-
Baịbụl Bụ Okwu Chineke Gwara AnyịNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
2. Olee ndị Baịbụl ga-abara uru?
Ozi ọma dị na Baịbụl nwere ike ịbara mmadụ niile uru, ya bụ, “mba niile na ebo niile na ndị na-asụ asụsụ niile na agbụrụ niile.” (Gụọ Mkpughe 14:6.) E nwere Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ. Ọ bụ Chineke mere ka ọ dị otú ahụ. N’agbanyeghị ebe ndị mmadụ bi ma ọ bụ asụsụ ha na-asụ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ onye ọ bụla nọ n’ụwa taa na-anụ ihe Baịbụl kwuru.
-
-
Olee Ihe Bụ́ Eziokwu Gbasara Ndị Mmụọ Ozi?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
4. Ndị mmụọ ozi na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta gbasara Jehova
Ndị mmụọ ozi Chineke anaghị ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ma, ha nwere ike iduga ndị ohu Chineke na nke ndị chọrọ ịnụ Okwu ya. Gụọnụ Mkpughe 14:6, 7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị mmụọ ozi nyere anyị aka n’ozi ọma anyị na-ekwusa?
Obi ọ̀ dị gị ụtọ ugbu a ị mụtara na ndị mmụọ ozi nwere ike iduga gị na nke ndị chọrọ ịnụ ihe Baịbụl na-ekwu? Maka gịnị?
-