Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 2/1 p. 14-19
  • Oké Ìgwè Mmadụ Na-eje Ozi Dị Nsọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oké Ìgwè Mmadụ Na-eje Ozi Dị Nsọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-eguzo n’Ihu Ocheeze Ahụ”
  • “Ndị E Gbokwasịworo Uwe Mwụda ahụ Dị Ọcha”
  • “Igu Nkwụ Dịkwa n’Aka Ha”
  • “Ofufe Ehihie na Abalị”
  • ‘Ndị Si ná Mba, Ebo, Ndị, na Asụsụ Nile, Pụta’
  • ‘Ndị Si n’Oké Mkpagbu ahụ Pụta’
  • Oké Ìgwè Mmadụ Bara Ụba
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • ‘Lee Oké Ìgwè Mmadụ’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Oké Ìgwè Mmadụ Ndị Nọ n’Ihu Ocheeze Jehova
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Oké Ìgwè Mmadụ A Na-apụghị Ịgụta Ọnụ Bụ Ndị Jehova Gọziri Agọzi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 2/1 p. 14-19

Oké Ìgwè Mmadụ Na-eje Ozi Dị Nsọ

“Ha na-efekwa Ya ofufe ehihie na abalị n’ụlọ nsọ Ya.”—MKPUGHE 7:15.

1. Nghọta ime mmụọ dị aṅaa dị ịrịba ama ka e ruru na 1935?

NA May 31, 1935, e nwere ọṅụ dị ukwuu n’etiti ndị bịara mgbakọ nke Ndịàmà Jehova na Washington, D.C. N’ebe ahụ, na nke mbụ ya, a matara oké ìgwè mmadụ nke Mkpughe 7:9 n’ụzọ doro anya n’ikwekọ n’akụkụ Bible ndị ọzọ nakwa n’ụzọ dabakọrọ n’ihe omume ndị malitewororị ikpughe.

2. Gịnị gosiri na ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba aghọtawo na Chineke akpọbeghị ha maka ndụ eluigwe?

2 Ihe dị ka izu isii tupu oge ahụ, n’ememe nke Nri Anyasị Onyenwe Anyị n’ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova, 10,681 nke ndị bịaranụ (ihe dị ka 1 n’ime 6) ekereghị òkè n’achịcha na mmanya nnọchianya ahụ, 3,688 nke ndị a kwa na-arụsị ọrụ ike n’ịkpọsa Alaeze Chineke. Gịnị mere ha ji ghara ikere òkè n’ihe nnọchianya ahụ? N’ihi na dabere n’ihe ha mụtaworo site na Bible, ha ghọtara na Chineke akpọbeghị ha maka ndụ eluigwe kama na ha pụrụ ikere òkè ná ndokwa ịhụnanya Jehova n’ụzọ ọzọ. Ya mere ná mgbakọ ahụ, mgbe onye ọkà okwu kwuru, sị: “Ndị nile nwere olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ụwa bilienụ ọtọ biko,” gịnị mere? Ọtụtụ puku biliri ọtọ, iti mkpu ọṅụ dịruru ogologo oge nke ndị na-ege ntị sochiri ya.

3. N’ihi gịnị ka mmata a matara oké ìgwè mmadụ ahụ ji nye ozi ubi mkpali ọhụrụ, oleekwa mmetụta Ndịàmà nwere banyere nke a?

3 Ihe ndị ahụ bịaranụ mụtara ná mgbakọ ahụ nyere ozi ha ihe mkpali ọhụrụ. Ha bịara ghọta na ugbu a, tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe ochie, a ga-enye ọ bụghị nanị puku ole na ole kama oké ìgwè mmadụ ohere ịbata ná ndokwa Jehova maka nchebe nke ndụ, n’olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs n’elu ala. Lee aha ozi na-enye obi ụtọ e nyere ndị na-ahụ eziokwu n’anya n’ebe ahụ! Ndịàmà Jehova ghọtara na e nwere oké ọrụ a ga-arụ—ọrụ na-enye ọṅụ. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, John Booth, onye so n’Òtù Na-achị Isi, chetara, sị: “Mgbakọ ahụ nyere anyị ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji aṅụrị ọṅụ.”

4. (a) Ruo n’ókè ha aṅaa n’ezie ka e nweworo nchịkọta nke oké ìgwè mmadụ ahụ kemgbe 1935? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ndị nke oké ìgwè mmadụ ahụ si na-enye ihe àmà na ha nwere okwukwe dị ndụ?

4 N’afọ ndị na-esotenụ, ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà Jehova mụbara n’ụzọ dị ịtụnanya. N’agbanyeghị mkpagbu ihe ike a wụkwasịrị ha ọtụtụ mgbe n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, ọ fọrọ nke nta ka ọnụ ọgụgụ ha jiri okpukpu atọ mụbaa n’ime afọ iri. Ndị nkwusa 56,153 ahụkwa bụ́ ndị nọworo na-agba àmà n’ihu ọha na 1935 mụbara, ka ọ na-erule 1994, ruo ihe karịrị 4,900,000 ndị nkwusa Alaeze nọ n’ihe karịrị 230 ala. Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a ji ntụsianya ike na-enwe olileanya ịbụ ndị a gụnyere ná ndị ọ ga-adị Jehova mma inye ndụ zuru okè n’elu ala bụ́ paradaịs. E jiri ha tụnyere ìgwè atụrụ nta ahụ, ha abụrụwo n’ezie oké ìgwè mmadụ. Ha abụghị ndị na-ekwu na ha nwere okwukwe ma ghara igosi ya. (Jemes 1:22; 2:14-17) Ha nile na-eso ndị ọzọ ekerịta ozi ọma nke Alaeze Chineke. Ị̀ bụ otu n’ime ìgwè mmadụ ahụ nwere obi ụtọ? Ịbụ Onyeàmà na-arụsi ọrụ ike bụ otu akara dị mkpa e ji amata ha, ma ọ gụnyere ihe ndị ọzọ.

“Na-eguzo n’Ihu Ocheeze Ahụ”

5. Gịnị ka eziokwu ahụ bụ na oké ìgwè mmadụ ahụ “na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ” na-egosipụta?

5 N’ọhụụ e nyere Jọn onyeozi, ọ hụrụ ka ha “na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:9) Ha iguzo n’ihu ocheeze nke Chineke, dị ka a kọwara ya n’ebe a, na-egosi na ha nakweere ọkaaka Jehova n’ụzọ zuru ezu. Nke a gụnyere ihe dị ukwuu. Dị ka ihe atụ: (1) Ha nakweere ike Jehova nwere ikpebiri ndị ohu ya ihe bụ ezi ihe na ihe ọjọọ. (Jenesis 2:16, 17; Aịsaịa 5:20, 21) (2) Ha na-anụ olu Jehova ka ọ na-agwa ha okwu site n’Okwu ya. (Deuterọnọmi 6:1-3; 2 Pita 1:19-21) (3) Ha ghọtara mkpa nke ịnọ n’okpuru ndị Jehova tinyeworo ọrụ nlekọta n’aka. (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Efesọs 5:22, 23; 6:1-3; Ndị Hibru 13:17) (4) Ọ bụ ezie na ha ezughị okè, ha na-agbalịsi ike ịnara nduzi ọchịchị Chineke, ọ bụghị ná mmanye, kama site n’ọchịchọ obi. (Ilu 3:1; Jemes 3:17, 18) Ha nọ n’ihu ocheeze ahụ ife Jehova, onye ha na-akwanyere ùgwù nke ukwuu ma na-ahụ n’anya n’ụzọ dị omimi. N’ọnọdụ nke oké ìgwè mmadụ a, ha ịbụ ndị “na-eguzo” n’ihu ocheeze ahụ na-egosi nnwapụta nke Onye ahụ na-anọkwasị n’ocheeze ahụ. (Tụlee Mkpughe 6:16, 17.) Ọ̀ bụ nnwapụta dabeere na gịnị?

“Ndị E Gbokwasịworo Uwe Mwụda ahụ Dị Ọcha”

6. (a) Gịnị ka oké ìgwè mmadụ ahụ ịbụ ndị “e gbokwasịrị uwe mwụda ahụ dị ọcha” pụtara? (b) Olee otú oké ìgwè mmadụ ahụ na-esi enweta nguzo ezi omume n’ihu Jehova? (ch) Ruo n’ókè ha aṅaa ka okwukwe n’ọbara Kraịst wụfuru si emetụta ndụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ?

6 Nkọwa nke Jọn onyeozi nyere banyere ihe ọ hụrụ sịrị na ndị so n’oké ìgwè mmadụ nke a bụ “ndị e gbokwasịworo uwe mwụda ahụ dị ọcha.” Uwe mwụda dị ọcha ndị ahụ nọchiri anya nguzo ha dị ọcha, nke ezi omume n’ihu Jehova. Olee otú ha si nweta ụdị nguzo dị otú ahụ? Anyị ebuworị ụzọ hụ na n’ọhụụ Jọn ha na-eguzo “n’ihu Nwa atụrụ ahụ.” Ha nabatara Jisọs Kraịst dị ka “Nwa atụrụ Chineke, Nke na-ebupụ mmehie nke ụwa.” (Jọn 1:29) Jọn nụrụ ka otu n’ime ndị okenye ahụ bụ́ onye, n’ọhụụ ahụ, nọ n’ocheeze Chineke kọwara, sị: “Ha sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ. N’ihi nke a ka ha nọ n’ihu ocheeze Chineke.” (Mkpughe 7:14, 15) N’ụzọ ihe atụ, ha asawo uwe ha site n’inwe okwukwe n’ọbara mgbapụta Kraịst. Ha adịghị ekwenyere ozizi Bible banyere ihe mgbapụta ahụ nanị n’isi. Obi ekele maka ya na-emetụta ụdị mmadụ ha bụ n’ime; ya mere, ha “na-eji obi” na-enwe okwukwe. (Ndị Rom 10:9, 10) Nke a na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ihe ha na-eji ndụ ha eme. N’okwukwe, ha na-arara onwe ha nye Jehova ná ndabere nke àjà Kraịst, na-egosipụta nraranye ahụ site n’imikpu ná mmiri, na-ebi ndụ n’ezie n’ụzọ kwekọrọ ná nraranye ha, wee si otú a bịa nweta mmekọrịta dị mma n’ebe Chineke nọ. Lee aha ihe ùgwù ọma ọ bụ—nke a ga-elezi anya chebe!—2 Ndị Kọrint 5:14, 15.

7, 8. Olee otú nzukọ Jehova siworo nyere oké ìgwè mmadụ ahụ aka ịhapụ imerụ uwe ha?

7 Site ná nchebara echiche ịhụnanya maka ọdịmma ha na-adịgide adịgide, nzukọ Jehova site n’oge ruo n’oge arụtụwo aka n’omume na àgwà ndị pụrụ itetọ, ma ọ bụ imerụ, uwe e ji amata mmadụ nke na, n’agbanyeghị ihe e kwuru n’ọnụ, onye ahụ agaghị ekwekọ n’ezie ná nkọwa ahụ e nyere ná Mkpughe 7:9, 10. (1 Pita 1:15, 16) N’imesi ihe e bipụtaworo na mbụ ike, Ụlọ Nche, na 1941 na mgbe ọ gasịrị, gosiri ugboro ugboro na ọ ga-adị oké njọ ikwusara ndị ọzọ ozi ọma ma mgbe ahụ, n’oge a na-adịghị eme nkwusa, tinye aka n’ụdị omume ndị dị ka ịkwa iko ma ọ bụ ịkwa iko ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:3; Ndị Hibru 13:4) Na 1947 e mesiri ya ike na ụkpụrụ alụmdi na nwunye ndị Kraịst nke Jehova kwekọchara n’ọnọdụ dị ná mba nile; n’agbanyeghị ihe omenala obodo kwadoro, ndị nọgidere na-alụ ihe karịrị otu nwunye apụghị ịbụ Ndịàmà Jehova.—Matiu 19:4-6; Taịtọs 1:5, 6.

8 Na 1973, e gosiri Ndịàmà Jehova n’ụwa nile na ha nile aghaghị ịjụ kpam kpam omume ọ bụla doro anya na ọ na-emerụ emerụ dị ka iji ụtaba eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, n’agbanyeghị ebe ha pụrụ ịnọ—ọ bụghị nanị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’ozi ubi kamakwa n’ebe ha na-arụ ọrụ ego ma ọ bụ ụfọdụ ebe zoro ezo anya ọha mmadụ na-adịghị aga. (2 Ndị Kọrint 7:1) Na 1987 ná mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova, e nyere ndị Kraịst bụ́ ndị ntorobịa ndụmọdụ n’ụzọ siri ike na iji nọgide na-enwe nguzo dị ọcha n’ihu Chineke, ha aghaghị iche nche megide ibi ụdị ndụ abụọ. (Abụ Ọma 26:1, 4) Mgbe mgbe, Ụlọ Nche adọwo aka ná ntị megide akụkụ dị iche iche nke mmụọ nke ụwa n’ihi na “okpukpe Chineke nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị” gụnyere idebe onwe onye “n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.”—Jemes 1:27.

9. Ònye n’ezie ga-eguzo n’ihu ocheeze Chineke dị ka onye a nwapụtaworo mgbe oké mkpagbu ahụ gasịrị?

9 Ọ bụ ndị ahụ okwukwe ha na-akpali ibi ndụ n’ụzọ nke ga-eme ka ha nọgide na-adị ọcha n’ime mmụọ na n’omume ka ga-anọ “na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ” dị ka ndị ohu a nwapụtaworo nke Chineke mgbe oké mkpagbu nke na-abịanụ gasịrị. Ndị a abụghị nanị ndị malitere ibi ndụ ndị Kraịst kama jiri iguzosi ike n’ihe nọgidesie ike na ya.—Ndị Efesọs 4:24.

“Igu Nkwụ Dịkwa n’Aka Ha”

10. Gịnị ka igu nkwụ ndị ahụ Jọn hụrụ n’aka oké ìgwè mmadụ ahụ pụtara?

10 Ihe so n’akụkụ pụtara ìhè nke oké ìgwè mmadụ ahụ, dị ka Jọn onyeozi hụrụ ya, bụ na “igu nkwụ dịkwa n’aka ha.” Olee mkpa nke ahụ dị? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na igu nkwụ ndị ahụ chetaara Jọn ememe ụlọ ikwuu nke ndị Juu, ememe kasị enye ọṅụ na kalenda ndị Hibru, nke a na-eme mgbe owuwe ihe ubi oge okpomọkụ gasịrị. N’ikwekọ n’ihe Iwu kwuru, igu nkwụ, tinyere alaka nke osisi ndị ọzọ, bụ ihe e ji wuo ụlọ ndo ndị a ga-anọ n’oge ememe ahụ. (Levitikọs 23:39-40; Nehemaịa 8:14-18) Ndị na-efe ofufe fegharịkwara ha n’ụlọ nsọ ahụ n’oge ịbụ abụ nke Halel ahụ (Abụ Ọma 113-118). O doro anya na mfegharị nke oké ìgwè mmadụ ahụ na-efegharị igu nkwụ chetakwaara Jọn oge Jisọs nyaara ịnyịnya banye Jerusalem ka ìgwè mmadụ nke ndị na-efe ofufe ji ọṅụ fegharịa igu nkwụ ma tie mkpu, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Onye ahụ bụ Nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị, bụ́ Eze nke Israel.” (Jọn 12:12, 13) Ya mere ifegharị igu nkwụ na-egosi na oké ìgwè mmadụ ahụ ji ọṅụ na-eto Alaeze Jehova na Eze ya e tere mmanụ.

11. N’ihi gịnị ka ndị ohu Chineke na-eji enweta ọṅụ n’ezie n’ijere Jehova ozi?

11 Ọ bụ mmụọ ọṅụ dị otú ahụ ka oké ìgwè mmadụ ahụ na-egosipụta ọbụna ugbu a ka ha na-efe Jehova. Nke a adịghị apụta na ha adịghị eche ihe isi ike ọ bụla ihu ma ọ bụ na ha adịghị enweta ihe iru újú ma ọ bụ ihe mgbu. Ma afọ ojuju nke na-abịa site n’ijere Jehova ozi na ime ihe na-atọ ya ụtọ na-enye aka ibelata ihe ndị ahụ. Otú a, otu onye ozi ala ọzọ ya na di ya jere ozi ruo 45 afọ na Guatemala kọrọ banyere ọnọdụ emepeghị anya nke gbara ha gburugburu, ọrụ ike na njem dị ize ndụ nke bụ akụkụ nke ndụ ka ha na-eji ozi Alaeze ahụ ejeru ime obodo ndị India. O kwubiri, sị: “Ọ bụ oge ndụ anyị mgbe anyị nwere obi ụtọ kasị ukwuu.” Ọ bụ ezie na ọ na-enwe mmetụta nke ime agadi na ọrịa, ihe so n’ime ihe ndị ikpeazụ o deturu n’akwụkwọ o ji edetu ihe bụ okwu ndị a: “Ọ bụ ndụ ọma, nke na-akwụghachi ụgwọ dị ukwuu.” N’elu ụwa nile, Ndịàmà Jehova na-enwe otu ụdị mmetụta ahụ banyere ozi ha.

“Ofufe Ehihie na Abalị”

12. Ma ọ bụ n’ehihie ma ọ bụ n’abalị, gịnị ka Jehova na-ahụ n’elu ụwa ebe a?

12 Ndị a na-efe ofufe nwere ọṅụ na-efe Jehova “ofufe ehihie na abalị n’ụlọ nsọ Ya.” (Mkpughe 7:15) Gbaa ụwa gburugburu, ọtụtụ nde na-ekere òkè n’ofufe nke a. Mgbe chi jiri ná mba ụfọdụ, ndị mmadụ ewee na-ehi ụra n’ebe ahụ, ná mba ndị ọzọ chi abọọla, Ndịàmà Jehova jikwa ọrụ n’aka n’ịgba àmà. Ka ụwa na-atụgharị, mgbe nile, ehihie na abalị, ha na-abụ abụ otuto Jehova. (Abụ Ọma 86:9) Ma ofufe ehihie na abalị ahụ e hotara ná Mkpughe 7:15 bụ ọbụna nke dịịrị onwe onye karị.

13. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si gosipụta ihe ife ofufe “ehihie na abalị” pụtara?

13 Mmadụ nile n’otu n’otu bụ́ ndị mejupụtara oké ìgwè mmadụ ahụ na-efe ofufe ehihie na abalị. Nke ahụ ọ̀ pụtara na e lere ihe nile ha na-eme anya dị ka ife ofufe? Ọ bụ eziokwu na n’agbanyeghị ihe ha na-eme, ha na-amụta ime ya n’ụzọ nke na-enye Jehova nsọpụrụ. (1 Ndị Kọrint 10:31; Ndị Kọlọsi 3:23) Otú ọ dị, “ofufe” metụtara nanị ihe gụnyere ofufe mmadụ na-efe Chineke kpọmkwem. Ịrụ ọrụ “ehihie na abalị” pụtara imechi ihe anya ma ọ bụ ịnọgide na-eme ihe nakwa mgbalịsi ike.—Tụlee Joshua 1:8; Luk 2:37; Ọrụ 20:31; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:8.

14. Gịnị ga-eme ka ozi ubi onwe onye anyị kwekọọ ná nkọwa nke ife ofufe “ehihie na abalị”?

14 Ka ha na-eje ozi n’ogige elu ala nke ụlọ nsọ ime mmụọ ukwu nke Jehova, ndị ahụ mejupụtara oké ìgwè mmadụ ahụ na-agbalị ikere òkè n’ozi ubi n’ụzọ chiri anya ma nọgide na-eme ya. Ọtụtụ emewo ya ihe mgbaru ọsọ ha ikere òkè ụfọdụ n’ozi ubi izu ọ bụla. Ndị ọzọ na-adọgbu onwe ha n’ọrụ dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Ọtụtụ mgbe ndị a na-eji ọrụ n’aka n’ịgba àmà n’okporo ámá na n’ụlọ ahịa dị iche iche n’isi ụtụtụ. Iji nabata ndị nwere mmasị, ụfọdụ Ndịàmà na-eduzi ọmụmụ Bible n’ime abalị. Ha na-agba àmà mgbe ha na-azụ ahịa, mgbe ha na-eme njem, mgbe ha na-eri nri ehihie, nakwa site na telifon.

15. E wepụ ozi ubi, gịnị so n’ije ozi dị nsọ anyị?

15 Ikere òkè ná nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ bụkwa akụkụ nke ofufe anyị; otú ahụkwa ka ọ dị ọrụ metụtara iwu na ilekọta ebe ndị a na-eme mgbakọ ndị Kraịst. Mgbalị ndị e tinyere ịgba ụmụnna ndị nwoke na nwanyị bụ́ ndị Kraịst ume na inyere ha aka, n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ ihe onwunwe, iji nọgide n’ije ozi Jehova so ya. Nke a gụnyere ọrụ nke Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ nile. Ije ozi Betel n’ụdị ya nile, nakwa ije ozi afọ ofufo ná mgbakọ anyị, bụcha ife ofufe. N’ezie, mgbe ndụ anyị na-agba gburugburu mmekọrịta nke anyị na Jehova, ha na-ejupụta n’ije ozi dị nsọ. Dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ na-ekwu, ndị Jehova na-efe “ofufe ehihie na abalị,” ha na-enwetakwa oké ọṅụ n’ime nke ahụ.—Ọrụ 20:35; 1 Timoti 1:11.

‘Ndị Si ná Mba, Ebo, Ndị, na Asụsụ Nile, Pụta’

16. Olee otú o si aghọ eziokwu na oké ìgwè mmadụ ahụ si ná ‘mba nile pụta’?

16 Site ná mba nile, ndị nke oké ìgwè mmadụ ahụ na-abịa. Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, ndokwa mgbapụta ahụ e mekwara site na Jisọs Kraịst zuru ezu iji gbapụta ha nile. Mgbe a matara oké ìgwè mmadụ ahụ n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ kwadoro ná nke mbụ ya na 1935, Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike na 115 ala. Ka ọ na-erule afọ ndị 1990, ọchịchọ a na-achọ ndị ahụ yiri atụrụ agbatịpụworị n’ihe karịrị ọnụ ọgụgụ ala ahụ okpukpu abụọ.—Mak 13:10.

