Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 36 p. 258-266
  • E Bibie Obodo Ukwu Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Bibie Obodo Ukwu Ahụ
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Babilọn Ukwu ahụ Adaa
  • Ndalata nke Babilọn Ukwu Ahụ
  • Mmanya nke Na-akpali Agụụ Ịkwa Iko
  • Ndị Ahịa
  • “Ndị nke M, Sinụ n’Ime Ya Pụta”
  • Okpukpe Ụgha—A Hụ Mbibi Ya Dị Ịrịba Ama Tupu O Mee
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Iru Újú na Ịṅụrị Ọṅụ ná Mbibi nke Babilọn
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • “Babilọn” Na-anọghị ná Ntụkwasị Obi Na-eche Mbibi Ihu
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Gịnị Bụ Babịlọn Ukwu Ahụ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 36 p. 258-266

Isi nke 36

E Bibie Obodo Ukwu Ahụ

Ọhụụ 12—Mkpughe 18:1–19:10

Isiokwu: Ọdịda na mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ; ịma ọkwá nke ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ

Oge Mmezu ya: Malite na 1919 ruo mgbe oké mkpagbu ahụ gasịrị

1. Gịnị ga-aka akara mmalite nke mkpagbu ukwu ahụ?

IHE mberede, ihe na-awụ ibubo n’ahụ, oké mbibi—otú ahụ ka ọdịda nke Babilọn Ukwu ahụ ga-adị! Ọ ga-abụ otu n’ime ihe omume ndị kasị akpata mbibi n’akụkọ ihe mere eme nile, na-aka akara mmalite nke ‘mkpagbu ukwu nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo ugbu a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.’—Matiu 24:21.

2. Ọ bụ ezie na alaeze dị iche iche nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị ebiliwo, daakwa, ụdị alaeze dị aṅaa nọgideworo na-adị?

2 Okpukpe ụgha adịruwo ogologo oge. Ọ nọgidewo n’enweghị nkwụsịtụ ọ bụla kemgbe oge Nimrọd ahụ agụụ mwụfu ọbara na-agụsi ike, bụ́ onye megidere Jehova wee dupụ ụmụ mmadụ iwu Ụlọ Elu nke Bebel. Mgbe Jehova gwagburu asụsụ nke ndị nnupụisi ahụ wee mee ka ha gbasasịa n’elu ala, okpukpe ụgha nke Babilọn so ha jee ebe nile ha jere. (Jenesis 10:8-10; 11:4-9) Eri mgbe ahụ, alaeze ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche ebiliwo, daakwa, ma okpukpe Babilọn anọgidewo. O werewo ọdịdị na oyiyi dị iche iche, na-aghọ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ e buru n’amụma. Akụkụ ya kasị pụta ìhè bụ Krisendọm, nke bilitere site ná njikọ nke ozizi Babilọn oge ochie na ozizi “ndị Kraịst” si n’ezi ofufe dapụ. N’ihi na Babilọn Ukwu ahụ adịtewo anya nke ukwuu, ọ na-esiri ọtụtụ mmadụ ike ikwere na a ga-emesịa bibie ya.

3. Olee ụzọ Mkpughe si mesie ya ike na okpukpe ụgha aghaghị ịda ada?

3 N’ihi ya, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị na Mkpughe ga-emesi ọdịda nke okpukpe ụgha ike site n’inye anyị ezi nkọwa abụọ nke ọdịda ya na ihe omume ndị ọzọ ndị ga-eduje n’ịtọgbọrọ n’efu ya. Anyị ahụworị ya dị ka “oké nwanyị ahụ na-akwa iko” nke ndị hụrụ ya n’anya na mbụ site n’òtù ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị mesịrị bibie. (Mkpughe 17:1, 15, 16) Ugbu a, n’ime ọhụụ ọzọkwa, anyị gaje ịhụ ya dị ka otu obodo, bụ́ ihe Babilọn oge ochie ahụ nọchiri anya ya n’ụzọ okpukpe.

Babilọn Ukwu ahụ Adaa

4. (a) Olee ọhụụ ọzọ Jọn hụrụ? (b) Olee ụzọ anyị pụrụ isi mara onye mmụọ ozi ahụ bụ, n’ihi gịnịkwa ka o ji kwesị ekwesị ka ọ maa ọkwá ọdịda Babilọn Ukwu ahụ?

4 Jọn gara n’ihu n’ihe ndekọ ahụ, na-akọrọ anyị, sị: “Mgbe ihe ndị a gasịrị m wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, na-enwe ike ukwu; e wee site n’ebube ya nye ụwa ìhè. O wee were olu ike tie mkpu, sị, Ọ dawo, ọ dawo, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ.” (Mkpughe 18:1, 2a) Nke a bụ nke ugbo abụọ ya Jọn na-anụ mkpọsa ahụ sitere n’ọnụ mmụọ ozi. (Lee Mkpughe 14:8.) Otú ọ dị, n’oge a, e mesiri ịdị mkpa ya ike site n’ịdị ebube nke mmụọ ozi ahụ sitere n’eluigwe, n’ihi na ebube ya nyere elu ụwa dum ìhè! Ònye ka ọ pụrụ ịbụ? Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Ezikiel onye amụma, mgbe ọ na-akọ banyere otu ọhụụ eluigwe, kwuru na “ụwa nwukwara enwu site n’ebube ya [Jehova].” (Ezikiel 43:2) Nanị mmụọ ozi nke pụrụ inwu enwu site n’ebube nke a pụrụ iji tụnyere nke Jehova ga-abụ Onyenwe anyị Jisọs, onye bụ “nnwupụ nke ebube [Chineke] na onyinyo nke ụdị ya.” (Ndị Hibru 1:3) Na 1914, Jisọs ghọrọ Eze eluigwe, kemgbe ahụkwa ọ nọwo na-enwe ike n’ebe ụwa dị dị ka Eze na Onyeikpe ya na Jehova na-arụkọ ọrụ. Ya mere, ọ dabara nnọọ nke ọma na ọ bụ ya kwesịrị ime mkpọsa banyere ọdịda nke Babilọn Ukwu ahụ.

5. (a) Olee ndị ka mmụọ ozi ahụ ji na-eme ihe n’ịkpọsa ọdịda Babilọn Ukwu ahụ? (b) Mgbe ikpe ikpe malitere n’isi ndị ahụ na-asị na ha bụ “ụlọ Chineke,” olee otú ihe si gaara Krisendọm?

5 Olee ndị ka mmụọ ozi nke a nwere oké ike ji na-eme ihe n’ịkpọsa ozi nke a dị ịtụnanya n’ihu ụmụ mmadụ? Lee, ọ bụ otu ndị ahụ a tọhapụrụ n’ihi ọdịda ahụ, ndị fọdụrụ e tere mmanụ nọ n’elu ala, bụ́ òtù Jọn ahụ. Site na 1914 ruo 1918, ndị a tara ahụhụ dị ukwuu n’aka Babilọn Ukwu ahụ, ma na 1918, Onyenwe anyị Jehova na “onyeozi ọgbụgba ndụ [Abraham]” ya, bụ́ Jisọs Kraịst, malitere ikpe ikpe ‘site n’ụlọ Chineke,’ bụ́ ndị ahụ na-ekwu na ha bụ ndị Kraịst. Otú a, a malitere ikpe Krisendọm nke si n’ezi ofufe dapụ ikpe. (Malakaị 3:1; 1 Pita 4:17) Oké ikpe ọmụma ọbara nke o nwetara n’oge agha ụwa mbụ ahụ, aka o tinyere n’ịkpagbu Ndịàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na ụkpụrụ okwukwe ya nile nke Babilọn enyereghị ya aka n’oge ikpe ahụ; ọ dịghịkwa akụkụ ọ bụla nke Babilọn Ukwu ahụ kwesịrị inweta nkwado Chineke.—Tụlee Aịsaịa 13:1-9.

6. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Babilọn Ukwu ahụ dara na 1919?

6 Ya mere, ka ọ na-erule afọ 1919, Babilọn Ukwu ahụ adawo, na-emeghe ụzọ ịtọhapụ ndị Chineke, weghachikwa ha, n’otu ụbọchị dị ka a pụrụ ikwu ya, bịa n’ala ha nke inwe ihe ịga nke ọma n’ụzọ ime mmụọ. (Aịsaịa 66:8) N’afọ ahụ, Jehova Chineke na Jisọs Kraịst, bụ́ Daraịọs ahụ Ka Ukwuu nakwa Saịrọs ahụ Ka Ukwuu, eduziwo ihe ndị na-emenụ ka okpukpe ụgha ghara inwekwa ike ijigide ndị Jehova. Ọ pụghịkwa igbochi ha ijere Jehova ozi na ime ka ndị nile chọrọ ịnụ mara na Babilọn Ukwu ahụ nke yiri nwanyị na-akwa iko na-eche mbibi ihu, na oge dịkwa nso maka iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta!—Aịsaịa 45:1-4; Daniel 5:30, 31.

7. (a) Ọ bụ ezie na e bibighị Babilọn Ukwu ahụ na 1919, olee ụzọ Jehova si lee ya anya? (b) Mgbe Babilọn Ukwu ahụ dara na 1919, gịnị ka ọ rụpụtaara ndị Jehova?

7 N’eziokwu, e bibighị Babilọn Ukwu ahụ na 1919—dịkwa ka a na-ebibighị obodo Babilọn oge ochie ahụ n’afọ 539 T.O.A. mgbe ọ dabara n’aka usuu ndị agha nke Saịrọs onye Peasia. Ma site n’ụzọ Jehova si ele ihe anya, òtù ahụ adawo. A mawo ya ikpe, ọ na-echerezi mmezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ya; n’ihi ya, okpukpe ụgha apụghịkwa ijide ndị Jehova ná ndọta n’agha. (Tụlee Luk 9:59, 60.) A tọhapụrụ ndị a ije ozi dị ka ohu kwesịrị ntụkwasị obi, nweekwa uche, nke Onyenwe anyị n’ikesa nri ime mmụọ n’oge ya. Ha anatawo mkpebi ahụ nke bụ “I mere nke ọma,” e zipụkwara ha ịbanyeghachi n’ọrụ Jehova.—Matiu 24:45-47; 25:21, 23; Ọrụ 1:8.

8. Ihe omume dị aṅaa ka onye nche ahụ a kọrọ akụkọ ya n’Aịsaịa 21:8, 9 na-akpọsa, olee ndị taa ka onye nche ahụ sekwara onyinyo ha?

8 N’ọtụtụ puku afọ gara aga, Jehova jiri ndị amụma ndị ọzọ mee ihe ibu amụma banyere oké ihe omume nke a. Aịsaịa kwuru okwu banyere onye nche nke ‘na-akpọ dị ka ọdụm, sị, Jehova, n’elu ụlọ nche ka mụ onwe m na-eguzo mgbe nile n’ehihie, na nche m ka a na-eme ka mụ onwe m guzo n’abalị nile.’ Oleekwa ihe onye nche ahụ na-ahụta wee jiri anya ike yiri nke ọdụm na-akpọsa? Ọ bụ nke a: “Ọ dawo, Babilọn adawo; ọzọ, arụsị nile a pịrị apị nke chi ya nile ka e [Jehova] tipịaruworo ala.” (Aịsaịa 21:8, 9) N’ụzọ dị nnọọ mma, onye nche nke a sere onyinyo òtù Jọn ahụ nke mụ anya taa, ka ọ na-eji magazin Ụlọ Nche na akwụkwọ ọchịchị Chineke ndị ọzọ na-eme ihe ịgbasa ozi nke bụ na Babilọn adawo.

Ndalata nke Babilọn Ukwu Ahụ

9, 10. (a) Mmetụta nke okpukpe Babilọn enwewo ndalata dị aṅaa eri mgbe Agha Ụwa nke Mbụ gasịrị? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka mmụọ ozi ahụ dị oké ike si kọwaa ọnọdụ Babilọn Ukwu ahụ nke ịbụ ihe daworo ada?

9 Ọdịda Babilọn oge ochie ahụ dara na 539 T.O.A. bụ mmalite nke ndalata were ogologo oge, nke jedebere n’ịtọgbọrọ n’efu ya. N’otu aka ahụ, kemgbe agha ụwa nke mbụ, mmetụta nke okpukpe Babilọn adalatawo n’ụzọ pụtara ìhè gburugburu ụwa. Na Japan, a machibidoro iwu ofufe ndị Shinto na-efe onye ọchịchị mgbe agha ụwa nke abụọ gasịrị. Na China, gọọmenti ndị Kọmunist na-elekọta nhọpụta na ọrụ nile metụtara okpukpe. N’ebe ugwu Europe nke ndị Protestant, ọtụtụ ndị aghọwo ndị na-enwekwaghị mmasị n’okpukpe. Nkewa na enweghị nkwekọrịta nke ndị òtù ya ebelatawokwa ike Chọọchị Roman Katọlik nwere n’ụwa nile.—Tụlee Mak 3:24-26.

10 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe omume ndị a nile socha ná ‘ntakọsị nke osimiri Yufretis’ iji kwadebe maka mbuso agha a gaje ibuso Babilọn Ukwu ahụ n’isi nso. E gosipụtakwara ‘ntakọsị’ nke a n’ọkwa ahụ popu mara n’October 1986 nke bụ na chọọchị ahụ aghaghị “ịmaliteghachi ịrịọ arịrịọ”—n’ihi oké mfu ego ọ na-enwe. (Mkpughe 16:12) Karịsịa kemgbe 1919, e kpughewo Babilọn Ukwu ahụ n’ihu ọha dị ka ala tọgbọrọ n’efu n’ụzọ ime mmụọ, dị nnọọ ka mmụọ ozi ahụ dị oké ike mara ọkwa n’ebe a, sị: “Ọ ghọwokwa ebe obibi nke ndị mmụọ ọjọọ, na ụlọ mkpọrọ nke mmụọ nile ọ bụla na-adịghị ọcha, na ụlọ mkpọrọ nke nnụnụ nile ọ bụla nke na-adịghị ọcha nke a kpọwokwara asị.” (Mkpughe 18:2b) N’oge na-adịghị anya, ọ gaje ịghọ ala tọgbọrọ n’efu n’ụzọ nkịtị, tọgbọrọ nkịtị dị ka mkpọmkpọ ebe nile nke Babilọn dị n’Iraq nke narị afọ nke 20 nke a.—Leekwa Jeremaịa 50:25-28.

11. N’echiche dị aṅaa ka Babilọn Ukwu ahụ ghọworo “ebe obibi nke ndị mmụọ ọjọọ” na ‘ụlọ mkpọrọ nke mmụọ nile na-adịghị ọcha na nnụnụ nile na-adịghị ọcha’?

11 O yiri ka okwu ahụ bụ “ndị mmụọ ọjọọ” n’ebe a sere onyinyo nke okwu ahụ bụ “mmụọ ọjọọ ndị yiri ewu” (se‘i·rimʹ) nke dị ná nkọwa Aịsaịa nyere banyere Babilọn ahụ dara ada: “Ma anụ ọhịa dị iche iche bi n’ala kpọrọ nkụ ga-amakpu n’ebe ahụ; ụlọ ha ga-ejupụtakwa n’okwukwu; enyi nnụnụ ga-ebikwa n’ebe ahụ, [mmụọ ọjọọ ndị yiri ewu, NW] ga-amalikwa elu n’ebe ahụ.” (Aịsaịa 13:21) Ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị ezo aka n’ebe mmụọ ọjọọ nkịtị dị kama n’ebe anụ ọhịa ndị gbara ajị nke ukwuu, ndị na-ebi n’ọzara dị, ndị na-eme ka ndị hụrụ ha cheta ndị mmụọ ọjọọ. Ná mkpọmkpọ ebe nile nke Babilọn Ukwu ahụ, ịdị adị nke anụmanụ ndị dị otú a n’ụzọ ihe atụ, tinyere ikuku na-adịghị efegharị efegharị, ikuku nsí (“nkupụ ume na-adịghị ọcha”) na nnụnụ ndị na-adịghị ọcha, na-egosipụta ọnọdụ ya nke ịbụ ebe nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ. Ọ dịghị olileanya ndụ ọ bụla ọ na-esetịpụrụ ihe a kpọrọ mmadụ.—Tụlee Ndị Efesọs 2:1, 2.

12. Olee ụzọ ọnọdụ Babilọn Ukwu ahụ si kwekọọ n’amụma Jeremaịa nke dị n’isi nke 50?

12 Ọnọdụ ya kwekọkwara n’amụma Jeremaịa: “Mma agha dị n’ahụ ndị Kaldea, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), na n’ebe ndị bi na Babilọn nọ, na n’ebe ndị isi ya nọ, na n’ebe ndị ya maara ihe nọ. . . . Ọkpụkpọ nkụ dị n’ebe mmiri ya nile dị, ha ga-atakwa ata: n’ihi na ala arụsị dị iche iche a pịrị apị ka ọ bụ, ha jikwa ihe egwu nile ha wịa ara. N’ihi nke a ka anụ ọhịa dị iche iche nke bi n’ala kpọrọ nkụ ga-ebi n’ebe ahụ, ha na anụ ọhịa nke na-ebe ebe, enyi nnụnụ ga-ebikwa n’ebe ahụ: mmadụ agaghị ebikwa n’ime ya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi; ọ gaghị abụkwa ebe obibi ruo ọgbọ nile.” Ikpere arụsị na ịgụ ekpere ka egwú apụghị ịzọpụta Babilọn Ukwu ahụ site ná nkwụghachi ụgwọ a ga-enye ya nke yiri mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.—Jeremaịa 50:35-40.

Mmanya nke Na-akpali Agụụ Ịkwa Iko

13. (a) Olee ụzọ mmụọ ozi ahụ dị oké ike si dọrọ uche gaa n’ịdị ukwuu nke ịkwa iko nke Babilọn Ukwu ahụ? (b) Ndụ ịkwa iko dị aṅaa nke jupụtara na Babilọn oge ochie ka a na-ahụtakwa na Babilọn Ukwu ahụ?

13 Ihe ọzọ mmụọ ozi ahụ siri oké ike mere bụ ịkpọtụ uche n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ịkwa iko nke Babilọn Ukwu ahụ, na-ekwu, sị: “N’ihi na mba nile adawo site ná mmanya nke [na-akpali agụụ, NW] nke ịkwa iko ya;a ndị eze ụwa sokwara ya kwaa iko, ndị ahịa nke ụwa bụrụ ọgaranya site n’ike nke inupụ isi ya.” (Mkpughe 18:3) O dubatawo mba nile nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ nile na-adịghị ọcha nke okpukpe ya. Na Babilọn oge ochie, dị ka onye Grik na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Herodotus si kọọ, a chọrọ ka nwa agbọghọ ọ bụla jiri ọnọdụ amaghị nwoke ya gbaa akwụna n’ofufe a na-efe n’ụlọ nsọ. A ka na-egosipụta mmerụ dị oké njọ n’ụzọ mmekọahụ ruo taa n’ihe ọkpụkpụ okpukpe ndị ahụ agha mebisịworo, ndị dị n’Angkor Wat nke dị na Kampuchea nakwa ndị dị n’ụlọ nsọ dị iche iche dị na Khajuraho, India, ndị na-egosi chi ndị Hindu ahụ bụ Vishnu ka ọnọdụ mmekọahụ dị iche iche gbara ya gburugburu. N’ime United States, mkpughe ndị mere ka ụwa maa jijiji e kpughere omume na-adịghị ọcha nke ndị okwuchukwu TV na 1987, nakwa na 1988, tinyekwara mkpughe nke omume zuru ebe nile nke ndị nwoke idina nwoke ibe ha n’etiti ndị ụkọchukwu okpukpe, na-egosi na ọbụna Krisendọm na-agbachi nkịtị ka ịkwa iko gabigara ókè nke na-awụ akpata oyi dịgide n’etiti ha. Ma n’agbanyeghị nke a, mba nile adabawo n’ụdị ịkwa iko nke siri ike ọbụna karị.

14-16. (a) Mmekọrịta dị aṅaa na-ezighị ezi n’ụzọ ime mmụọ nke okpukpe na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bilitere n’Itali nke ndị ọchịchị Fascist? (b) Mgbe ndị Itali wabatara n’Abyssinia, okwu dịgasị aṅaa ka ndị bishọp Chọọchị Roman Katọlik kwuru?

14 Anyị atụleworị njikọ ahụ na-ezighị ezi dị n’etiti okpukpe na ọchịchị, bụ́ nke mere ka Hitler mabata n’ike ọchịchị na Nazi Germany. Mba ndị ọzọ takwara ahụhụ n’ihi ntinye aka okpukpe na-etinye n’ihe omume nke ụwa. Dị ka ihe atụ: N’Itali nke dị n’okpuru ọchịchị ndị Fascist, na February 11, 1929, Mussolini na Cardinal Gasparri bịanyere aka n’akwụkwọ nkwekọrịta Lateran Treaty ahụ, na-eme ka Vatican City bụrụ mba kwụụrụ onwe ya. Pope Pius nke Iri na Otu kwupụtara na ya “ewerewo Itali nyeghachi Chineke, werekwa Chineke nyeghachi Itali.” Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Tụlee ihe mere mgbe afọ isii gasịrị. N’October 3, 1935, Itali wabatara n’Abyssinia, na-ekwu na mba ahụ bụ “ala na-eme ihe ike, ndị ka na-agba ohu.” Ònye n’ezie bụ onye na-eme ihe ike? Chọọchị Katọlik ọ̀ katọrọ omume aka ike nke Mussolini? Ka popu ahụ nọ na-ekwu okwu ndị na-esi ike nghọta, ndị bishọp ya nọ na-eme nnọọ ihe pụtara ìhè n’ịgọzi usuu ndị agha nke “ala nna” ha bụ Itali. N’akwụkwọ bụ The Vatican in the Age of the Dictators, Anthony Rhodes kọrọ, sị:

15 “N’akwụkwọ Ọzụzụ Atụrụ ya nke akara ụbọchị ya bụ October 19 [1935], onye Bishọp nke Udine [Itali] dere, sị, ‘Oge erubeghị o kwesịghịkwa ekwesị ka anyị kwupụta ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi banyere okwu ahụ. Ọrụ dịịrị anyị dị ka ndị Itali, karịakwa dị ka ndị Kraịst, bụ inye aka n’ihe ịga nke ọma nke ndị agha anyị.’ Onye Bishọp nke Padua dere n’October 21, sị, ‘N’oge ihe isi ike nke anyị nọ na ya ugbu a, anyị na-arịọ unu ka unu nwee okwukwe ná ndị ndú anyị na n’usuu ndị agha anyị.’ N’October 24, onye Bishọp nke Cremona doro flag òtù ndị agha ole na ole nsọ, wee sị: ‘Ka ngọzi Chineke dịkwasị ndị agha ndị a ndị ga-anọ n’ala Africa merie ala ọhụrụ ebe a ga-anọ zụlite ọkà ihe ọmụma ndị Itali, wee si otú ahụ na-eweta ha bịa n’omenala ndị Rom na nke ndị Kraịst. Ka Itali guzoghachikwa ọzọ dị ka ndị na-akụziri ụwa dum àgwà ndị Kraịst.’”

16 A wakwasịrị Abyssinia n’ike, na-enwe ngọzi nke ndị ndú okpukpe Roman Katọlik. Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla ndị a pụrụ isi kwuo na ha yiri Pọl onyeozi n’ịbụ onye ‘dị ọcha n’ebe ọbara mmadụ nile dị’?—Ọrụ 20:26.

17. Olee ụzọ Spain si taa ahụhụ n’ihi na ndị ndú okpukpe ya enweghị ike ‘ịkpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma oge’?

17 Tụkwasị na Germany, Itali, na Abyssinia, otu mba ọzọ nke ịkwa iko Babilọn Ukwu ahụ metụtaworo—Spain. Otu n’ime ihe ndị kpatara Agha Obodo nke 1936-1939 ná mba ahụ bụ mgbalị ọchịchị a họpụtara ahọpụta mere iji belata ike dị ukwuu Chọọchị Roman Katọlik nwere. Mgbe agha ahụ malitere, onyendú usuu ndị agha mgbanwe ọchịchị nke ọchịchị Fascist ndị Katọlik, bụ́ Franco, kọwara onwe ya dị ka “Ọchịagha Ndị Kraịst n’Agha Ntụte Dị Nsọ,” bụ́ ùtú aha nke o mesịrị kwụsị iji na-eme ihe. Ọtụtụ narị puku ndị Spain nwụrụ n’agha ahụ. E wezụgakwa nke a, dị ka otu ngụkọ e leziri anya mee ka ọ ghara ịgabiga ókè si kọọ, ndị òtù Nationalist nke Franco egbuwo 40,000 ndị òtù Popular Front, ebe ndị nọ n’òtù nke abụọ ahụ gbuworo 8,000 ndị nọ n’ọkwá okpukpe dị iche iche—ndị mọnk, ndị ụkọchukwu, ndị nọn, na ndị a ka nabatara ọhụrụ n’ọkwá okpukpe. Otú ahụ ka ọ dị bụ ihe egwu na ọnọdụ ọjọọ na-adị n’agha obodo, na-egosipụta amamihe dị n’ịgbaso okwu Jisọs nke bụ: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya: n’ihi na mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) Lee ka o si bụrụ ihe jọgburu onwe ya na Krisendọm na-etinye aka ná mwụfu ọbara n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu otú a! N’ezie, ndị ụkọchukwu ya adawo nnọọ ada ‘n’ịkpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma oge’!—Aịsaịa 2:4.

Ndị Ahịa

18. Olee ndị bụ “ndị ahịa nke ụwa”?

18 Olee ndị bụ “ndị ahịa nke ụwa”? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị ga-akpọ ha ndị na-azụ na-ere, ndị eze ahịa, ndị na-eji anya nkà na-agba mgbere n’oké azụmahịa nke oge a. Nke a adịghị egosi na ọ bụ ihe na-ezighị ezi itinye aka n’azụmahịa nke iwu na-emegideghị. Bible nyere ndị azụmahịa ndụmọdụ amamihe dị na ya, na-adọ aka ná ntị megide emeghị ihe n’eziokwu, inwe anyaukwu, na ihe ndị yiri ha. (Ilu 11:1; Zekaraịa 7:9, 10; Jemes 5:1-5) Ihe na-eweta uru karị bụ “nsọpụrụ Chineke, ya na inwezu ihe nile dị mkpa.” (1 Timoti 6:6, 17-19) Otú ọ dị, ụwa Setan adịghị agbaso ụkpụrụ ezi omume. Mmerụ jupụtara n’ebe nile. A na-ahụta ya n’okpukpe, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị—nakwa n’oké azụmahịa. Site n’oge ruo n’oge, usoro mgbasa akụkọ na-ekpughe akụkọ ọjọọ dị iche iche ndị dị ka ndị nọ n’ọkwá ọchịchị dị elu irikpọ ego ọha, ire na ịzụ ngwá agha n’ụzọ iwu na-akwadoghị.

19. Eziokwu dị aṅaa banyere ọnọdụ akụ na ụba nke ụwa na-enye aka ịkọwa ihe mere ndị ahịa nke ụwa ji bụrụ ndị e kwesịrị ịkpọtụ aha na-adịghị mma n’akwụkwọ Mkpughe?

19 Ego dị n’ịzụ na ire ngwá agha anọwo na-arị elu gabiga $1,000,000,000,000 kwa afọ, ebe ọtụtụ narị nde ụmụ mmadụ na-adịghị enweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ. Nke ahụ dị njọ nke ukwuu. Ma, o yiri ka ngwá agha ọ̀ bụ otu ihe bụ isi e ji akwado usoro akụ na ụba ụwa. N’April 11, 1987, otu ihe odide dị n’akwụkwọ Spectator nke London kọrọ, sị: “N’ịgụ nanị ụlọ ọrụ ndị o metụtara kpọmkwem, e nwere 400,000 mmadụ ndị e were n’ọrụ n’ime U.S., na 750,000 n’ime Europe n’ọrụ ndị metụtara ngwá agha. Ma n’ụzọ dị nnọọ mgbagwoju anya, ka ọnọdụ imepụta ngwá agha n’usoro ọha mmadụ na nke akụ na ụba nọ na-amụba, a dịghị echebakwa echiche hie nne n’ajụjụ ahụ dị mkpa nke bụ ma ndị ahụ na-emepụta ya hà nọkwa ná nchebe nke ọma.” A na-erite uru ego dị ukwuu ka a nọ na-ere bọmbụ na ngwá agha dị iche iche gburugburu ụwa, ọbụna na-eresị ndị pụrụ ịghọ ndị iro nke ndị ahụ na-ere ha. N’ọdịnihu, bọmbụ ndị ahụ pụrụ iji oké ire ọkụ bịaghachi ibibi ndị ahụ na-ere ha. Lee nnọọ ihe mgbagwoju anya nke a bụ! Tụkwasị na nke a ime wuru wuru nke e jikọtara ya na azụmahịa ngwá agha. N’ime United States nanị, dị ka akwụkwọ Spectator ahụ si kọọ, “kwa afọ ngwá agha na ngwá ọrụ ọnụ ego ya ruru $900 nde na-efunarị ụlọ ọrụ Pentagon n’ụzọ ha na-apụghị ịkọwa.” Ọ bụghị ihe ijuanya na a kpọrọ ndị ahịa nke ụwa aha ọjọọ ná Mkpughe!

20. Ihe atụ dị aṅaa na-egosi aka okpukpe na-etinye n’azụmahịa wuru wuru?

20 Dị ka mmụọ ozi ahụ dị ebube buru n’amụma, okpukpe etinyewo aka n’ụzọ miri emi n’aghụghọ azụmahịa ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, aka Vatican dị n’ọdịda nke ụlọ akụ Banco Ambrosiano ndị Itali na 1982. A nọwo na-eleba anya n’okwu ikpe ahụ n’ime afọ ndị 1980 nile, ajụjụ ahụ nke a na-azabeghị bụkwa: Olee ebe ego ahụ jere? Na February 1987, ndị majistreti nke Milan nyere akwụkwọ na-enye ikike ka e jee jide ndị ụkọchukwu atọ nke Vatican, gụnyere otu onye achịbishọp bụ onye America, n’ihi ebubo e boro ha nke bụ na ha nyere aka iji mechie ụlọ ọrụ ahụ n’ụzọ aghụghọ, ma mba Vatican jụrụ arịrịọ a rịọrọ ha ịkpọpụta ndị a. Na July 1987, n’agbanyeghị oké mkpu mkpesa ndị mmadụ na-eti, ụlọikpe kasị elu n’Itali bụ Court of Appeals kwuru na akwụkwọ ndị ahụ na-enye ikike njide adịkwaghị irè, na-adabere n’otu nkwekọrịta ochie dị n’etiti mba Vatican na gọọmenti Itali.

21. Ànyị si aṅaa mara na Jisọs enweghị ihe ọ bụla jikọtara ya na azụmahịa ndị a na-enyo enyo nke oge ya, ma gịnị ka anyị na-ahụta taa n’ihe banyere okpukpe Babilọn?

21 Jisọs ò nwere njikọ ọ bụla n’etiti ya na omume azụmahịa ndị a na-enyo enyo n’oge ya? Ee e. O nweghị ọbụna otu ibe ala, n’ihi na o ‘nweghị ebe ịtọgbọ isi ya.’ Jisọs tụụrụ otu onye ọchịchị bara ọgaranya nke bụ okorobịa aro, sị: “Ree ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke i nwere, kenye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ n’eluigwe: bịakwa, soo m.” Nke ahụ bụ ndụmọdụ dị mma, n’ihi na ọ gaara emeworị ka o nwere onwe ya pụọ ná nchekasị nile metụtara azụmahịa. (Luk 9:58; 18:22) N’ụzọ na-eyighị nke ahụ, okpukpe Babilọn na-enwekarị njikọ na-adịghị mma n’anya n’etiti ya na oké azụmahịa. Dị ka ihe atụ, na 1987, akwụkwọ akụkọ Albany Times Union kọrọ na onye na-elekọta okwu ego na dayọses ukwu nke chọọchị Katọlik dị na Miami, Florida, U.S.A., kwetara na chọọchị ahụ nwere òkè n’ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ngwá agha nuklia, sinima ndị na-egosi mmekọahụ, na siga.

“Ndị nke M, Sinụ n’Ime Ya Pụta”

22. (a) Gịnị ka otu olu sitere n’eluigwe na-asị? (b) Gịnị dujere ndị Chineke n’ịṅụrị ọṅụ n’afọ 537 T.O.A. na n’afọ 1919 O.A.?

22 Okwu ọzọ Jọn kwuru na-ezo aka ná mmezu ọzọ nke usoro amụma ahụ: “M wee nụ olu ọzọ ka ọ na-esi n’eluigwe daa, sị, Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile.” (Mkpughe 18:4) Amụma ndị metụtara ọdịda Babilọn oge ochie n’ime Akwụkwọ Nsọ Hibru gụnyekwara iwu ahụ Jehova nyere ndị ya, bụ: ‘Sinụ n’etiti Babilọn gbapụ.’ (Jeremaịa 50:8, 13) N’otu aka ahụkwa, n’iburu n’uche ịtọgbọrọ n’efu na-abịanụ nke Babilọn Ukwu ahụ, a na-agba ndị Chineke ume ugbu a ka ha gbapụ. N’afọ 537 T.O.A., ohere nke ịgbapụ site na Babilọn kpatara ọṅụ dị ukwuu n’akụkụ ndị Israel kwesịrị ntụkwasị obi. N’otu ụzọ ahụkwa, ntọhapụ a tọhapụrụ ndị Chineke site ná ndọta n’agha nke Babilọn n’afọ 1919 dujere n’ịṅụrị ọṅụ. (Mkpughe 11:11, 12) Eri mgbe ahụkwa, ọtụtụ nde ndị ọzọ erubewo isi n’iwu ahụ e nyere ịgbapụ.

23. N’ụzọ dị aṅaa ka olu ahụ sitere n’eluigwe si mesie ya ike, bụ́ ịdị ngwa nke ịgbapụ site na Babilọn Ukwu ahụ?

23 Ọ̀ bụ n’ezie ihe dị oké ngwa ịgbapụ site na Babilọn Ukwu ahụ, na-akwụsị ịbụ onye òtù nke okpukpe ụwa, meekwa nkewa doro anya? Ọ dị otú ahụ, n’ihi na ọ dị mkpa ka anyị na-ele nnukwu òtù okpukpe nke a nọworo ogologo oge, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, anya dị ka Chineke si ele ya. O meghị ka okwu ya dị nro mgbe ọ kpọrọ ya oké nwanyị ahụ na-akwa iko. Ya mere, olu ahụ sitere n’eluigwe na-aga n’ihu ịkọrọ Jọn banyere onye akwụna nke a, sị: “N’ihi na mmehie ya nile rapakọọrọ n’otu ruo eluigwe, Chineke chetakwara ajọ omume ya nile. Nyeghachinụ ya ọbụna dị ka ya onwe ya nyeghachiri mmadụ, nyekwanụ ya okpukpu abụọ dị ka ọrụ ya nile dị: n’ime iko ahụ ọ gwara agwa, gwaaranụ ya okpukpu abụọ. Ka ha hà, bụ́ otuto o nyere onwe ya, na inupụ isi o nupụrụ, nyenụ ya mmekpa ahụ na iru újú hà otú ahụ: n’ihi na ọ na-asị n’obi ya, Ana m anọdụ dị ka eze nwanyị, abụghịkwa m nwanyị di ya nwụrụ, ọ dịghịkwa iru újú m ga-ahụ ma ọlị. N’ihi nke a ọ bụ n’otu ụbọchị ka ihe otiti ya nile ga-abịa, bụ́ ọnwụ, na iru újú, na ụnwụ; a ga-erechapụkwa ya n’ọkụ; n’ihi na ọ dị ike, bụ́ Onyenwe anyị Chineke, onye kpere ya ikpe.”—Mkpughe 18:5-8.

24. (a) Ndị Chineke aghaghị ịgbapụ site na Babilọn Ukwu ahụ iji zere gịnị? (b) Ndị ahụ na-agbapụghị site na Babilọn Ukwu ahụ na-eso ya ekerịta mmehie dịgasị aṅaa?

24 Okwu ndị ahụ siri nnọọ ike! Ya mere, ọ dị mkpa ime ihe. Jeremaịa gbara ndị Israel ume n’oge ya ka ha mee ihe, na-asị: “Sinụ n’etiti Babilọn gbalaga, . . . n’ihi na mgbe ịbọ ọ́bọ̀ ka ọ bụụrụ Jehova; mmeso obodo ahụ ka ya onwe ya na-akwụghachi ya. Sinụ n’etiti ya pụọ, unu ndị m, wepụganụ onwe unu n’otu n’otu n’iwe dị ọkụ nke Jehova.” (Jeremaịa 51:6, 45) N’otú aka ahụkwa, olu ahụ sitere n’eluigwe na-adọ ndị Chineke aka na ntị taa ka ha gbapụ site na Babilọn Ukwu ahụ ka ha wee ghara ịnata ụfọdụ n’ihe otiti ya nile. A nọ ugbu a na-akpọsa ikpe ọmụma Jehova ndị yiri ihe otiti n’isi ụwa nke a, gụnyere Babilọn Ukwu ahụ. (Mkpughe 8:1–9:21; 16:1-21) Ọ dị mkpa ka ndị Chineke doo onwe ha iche site n’okpukpe ụgha ma ọ bụrụ na ha onwe ha achọghị ịta ahụhụ ihe otiti nke a wee mesịa soro ya nwụọ. E wezụga nke a, ịnọgide n’ime òtù ahụ ga-eme ka ha kere òkè ná mmehie ya nile. Ikpe ahụ mara ya ga-amakwa ha, bụ́ nke ịkwa iko ime mmụọ na ịwụfu ọbara “nke ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.”—Mkpughe 18:24; tụlee Ndị Efesọs 5:11; 1 Timoti 5:22.

25. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndị Chineke si hapụ Babilọn oge ochie ahụ?

25 Ma olee ụzọ ndị Chineke na-esi esi na Babilọn Ukwu ahụ na-apụ? N’ihe banyere Babilọn oge ochie, ndị Juu aghaghị iji ụkwụ ha site n’obodo Babilọn gaa ogologo njem laghachi n’Ala Nkwa ahụ. Ma a chọrọ ihe karịrị nke ahụ. Aịsaịa gwara ndị Israel n’ụzọ amụma, sị: “Wezụganụ onwe unu, wezụganụ onwe unu, sinụ n’ebe ahụ pụọ, unu emetụla ihe rụrụ arụ: sinụ n’etiti ya pụọ: dịnụ ọcha, unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke Jehova.” (Aịsaịa 52:11) Ee, ha aghaghị ịgbakụta omume nile na-adịghị ọcha azụ nke okpukpe Babilọn, bụ́ nke pụrụ imetọ ofufe ha na-efe Jehova.

26. Olee ụzọ ndị Kraịst ahụ nọ na Kọrint si rube isi n’okwu ahụ bụ, ‘Sinụ n’ime ya pụọ, unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka’?

26 Pọl onyeozi hotara okwu Aịsaịa n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrint na-asị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu, n’ihi na unu na ha dị iche: n’ihi na olee nkekọ ezi omume na imebi iwu na-ekekọ? Ma ọ bụ olee nnwekọ ìhè na ọchịchịrị na-enwekọ? . . . N’ihi nke a sinụ n’etiti ha pụta, guzokwanụ iche: ka [Jehova, NW] kwuru, unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka.” Ọ dịghị mkpa ka ndị Kraịst ahụ bụ́ ndị Kọrint hapụ obodo Kọrint iji mezuo iwu ahụ. Otú ọ dị, n’ụzọ nkịtị ha aghaghị izere ụlọ nsọ nile na-adịghị ọcha nke okpukpe ụgha, dookwa onwe ha iche n’ụzọ ime mmụọ site n’ihe omume nile nke ndị ahụ na-ekpere arụsị. Na 1919, ndị Chineke malitere ịgbapụ site na Babilọn Ukwu ahụ n’ụzọ dị otú a, na-asachapụ site n’ahụ ha ihe nile fọdụrụ afọdụ ndị na-adịghị ọcha nke ozizi na omume. Otú a, ha nwere ike ijere ya ozi dị ka ndị ya e mere ka ha dị ọcha.—2 Ndị Kọrint 6:14-17; 1 Jọn 3:3.

27. Myirịta dịgasị aṅaa ka e nwere n’etiti ikpe ndị ahụ a mara Babilọn oge ochie na ndị a mara Babilọn Ukwu ahụ?

27 Ọdịda Babilọn oge ochie na omume e mesịrị mee ka ọ tọgbọrọ n’efu bụ ahụhụ dịịrị mmehie ya nile. “N’ihi na ikpe ya erutụwo eluigwe.” (Jeremaịa 51:9) Otú ahụkwa ka mmehie nile nke Babilọn Ukwu ahụ “rapakọọrọ n’otu ruo eluigwe,” nke mere na Jehova n’onwe ya ahụtawo ya. Ikpe mara ya n’ihi ikpe na-ezighị ezi, ikpere arụsị, ndụ na-adịghị ọcha, mmegbu, izu ohi, na igbu ọchụ. N’otu akụkụ, ọdịda Babilọn oge ochie bụ ịbọ ọ́bọ̀ maka ihe o meworo ụlọ nsọ Jehova na ndị na-efe ya ezi ofufe. (Jeremaịa 50:8, 14; 51:11, 35, 36) Ọdịda Babilọn Ukwu ahụ na mbibi a ga-emesị bibie ya bụkwa n’otu aka ahụ ngosipụta nke ịbọ ọ́bọ̀ maka ihe o meworo ndị na-efe ezi ofufe n’ime ọtụtụ narị afọ gaworo aga. N’eziokwu, mbibi ikpeazụ ya bụ mmalite nke “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere.”—Aịsaịa 34:8-10; 61:2; Jeremaịa 50:28.

28. Ụkpụrụ ikpe ziri ezi dị aṅaa ka Jehova ji eme ihe n’ihe banyere Babilọn Ukwu ahụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

28 N’okpuru Iwu Mosis, ọ bụrụ na onye Israel ezunara ụmụ amaala ibe ya ihe, ọ ghaghị ịkwụghachi, ma ọ dịkarịa ala, okpukpu abụọ nke ihe ahụ o zuuru. (Ọpụpụ 22:1, 4, 7, 9) Ná mbibi ahụ na-abịanụ nke Babilọn Ukwu ahụ, Jehova ga-eji ụkpụrụ ikpe ziri ezi yiri nke ahụ mee ihe. Ọ ga-anata okpukpu abụọ nke ihe o mere ndị ọzọ. A gaghị emere ya ebere n’ihi na Babilọn Ukwu ahụ egosighị obi ebere ọ bụla n’ahụ́ ndị ọ na-emekpọ ọnụ. O rigburu ndị nile nọ n’elu ala nke ukwuu iji nọgide ‘na-adị ndụ okomoko nke ihere na-adịghị eme.’ Ugbu a ọ gaje inweta ahụhụ na iru újú. Babilọn oge ochie chere na ya nọ n’ebe na-adịghị ize ndụ ma ọlị, na-etu ọnụ, sị: “M gaghị anọ dị ka nwanyị di ya nwụrụ, m gaghị amakwa ọgbụgba aka ụmụ.” (Aịsaịa 47:8, 9, 11) Babilọn Ukwu ahụ na-echekwa na ya nọ ná nchebe. Ma mbibi ya, nke Jehova, onye “di ike” nyere iwu ya, ga-eme ngwa ngwa, dị ka à ga-asị na ọ bụ “n’otu ụbọchị”!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a New World Translation Reference Bible, nkọwa ala ala peji.

Igbe dị na peeji nke 263]

“Ndị Eze . . . Sokwara Ya Kwaa Iko”

Ná mmalite afọ ndị 1800, ndị ahịa Europe na-ebuba ọgwụ opium dị ukwuu na China. Na March 1839, ndị ọchịchị China nwara ịkwụsị azụmahịa ahụ megidere iwu site n’ijichi 20,000 igbe ọgwụ ahụ site n’aka ndị ahịa Britain. Nke a dujere n’esemokwu n’etiti Britain na China. Ka mmekọrịta dị n’etiti mba abụọ ahụ na-ajọwanye njọ, ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ nke Protestant gbara Britain ume ka ha banye n’ibu agha, site n’okwu ndị dị ka ndị a:

“Lee nnọọ ka ihe isi ike ndị a si na-enye obi m ọṅụ n’ihi na echere m na iwe pụrụ iwe gọọmenti England, Chineke, site n’ike Ya, pụkwara ịkwatusị ihe mgbochi nile na-egbochi oziọma Kraịst ịbanye na China.”—Henrietta Shuck, onyeozi ala ọzọ nke okpukpe Southern Baptist.

N’ikpeazụ, agha tiwapụrụ—agha nke a maara taa dị ka Agha Opium. Ndị ozi ala ọzọ ji obi ha nile gbaa Britain ume site n’okwu ndị dị ka ndị a:

“A na-amanye m ịtụleghachi ọnọdụ dị ugbu a, ọ bụchaghị dị ka okwu metụtara opium ma ọ bụ ndị England, kama dị ka oké atụmatụ nke Chineke iji obi ọjọọ nke mmadụ kwalite nzube Ya nile nke obi ebere n’ebe China nọ site n’ịkwatusị mgbidi nile kewapụrụ ya iche.”—Peter Parker, onye ozi ala ọzọ nke okpukpe Congregational.

Onye ozi ala ọzọ nke okpukpe Congregational, Samuel W. Williams, kwukwara, sị: “Aka Chineke pụtara ìhè n’ihe nile meworonụ n’ụzọ dị ịrịba ama, anyị adịghịkwa arụ ụka na Ya, onye sịrị na Ya bịara iweta mma agha n’elu ala abịawo n’ebe a, na ọ bụkwa maka ibibi ndị iro Ya ngwa ngwa na iguzobe alaeze nke Ya. Ọ ga-anọgide na-akwatu ruo mgbe O guzobere Onyeisi Udo ahụ.”

Banyere ajọ mgbukpọ nke ndị China, onye ozi ala ọzọ bụ J. Lewis Shuck dere, sị: “Ana m ewere ọnọdụ ndị dị otú ahụ . . . dị ka ngwá ọrụ Onyenwe anyị ji eme ihe kpọmkwem n’ikpochapụ unyi nile na-egbochi ọganihu nke Eziokwu Chineke.”

Onye ozi ala ọzọ nke okpukpe Congregational, Elijah C. Bridgman kwukwara, sị: “Ọtụtụ mgbe, Chineke ejiwo aka siri ike nke ike ọchịchị mee ihe n’idozi ụzọ maka alaeze Ya . . . Ngwá ọrụ e ji na-eme ihe n’oge ndị a dị oké mkpa bụ ụmụ mmadụ; ike nduzi ya bụ nke Chineke. Onye ọchịchị ahụ dị elu nke mba nile ewerewo England n’ọrụ iji baara China mba ma wetuo ya n’ala.”—Nhota ndị e wetara n’isiokwu bụ́ “Mmezu na Ụzọ Mmezu,” 1974, ihe odide nke Stuart Creighton Miller bipụtara na The Missionary Enterprise in China and America (Nnyocha Harvard nke onye editọ ya bụ John K. Fairbank).

Igbe dị na peeji nke 264]

“Ndị Ahịa . . . Bụrụ Ọgaranya”

“N’agbata 1929 na ntiwapụ nke Agha Ụwa nke Abụọ, [Bernadino] Nogara [bụ́ onye nlekọta okwu ego nke Vatican] zipụrụ ego ndị Vatican na ndị nnọchianya Vatican iji rụọ ọrụ n’akụkụ dị iche iche nke usoro akụ na ụba ndị Itali—karịsịa n’imepụta ike eletrik, usoro nzirịta ozi telifonu, ọrụ mgbazinye ego na nke ụlọ akụ, ụzọ ụgbọ okporo ígwè ndị dị nta, na mmepụta nke ngwá ọrụ e ji arụ ọrụ ubi, simenti, na ákwà ndị e ji ihe ndị aka mere wee mepụta. Ọtụtụ n’ime azụmahịa ndị a wetara uru dị ukwuu.

“Nogara rikpuru ọtụtụ ụlọ ọrụ dị iche iche gụnyere La Società Italiana della Viscosa, La Supertessile, La Società Meridionale Industrie Tessili, na La Cisaraion. N’ịchịkọta ndị a nile bịa n’ịbụ otu ụlọ ọrụ, bụ́ nke ọ kpọrọ CISA-Viscosa, nke o tinyekwara n’okpuru ike nchịkwa Baron Francesco Maria Oddasso, bụ́ otu n’ime ndị a kasị tụkwasị obi ná ndị na-abụghị ndị ụkọchukwu na Vatican, mgbe ahụ, Nogara mere ka ụlọ ọrụ kasị ukwuu n’Itali nke na-emepụta ákwà, bụ́ SNIA-Viscosa weghaara ụlọ ọrụ ọhụrụ ahụ. Ka oge na-aga, aka ndị Vatican na-etinye na SNIA-Viscosa buwanyere ibu, e mesịa, Vatican weghaara nchịkwa ya—nke ihe àmà ya bụ eziokwu ahụ bụ na Baron Oddasso mesịrị ghọọ osote onyeisi oche ya.

“Otú a ka Nogara si tinye aka n’usoro ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ákwà. O si n’ụzọ ndị ọzọ tinyekwa aka n’usoro ụlọ ọrụ ndị ọzọ, n’ihi na Nogara nwere ọtụtụ aghụghọ dị iche iche o bu n’isi. Eleghị anya nwoke nke a na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya . . . mere ihe ka ukwuu iji tinye ndụ n’usoro akụ na ụba ndị Itali karịa otu onye azụmahịa ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke Itali . . . Ọ dịbeghị nnọọ mgbe ọ bụla Benito Mussolini nwere ike inweta ụdị alaeze ahụ nke ọ rọrọ nrọ ya, ma o nyeere Vatican na Bernadino Nogara aka iwulite ụdị ike ọchịchị ọzọ.”—The Vatican Empire, nke Nino Lo Bello dere, peji nke 71-73.

Nke a bụ nanị otu ihe atụ nke mmekọrịta chiri anya dị n’etiti ndị ahịa nke ụwa na Babilọn Ukwu ahụ. Ka a sịkwa ihe mere na ndị ahịa ndị a ga-akwa ákwà mgbe onye òtù azụmahịa ha na-anọghịzi ya!

[Foto dị na peeji nke 259]

Ka ụmụ mmadụ na-agbasa gaa n’elu ala nile, ha weere okpukpe Babilọn na-agbasa

[Foto ndị dị na peeji nke 261]

Òtù Jọn ahụ, dị ka onyenche, na-akpọsa na Babilọn adawo

[Foto dị na peeji nke 266]

Mkpọmkpọ ebe nile nke Babilọn oge ochie bụ ihe àmà nke mbibi na-abịanụ nke Babilọn Ukwu ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya