A Ga-enwe Mbilite n’Ọnwụ nke Ndị Ezi Omume
“Enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.”—ỌRỤ 24:15.
1. Ọnọdụ dị aṅaa cheworo mmadụ nile ihu kemgbe ọdịda nke Adam na Iv?
“IHE ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya, n’ihi na ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW], ebe gị onwe gị na-ala.” (Eklisiastis 9:10) Site n’okwu ole na ole ndị a a họrọ nke ọma, Eze Solomọn nwere amamihe na-akọwa ọnọdụ nke cheworo ọgbọ ọ bụla nke ihe a kpọrọ mmadụ ihu kemgbe nne na nna anyị mbụ, Adam na Iv, dabasịrị ná mmehie. N’agụpụghị onye ọ bụla, ọnwụ emesịwo lomie mmadụ nile—ọgaranya na ogbenye, eze na onye nkịtị, onye nwere okwukwe na onye na-enweghị okwukwe. N’ezie, ọnwụ ‘abụrụwo eze.’—Ndị Rom 5:17.
2. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ ijiworị nwee ndakpọ olileanya n’oge ọgwụgwụ nke a?
2 N’agbanyeghị ọganihu ndị kasị ọhụrụ e nweworo na sayensị ọgwụ na ahụ ike, ọnwụ ka nọgidere na-achị dị ka eze ọbụna taa. Ọ bụ ezie na nke a abụghị ihe ijuanya, ụfọdụ ndị nwere ike inwewo ndakpọ olileanya mgbe ha chere onye iro nke a nọworo ogologo oge ihu. N’ihi gịnị? Ọ dị mma, laa azụ n’afọ ndị 1920, Watch Tower Society kpọsara ozi ahụ bụ́ “Ọtụtụ nde ndị dị ndụ ugbu a agaghị anwụ ma ọlị.” Olè ndị ga-abụ ọtụtụ nde ndị a? “Atụrụ” ndị e kwuru okwu ha n’okwu Jisọs banyere ụmụ atụrụ na ụmụ ewu. (Matiu 25:31-46) E buru amụma na ndị a yiri atụrụ ga-apụta n’oge ọgwụgwụ, olileanya ha ga-abụkwa ndụ ebighị ebi n’elu ala bụ́ paradaịs. Ka oge na-aga, ndị Chineke nwetara nghọta ka mma nke ọnọdụ “atụrụ” ndị a ná nzube Jehova. A chọpụtara na a ga-ekewapụ ndị a na-erube isi n’ebe “ewu” isi ike ndị ahụ nọ, mgbe e bibisịkwara ndị nke ikpeazụ ahụ, atụrụ ahụ ga-eketa akụkụ elu ala nke Alaeze ahụ a kwadebewooro ha.
Ịchịkọta Ndị ahụ Yiri Atụrụ
3. N’ọrụ dị aṅaa ka ndị Chineke tinyeworo uche ha kemgbe 1935?
3 Na-amalite na 1935, ‘ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi’ elekwasịwo anya n’ịchọta ndị dị otú ahụ yiri atụrụ na ịkpọbata ha ná nzukọ Jehova. (Matiu 24:45; Jọn 10:16) Ndị Kraịst ndị a a pụrụ izi ihe aghọtawo na Jisọs na-achị achị ugbu a n’Alaeze eluigwe Jehova nakwa na oge na-abịa ngwa ngwa maka ọgwụgwụ nke usoro ihe ọjọọ nke a na mwebata nke ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-ebi n’ime ya. (2 Pita 3:13; Mkpughe 12:10) N’ime ụwa ọhụrụ ahụ, a ga-emezu okwu ndị na-enye obi ụtọ nke Aịsaịa: “O lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịsaịa 25:8.
4. Ọ bụ ezie na ha na-atụsi anya ike ịhụ ka e wepụrụ ọkaaka Jehova n’ụta n’Amagedọn, gịnị meworo ọtụtụ n’ime atụrụ ọzọ ahụ?
4 Ebe ọgwụgwụ nke ụwa Setan dị ezi nso, ndị Kraịst yiri atụrụ ga-enwe oké mmasị ịhụ ka e wepụrụ ọkaaka Jehova n’ụta n’oge mkpagbu na-abịanụ n’isi Babilọn Ukwu ahụ na akụkụ ndị ọzọ nke ụwa Setan. (Mkpughe 19:1-3, 19-21) Nye ọnụ ọgụgụ dị ukwuu, o metụbeghị otú ahụ mbụ. Ọtụtụ ndị nweburu olileanya iso ‘n’ọtụtụ nde’ ahụ na-agaghị anwụ ma ọlị anwụwo n’ezie. E gburu ụfọdụ n’ihi okwukwe ha nwere maka eziokwu ahụ n’ụlọ mkpọrọ na ogige ịta ahụhụ dị iche iche ma ọ bụ n’aka ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè. Ndị ọzọ anwụwo n’ihe ọghọm dị iche iche ma ọ bụ site n’ihe ndị a sịrị na ha sitere n’okike—ọrịa na ịka nká. (Abụ Ọma 90:9, 10; Eklisiastis 9:11) N’ụzọ doro anya, ndị ọzọ ga-anwụ tupu ọgwụgwụ ahụ eruo. Olee otú ndị dị otú ahụ ga-esi hụ mmezu nke nkwa ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-ebi n’ime ya?
Olileanya Mbilite n’Ọnwụ
5, 6. Ọdịnihu dị aṅaa dị maka ndị nwere olileanya elu ala bụ́ ndị nwụrụ tupu Amagedọn?
5 Pọl onyeozi nyere azịza ya mgbe ọ na-ekwu okwu n’ihu onye ọchịchị Rom bụ́ Filiks. Dị ka e dekọrọ n’Ọrụ Ndị Ozi 24:15, Pọl ji obi ike kwusaa, sị: “Enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” Olileanya nke mbilite n’ọnwụ na-enye anyị obi ike n’ihu ihe isi ike ndị kasị njọ. N’ihi olileanya ahụ, ezi ndị enyi anyị ndị dara ọrịa ma nwee mmetụta na ha ga-anwụ adịghị ada mbà n’obi. Ihe ọ sọrọ ya mee, ha maara na ha ga-aghọrọ nkwụghachi ụgwọ nke ikwesị ntụkwasị obi dị ka ihe ubi. N’ihi olileanya nke mbilite n’ọnwụ, ụmụnna anyị nwoke na nwanyị ndị nwere obi ike ndị na-eche ọnwụ ihu n’aka ndị na-esogbu ha maara na ọ dịghị ụzọ ọ bụla ndị na-esogbu ha pụrụ isi nwee mmeri. (Matiu 10:28) Mgbe mmadụ nwụrụ n’ọgbakọ, anyị na-enwe mwute n’ihi onye ahụ ịnwụnahụ anyị. N’otu mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ahụ bụ otu n’ime atụrụ ọzọ ahụ, anyị na-aṅụrị ọṅụ na onye kwere ekwe ibe anyị ekwesịwo ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ ma na-ezu ike ugbu a, na-ejide n’aka ọdịnihu n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.—1 Ndị Tesalọnaịka 4:13.
6 Ee, olileanya mbilite n’ọnwụ bụ akụkụ dị mkpa nke okwukwe anyị. Otú ọ dị, gịnị mere okwukwe anyị ná mbilite n’ọnwụ ji sie ike otú a, olè ndị kwa so na-ekerịta olileanya ahụ?
7. Gịnị bụ mbilite n’ọnwụ ahụ, oleekwa ụfọdụ akụkụ akwụkwọ nsọ na-ekwu na ọ ghaghị ime?
7 Okwu Grik maka “mbilite n’ọnwụ” bụ a·naʹsta·sis, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “ibili ọtọ.” N’ụzọ bụ isi ọ na-ezo aka n’ibilite site ná ndị nwụrụ anwụ. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, okwu ahụ bụ́ “mbilite n’ọnwụ” kpọmkwem apụtaghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ma e kwupụtara olileanya mbilite n’ọnwụ n’ụzọ doro anya n’ebe ahụ. Dị ka ihe atụ, anyị na-ahụ ya n’okwu ndị Job kwuru mgbe ọ nọ ná nhụjuanya ya: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na I zobe m [na Sheol, NW] . . . ma a sị na Ị kpaara m ókè, wee cheta m!” (Job 14:13) N’otu aka ahụ, na Hosea 13:14, anyị na-agụ, sị: “N’aka [Sheol, NW] ka M ga-esi gbapụta ha; n’aka ọnwụ ka M ga-eme ka ha si pụọ nwere onwe ha: olee ebe ajọ ọrịa gị nile nke na-efe efe dị, gị ọnwụ? olee ebe mbipụ gị dị, [Sheol, NW]?” Ná 1 Ndị Kọrint 15:55, Pọl onyeozi hotara okwu ndị a ma gosi na mmeri nke e buru amụma ya e meriri ọnwụ bụ nke a na-emezu site ná mbilite n’ọnwụ. (Otú ọ dị, n’akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ Pọl na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ nke eluigwe.)
Ndị Kwere Ekwe ‘A Gụrụ ná Ndị Ezi Omume’
8, 9. (a) Olee otú ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ isi keta òkè ná mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume? (b) Gịnị bụ ihe ndabere nke olileanya anyị ná ndụ nke ọnwụ na-agaghị akwụsị?
8 N’okwu ọ gwara Filiks, nke e hotara na paragraf nke 5, Pọl kwuru na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na ndị ajọ omume. Olè ndị bụ ndị ezi omume ahụ a ga-akpọlite? N’ezie, ọ dịghị mmadụ ọ bụla bụ onye ezi omume site n’ọmụmụ. Anyị nile bụ ndị mmehie site n’ọmụmụ, anyị na-emekwa mmehie n’oge ndụ anyị dum—nke na-eme ka anyị bụrụ ndị kwesịrị ọnwụ n’ihi ihe abụọ. (Ndị Rom 5:12; 6:23) Otú ọ dị, n’ime Bible anyị na-achọta okwu ahụ bụ ‘a gụrụ n’onye ezi omume.’ (Ndị Rom 3:28) Nke a na-ezo aka n’ebe ụmụ mmadụ nọ ndị, ọ bụ ezie na ha ezughị okè, Jehova agbaghaworo ha mmehie ha.
9 E ji okwu ahụ eme ihe n’ụzọ pụtakarịsịrị ìhè n’ihe banyere ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị nwere olileanya nke eluigwe. Ná Ndị Rom 5:1, Pọl onyeozi na-asị: “Ebe a gụrụ anyị ná ndị ezi omume site n’okwukwe, anyị na Chineke dị n’udo site n’aka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” A gụrụ ndị Kraịst nile e tere mmanụ ná ndị ezi omume n’ihi okwukwe. Okwukwe n’ime gịnị? Dị ka Pọl na-akọwa n’ụzọ satụrụ mbara n’akwụkwọ Ndị Rom, ọ bụ okwukwe na Jisọs Kraịst. (Ndị Rom 10:4, 9, 10) Jisọs nwụrụ dị ka mmadụ zuru okè, e mesịakwa site ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya, o wee rịgoo n’eluigwe inyefe ọnụ ahịa nke ndụ mmadụ ya n’ihi anyị. (Ndị Hibru 7:26, 27; 9:11, 12) Mgbe Jehova nakweere àjà ahụ, ihe Jisọs mere bụ ịzụpụta agbụrụ mmadụ pụọ ná mmehie na ọnwụ. Ndị nwere okwukwe ná ndokwa nke a na-erite uru dị ukwuu site na ya. (1 Ndị Kọrint 15:45) Ná ndabere ya ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi nwere olileanya nke iketa ndụ nke onye iro obi ọjọọ ahụ, bụ́ ọnwụ, na-agaghị akwụsịli.—Jọn 3:16.
10, 11. (a) Mbilite n’ọnwụ dị aṅaa na-echere ndị Kraịst e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi? (b) Ụdị mbilite n’ọnwụ dị aṅaa ka ndị na-efe ofufe tupu oge ndị Kraịst nwere olileanya ya?
10 N’ihi àjà mgbapụta Jisọs, ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi nwere olileanya e ji n’aka nke ịbụ ndị a kpọlitere dị ka ndị bụ mmụọ e kere eke na-adịghị anwụ anwụ, dị ka Jisọs. (Mkpughe 2:10) E kwuru banyere mbilite n’ọnwụ ha ná Mkpughe 20:6, nke na-asị: “Ngọzi na-adịrị ya, ọ dịkwa nsọ, bụ́ onye nwere òkè n’ime mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ: ọnwụ nke abụọ ahụ enweghị ike n’ebe ndị a nọ; kama ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa Ya bụrụ eze [otu puku afọ] ahụ.” Nke a bụ mbilite n’ọnwụ nke eluigwe. Ma, rịba ama na Bible na-akpọ ya “mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ,” nke pụtara na e nwere ọzọ na-abịanụ.
11 Ná Ndị Hibru isi nke 11, Pọl rụtụrụ aka n’ogologo ahịrị nke ndị ohu Chineke tupu oge ndị Kraịst bụ́ ndị nweworo okwukwe siri ike na Jehova Chineke. Ndị a kwa nwere okwukwe ná mbilite n’ọnwụ. N’amaokwu nke 35 nke isiakwụkwọ ahụ, Pọl na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ dị iche iche nke ọrụ ebube ndị mere n’oge akụkọ ihe mere eme nke Israel, na-asị: “Ndị inyom natara ndị ha ndị nwụrụ anwụ site ná mbilite n’ọnwụ: ma e tigburu ndị ọzọ, ebe ha jụrụ ịnata mgbapụta ha; ka ha wee nata mbilite n’ọnwụ ka mma.” Ndị àmà oge ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ ilepụ anya n’ihu maka mbilite n’ọnwụ nke ka ndị ahụ metụtara, dị ka ihe atụ, Elaịja na Elaịsha mma. (1 Ndị Eze 17:17-22; 2 Ndị Eze 4:32-37; 13:20, 21) Olileanya ha bụ mbilite n’ọnwụ baa n’ụwa ebe a na-agaghị emekpọ ndị ohu Chineke ọnụ n’ihi okwukwe ha, ụwa ebe ndị ndị inyom hụrụ n’anya na-agaghị anwụnahụ ha. Ee, ha lepụrụ anya isi ná ndị nwụrụ anwụ bilite baa n’otu ụwa ọhụrụ ahụ nke anyị na-ele anya ya. (Aịsaịa 65:17-25) Jehova ekpugheghịịrị ha ruo n’ókè o meere anyị banyere ụwa ọhụrụ nke a. N’agbanyeghị nke ahụ, ha maara na ọ na-abịa, ha chọkwara ibi na ya.
Mbilite n’Ọnwụ nke Elu Ala
12. À gụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge ndị Kraịst ná ndị ezi omume? Kọwaa.
12 Ànyị kwesịrị iche banyere nteta nke ndị ikom na ndị inyom ndị a kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge ndị Kraịst n’ime ụwa ọhụrụ ahụ dị ka akụkụ nke mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume? Ee, dị ka ihe àmà na-egosi, n’ihi na Bible na-ezo aka n’ebe ha nọ dị ka ndị ezi omume. Dị ka ihe atụ, Jemes onye na-eso ụzọ kpọtụrụ otu nwoke na otu nwanyị nke oge ochie aha bụ́ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume. Nwoke ahụ bụ Abraham, nna nna nke agbụrụ ndị Hibru. Banyere ya anyị na-agụ, sị: “Abraham wee kwere okwu Chineke, e wee gụọ ya nye ya n’ezi omume; e wee kpọọ ya enyi nke Chineke.” Nwanyị ahụ bụ Rehab, onye na-abụghị onye Israel nke gosiri okwukwe na Jehova. A ‘gụrụ ya n’onye ezi omume,’ o wee bụrụ akụkụ nke mba Hibru. (Jemes 2:23-25) Otú a, Jehova gụrụ ndị ikom na ndị inyom oge ochie ndị gosipụtara okwukwe siri ike na Jehova na ná nkwa ya nile ma nọgide n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ná ndị ezi omume ná ndabere nke okwukwe ha, obi abụọ adịghịkwa ya na ha ga-eso keta òkè ná “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume.”
13, 14. (a) Olee otú anyị si mara na a pụrụ ịgụ ndị Kraịst nwere olileanya elu ala ná ndị ezi omume? (b) Gịnị ka nke a pụtara nye ha?
13 Otú ọ dị, gịnị banyere ndị yiri atụrụ taa, ndị nwere olileanya elu ala bụ́ ndị raara onwe ha nye Jehova ma nwụọ n’ikwesị ntụkwasị obi n’oge ọgwụgwụ nke a? Hà ga-eketa òkè ná mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume? O doro anya na ọ dị otú ahụ. Jọn onyeozi hụrụ oké ìgwè mmadụ dị otú ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi n’ọhụụ. Rịba ama otú o si kọwaa ha: “M wee hụ, ma lee, oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta, na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa atụrụ ahụ, e gbokwasịworo ha uwe mwụda dị ọcha, igu nkwụ dịkwa n’aka ha; ha wee were oké olu tie mkpu, sị, Nzọpụta dịịrị Chineke anyị, Onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.”—Mkpughe 7:9, 10.
14 Rịba ama na ndị a dị umeala n’obi nwere nchekwube siri ike na a ga-azọpụta ha, ha na-etokwa Jehova na Jisọs, bụ́ “Nwa atụrụ ahụ,” maka nke a. Ọzọ, ha na-eguzo n’ihu Jehova na Nwa Atụrụ ahụ, ha nile yikwa uwe ọcha. Gịnị mere ha ji yiri uwe ọcha? Ihe e kere eke nke eluigwe gwara Jọn, sị: “Ha sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:14) N’ime Bible, ọcha bụ ihe nnọchiteanya nke ịdị ọcha, ezi omume. (Abụ Ọma 51:7; Daniel 12:10; Mkpughe 19:8) Eziokwu ahụ bụ na a hụrụ oké ìgwè mmadụ ahụ ka ha yi uwe ọcha pụtara na Jehova na-ele ha anya dị ka ndị ezi omume. Olee otú nke ahụ si kwe omume? N’ihi na, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha asawo uwe ha n’ọbara nke Nwa Atụrụ ahụ. Ha nwere okwukwe n’ọbara Jisọs Kraịst wụfuru, a gụkwara ha ná ndị ezi omume dị ka ndị enyi Chineke n’olileanya nke ịlanarị oké mkpagbu ahụ. N’ihi ya, onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ntụkwasị obi nke raara onwe ya nye nke bụ ugbu a akụkụ nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke nwụrụnụ tupu oké mkpagbu ahụ pụrụ inwe obi ike na ya ga-eketa òkè ná mbilite n’ọnwụ nke elu ala nke ndị ezi omume.
15. Ebe ọ bụ na a ga-akpọlite ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume, gịnị bụ abamuru nke mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume?
15 A kọwara mbilite n’ọnwụ ahụ ná Mkpughe isi 20, amaokwu nke 13 n’okwu ndị a: “Oké osimiri wee nyeghachi ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ya; ọnwụ na Hedis nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ha: e wee kpee ha ikpe n’otu n’otu dị ka ọrụ nile ha si dị.” Otú a, n’oge oké Ụbọchị Ikpe Jehova nke otu puku afọ, a ga-akpọlite ndị nile nọ ná ncheta Chineke—ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume. (Ọrụ 17:31) Otú ọ dị, lee ka ọ ga-esi ka nnọọ mma nye ndị ezi omume! Ha ebiworị ndụ nke okwukwe. Ha esoroworị Jehova nwee mmekọrịta chiri anya, nweekwa obi ike ná mmezu nke nzube ya nile. Ndị àmà bụ́ ndị ezi omume tupu Oge Ndị Kraịst ga-esi ná ndị nwụrụ anwụ teta na-enwe ịnụ ọkụ n’obi maka ịmụta otú nkwa ndị Jehova kwere banyere Mkpụrụ ahụ si mezuo. (1 Pita 1:10-12) Ndị nke atụrụ ọzọ ahụ ndị Jehova na-ele anya dị ka ndị ezi omume n’oge anyị ga-esi n’ili pụta na-enwe ịnụ ọkụ n’obi maka ịhụ ụwa Paradaịs ahụ nke ha kwuru okwu ya mgbe ha kwusara ozi ọma ahụ n’usoro ihe nke a. Lee aha oge aṅụrị nke ahụ ga-abụ!
16. Gịnị ka anyị pụrụ ikwu banyere mbilite n’ọnwụ nke Ụbọchị Ikpe nke ndị nwụrụ n’oge anyị?
16 N’oge Ụbọchị Ikpe ahụ nke otu puku afọ, olee kpọmkwem mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi n’afọ ndị ikpeazụ ndị a nke usoro ihe Setan? Bible ekwughị. Otú ọ dị, ọ́ gaghị abụ ihe ezi uche dị na ya na a ga-akpọlite ndị a gụrụ ná ndị ezi omume bụ́ ndị nwụrụ n’oge anyị ná mmalite ka ha wee nwee ike isoro oké ìgwè mmadụ ahụ ndị lanarịrị Amagedọn kere òkè n’ọrụ nke ịnabataghachi ndị ọgbọ mbụ site n’ọnwụ? Ee, n’ezie!
Olileanya nke Na-enye Nkasi Obi
17, 18. (a) Nkasi obi dị aṅaa ka olileanya mbilite n’ọnwụ na-enye? (b) Gịnị ka a na-akpali anyị ịkpọsa banyere Jehova?
17 Olileanya mbilite n’ọnwụ na-enye ndị Kraịst nile taa ume na nkasi obi. Ọ bụrụ na anyị anọgide n’ikwesị ntụkwasị obi, ọ dịghị ihe ndapụta ọ bụla, ọ dịghịkwa onye iro ọ bụla pụrụ ịnapụ anyị ụgwọ ọrụ anyị! Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ 1992 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, na peji nke 177, n’ebe ahụ foto nke ndị Kraịst bụ́ ndị Etiopia nwere obi ike bụ́ ndị nwụrụ kama imebi okwukwe ha pụtara. Okwu e dere n’okpuru foto ha na-asị: “Ihu ndị anyị na-atụ anya ịhụ ná mbilite n’ọnwụ.” Lee ihe ùgwù ọ ga-abụ ịmata ndị a na ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ bụ́ ndị gosiworo otu ụdị ikwesị ntụkwasị obi ahụ n’ihu ọnwụ!
18 Gịnị banyere ndị anyị hụrụ n’anya na ndị enyi anyị ndị na-adịghị ndụ gabiga oké mkpagbu ahụ n’ihi afọ ndụ ma ọ bụ nkwarụ? N’ihi olileanya nke mbilite n’ọnwụ, ha nwere ọdịnihu magburu onwe ya ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ bụrụkwa na anyị ejiri obi ike gosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta nke Jisọs, anyị nwere ọdịnihu dị ebube. N’ihi gịnị? N’ihi na, dị ka Pọl, anyị nwere olileanya ná “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume.” Site n’obi anyị nile, anyị na-ekele Jehova maka olileanya nke a. N’ezie, ọ na-akpali anyị ikwupụtaghachi okwu nke onye ọbụ abụ ahụ: “Kọsaanụ akụkọ ebube [Chineke] n’etiti mba nile, akụkọ oké ọrụ Ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche. N’ihi na Jehova dị ukwuu, bụrụkwa onye a na-eto nke ukwuu.”—Abụ Ọma 96:3, 4.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị aṅaa na-enye aka imesi olileanya anyị ná mbilite n’ọnwụ nke elu ala ike?
◻ Ná ndabere dị aṅaa ka a na-agụ ndị Kraịst ugbu a ná ndị ezi omume?
◻ Olee otú olileanya mbilite n’ọnwụ si enye anyị obi ike na mkpebisi ike?
[Foto dị na peeji nke 9]
Dị ka Pọl, ndị Kraịst e tere mmanụ na-enwe olileanya ná mbilite n’ọnwụ nke eluigwe