Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 15 p. 82-89
  • “Ònye Kwesịrị Ịsaghe Akwụkwọ Ahụ?”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ònye Kwesịrị Ịsaghe Akwụkwọ Ahụ?”
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Kwesịrị Ekwesị
  • ‘Nwa Atụrụ ahụ nke E Gburu Egbu’
  • Abụ Otuto
  • Abụ Ọhụrụ
  • Ndị Òtù Abụ nke Eluigwe
  • Abụ Otuto nke Na-adawanye Ụda
  • Ịbụ Abụ Mmeri Ọhụrụ Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Ịdị Ebube nke Ocheeze Eluigwe Jehova
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Ozi Dị Ụtọ ma Na-elukwa Ilu
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Ụbọchị Ikpe nke Chineke—Ihe Ọṅụ nke Ga-esi na Ya Pụta!
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 15 p. 82-89

Isi nke 15

“Ònye Kwesịrị Ịsaghe Akwụkwọ Ahụ?”

1. Gịnị na-eme ugbu a n’ọhụụ Jọn?

Ọ DỊ EBUBE! Ọ DỊ EGWU! Otú ahụ ka ọ dị bụ́ ọhụụ nke ocheeze Jehova n’ọnọdụ ya n’etiti ọwá ọkụ dị iche iche, ndị cherub, 24 ndị okenye ahụ, na oké osimiri ahụ e ji enyo mee. Ma bịadị Jọn, gịnị ọzọ ka ị na-ahụ? Jọn lekwasịrị anya kpọmkwem n’etiti ọnọdụ eluigwe nke a, na-akọrọ anyị, sị: “M wee hụ akwụkwọ nke e dere ya rịị ihe n’ime na azụ, nke e jikwararịị akara asaa kasie ya ike, ka ọ dị n’aka nri Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ. M wee hụ mmụọ ozi dị ike, ka ọ na-ewere oké olu na-ekwusa, sị, Ònye kwesịrị ịsaghe akwụkwọ ahụ, na ịnyawapụ akara ya? Ọ dịghịkwa onye ọ bụla dị n’eluigwe, ma ọ bụ n’elu ụwa, ma ọ bụ n’okpuru ụwa, pụrụ ịsaghe akwụkwọ ahụ, ma ọ bụ ile ya anya. M wee kwaa ákwá nke ukwuu, n’ihi na a hụghị onye ọ bụla kwesịrị ịsaghe akwụkwọ ahụ, ma ọ bụ ile ya anya.”—Mkpughe 5:1-4.

2, 3. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị Jọn oké mkpa ka a chọta onye ga-emeghe akwụkwọ ahụ, gịnịkwa yiri ka ọ bụ olileanya e nwere maka nke ahụ? (b) Gịnị ka ndị Chineke e tere mmanụ jiworo oké ịnụ ọkụ n’obi chere n’oge anyị a?

2 Jehova n’onwe ya, bụ́ Eze Onyenwe ihe nile e kere eke, ji akwụkwọ mpịakọta ahụ n’aka ya. Ọ ghaghị ịbụ na o jupụtara n’ihe ọmụma dị mkpa, n’ihi na e dere ya ihe n’ihu nakwa n’azụ. A na-akpali echiche anyị ịmara ihe dị n’ime ya. Gịnị dị n’akwụkwọ mpịakọta ahụ? Anyị na-echeta òkù Jehova kpọrọ Jọn, sị: “Rịgota n’ebe a, m ga-egosikwa gị ihe nile nke na-aghaghị ịpụta mgbe ihe ndị a gasịrị.” (Mkpughe 4:1) Site n’oké olileanya, anyị na-elepụ anya ịmara ihe ihe ndị ahụ bụ. Ma lee, e mechisiri akwụkwọ mpịakọta ahụ ike, jiri akara asaa kachisie ya ike!

3 Mmụọ ozi ahụ dị ike ọ̀ ga-ahụ onye ruru eru ịsaghe akwụkwọ mpịakọta ahụ? Dị ka Kingdom Interlinear si sụgharịa ya, akwụkwọ ahụ dị “n’elu aka nri” nke Jehova. Nke a na-ezo aka na o ji ya n’aka ọ saghere asaghe. Ma o yiri ka ọ dịghị onye nọ n’eluigwe ma ọ bụ n’elu ụwa ruru eru ịnara ma meghee akwụkwọ mpịakọta ahụ. E nweghị ọbụna n’okpuru ala, n’etiti ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi ndị nwụworonụ, onye ọ bụla ruru eru maka oké ihe ùgwù nke a. Ka a sịkwa ihe mere nke a ji wute Jọn nke ukwuu! Ma eleghị anya ọ gajeghị ịmara “ihe nile nke na-aghaghị ịpụta mgbe ihe ndị a gasịrị.” N’oge anyị a kwa, ndị Chineke e tere mmanụ ejiwo oké ịnụ ọkụ n’obi chere ka Jehova nye ìhè ya na eziokwu ya n’akwụkwọ Mkpughe. Ọ ga-anọgide na-eme nke a n’oge a kara aka maka mmezu amụma ahụ, ka o wee duzie ndị ya n’ụzọ nke “nzọpụta.”—Abụ Ọma 43:3, 5.

Onye Kwesịrị Ekwesị

4. (a) Ònye ka a chọtara nke ruru eru imeghe akwụkwọ ahụ na akara ya nile? (b) N’ụgwọ ọrụ na ihe ùgwù dị aṅaa ka òtù Jọn ahụ na ndị na-esonyere ha na-ekere òkè ugbu a?

4 Ee, e nwere onye nwere ike ịsaghe akwụkwọ ahụ! Jọn kọrọ, sị: “Otu onye n’etiti ndị okenye ahụ wee sị m, Akwala ákwá: lee, Ọdụm ahụ nke si n’ebo Juda pụta, onye bụ mkpọrọgwụ nke Devid, o meriri, ịsaghe akwụkwọ ahụ na akara ya asaa.” (Mkpughe 5:5) Ya mere Jọn, hichapụ anya mmiri ndị ahụ! Ndị òtù Jọn na ndị ahụ ji ikwesị ntụkwasị obi na-eso ha taa enwewokwa ntachi obi gabiga ọtụtụ iri afọ nke ọnwụnwa ndị siri ike mgbe ha ji ndidi na-echere mmeghe anya. Lee ụgwọ ọrụ na-akasi obi anyị nwere ugbu a n’ịghọta ọhụụ ahụ nke ọma, leekwa ihe ùgwù ọ bụ ikere òkè ná mmezu ya site n’ịkpọsara ndị ọzọ ozi dị n’ime ya!

5. (a) Amụma dị aṅaa ka e buru banyere Juda, n’olee ebekwa ka ndị si n’usoro ọmụmụ Juda chịrị achị? (b) Ònye bụ Shaịlo?

5 Aa, “Ọdụm ahụ nke si n’ebo Juda pụta”! Jọn maara ihe banyere amụma ahụ Jekọb, bụ́ nna ochie nke agbụrụ ndị Juu, buru banyere nwa ya nke anọ, bụ́ Juda: “Nwa ọdụm ka Juda bụ; n’anụ a dọgburu, nwa m, ka i siworo rịgoo; O huru ala, ọ makpuru dị ka ọdụm, na dị ka nne ọdụm; ònye ga-eme ka o bilie? Mkpanaka eze agaghị esi n’ebe Juda nọ wezụga onwe ya, mkpanaka onye na-enye ụkpụrụ agaghị esikwa n’etiti ụkwụ ya abụọ wezụga onwe ya, ruo mgbe Shaịlo ga-abịa; ọ bụkwa ya ga-enwe ịṅa ntị ndị dị iche iche.” (Jenesis 49:9, 10) Usoro eze nke ndị Chineke sitere na Juda pụta. Malite na Devid, ndị eze nile chịrị achị na Jerusalem ruo mgbe ndị Babilọn bibiri obodo ahụ bụ ndị si n’usoro ọmụmụ Juda. Ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha bụ Shaịlo ahụ Jekọb buru n’amụma. Shaịlo pụtara “Onye O [Ruuru] Ịbụ nke Ya.” N’ụzọ amụma, aha nke a zoro aka na Jisọs, bụ́ onye Alaeze Devid dị n’aka ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.—Ezikiel 21:25-27; Luk 1:32, 33; Mkpughe 19:16.

6. N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si bụrụ “ome” nke Jesi nakwa “mkpọrọgwụ nke Devid”?

6 Jọn mere ngwa n’ịghọta aka ahụ e zoro na “mkpọrọgwụ nke Devid.” N’ụzọ amụma, a kpọrọ Mesaịa ahụ e kwere nkwa ya ‘ome nke si n’ógwè osisi Jesi [bụ́ nna Eze Devid] pụta, otu alaka’ na “mkpọrọgwụ Jesi, nke na-eguzo ịbụ ọkọlọtọ ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 11:1, 10) Jisọs bụ ome nke Jesi, ebe a mụnyere ya n’ahịrị ndị eze nke Devid, bụ́ nwa Jesi. Ọzọkwa, dị ka mkpọrọgwụ nke Jesi, ọ bụ Ya mere ka usoro ndị eze nke Devid bilitekwa ọzọ, na-enye ya ndụ na nkwado ruo mgbe ebighị ebi.—2 Samuel 7:16.

7. Gịnị mere ka Jisọs ruo eru ịnara akwụkwọ ahụ site n’aka Onye ahụ na-anọkwasị n’ocheeze ahụ?

7 N’ụzọ kasị pụta ìhè, Jisọs bụ onye ahụ, dị ka mmadụ zuru okè, nke jeere Jehova ozi ikwesị ntụkwasị obi nakwa n’okpuru ule ndị siri oké ike. O nyere azịza zuru ezu n’ịma aka Setan. (Ilu 27:11) Otú a, ọ pụrụ ikwu ihe ahụ o kwuru n’anyasị ahụ tupu ọnwụ ịchụàjà ya, sị, “Mụ onwe m emeriwo ụwa.” (Jọn 16:33) N’ihi nke a, Jehova ji ntụkwasị obi nye Jisọs ahụ a kpọliteworo n’ọnwụ “ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa.” Ọ bụ nanị ya, karịa ndị ohu Chineke nile, ruru eru ịnara akwụkwọ mpịakọta ahụ, na-enwe olileanya ime ka a mara ozi dị ebube nke dị n’ime ya.—Matiu 28:18.

8. (a) N’ihe banyere Alaeze ahụ, gịnị gosiri iru eru Jisọs? (b) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na otu n’ime 24 ndị okenye ahụ kpugheere Jọn onye ruru eru imeghe akwụkwọ ahụ?

8 N’ezie, o ziri ezi na Jisọs kwesịrị ịsaghe akwụkwọ ahụ. Kemgbe 1914, ọ nọkwasịwo n’ocheeze dị ka Eze nke Alaeze Mesaịa nke Chineke, akwụkwọ ahụ kpughekwara ọtụtụ ihe banyere Alaeze ahụ na ihe ọ ga-arụzu. Jisọs ji ikwesị ntụkwasị obi gbaara eziokwu Alaeze àmà mgbe ọ nọ n’elu ala ebe a. (Jọn 18:36, 37) Ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere maka ọbịbịa nke Alaeze ahụ. (Matiu 6:9, 10) Ọ malitere nkwusa nke ozi ọma banyere Alaeze ahụ ná mmalite nke oge ndị Kraịst, buokwa amụma banyere ngwụsị nke ọrụ nkwusa ahụ n’oge ikpeazụ. (Matiu 4:23; Mak 13:10) O kwesịkwara ekwesị n’otu aka ahụ na otu n’ime 24 ndị okenye ahụ kwesịrị ịkọrọ Jọn na Jisọs bụ onye gaje imeghe akara ndị ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị okenye ndị a na-anọdụ n’ocheeze, na-ekpukwa okpueze, ebe ha so Kraịst bụrụ ndị nketa n’Alaeze ya.—Ndị Rom 8:17; Mkpughe 4:4.

‘Nwa Atụrụ ahụ nke E Gburu Egbu’

9. Kama ịhụ ọdụm, gịnị ka Jọn hụrụ ka ọ na-eguzo “n’etiti ocheeze ahụ,” ò sikwa aṅaa kọwaa ya?

9 Jọn legharịrị anya ka ọ hụ “Ọdụm ahụ nke si n’ebo Juda pụta.” Ma lee nnọọ ihe dị egwu ọ hụrụ! Ihe ọ hụrụ bụ onyinyo dịwaga nnọọ iche: “M wee hụ nwa atụrụ ka ọ na-eguzo n’etiti ocheeze ahụ na ihe anọ ahụ nke dị ndụ, guzokwa n’etiti ndị okenye ahụ, dị ka à ga-asị na e gburu ya rịị, o nwekwara mpi asaa, na anya asaa, nke bụ mmụọ asaa ahụ nke Chineke, bụ́ nke e zigaworo ha n’ụwa nile.”—Mkpughe 5:6.

10. Ònye bụ “nwa atụrụ” ahụ Jọn hụrụ, n’ihi gịnịkwa ka ùtú aha ahụ ji kwesị ekwesị?

10 Kpọmkwem n’etiti ebe ahụ, n’akụkụ ocheeze ahụ, n’etiti ebe ahụ ihe anọ ahụ dị ndụ na 24 ndị okenye ahụ gbara gburugburu, ọ hụrụ otu nwa atụrụ! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jọn matara ngwa ngwa na atụrụ nke a bụ “Ọdụm ahụ nke si n’ebo Juda pụta” na “mkpọrọgwụ nke Devid.” Ọ maara na, n’ihe karịrị 60 afọ tupu mgbe ahụ, Jọn Onye Na-eme Baptism kọwara Jisọs nye ndị Juu na-ekiri ihe na-emenụ dị ka “Nwa Atụrụ Chineke, nke na-ebupụ mmehie nke ụwa!” (Jọn 1:29) N’ogologo oge nile ọ dịrị ndụ n’elu ala, Jisọs nọgidere n’enweghị ntụpọ site n’ụwa—dị nnọọ ka nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ ọ bụla—ka o wee nwee ike ijiri ndụ ya na-enweghị ịta ụta chụọ àjà n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ.—1 Ndị Kọrint 5:7; Ndị Hibru 7:26.

11. N’ihi gịnị ka ọ na-abụghị ihe mweda n’ala igosipụta Jisọs ahụ e meworo ka ọ dị ebube dị ka “nwa atụrụ . . . dị ka à ga-asị na e gburu ya rịị”?

11 Ọ̀ bụ na o yighị ihe na-eweda mmadụ n’ala ma ọ bụ ihe na-enwechaghị ùgwù igosipụta Jisọs ahụ e meworo ka ọ dị ebube dị ka “nwa atụrụ . . . dị ka à ga-asị na e gburu ya rịị”? Ọ dịghị ma ọlị! Eziokwu ahụ bụ́ na Jisọs nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ bụ mmeri dị ukwuu megide Setan nakwa oké mmeri nye Jehova bụ Chineke. Igosipụta Jisọs n’ụzọ dị otú a gosipụtara n’ụzọ pụtara ìhè mmeri o meriri ụwa nke Setan, bụrụkwa ihe ncheta nke ịhụnanya dị omimi Jehova na Jisọs nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. (Jọn 3:16; 15:13; tụlee Ndị Kọlọsi 2:15.) Otú a, e zoro aka n’ebe Jisọs nọ dị ka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ onye ruru eru n’ụzọ pụrụ iche ịsaghe akwụkwọ ahụ.—Jenesis 3:15.

12. Gịnị ka mpi asaa nke Nwa Atụrụ ahụ sere onyinyo ya?

12 Gịnị ọzọ na-atụkwasị ihe ná nghọta anyị nwere banyere “nwa atụrụ” nke a? O nwere mpi asaa. N’ime Bible, mpi na-abụkarị ihe atụ nke ike ma ọ bụ ike ọchịchị, asaa ga-egosikwa izu ezu. (Tụlee 1 Samuel 2:1, 10; Abụ Ọma 112:9; 148:14.) N’ihi nke a, mpi asaa nke Nwa Atụrụ ahụ nọchiri anya izu ezu nke ike Jehova jiworo ntụkwasị obi nye Jisọs. Ọ “kachasị ha nile elu, bụ́ ịbụ onye isi, na ịchịisi, na ike, na ịbụ onyenwe mmadụ, na aha ọ bụla a na-akpọ ya aha, ọ bụghị nanị n’oge a, kama ọ bụkwa n’oge nke gaje ịbịa.” (Ndị Efesọs 1:20-23; 1 Pita 3:22) N’ụzọ pụtara ìhè, Jisọs ejiriwo ike ya, bụ́ ike ịchịisi ya, mee ihe kemgbe 1914 mgbe Jehova dokwasịrị ya n’ocheeze dị ka Eze eluigwe.—Abụ Ọma 2:6.

13. (a) Gịnị ka anya asaa nke Nwa Atụrụ ahụ sere onyinyo ya? (b) Gịnị ka Nwa Atụrụ ahụ gara n’ihu ime?

13 Ọzọkwa, e nyezuru Jisọs mmụọ nsọ, dị ka e sere onyinyo ya site n’anya asaa nke Nwa Atụrụ ahụ, ndị “bụ mmụọ nsọ ahụ nke Chineke.” Jisọs bụ ụzọ ozuzu nke ike ịrụ ọrụ Jehova si na-erugara ndị ohu Ya nọ n’elu ala. (Taịtọs 3:6) Ihe àmà gosiri na ọ bụ site n’otu mmụọ ahụ ka ọ na-anọ n’eluigwe hụ ihe na-eme n’elu ala ebe a. Dị ka Nna ya, Jisọs nwere nghọta zuru okè. Ọ dịghị ihe ọ na-adịghị ahụta. (Tụlee Abụ Ọma 11:4; Zekaraịa 4:10.) O doro anya na Ọkpara nke a—onye ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nke meriri ụwa nke a; bụ́ Ọdụm ahụ nke sitere n’ebo Juda; mkpọrọgwụ nke Devid; onye nyere ndụ ya n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ; onye nwere ikike zuru ezu, ozuzu nke mmụọ nsọ, na nghọta zuru okè site n’aka Jehova bụ Chineke—ee, onye nke a pụrụ iche dị ka onye ruru eru ịnara akwụkwọ ahụ site n’aka Jehova. Ọ̀ lara azụ n’ịnara ọrụ nke a nke ije ozi ná nzukọ Jehova e buliri elu? Ee e! Kama nke ahụ, “o wee bịa, ọ narawokwa akwụkwọ ahụ n’aka nri Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ.” (Mkpughe 5:7) Lee nnọọ ezi ihe nlereanya nke ịdị njikere irube isi nke a bụ!

Abụ Otuto

14. (a) Olee otú ihe anọ ahụ dị ndụ na 24 ndị okenye ahụ si meghachi omume mgbe Jisọs naara akwụkwọ ahụ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ihe Jọn kwuru banyere 24 ndị okenye ahụ si kwadoo ndị ha bụ na ọnọdụ ha?

14 Olee otú ndị ọzọ ahụ nọ n’ihu ocheeze Jehova si meghachi omume? “Mgbe ọ natara akwụkwọ ahụ, ihe anọ ahụ nke dị ndụ na [iri ndị okenye abụọ na anọ] ahụ wee daa n’ala n’ihu Nwa Atụrụ ahụ, ha nile n’otu n’otu nwere ụbọ akwara, na ọkwa nke e ji ọlaedo mee nke jupụtara n’ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, nke bụ ekpere ndị nsọ.” (Mkpughe 5:8) Dị ka ihe anọ ahụ dị ndụ yiri ndị cherub ndị nọ n’ihu ocheeze Chineke, 24 ndị okenye ahụ na-akpọ isiala nye Jisọs dị ka ihe àmà nke nnakwere ha nakweere ikike ya. Ma ọ bụ nanị ndị okenye ndị a ji ụbọ akwara na ọkwa ndị jupụtara n’ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.a Ọ bụkwa nanị ha na-abụ abụ ọhụrụ ugbu a. (Mkpughe 5:9) N’ime nke a, ha yiri 144,000 ahụ nke “Israel nke Chineke” ahụ dị nsọ, ndị nwekwara ụbọ akwara, na-abụkwa abụ ọhụrụ. (Ndị Galetia 6:16; Ndị Kọlọsi 1:12; Mkpughe 7:3-8; 14:1-4) Ọzọkwa, e gosiri 24 ndị okenye ahụ dị ka ndị na-arụzu ọrụ ndị nchụàjà n’eluigwe, nke ndị nchụàjà n’Israel oge ochie sere onyinyo ha, bụ́ ndị na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nye Jehova n’ụlọ ikwuu ahụ—bụ́ ọrụ a kwụsịrị ịrụ n’elu ala mgbe Chineke wezụgara Iwu Mosis ahụ, na-akpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ nke Jisọs. (Ndị Kọlọsi 2:14) Nkwubi okwu dị aṅaa ka anyị na-eru na ya site n’ihe a nile? Na a na-ahụ ndị a e tere mmanụ, bụ́ ndị nwere mmeri n’ihe bụ kpọmkwem ọrụ ha gaje ịrụ dị ka “ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya bụrụ eze [otu puku afọ] ahụ.”—Mkpughe 20:6.

15. (a) N’Israel, ònye ka nanị ya nwere ihe ùgwù nke ịbanye n’ime Ebe Kasị Nsọ nke ụlọ ikwuu ahụ? (b) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ okwu metụtara ọnwụ na ndụ onyeisi nchụàjà ahụ isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ tupu ọ banye n’ime Ebe Kasị Nsọ ahụ?

15 N’Israel oge ochie, ọ bụ nanị onyeisi nchụàjà nwere ike ịbanye n’Ebe Kasị Nsọ ahụ, bụ́ ebe Jehova nọ n’ụzọ ihe atụ. Nye ya, ibu ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ bụ okwu metụtara ọnwụ na ndụ. Iwu Jehova kwuru, sị: “[Erọn] ga-ewerekwa ihe ịgụ ọkụ jupụtara n’icheku ọkụ site n’elu ebe ịchụaja, site n’ihu Jehova, na njuaka ya abụọ nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke e ji ụda ụtọ dị iche iche mee, bụ nke e supịara esupịa, ọ ga-ewebata ya n’ime ákwà mgbochi: ọ ga-etinyekwa ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ n’elu ọkụ n’ihu Jehova, ka anwụrụ ọkụ nke ihe nsure ọkụ ahụ nke na-esi ísì ụtọ wee kpuchie [ihe mkpuchi Igbe ahụ, NW] nke dị n’elu ihe àmà ahụ, ka o wee ghara ịnwụ.” (Levitikọs 16:12, 13) Ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume onyeisi nchụàjà ahụ ịbanye n’ime Ebe Kasị Nsọ ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ suree ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.

16. (a) N’okpuru usoro ihe nke ndị Kraịst, olee ndị na-abanye n’Ebe Kasị Nsọ nke ihe atụ ahụ? (b) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst e tere mmanụ na-aghaghị ‘isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ’?

16 N’usoro ihe nke ndị Kraịst, ọ bụghị nanị Onyeisi Nchụàjà ihe atụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, kamakwa nke ọ bụla n’ime 144,000 ndị nchụàjà ahụ nọ n’okpuru ya ga-emesị banye n’ime Ebe Kasị Nsọ nke ihe atụ ahụ, bụ́ ebe Jehova nọ n’eluigwe. (Ndị Hibru 10:19-23) Ịbanye n’Ebe Kasị Nsọ nke a agaghị ekwe ndị nchụàjà ndị a omume, dị ka 24 ndị okenye ndị ahụ nọchiri anya ha, ma ọ bụrụ na ha ‘esureghị ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ,’ ya bụ, ikpere Jehova ekpere, na-arịọkwa ya arịrịọ mgbe nile.—Ndị Hibru 5:7; Jud 20, 21; tụlee Abụ Ọma 141:2.