17. Gịnị ka a na-eme iji nyere ndị nke ‘agbụrụ, ndị, na asụsụ nile’ aka isoro n’oké ìgwè mmadụ ahụ?

17 N’ịchọta ndị ga-emesịa soro n’oké ìgwè mmadụ ahụ, Ndịàmà Jehova elekwasịwo anya ọ bụghị nanị n’ebe ìgwè mba dị iche iche nọ kamakwa n’ebe agbụrụ nile na ndị nile na ìgwè asụsụ nile nọ n’ime mba ndị ahụ nọ. Iji ruo ndị a, Ndịàmà na-ebipụta akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’ihe karịrị 300 asụsụ. Nke a gụnyere ọzụzụ na ịnọgide na-enwe òtù ndị nsụgharị ruru eru, na-enye ígwè kọmputa nwere ike ide asụsụ ndị a nile, nakwa ibipụta ya ebipụta. Nanị n’afọ ise gara aga, a gbakwụnyewo 36 asụsụ, nke ihe dị ka 98,000,000 mmadụ na-asụ, n’asụsụ ndị a na-asụgharị. Tụkwasị na nke ahụ, Ndịàmà na-agbalị ịkpọtụrụ ndị a n’onwe ha iji nyere ha aka ịghọta Okwu Chineke.—Matiu 28:19, 20.

‘Ndị Si n’Oké Mkpagbu ahụ Pụta’

18. (a) Mgbe oké mkpagbu ahụ tiwapụrụ, olè ndị ka a ga-echebe? (b) Mkpọsa obi ụtọ dịgasị aṅaa ka a ga-akpọsa mgbe ahụ?

18 Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ifufe nke mbibi ahụ e hotara ná Mkpughe 7:1, ọ bụghị nanị na “ndị ohu Chineke anyị” e tere mmanụ ga-enweta nchebe ịhụnanya nke Jehova kama otú ahụ ka ọ ga-adị ndị oké ìgwè mmadụ ahụ sonyewooro ha n’ezi ofufe. Dị ka a gwara Jọn onyeozi, ndị nke oké ìgwè mmadụ ahụ ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta’ dị ka ndị lanarịworonụ. Lee aha iti mkpu otuto na obi ekele ha ga-enye mgbe ahụ ka ha na-akpọsa, sị: “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, Onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ”! Ndị ohu Chineke nile na-anọgidesi ike n’ihe n’eluigwe ga-agbakwụnyekwa olu ha n’ịkpọsa, sị: “Amen: Ngọzi nile, na otuto nile, na amamihe nile, na ekele nile, na nsọpụrụ nile, na ike nile, na ume nile, dịrị Chineke anyị ruo mgbe nile ebighị ebi. Amen.”—Mkpughe 7:10-14.

19. N’ọrụ dị aṅaa na-enye ọṅụ ka ndị ahụ lanarịrị ga-achọsi ike ikere òkè na ya?

19 Lee aha oge obi ụtọ nke ahụ ga-abụ! Ndị nile dị ndụ ga-abụ ndị ohu nke nanị otu ezi Chineke ahụ! Ọṅụ kasị ukwuu n’ihe ndị a ga-abụ n’ijere Jehova ozi. A ga-enwe ọrụ dị ukwuu a ga-arụ—ọrụ na-enye ọṅụ! A ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs. A ga-akpọlite ọtụtụ puku nde nke ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ma mgbe ahụ kụziere ha ụzọ Jehova nile. Lee ihe ùgwù ọ ga-abụ ikere òkè na ya!

Gịnị Ka I Nwere Ikwu?

◻ Mmetụta dị aṅaa ka ihe omume ndị weere ọnọdụ na 1935 nwere n’ozi ubi nke Ndịàmà Jehova?

◻ Gịnị ka eziokwu nke na e gosiri oké ìgwè mmadụ ahụ ka ha “na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ” na-egosipụta?

◻ Olee otú ekele maka ọbara nke Nwa Atụrụ ahụ kwesịrị isi metụta ndụ anyị?

◻ Gịnị ka ha ifegharị igu nkwụ na-egosipụta?

◻ Olee otú oké ìgwè mmadụ ahụ na-esi eje ozi dị nsọ ehihie na abalị?

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Ije ozi ha na-egosi imechi ihe anya, ịdị uchu, na mgbalịsi ike

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya