Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mrt isiokwu 55
  • A Na-emebisị Ụwa—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Na-emebisị Ụwa—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E buru amụma na a ga-enwe ndị ga na-emebi ụwa
  • O nweghị ihe ga-eme ụwa a
  • Mba Dị Iche Iche Hà Ga-ejikọli Aka Dozie Ihe Ndị Na-akpata Ọdachi n’Ụwa A?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Oké Okpomọkụ A Na-enwe n’Ụwa Niile—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ụwa Na-ekpo Oké Ọkụ—Ò Nwere Ihe Ga-akwụsị Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ndị Mmadụ Hà Ga-emebiru Ụwa A Otú Ọ Na-agaghịzi Ekwe Mmekwata?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Isiokwu Ndị Ọzọ
mrt isiokwu 55
Otú ụwa dị ma a nọrọ n’ọnwa na-ele ya anya. Ọkara ya dị mma ebe ọkara ya nke ọzọ dị ka ihe kpọnwụrụ akpọnwụ.

NA-ECHENỤ NCHE!

A Na-emebisị Ụwa​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

N’abalị 4 n’ọnwa Eprel 2022, otu ụlọ ọrụ na-eleru otú ikuku na mmiri ozuzu si akpa ike anya (Intergovernmental Panel on Climate Change) gwara Òtù Mba Ụwa ihe ha chọpụtara. Mgbe onyeisi Òtù Mba Ụwa, bụ́ António Guterres, lebachara ihe ahụ ha chọpụtara anya, ọ sịrị: “Ụmụ mmadụ na-eme ihe dị iche iche ga-akpatara ụwa anyị a nsogbu. Mmiri ga-etochi ọtụtụ obodo. Oké okpomọkụ a na-enwetụbeghị ụdị ya ga-adị. Nnukwu mmiri ga na-ezokwa. Mmiri ọṅụṅụ agaghị adị. Nde kwuru nde osisi na ụmụ anụmanụ ga-anwụkpọ. Ihe a m na-ekwu abụghị egwuregwu. Ihe ndị a bụ ihe ndị sayensị kwuru ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị emeghị ihe ngwa ngwa ka a kwụsị imebi ikuku na mmiri.”

O nwere isiokwu gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times, nke Jun 15, 2022. Isiokwu ahụ bụ “Flooding Chaos in Yellowstone, a Sign of Crises to Come.” Ọ sịrị: “Ndị sayensị na-ekwu na n’ime afọ ole na ole na-abịa na oké okpomọkụ ga-akpa oké ọhịa ndị dị n’Amerịka dị narị anọ na iri abụọ na atọ [423] aka ọjọọ. Ihe ga-eme yiri ihe anyị na-agụta na Baịbụl: a ga-enwe ọkụ na idei mmiri, mmiri kpụkọrọ akpụkọ ga na-agbaze, mmiri dị n’oké osimiri ga na-eto, oké okpomọkụ ga-adịkwa.”

À ga-akwụsịli oké okpomọkụ na oké mmiri ozuzo na-akpa ike n’ụwa anyị a? Ọ bụrụ na a ga-akwụsịli ha, ònye ga-akwụsị ha? Ka anyị hụ ihe Baịbụl kwuru.

E buru amụma na a ga-enwe ndị ga na-emebi ụwa

Baịbụl kwuru na Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Amaokwu Baịbụl a na-akụziri anyị ihe atọ ndị a:

  1. 1. Ihe ndị mmadụ na-eme ga na-emebisị ụwa.

  2. 2. A ga-emecha kwụsị imebi ụwa.

  3. 3. Ọ bụ Chineke ga-eme ka nsogbu a kwụsị, ọ bụghị mmadụ.

O nweghị ihe ga-eme ụwa a

Baịbụl kwuru na “ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi.” (Ekliziastis 1:4) E nweghị mgbe ndị mmadụ na-agaghị ebi na ya.

  • “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.”​—Abụ Ọma 37:29.

A ga-emecha dozie ụwa anyị a, ya adịkwa mma obibi.

  • “Ala ịkpa na ala kpọrọ nkụ ga-enwe aṅụrị. Ọzara ga-aṅụrịkwa ọṅụ, okooko osisi ga-ejukwa eju na ya.”​—Aịzaya 35:1.

Gụọ isiokwu bụ́ “Who Will Save the Earth?” ka ị mata ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na Chineke ga-edozi ụwa anyị a. 

Gụọ isiokwu bụ́ “Climate Change and Our Future​—What the Bible Says” ka ị hụ ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu n’agbanyeghị otú e si na-emebi mmiri na ikuku.

Gụọ isiokwu bụ́ “Extreme Weather​—Can the Bible Help You to Cope?” ka ị chọpụta otú Baịbụl ga-esi nyere gị aka ịna-edi ihe isi ike nsogbu a na-akpata.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya