Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ndị Mmadụ Hà Ga-emebiru Ụwa A Otú Ọ Na-agaghịzi Ekwe Mmekwata?
    Ụlọ Nche—2014 | Septemba 1
    • Ndị Mmadụ Hà Ga-emebiru Ụwa A Otú Ọ Na-agaghịzi Ekwe Mmekwata?

      “Otu ọgbọ na-ala, ọgbọ ọzọ na-abịakwa; ma ụwa na-adịru ọbụna mgbe ebighị ebi.”—Ọ BỤ SỌLỌMỌN, ONYE CHỊRỊ IZREL N’OGE OCHIE, KWURU IHE A.a

      Ihe a Sọlọmọn kwuru gosiri na a gaghị eji ụmụ mmadụ na-anaghị adịte ndụ aka tụnyere ụwa anyị a na-enweghị ọgwụgwụ. Kemgbe ọtụtụ puku afọ, ọtụtụ ndị ebiela n’ụwa ma mechaa nwụọ, ma ụwa ka dịkwa. Ihe ndị na-eme ka ndị mmadụ dịrị ndụ ka dịkwa n’ụwa.

      Kemgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, otú ihe si na-agbanwe n’ụwa n’ike n’ike enweghị atụ. Kemgbe ihe dị ka afọ iri asaa gara aga, otú ndị mmadụ si eme njem, otú ha si ezirịta ozi, nakwa ihe ndị nkà na ụzụ mepụtarala emeela ka ihe kakwuoro ndị mmadụ mfe. Ọtụtụ ndị nweziri ihe ndị e ji ebi ndụ e cheburu na a gaghị enwe ike imepụta. Ndị bi n’ụwa amụbaakwala ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ okpukpu atọ.

      Ma, ihe ndị a akpatala ọtụtụ nsogbu. Otú ndị mmadụ si emebisị ihe ndị dị n’ụwa ugbu a na-aka njọ nke na n’oge na-adịghị anya, ihe ndị na-eme ka ụwa dị mma obibi ga-akwụsị ịrụ ọrụ nke ọma. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị ekwuodịla na ọ bụ n’oge a ka ihe ụmụ mmadụ na-eme kacha akpa ụwa aka ọjọọ.

      Baịbụl kwuru na e nwere oge ụmụ mmadụ ‘ga-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Ụfọdụ chere na ọ bụ ugbu a bụ oge ahụ. Ndị mmadụ hà ka ga-emebikwu ihe n’ụwa? Hà ga-emebiru ụwa otú ọ na-agaghịzi ekwe mmekwata?

      È MEBIRUOLA ỤWA OTÚ Ọ NA-AGAGHỊ EKWE MMEKWATA?

      Ndị mmadụ hà emebiruola ụwa otú ọ na-agaghị ekwe mmekwata? Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị sịrị na o siri ike ịmata nsogbu ihe ndị mmadụ na-emebi n’ụwa ga-akpata. N’ihi ya, ụjọ na-atụ ha na o nwere ike ịbụ na oge njinji ga-eji n’ụwa adịla nso, ya bụ, oge oké okpomọkụ na idei mmiri a na-enwe n’ụwa ga-aka njọ ma kpatara ndị mmadụ nsogbu.

      Ebe anụ ọhịa bea nọ n’elu obere mmiri kpụkọrọ akpụkọ

      Dị ka ihe atụ, n’ebe ndịda ụwa, e nwere nnukwu mmiri kpụkọrọ akpụkọ dị n’elu oké osimiri. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụrụ na ụwa akwụsịghị ikpokwu ọkụ, e nwere oge ọ ga-eru a gaghịzi enwe ihe a ga-eme ka mmiri ahụ kpụkọrọ akpụkọ kwụsị ịgbaze. Ihe mere ha ji kwuo otú ahụ bụ na mmiri ahụ kpụkọrọ akpụkọ anaghị ekwe ka oké osimiri dị n’okpuru ya kporo ọkụ. Ma, ọ bụrụ na mmiri ahụ kpụkọrọ akpụkọ agbazee, o nweghịzi ihe ga-ekpuchi oké osimiri ahụ. Ebe ọ bụkwa na elu oké osimiri ahụ na-eji oji, ọ ga-ekporo ọkụ ngwa ngwa, mee ka mmiri ahụ kpụkọrọ akpụkọ na-agbazekwu. Ihe a nwere ike ịna-eme n’akwụsịghị akwụsị, meekwa ka oké osimiri ndị dị n’ụwa jubiga ókè ma kpatara ọtụtụ nde mmadụ ọdachi.

  • Ndị Mmadụ Hà Ga-emebiru Ụwa A Otú Ọ Na-agaghịzi Ekwe Mmekwata?
    Ụlọ Nche—2014 | Septemba 1
    • Otú Ndị Mmadụ Si Emebisị Ụwa A

      • Ikuku. “A naghị ajụ ajụ ma ikuku, oké osimiri, na ala hà na-ekpokwu ọkụ . . . Kemgbe afọ 1951, ihe kacha eme ka ụwa na-ekpokwu ọkụ bụ ihe ndị mmadụ na-eme n’ime ya.”—Ụlọ Ọrụ Amerịka Na-enyocha Ihu Ígwé, 2012.

      • Ala. “Ụmụ mmadụ emebisiela ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ọkara mbara ala niile e nwere n’ụwa. Nke a akpatarala ihe dị iche iche dị ndụ n’ụwa nsogbu, mee ka ala ghara ịna-emepụta nri nke ọma, . . . meekwa ka ụwa na-ekpokwu ọkụ.”—Akwụkwọ bụ́ Global Change and the Earth System.

      • Oké Osimiri. “Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e gbukpọọla azụ̀ ndị dị n’oké osimiri ndị e nwere n’ụwa ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na a naghị ekwe ka ndị nke fọrọnụ mụbaa tupu e gbuwe ha.”—Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi bụ́ BBC, Septemba 2012.

      • Osisi na Ụmụ Anụmanụ. ‘Ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị ekwuola na ọ bụ ụmụ mmadụ mere ọtụtụ osisi na ụmụ anụmanụ ga-eji anwụcha n’oge na-adịghị anya.’—O si n’adres Ịntanet bụ́ science.nationalgeographic.com.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya