Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Nnapụta Unu Na-eru Nso”
    Ụlọ Nche—2015 | Julaị 15
    • 16, 17. Olee ihe ga-emerịrị tupu Nwa Atụrụ ahụ alụọ nwaanyị ọhụrụ?

      16 Ozugbo ndị niile e tere mmanụ gachara eluigwe, a ga-amalite nkwadebe ikpeazụ maka ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ. (Mkpu. 19:9) Ma, e nwere ihe ga-eme tupu oge obi ụtọ ahụ. Cheta na obere oge tupu a kpọga ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa eluigwe, Gọg ga-alụso ndị Chineke ọgụ. (Ezik. 38:16) Gịnị ka ndị Chineke ga-eme? N’ụwa, ọ ga-adị ka e nweghị onye ga-echebe ha. Ha ga-eme ihe a gwara ndị Izrel n’oge Eze Jehọshafat. A sịrị ha: “Unu agaghị alụ ọgụ na nke ugbu a. Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ, guzoronụ otu ebe hụ otú Jehova ga-esi zọpụta unu. Juda na Jeruselem, unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ.” (2 Ihe 20:17) Ma, ihe a ga-eme n’eluigwe ga-adị nnọọ iche. Mgbe Mkpughe 17:14 na-ekwu banyere oge ndị niile e tere mmanụ ga-anọ n’eluigwe, ọ gwara anyị banyere ndị iro ndị Chineke, sị: “Ndị a ga-ebuso Nwa Atụrụ ahụ agha, ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha, n’ihi na ọ bụ Onyenwenụ kasị ndị nwenụ niile na Eze nke ndị eze. Ndị so ya ga-emerikwa ha, ya bụ, ndị a kpọrọ, ndị a họọrọ, ndị kwesịkwara ntụkwasị obi.” Jizọs na otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ ha na ya ga-achị n’eluigwe ga-abịa napụta ndị Chineke nọ n’ụwa.

      17 Nnapụta ahụ ga-emezi ka agha Amagedọn malite. Agha ahụ ga-emekwa ka e too aha nsọ Jehova. (Mkpu. 16:16) N’oge ahụ, ndị niile yiri ewu “ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi.” Ihe ọjọọ ọ bụla agaghịzi adị n’ụwa. Chineke ga-echebekwa oké ìgwè mmadụ n’Amagedọn, bụ́ ihe ikpeazụ ga-eme n’oké mkpagbu ahụ. Mgbe ihe niile a mechara, Nwa Atụrụ ahụ ga-alụzi nwaanyị ọhụrụ. Ọ bụ ihe ikpeazụ a kọrọ ná Mkpughe. (Mkpu. 21:1-4)d Ndị niile nọ n’ụwa mgbe ahụ ga-abụ ndị na-eme uche Chineke na ndị ọ hụrụ n’anya. Ọ ga-emekwara ha ọtụtụ ihe ọma. Ọ ga-abụ nnukwu oriri alụmdi na nwunye. Ànyị na-atụsi anya oge ahụ ike?—Gụọ 2 Pita 3:13.

  • “Nnapụta Unu Na-eru Nso”
    Ụlọ Nche—2015 | Julaị 15
    • d Abụ Ọma nke 45 kọwara ihe ndị ga-ebu ibe ha ụzọ mee. Eze ahụ ga-ebu ụzọ lụọ agha. Ọ lụchaa, ya alụzie nwaanyị.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya