Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 13 p. 66-73
  • Zụrụ Ọlaedo nke A Nụchaworo n’Ọkụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Zụrụ Ọlaedo nke A Nụchaworo n’Ọkụ
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ị Na-asị, Abụ M Ọgaranya”
  • Ndụmọdụ Banyere ‘Ịba Ọgaranya’
  • Ịtụnye Ọgwụ Anya nke Ime Mmụọ
  • Irite Uru Site na Ndụmọdụ na Ịdọ Aka ná Ntị
  • ‘Iri Nri Anyasị Ahụ’
  • Ocheeze nke Dịịrị Ndị Nwere Mmeri
  • Gee Ntị n’Ihe Mmụọ Nsọ Na-ekwu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Jigide Okwukwe n’Ebe Chineke na Kraịst nọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Olee Otú Ntụkwasị Obi I Nwere Na Chineke Siruru N’ike?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Zụlite Nrubeisi Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 13 p. 66-73

Isi nke 13

Zụrụ Ọlaedo nke A Nụchaworo n’Ọkụ

LEỌDISIA

1, 2. Olee ebe nke ikpeazụ n’ọgbakọ asaa ndị ahụ natara ozi sitere n’aka Jisọs ahụ e mere ka ọ dị ebube dị, gịnị bụkwa ihe ụfọdụ e ji mara obodo ahụ?

LEỌDISIA bụ nke ikpeazụ n’ime ọgbakọ asaa ahụ ndị natara ozi sitere n’aka Jisọs ahụ biliteworo n’ọnwụ. Leekwa nnọọ ozi na-emepe anya, nke na-akpalikwa akpali dị na ya!

2 Taa, ị ga-ahụ mkpọmkpọ ebe nke Leọdisia n’ebe dị nso Denizli, ihe dị ka 90 kilomita n’ọwụwa anyanwụ nke ndịda Alasehir. N’ime narị afọ mbụ, Leọdisia bụ obodo nwere nnọọ ihe ịga nke ọma. Ebe ọ dị n’ebe ụzọ abụọ zukọtara, ọ bụ obodo bụ isi maka nchekwa ego na azụmahịa. Orire a na-ere otu ụdị ọgwụ anya a ma ama n’ebe ahụ mere ka ihe onwunwe ya bakwuo ụba, ọ bụkwa ebe a ma ama n’ihi uwe ndị dị oké ọnụ ahịa a na-eji ogho ojii na-emepụta n’ebe ahụ. E meriri nsogbu nke ụkọ mmiri nke na-enye obodo ahụ nsogbu site n’isi n’ọdọ mmiri ọkụ ndị dị n’ebe dị anya dọta mmiri bịa n’obodo ahụ. Otú a, mmiri ahụ na-adị nanị ṅaraṅara mgbe ọ na-erute n’obodo ahụ.

3. Jisọs si aṅaa malite ozi o zigaara ọgbakọ dị na Leọdisia?

3 Leọdisia adịghị anya site na Kọlọsi. Mgbe ọ na-edegara ndị Kọlọsi akwụkwọ, Pọl onyeozi kwuru okwu banyere akwụkwọ ozi o buru ụzọ degara ndị Leọdisia. (Ndị Kọlọsi 4:15, 16) Anyị amaghị ihe Pọl dere n’akwụkwọ ozi ahụ, ma ozi nke Jisọs na-ezigara ndị Leọdisia ugbu a na-egosi na ha adabawo n’ọnọdụ jọgburu onwe ya n’ụzọ ime mmụọ. Ma, dị ka ọ na-eme na mbụ, Jisọs bu ụzọ kọwapụta onwe ya, na-asị: “Degakwara mmụọ ozi nke nzukọ Kraịst dị na Leọdisia akwụkwọ, sị, Ihe ndị a ka Amen ahụ na-ekwu, bụ́ onyeàmà ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi, nke bụkwa onye eziokwu, isi nke ihe nile Chineke kere.”—Mkpughe 3:14.

4. Olee otú Jisọs si bụrụ “Amen ahụ”?

4 Gịnị mere Jisọs ji kpọọ onwe ya “Amen ahụ”? Ùtú aha nke a na-eme ka ikpe ọmụma dị n’ozi ya sikwuo ike. “Amen” bụ ndegharị nkịtị nke okwu Hibru ahụ pụtara “kpọmkwem,” “ya dị otú ahụ,” a na-ejikwa ya eme ihe ná ngwụcha ekpere iji mesie echiche ndị e kwupụtara n’ime ya ike. (1 Ndị Kọrint 14:16) Jisọs bụ “Amen ahụ” n’ihi na ikwesị ntụkwasị obi ya na-enweghị ntụpọ na ọnwụ ịchụ àjà ya kwadoro mmezu nke nkwa Jehova nile dị oké ọnụ ahịa, meekwa ka ha bụrụ ihe e ji n’aka. (2 Ndị Kọrint 1:20) Kemgbe ahụ, a na-ekpegara Jehova ekpere nile n’ụzọ ziri ezi site n’aha Jisọs.—Jọn 15:16; 16:23, 24.

5. Olee ụzọ Jisọs si bụrụ “onyeàmà ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi, nke bụkwa onye eziokwu”?

5 Jisọs bụkwa “onyeàmà ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi, nke bụkwa onye eziokwu.” N’amụma, a na-ejikọtakarị ya na ikwesị ntụkwasị obi, eziokwu, na ezi omume, n’ihi na ọ bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi kpam kpam dị ka ohu nke Jehova Chineke. (Abụ Ọma 45:4; Aịsaịa 11:4, 5; Mkpughe 1:5; 19:11) Ọ bụ Onyeàmà kasị ukwuu nke Jehova. N’eziokwu, dị ka “isi nke ihe nile Chineke kere,” Jisọs akpọsawo ebube Chineke siterị ná mmalite. (Ilu 8:22-30) Mgbe ọ bụ mmadụ n’elu ala, ọ gbaara eziokwu ahụ àmà. (Jọn 18:36, 37; 1 Timoti 6:13) Mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, o kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa inye ha mmụọ nsọ, wee gwa ha, sị: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” Site na Pentikọst nke 33 O.A. gaa n’ihu, Jisọs duziri ndị Kraịst ndị a e tere mmanụ n’ikwusa ozi ọma ahụ “n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” (Ọrụ 1:6-8; Ndị Kọlọsi 1:23) N’eziokwu, o kwesịrị ekwesị ịkpọ Jisọs onyeàmà ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi, nke bụkwa onye eziokwu. Ọ ga-abụrụ ndị Kraịst ahụ nọ na Leọdisia amamihe ige ntị n’okwu ya.

6. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si kọwaa ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ ahụ dị na Leọdisia? (b) Ezi ihe nlereanya dị aṅaa nke Jisọs ka ndị Kraịst ahụ nọ na Leọdisia na-agbasoghị?

6 Ozi dị aṅaa ka Jisọs zijeere ndị Leọdisia? Ọ gwaghị ha okwu ịja mma ọ bụla. Ọ gwara ha hoo haa, sị: “Amatara m ọrụ gị nile, na ị jụghị oyi i kpoghịkwa ọkụ: ọ ga-adị m nnọọ mma ma ị na-ajụ oyi ma ọ bụ na ị na-ekpo ọkụ. Otú a, n’ihi na ị dị ṅaraṅara, i kpoghịkwa ọkụ ị jụghịkwa oyi, m ga-agbọpụ gị n’ọnụ m.” (Mkpughe 3:15, 16) Ị̀ ga-esi aṅaa meghachi omume n’ozi dị otú a site n’ọnụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst? Ọ̀ bụ na ị gaghị eteta n’ụra wee nyocha onwe gị? N’eziokwu, ọ dị mkpa ka ndị Leọdisia ahụ kpalighachi onwe ha, n’ihi na ha adawo n’ụra ime mmụọ, ma eleghị anya na-elefuru ọtụtụ ihe anya. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 6:1.) Jisọs, bụ́ onye ha kwesịrị iṅomiworị dị ka ndị Kraịst, nọ mgbe nile na-enwe oké ịnụ ọkụ n’obi n’ebe Jehova na ozi ya dị. (Jọn 2:17) Ọzọkwa, ndị dị umeala n’obi ahụwo na ọ na-abụ onye dị nwayọọ mgbe nile, na-enye ume ọhụrụ dị ka iko mmiri oyi n’ụbọchị oké okpomọkụ. (Matiu 11:28, 29) Ma ndị Kraịst nọ na Leọdisia adịghị ọkụ, ha ajụghịkwa oyi. Dị ka mmiri ndị ahụ na-erubata n’obodo ha, ha adịwo ṅaraṅara. Jisọs gaje ịjụ ha kpam kpam, ‘gbụpụ ha n’ọnụ ya’! Ka anyị onwe anyị, n’akụkụ nke anyị, gbalịsie ike, jiri ịnụ ọkụ n’obi mee ihe dị ka Jisọs mere, ịnọgide na-enye ndị ọzọ ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ.—Matiu 9:35-38.

“Ị Na-asị, Abụ M Ọgaranya”

7. (a) Jisọs si aṅaa mee ka a mara ihe bụ isi nsogbu ndị Kraịst ahụ nọ Leọdisia? (b) N’ihi gịnị ka Jisọs ji kwuo na ndị Kraịst ndị ahụ nọ na Leọdisia ‘bụ ndị kpuru ìsì na ndị gba ọtọ’?

7 Gịnị bụ n’ezie isi nsogbu nke ndị Leọdisia? Anyị na-enweta ihe àmà banyere nke a n’okwu ọzọ Jisọs kwuru: “N’ihi na ị na-asị, Abụ m ọgaranya, e mewo ka m bụrụ ọgaranya, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla na-akpa m; ị mataghịkwa na gị onwe gị bụ onye ahụ na-ahụju anya na onye kwesịrị ebere na onye dara ogbenye na onye kpuru ìsì na onye na-agba ọtọ.” (Mkpughe 3:17; tụlee Luk 12:16-21.) N’ihi na ha bi n’obodo bara ọgaranya, ha nwere obi ike n’ihi ihe onwunwe ha. Ọ ghaghị ịbụ na ámá egwuregwu, ọgbọ ihe nkiri, na ebe mmega ahụ ndị jupụtara n’obodo ahụ emetụtawo ụzọ ndụ ha, nke mere na ha aghọwo “ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.”a (2 Timoti 3:4) Ma ndị ahụ bara ọgaranya n’ihe onwunwe na Leọdisia enweghị ihe ọ bụla n’ụzọ ime mmụọ. Ha nwere nanị ‘akụ e chekwara n’eluigwe’ ole na ole, ma ọ bụrụ na ọ dị nke ha nwere enwe. (Matiu 6:19-21) Ha emeghị ka anya ha dịrị otu ebe, na-edebe Alaeze Chineke n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ha. N’ezie, ha nọ n’ọchịchịrị, bụrụ ndị kpuru ìsì, ndị na-adịghị ahụ ụzọ n’ime mmụọ. (Matiu 6:22, 23, 33) Karịsịa, n’agbanyeghị uwe ọma ndị ha pụrụ ijiworị akụ ha zụta, n’anya Jisọs, ha bụ ndị gba ọtọ. Ha enweghị uwe ime mmụọ ọ bụla a ga-eji mara ha dị ka ndị Kraịst.—Tụlee Mkpughe 16:15.

8. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka o si bụrụ na ọnọdụ yiri nke ahụ dị na Leọdisia dịkwa taa? (b) Olee otú ndị Kraịst ụfọdụ siworo duhie onwe ha n’ime ụwa anyaukwu nke a?

8 Lee nnọọ ọnọdụ dị oké njọ nke a bụ! Ma, ọ̀ bụ na anyị adịghị ahụ ọnọdụ yiri nke ahụ ọtụtụ mgbe taa? Gịnị bụ isi ihe kpatara ya? Ọ bụ àgwà nke ịtụkwasị onwe onye obi, nke na-esite n’ịdabere n’ihe onwunwe na ikike mmadụ nwere. Dị ka ndị na-eje chọọchị Krisendọm, ụfọdụ ndị Jehova eduhiewo onwe ha, na-eche na ha pụrụ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ nanị site n’ije nzukọ site n’oge ruo n’oge. Ha na-agbalị ịbụ “ndị na-eme okwu ahụ” nanị n’ọnụ. (Jemes 1:22) N’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị òtù Jọn ahụ nọgidere na-adọ ha, ha tụkwasịrị obi ha n’ụdị ejiji dị iche iche, ụgbọ ala na ụlọ ndị dara oké ọnụ, nakwa n’ime ka ntụrụ ndụ na ihe ụtọ bụrụ ihe bụ isi ná ndụ ha. (1 Timoti 6:9, 10; 1 Jọn 2:15-17) Ihe ndị a nile na-arụpụta ịda mbà n’ike nghọta ime mmụọ. (Ndị Hibru 5:11, 12) Kama iyi ndị ahụ dị ṅaraṅara, ha kwesịrị ịkpalighachi ‘ọkụ nke mmụọ nsọ’ ahụ, gosikwa ezi ịnụ ọkụ n’obi iji ‘kwusaa okwu ahụ.’—1 Ndị Tesalọnaịka 5:19; 2 Timoti 4:2, 5.

9. (a) Okwu dị aṅaa ndị Jisọs kwuru kwesịrị ịkpali ndị Kraịst dị ṅaraṅara, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee otú ọgbakọ pụrụ isi nyere “atụrụ” ndị na-akpafu akpafu aka?

9 Olee otú Jisọs si ele ndị Kraịst dị ṅaraṅara anya? Okwu ndị a o kwuru hoo haa kwesịrị ịkpali ha: “Ị mataghịkwa na gị onwe gị bụ onye ahụ na-ahụju anya na onye kwesịrị ebere na onye dara ogbenye na onye kpuru ìsì na onye na-agba ọtọ.” Akọ na uche ha adịghị enwekwa mmetụta ruo n’ókè nke na ha aghọtaghị ọnọdụ ha jọgburu onwe ya. (Tụlee Ilu 16:2; 21:2.) A pụghị ilefuru ọnọdụ ọjọọ dị otú a anya n’ime ọgbakọ dị ka ihe na-adịghị oké njọ. Site n’isetịpụ ezi ihe nlereanya nke ịnụ ọkụ n’obi, sitekwa n’inye nlekọta ọzụzụ n’ịhụnanya, ndị okenye na ndị ọzọ ha dunyere ga-enwe ike ịkpọteghachi “atụrụ” ndị a na-akpafu akpafu bịa n’ọṅụ ha mbụ nke iji obi dum na-eje ozi.—Luk 15:3-7.

Ndụmọdụ Banyere ‘Ịba Ọgaranya’

10. Gịnị bụ “ọlaedo” ahụ nke Jisọs gwara ndị Kraịst nọ na Leọdisia ka ha zụrụ n’aka ya?

10 È nwere ngwọta dịịrị ọnọdụ ọjọọ nke dị na Leọdisia? Ee, ma ọ bụrụ na ndị Kraịst ahụ ga-agbaso ndụmọdụ Jisọs: “Adụọ m gị ọdụ ka ị zụrụ n’aka m ọlaedo nke [a nụchaworo, NW] n’ọkụ, ka i wee ghọọ ọgaranya.” (Mkpughe 3:18a) Ezi “ọlaedo” ndị Kraịst, nke a nụchaworo n’ọkụ, nke e wepụkwara afụrụ dị na ya, ga-eme ka ha bụrụ “ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” (Luk 12:21) Olee ebe ha pụrụ ịzụta ọlaedo dị otú ahụ? Ọ bụghị site n’aka ndị ọrụ ụlọ akụ dị n’ógbè ha, kama ọ bụ site n’aka Jisọs! Pọl onyeozi kọwara ihe ọlaedo ahụ bụ mgbe ọ gwara Timoti ka o nye ndị Kraịst bara ọgaranya iwu “ka ha na-eme ezi ihe, ka ha bụrụ ọgaranya n’ọrụ ọma nile, ka ha bụrụ ndị kwadebeworo ime ka ndị ọzọ keta ihe ha nwere, ka ha bụrụ ndị kwere ka ndị ọzọ soo ha nwekọọ ihe; ka ha kpadooro onwe ha ntọala ọma nye oge gaje ịbịa.” Ọ bụ nanị site n’itinye onwe ha n’ọrụ n’ụzọ dị otú a ka ha nwere ike ‘ijide ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie.’ (1 Timoti 6:17-19) Ndị ahụ bara ọgaranya na Leọdisia kwesịrị ịgbasoworịị ndụmọdụ Pọl wee si otú a bụrụ ndị ọgaranya n’ime mmụọ.—Leekwa Ilu 3:13-18.

11. Ihe atụ dịgasị aṅaa nke oge a ka anyị nwere banyere ndị na-azụrụ ‘ọlaedo nke a nụchaworo n’ọkụ’?

11 È nwere ihe atụ nke oge a nke ndị na-azụrụ ‘ọlaedo nke a nụchaworo n’ọkụ’? Ee, e nwere! Ọbụna mgbe ụbọchị Onyenwe anyị nọ na-abịa nso, anya nọ na-emeghe otu ìgwè nta nke ndị mmụta Bible n’ihe banyere ezighị ezi nke ọtụtụ ozizi ndị Babilọn dị na Krisendọm, ndị dị ka Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ahụhụ nke ọkụ ala mmụọ, ime ụmụaka baptism, na ife ihe oyiyi dị iche iche ofufe (gụnyere ihe oyiyi nke obé na ndị nke Meri). N’ịkwado eziokwu Bible, ndị Kraịst ndị a kpọsara Alaeze Jehova dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ, nakwa àjà mgbapụta Jisọs dị ka ihe mgbakwasị ụkwụ maka nzọpụta. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 40 afọ tupu o ruo, ha zoro aka na 1914 dị ka afọ ahụ amụma Bible kara akara dị ka ọgwụgwụ nke oge ndị Jentaịl, nke ihe omume ndị na-akpali akpali ga-esochi n’elu ụwa.—Mkpughe 1:10.

12. Ònye bụ otu n’ime ndị ahụ na-edu ndú n’etiti ndị Kraịst na-eteta n’ụra, ò sikwa aṅaa setịpụ ihe nlereanya pụrụ iche n’ịkpakọba akụ n’eluigwe?

12 Onye butere ụzọ n’ime ndị Kraịst ndị a na-eteta n’ụra bụ Charles Taze Russell, onye guzobere klas nke ndị na-amụ Bible n’obodo Allegheny (nke bụ́ otu akụkụ obodo Pittsburgh ugbu a), Pennsylvania, U.S.A., ná mmalite afọ ndị 1870. Mgbe ọ malitere ọchịchọ ọ na-achọ eziokwu, Russell na nna ya na-azụkọ ahịa, na-enwekwa olileanya ịba oké ọgaranya. Ma, o rekpọrọ òkè o nwere n’ìgwè ụlọ ahịa ahụ wee tinye ego ya nile iji nye aka n’ịkpọsa Alaeze Chineke n’elu ala dum. Na 1884, Russell ghọrọ onyeisi oche mbụ nke òtù ahụ a maara ugbu a dị ka Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. Na 1916, ọ nwụrụ mgbe ọ nọ n’ụgbọ okporo ígwè n’ebe dị nso na Pampa, Texas, mgbe ọ nọ n’ụzọ ije New York, ebe ike gwụsịrị ya nnọọ site ná njegharị nkwusa ikpeazụ o mere n’ọdịda anyanwụ United States. O setịpụrụ ihe nlereanya pụrụ iche nke ichekwa akụ ime mmụọ n’eluigwe, bụ́ ihe nlereanya nke ọtụtụ narị puku ndị ozi ọsụ ụzọ ji onwe ha achụ àjà na-agbaso taa.—Ndị Hibru 13:7; Luk 12:33, 34; tụlee 1 Ndị Kọrint 9:16; 11:1.

Ịtụnye Ọgwụ Anya nke Ime Mmụọ

13. (a) Olee otú ọgwụ anya nke ime mmụọ ga-esi meziwanye ọnọdụ nke ndị Leọdisia ahụ? (b) Uwe ndị dị aṅaa ka Jisọs gwara ha ka ha nweta, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

13 Jisọs dụsikwara ndị Leọdisia ahụ ọdụ ike, sị: “Zụrụkwa uwe ọcha, ka i wee gbokwasị onwe gị, ka e wee ghara ime ka ihere nke ịgba ọtọ gị pụta ìhè; ka ị zụrụkwa ọgwụ anya ite n’anya gị, ka i wee na-ahụ ụzọ.” (Mkpughe 3:18b) Ha kwesịrị ịchọ ọgwụgwọ maka ọnọdụ ha nke ikpu ìsì ime mmụọ site n’ịzụrụ ọgwụ anya na-agwọ agwọ, ọ bụghị nke ndị dibịa nọ n’ebe ahụ, kama ụdị nke ahụ ọ bụ nanị Jisọs na-enye. Ọ ga-enyere ha aka inweta ihe ọmụma ime mmụọ, na-enyere ha aka ije ije ‘n’okporo ụzọ nke ndị ezi omume’ mgbe anya ha na-egbukepụ egbukepụ lekwasịrị n’ime uche Chineke. (Ilu 4:18, 25-27) Otú a, ha ga-eyikwasị, ọ bụghị uwe ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa e ji ogho ojii mee n’obodo Leọdisia, kama “uwe ọcha” ndị mara mma ndị na-akpọsa ihe dị ùgwù e ji mara ha dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst.—Tụlee 1 Timoti 2:9, 10; 1 Pita 3:3-5.

14. (a) Ọgwụ anya ime mmụọ dị aṅaa ka e nweworo kemgbe 1879? (b) Olee ebe e siworo na-enweta nkwado ego nye ọrụ Ndịàmà Jehova? (ch) N’iji onyinye afọ ofufo na-eme ihe, olee otú Ndịàmà Jehova si dị iche n’ebe ndị ọzọ nọ?

14 È nwere ọgwụ anya nke ime mmụọ n’oge anyị a? Ee, e nwere! Na 1879, Pastọ Russell, dị ka e ji ịhụnanya na-akpọ ya, malitere ibipụta magazin ahụ a maara gburugburu ụwa taa dị ka Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova iji kwadoo eziokwu. Ná mbipụta nke abụọ ya, o kwupụtara, sị: “[Magazin a] nwere, dị ka anyị kwere, JEHOVA dị ka onye na-akwado ya, ebe ọ bụkwa otú ahụ, ọ dịghị mgbe ọ ga-arịọ ma ọ bụ kpọọ òkù ka ndị mmadụ nyere ya aka. Mgbe Ya onwe ya, bụ́ onye sịrị: ‘Ọlaedo na ọlaọcha nile nke ugwu nile bụ nke m,’ kwụsịrị inye ego a chọrọ maka mbipụta ya, anyị ga-aghọta na ọ bụ oge ịkwụsị ibipụta ya.” Ụfọdụ ndị okwuchukwu telivishọn akwakọbawo oké ihe onwunwe, na-ebikwa ndụ okomoko n’emeghị ihere (ọtụtụ mgbekwa ndụ rụrụ arụ). (Mkpughe 18:3.) N’ụzọ dị iche na nke a, Ndị Mmụta Bible, ndị a maara taa dị ka Ndịàmà Jehova, ejiwo onyinye nile a na-arịọghị arịrịọ maka ya ndị ha natara mee ihe n’ịhazi na ime ka ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ banyere Alaeze Jehova na-abịanụ gaa n’ihu. Òtù Jọn nke oge a eduziwo mbipụta nke Ụlọ Nche na Teta!, bụ́ magazin ndị e kesara ngụkọta nke ihe karịrị 59 nde n’afọ 2006. E nwere Ụlọ Nche n’ihe dị ka asụsụ 150. Ọ bụ akwụkwọ bụ́ isi nke ọgbakọ nwere ihe karịrị nde ndị Kraịst isii, ndị jiworo ọgwụ anya dị otú ahụ mee ihe n’imeghe anya ha n’ihe banyere okpukpe ụgha na ịdị ngwa nke ikwusa ozi ọma ahụ nye mba nile.—Mak 13:10.

Irite Uru Site na Ndụmọdụ na Ịdọ Aka ná Ntị

15. N’ihi gịnị ka Jisọs ji nye ndị Kraịst ahụ nọ na Leọdisia ndụmọdụ siri ike, ọgbakọ ahụ kwesịkwara isi aṅaa zaghachi n’ebe ọ dị?

15 Ka anyị laghachikwuru ndị Leọdisia. Hà ga-esi aṅaa zaghachi na ndụmọdụ a siri ike si n’ọnụ Jisọs? Hà ga-abụ ndị e mere ka obi ha daa mbà ha wee chee na Jisọs achọkwaghị ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya ọzọ? Ee e, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị ma ọlị. Ozi ahụ gara n’ihu ịsị: “Ka ha hà, bụ ndị mụ onwe m hụrụ n’anya, ana m atụ ha mmehie ha n’anya, ziekwa ha ihe site n’inye ha ahụhụ: ya mere, na-anụ ọkụ n’obi, chegharịakwa.” (Mkpughe 3:19) Dị ka ọ dị banyere ịdọ aka ná ntị nke sitere n’aka Jehova, ịdọ aka ná ntị nke sitere n’aka Jisọs bụkwa ihe àmà nke ịhụnanya ya. (Ndị Hibru 12:4-7) Ọgbakọ Leọdisia ahụ kwesịrị iji mmetụta ịhụnanya o nwere n’ebe ha nọ mee ihe dị mma, tinyekwa ndụmọdụ ya n’ọrụ. Ha kwesịrị ichegharị, na-aghọta na ọnọdụ ha nke ekpoghị ọkụ na ajụghị oyi bụ otu ihe ahụ ya na ime mmehie. (Ndị Hibru 3:12, 13; Jemes 4:17) Ka ndị okenye nọ n’etiti ha wezụga ọchịchọ ihe onwunwe ha ma ‘kpalie’ onyinye ahụ ha natara n’aka Chineke. Mgbe ọgwụgwọ nke ọgwụ anya ime mmụọ ahụ malitere inwe mmetụta, ka ndị nile nọ n’ọgbakọ ahụ nweta ume ọhụrụ dị ka nke na-esite ná mmiri iyi jụrụ oyi nke na-awụsa mmadụ.—2 Timoti 1:6; Ilu 3:5-8; Luk 21:34.

16. (a) È si aṅaa na-egosipụta ịhụnanya na mmetụta Jisọs taa? (b) Ọ bụrụ na anyị anata ịdọ aka ná ntị siri ike, olee ụzọ anyị kwesịrị isi meghachi omume?

16 Gịnị banyere anyị taa? Jisọs na-aga n’ihu ‘ịhụ ndị nke aka ya nọ n’elu ụwa n’anya.’ Ọ ga-anọgidekwa na-eme nke a “ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Jọn 13:1; Matiu 28:20) A na-egosipụta ịhụnanya na mmetụta o nwere site n’òtù Jọn nke oge a na kpakpando ma ọ bụ ndị okenye nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Mkpughe 1:20) N’oge oké ọnwụnwa ndị a, ndị okenye nwere mmasị dị omimi n’inyere anyị nile aka, ma ndị okenye ma ụmụntakịrị, ịnọgide ná njikọ ọchịchị Chineke, na-eguzogide ọchịchọ ịnọpụ iche, oké ọchịchọ nke ihe onwunwe, na ihe rụrụ arụ nke jupụtara n’ụwa. Ọ bụrụ na anyị anata ịdọ aka ná ntị siri ike mgbe ụfọdụ, cheta na “ụzọ ndụ ka ịba mba nile nke ịdọ aka ná ntị bụ.” (Ilu 6:23) Anyị nile bụ ndị na-ezughị okè, anyị kwesịkwara ịnụ ọkụ n’obi ime nchegharị ruo ókè ọ bụla ọ dị mkpa ka e wee gbazigharịa anyị, ka anyị nọgidekwa n’ịhụnanya Chineke.—2 Ndị Kọrint 13:11.

17. Olee otú akụ na ụba pụrụ isi bụrụ ihe ize ndụ ime mmụọ nye anyị?

17 Anyị agaghị ekwe ka ịchọ ihe onwunwe, akụ na ụba, ma ọ bụ enweghị akụ na ụba mee ka anyị dị ṅaraṅara. Akụ na ụba pụrụ inye aka n’imeghere anyị ụzọ ndị ọhụrụ nke ije ozi, ma ọ pụkwara ịbụ ihe ize ndụ. (Matiu 19:24) Onye bara ọgaranya pụrụ iche na ọ dịghị ya mkpa ịnụ ọkụ n’obi n’ọrụ nkwusa ahụ dị ka ndị ọzọ, ọ bụrụhaala na ọ na-enye onyinye ego buru ibu site n’oge ruo n’oge. Ọ pụkwara iche na ịbụ ọgaranya mere ka ya ruo eru inweta ihu ọma ndị pụrụ iche. Ọzọkwa, e nwere ọtụtụ ihe ụtọ na ihe ntụrụ ndụ ndị onye bara ọgaranya pụrụ inweta nke ndị ọzọ na-apụghị inweta. Ma ihe ndọpụ uche ndị ahụ na-ewere oge, ha pụkwara ịdọrọ onye na-anọghị na nche pụọ n’ozi ndị Kraịst, wee si otú a na-eme onye na-enweghị uche ka ọ dị ṅaraṅara. Ka anyị zere ọnyà nile dị otú ahụ, nọgidekwa jiri obi anyị dum “na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ, na-agbasikwa mgba ike,” n’olileanya nke inweta ndụ ebighị ebi.—1 Timoti 4:8-10; 6:9-12.

‘Iri Nri Anyasị Ahụ’

18. Ohere dị aṅaa ka Jisọs debere n’ihu ndị Kraịst nọ na Leọdisia?

18 Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Lee, ana m eguzo n’ọnụ ụzọ, na-akụkwa aka: ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ olu m, megheekwa ụzọ, m ga-abakwute ya, sokwa ya rie nri anyasị, ya onwe ya ga-esokwa m rie.” (Mkpughe 3:20) A sị nnọọ na ndị Kraịst nọ na Leọdisia ga-anabata Jisọs n’ọgbakọ ha, ọ ga-enyere ha aka imeri ọnọdụ ha nke ịdị ṅaraṅara!—Matiu 18:20.

19. Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe o kwere nkwa iso ọgbakọ ahụ dị na Leọdisia rie nri anyasị?

19 O doro anya na mkpọtụ Jisọs kpọtụrụ nri anyasị aha chetaara ndị Leọdisia ahụ oge mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya rikọrọ nri. (Jọn 12:1-8) Oge ndị dị otú ahụ na-ewetakarị ngọzi ime mmụọ nye ndị nọ n’ebe ahụ. Otú ahụkwa, e nwere oge ndị a ma ama, mgbe Jisọs bilitesịrị n’ọnwụ, mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ n’oge nri, bụ oge ndị wusiri ha ike nke ukwuu. (Luk 24:28-32; Jọn 21:9-19) N’ihi nke a, nkwa ahụ o kwere ịbata n’ime ọgbakọ ndị Leọdisia wee soro ha rie nri anyasị bụ nkwa nke iwetara ha abamuru ime mmụọ dị ukwuu ọ bụrụ nanị na ha anabata ya.

20. (a) Ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị, gịnị ka ọnọdụ ịdị ṅaraṅara nke Krisendọm rụpụtara? (b) Olee otú ikpe Jisọs siworo metụta Krisendọm?

20 Agbamume Jisọs ji ịhụnanya nye ndị Leọdisia ahụ dị oké mkpa nye ndị fọdụrụ n’etiti ndị Kraịst e tere mmanụ taa. Ụfọdụ n’ime ndị a na-echeta na ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị, ndị okpukpe Krisendọm ghọrọ ndị dị ṅaraṅara ruo n’ókè jọgburu onwe ya. Kama ịnabata nlọghachi nke Onyenwe anyị na 1914, ndị ndú ya mikpuru onwe ha n’oké mgbukpọ nke Agha Ụwa Mbụ, nke 24 n’ime 28 mba ndị na-eburita agha n’ime ya na-ekwu na ha bụ ndị Kraịst. Lee ka ikpe ọmụma ọbara dịkwasịrị ha si dị ukwuu! N’ime Agha Ụwa nke Abụọ, nke a lụkwara n’akụkụ ka ukwuu n’ime Krisendọm, mmehie nke okpukpe ụgha ‘rapakọkwara n’otu ọzọ ruo eluigwe.’ (Mkpughe 18:5) Ọzọkwa, ndị ndú okpukpe agbakụtawo Alaeze Jehova na-abịanụ azụ site n’ịkwado òtù League of Nations, United Nations, na òtù mba na nke mgbanwe ọchịchị dị iche iche, nke ọ na-adịghị nke ọ bụla n’ime ha pụrụ igbo mkpa ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ dịworị anya Jisọs jụrụ ndị ndú okpukpe, na-ama ha ikpe, na-atụfukwa ha, dị nnọọ ka onye na-akụ azụ na-atụfu azụ na-adịghị mma nke ụgbụ ya jidere. Ọnọdụ ọjọọ nke chọọchị dị iche iche nke Krisendọm nọ na ya taa na-agba àmà banyere ikpe dị otú ahụ a mara ya. Ka ihe ga-emesị mee ya bụrụ ịdọ aka ná ntị nye anyị!—Matiu 13:47-50.

21. Site 1919 gaa n’ihu, olee otú ndị Kraịst nọ n’ezi ọgbakọ ahụ siworo zaghachi n’okwu Jisọs gwara ndị Kraịst ahụ nọ Leọdisia?

21 Ọbụna n’ime ezi ọgbakọ ahụ, e nwewo mmadụ ndị dịrị ṅaraṅara, bụ mmadụ ndị yiri ihe ọṅụṅụ nke na-adịghị ọkụ ruo n’ókè ịkpali akpali, ha ajụghịkwa oyi n’ókè inye ume ọhụrụ. Ma Jisọs egosiwo na ya ka nwekwara ezi ịhụnanya n’ebe ọgbakọ ya dị. Ọ na-enye ndị Kraịst onwe ya, bụ́ ndị na-anabata ya nke ọma, ọtụtụ ndị anabatawokwa ya, dị ka à ga-asị na ọ bụ ịbịa rie nri anyasị. N’ihi nke a, site na 1919 gaa n’ihu, e meghewo anya ha nye ihe amụma Bible dị iche iche pụtara. Ha enwewo oge mmepe anya dị ukwuu.—Abụ Ọma 97:11; 2 Pita 1:19.

22. Nri anyasị dị aṅaa nke a ga-eme n’ọdịnihu ka Jisọs pụrụ ibuworị n’uche, oleekwa ndị ga-ekere òkè na ya?

22 Mgbe ọ na-agwa ndị Leọdisia okwu, ọ pụrụ ịbụ na Jisọs bukwa nri anyasị ọzọ n’uche. N’akụkụ nke ikpeazụ nke Mkpughe, anyị na-agụ, sị: “Ngọzi na-adịrị ndị a kpọworo ịbịa ná nri anyasị ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ.” Nke a bụ oké oriri mmeri iji nye Jehova otuto mgbe o mezusiworo ihe e kpere n’ikpe n’isi okpukpe ụgha—bụ́ oké oriri nke Kraịst na òtù zuru ezu nke 144,000 ahụ mejupụtara nwanyị ọ na-alụ ọhụrụ ga-ekere òkè na ya n’eluigwe. (Mkpughe 19:1-9) Ndị nọ n’ọgbakọ Leọdisia oge ochie ahụ—ee, ụmụnna Kraịst Jisọs ndị na-ekwesị ntụkwasị obi n’oge a, ndị debere uwe e ji mara ha dị ka ezi ndị Kraịst ọcha—ha nile ga-esoro Onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ kere òkè ná nri anyasị ahụ. (Matiu 22:2-13) Lee oké ihe mkpali nke a bụ ịnụ ọkụ n’obi na ichegharị!

Ocheeze nke Dịịrị Ndị Nwere Mmeri

23, 24. (a) Ụgwọ ọrụ ọzọ dị aṅaa ka Jisọs kwuru okwu banyere ya? (b) Olee mgbe Jisọs nọdụrụ ala n’ocheeze Mesaịa ya, oleekwa mgbe ọ malitere ikpe ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Kraịst ikpe? (ch) Nkwa dị aṅaa dị ebube ka Jisọs kwere ndị na-eso ụzọ ya mgbe o guzobere Ememe Ncheta nke ọnwụ ya?

23 Jisọs kwuru banyere ụgwọ ọrụ ọzọ, na-asị: “Onye na-emeri emeri, ya ka m ga-ekwenye ka o so m nọdụ ala n’ocheeze m, dị ka mụ onwe m merikwara, wee soo Nna m nọdụ ala n’ocheeze ya.” (Mkpughe 3:21) N’imezu okwu Devid nke dị n’Abụ Ọma 110:1, 2, Jisọs ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, mgbe o merisịworo ụwa na 33 O.A., ka a kpọlitere n’ọnwụ, wee bulie ya elu isoro Nna ya nọdụ ala n’ocheeze Ya nke dị n’eluigwe. (Ọrụ 2:32, 33) N’afọ ọzọ dị oké mkpa, bụ́ 1914, Jisọs bịara ịnọdụ ala n’ocheeze Mesaịa nke ya onwe ya dị ka Eze na Onyeikpe. Ihe àmà na-egosi na ikpe ahụ malitere na 1918 n’ebe ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst nọ. Mgbe ahụ, ndị e tere mmanụ, ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-esonyere Jisọs n’Alaeze ya. (1 Pita 4:17) O kwewo ha nkwa nke a mgbe ọ na-eguzobe Ememe Ncheta nke ọnwụ ya, na-agwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mụ onwe m na-agbakwa ndụ inye unu alaeze, dị ka Nna m gbara ndụ inye m, ka unu wee rie ṅụọkwa na table nke m n’alaeze m; unu ga-anọkwasịkwa n’ocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.”—Luk 22:28-30.

24 Lee nnọọ ọrụ dị ebube nke a bụ—isoro Eze ahụ na-achị achị nọdụ ala n’oge “ịmụ ọzọ ahụ,” sorokwa ya kere òkè, ná ndabere nke àjà ya zuru okè, n’ime ka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi bịaruo izu okè yiri nke Iden! (Matiu 19:28; 20:28) Dị ka Jọn gwara anyị, Jisọs na-eme ka ndị ahụ nwere mmeri ghọọ “alaeze, ndị nchụàjà nye Chineke na nna nke ya,” ịnọdụ n’ocheeze ndị dị gburugburu ocheeze dị ebube nke Jehova n’onwe ya. (Mkpughe 1:6; 4:4) Ka anyị nile—ma ànyị so ná ndị e tere mmanụ ma ọ bụ n’òtù “ụwa ọhụrụ” ahụ nke nwere olileanya ikere òkè n’iweghachi Paradaịs—buru okwu ndị a n’uche nke Jisọs gwara ndị Leọdisia!—2 Pita 3:13; Ọrụ 3:19-21.

25. (a) Dị ka ọ dị n’ozi ndị bu ụzọ, olee otú Jisọs si mechie ozi o zijeere ndị Leọdisia? (b) Olee ụzọ ndị Kraịst nke oge a n’otu n’otu kwesịrị isi zaghachi n’okwu Jisọs gwara ọgbakọ ahụ dị na Leọdisia?

25 Dịkwa ka n’ozi ndị mbụ, Jisọs mechiri ozi nke a site n’okwu agbamume ndị a: “Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst.” (Mkpughe 3:22) Anyị agamiwo n’ime mgbe ikpeazụ. Ihe àmà jupụtara gburugburu anyị na Krisendọm jụrụ oyi n’ihe banyere ịhụnanya. N’ụzọ dị iche na nke a, ka anyị onwe anyị, dị ka ezi ndị Kraịst, jiri ịnụ ọkụ n’obi zaghachi n’ozi Jisọs zijeere ọgbakọ ahụ dị na Leọdisia, ee, n’ozi asaa nile ahụ nke Onyenwe anyị zijeere ọgbakọ ndị ahụ. Anyị pụrụ ime nke a site n’ịrụsi ọrụ ike mgbe anyị na-ekere òkè ná mmezu nke oké amụma Jisọs maka ụbọchị anyị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:12-14.

26. Olee mgbe ọzọ Jisọs kwuru okwu kpọmkwem gwa Jọn, ma, na gịnị ka ọ na-ekere òkè?

26 Ndụmọdụ Jisọs nyere ọgbakọ asaa ahụ agwụsiwo. Ọ gwaghị Jọn okwu ọzọ n’akwụkwọ Mkpughe ruo isi nke ikpeazụ ya; ma ọ na-ekere òkè n’ọtụtụ n’ime ọhụụ ndị ahụ, dị ka ihe atụ, n’imezu ihe ndị Jehova kpere n’ikpe. Ka anyị sonyere òtù Jọn ahụ n’inyocha ọhụụ nke abụọ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kpughere.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ndị ọkà n’igwupụta ihe mgbe ochie n’ala achọtawo ebe ndị a nile na Leọdisia.

Igbe dị na peeji nke 73]

Ịhụ Ihe Onwunwe n’Anya Megide Amamihe

Laa azụ na 1956, otu onye odeakụkọ dere, sị: “A na-eche na n’ihe dị ka otu narị afọ gara aga, otu nwoke nwere 72 ihe ndị ọ chọrọ, nke e lere 16 n’ime ha anya dị ka ihe ndị dị mkpa. Taa, a na-eche na otu nwoke ọ bụla nwere 474 ihe ndị ọ chọrọ, nke a na-ele 94 n’ime ha anya dị ka ihe ndị dị mkpa. N’otu narị afọ gara aga, ndị na-ere ahịa na-arụgide mmadụ ịzụ 200 ihe dị iche iche—ma taa, e nwere 32,000 ihe ndị ọ dị mkpa ka ndị ahịa gbaa mmadụ ume ka ọ ghara ịzụ. Ihe ndị dị mmadụ mkpa dị ole na ole—ihe ndị ọ chọrọ adịghị agwụ agwụ.” Taa, a na-ebokwasị ụmụ mmadụ echiche ahụ nke bụ na akụ na ụba na ihe onwunwe bụ isi ihe ná ndụ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-elefuru ndụmọdụ ahụ dị n’Eklisiastis 7:12 anya, nke sịrị: “Amamihe bụ ndo, ego bụkwa ndo: ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onyenwe ya dị ndụ.”

[Foto dị na peeji nke 67]

Mmiri na-abịarute Leọdisia dị ṅaraṅara n’ụzọ na-adịghị mma. Ndị Kraịst nọ na Leọdisia nwere mmụọ dị ṅaraṅara nke na-adịghị mma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya