Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ịgbalị Ịbụ Ndị Ga-enwe Mmeri
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 3. (a) Agbamume dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana? (b) Ọ bụ ezie na ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana bụ ndị ogbenye, n’ihi gịnị ka Jisọs ji sị na ha bụ ndị “ọgaranya”?

      3 “Amatara m mkpagbu gị, na ogbenye ị bụ (ma ị bụ ọgaranya), na nkwulu Chineke nke ndị na-asị na ha bụ ndị Juu, ma ha abụghị, kama ha bụ ụlọ nzukọ Setan.” (Mkpughe 2:9) Jisọs enweghị okwu nkatọ ọ bụla ọ ga-agwa ụmụnna ya ndị nọ na Smụana, ọ bụ nanị okwu ịja mma. Ha atawo ahụhụ mkpagbu dị ukwuu n’ihi okwukwe ha. Ha bụ ndị ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe, eleghị anya n’ihi ikwesị ntụkwasị obi ha. (Ndị Hibru 10:34) Otú ọ dị, ihe bụ isi nchegbu ha bụ ihe ime mmụọ, ha akpadowokwa akụ n’eluigwe, dị ka Jisọs gbara ume ka e mee. (Matiu 6:19, 20) N’ihi nke a, Onyeisi Ọzụzụ Atụrụ ahụ na-ele ha anya dị ka ndị bụ “ọgaranya.”—Tụlee Jemes 2:5.

      4. Site n’aka ole ndị ka ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana nwetara mmegide dị ukwuu, oleekwa otú Jisọs si lee ndị mmegide ndị a anya?

      4 Jisọs rịbara ama karịsịa na ndị Kraịst nọ na Smụana anagidewo mmegide dị ukwuu n’aka ndị Juu anụ ahụ. N’oge ochie, ọtụtụ ndị si n’agbụrụ nke a leziri anya megide mgbasa nke Iso Ụzọ Kraịst. (Ọrụ 13:44, 45; 14:19) Ugbu a, nanị iri afọ ole na ole mgbe Jerusalem dasịrị, ndị Juu ahụ nọ na Smụana na-egosipụtakwa otu mmụọ Setan ahụ. Ka a sịkwa ihe mere Jisọs ji lee ha anya dị ka “ụlọ nzukọ Setan”!a

  • Ịgbalị Ịbụ Ndị Ga-enwe Mmeri
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • a N’ihe dị ka 60 afọ mgbe Jọn nwụsịrị, e suru Polycarp onye dị 86 afọ ọkụ na Smụana n’ihi na o kweghị agọnarị okwukwe ya n’ebe Jisọs nọ. Akwụkwọ ahụ bụ The Martyrdom of Polycarp, nke e kwenyere na e dere ya n’oge ihe a mere, kwuru na mgbe a na-achịkọta nkụ iji suo ya ọkụ, “ndị Juu nwere ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu, dị ka ha na-emekarị, n’inye aka na nke a”—ọ bụ ezie na ogbugbu ahụ weere ọnọdụ “n’oké ụbọchị Sabat.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya