Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ịlụso Ajọ Anụ Ọhịa Abụọ Ọgụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 2 Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya apụkwaghị inye nsogbu ọzọ n’eluigwe nke dị nsọ. A chụpụwo ajọ mmụọ ndị ahụ site n’eluigwe, wee kpaara ha ókè ịnọ na gburugburu elu ala. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ nke a kpatara oké mmụba e nwere n’ihe omume mgbaasị n’oge a. Agwọ aghụghọ ahụ ka nọgidekwara na-enwe nzukọ ndị mmụọ e merụrụ emerụ. Ma, ọ̀ na-ejikwa nzukọ a na-ahụ anya na-eme ihe iji duhie ihe a kpọrọ mmadụ? Jọn kọọrọ anyị, sị: “M wee hụ anụ ọhịa ka ọ na-esi n’oké osimiri rịgopụta, na-enwe mpi iri na isi asaa, na-ekpukwa okpueze iri n’elu mpi ya, na-enwekwa aha ụfọdụ nke nkwulu Chineke n’elu isi ya. Anụ ọhịa nke m hụrụ yikwara agụ, ụkwụ ya dịkwa ka ụkwụ bear, ọnụ ya dịkwa ka ọnụ ọdụm: dragọn ahụ wee nye ya ike ya, na ocheeze ya, na oké ịchịisi.”—Mkpughe 13:1b, 2.

      3. (a) Ajọ anụ ọhịa dịgasị aṅaa ka Daniel onye amụma hụrụ n’ọhụụ? (b) Gịnị ka nnukwu anụ ọhịa ndị ahụ ndị dị na Daniel 7 nọchiri anya ha?

      3 Gịnị bụ anụ ọhịa nke a jọrọ njọ ile anya? Bible n’onwe ya na-enye azịza ya. Tupu ọdịda Babilọn n’afọ 539 T.O.A., onye Juu ahụ bụ Daniel onye amụma hụrụ ọhụụ ndị metụtara ajọ anụ ọhịa dị iche iche. Na Daniel 7:2-8, ọ kọwara anụ ọhịa anọ ndị si n’oké osimiri rịgopụta, nke mbụ yiri ọdụm, nke abụọ yiri bear, nke atọ yiri agụ, “ma lee, otu anụ, nke mere ha anọ, nke dị egwu, nwee ume, dịkarịsiri ike; . . . o nwekwara mpi iri.” Nke a yiri nnọọ anụ ọhịa ahụ Jọn hụrụ n’ihe dị ka afọ 96 O.A. Anụ ọhịa ahụ nwekwara akụkụ ahụ ndị yiri nke ọdụm, bear, na agụ, o nwekwara mpi iri. Gịnị bụ anụ ukwu ndị ahụ Daniel hụrụ? Ọ kọọrọ anyị, sị: “Anụ ukwu ndị a, . . . bụ eze anọ, ndị ga-esi n’ala bilie ọtọ.” (Daniel 7:17) Ee, anụ ndị ahụ nọchiri anya ‘ndị eze,’ ma ọ bụ ike ọchịchị dị iche iche dị n’elu ala.

  • Ịlụso Ajọ Anụ Ọhịa Abụọ Ọgụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 8. Gịnị mere ọ gaghị abụ ihe ijuanya na e ji anụ ọhịa see onyinyo alaeze ụwa nke Anglo-America?

      8 Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe na-anwụ ibubo n’ahụ iji anụ ọhịa see onyinyo ike ọchịchị dị iche iche? Nke ahụ bụ ihe ụfọdụ ndị mmegide kwuru n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, mgbe a mara ọnọdụ Ndịàmà Jehova aka n’ụlọikpe dị iche iche gburugburu ụwa dị ka otu òtù, dịkwa ka ndị mmadụ n’otu n’otu. Ma cheretụ wee chee echiche! Ọ̀ bụ na mba ndị ahụ n’onwe ha adịghị anabata anụmanụ na anụ ọhịa dị iche iche dị ka ihe nnọchianya nke mba ha dị iche iche? Dị ka ihe atụ, e nwere ọdụm nke Britain, ugo nke America, na dragọn nke China. N’ihi nke a, gịnị mere onye ọ bụla ga-eji gbaa isi akwara ma ọ bụrụ na Chineke ahụ Onye Nwe Bible Nsọ ejirikwa anụ ọhịa mee ihe ise onyinyo ọchịchị ụwa dị iche iche?

      9. (a) N’ihi gịnị ka mmadụ na-ekwesịghị ịjụ mgbe Bible kwuru na ọ bụ Setan nyere anụ ọhịa ahụ ikike ya dị ukwuu? (b) Olee otú e si kọwaa Setan n’ime Bible, ò sikwa aṅaa na-enwe ike n’ahụ ọchịchị dị iche iche?

      9 Karịsịa, n’ihi gịnị ka onye ọ bụla ga-eji jụ ikwenye mgbe Bible kwuru na ọ bụ Setan nyere anụ ọhịa ahụ oké ike o nwere? Ọ bụ Chineke bụ Onye kwuru okwu ahụ, n’ihu ya, ‘mba nile dịkwa ka otu ntụ mmiri na-atụpụ n’ite mmiri, dịkwa ka uzuzu.’ Ọ ga-akara mba ndị ahụ mma ịchọ ihu ọma Chineke karịa ịbụ ndị a kpasuru iwe n’ihi otú Okwu amụma ya si kọwaa ha. (Aịsaịa 40:15, 17; Abụ Ọma 2:10-12) Setan abụghị onye dị n’akụkọ ifo, nke e nyere ọrụ ịta mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ ahụhụ n’ọkụ hell. Ọ dịghị ebe ọ bụla dị otú ahụ dị adị. Kama nke ahụ, a kọwara Setan n’Akwụkwọ Nsọ dị ka “mmụọ ozi nke ìhè”—onyeọkà n’iduhie mmadụ, onye nwere ike dị ukwuu n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa dum.—2 Ndị Kọrint 11:3, 14, 15; Ndị Efesọs 6:11-18.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya