-
Ònye Bụ Chineke?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
2. Olee ihe Baịbụl gwara anyị gbasara Jehova?
Baịbụl gwara anyị na ọ bụ Jehova bụ naanị ezi Chineke n’ime chi niile ndị mmadụ na-efe. Maka gịnị? E nwere ọtụtụ ihe mere o ji kwuo otú ahụ. Jehova bụ Ọkaakaa. Ọ bụ naanị ya bụ “Onye Kacha Elu n’ụwa niile.” (Gụọ Abụ Ọma 83:18.) Ọ bụ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” n’ihi na ọ ga-emeli ihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Ọ bụ ya “kere ihe niile,” ma eluigwe ma ụwa ma ihe niile dị ndụ dị n’ụwa. (Mkpughe 4:8, 11) Ọ bụ naanị Jehova bụ onye na-enweghị mgbe ọ malitere. Ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 90:2.
-
-
Olee Ihe Anyị Ga-eme Ka Chineke Nabata Ofufe Anyị?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
Anyị kwesịrị ịna-efe naanị Jehova n’ihi na ọ bụ ya kere anyị. (Mkpughe 4:11) Ihe ọ pụtara bụ na anyị ekwesịghị iji ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ foto na-efe Chineke. Kama, anyị kwesịrị ịhụ Chineke n’anya, na-efekwa naanị ya.—Gụọ Aịzaya 42:8.
Otú anyị si efe Jehova kwesịrị ‘ịdị nsọ, dịkwa ya mma.’ (Ndị Rom 12:1) Ọ pụtara na anyị ga na-edebe iwu ya. Dị ka ihe atụ, ndị hụrụ Jehova n’anya anaghị eji iwu o nyere gbasara alụmdi na nwunye egwu egwu, ha na-edebekwa ya. Ha anaghịkwa eme ihe ọ bụla ga-emerụ ha ahụ́, dị ka, ịkpọ ụtaba, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya ókè.a
-