Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 5/15 p. 8-9
  • Bible Gothic—Ihe Dị Ịrịba Ama A Rụzuru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bible Gothic—Ihe Dị Ịrịba Ama A Rụzuru
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ulfilas​—⁠Onye Ozi Ala Ọzọ na Onye Nsụgharị Bible
  • Akụkọ Ihe Mere Eme Oge Gboo nke Bible Gothic
  • Ihe Odide Ndị Lanarịrị
  • Iweghachi Ihe Odide nke Bible Gothic
  • Gịnị Mere Codex Vatikan Ji Bụrụ Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Otú Okwu Chineke Si Ruo Ndị Mmadụ Aka na Spen n’Oge Ochie
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ịchọpụta Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa E Dere na Baịbụl
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Codex Bezae—Ihe Odide Pụrụ Iche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 5/15 p. 8-9

Bible Gothic—Ihe Dị Ịrịba Ama A Rụzuru

NDỊ Goth bụ njikọ nke agbụrụ dị iche iche nke ndị Germany, ma eleghị anya na-esite na Scandinavia. Na narị afọ ndị mbụ nke Oge Anyị, ha kwagara ebe dị anya ruo Osimiri Ojii na osimiri Danube, ruo nnọọ ná nsọtụ nke Alaeze Ukwu Rom.

Akwụkwọ mbụ e wepụtara n’asụsụ ọ bụla nke ndị Germany bụ Bible Gothic. Taa nsụgharị a dị nanị ná mpekere mpekere. Otú ọ dị, ọ nọgidere na-abụ nsụgharị pụrụ iche na nke bara oké uru nke Akwụkwọ Nsọ. N’ihi gịnị?

Ulfilas​—⁠Onye Ozi Ala Ọzọ na Onye Nsụgharị Bible

Onye sụgharịrị Bible a bụ Ulfilas, nke a makwaara n’aha asụsụ Gothic ya bụ́ Wulfila. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Philostorgius kwuru, Ulfilas bụ nwa nwa nke ndị a dọtara n’agha n’otu mgbe ndị Goth wakporo Kapadọsia, nke bụ ugbu a akụkụ nke ebe ọwụwa anyanwụ Turkey. A mụrụ ya n’ihe dị ka n’afọ 311 O.A., Eusebius nke Nicomedia bikwasịrị ya aka n’isi ihe dị ka 30 afọ n’ihu, mụọkwa ịrụ ọrụ dị ka onye ozi ala ọzọ n’etiti ndị Goth.

“Iji mụbaa ma zie ndị ọ tọghatara ihe,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant na-ekwu, “o ji ntachi obi sụgharịa, site na Grik gaa na Gothic, Bible dum e wezụga Akwụkwọ Abụọ nke Ndị Eze.” (The Age of Faith) Taa, e wezụga otu mpekere nke akwụkwọ Nehemaịa, ihe odide ọzọ nke Bible Gothic ka dịnụ bụ akụkụ ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

Gothic abụghị asụsụ a na-ede ede. Ya mere Ulfilas chere ihu ihe ịma aka nke nsụgharị chọrọ ọgụgụ isi pụrụ iche. Ndị ọkọ akụkọ banyere ndị ụkọchukwu n’oge gboo sị na ọ bụ ya wepụtara abịdịị nwere mkpụrụ akwụkwọ 27 nke ndị Goth, nke dabeere n’ụzọ bụ isi n’abịdịị ndị Grik na Latin. Ọzọkwa, The New Encyclopædia Britannica na-ekwu na “o chepụtara usoro okwu ndị Kraịst bụ́ ndị Germany, bụ́ ndị a ka na-eji ụfọdụ n’ime ha eme ihe.”

Akụkọ Ihe Mere Eme Oge Gboo nke Bible Gothic

Ulfilas mesịrị nsụgharị ya tupu 381 O.A., nwụọkwa afọ abụọ ma ọ bụ atọ mgbe nke ahụ gasịrị. Iwu ewu nke akwụkwọ ya bụ ihe The Encyclopedia Americana gbaara akaebe, bụ́ nke na-asị na “nsụgharị ahụ bụ nke ndị Goth ndị kwalara Spain na Ịtali na-ejikarị eme ihe.” N’ezie, n’iji ọnụ ọgụgụ nke mpekere ya ka ndị dịnụ kwubie okwu, o yiri ka e wepụtara ọtụtụ Bible Gothic nke a. O yiri ka e mepụtara ọtụtụ ihe odide n’otu scriptoria nke Ravenna na Verona, n’ógbè ebe ndị Goth guzobeworo alaeze ha. Scriptoria bụ ọnụ ụlọ ndị dị n’ebe obibi ndị mọnk ebe a na-anọ ede ma na-edepụtagharị ihe odide.

Ndị Goth bịara ná ngwụsị ha dị ka otu mba n’ihe dị ka na 555 O.A., mgbe onye ọchịchị alaeze ukwu Byzantine bụ́ Justinian nke Mbụ merighachiri Ịtali. Mgbe ọdịda ha gasịrị, ka Tönnes Kleberg na-ekwu, “asụsụ Gothic na omenala ndị Goth n’Ịtali pụrụ n’anya, na-ahapụghị nnọọ apa ọ bụla. Ihe odide ndị dị n’asụsụ Gothic adịkwaghị adọrọ mmasị ọ bụla. . . . N’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu e wepụtara ha ma hichapụ ihe nile e dere na ha. E jizirị oké parchment ahụ dee ihe ndị ọhụrụ.”

Ihe Odide Ndị Lanarịrị

N’ụfọdụ n’ihe odide ndị a, e hichasịghị ihe odide ha nke ọma, na-ahapụ ihe mbụ e dere na ha ka a ka na-ahụtụ ha anya. A chọtawo ọtụtụ n’ime palimpsest, dị ka a na-akpọ ha, ma kọwaa ha. N’ụzọ dị ịrịba ama, e chekwara Codex Argenteus ahụ na-ewu ewu, nke nwere Oziọma anọ n’usoro nke Matiu, Jọn, Luk, na Mak, n’enweghị ihe mere ha.

E chere na akwụkwọ codex nke a magburu onwe ya sitere na scriptorium nke Ravenna ná mmalite nke narị afọ nke isii O.A. A na-akpọ ya Codex Argenteus, nke pụtara “Akwụkwọ Ọlaọcha,” n’ihi na e ji ink ọlaọcha dee ya. E sijiri ibe ya akwụkwọ nile nke parchment nke a odo odo, na-egosi na ma eleghị anya e nyere ikike ya maka onye eze. Mkpụrụ akwụkwọ ọlaedo tụgwara ahịrị atọ ndị mbụ nke Oziọma nke ọ bụla nakwa mmalite nke akụkụ nke ọ bụla dị iche. Aha ndị dere Oziọma ndị ahụ dịkwa n’ọlaedo n’elu “paseji” ndị dị n’akụkụ onwe ha ndị dị n’ala ala nke kọlụm nke akwụkwọ. Ndị a na-enye ntụaka gaa n’akụkụ ihe odide ndị yiri ibe ha n’Oziọma ndị ahụ.

Iweghachi Ihe Odide nke Bible Gothic

Mgbe mkposa nke mba ndị Goth gasịrị, Codex Argenteus ahụ bara uru furu. A hụghị ya ọzọ ruo mgbe ọ pụtakwara ọzọ n’etiti nke narị afọ nke 16 n’ogige ndị mọnk na Werden, nso nso Cologne, Germany.

N’afọ 1569, e bipụtara nsụgharị Gothic nke Ekpere Onyenwe Anyị, na-adọrọ uche gaa na Bible ahụ nke e si na ya nweta ya. Aha ahụ bụ Codex Argenteus pụtara nke mbụ ya n’akwụkwọ e biri ebi na 1597. Site na Werden ihe odide a batara ná nchịkọta ihe ọkà nke onye ọchịchị alaeze ukwu na Prague. Otú ọ dị, na ngwụsị nke Agha Iri Afọ Atọ na 1648, ndị Sweden ahụ nwere mmeri buuru ya na akụ̀ ndị ọzọ. Eri 1669 akwụkwọ codex a enwewo ọnọdụ na-adịgide adịgide n’ebe ndebe akwụkwọ Uppsala University Library, Sweden.

Codex Argenteus na mbụ bụ nke 336 ibe akwụkwọ mejupụtara, nke 187 n’ime ha dị n’Uppsala. A chọpụtara otu ibe akwụkwọ ọzọ​—⁠nke ikpeazụ nke Oziọma Mak​—⁠na 1970 na Speyer, Germany.

Site n’oge akwụkwọ codex ahụ pụtaghachiri, ndị mmụta malitere ịmụ akwụkwọ ahụ iji kpughee ihe asụsụ Gothic ahụ nwụworo anwụ pụtara. N’iji ihe odide nile e nwere na mgbalị ndị e mere na mbụ iji weghachi akụkụ ihe odide ahụ mee ihe, onye Germany bụ́ ọkà mmụta bụ́ Wilhelm Streitberg chịkọtara ma bipụta na 1908 “Die gotische Bibel” (Bible Gothic), na-enwe akụkụ ihe odide Grik na nke Gothic ná ncherịta ihu onwe ha.

Taa, Bible Gothic nke a na-adọrọ mmasị karịsịa nye ndị mmụta. Otú ọ dị, eziokwu bụ na e wepụtara ya ma were ya n’ihe dị oké ọnụ ahịa n’ụbọchị ndị mbụ nke nsụgharị Bible, na-agba akaebe maka ọchịchọ na mkpebi siri ike nke Ulfilas ịsụgharị Okwu Chineke gaa n’ihe bụ mgbe ahụ asụsụ ọgbara ọhụrụ. Ọ matara n’ụzọ ziri ezi na nanị n’ụzọ nke a ka ndị Goth pụrụ isi nwee olileanya ịghọta eziokwu ndị Kraịst.

[Ebe e si nweta foto dị na peeji 9]

A natara Uppsala University Library, Sweden, ikike

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya