Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 5/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-eme?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Ụmụnna Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Kraịst Bụ́ Eze Abịa Ikpe Ndị Bụ́ Atụrụ na Ndị Bụ́ Ewu Ikpe
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 5/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

À ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ ma ọ bụrụ na ha anakwereghị ezi Iso Ụzọ Kraịst ugbu a ma nwụọ tupu mmalite nke mkpagbu ukwu ahụ?

Ọ dị mma ka anyị nile guzogide mkpali ọ bụla nke ime omume dị ka ndị ikpe, na-aghọta na mee elu mee ala, ikpe Jehova site n’aka Jisọs Kraịst bụ nke dị mkpa. (Jọn 5:22; Ọrụ 10:42; 2 Timoti 4:⁠1) Ma Akwụkwọ Nsọ na-enye ihe ọmụma ụfọdụ iji nye aka n’azịza nke ajụjụ a na-atụle ugbu a.

Nkwusa zuru ụwa ọnụ nke ozi ọma nke Alaeze Chineke bụ akụkụ dị mkpa nke ‘ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jisọs.’ Ihe ịrịba ama nke a apụtawo ìhè kemgbe mmalite nke narị afọ nke a. Ọrụ nkwusa ahụ na-akpata nkewa nke ndị nke mba nile ná mmezu nke ihe atụ Jisọs banyere “atụrụ” na “ụmụ ewu.” Mgbe a rụzuru ọrụ nkwusa na nkewa nke a, “mkpagbu ukwu” ahụ ga-eweta ajọ usoro ihe dị ugbu a n’isi njedebe.​—⁠Matiu 24:​3, 21, 22; 25:​31-46.

Jehova, ya na Ọkpara ya, ga-ekpebi ma onye ọ bụla nke jụrụ ozi Alaeze ahụ ma nwụọ tupu ntiwapụ nke mkpagbu ukwu ò so n’òtù ụmụ ewu. Jisọs sịrị na ụmụ ewu ‘ga-apụ jee ná mbipụ ebighị ebi.’ Ya mere, anyị pụrụ ikwubi na ndị Chineke kpebiri na ha bụ ụmụ ewu agaghị enweta mbilite n’ọnwụ. E kpere ha ikpe yiri nke ahụ e kpere ndị ‘ga-ahụ ọmụma ikpe ziri ezi nke mbibi ebighị ebi’ n’oge mkpagbu ukwu ahụ.​—⁠2 Ndị Tesalọnaịka 1:⁠9.

Ma gịnị banyere ndị ahụ ọ pụrụ iyi ka e kpughewo ha n’ụzọ zuru ezu nye ozi Alaeze ahụ nke na ha ga-enweworị ike ime nhọrọ e chabara echiche maka ma ọ bụ megide eziokwu ahụ tupu ha anwụọ ná “mgbe ikpeazụ” ndị a?​—⁠2 Timoti 3:⁠1.

Ihe àmà na-egosi na ọtụtụ ndị nwụrụ n’oge ọrụ nkwusa ahụ na-aga n’ihu tupu mkpagbu ukwu ahụ ga-enweta mbilite n’ọnwụ. E gosipụtara nke a site n’ihe anyị na-agụ ná Mkpughe 6:​7, 8 banyere mgbagharị nke ndị ịnyịnya ihe atụ ahụ. Ọtụtụ ndị anwụwo dị ka ndị agha, ụkọ nri, na ajọ ihe otiti gburu. Ebe ọ bụ “Hedis” kpọọrọ ndị a “Ọnwụ” gburu, a ga-akpọlite ha n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst, mgbe Hedis ga-enyeghachi ndị nile nwụrụ anwụ nọ n’ime ya. (Mkpughe 20:13) Ọtụtụ ndị a ga-akpọlite gaa ná ndụ pụrụ ịnụworị ozi Alaeze ahụ tupu ha anwụọ.

Lee ka anyị pụrụ isi nwee obi ekele na Jisọs ahapụghị ụmụ mmadụ ikpebi ndị dị ka atụrụ na ndị dị ka ụmụ ewu! Ụmụ mmadụ na-ezughị okè apụghị ịtụle nke ọma ohere ole mmadụ nweworo ịnụ na ịnakwere ozi ọma ahụ. Ànyị pụrụ ịmara ihe ọnọdụ obi ya bụ ma ọ bụ ma ọ̀ hụrụ ezi omume n’anya n’ezie? Ànyị pụrụ ịtụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ókè nzaghachi ya pụrụ isiworị bụrụ nke e metụtara site n’ezinụlọ ya, ọzụzụ nke okpukpe ya nyere ya, ma ọ bụ mmetụta ndị ọzọ? mO doro anya na anyị apụghị. Ma, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova Chineke na Jisọs Kraịst pụrụ ịtụle ihe ndị dị otú ahụ, mgbe ahụkwa ruo ná mkpebi ndị zuru okè, zie ezi, bụrụkwa ndị nke ezi omume.​—⁠Deuterọnọmi 32:​4; Aịsaịa 11:​1-5.

Otú a, e nweghị ihe ọ bụla mere anyị ga-eji na-ekwu ihe bụ uche anyị banyere onye nke a pụrụ ma ọ bụ nke a na-apụghị ịkpọlite n’ime ndị nwụworo n’oge na-adịbeghị anya. Nke a bụ ihe a na-enyebeghị anyị ikike ime. (Tụlee Luk 12:​13, 14.) Ọ ga-abụrụ anyị ihe amamihe karị ichere ihe ga-abụ mkpebi nke Ndị Ikpe ezi omume ahụ, bụ́ Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. Nke a ga-enyekwu anyị udo nke uche dị ka ndị ohu Jehova. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịtụkwasị uche karị n’ihe e kenyeworo anyị ime​—⁠‘gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-ezi ha ka ha debe nile Jisọs nyere n’iwu.’​—⁠Matiu 28:​19, 20.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]

Atụrụ Leicester, Meyers

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya