-
Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
-
-
Mmadụ ole ka a ga-akpọlite n’ọnwụ, ha agaa eluigwe?
Baịbụl kwuru na a ga-akpọlite otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ n’ọnwụ, ha agaa eluigwe. (Mkpughe 7:4) N’ọhụụ dị n’akwụkwọ Mkpughe 14:1-3, Jọn onyeozi hụrụ “Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo n’Ugwu Zayọn, ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.” N’ọhụụ a, “Nwa Atụrụ ahụ” nọchịrị anya Jizọs e si n’ọnwụ kpọlite. (Jọn 1:29; 1 Pita 1:19) “Ugwu Zayọn” nọchiri anya otú e si bulie Jizọs elu, ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-eso ya chịa n’eluigwe.—Abụ Ọma 2:6; Ndị Hibru 12:22.
Na Baịbụl, e nwere aha a kpọrọ ndị a ‘a kpọrọ, na ndị a họọrọ’ ka ha soro Jizọs chịa. A kpọrọ ha “ìgwè atụrụ nta.” (Mkpughe 17:14; Luk 12:32) Ihe a Baịbụl kpọrọ ha gosiri na ha ga-adị obere n’ọnụ ọgụgụ ma e jiri ha tụnyere ọnụ ọgụgụ ndị niile bụ́ atụrụ Jizọs.—Jọn 10:16.
-
-
Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
-
-
Ụgha: Ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Mkpughe abụghị ọnụ ọgụgụ nkịtị, o nwere ihe ọ nọchịrị anya ya.
Eziokwu: Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ọnụ ọgụgụ dị n’akwụkwọ Mkpughe nwere ihe ha nọchịrị anya ya, ma ụfọdụ ọnụ ọgụgụ e dere na ya bụ ọnụ ọgụgụ nkịtị. Dị ka ihe atụ, o kwuru banyere “aha iri na abụọ nke ndịozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 21:14) Lee ihe doro anya mere a ga-eji kwuo na e kwesịrị iwere otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ka ọnụ ọgụgụ nkịtị.
Mkpughe 7:4 kwuru banyere “ọnụ ọgụgụ nke ndị ahụ a kara akara [ma ọ bụ ndị ahụ a họọrọ ịga eluigwe], ya bụ, otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.” N’amaokwu ndị na-esonu, e kwuru okwu òtù ọzọ dị iche bụ́ “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ.” Ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ ga-enwetakwa nzọpụta si n’aka Chineke. (Mkpughe 7:9, 10) Ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ abụghị ọnụ ọgụgụ nkịtị, kama e ji ya akọwa otu òtù a na-amaghị ọnụ ọgụgụ ya, ọ pụtaranụ na o nweghizi ihe dị iche ya na “oké ìgwè mmadụ” ahụ.a
Ihe ọzọ bụ na mmadụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ bụ ndị ‘e si n’etiti ụmụ mmadụ zụta dị ka mkpụrụ mbụ.’ (Mkpughe 14:4) “Mkpụrụ mbụ” ahụ a kpọrọ ha gosiri na ha bụ mmadụ ole na ole a họọrọ. Nke a gosiri na ndị ga-eso Jizọs chịa dị ole na ole ma e jiri ha tụnyere imirikitimi ndị ha ga-achị n’ụwa.—Mkpughe 5:10.
a N’otu akwụkwọ kwuru gbasara Mkpughe isi 1 ruo 7 a na-akpọ An Exegetical Commentary, na peeji ya nke 474, otu ọkachamara aha ya bụ Robert L. Thomas, kwuru gbasara otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 7:4. Ọ sịrị: “Ọnụ ọgụgụ a bụ ọnụ ọgụgụ nkịtị e ji gosi ọdịiche dị n’etiti ya na ọnụ ọgụgụ ahụ onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ e kwuru okwu ya na Mkpughe 7:9. Ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ a abụghị ọnụ ọgụgụ nkịtị, ọ pụtara na e nweghịzi ọnụ ọgụgụ dị n’akwụkwọ Mkpughe a ga-ewere ka ọnụ ọgụgụ nkịtị.”
-