunwe ya bakwuo ụba, ọ bụkwa ebe a ma ama n’ihi uwe ndị dị oké ọnụ ahịa a na-eji ogho ojii na-emepụta n’ebe ahụ. E meriri nsogbu nke ụkọ mmiri nke na-enye obodo ahụ nsogbu site n’isi n’ọdọ mmiri ọkụ ndị dị n’ebe dị anya dọta mmiri bịa n’obodo ahụ. Otú a, mmiri ahụ na-adị nanị ṅaraṅara mgbe ọ na-erute n’obodo ahụ.

  • Zụrụ Ọlaedo nke A Nụchaworo n’Ọkụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 6. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si kọwaa ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ ahụ dị na Leọdisia? (b) Ezi ihe nlereanya dị aṅaa nke Jisọs ka ndị Kraịst ahụ nọ na Leọdisia na-agbasoghị?

      6 Ozi dị aṅaa ka Jisọs zijeere ndị Leọdisia? Ọ gwaghị ha okwu ịja mma ọ bụla. Ọ gwara ha hoo haa, sị: “Amatara m ọrụ gị nile, na ị jụghị oyi i kpoghịkwa ọkụ: ọ ga-adị m nnọọ mma ma ị na-ajụ oyi ma ọ bụ na ị na-ekpo ọkụ. Otú a, n’ihi na ị dị ṅaraṅara, i kpoghịkwa ọkụ ị jụghịkwa oyi, m ga-agbọpụ gị n’ọnụ m.” (Mkpughe 3:15, 16) Ị̀ ga-esi aṅaa meghachi omume n’ozi dị otú a site n’ọnụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst? Ọ̀ bụ na ị gaghị eteta n’ụra wee nyocha onwe gị? N’eziokwu, ọ dị mkpa ka ndị Leọdisia ahụ kpalighachi onwe ha, n’ihi na ha adawo n’ụra ime mmụọ, ma eleghị anya na-elefuru ọtụtụ ihe anya. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 6:1.) Jisọs, bụ́ onye ha kwesịrị iṅomiworị dị ka ndị Kraịst, nọ mgbe nile na-enwe oké ịnụ ọkụ n’obi n’ebe Jehova na ozi ya dị. (Jọn 2:17) Ọzọkwa, ndị dị umeala n’obi ahụwo na ọ na-abụ onye dị nwayọọ mgbe nile, na-enye ume ọhụrụ dị ka iko mmiri oyi n’ụbọchị oké okpomọkụ. (Matiu 11:28, 29) Ma ndị Kraịst nọ na Leọdisia adịghị ọkụ, ha ajụghịkwa oyi. Dị ka mmiri ndị ahụ na-erubata n’obodo ha, ha adịwo ṅaraṅara. Jisọs gaje ịjụ ha kpam kpam, ‘gbụpụ ha n’ọnụ ya’! Ka anyị onwe anyị, n’akụkụ nke anyị, gbalịsie ike, jiri ịnụ ọkụ n’obi mee ihe dị ka Jisọs mere, ịnọgide na-enye ndị ọzọ ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ.—Matiu 9:35-38.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya