-
Ihe Iseokwu Ahụ—Otú O si MaliteTeta!—2003 | Jenụwarị 8
-
-
Ihe Iseokwu Ahụ—Otú O si Malite
STRATTON, OHIO, U.S.A., bụ obere ógbè dịdewere Osimiri Ohio, bụ́ nke kewara Ohio na West Virginia. A na-akpọ ya obodo nta, o nwekwara onyeisi obodo. Na mberede, obere ógbè a nke ihe na-erughị mmadụ 300 bi na ya ghọrọ ebe e nwere esemokwu na 1999 mgbe ndị na-achị achị n’ebe ahụ nwara ịmanye Ndịàmà Jehova, tinyere ndị ọzọ, inweta akwụkwọ ikike tupu ha agaa n’ebe obibi ndị mmadụ n’obodo ahụ iji zie ha ozi dabeere na Bible.
N’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ okwu dị mkpa? Ka ị na-agụ akụkọ anyị a, ị ga-ahụ na ụdị iwu na nchịkwa gọọmenti a ga-akpara nnwere onwe ikwu okwu ọ bụghị nanị nke Ndịàmà Jehova, kamakwa nke ndị nile bi na United States, ókè n’ezie.
Otú Esemokwu ahụ Si Malite
Ruo ọtụtụ afọ, ndị ozi nke Ọgbakọ Wellsville nke Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị ha na ndị isi ọchịchị ole na ole nke obodo ahụ nọworo na-enwe nsogbu banyere ozi ụlọ n’ụlọ dị otú ahụ kemgbe 1979, anọwo na-eleta ndị bi na Stratton. Ná mmalite afọ ndị 1990, otu onye uwe ojii obodo ahụ chụpụrụ otu ìgwè Ndịàmà n’obodo ahụ, na-ekwu, sị: “Ma è nwere ihe ndị ruuru unu ma ọ bụ na e nweghị, ọ gbasaghị m.”
Okwu ahụ bịara biri ọkụ na 1998 mgbe onyeisi obodo Stratton n’onwe ya baara mmadụ anọ n’ime Ndịàmà Jehova mbá. Ha kwọọrọ ụgbọala si n’obodo nta ahụ na-apụta mgbe ha gaghachisịrị ebe ahụ iji soro ndị bi n’obodo ahụ nwee nkwurịta okwu, bụ́ ndị gosiworo mmasị n’inwe nkwurịta okwu dabeere na Bible. Dị ka otu n’ime ụmụ nwanyị ahụ a baara mbá kwuru, onyeisi obodo ahụ kwuru na a sị na ha bụ ụmụ nwoke, na ya gaara atụ ha nga.
Ihe kpatara esemokwu nke ugbu a bụ iwu obodo nta ahụ nke “Na-achịkwa Omume nke Ire Ihe na Ịrịọ Ihe n’Ebe Obibi Mmadụ n’Abụghị Onye A Kpọrọ Akpọ,” bụ́ nke na-achọ ka onye ọ bụla chọrọ ikere okè n’ọrụ ụlọ n’ụlọ nweta akwụkwọ ikike, n’efu, n’aka onyeisi obodo ahụ. Ndịàmà Jehova lere iwu a anya dị ka imebi nnwere onwe ikwu okwu, nnwere onwe ikpe okpukpe, na nwere onwe ịgbasa akụkọ. N’ihi ya, ha gbara akwụkwọ n’ụlọikpe etiti mgbe obodo nta ahụ jụrụ ịgụpụ ha ná ndị a na-atụ anya idebe iwu ahụ.
Na July 27, 1999, ọkàikpe nke otu ụlọikpe ógbè nke United States lebara anya n’okwu ikpe ahụ maka Ógbè Ndịda nke Ohio. O kpebiri na iwu obodo nta ahụ tiri ka a na-enweta akwụkwọ ikike kwekọrọ n’ụkpụrụ iwu. Mgbe nke ahụ gasịrị, na February 20, 2001, Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe nke United States maka Ógbè nke Isii kwadokwara na iwu ahụ e tiri kwekọrọ n’ụkpụrụ iwu.
Ka e wee dozie esemokwu ahụ, Watchtower Bible and Tract Society of New York nakwa Ọgbakọ Wellsville nke Ndịàmà Jehova rịọrọ ka Ụlọikpe Kasị Elu nke United States leba anya n’okwu ikpe ahụ.
-
-
Ụlọikpe Kasị Elu Anabata Ikpe AhụTeta!—2003 | Jenụwarị 8
-
-
Ụlọikpe Kasị Elu Anabata Ikpe Ahụ
N’AFỌ NDỊ NA-ADỊBEGHỊ ANYA, Ụlọikpe Kasị Elu ekwetawo ikpebi ihe dị ka ikpe 80 ruo 90 n’ime ihe karịrị ikpe 7,000 a na-arịọ ha ka ha leba anya na ha kwa afọ—nke ji obere ihe karịa 1 pasent.
Na May 2001, Ndịàmà Jehova tinyere Akwụkwọ Mkpesa n’Ụlọikpe Kasị Elu maka inweta ikike ilebagharị anya n’ikpe ahụ, na-ajụ, sị: “Ndị ozi okpukpe, bụ́ ndị na-agwa ndị ọzọ banyere nkwenkwe okpukpe ha site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, bụ́ nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na nke a nọworo na-eme eri otu narị afọ, ha na ndị na-agba mgbere hà bụ otu ma e lee ya anya dị ka ụkpụrụ iwu obodo si dị, hà kwesịrị idebe iwu na-ekwu na a ga-enweta ikike n’aka obodo iji gwa ndị ọzọ banyere Bible ma ọ bụ nyefee ha akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’efu?”
N’October 15, 2001, e mere ka Ngalaba Okwu Iwu nke Watchtower mara na Ụlọikpe Kasị Elu nke United States ekwetawo ileba anya n’okwu ikpe dị n’etiti Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., tinyere ndị ọzọ na Obodo Nta Stratton, tinyere ndị ọzọ!
Ụlọikpe ahụ nabatara nanị okwu ikpe nke metụtara kpọmkwem nnwere onwe ikwu okwu, ya bụ, ma nkwado Ndezigharị Mbụ ahụ nyere nnwere onwe ikwu okwu ọ̀ gụnyere oruru o ruuru mmadụ ịgwa ndị ọzọ okwu banyere ihe ọ bụla n’ebughị ụzọ nata ndị isi ọchịchị ikike.
Ugbu a, a ghaghị ịrụrụ okwu ahụ ụka n’ihu ndị ọkàikpe itoolu nke Ụlọikpe Kasị Elu nke United States. Ndịàmà ahụ ga-enwe ndị ọkàiwu nke ha; Obodo Nta Stratton ga-enwekwa ndị ọkàiwu nke ha. Olee otú ihe ga-esi gaa n’ụlọ ikpe ahụ?
[Igbe dị na peeji nke 5]
GỊNỊ BỤ NDEZIGHARỊ MBỤ?
“NDEZIGHARỊ MBỤ (NGUZOBE NKE OKPUKPE; NNWERE ONWE IKPE OKPUKPE, IKWU OKWU, ỊGBASA AKỤKỌ, ỊGBAKỌ ỌNỤ, IME MKPESA) Nzukọ Ndị Omeiwu agaghị eme iwu ọ bụla banyere nguzobe nke okpukpe, ma ọ bụ ịmachibido ikpe okpukpe n’enweghị mgbochi iwu; ma ọ bụ ịkpara nnwere onwe ikwu okwu ma ọ bụ nke ịgbasa akụkọ ókè; ma ọ bụ ikike ndị mmadụ nwere izukọta n’udo, na ịrịọ Gọọmenti arịrịọ maka ileba anya ná mkpesa.”—Ụkpụrụ Iwu United States.
“Ndezigharị Mbụ ahụ bụ ebe usoro ọchịchị onye kwuo uche ya nke United States hiwere isi. Ndezigharị Mbụ machibidoro Nzukọ Ndị Omeiwu ime iwu ndị na-egbochi nnwere onwe ikwu okwu, nke ịgbasa akụkọ, nke izukọta n’udo, ma ọ bụ nke ime mkpesa. Ọtụtụ ndị na-ele nnwere onwe ikwu okwu anya dị ka nnwere onwe nke kasị mkpa na ntọala nke nnwere onwe ndị ọzọ nile. Ndezigharị Mbụ ahụ machibidokwara Nzukọ Ndị Omeiwu ime iwu ndị na-eguzobe okpukpe ọchịchị na-akwado ma ọ bụ nke na-egbochi nnwere onwe ikpe okpukpe.” (The World Book Encyclopedia) N’ụzọ na-akpali mmasị, ná mkpebi ikpe dị n’etiti Cantwell na Connecticut, 310 U.S. 296 (1940), bụ́ mkpebi ikpe dị ịrịba ama nke metụtakwara Ndịàmà Jehova, Ụlọikpe Kasị Elu nke United States kpebiri na Ndezigharị Mbụ ahụ machibidoro ọ bụghị nanị “Nzukọ Ndị Omeiwu” (gọọmenti etiti) kamakwa ọchịchị ime obodo (steeti na ime obodo) ime iwu ndị ga-emebi nnwere onwe ndị e nwere ná Ndezigharị Mbụ ahụ n’ụzọ na-ekwekọghị n’ụkpụrụ iwu.
[Foto ndị dị na peeji nke 5]
Okwu ahụ metụtara ụdị dịgasị iche iche nke ịga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]
Photograph by Franz Jantzen, Collection of the Supreme Court of the United States
-
-
Nzọụkwụ Mbụ—Nrụrịta Ụka n’Ihu Ụlọikpe Kasị EluTeta!—2003 | Jenụwarị 8
-
-
Nzọụkwụ Mbụ—Nrụrịta Ụka n’Ihu Ụlọikpe Kasị Elu
ỤBỌCHỊ E WEPỤTARA a ga-enwe nrụrịta ụka ahụ n’ihu Ọkàikpe Ukwu William Rehnquist na ndị ọkàikpe ibe ya asatọ nke Ụlọikpe Kasị Elu bụ February 26, 2002. Ìgwè nke ndị ọkàiwu anọ mejupụtara kpechitere ọnụ Ndịàmà Jehova.
Onye ndú ndị ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Ndịàmà ji okwu na-akpali mmasị malite arụmụka ya: “Ọ kụọla elekere anya 11:00 nke ụtụtụ Saturday n’Obodo Nta Stratton. [Mgbe ahụ, ọ kụrụ aka ugboro atọ n’elu tebụl ikpo okwu.] ‘Ị̀ bọọla chi. N’ihi ihe ndị mere n’oge na-adịbeghị anya, etinyewo m mgbalị dị ukwuu iji bịa n’ebe obibi gị ịgwa gị ihe Onye Amụma bụ́ Aịzaịa kọwara dị ka ihe ka mma. Nke ahụ bụ oziọma ahụ Kraịst Jizọs kwuru banyere ya, oziọma nke Alaeze Chineke.’”
Ọ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Ọ bụ ime mpụ bụ́ ịga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ n’Obodo Nta Stratton ma zie ozi ahụ ọ gwụla ma onye ahụ ò buru ụzọ nweta akwụkwọ ikike n’aka obodo nta ahụ iji mee otú ahụ.”
‘Ọ̀ Bụ na Unu Adịghị Ekwu Ka E Nye Unu Ego?’
Ọkàikpe Stephen G. Breyer jụrụ ajụjụ ụfọdụ dị mkpa banyere Ndịàmà. Ọ jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na ndị kpọrọ gị adịghị ekwu ka e nye ha ego, ọbụnadị otu peni, nakwa [na] ha adịghị ere Bible, na ha adịghị ere ihe ọ bụla, nanị ihe ha na-eme bụ ikwu, sị, ‘Achọrọ m ịgwa gị banyere okpukpe’?”
Ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Ndịàmà zara, sị: “Nna Anyị Ukwu, ihe ndị meworonụ doro nnọọ anya, n’Obodo Nta Stratton, Ndịàmà Jehova ekwughị ka e nye ha ego. N’ógbè ndị ọzọ, ihe ndị meworonụ dokwara anya na mgbe ụfọdụ ha ga-ekwu banyere onyinye afọ ofufo. . . . Anyị adịghị achọ ebe anyị ga-arịọta ego. Nanị ihe anyị na-achọ bụ ịgwa ndị mmadụ banyere Bible.”
Ọ̀ Dị Mkpa Inweta Ikike n’Aka Gọọmenti?
Ọkàikpe Antonin Scalia ji nghọta jụọ, sị: “Echiche unu ọ́ bụghị na unu ekwesịghị ịgakwuru onyeisi obodo ma rịọ maka akwụkwọ ikike iji gwa ndị agbata obi unu banyere ihe na-akpali mmasị?” Ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Ndịàmà ahụ zaghachiri, sị: “Anyị ekwenyeghị na Ụlọikpe a kwesịrị ịkwado iwu Gọọmenti nke chọrọ ka nwa amaala nweta akwụkwọ ikike iji gwa nwa amaala ọzọ okwu n’ebe obibi ya.”
Mgbanwe nke Arụmụka, Mgbanwe nke Ọnọdụ Uche
Oge eruwo ugbu a ka Obodo Nta ahụ kwuo nke ha. Onye ndú ndị ọkàiwu ha kọwara iwu Stratton, na-ekwu, sị: “Stratton ji ikike nchịkwa o nwere eme ihe mgbe ọ chọrọ ịhụ na e chebere oge ndị bi na ya ji anọrọ onwe ha, mgbe ọ chọrọ igbochi mpụ. Iwu megidere ịgagharị na ịrịọ arịrịọ n’ebe obibi mmadụ chọrọ nanị ka e buru ụzọ debanye aha n’akwụkwọ nakwa ka mmadụ jide akwụkwọ ikike mgbe ọ na-aga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ.”
Ọkàikpe Scalia wanyere ji ahụ mma n’ebe o kwesịrị mgbe ọ jụrụ, sị: “Ọ̀ dị okwu ikpe ọzọ unu maara anyị [Ụlọikpe Kasị Elu] lebatụworo anya na ya bụ́ nke metụtara iwu sara mbara dị ka nke a, nke metụtara ịrịọ arịrịọ, ọ bụghị ịrịọ ego, ọ bụghị ire ngwá ahịa, kama ọbụna, nke metụtara ihe dị ka, ‘Achọrọ m ikwu banyere Jizọs Kraịst,’ ma ọ bụ ‘Achọrọ m ikwu banyere ichebe gburugburu ebe obibi?’ Ànyị elebatụwo anya n’okwu ikpe dị otú ahụ?”
Ọkàikpe Scalia gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ dịghị ikpe dị otú ahụ m maara e kpetụworo n’ime ihe karịrị narị afọ abụọ gara aga.” N’ebe a ka Ọkàikpe Ukwu Rehnquist kwuru n’ụzọ na-atọ ọchị, sị: “Ị dịrubeghị ndụ otú ahụ.” Nke ahụ kpasuru ọchị n’ụlọikpe ahụ. Ọkàikpe Scalia gara n’ihu n’arụmụka ya, sị: “Ókè okwu a saruru mbara bụ ihe ọhụrụ n’anya m.”
Ọ̀ Bụ Echiche Magburu Onwe Ya?
Ọkàikpe Anthony M. Kennedy jụrụ ajụjụ a kapịrị ọnụ, sị: “I chere na ọ bụ echiche magburu onwe ya bụ́ na m ga-anatarịrị Gọọmenti akwụkwọ ikike tupu mụ agbadaa n’okporo ámá, bụ́ ebe m na-amaghị ndị nile bi na ya, [ma] kwuo, sị, Achọrọ m ịgwa unu okwu n’ihi na otú e si ekpofu ihe adịghị mma, n’ihi na ana m enwe nchegbu banyere Onye Omeiwu anyị, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ yiri ya. M̀ kwesịrị ịgwa Gọọmenti tupu mụ emee ya?” Ọ gbakwụnyere, sị, “Nke ahụ dị ịtụnanya.”
Mgbe nke ahụ gasịrị, Ọkàikpe Sandra Day O’Connor tinyere ọnụ n’arụmụka ahụ, na-ajụ, sị: “Olee banyere ụmụaka na-eme ngagharị n’oge ememe na-ekwu na ọ bụrụ na e nyeghị ha ihe ha chọrọ ha emebie ihe? Hà kwesịrị inweta akwụkwọ ikike?” Ọkàikpe O’Connor na Ọkàikpe Scalia rụkwuru ụka n’akụkụ a. Ọkàikpe O’Connor webatara arụmụka ọzọ: “Olee banyere mmadụ ịgbazite otu iko shuga n’aka onye agbata obi ya? M̀ ga-aga nweta akwụkwọ ikike iji gaa gbaziri otu iko shuga n’aka onye agbata obi m?”
Ndịàmà Hà Bụ Ndị Na-achọgharị Ndị Nkwado?
Ọkàikpe David H. Souter, jụrụ, sị: “Gịnị mere iwu a ji metụta Ndịàmà Jehova? Hà bụ ndị na-achọgharị ndị nkwado, ndị arịrịọ, ndị na-agba mgbere ahịa, ndị ahịa mbugharị, ndị ahịa na-ejegharị ejegharị? Ọ dịghị nke ọ bụla ha bụ, ka ọ̀ dị?” Ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Obodo Nta ahụ hotara iwu ahụ nke ukwuu ma gbakwụnye na ụlọikpe ka ala kọwara Ndịàmà Jehova dị ka ndị na-achọgharị ndị nkwado. Ọkàikpe Souter zaghachiri na nke a, sị: “Ọ pụtanụrụ na i nwere nkọwa sara mbara maka ndị na-achọgharị ndị nkwado, ma ọ bụrụ na ọ gụnyere Ndịàmà Jehova.”
Mgbe nke ahụ gasịrị, Ọkàikpe Breyer hotara nkọwa akwụkwọ ọkọwa okwu nyere maka ndị na-achọgharị ndị nkwado iji gosi na ọ gụnyeghị Ndịàmà. Ọ gbakwụnyere, sị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla m gụtara n’arụmụka i dere bụ́ nke kwuru ihe mere e ji chọọ ka ndị a [Ndịàmà Jehova] bụ́ ndị na-enweghị mmasị n’ego, na-enweghị mmasị n’ire ihe, ọbụna na-enweghị mmasị n’ime ntụli aka, gaa n’ụlọ ezumezu obodo ma debanye aha ha n’akwụkwọ. Gịnị bụ nzube obodo ahụ?”
“Ihe Ùgwù” nke Nkwurịta Okwu
Mgbe ahụ, Obodo Nta ahụ rụrụ ụka na “nzube nke obodo ahụ bụ igbochi iwe nke ndị nwe ebe obibi.” O mekwuru ka o doo anya na ọ bụ maka ichebe ndị bi n’obodo ahụ pụọ n’igwu wayo nakwa pụọ n’aka ndị omempụ. Ọkàikpe Scalia hotara iwu ahụ iji gosi na onyeisi obodo ahụ pụrụ ikwu ka e nyekwuo ihe ọmụma banyere onye na-edebanye aha ya n’akwụkwọ na nzube o ji eme otú ahụ iji “kọwaa n’ụzọ ziri ezi ọdịdị nke ihe ùgwù ọ chọrọ.” Ọ gbakwụnyere, n’ụzọ a kapịrị ọnụ, sị: “Unu na-ekwu na ọ bụ ihe ùgwù bụ́ ịgagharị iji mee ka ụmụ amaala ibe unu kwenye n’otu ihe ma ọ bụ n’ihe ọzọ—o kweghị m nnọọ nghọta.”
Ọkàikpe Scalia gakwara n’ihu na-ajụ, sị: “À ga-achọ ka onye ọ bụla ga-apị mgbịrịgba ọnụ ụzọ gaa ka e were akara mkpịsị aka ya n’isi ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo tupu [ya] enwee ike ịpị mgbịrịgba ọnụ ụzọ? Obere ohere ahụ e nwere na a ga-eme mpụ ò zuru ime ka a chọọ ka onye ọ bụla chọrọ ịpị mgbịrịgba ọnụ ụzọ gaa debanye aha n’isi ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo? N’ezie, ọ dịghị otú ahụ.”
Ọ̀ Na-echebe Ndị Bi n’Obodo?
Mgbe minit 20 e nyere ya gwụrụ, ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Obodo Nta ahụ nyeere osote ọkàikpe ukwu nke steeti Ohio ohere. O kwuru na iwu ahụ e tiri ka mmadụ ghara ịrịọ arịrịọ chebere ndị bi n’obodo nta ahụ pụọ ná nleta nke onye ha na-amaghị, “bụ́ onye a na-akpọghị akpọ n’ezie, [nke] nọ n’ebe obibi m . . . echekwara m na o ruuru obodo nta ahụ ikwu, sị, ‘Anyị na-enwe nchegbu banyere ụdị ihe omume dị otú ahụ.’”
Mgbe ahụ, Ọkàikpe Scalia kwuru, sị: “Obodo nta ahụ na-ekwu na ọbụna ndị ahụ na-anabata Ndịàmà Jehova, ọ bụrụgodị na owu na-ama ha, bụrụkwa ndị ga-achọ ịgwa mmadụ okwu banyere ihe ọ bụla, na ọ ka dịkwa mkpa ka ndị a [Ndịàmà Jehova] gaa debanye aha ha n’akwụkwọ na nke onyeisi obodo iji nweta ihe ùgwù nke ịpị mgbịrịgba ọnụ ụzọ ha.”
“Mmachibido Ezi Uche Dị Nnọọ na Ya”
Mgbe a na-ajụ ajụjụ ndị ahụ, Ọkàikpe Scalia kwuru otu ihe gbara ọkpụrụkpụ mgbe o kwuru, sị: “Anyị nile pụrụ ikweta na mba ndị kasị dịrị nchebe n’ụwa bụ ndị nọ n’ọchịchị aka ike. Mpụ na-adị nnọọ obere na ha. Ọ bụ ihe a maara ebe nile na, ruo n’ókè ụfọdụ, nnwere onwe na-akpata mmebi iwu ka ukwuu, isiokwu abụrụkwa ma ihe e ji maka ya tie iwu a ọ̀ na-akwụsị mmebi iwu ruo n’ókè kwesịrịnụ nke na ya na ihe ịchọ ka e nweta ihe ùgwù iji pịa mgbịrịgba ọnụ ụzọ mmadụ ga-efu hà nhata.” Mgbe ahụ, osote ọkàikpe ukwu steeti ahụ kwuru na “ọ bụ mmachibido ezi uche dị nnọọ na ya.” Ọkàikpe Scalia zaghachiri na ezi uche dị nnọọ na ya nke na “anyị apụghị ịchọta okwu ikpe ọ bụla nke na-ekwu banyere otu obodo nke metụworo ụdị iwu ahụ. Echeghị m na ezi uche dị na ya.”
N’ikpeazụ, n’ihi nrụgide nke otu n’ime ndị ọkàikpe ndị ahụ, osote ọkàikpe steeti ahụ kwetara, sị: “Agaghị m ekwetacha na mmadụ pụrụ ịmachibido ịpị mgbịrịgba ọnụ ụzọ ma ọ bụ ịkụ aka n’ọnụ ụzọ iwu kpam kpam.” Mgbe o kwusịrị nke ahụ, o mechiri okwu ya.