Abụ Ọhụrụ

17. (a) Abụ ọhụrụ dị aṅaa ka 24 ndị okenye ahụ na-abụ? (b) Olee otú a na-esi ejikarị okwu ahụ bụ “abụ ọhụrụ” eme ihe n’ime Bible?

17 A na-anụ abụ dị ụtọ ugbu a. A na-abụ ya nye Nwa Atụrụ ahụ site n’ọnụ ndị òtù ya bụ ndị nchụàjà, bụ́ 24 ndị okenye ndị ahụ: “Ha na-abụkwa abụ ọhụrụ, sị, I kwesịrị ịnata akwụkwọ ahụ, na ịsaghe akara ya: n’ihi na e gburu gị egbu, i werekwa ọbara gị gbatara Chineke mmadụ si n’ebo nile ọ bụla, na asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla, na mba nile ọ bụla, pụta.” (Mkpughe 5:9) Okwu ahụ bụ “abụ ọhụrụ” pụtara ọtụtụ ugbo n’ime Bible, ọ na-ezokarịkwa aka n’inye Jehova otuto n’ihi oké ọrụ nnapụta ọ rụrụ. (Abụ Ọma 96:1; 98:1; 144:9) Otú a, abụ ahụ dị ọhụrụ n’ihi na onye na-abụ ya pụrụ ịkpọsa ọrụ ndị ọzọ dị ebube Jehova rụrụ, kwupụtakwa otuto nye aha Ya dị ebube.

18. N’ihi ime gịnị ka 24 ndị okenye ndị ahụ ji jiri abụ ọhụrụ ha na-eto Jisọs?

18 Otú ọ dị, n’ebe a, ọ bụ n’ihu Jisọs kama ịbụ n’ihu Jehova ka 24 ndị okenye ahụ na-abụ abụ ọhụrụ. Ma ụkpụrụ ahụ bụ otu. Ha na-eto Jisọs maka ihe ọhụrụ ndị ya onwe ya, dị ka Ọkpara Chineke, mewooro ha. Site n’ọbara ya, ọ ghọrọ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke si otú a mee ka o kwe omume ịmụpụta mba ọhụrụ dị ka ihe onwunwe pụrụ iche nke Jehova. (Ndị Rom 2:28, 29; 1 Ndị Kọrint 11:25; Ndị Hibru 7:18-25) Ndị so ná mba ọhụrụ nke a nke ime mmụọ si n’ọtụtụ mba anụ ahụ dị iche iche bịa, ma Jisọs jikọrọ ha n’otu baa n’otu ọgbakọ dị ka otu mba.—Aịsaịa 26:2; 1 Pita 2:9, 10.

19. (a) Ngọzi dị aṅaa ka Israel anụ ahụ na-enwetaghị n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ha? (b) Ngọzi dị aṅaa ka mba ọhụrụ nke Jehova ga-enweta?

19 Mgbe Jehova mere ka ndị Israel ghọọ otu mba laarị azụ n’oge Mosis, ya na ha banyere n’ọgbụgba ndụ, o kwere nkwa na ọ bụrụ na ha ga-anọgide n’ikwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ahụ, ha ga-aghọ alaeze nke ndị nchụàjà n’ihu ya. (Ọpụpụ 19:5, 6) Ndị Israel ekwesịghị ntụkwasị obi, ọ dịghịkwa mgbe ha nwetara mmezu nke nkwa ahụ. N’aka nke ọzọ, mba ọhụrụ ahụ, nke e guzobere n’ihe ndabere nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke Jisọs bụ onye ogbugbo ya, anọgidewo n’ikwesị ntụkwasị obi. N’ihi nke a, ndị so n’ime ya ga-achị ụwa dị ka ndị eze, jeekwa ozi dị ka ndị nchụàjà, na-enyere ndị obi ha ziri ezi n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ aka ịbụ ndị e mere ka ha na Jehova dịghachi ná mma. (Ndị Kọlọsi 1:20) Ọ bụ kpọmkwem dị ka abụ ọhụrụ ahụ kwupụtara ya, sị: “I wee mee ha ka ha bụrụ alaeze na ndị nchụàjà nye Chineke anyị; ha bụkwa eze n’elu ụwa.” (Mkpughe 5:10) Lee nnọọ ọṅụ ndị okenye 24 ndị a nwere n’ịbụ abụ ọhụrụ nke a nke otuto nye Jisọs ahụ e meworo ka ọ dị ebube!

Ndị Òtù Abụ nke Eluigwe

20. Abụ otuto dị aṅaa nye Nwa Atụrụ ahụ ka a na-abụ ugbu a?

20 Olee otú ndị ọzọ n’ime nzukọ eluigwe nke Jehova dị ukwuu si zaghachi n’abụ ọhụrụ nke a? Ọ bụụrụ Jọn ihe oké mkpali ịhụ nkwekọrịta ha sitere n’ala ala obi: “M wee hụ, nụkwa olu ọtụtụ ndị mmụọ ozi ndị nọ ocheeze ahụ na ihe anọ ahụ nke dị ndụ na ndị okenye ahụ gburugburu; ọnụ ọgụgụ ha hiri oké nne nke ukwuu, nke a na-apụghị ịgụta ha; anụrụ m ka ha weere oké olu na-asị, O kwesịrị, bụ́ Nwa Atụrụ ahụ nke e gbuworo egbu, ịnata ike nile, na akụ, na amamihe, na ume, na nsọpụrụ, na otuto, na ngọzi.” (Mkpughe 5:11, 12) Lee nnọọ abụ otuto dị ebube nke a bụ!

21. Otuto nke a a na-enye Nwa Atụrụ ahụ ọ̀ na-ewepụ ihe n’ọbụbụeze ma ọ bụ ọnọdụ nke Jehova? Kọwaa.

21 Nke a ọ̀ pụtara na Jisọs anọchiwo ọnọdụ Jehova Chineke, na ihe nile e kere eke echigharịwokwa jee n’inye ya otuto kama inye Nna ya? Ọ dịghị ma ọlị! Kama nke ahụ, abụ otuto nke a kwekọrọ n’ihe Pọl onyeozi dere, sị: “Chineke welikwara [Jisọs] elu nke ukwuu, werekwa amara nye ya aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu; ka ọ ga-abụ n’aha Jisọs ka ikpere nile wee gbuo n’ala, nke ihe nile dị n’eluigwe na ihe nile dị n’elu ụwa na ihe nile dị n’okpuru ala, ka ire nile ọ bụla wee kwupụtakwa na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, ka e wee nye Chineke, bụ́ Nna, otuto.” (Ndị Filipaị 2:9-11) N’ebe a, e nyere Jisọs otuto n’ihi òkè o keere n’idozi oké ihe iseokwu ahụ nke chere ihe nile e kere eke ihu—ịkwado iru eru Jehova ịbụ eze. Lee nnọọ otuto nke a wetawooro Nna ya n’ezie!

Abụ Otuto nke Na-adawanye Ụda

22. N’abụ otuto dị aṅaa ka olu ndị sitere n’elu ala na-esonyekọ?

22 N’ọnọdụ ahụ nke Jọn kọwara, ndị nọ n’eluigwe na-abụku Jisọs abụ otuto iji gosipụta na ha matara ikwesị ntụkwasị obi ya na ike ịchị achị o nwere n’eluigwe. N’ime nke a, olu ndị sitere n’elu ala na-esonyere ha ka ndị a kwa na-ekere òkè n’ito ma Nna ahụ ma Ọkpara ahụ. Dị nnọọ ka ihe nwa nke bụ mmadụ mezuru pụrụ iwetara ndị mụrụ ya otuto, otú ahụ ka ụzọ ikwesị ntụkwasị obi nke Jisọs gbasoro bụ ihe a mazuru nke ọma n’etiti ihe nile e kere eke “ka e wee nye Chineke, bụ́ Nna, otuto.” N’ihi nke a, Jọn gara n’ihu ịkọ, sị: “M wee nụ ihe nile ọ bụla e kere eke nke dị n’eluigwe, na n’elu ụwa, na n’okpuru ụwa, na n’elu oké osimiri, ha na ihe nile dị ha n’ime, ka ha na-asị, Ọ bụ Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, ya na Nwa Atụrụ ahụ, ka ngọzi nile na nsọpụrụ nile na otuto nile na ike nile dịịrị ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Mkpughe 5:13.

23, 24. (a) Gịnị na-egosi mgbe a ga-amalite ịbụ abụ otuto ahụ n’eluigwe, nakwa mgbe ọ ga-amalite n’elu ala? (b) Olee otú ụda ya si na-adali elu ka ọtụtụ afọ na-agabiga?

23 Olee mgbe a bụrụ ọmarịcha abụ otuto nke a? O bidoro ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị. Mgbe a chụpụsịrị Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe, “ihe nile ọ bụla e kere eke nke dị n’eluigwe” pụrụ itinyekọta olu ha n’abụ otuto nke a. Dịkwa ka ihe ndekọ ahụ gosiri, ọ bụ kemgbe 1919 ka ìgwè mmadụ nọ n’elu ala jikọtaworo olu ha n’ito Jehova, na-amụba site na puku ole na ole ruo ihe karịrị nnọọ nde mmadụ isii ka ọ na-erule afọ 2005.b Mgbe e bibisịrị usoro ihe elu ala nke Setan, “ihe nile ọ bụla e kere eke . . . n’elu ụwa” ga na-abụkukwa Jehova na Ọkpara ya abụ otuto. N’oge Jehova kara aka, mbilite n’ọnwụ nke ọtụtụ ijeri ndị nwụrụ anwụ ga-amalite, mgbe ahụ, “ihe nile ọ bụla e kere eke . . . n’okpuru ụwa,” ya bụ ndị nọ ná ncheta nke Chineke ga-enwe ohere isonye n’abụ otuto ahụ a na-abụ n’eluigwe na n’elu ala.

24 Ka ọ dị ugbu a, “site ná nsọtụ ụwa; . . . n’oké osimiri, na . . . agwaetiti nile,” ọtụtụ nde ndị mmadụ na-esonyere nzukọ Jehova zuru ụwa ọnụ n’ịbụ abụ ọhụrụ. (Aịsaịa 42:10; Abụ Ọma 150:1-6) Abụ otuto nke a na-enye ọṅụ ga-eru ụda ya kasị elu n’ọgwụgwụ nke Puku Afọ ahụ, mgbe e meworo ka ihe a kpọrọ mmadụ ruo izu okè. A ga-ebibi agwọ ochie ahụ, onyeisi nduhie ahụ, bụ́ Setan n’onwe ya, ná mmezu nke ikpeazụ nke Jenesis 3:15, ná mmezu ikpeazụ bụkwa nke mmeri, ihe nile e kere eke dị ndụ, ma ndị mmụọ ma ndị mmadụ, ga-abụkọ abụ n’otu, sị: “Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, ya na Nwa Atụrụ ahụ, ka ngọzi nile na nsọpụrụ nile na otuto nile na ike nile dịịrị ruo mgbe ebighị ebi.” A gaghị enwe olu ọ bụla dapụrụ iche n’eluigwe na n’elu ụwa.

25. (a) Ịgụ ihe ndekọ Jọn banyere abụ otuto eluigwe na ala nke a na-akpali anyị ime gịnị? (b) Ihe nlereanya ọma dị aṅaa ka ihe anọ ahụ dị ndụ na 24 ndị okenye ahụ setịpụụrụ anyị mgbe ọhụụ ahụ na-abịaru ọgwụgwụ ya?

25 Lee nnọọ oge oké ọṅụ nke a ga-abụ! O doro anya na ihe Jọn kọwara n’ebe a na-eme ka obi tọọ anyị ụtọ nke ukwuu, kpaliekwa anyị isonyere ndị nọ n’eluigwe n’ịbụ abụ otuto sitere n’ala ala obi nye Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. Ọ̀ bụ na anyị ekpebisighị ike karị mgbe ọ bụla ọzọ ịnọgide na-arụ ọrụ ọma? Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị pụrụ ịtụ anya na, site n’enyemaka Jehova, anyị ga-anọ ebe ahụ n’otu n’otu ná mmezu obi ụtọ ahụ, na-etinyekọta olu anyị n’abụ otuto ahụ a na-abụ n’eluigwe na n’elu ụwa. O doro anya na ihe anọ ahụ dị ndụ yiri ndị cherub na ndị Kraịst e tere mmanụ si n’ọnwụ bilite kwekọrọ na nke a, n’ihi na ọhụụ ahụ ji okwu ndị a mechie: “Ihe anọ ahụ nke dị ndụ wee sị, Amen. Ndị okenye ahụ wee daa n’ala kpọọ isiala.”—Mkpughe 5:14.

26. Na gịnị ka anyị kwesịrị inwe okwukwe, gịnịkwa ka Nwa Atụrụ ahụ na-akwadebe ime?

26 Ka gị onwe gị, ezi onye na-agụ akwụkwọ a, nwee okwukwe n’àjà nke Nwa Atụrụ ahụ—‘onye ahụ kwesịrị’—ka a gọziekwa gị ná mgbalị i ji obi umeala na-eme ife Jehova na ijere ya ozi—bụ́ “Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ.” Ka òtù Jọn ahụ nyere gị aka taa mgbe ọ nọgidere na-enye ‘ókè nri [ime mmụọ] ahụ dị mkpa n’oge ya.’ (Luk 12:42) Ma lee! Nwa Atụrụ ahụ na-ejikere imeghe akara asaa ahụ. Ihe mkpughe dịgasị aṅaa ndị na-akpali akpali na-echere anyị ugbu a?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ikwu ya n’ụzọ metụtara ụtọ asụsụ, okwu ahụ bụ “ha nile n’otu n’otu nwere ụbọ akwara, na ọkwa nke e ji ọlaedo mee nke jupụtara n’ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ” pụrụ izo aka n’ebe ma ndị okenye ahụ ma ihe anọ ahụ dị ndụ dị. Otú ọ dị, akụkụ ndị ọzọ nke ihe odide a mere ka ọ pụta ìhè na okwu ahụ metụtara nanị 24 ndị okenye ahụ.

b Lee chaatị dị na peji nke 64.

[Foto dị na peeji nke 86]

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya