Ụlọikpe Dị Elu Nke Europe Akwado Ikike Ime Nkwusa Na Gris
N’IHI gịnị ka a ga-eji jichie nwoke nke ndị agbata obi ya na-eto ihe karịrị ugboro 60 eri 1938? N’ihi gịnị ka a ga-eji kpụta onye a na-elekọta ụlọ ahịa bụ́ onye na-akwụwa aka ọtọ nke si n’agwaetiti Krit nke Gris n’ihu ụlọikpe dị iche iche nke Gris ugboro 18, ọ nọọkwa ihe karịrị afọ isii n’ụlọ mkpọrọ? Ee, n’ihi gịnị ka a ga-eji si n’ebe nwunye ya na ụmụ ya ise nọ kpụpụ nwoke a na-arụsi ọrụ ike nke nwere ezinụlọ, Minos Kokkinakis, chụlaga ya n’agwaetiti ịta ahụhụ dị iche iche?
Iwu ndị e nyere n’afọ 1938 na 1939 na-amachi ịtọghata ndị ọzọ bụ ihe bụ isi kpatara ya. Onye ọchịchị aka ike Gris bụ́ Ioannis Metaxas, bụ́ onye na-eme ihe n’okpuru mmetụta nke Chọọchị Greek Orthodox, guzobere iwu ndị a.
N’ihi iwu a e nyere, malite na 1938 ruo 1992, e nwere 19,147 ugboro e jichiri Ndịàmà Jehova, ụlọikpe dị iche iche tụkwara ha mkpọrọ nke ngụkọta ya ruru 753 afọ, nke a nọkwara 593 n’ime ya n’ezie. E mere ihe a dum n’ihi na Ndịàmà na Gris, dị ka n’ebe ndị ọzọ, na-agbaso ntụziaka Jisọs Kraịst nyere ka e “mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile” o nyere n’iwu.—Matiu 28:19, 20.
Ma na May 25, 1993, e nwetara oké mmeri maka inwe onwe ife ofufe! N’ụbọchị ahụ Ụlọikpe Europe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ nke dị na Strasbourg, France, kwadoro ikike nwa amaala Gris nwere ịkụziri ndị ọzọ ihe ndị o kwenyere. N’ime mkpebi dị otú ahụ, ụlọikpe a dị elu nke Europe guzobere ihe nchebe ndị sara mbara maka nnwere onwe okpukpe ndị pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu ná ndụ ndị mmadụ n’ebe ọ bụla.
Ka anyị lerukwuo anya n’ihe ndị merenụ, gụnyere mkparị ndị nanị otu nwa amaala Gris nwetara, bụ́ nke dugara ná mkpebi ụlọikpe a mere ihe akụkọ.
Otú O Si Malite
Na 1938 nwa amaala nke a, Minos Kokkinakis, ghọrọ onye mbụ n’ime Ndịàmà Jehova a mara ikpe n’okpuru iwu Gris ahụ nke na-eme ka ịtọghata ndị ọzọ ghọọ ịda iwu mpụ. N’abụghị onye a nụrụ okwu ikpe ya, a chụpụrụ ya n’obodo gaa n’agwaetiti Aegean nke Amorgos ịnọ ọnwa 13. Na 1939 a mara ya ikpe ugbo abụọ ma tụọ ya mkpọrọ ọnwa abụọ na ọkara na nke ọ bụla.
Na 1940, a chụlagara Kokkinakis n’àgwàetiti Melos ịnọ ọnwa isii. N’afọ na-esonụ, n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, a tụkpuru ya n’ụlọ mkpọrọ ndị agha dị n’Atens ruo ihe karịrị ọnwa 18. Banyere oge ahụ, ọ na-echeta, sị:
“Enweghị nri n’ụlọ mkpọrọ ahụ kawanyere njọ. Ike gwụrụ anyị nke ukwuu nke na anyị apụghị ịga ije. Ma ọ bụghị maka Ndịàmà si n’ógbè ndị dị n’Atens na Piraeus bụ́ ndi sitere n’ụkọ ha nye anyị nri, anyị gaara anwụ.” E mesịa, na 1947, a tụkwara ya mkpọrọ ọzọ, ọ nọọkwa ọnwa anọ na ọkara ọzọ n’ụlọ mkpọrọ.
Na 1949, a chụlagara Minos Kokkinakis n’agwaetiti Makrónisos, aha nke na-echetara ọtụtụ ndị Gris ihe ụjọ n’ihi ụlọ mkpọrọ dị n’ebe ahụ. N’etiti ihe dị ka 14,000 ndị a tụkpuru n’ụlọ mkpọrọ mgbe ahụ na Makrónisos, ihe dị ka 40 bụ́ Ndịàmà. Akwụkwọ nkà ihe ọmụma dị n’asụsụ Grik bụ́ Papyros Larousse Britannica na-ekwu, sị: “Ụzọ mmekpọ ọnụ site n’obi ọjọọ, . . . ọnọdụ ibi ndụ, bụ́ ndị mba ndị mepere anya na-agaghị anakwere, na àgwà retọrọ eretọ nke ndị nche n’ebe ndị a tụrụ mkpọrọ nọ . . . bụ ihe mmechuihu n’akụkọ ihe mere nke Gris.”
Kokkinakis, onye nọrọ otu afọ n’ụlọ mkpọrọ dị na Makrónisos, kọwara ọnọdụ ndị ahụ: “Ndị soja, dị ka ndị so ná Njụta Okwukwe ahụ, ga-agba onye mkpọrọ nke ọ bụla ajụjụ ọnụ malite n’ụtụtụ ruo mgbede. A pụghị iji okwu kọwaa mmekpọ ọnụ ha kpatara. Isi gbakara ọtụtụ ndị mkpọrọ; e gburu ndị ọzọ; e menyere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu ọrụsị. N’abalị ndị ahụ jọgburu onwe ha mgbe anyị na-anụ ákwá na ịsụ ude nke ndị a na-emekpọ ọnụ, anyị ga-ekpe ekpere dị ka otu ìgwè.”
Mgbe ọ lanarịsịrị ihe isi ike na Makrónisos, e jichiri Kokkinakis ugboro isii ọzọ n’afọ ndị 1950, ọ nọọkwa ọnwa iri n’ụlọ mkpọrọ. N’afọ ndị 1960, e jichikwara ya ugboro anọ ọzọ, tụọkwa ya mkpọrọ ọnwa asatọ. Ma cheta, na Minos Kokkinakis bụ nanị otu n’ime ọtụtụ narị Ndịàmà Jehova ndị e jichiri ma tụọ mkpọrọ n’ọtụtụ afọ ndị ahụ n’ihi ịgwa ndị ọzọ okwu banyere okwukwe ha!
Olee otú o si bụrụ na ajọ ikpe na-ezighị ezi a na-emeso Ndịàmà Jehova na Gris mesịrị pụta n’ihu Ụlọikpe Europe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ?
Ikpe Mbụ
Ikpe ahụ malitere na March 2, 1986. N’ụbọchị ahụ Minos Kokkinakis, mgbe ahụ onye azụmahịa laworo ezumike nká nke gbara 77 afọ, na nwunye ya gara n’ebe obibi Oriakụ Georgia Kyriakaki na Sitia, Krit. Di Oriakụ Kyriakaki, bụ́ onye ndú ndị ukwe na chọọchị Orthodox dị n’ógbè ahụ, gwara ndị uwe ojii. Ndị uwe ojii bịara jichie Mazị na Oriakụ Kokkinakis, ndị a kpụrụzịịrị gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị n’ógbè ahụ. A manyere ha ịnọ ọnọdụ abalị ahụ n’ebe ahụ.
Gịnị ka e boro ha ebubo ya? Otu ahụ e boro Ndịàmà Jehova ọtụtụ puku ugbo n’ime 50 afọ gara aga, ya bụ, na ha na-atọghata ndị ọzọ. Usoro Iwu Gris (1975), Ndepụta nke 13, na-asị: “A machibidoro ịtọghata ndị ọzọ.” Tụlekwuo iwu ndị Gris, akụkụ nke 4, nọmba 1363/1938 na 1672/1939, nke na-eme ka ịtọghata ndị ọzọ bụrụ ịda iwu mpụ. Ọ na-asị:
“‘Ịtọghata ndị ọzọ’ pụtara, kpọmkwem, mgbalị ọ bụla pụtara ìhè ma ọ bụ ghara ịpụta ìhè itinye aka ná nkwenkwe okpukpe nke onye na-ekpe okpukpe dị iche . . . , na-eburu n’uche imebi nkwenkwe ndị ahụ, site n’ụdị mkpali ọ bụla ma ọ bụ nkwa ihe mkpali ma ọ bụ nkwado uche ma ọ bụ enyemaka ihe onwunwe, ma ọ bụ n’ụzọ aghụghọ ma ọ bụ site n’iji enweghị ahụmahụ ya, ya ịtụkwasị gị obi, mkpa ya, ọgụgụ isi ya dị ala, ma ọ bụ ya amaghị nke a na-akọ, mee ihe.”
Ụlọikpe Maka Ndị Mpụ na Lasithi, Krit, nụụrụ okwu ikpe ahụ na March 20, 1986, ma kwuo na ikpe ime ndị na-eso ụzọ mara Mazị na Oriakụ Kokkinakis. A tụrụ ha abụọ mkpọrọ ọnwa anọ. N’ịma di na nwunye ahụ ikpe, ụlọikpe ahụ kwupụtara na ndị ahụ na-azara ọnụ ha etinyewo aka “ná nkwenkwe okpukpe nke ndị Kraịst Orthodox . . . site n’iji enweghị ahụmahụ ha, ọgụgụ isi ha dị ala, na ha amaghị nke a na-akọ, mee ihe.” A sịkwara na ndị ahụ na-azara ọnụ ha “na-agba [Oriakụ Kyriakaki] ume site ná nkọwa ha amamihe dị na ya ma dị akọ . . . ịgbanwe nkwenkwe ya nke ndị Kraịst Orthodox.”
E wegaara Ụlọikpe Mkpegharị nke Krit mkpebi ahụ. Na March 17, 1987, ụlọikpe a nke Krit tọhapụrụ Oriakụ Kokkinakis ma kwado ikpe a mara di ya, ọ bụ ezie na o belatara mkpọrọ ọ ga-anọ ruo ọnwa atọ. Mkpebi ikpe ahụ kwuru na Mazị Kokkinakis ejiwo “enweghị ahụmahụ [Oriakụ Kyriakaki], ọgụgụ isi ya dị ala, na ya amaghị nke a na-akọ, mee ihe.” O kwuru na ọ “malitere ịgụpụta akụkụ ihe odide ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ nke o ji nkà kọwaa n’ụzọ nwanyị ahụ bụ onye Kraịst, n’ihi enweghị ọzụzụ zuru ezu n’ozizi, na-apụghị ịgbagha.”
N’echiche na-ekwekọghị na nke ahụ, otu n’ime ndị ọkà ikpe mkpegharị ahụ dere na Mazị Kokkinakis “kwesịkwara ka a tọhapụ ya, ebe ọ bụ na enweghị ihe àmà na-egosi na Georgia Kyriakaki . . . enweghị ahụmahụ n’ezie n’ozizi ndị Kraịst Orthodox, ebe ọ lụrụ onye ndú ndị ukwe, ma ọ bụ na o nwere n’ezie ọgụgụ isi dị ala ma ọ bụ bụrụ n’ezie onye na-amaghị nke a na-akọ, nke na onye ahụ na-azara ọnụ ya ga-eji ya mee ihe ma . . . [si otú ahụ] kpalie ya ịghọ onye òtù nke ịrọ òtù Ndịàmà Jehova.”
Mazị Kokkinakis buru okwu ahụ gaa n’Ụlọikpe O Kwuchaa Ọ Gwụ nke Gris, Ụlọikpe Kasị Elu nke Gris. Ma ụlọikpe ahụ kagburu okwu ahụ n’April 22, 1988. Ya mere n’August 22, 1988, Mazị Kokkinakis wegaara Òtù Europe Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ okwu ahụ. E mesịrị nabata mkpesa ya na February 21, 1992, webatakwa ya n’Ụlọikpe Europe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ.
Ihe Ndị E Kpere n’Okwu Ikpe Ahụ
Ebe Gris so ná mba ndị mejupụtara Kansụl nke Europe, iwu ji ya ikwekọ ná Ndepụta Nile nke Nkwekọrịta Europe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ. Ihe Ndepụta nke 9 nke Nkwekọrịta ahụ na-agụ, sị: “Nnwere onwe nke echiche, akọ na uche na okpukpe ruuru onye ọ bụla; ihe iruru mmadụ nke a gụnyere nnwere onwe ịgbanwe okpukpe ma ọ bụ nkwenkwe ya na nnwere onwe, nanị ya ma ọ bụ n’ìgwè ya na ndị ọzọ na n’ihu ọha ma ọ bụ ná nzuzo, igosipụta okpukpe ma ọ bụ nkwenkwe ya, n’ofufe, nkụzi, ihe omume na ememe.”
Otú a, gọọmenti Gris ghọrọ onye na-azara ọnụ ya n’ụlọikpe Europe. E boro ya ebubo ihi aka n’anya na-emebi ihe ruuru nwa amaala Gris ikpe okpukpe n’ụzọ kwekọrọ n’iwu Jisọs Kraịst nyere, ya bụ, ‘ịkụzi ihe na ime ndị na-eso ụzọ.’ (Matiu 28:19, 20) Ọzọkwa, Pita onyeozi kwuru, sị: “[Jisọs] wee nye anyị iwu ka anyị kwusaara [ndị mmadụ], ka anyị kwusiekwa ike.”—Ọrụ 10:42.
Mbipụta pụrụ iche na 1992 nke magazin Human Rights Without Frontiers bu isiokwu ihu akwụkwọ akụkọ bụ́ “Gris—Ịkpachara Anya Na-emebi Ihe Ndị Ruuru Mmadụ.” Magazin ahụ kọwara na peji nke 2, sị: “Gris bụ nanị mba dị n’òtù EC [European Community] nke dịkwa na Europe nke nwere ụkpụrụ iwu ịta ahụhụ nke chọrọ ịnara nha na ịtụ mkpọrọ maka onye ọ bụla na-akpali onye ọzọ ịgbanwe okpukpe ya.”
Ya mere ka ọ dị mgbe ahụ, e nwere oké mkpali ma n’etiti ndị ọrụ iwu ma ndị ọzọ. Gịnị ka a ga-ekpebi banyere iwu ndị Gris nke na-amachibido ịkụziri ndị ọzọ ihe mmadụ kwenyere?
Ịnụrụ Ikpe na Strasbourg
Ụbọchị ịnụrụ okwu ikpe ahụ mesịrị rute—November 25, 1992. Oké mmiri ruru na Strasbourg, oyi na-atụkwa nke ukwuu, ma n’ime Ụlọikpe ahụ ndị ọkà iwu ji ịnụ ọkụ n’obi kwupụta ịrụ ụka ha. Ruo hour abụọ, e wepụtara ihe àmà. Professor Phedon Vegleris, onye na-ekpechitere Kokkinakis, ruru na mkpọrọgwụ isiokwu ahụ, na-ajụ, sị: ‘Iwu mgbochi a a haziri ichebe ndị òtù Chọọchị Greek Orthodox ka a ghara ịtọghata ha gaa ná nkwenkwe okpukpe ndị ọzọ ò kwesịrị ịnọgide na-adị, a na-etinyekwa ya n’ọrụ?’
Na-egosi ijuanya n’ezie, Professor Vegleris jụrụ, sị: “O juru m anya ihe mere iwu a [nke ịtọghata ndị ọzọ] ji na-eme ka ihe omenala yie nzuzu na amaghị ihe. Anọwo m na-enwe ihe ijuanya mgbe nile ihe mere ihe omenala kwesịrị iji nwee mkpa nchebe site ná nzuzu, site n’adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ . . . Nke a bụ ihe na-enye nsogbu n’uche ma na-awụ m akpata oyi.” N’ụzọ dị ịrịba ama, onye nọchitere anya ndị gọọmenti enweghị ike inye otu ihe atụ ebe e ji iwu a mee ihe n’ebe onye ọzọ nọ e wezụga Ndịàmà Jehova.
Onye nke abụọ kpechiteere Kokkinakis, bụ́ Mazị Panagiotis Bitsaxis, gosiri otú iwu ịtọghata ndị ọzọ ahụ si bụrụ nke ezi uche na-adịghị ya. Ọ sịrị: “Nnakwere nke inwerịta mmetụta n’ahụ ndị ọzọ bụ ọnọdụ e bu ụzọ guzobe maka mkparịta ụka n’etiti ndị toro eto. Ma ọ bụghị ya, anyị ga-abụ ọha mmadụ gbara iche nke anụ ọhịa ndị na-adịghị ekwu okwu, ndị ga-eche echiche ma ghara ikwupụta uche ha, ndị ga-ekwu okwu, ma ha agaghị enwe mkparịta ụka, ndị ga-adị adị ma ha na ndị ọzọ agaghị adịkọ ọnụ.”
Mazị Bitsaxis rụkwara ụka na “a mara Mazị Kokkinakis ikpe ọ bụghị ‘n’ihi ihe o mere’ kama [n’ihi] ‘ihe ọ bụ.’” Ya mere, Mazị Bitsaxis gosiri na ọ bụghị nanị na e mebiwo ụkpụrụ nile nke nnwere onwe okpukpe kama na e tikpọsịwo ya kpam kpam.
Ndị na-anọchite gọọmenti Gris nwara ịnye echiche dị iche n’ihe bụ ezie, na-azọrọ na Gris bụ “paradaịs nke ihe ndị ruuru mmadụ.”
Mkpebi Ahụ
Ụbọchị a tụworo anya ya eri ogologo oge maka iwepụta mkpebi ikpe bịara—May 25, 1993. Ná nkwado ndị ọkà ikpe isii megide atọ, Ụlọikpe ahụ kpebiri na gọọmenti Gris emebiwo nnwere onwe okpukpe nke Minos Kokkinakis gbara 84 afọ. Gụnyere iwepụ ụzọ ndụ ya nke ozi ihu ọha n’ụta, o kwuru ka a kwụọ ya $14,400 maka iti ya aka n’obi. Ụlọikpe ahụ si otú a jụ arụmụka gọọmenti Gris na Kokkinakis na Ndịàmà Jehova ji usoro nrụgide dị iche iche eme ihe mgbe ha so ndị ọzọ na-ekwurịta okwu banyere ihe ndị ha kwere na ha.
Ọ bụ ezie na Usoro Iwu Gris na iwu mgbe ochie Gris pụrụ ịmachi ịtọghata ndị ọzọ, ụlọikpe dị elu na Europe kpebiri na iji iwu a na-akpagbu Ndịàmà Jehova ezighị ezi. O kwekọghị ná Ndepụta nke 9 nke Nkwekọrịta Europe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ.
Mkpebi ụlọikpe ahụ kọwara, sị: “Okpukpe bụ akụkụ nke ‘usoro echiche mmadụ a na-anọgide na-eme ka ọ dị ọhụrụ’ ọ bụkwa ihe na-agaghị ekwe omume iche banyere ya dị ka ihe a na-agaghị arụ ụka n’ihu ọha.”
Echiche nke otu n’ime ndị ọkà ikpe itoolu ahụ nke ha nile kwekọrịta ma ya bụ: “Ịtọghata ndị ọzọ, nke a kọwara dị ka ‘ịnụ ọkụ n’obi n’ịgbasa okwukwe,’ bụ nke a na-apụghị ịta mmadụ ahụhụ n’ihi ya; ọ bụ ụzọ—nke dị nnọọ n’iwu n’onwe ya—isi ‘gosipụta okpukpe mmadụ.’
“N’okwu ikpe a a mara onye ahụ tinyere akwụkwọ [Mazị Kokkinakis] ikpe nanị n’ihi igosipụta ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ, n’emeghị ihe ọjọọ ọ bụla n’onwe ya.”
Ihe Ndị Sitere ná Mkpebi Ikpe Ahụ
Ntụzi doro anya nke Ụlọikpe Europe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ bụ na ndị isi nke gọọmenti Gris ga-akwụsị iji iwu nke na-amachibido ime ndị na-eso ụzọ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. E nwere olileanya na Gris ga-eme ihe kwekọrọ ná nduzi ụlọikpe ahụ ma kwụsị mkpagbu ọ na-akpagbu Ndịàmà Jehova.
Ọ bụghị nzube Ndịàmà Jehova iwebata mgbanwe n’usoro ọha na eze ma ọ bụ ịgbanwe usoro iwu. Ihe bụ isi na-echegbu ha bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’irubere iwu Jisọs Kraịst nyere isi. Otú ọ dị, iji mee nke a, ọ na-amasị ha ‘ịgọpụrụ ozi ọma ahụ na ime ka o guzosie ike,’ dị ka Pọl onyeozi mere na narị afọ mbụ.—Ndị Filipaị 1:7.
Ndịàmà Jehova bụ ụmụ amaala na-edebe iwu ná mba nile ebe ha bi. Otú ọ dị, karịsịa ihe nile, a na-arụgide ha irubere iwu Chineke isi dị ka e dekọrọ ya na Bible Nsọ. Ya mere, ọ bụrụ na iwu nke ala ọ bụla amachibido ha ịkọrọ ndị ọzọ nkwenkwe ha dabeere na Bible, a na-amanye ha iwere nguzo ndị ozi ahụ: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.
[Igbe dị na peeji nke 28]
MKPAGBU NDỊ ỌZỌ NDỊ ỤKỌCHUKWU KPATARA
Mgbalị ndị ụkọchukwu na Gris iji ‘iwu kpụzie mmegbu’ anọwo na-aga n’ihu ruo ọtụtụ iri afọ. (Abụ Ọma 94:20) Ihe ọzọ mere n’agwaetiti Krit bụ nke e doziri n’isi nso a. Laa azụ na 1987 bishọp otu ógbè na ndị ụkọchukwu 13 boro Ndịàmà itoolu ebubo ime ndị na-eso ụzọ. E mesịa, na January 24, 1992, e kpere okwu ahụ.
Ọnụ ụlọ ụlọikpe ahụ jupụtara n’ọnụ. Ihe dị ka 35 ndị ụkọchukwu nọ ya ịkwado ebubo ndị ahụ gbara akwụkwọ. Otú ọ dị, Ndịàmà bịara ịgba ụmụnna ha ume anọchiworị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’oche ndị ahụ. Ọbụna tupu a malite ịnụrụ okwu ikpe, onye na-ekpechitere ndị a na-ekpe ikpe gosipụtara ihie ụzọ ndị dị oké njọ nke ọkà iwu ahụ na-anọchite anya ndị ahụ gbara akwụkwọ.
Ihe meziri bụ na ndị o metụtara n’okwu ahụ pụwara ịga ịgbarịta izu. Mgbe ha kwurịtasịrị okwu hour abụọ na ọkara, Onye Isi Oche Ụlọikpe ahụ mara ọkwa na ọkà iwu ndị ahụ na-azara ọnụ ha kwuziri ekwuzi. Ya mere na a kagbuwo ebubo ahụ e boro Ndịàmà itoolu ahụ! O kpebiri na a ga-amaliteghachi nnyocha ahụ n’isi iji chọpụta ma ndị ahụ e boro ebubo hà dara iwu ime ndị na-eso ụzọ.
Ozugbo a mara ọkwa ahụ, ọgba aghara dapụtara n’ọnụ ụlọ ụlọikpe ahụ. Ndị ụkọchukwu ahụ malitere iti mkpu iyi egwu na mkparị. Otu ụkọchukwu ji otu obe wakpo ọkà iwu Ndịàmà Jehova ma nwaa ịmanye ya ife ya ofufe. Ọ dịrị mkpa na ndị uwe ojii batara n’okwu, Ndịàmà ahụ mesịakwa nwee ike iji nwayọọ pụọ.
Mgbe a kagbusịrị ikpe ahụ, onye ikpe ọha kwadebere ebubo ọhụrụ megide Ndịàmà itoolu ahụ. E yiri ikpe ahụ ịbụ n’April 30, 1993, nanị izu atọ tupu Ụlọikpe Europe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ enye mkpebi ya n’okwu ikpe nke Kokkinakis. Ọzọkwa, e nwere ọtụtụ ndị ụkọchukwu bịara.
Ndị ọkà iwu maka mmadụ itoolu ahụ na-azara ọnụ ha tinyere akwụkwọ mmegide na ndị na-ebo Ndịàmà ahụ ebubo anọghị n’ụlọikpe. N’ime ọsọ ọsọ ya iji kwadebe ebubo ọhụrụ, onye ikpe ọha ahụ ehiewo ụzọ dị oké njọ nke ịhapụ izigara ndị ahụ na-ebo ebubo okwu ịbịa n’ụlọikpe. Ya mere ndị ọkà iwu nke Ndịàmà rịọrọ ụlọikpe ahụ ka ọ kagbuo okwu ikpe ahụ n’ihi ngahie nke a dị oké njọ.
Mgbe ahụ, ndị ọkà ikpe ahụ hapụrụ ọnụ ụlọ ụlọikpe ma gbarịta izu ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu hour. Mgbe ha lọghachiri, Onye Isi Oche Ụlọikpe ahụ, ka o hulatara isi ya ala, kwupụtara na aka Ndịàmà itoolu nile ahụ dị ọcha n’ebubo ndị ahụ.
Ndịàmà na Gris nwere ekele maka ihe si n’okwu ikpe a pụta, nakwa maka mkpebi nke Ụlọikpe Europe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ n’okwu ikpe Kokkinakis na May 25 nke afọ a. Ekpere ha bụ na n’ihi mmeri n’okwu ikpe ndị a, ha ga-enwe ike ịnọ na-ebi ndụ ndị Kraịst ha ‘n’ụzọ dị n’udo na nke dị nwayọọ n’ime nsọpụrụ Chineke nile na ikwesị nsọpụrụ nile.’—1 Timoti 2:1, 2.
[Foto dị na peeji nke 31]
Minos Kokkinakis na nwunye ya