Iji Ọṅụ Na-atachi Obi n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa
Akụkọ nke a na-akpali akpali sitere n’aka Ndịàmà Jehova nọ na Lebanon
AFỌ ije ozi 1990 anyị malitere mgbe e nwere oké ịtụ bọmbụ na Beirut. Mgbe ahụ e nwere ndajụ nke nọgidere site n’ọgwụgwụ September 1989 ruo January 1990.
N’ime ọnwa ndị ahụ, e nyere akụkọ ozi nke ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke 2,659 ndị nkwusa (na November), ma e jiri ya tụnyere 2,467 e nwere n’afọ ije ozi 1989. E mere 44 mmadụ baptism, kwa ọnwa, nkezi nke 65 mmadụ kerekwara òkè n’ije ozi ọsụ ụzọ inyeaka. Na nke mbụ ya, e nyere akụkọ ozi nke ihe karịrị 2,000 ọmụmụ Bible, anyị malitekwara inwe olileanya ihe a pụrụ ịrụzu n’ọdịnihu.
Ma agha tiwapụkwara ọzọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Beirut, bụ́ ebe ihe ka ọtụtụ n’ọgbakọ ndị ahụ dị, ọ dịkwara mkpa ka ọtụtụ ụmụnna anyị gbalaga n’akụkụ ndị ọzọ nke mba ahụ. Ruo ọtụtụ ụbọchị, e nweghị nzirịta ozi ọ bụla dị n’etiti anyị na ọgbakọ ndị ahụ dị n’akụkụ ebe ọgba aghara ahụ metụtara, akụkọ ozi ubi ezughịkwa ezu. Otú o sina dị, ụmụnna ndị ahụ gbasasịrị agbasasị sonyeere ọgbakọ ndị dị n’ebe ndị ha gbajere, ọrụ ụlọ n’ụlọ gakwara n’ihu, na-arụpụta ihe ọma dị iche iche gburugburu mba ahụ. Ka ọ dị n’oge ahụ, ọtụtụ n’ime ụlọ ụmụnna anyị abụwo ndị e suru ọkụ ma ọ bụ ndị e bibisịrị site n’ịtụ bọmbụ ndị ahụ. Otu nwanna nwanyị nwụrụ.
Anyị ji obi ike legara Jehova anya maka enyemaka na nduzi. Ndị ọsụ ụzọ nwere obi ike wepụtara onwe ha iwere nri ime mmụọ, tinyere ihe oriri na mmiri, wejere ụmụnna anyị ndị nọ n’akụkụ ebe ndị ahụ a nọchibidoro anọchibido. N’ịbụ ndị ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova na ụmụnna ha nọ kpaliri, ọbụna na ha bara n’ihe ize ndụ nke ịgafe okporo ụzọ ndị e lijuru ogbunigwe na ha. A gbara ezi àmà mgbe ndị mmadụ hụrụ ka ihe enyemaka ndị ahụ na-abịara ezinụlọ ụmụnna anyị dị iche iche. Ha hụrụ ihe ezi ịhụnanya pụrụ ime mgbe mmadụ nile dị n’otu n’ofufe nke otu ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova.—Jọn 13:34, 35; 15:13.
N’ime afọ ije ozi ahụ, ọ dịghị otu mbipụta ọ bụla nke magazin anyị gafenahụrụ ụmụnna ahụ. Dị ka ọ dịwororịị n’ihe banyere Ụlọ Nche, a malitere ibipụtakọ magazin Teta! n’asụsụ Arabic n’otu mgbe ahụ a na-ebipụta nke Bekee malite ná mbipụta nke January 8, 1990. Ndịàmà na ndị nwere mmasị nwebigara ọṅụ ókè. Ọ bụkwa ihe mkpali ịhụ akwụkwọ ndị ọhụrụ e wepụtara n’asụsụ Arabic, dị ka akwụkwọ nta ahụ bụ Should You Believe in the Trinity? na akwụkwọ ukwu ndị ahụ bụ The Bible—God’s Word or Man’s? na Akwukwọm nke Akukọ Bible.
E wetara ihe onyinye ime mmụọ ndị a n’agbanyeghị mmechi nke ọtụtụ ụlọ ọrụ mmepụta ihe na ụlọ ọrụ ndị ọzọ dị na Beirut. Ọnọdụ akụ na ụba dị njọ ná mba ahụ dum. Ọtụtụ ebe enweghị ọkụ eletrik, mmiri, na telifonu. Ugbu a, ka ụfọdụ n’ime ụmụnna anyị kọọ ụzọ ha siworo nweta ọṅụ ọbụna mgbe ha nọ na-anagide ihe isi ike nile nke agha nke nọworo na-aga n’ihu ruo afọ 15.
‘Akụkụ Ya nke Dị Mma’
Otu nwanna nwoke nọ na Beirut dere, sị: “Nke mbụ, eji m obi m nile na-ekele Jehova n’ihi na o mewo ka anyị nọrọ ná nchebe n’ime nzukọ ya nke ezi ofufe n’agbanyeghị ọnọdụ ihe isi ike nile anyị cheworo ihu. N’oge ndị na-adịbeghị anya gara aga, enwere m ahụmahụ ụfọdụ ndị wetaara m ọṅụ, ana m elekwa ha anya dị ka akụkụ dị mma nke agha.
“N’oge a na-enwe oké ịtụ bọmbụ, anyị na ndị agbata obi anyị na-anọdụ n’elu stepụ, ebe ọ bụ ebe ahụ bụ ebe kasị dịrị ná nchebe n’oge a na-atụ bọmbụ. Ọtụtụ mgbe, anyị na-agwa ha okwu banyere Alaeze Chineke dị ka nanị ihe ngwọta e nwere nye nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ, anyị na-ekpekukwa Chineke anyị, bụ́ Jehova, ekpere ọtụtụ ugbo. Mmadụ nile mazuru nke a.
“Mgbe ụfọdụ, ịtụ bọmbụ ahụ na-anọgide ruo ọtụtụ ụbọchị, anyị apụghịkwa ije nzukọ dị iche iche. Ya mere, ana m eji magazin Ụlọ Nche bịa wee na-amụ ya mgbe anyị na-anọdụ n’elu stepụ ndị ahụ. Nke ahụ kpaliri mmasị ndị agbata obi anyị. Ụfọdụ n’ime ha adịghị ekwunyeburu anyị okwu n’ihi na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Ma mgbe otu bọmbụ dara n’ụlọ anyị, ọ tụrụ ha n’anya ịhụ ụdị ịhụnanya ụmụnna anyị gosiri. Ugbu a ha chọrọ ikwunyere anyị okwu. Nke ahụ mere ka anyị nwee ike ime ka ha nata ụtụ Teta!
“Ahụmahụ ndị a mere ka m kpebisie ike ịnọgide na-ekwu okwu banyere eziokwu ahụ. Jehova kwesịrị inweta ofufe na nsọpụrụ na otuto anyị nile.”
“Aha Jehova Zọpụtara Ndụ M”
Otu nwanna nke si n’Ọgbakọ Ras Beirut kọrọ, sị: “Mụ na nwunye m na ụmụntakịrị anyị abụọ malitere ụbọchị anyị n’ozi ụlọ n’ụlọ n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ nke Beirut. N’ehihie, anyị nwere nzukọ asụsụ Bekee n’ụlọ m. N’elekere 6:30 nke uhuruchi, ọchịchịrị agbachiwo. Nanị ndị a na-ahụ n’okporo ụzọ bụ ndị ikom bucha égbè. Bọmbụ nọ na-ezodata dị ka mmiri. Ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ụlọ anyị agbapụwo. E nweghị ma mmiri ma ọkụ eletrik. Mgbe ahụ, anyị wee nụ ka a na-akụ aka n’ọnụ ụzọ.
“N’iche na ọ pụrụ ịbụ otu n’ime ndị agbata obi anyị ndị chọrọ ịrịọ mmiri ma ọ bụ achịcha, nwunye m mepere ụzọ. Ndị ikom anọ bu égbè guzo n’ebe ahụ. Ha tụgidere nwunye m égbè wee jụọ ya ebe m nọ, na-akpọ aha m. N’izu ahụ, e siwo otú ahụ kpọrọ ndị ikom itoolu site n’ụlọ ha dị iche iche ma gbuo ha ozugbo. Mgbe ndị ikom ahụ bu égbè hụrụ m, ha tụgidere m égbè ọwụ mgbọ ndị ha bu n’isi wee nye m iwu ka m soro ha pụọ. Agwara m ha, sị: ‘M ga-eso unu jee. Ma ka m buru ụzọ jee yiri uwe.’ Eji m obi m nile kpekuo Jehova ekpere, na-arịọ enyemaka ya. Ka m kpesịrị ekpere, ahụ dajụrụ m nke ukwuu, m wee malite ịhụ ndị ikom ndị a bu égbè, ndị na-eyi egwu, dị ka ndị mmadụ efu. Apụrụ m ịgwa ha okwu n’atụghị egwu.
“Ajụrụ m ha, sị: ‘Gịnị ka unu chọrọ n’aka m? Ka anyị nọrọ n’ime ụlọ kwutụgodị okwu tupu anyị apụọ.’ Ozugbo anyị banyere n’ime palọ, onye isi ha jụrụ m, sị: ‘Olee ikike i nwere ịbanye n’ime ụlọ ndị mmadụ na-ekwusara ha ozi ọma?’ Azaghachiri m, sị: ‘Ị na-ebu égbè iji mee ihe ị chọrọ ime, ọ dịghịkwa onye na-egbochi gị. Ana m eji ozi ọma nke udo nke Jisọs nyere anyị iwu ikwusa na-aga.’ Mgbe ahụ, m wee kọwaa nkwenkwe na ọrụ nke Ndịàmà Jehova. Ozugbo m kpọtụrụ aha ahụ bụ Jehova, ha sịrị: ‘Ọ ga-ezuru anyị ịnọ ebe a jụọ gị ajụjụ. Ọ dịghị mkpa anyị ịkpọrọ gị pụọ.’ O yiri ka otu onye n’ime ha ọ̀ maara otu nwanna. Ọ sịrị: ‘Onye a dị ka Jarjoura.’
“Anyị gbaara ndị ahụ bu égbè àma, zaakwa ajụjụ ha dị iche iche ruo otu hour na ọkara. Mgbe ahụ, kama ịtụba m n’ime ebe moto ha na-ebu ibu wee buru m pụọ dị ka ha mere ndị ọzọ, ha rịọrọ m mgbaghara, sutụ m ọnụ, kwe nkwa inyere m aka mgbe ọ bụla ọ dịrị m mkpa, wee pụọ. N’oge a dum, enwere m mmetụta nke nchebe Jehova. Ikere òkè n’ozi ụlọ n’ụlọ n’ụtụtụ ahụ na ije nzukọ n’ehihie ya agbawo m ume iguzosi ike. N’eziokwu, aha Jehova zọpụtara ndụ m.”—Ilu 18:10.
“Nlekọta Jehova Gbara Anyị Gburugburu”
Otu nwanna nwoke ọzọ si Beirut deta akwụkwọ, sị: “Ọ bụ ụbọchị Wednesday, January 31, 1990. Mgbe mụ na nwanne m nwoke nọ na-arụ ọrụ n’ụlọ otu nwanna nwanyị, agha ahụ malitekwara ọzọ. Bọmbụ nọ na-ada ebe nile. N’ihi ajọ obubu agha ahụ, anyị apụghị ịlaghachi n’ụlọ anyị. Nwanna nwanyị ahụ lekọtara anyị nke ọma ọ bụ ezie na o nwere nanị ibe achịcha ole na ole.
“Echegburu m onwe m nke ukwuu n’ihi nwunye m n’ihi na ọ bụ onye Filipino, ime ihe ike nke agha amaraghịkwa ya ahụ. Otú ọ dị, n’ụbọchị nke abụọ, enwere m ike ịhapụ wee laa n’ụlọ m. E ji ọtụtụ ikpó ihe ndị na-adị n’ụlọ buchisịa okporo ụzọ, ma ekele dịrị Jehova na ọ dịghị ihe mere nwunye m. Mgbe ala dajụrụ ruo nwa mgbe, oké ịtụ bọmbụ ahụ maliteghachiri ọzọ. Anyị zoro n’ụlọ otu nwanna nke dị nso na nke anyị. Anyị dị mmadụ ise—nwunye m, nwa m nwoke gbara afọ abụọ, mụ onwe m, nwanne m nwoke, na nwunye ya. Bọmbụ, mgbọ shell, na rọketi dara gburugburu anyị, ma nlekọta Jehova gbara anyị gburugburu. Ụbọchị abụọ nke ịtụ bọmbụ gafesịrị, mgbe anyị nọgidere na-edina n’ala, anwụrụ ọkụ bọmbụ ndị ahụ jupụtakwara n’imi anyị.
“Mgbe anyị na-ege ntị n’ụda bọmbụ ndị ahụ, anyị chetara okwu Devid nke dị n’Abụ Ọma 18:1-9, 16-22, 29, 30. N’oge ihe isi ike ndị ahụ, n’agbanyeghịkwa ihe nile na-emenụ, anyị nwere obi ụtọ, anyị ka nwekwara ike inwe ihu ọchị. Anyị kpekuru Jehova ekpere na ọ bụrụ na anyị ga-anwụ, ka anyị nwụọ n’ụzọ dị mfe, n’enweghị oké ịta ahụhụ. Olileanya anyị nwere ná mbilite n’ọnwụ siri ike.
“O siri ike ikwere ihe mere n’echi ya. Ihe dị ka 25 bọmbụ dara n’ebe dị nso n’ụlọ ahụ anyị zoro n’ime ya, ma ọ dịghị otu onye n’ime anyị merụrụ ahụ. Ị̀ pụrụ iji anya nke uche gị hụ ụdị mmetụta anyị nwere mgbe anyị hụtara nchebe Jehova? N’ụtụtụ echi ya, anyị kpebiri ozugbo ahụ ịgbapụ. Nanị moto m bụ nke dị n’okporo ụzọ ahụ nke a na-esughị ọkụ. Akwọọrọ m moto gabiga ogbunigwe ndị e liri n’ala na bọmbụ dị iche iche, site n’enyemaka Jehova, anyị nwekwara ike ịgbapụ gaa n’ógbè ebe dịtụ jụụ karịa nke anyị. N’ebe ahụ, ụmụnna anyị ji ịhụnanya nye anyị uwe, ihe oriri, na ego.
“N’agbanyeghị ihe isi ike nile, anyị nwere obi ụtọ n’ihi na Jehova nọnyeere anyị. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ dị ka à ga-asị na o zipụrụ ndị mmụọ ozi ya ka ha hụ na bọmbụ ndị ahụ adasaghị anyị. (Abụ Ọma 34:7) Ee, ọṅụ anyị nwere dị ukwuu. Ma ọṅụ anyị ga-adị ukwuu karị mgbe anyị lanarịsịrị Amagedọn.”
Ọrụ Enyemaka Ihe Mberede!
Akụkụ ụfọdụ nke Beirut yiri dị ka à ga-asị na e nwere ala ọma jijiji na ya. E mebitụrụ ma ọ bụ bibisịa kpam kpam ụlọ nke ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị. Mgbe ọgba aghara nke oge a malitere, Kọmitii Alaka Ụlọ Ọrụ guzobere kọmitii ọrụ enyemaka iji lekọta mkpa ụmụnna. Ọ malitere ịrụ ọrụ na February 16, 1990, n’ihe dị ka mgbe anyị mesịrị nwee ike ịbanye n’ógbè ndị ahụ o metụtara. Nzube nke kọmitii nke a nwere akụkụ atọ: Inye ụmụnna ahụ agbamume ime mmụọ; ilekọta mkpa ha maka ego, ihe oriri, na mmiri; na inyere ha aka ịrụzi ma ọ bụ iwughachi ụlọ ha.
Ọ dịghị mkpa ịkpọ ndị ọrụ afọ ofufo akpọ. Kwa ụbọchị, ọtụtụ n’ime ha pụtara n’isi ụtụtụ inye aka. Nke a bụ okwu ụfọdụ sitere n’ọnụ ndị ahụ e nyeere aka:
Otu nwanna nwanyị, mgbe a nọ na-azachasị, na-edozighachikwa ụlọ ya, kwuru, sị: “Ana m anụbu banyere enyemaka ụmụnna na-enye mgbe ihe ọdachi mere. Ugbu a ana m ahụ ya, na-enwekwa mmetụta ya.” Ọbụna onye agbata obi ya, bụ́ nwanyị onye Alakụba, gwara nwanna nwanyị nke a, sị: “Unu hụrịtara onwe unu n’anya n’ezie. Ọ bụ nke unu bụ ezi okpukpe ahụ. Ugbu a aga m agbaje n’obodo m wee gwa mmadụ nile ihe unu na-eme n’ebe a.” Onye agbata obi nke a wetaara ndị ọrụ afọ ofufo ahụ ihe oriri.
Otu nwanna nwanyị meworo agadi kwuru, sị: “Atụrụ m anya na unu ga-abịa ileta m, ma atụghị m anya na Society ga-edunye mmadụ ka o kutere m mmiri.” Ọ na-akwa ákwá mgbe o sutụrụ nwanna nwoke ahụ nke bịara inyere ya aka ọnụ.
Otu ezinụlọ nke nwere mmadụ atọ—di na nwunye ndị bụ ndị nkwusa na-emebeghị baptism na obere nwa ha nwoke—ka e letara, nyekwa ha otu nnukwu ìgbé mmiri ara ehi, achịcha, mmiri ọṅụṅụ, na ego. Mgbe a gwara ha na ọ bụ Ndịàmà Jehova mere ndokwa nke a, nwoke ahụ kwuru, sị: “Anọrọ m na Chọọchị Evangelical ruo afọ 11, na-arụsikwa ọrụ ike n’ime ya. Ma n’ime afọ 15 ahụ a lụworo agha na Lebanon, ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ha chere echiche imere ndị òtù ha ihe dị otú a.” Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Nke a bụ n’ezie nanị nzukọ Chineke nwere.” E mere nwoke ahụ na nwunye ya baptism n’otu mgbakọ e nwere na May 1990.
Otu onye okenye ọgbakọ kwuru, sị: “Anyị amaghị okwu anyị ga-eji gosi ekele anyị nwere maka ọrụ ịhụnanya unu rụwooro ndị nọ ná mkpagbu. Nke a metụrụ m n’ahụ nke ukwuu na akwara m ákwá mgbe m hụrụ otu ìgwè ụmụ okorobịa bụ ụmụnna, ndị ọrụ afọ ofufo, ka ha na-ewughachi ụlọ nke ndị mụrụ m. Ọbụna ndị agbata obi anyị ndị na-abụghị Ndịàmà gosiri ekele ha nwere. Anyị nwere ekele n’ezie nye Jehova na nzukọ ya maka nkwado a hụrụ anya nke e nyeworo. Lee nnọọ ka okwu onye ọbụ abụ ahụ si bụrụ eziokwu, nke dị n’Abụ Ọma 144:15: ‘Ndị ihe na-agara nke ọma [“obi ụtọ,” NW] ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha.’”
“Ụdị Ndị Dị Aṅaa Ka Unu Bụ?”
Otu nwanna nwanyị nke nwere ezinụlọ dere, sị: “Achọrọ m igosi obi ekele dị omimi m nwere maka ịhụnanya nke Jehova na nzukọ ya. Ọtụtụ mgbọ shell dara n’ụlọ m, o wee gbaa ọkụ. Ọtụtụ ndị gwara anyị na a pụghị ịrụzi ya arụzi. Otú ọ dị, lee ka o guzo ugbu a, a rụzighachiwokwa ya dị ka à ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụla mere ya, ọtụtụ narị ụlọ ndị dị n’okporo ámá anyị gbakwara ya gburugburu, bụ́ ndị rere ọkụ, ndị e bibikwara ebibi.
“Ọbụna ndị agbata obi anyị, ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova, na-ajụ, sị: ‘Olee ebe ịhụnanya nke a si bịa? Ụdị ndị dị aṅaa ka unu bụ? Òle ndị bụ mmadụ ndị a ji ịnụ ọkụ n’obi dị otú a na-arụ ọrụ, ndị na-adịghị eme mkpọtụ, na-akpakwa ezi àgwà? Ngọzi dịrị Chineke onye nyeworo unu ịhụnanya na mmụọ iji onwe onye chụọ àjà dị otú a.’ Lee nnọọ ka okwu ndị ahụ si bụrụ eziokwu, ndị dị n’Abụ Ọma 84:11, 12: ‘N’ihi na anyanwụ na ọta ka Jehova, bụ́ Chineke, bụ: amara na nsọpụrụ ka Jehova ga-enye: ọ gaghị egbochi ezi ihe n’ebe ndị na-ejegharị n’izu okè nọ. Jehova nke usuu nile nke ndị agha, onye ihe na-agara nke ọma [“obi ụtọ,” NW] ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị obi na gị.’”
Otu nwoke onye nwunye ya na ụmụ ya bụ Ndịàmà Jehova dere, sị: “Ọ ga-amasị m ikele unu maka enyemaka unu n’ịrụzi ụlọ anyị. Ọrụ unu gosiri ezi ịhụnanya ndị Kraịst, bụ́ nke a na-adịghị ahụkebe n’oge ndị a. Ka Chineke gọzie mgbalị unu nile.”
Mgbe a rụghachisịrị ụlọ nke otu onye okenye ọgbakọ, o kwuru, sị: “Ọnụ anyị apụghị ịkọ ihe dị n’obi anyị. Anyị apụghị ịhụ okwu ndị anyị ga-eji gwa unu otú anyị si nwee ekele maka Jehova na nzukọ ya. Anyị nwere mmetụta nke ịdị nso Jehova n’oge mkpagbu anyị. Ịhụnanya unu agbawo ndị nile nọ n’ezinụlọ m ume ikere òkè n’inyere ndị ọzọ nọ ná mkpa aka.”
N’ime ọnwa April, 194 mmadụ ndị nọ na Lebanon nwetara ọṅụ site n’ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Anyasị Ememe Ncheta ahụ dịrị jụụ karịa anyasị ndị ọzọ, e mekwara Ememe Ncheta ahụ, na-enwe ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke 5,034 ndị biaranụ. E nwechara mgbakọ nile e mere atụmatụ ha, ngụkọta ọnụ ọgụgụ ndị e mere baptism n’afọ ahụ bụkwa 121 n’agbanyeghị ọgba aghara dị ná mba ahụ. Ọtụtụ ezinụlọ ndị nọ n’ọgbakọ ndị ahụ ahapụwo ala ahụ kpam kpam. Ma ndị ọhụrụ nwere mmasị na-enwe ọganihu iru baptism, 2,726 ndị nkwusa Alaeze ahụ nọgidekwara na-amụba. N’ime afọ ije ozi 1990, ndị Jehova nile nọ na Lebanon nwetara ahụmahụ nke ikwesị ntụkwasị obi Jehova ka o lekọtara anyị nke ọma, duziekwa anyị gabiga oge ọgba aghara.—Abụ Ọma 33:4, 5; 34:1-5.