Mgbe a na-eme mgbagha okwu, ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Ndịàmà kọwara na iwu ahụ enweghị usoro nnyocha. “Apụrụ m ịga n’isi ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo ma kwuo, sị, ‘Abụ m [Onye dị otú a],’ ma nweta akwụkwọ ikike ma gaa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ.” Ọ kọwakwara na onyeisi obodo nwere ikike ịjụ inye onye sịrị na ya anọghị n’òtù ọ bụla akwụkwọ ikike ahụ. “Anyị kwenyere na nke a bụ n’ụzọ doro anya mkpebi onwe onye,” ka o kwuru ma gbakwụnye, sị: “Eji m nkwanye ùgwù na-ekwu na ọrụ anyị [Ndịàmà Jehova] dabeere n’akụkụ bụ́ isi ná Ndezigharị Mbụ ahụ.”
Obere oge mgbe nke a gasịrị, Ọkàikpe Ukwu Rehnquist wetara arụmụka ahụ ná njedebe, na-ekwu, sị: “Okwu ikpe a abatawo n’aka [Ụlọikpe Kasị Elu].” Nnụrụ okwu ikpe ahụ nile were nanị ihe karịrị otu awa. Ókè otu awa ahụ dịruru ná mkpa gaje ịpụta ìhè ná mkpebi ụlọikpe e dere ede bụ́ nke e wepụtara na June.
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
Ọkàikpe Ukwu Rehnquist
Ọkàikpe Breyer
Ọkàikpe Scalia
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Rehnquist: Collection, The Supreme Court Historical Society/Dane Penland; Breyer: Collection, The Supreme Court Historical Society/Richard Strauss; Scalia: Collection, The Supreme Court Historical Society/Joseph Lavenburg
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ọkàikpe Kennedy
Ọkàikpe O’Connor
Ọkàikpe Souter
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Kennedy: Collection, The Supreme Court Historical Society/Robin Reid; O’Connor: Collection, The Supreme Court Historical Society/Richard Strauss; Souter: Collection, The Supreme Court Historical Society/Joseph Bailey
[Foto dị na peeji nke 8]
Ime ụlọikpe
[Ebe E Si Nweta Foto]
Photograph by Franz Jantzen, Collection of the Supreme Court of the United States
-
-
Ụlọikpe Kasị Elu Akwadoo Nnwere Onwe Ikwu OkwuTeta!—2003 | Jenụwarị 8
-
-
Ụlọikpe Kasị Elu Akwadoo Nnwere Onwe Ikwu Okwu
ỤBỌCHỊ AHỤ DỊ OKÉ MKPA ruru na June 17, 2002, bụ́ mgbe Ụlọikpe Kasị Elu bipụtara mkpebi ya e dere ede. Gịnị ka e kpebiri? Isi akụkọ gbara n’akwụkwọ akụkọ dị iche iche mere ka nke ahụ pụta ìhè. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kpọsara, sị: “Ụlọikpe Ewepụ Ihe Mgbochi ná Nleta Ndịàmà Jehova Na-eme.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Columbus Dispatch nke Ohio kwuru, sị: “Ụlọikpe Dị Elu Akagbuo Iwu Inweta Akwụkwọ Ikike.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Plain Dealer nke Cleveland, Ohio, kwuru, n’ụzọ dị mfe, sị: “Ọ Dịghị Ndị Arịrịọ Mkpa Inweta Nkwado Site n’Isi Ụlọ Ọrụ Gọọmenti Ime Obodo.” Peeji dị n’akụkụ peeji e nwere uche akwụkwọ akụkọ bụ́ USA Today kpọsara, sị: “Nnwere Onwe Ikwu Okwu Enwee Mmeri.”
A kagburu mkpebi ndị ụlọikpe ka ala mere megide Ndịàmà Jehova mgbe e nwesịrị ntụli aka bụ́ nke mmadụ 8 kwadoro ka a kagbuo ya ebe 1 onye na-akwadoghị ya! Ọ bụ Ọkàikpe John Paul Stevens dere Mkpebi Ụlọikpe ahụ bụ́ nke dị peeji 18. Mkpebi ahụ bụ nkwupụtaghachi siri ike nke nchebe Ndezigharị Mbụ ahụ nyere ozi ihu ọha nke Ndịàmà Jehova. Ná mkpebi Ụlọikpe ahụ dere ede, ọ kọwara na Ndịàmà ahụ etinyeghị akwụkwọ maka akwụkwọ ikike n’ihi na ha na-azọrọ na “ikike ha nwere ime nkwusa sitere n’Akwụkwọ Nsọ.” Mgbe ahụ, Ụlọikpe ahụ hotara ihe akaebe ndị e zoro aka na ha n’akwụkwọ arụmụka ha: “Anyị chere na ịchọ inweta akwụkwọ ikike site n’aka obodo iji mee nkwusa ga-afọdụ nke nta ka ọ bụrụ ịkparị Chineke.”
Mkpebi Ụlọikpe ahụ kwuru, sị: “Ruo ihe karịrị afọ 50, Ụlọikpe a ewepụwo ihe mgbochi ndị e tinyere n’ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ nakwa n’ikesa akwụkwọ nta. Ọ bụghị ihe ndaba nkịtị na ihe ka ọtụtụ n’okwu ikpe ndị a metụtara ihe ndị ruuru mmadụ, ndị Ndịàmà Jehova wepụtara n’ụlọikpe bụ́ ndị dị ná Ndezigharị Mbụ ahụ, n’ihi na ịga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ bụ ihe a chọrọ ha n’aka n’okpukpe ha. Dị ka anyị kwuru n’okwu ikpe dị n’etiti Murdock na Pennsylvania, . . . (1943), Ndịàmà Jehova ‘na-ekwu na ha na-agbaso ihe nlereanya Pọl, na-ezi ihe “n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.” Ọrụ 20:20. Ha ghọtara n’ụzọ nkịtị iwu ahụ dị n’Akwụkwọ Nsọ bụ́, “Gaanụ n’ime ụwa dum kwusaara ihe nile e kere eke ozi ọma.” Mak 16:15. Site n’ime otú ahụ, ha kwenyere na ha na-erube isi n’iwu Chineke.’”
Mkpebi ahụ hotakwara okwu ikpe e nwere n’afọ 1943 ọzọ: “Ná Ndezigharị Mbụ ahụ, ụdị ihe omume okpukpe a dị mkpa dị nnọọ ka ofufe a na-efe n’ụlọ ụka nakwa ikwu okwuchukwu n’elu ikpo okwu. O ruru eru ịbụ nke e chebere dị nnọọ ka a na-echebe ihe omume okpukpe ndị a nabatara bụ́ ndị gbanyeworo mkpọrọgwụ.” N’ihota okwu ikpe e nwere n’afọ 1939, Mkpebi ahụ kwuru, sị: “Ịchọ ka a na-achịkwa ihe omume mmadụ site n’iti iwu ka e nweta akwụkwọ ikike bụ́ nke ga-eme ka ikesa akwụkwọ nta n’enweghị ihe mgbochi ghara ikwe omume bụ nnọọ imebi ihe ndị ruuru mmadụ n’ụzọ iwu.”—Ọ bụ ha dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.
Ụlọikpe ahụ kwuziri ihe dị ịrịba ama: “Ikpe ndị ahụ na-egosi na mgbalị Ndịàmà Jehova na-eme iguzogide iji iwu na-achịkwa ikwu okwu abụghị ọgụ ha na-alụ maka ihe ndị ruuru nanị onwe ha.” Mkpebi ahụ kọwara na “ọ bụghị nanị [Ndịàmà] bụ ‘ndị nkịtị’ nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e ji iwu ndị yiri nke Obodo Nta ahụ mechie ọnụ.”
Mkpebi ahụ gara n’ihu ikwu na iwu ahụ “bụ mkparị—ọ bụghị nanị nye ụkpụrụ omume ndị Ndezigharị Mbụ ahụ na-echebe, kamakwa nye echiche bụ́ na e nwere ọha mmadụ nweere onwe ya—na mgbe nwa amaala chọrọ isoro ndị ọzọ nwee nkwurịta okwu nkịtị, ọ ghaghị iburu ụzọ gwa gọọmenti banyere ọchịchọ ya ịgwa ndị agbata obi ya okwu ma nwetazie ikike ime otú ahụ. . . . Iwu nke na-achọ ka e nweta akwụkwọ ikike iji nwee nkwurịta okwu dị otú ahụ bụ ịhapụ nnọọ ụzọ e siworo na-eme ihe ná mba anyị na ụzọ iwu kwadoro ka e si na-eme ihe.” Mkpebi Ụlọikpe ahụ kwuziri banyere “mmetụta dị nnọọ njọ nke akwụkwọ ikike dị otú ahụ a chọrọ ka e nweta ga-enwe.”
Mpụ Pụrụ Ịdị
Olee banyere echiche bụ́ na akwụkwọ ikike ahụ bụ ihe nchebe pụọ n’aka ndị na-etika ụlọ na ndị omempụ ndị ọzọ? Ụlọikpe ahụ rụrụ ụka, sị: “N’agbanyeghị na anyị lere nchegbu ndị a anya dị ka ndị ezi uche dị na ha, ụkpụrụ anyị tụrụ emewo ka o doo anya na a ghaghị inwe nguzozi n’agbata nchegbu ndị a na mmetụta iwu ahụ ga-enwe n’ihe ndị ruuru mmadụ bụ́ ndị dị ná Ndezigharị Mbụ ahụ.”
Mkpebi Ụlọikpe ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “O yighị ka enweghị akwụkwọ ikike ọ̀ ga-egbochi ndị omempụ ịkụ aka n’ọnụ ụzọ na inwe nkwurịta okwu ndị iwu a na-akpọtụghị aha. Dị ka ihe atụ, ha pụrụ ịjụ ajụjụ ụzọ ma ọ bụ rịọ ka ha kpọọ fon, . . . ma ọ bụ ha pụrụ idebanye aha na-abụghị aha ha n’akwukwọ ma lafere.”
N’izo aka ná mkpebi ndị e mere n’afọ ndị 1940, Ụlọikpe ahụ, dere, sị: “Ụdị okwu ndị e jiri mee ihe ná mkpebi ndị e mere n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, bụ́ ndị mere ugboro ugboro ka ndị òtù okpukpe nke onye gbara akwụkwọ [Watch Tower Society] ghara ịbụ ndị a kpụpụrụ n’ụlọikpe gosipụtara otú Ụlọikpe a si ele nnwere onwe ndị dị ná Ndezigharị Mbụ ahụ anya bụ́ ndị okwu ikpe a metụtara.”
Gịnị ka Ụlọikpe ahụ kwubiri? “A kagbuwo mkpebi nke Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe, e weghachiwokwara ha okwu ahụ maka ilebakwu ya anya n’ụzọ kwekọrọ ná mkpebi a. Nke a bụ ntụziaka anyị.”
N’ihi ya, ihe si n’okwu ahụ pụta bụ, dị ka e kwuru n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Chicago Sun-Times, “Ụlọikpe Akwadoo Ndịàmà Jehova,” ọ bụkwa mmadụ 8 n’ime mmadụ 9 mere otú ahụ.
Gịnị Banyere Ọdịnihu?
Olee otú Ndịàmà Jehova nọ n’Ọgbakọ Wellsville dị nso si lee mmeri a e nwere n’Ụlọikpe Kasị Elu anya? N’ezie, e nweghị ihe mere ha ga-eji jiri ya tuo ọnụ ruo n’ókè nke iwetara ndị bi na Stratton ihere. Ndịàmà adịghị ewesa ndị obodo ahụ iwe bụ́ ndị kwesịrị nsọpụrụ. Gregory Kuhar, bụ́ Onyeàmà nọ n’obodo nta ahụ, kwuru, sị: “Ọ bụbughị ọchịchọ anyị iwega okwu a n’ụlọikpe. O doro anya na iwu ahụ n’onwe ya ezighị ezi. Ihe anyị mere abụghị nanị maka anyị onwe anyị, kamakwa ọ bụ maka mmadụ nile.”
Ihe ndị na-eme na-egosi na Ndịàmà emewo mgbalị dị ukwuu ịghara ịkpasu ndị nọ n’obodo nta ahụ iwe. Gene Koontz, bụ́ Onyeàmà ọzọ, kọwara, sị: “Oge ikpeazụ anyị mere nkwusa na Stratton bụ na March 7, 1998—ihe karịrị nnọọ afọ anọ gara aga.” Ọ gbakwụnyere, sị: “A gwara m na a ga-ejide m. N’ime afọ ndị ahụ, anyị nụrụ ọtụtụ akụkọ banyere egwu ndị uwe ojii na-eyi anyị na ha ga-ejide anyị. Ma, mgbe anyị kwuru na anyị chọrọ ịhụ iwu ahụ nke e dere ede, ha azaghị anyị ihe ọ bụla.”
Koontz gbakwụnyere, sị: “Ọ ga-akara anyị mma isoro ndị agbata obi anyị na-enwe mmekọrịta dị mma. Ọ bụrụ na ụfọdụ achọghị ka anyị leta ha, anyị ga-akwanyere mkpebi ha ùgwù. Ma e nwere ndị ọzọ nwere omume enyi bụ́ ndị na-anabata nkwurịta okwu Bible.”
Gregory Kuhar kọwara, sị: “Anyị ejighị okwu ikpe ahụ gaa n’ụlọikpe iji sesa ndị Stratton okwu. Nanị ihe anyị chọrọ ime bụ iguzobe nnwere onwe anyị ikwu okwu dị ka Ụkpụrụ Iwu si dị.”
Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “E mesịa, anyị nwere olileanya ịlaghachi Stratton. Obi ga-adị m ụtọ ịbụ onye mbụ ga-akụ aka n’ọnụ ụzọ mgbe anyị laghachiri. N’ime ihe kwekọrọ n’iwu Kraịst nyere, anyị aghaghị ịlaghachi.”
Ihe e kpebiri n’ikpe dị n’etiti “Watchtower na Obodo Nta Stratton” enwewo mmetụta dị ukwuu. Mgbe ọtụtụ ndị ọchịchị ime obodo nọ na United States nụrụ banyere mkpebi Ụlọikpe Kasị Elu ahụ, ha matara na a pụghịzi iji iwu ime obodo gbochie ọrụ izisa ozi ọma nke Ndịàmà Jehova. Ruo ugbu a, e doziwo ihe isi ike ndị a na-enwe n’ime nkwusa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ n’ihe dị ka ógbè 90 nke United States.
-