Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 12/15 p. 32
  • “Ọgwụ Anya Ite n’Anya Gị”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọgwụ Anya Ite n’Anya Gị”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 12/15 p. 32

“Ọgwụ Anya Ite n’Anya Gị”

Ọ BỤ Jisọs Kraịst gwara ndị Kraịst narị afọ mbụ dị na Leọdisịa, Asia Minor ka ha zụrụ ọgwụ ahụ.

Jisọs sịrị: “Zụrụkwa ọgwụ anya ite n’anya gị, ka i wee na-ahụ ụzọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ọ bụghị ọrịa anya nkịtị chọrọ ọgwụgwọ kama ọ bụ ìsì ime mmụọ. Mmụọ nke obodo ahụ bụ́ Leọdisịa nke nwere ọganihu n’ụzọ ihe onwunwe enwewo mmetụta n’ahụ ndị Kraịst bi na ya, ha aghọwokwa ndị na-ejighịzi ezi mkpa ime mmụọ ha kpọrọ ihe.

N’ikwu banyere nke a dị ka ihe mere ha adịghị ahụkwa ụzọ nke ọma, Jisọs sịrị: “Ị na-asị, Abụ m ọgaranya, e mewo ka m bụrụ ọgaranya, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla na-akpa m; ị mataghịkwa na gị onwe gị bụ onye ahụ na-ahụju anya na onye kwesịrị ebere na onye dara ogbenye na onye kpuru ìsì na onye na-agba ọtọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ọ bụ ezie na ndị nọ n’ọgbakọ ahụ amaghị, “ọgwụ anya” na-agwọ agwọ bụ́ nke a pụrụ inweta nanị site n’ịṅa ntị n’ozizi na ịdọ aka ná ntị Jisọs Kraịst, dị ha mkpa. “Zụrụ n’aka m,” ka Jisọs kwuru.—Mkpughe 3:17, 18, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.

Dị ka ọ dị ndị nọ na Leọdisịa, ọ dị ezi ndị Kraịst taa mkpa ịnọ na nche megide ịbụ ndị ịhụ ihe onwunwe n’anya na oké nchụso ihe ụtọ nke ebe ha bi na-emetụta n’ụzọ gabigara ókè, ikekwe n’amaghị ama. E depụtara ọgwụ ga-eme ka a nọgide na-ahụ ụzọ nke ọma n’ụzọ ime mmụọ na ndụmọdụ bụ́: “Zụrụ n’aka [Jisọs] . . . ọgwụ ite n’anya gị, ka i wee na-ahụ ụzọ.”

Ihe kwesịrị ịrịba ama bụ eziokwu ahụ bụ́ na a ghaghị ịzụ “ọgwụ anya” a azụ. Ọ ga-efu ihe. A ghaghị iwepụta oge iji na-amụ ma na-atụgharị uche n’Okwu Chineke. Ọbụ abụ ahụ na-emesi anyị obi ike na Okwu a “na-enwu enwu, na-enye anya [ime mmụọ] ìhè.”—Abụ Ọma 19:8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya