Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ihe Otiti Ndị Jehova Ga-eti Krisendọm
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 29. Gịnị mezuru ihe atụ nke ‘oké kpakpando nke na-ere ọkụ dị ka ọwa,’ ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

      29 Anyị ahụworị ihe nnọchianya nke kpakpando n’ozi ndị ahụ Jisọs zijeere ọgbakọ asaa ndị ahụ, n’ebe kpakpando asaa ahụ sere onyinyo ndị okenye nọ n’ọgbakọ ndị ahụ.b (Mkpughe 1:20) “Kpakpando” ndị e tere mmanụ, ha na ndị ọzọ nile so ná ndị e tere mmanụ, na-ebi n’ebe ndị dị n’eluigwe n’ụzọ ime mmụọ malite n’oge e ji mmụọ nsọ kaa ha akara dị ka ihe àmà nke ihe nketa eluigwe ha. (Ndị Efesọs 2:6, 7) Otú ọ dị, Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị na a ga-esite n’etiti ndị ahụ yiri kpakpando nwee ndị dapụrụ n’ezi ofufe, ndị na-arọ òtù, ndị ga-eduhie ìgwè atụrụ ahụ. (Ọrụ 20:29, 30) Ekwesịghị ntụkwasị obi dị otú ahụ ga-arụpụta oké ndapụ n’ezi ofufe, ndị okenye ndị a dapụworonụ ga-emejupụtakwa onye ahụ na-emebi iwu nke ọtụtụ ndị mejupụtara, onye ga-ebuli onwe ya elu gaa n’ọnọdụ yiri nke Chineke n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3, 4) E mezuru ịdọ aka ná ntị Pọl mgbe ndị ụkọchukwu Krisendọm pụtara n’ebe a ga-ahụ ha anya n’ime ụwa. E sere onyinyo nke ìgwè ndị a n’ụzọ ziri ezi dị ka ‘oké kpakpando nke na-ere ọkụ dị ka ọwa.’

  • Ihe Otiti Ndị Jehova Ga-eti Krisendọm
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • b Ọ bụ ezie na kpakpando asaa ahụ ndị dị n’aka nri Jisọs sere onyinyo ndị nlekọta e tere mmanụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst, ndị okenye nọ n’ihe ka ọtụtụ n’ihe karịrị 100,000 ọgbakọ dị n’ụwa taa so n’oké ìgwè mmadụ ahụ. (Mkpughe 1:16; 7:9) Gịnị bụ ọnọdụ ha? Ebe ha na-enweta nhọpụta ha site ná mmụọ nsọ site n’aka òtù ohu ahụ e tere mmanụ nke kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nweekwa uche, a pụrụ ikwu na ndị a nọ n’okpuru aka nri nduzi nke Jisọs, n’ihi na ha bụkwa ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru. (Aịsaịa 61:5, 6; Ọrụ 20:28) Ha na-akwado “kpakpando asaa” ahụ n’ihi na ha na-eje ozi n’ebe ụmụnna e tere mmanụ ndị ruru eru na-anọghị ya.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya