Mgbe Ha Na-agụ Ya na Otú Ha Si Erite Uru
Isi Ụtụtụ:
Di na nwunye, ndị na-arụcha ọrụ n’ebe ọzọ, kpebiri ibili nanị minit iri tupu oge ha na-ejibụ ebili n’ụtụtụ ọ bụla ma jiri oge ahụ gụkọọ Bible ọnụ tupu ha efepụ n’ụlọ. Ihe ha gụrụ na-enye ihe mgbakwasị ụkwụ maka mkparịta ụka na-ewuli elu mgbe ha hapụsịrị ụlọ.
Otu onye okenye na Nigeria na-eji usoro ihe omume e depụtara maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke eme ihe dị ka ebe mgbakwasị ụkwụ maka ọgụgụ Bible ezinụlọ n’ụlọ ya. Ha na-agụ otu akụkụ ya kwa ụbọchị mgbe ha tụlesịrị ihe mmụta dịịrị ụbọchị, nke na-abụkarị n’ụtụtụ. A na-agwa ụmụaka ka ha gụpụta akụkụ ụfọdụ ebe a ga-agụ n’ụzọ onye gụọ ibe ya agụọ. Mgbe ahụ a na-akpọ ha òkù ịjụ ajụjụ n’amaokwu ndị ahụ a gụrụ.
Otu nwunye na-elekọta ụlọ na Japan agụsịwo Bible dum otu ugbo kwa afọ kemgbe 1985. Usoro ihe omume ya bụ ịgụ ya site 20 ruo 30 minit na-amalite na n’elekere ise nke ụtụtụ kwa ụbọchị. Banyere uru ndị dị na ya, ọ sịrị: “E wusiwo okwukwe m ike. O nyeworo m aka ichefu ọrịa m ma tinye uche n’olileanya Paradaịs.”
Otu Nwanna nwanyị bụworo onye ọsụ ụzọ ruo 30 afọ ma bụrụ onye di ya na-abụghị Onyeàmà na-ebili n’elekere ise n’ụtụtụ ọ bụla ịgụ Bible ya. Usoro ihe omume ya chọrọ ịgụ ihe dị ka peji anọ site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, otu isiakwụkwọ site n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, na otu amaokwu site n’Ilu. Ọ gụchaala Bible dum kwa afọ kemgbe 1959. Ọ sịrị: “N’ihi ihe m na-agụ, m na-enwe mmetụta nke ịbụ onye Jehova hụrụ n’anya . . . M na-anata agbamume, nkasi obi, na mgbazi olu.” Ọ gbakwụnyere: “Ịgụ Bible yiri ka Jehova inye m ume ọhụrụ ná ndụ m kwa ụbọchị.”
Otu Nwanna nwanyị onye mụtara eziokwu ahụ n’ala ebe a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu nwekwara di na-eguzogide ihe ndị o kwere. O nwere ike ịgụ Bible ya site na Monday ruo Friday, n’agbata elekere isii na asaa nke ụtụtụ. Nke a enyewo ya ume nke ime ahụ. N’ịtụgharị uche n’otú ọgụgụ ihe ya siworo metụta ya, ọ sịrị: “Anyị na-amụta ịhụ Jehova na Jisọs n’anya nakwa ibi ndụ n’obi ụtọ, ọbụna ma e nwee nsogbu na ihe isi ike dị iche iche, na-amara na nkwa Jehova nile adịghị ada ada.”
Otu Nwanna nwanyị gaworo Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ kpebisiri ike ịgbaso ndụmọdụ e nyere n’ebe ahụ iji mee ka ọgụgụ Bible bụrụ ihe a ga na-eme kwa ụbọchị. Na mbụ, o nwere ike ime ya n’agbata elekere ise na isii nke ụtụtụ. Mgbe mgbanwe ọrụ mere ka nke ahụ ghara ịdị irè, ọ gafere n’agbata elekere itoolu na iri nke abalị. Mgbe ọnọdụ ịma aka ndị ọzọ bilitere, ọ sịrị, “M nọgidere na-agbanwe usoro ime ihe m ka o kwekọọ n’ọnọdụ dị iche iche.”
Mgbe Oge Na-aga n’Ụbọchị:
Ụmụnne nwanyị abụọ otu nne ji bụ́ ndị òtù nke ezinụlọ Betel na Brazil nwere omenala nke ịgụkọ Bible ọnụ ruo ihe dị ka 20 minit kwa ụbọchị mgbe nri ehihie gasịrị. Ha agụsịwo Bible dum ihe dị ka 25 ugboro; ma ha na-ede, sị: “Anyị na-ahụ ihe ọhụrụ mgbe nile, ya mere ọgụgụ Bible adịghị abụ ihe na-agwụ ike ma ọlị.”
Otu nwanna nwanyị na-alụghị di na Japan ghọtara na ya amaghị Akwụkwọ Nsọ nke ọma ọ bụ ezie na a zụlitere ya dị ka Onyeàmà; mgbe ọ ghọrọ onye ọsụ ụzọ, o kpebiri ịgụchi Bible anya. Ugbu a ọ na-enwe ọgụgụ ihe ya maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke mgbe ọ na-aga ụlọ ọgwụ maka ịnara ọgwụ otu ụbọchị kwa izu. Mgbe e mesịrị, n’ụlọ, ọ na-eme nchọpụta ya na ya so. Ka ọ na-eru n’ọgwụgwụ izu, ọ na-agụkwu Bible, na-ahọrọ akwụkwọ ya n’usoro e ji dee ha.
Otu onye gbara afọ 13 bụ́ onye gụsịworo Bible dum ugbo atọ nọ ugbu a na-agụ otu isiakwụkwọ ụbọchị ọ bụla mgbe ọ lọtara ụlọ akwụkwọ. Ọ sịrị na nke a enyeworo ya aka “inwekwu mmetụta ịhụnanya maka Jehova.”
Otu Onyeàmà nwere usoro ihe omume juru eju dị ka nwoke na-arụ ọrụ, okenye, di, na nna na-ege Bible a gụnyere na kaseti mgbe ọ ga-aga ọrụ n’ụgbọ okporo ígwè. Mgbe e mesịrị n’ụlọ ọ na-enwe ọgụgụ ihe onwe onye nke otu ebe ahụ.
Tinyere ọgụgụ ihe onwe onye ya, otu onye ọsụ ụzọ na France na-ege Bible a gụnyere na kaseti mgbe ọ na-akwadebe nri, mgbe ọ na-anya ụgbọ ala, mgbe ọ na-agabiga oge ihe isi ike, ma ọ bụ nanị maka ntụrụndụ.
Otu onye ọsụ ụzọ dị 21 afọ na Japan chetara na nne ya gbara isi akwara na ya ga-eri ihe ime mmụọ ụbọchị ọ bụla, ọ nọgidewokwa na-agụ Bible kwa ụbọchị, kemgbe ọ gbara afọ atọ, ọ bụ ezie na ọ bụghị n’otu oge ahụ mgbe nile. Mgbe ọ gụsịrị akụkụ ọ họọrọ maka ụbọchị ahụ, ọ na-ejide n’aka na ya gụgharịrị amaokwu ndị bụ isi, mgbe ahụkwa ọ ga-ewere minit ole na ole tụleghachi n’uche ya ihe ọ gụrụ.
Onyeàmà ọzọ, bụ́ onye ọsụ ụzọ, agụsịwo Bible dum ihe dị ka ugbo iri n’afọ 12 gara aga. Di ya bụ onye na-ekweghị ekwe, ya mere ọ na-ahazi ọgụgụ ihe ya n’ehihie.
Uhuruchi:
Otu onye okenye na onye ọsụ ụzọ oge nile na Japan bụ́ onye na-agụ Bible n’abalị ọ bụla tupu ya alakpuo ụra emewo nke a kemgbe afọ asatọ gara aga. Ọ sịrị: “M nwere mmasị karịsịa n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-egosi otú Jehova si eche echiche, mmetụta ọ na-enwe banyere okwu dị iche iche, na otú ọ na-esi eme ihe n’ọnọdụ dị iche iche. Site n’ịtụgharị uche n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a, e nyeworo m aka ime echiche Jehova nke m na inyere ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst na ndị ezinụlọ m aka.”
Otu okenye na France anọwo na-agụ Bible ruo otu hour n’uhuruchi ọ bụla kemgbe 1979. Mgbe mgbe ọ na-enwe nsụgharị ise ma ọ bụ isii na-adọsa n’ihu ya maka iji otu atụnyere ibe ya. Ọ sịrị na ọgụgụ ihe ọ na-eji nlezianya eme enyeworo ya aka ịghọta “ụzọ isi tinye ihe ọmụma Bible n’ọrụ n’ọnọdụ ndị na-adị kwa ụbọchị.” Nke a enyewokwara ya aka ịdịkwu irè mgbe ọ na-enye ndụmọdụ site n’Akwụkwọ Nsọ.
Kemgbe 28 afọ gara aga, otu nwanna na Nigeria emewo ya omume ya ịgụ amaokwu Akwụkwọ Nsọ e nyere n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị maka ntụle n’ụtụtụ echi ya. Tinyere nke ahụ, ọ na-agụ isi akwụkwọ Bible ahụ dum e si wepụta amaokwu ahụ. Mgbe ọ lụsịrị nwunye, ọ nọgidere na-eme nke a, na-eso nwunye ya na-agụ ma na-atụle ihe ọmụma ahụ.
Otu nwa nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu bụ́ onye nne na nna ya na-abụghị Ndịàmà emewo ya omume ya ịgụ ihe minit ise ruo iri n’abalị ọ bụla tupu ya alakpuo ụra. Ndị ahụ bụ oge dị oké ọnụ ahịa nye ya, ọ na-ekpekwa ekpere tupu na mgbe ọ gụsịrị ihe ahụ. Ihe mgbaru ọsọ ya bụ ịmara ozi nke Jehova duziri onye ọ bụla n’ime ndị dere Bible idekọ.
Otu nwanna nwoke lụworo nwunye, nọ n’ije ozi Betel, sịrị na ya agụsịwo Bible otu ugbo kwa afọ kemgbe afọ asatọ gara aga. Ọ na-agụ ihe 20 ma ọ bụ 30 minit tupu ya alakpuo ụra. Ọbụna mgbe o nwere oké ike ọgwụgwụ, ọ na-achọpụta na ọ bụrụ na ọ lakpuo ụra n’agụghị ihe, ọ pụghị ịrahụ ụra. Ọ ghaghị ibili ma gboo mkpa ime mmụọ ahụ.