Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ịlụso Ajọ Anụ Ọhịa Abụọ Ọgụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 25. (a) Olee otú Jọn si kọwaa anụ ọhịa ihe atụ ọzọ nke pụtara n’elu ụwa? (b) Gịnị ka mpi abụọ nke anụ ọhịa ọhụrụ nke a gosiri, ya na mpụta ọ pụtara site n’ala?

      25 Ma ugbu a, otu anụ ọhịa ọzọ na-apụta n’ebe a ga-ahụ ya anya n’ụwa. Jọn kọrọ, sị: “M wee hụ anụ ọhịa ọzọ ka ọ na-esi n’ala rịgopụta; o nwekwara mpi abụọ yiri nke nwa atụrụ ahụ, ma ọ na-ekwu okwu dị ka dragọn ahụ. O wee na-achị isi nile nke anụ ọhịa mbụ ahụ n’ihu ya. Ọ na-emekwa ụwa na ndị bi n’ime ya ka ha kpọọ isiala nye anụ ọhịa mbụ ahụ, nke e mere ka ihe otiti ya nke na-eweta ọnwụ laa. Ọ na-emekwa oké ihe ịrịba ama dị iche iche, ka o wee mee ọbụna ọkụ ka o si n’eluigwe rịdata n’ụwa n’ihu mmadụ nile.” (Mkpughe 13:11-13) Anụ ọhịa nke a nwere mpi abụọ, nke na-egosi mmekọrịta nke òtù ọchịchị abụọ. A kọwakwara ya dị ka nke si n’ala na-arịgopụta, ọ bụghị site n’oké osimiri. Otú a, ọ na-esite n’usoro ihe elu ala nke Setan guzobewororịị. Ọ ghaghị ịbụ alaeze ụwa nke dị adị, nke ga-ewere ọnọdụ pụtara ìhè n’ime ụbọchị Onyenwe anyị.

  • Ịlụso Ajọ Anụ Ọhịa Abụọ Ọgụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 27. (a) Àgwà dị aṅaa nke anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ ka e gosiri site n’eziokwu ahụ bụ na ọ na-eme ka ọkụ si n’eluigwe rịdata? (b) Olee otú ọtụtụ ndị si ele ihe ahụ nọchiri anya anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ anya taa?

      27 Anụ ọhịa nke a nwere mpi abụọ na-eme oké ihe ịrịba ama dị iche iche, ọbụna na-eme ka ọkụ si n’eluigwe rịdata. (Tụlee Matiu 7:21-23.) Ihe ịrịba ama nke ikpeazụ a na-echetara anyị Elaịja, bụ́ onye amụma Chineke ahụ nke ya na ndị amụma Beal rụrịtara ụka. Mgbe o nwere ihe ịga nke ọma n’ime ka ọkụ site n’eluigwe rịdata n’aha Jehova, ọ nwapụtara n’ụzọ na-enweghị ngọpụ na ọ bụ ezi onye amụma, na ndị amụma Beal bụkwa ndị amụma ụgha. (1 Ndị Eze 18:21-40) Dị ka ndị amụma Beal ndị ahụ, anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ chere na ya nwere iru eru zuru ezu dị ka onye amụma. (Mkpughe 13:14, 15; 19:20) Ee, ọ na-ekwu na ya emeriwo ikike nile nke ihe ọjọọ n’agha ụwa abụọ, meriekwa ihe ahụ a sị na ọ bụ ọchịchị kọmụnist nke na-adịghị asọpụrụ Chineke! N’ezie, ọtụtụ ndị na-ele ihe ahụ nọchiri anya anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ n’oge a anya dị ka onye nchebe nke inwe onwe na isi iyi nke ihe onwunwe ndị dị mma.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya