Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ihe Ndị Na-aghaghị Ime n’Isi Nso
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • Ụzọ Nzirịta Ozi

      5. Olee ụzọ e si zitere Jọn onyeozi ihe o dere ná Mkpughe, zigakwara ya ọgbakọ dị iche iche?

      5 Mkpughe 1:1b, 2 gara n’ihu, sị: “O [Jisọs] wee site n’aka mmụọ ozi ya ziga [Mkpughe] wee gosi Jọn ohu ya [“n’ihe àmà,” NW]; onye gbara àmà nke okwu Chineke, na nke àmà Jisọs Kraịst, ka ha hà, bụ ihe ọ hụrụ.” Otú a, Jọn natara ihe odide ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ site n’aka otu mmụọ ozi. O dere ya n’akwụkwọ mpịakọta, na-ezijere ya ọgbakọ dị iche iche nke oge ya. Ọ bụụrụ anyị ihe obi ụtọ na Chineke echebewo ya maka agbamume nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100,000 ọgbakọ dị iche iche nke ndị ohu ya dị n’otu n’elu ala ebe a taa.

      6. Olee otú Jisọs si mee ka a mara ụzọ ọ ga-eji mee ihe n’inye ‘ndị ohu’ ya nri ime mmụọ taa?

      6 Chineke nwere ụzọ nzirịta ozi nke o si mee ka a nụ ihe dị ná Mkpughe n’oge Jọn, Jọn bụkwa akụkụ elu ala nke ụzọ nzirịta ozi ahụ. N’otu aka ahụ, Chineke nwekwara ụzọ e si na-enye ‘ndị ohu’ ya ọzụzụ ime mmụọ taa. N’oké amụma ya banyere ‘ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a,’ Jisọs mere ka a mara ụzọ a dị ka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ezinụlọ ya, inye ha ihe e ji azụ ha n’oge ya.” (Matiu 24:3, 45-47) O ji òtù Jọn nke a nke ọtụtụ ndị mejupụtara na-eme ihe n’ikpughe ihe amụma ahụ pụtara.

      7. (a) Olee ụzọ ihe àmà ndị ahụ a na-ahụ ná Mkpughe kwesịrị isi metụta anyị? (b) Ruo ogologo oge hà aṅaa ka ụfọdụ ndị so n’òtù Jọn ahụ kereworo òkè n’imezu ọhụụ ndị ahụ dị ná Mkpughe?

      7 Jọn onyeozi dere na Jisọs gosiri ya Mkpughe ahụ ‘n’ihe àmà,’ ma ọ bụ n’ihe atụ dị iche iche. Ihe ndị a pụtara ìhè, bụrụkwa ihe na-akpali akpali inyocha ha. Ha na-egosi ịrụsi ọrụ ike, ha kwesịkwara ịkpali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi tinye uchu n’ime ka ndị ọzọ mara ihe banyere ya na ihe ọ pụtara. Mkpughe na-egosi anyị ọtụtụ ọhụụ ndị dị oké egwu, ndị Jọn keere òkè na nke ọ bụla n’ime ha dị ka onye so na-eme ihe ndị ahụ ma ọ bụ nọrọ dị ka onye na-ekiri ekiri. Ndị ahụ nọ n’òtù Jọn, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha kereworo òkè ruo ọtụtụ iri afọ ná mmezu nke ọhụụ ndị a, nwere obi ụtọ ịhụ na mmụọ Chineke ekpughewo ihe ha pụtara ka ha wee nwee ike ịkọwara ya ndị ọzọ.

  • Ihe Ndị Na-aghaghị Ime n’Isi Nso
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 9. (a) Dị ka Jọn, àgwà dị aṅaa ka ndị òtù Jọn nke oge a gosipụtaworo? (b) Jọn si aṅaa gosi ụzọ anyị ga-esi nwee obi ụtọ?

      9 Jọn kwesịrị ntụkwasị obi n’ịbụ onyeàmà nye ozi ahụ nke Chineke sitere n’aka Jisọs Kraịst nye ya. Ọ kọwara nke ọma ‘ihe nile ọ hụrụ.’ Òtù Jọn ejiriwo ezi ịnụ ọkụ n’obi na-achọ nduzi site n’aka Chineke na Jisọs Kraịst ka ha wee nwee ike ịghọta amụma ahụ n’ụzọ zuru ezu, meekwa ka ndị Chineke mara isi ihe ndị dị na ya. Maka abamuru nke ọgbakọ ahụ e tere mmanụ (nakwa nke oké ìgwè mmadụ ahụ zuru mba nile ọnụ nke Chineke ga-echebe ndụ gabiga oké mkpagbu ahụ), Jọn dere, sị: “Ngọzi na-adịrị onye na-agụ, na ndị na-anụ okwu nile nke amụma nke a, ndị na-edebekwa ihe nile e deworo n’ime ya: n’ihi na oge ahụ dị nso.”—Mkpughe 1:3.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya