Iweta Ìhè ahụ n’Ebe Ndị Dịpụrụ Adịpụ na Bolivia
ALA okpomọkụ dị larịị, nke jupụtara n’ihe ọkụkụ dị n’ebe ugwu na ebe ọwụwa anyanwụ nke oké ugwu ndị ahụ dị na Bolivia. Osimiri ndị na-eme mkpatụ bụ́ ndị gafere oké ọhịa na ọhịa ndị na-etoghị eto kewasịrị ndị a. Gịnị ka ọ dị ka ya ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’ebe ndị dị otú ahụ dịpụrụ adịpụ?
Were onwe gị dị ka onye nọ n’ime nnukwute ụgbọ epeepe, nke a pịpụtara site n’ógwè osisi, nke nwekwara injin n’azụ ya. Nke a bụ ahụmahụ nke mmadụ isii na-eje ozi oge nile ndị si Trinidad, bụ́ otu obodo nke dị n’akụkụ El Beni nke Bolivia. Ha akwadowo ịga njem nke a ka ha wee nwee ike ịgba àmà n’ógbè nta ndị dị n’akụkụ osimiri, bụ́ nke a na-ejibeghị ‘ozi ọma nke alaeze ahụ’ rute na mbụ. (Matiu 24:14) Mgbe ha gabigasịworo mmiri ahụ na-egbu mara mara nke sara mbara, ụgbọ epeepe ahụ malitere ịkpọda n’elu mmiri dị mkpagide na-eche ihu n’Osimiri Mamoré.
Otu onye so n’òtù ahụ kọrọ, sị: “Ọ fọrọ nke nta ka anyị ruo na Mamoré ahụ mgbe anyị chọpụtara na akụkụ ikpeazụ nke mmiri ahụ tara ata. Mgbe anyị si n’ime ụgbọ ahụ pụta, anyị malitere imikpu n’ime apịtị ruru n’apata ụkwụ anyị! Akpụkpọ ụkwụ nwunye m fụnahụrụ ya ka ọ na-agbalị inwere onwe ya. Ma site n’enyemaka ndị na-agafe agafe, anyị nwere ike ịdọkpụpụta nnukwute ụgbọ epeepe ahụ n’apịtị ma kpụgote ya n’ebe ala siri ike. Mgbe hour abụọ nke ịrụsi ọrụ ike gasịrị, anyị rutere na Mamoré ahụ.
“Mgbe ahụ anyị ji nwayọọ nyara ụgbọ ahụ na-aga n’elu osimiri ahụ, nke ikpó ájá dị elu ndị jupụtara n’ihe ọkụkụ na-eme n’ebe okpomọkụ dị n’akụkụ ya abụọ. Mgbe ha nụrụ ụda injin ụgbọ ahụ, nnukwute mbe mmiri ndị nọ n’elu ógwè osisi na-ese n’elu na-adaba n’ime mmiri, ebe azụ dolphin na-amalite n’elu mmiri mgbe ụfọdụ. Ebe mbụ anyị ga-akwụsị pụtara ìhè site n’ogologo anwụrụ ọkụ sitere n’otu ụsọ osimiri ebe a kwanyere ọkụ iji chụpụ ụmụ ahụhụ. Mgbe anyị kwụbasịrị ụgbọ anyị n’etiti alaka osisi ndị dakọtara ọnụ, anyị sooro ndị ahụ nwere omume enyi kwurịta okwu banyere ngọzi Alaeze ndị na-abịanụ. N’ihi ekele ha nwere, ha kwajuuru anyị mkpụrụ osisi na àkwá.
“Ka ụbọchị ahụ na-agabiga, anyị kwụsịrị n’ebe ndị ọzọ ịkụkwu mkpụrụ nke eziokwu. Chi ejiwo mgbe anyị rutere na San Antonio. Ndị obodo ahụ alabawo ụra. Ma, mgbe e ziri ozi na a ga-egosi ihe nkiri, a malitere ịmụnyesị oriọna. A kwadebere otu ịnyịnya na otu ụgbọ ọ na-adọkpụ ije bute ngwá ọrụ anyị bịa n’obodo ahụ. Ọtụtụ matara Ndịàmà Jehova site ma n’ihe nkiri ahụ ma ná mmadụ.
“N’echi ya anyị nọgidere na-aga n’ebe ndị ọhụrụ. N’elu ikpó ájá dị elu, ndị inyom nọ na-asa ákwà ha, na-asakwa ọbụna nwa ọhụrụ ahụ n’ime nnukwute okpokoro mbe mmiri. Ha anụtụbeghị ozi Bible anyị mbụ. N’otu ebe, ụmụ obere azụ na-amali elu na-apụta n’ime mmiri n’akụkụ ụgbọ mmiri anyị, ọtụtụ dabatakwara n’ime ya. Ya mere mgbe anyị gosichara ihe nkiri ahụ, anyị tara azụ e ghere eghe tupu anyị alakpuo ụra. Mgbe njem ahụ gwụsịrị, e tinyewo ọtụtụ akwụkwọ n’ebe nke a dịpụrụ adịpụ, anyị nwekwara afọ ojuju na anyị enyeworo ọtụtụ ndị aka ịnụ ozi ọma ahụ na nke mbụ ya.”—Tụlee Ndị Rom 15:20, 21.
Ihe Àmà nke Nduzi Ndị Mmụọ Ozi
Tinye onwe gị n’ọnọdụ nke onye e zipụrụ ịchọta otu onye n’obodo nke nwere 12,000 ndị mmadụ, bụ́ ebe ị na-agatụbeghị mbụ. Ọ dịghị ihe ọ bụla ị maara banyere ya, e wezụga aha ya. Nke ahụ bụ ihe ịma aka na-eche mmadụ abụọ na-eje ozi oge nile, bụ́ ndị rutere na Guayaramerín, na-enwe olileanya ịchọta otu onye nke mụworo Bible ma jee nzukọ dị iche iche na mbụ n’obodo ọzọ ma ugbu a kwafete n’obodo nke a. Mgbe ha zusịrị ike, di na nwunye ahụ bụ ndị ọsụ ụzọ kpebiri iga n’ụlọ oriri, ebe e nwere ọtụtụ ìgwè ndị mmadụ bụ́ ndị nọ na table dị iche iche na-eri nri ma ọ bụ na-enwe nkwurịta okwu efu. Ozugbo ahụ, otu nwoke bịakwutere di na nwunye ahụ ma malite nkwurịta okwu. Ha jụrụ ya ma ọ maara nwanyị ahụ ha na-achọ. Ọ sịrị, “Ee e, ma nne nwunye m bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.” Ebe ọ bụ na ọ dịghị Ndịàmà Jehova ọ bụla a maara nke bi n’obodo ahụ, ha chere na ọ ga-abụ na ọ maghị ihe ọ na-ekwu.
Otú ọ dị, n’ụbọchị na-esonụ ha letara nwanyị nke a meworo okenye, bụ́ onye na-adịghị ebilite n’elu àkwà n’ihi otu ụkwụ gbajiri agbaji. Nwanyị ahụ sịrị, “Abụ m otu onye n’ime Ndịàmà Jehova, ma emebeghị m baptism.” Mgbe a jụrụ ya onye kụziiri ya eziokwu ahụ, ọ tụrụ aka gaa n’otu foto nke nwa nwa ya nwanyị dị n’elu ájá ma kwuo, sị: “Ọ bụ ya.” O juru ha anya nke ukwuu! Ọ bụ nwa agbọghọ nke ha na-achọ! Ha jụrụ, sị, “N’ihi gịnị ka di nwa gị ji sị na ya amaghị onye ọ bụ?” Ọ zaghachiri, sị, “Oo, ọ lụwo di ugbu a, ọ bụkwa nanị aha e ji mara ya dị ka nwanyị lụrụ di ka ọ maara.” Nwa nwa nwanyị ahụ pụrụ apụ n’oge ahụ, ma mgbe nke ahụ gasịrị e duziri ọmụmụ Bible site n’iderịta akwụkwọ ozi. Gịnị si na nke ahụ pụta? Ma ya ma nne ya ochie nwere ọganihu ruo n’ókè nke ime baptism. E jiri ụlọ ha mee ihe dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze maka otu ọgbakọ nke na-eto eto, dịkwa ka onye na-eje ozi oge nile, nwa agbọghọ ahụ eduziwo ọtụtụ mmadụ bata ná nzukọ Jehova.
Ime Nkwusa n’Etiti Ebe Okpomọkụ
Ọzọ, weregodi ya na ụgbọ elu ị nọ na ya na-achọ ifeda n’ala n’elu ụzọ ụgbọ elu ahịhịa puru na ya nke dị na San Joaquín, kpọmkwem n’etiti ebe okpomọkụ nke Bolivia. Ahụ adịghị eru gị ala mgbe i chere echiche banyere ihe otiti ahụ dị omimi nke, n’afọ abụọ gara aga, kpochapụrụ otu ụzọ n’ime ụzọ ise nke ndị bi n’obodo nke a.
Di na nwunye ahụ bụ ndị ọsụ ụzọ si Trinidad na-abịa n’ụgbọ elu enweworị ahụmahụ nke ile ọbịa nke ndị ahụ. Onye nke bụ di na-akọ, sị: “Mkparịta ụka anyị nwere site na Bible n’oge anyị nọ n’ụgbọ elu dubara n’ọkpụkpọ òkù a kpọrọ anyị ịnọ n’ụlọ mmadụ, n’akwụghị ụgwọ. Onye anyị bi na nke ya nyere anyị ọbụna ihe oriri n’ọnụ ahịa dị ala, nke mere ka anyị nwee ohere itinye oge anyị nile n’ọrụ nkwusa anyị. Ozugbo anyị rutesịrị, a gwara anyị ka anyị gaa n’ogige ndị agha ozugbo. Mgbe onye isi ndị agha matara na anyị abụghị ndị na-emegide ndị ọchịchị kama na anyị bụ Ndịàmà Jehova, o gosipụtara mmasị pụrụ iche ma nata otu Bible, tinyere akwụkwọ e ji amụ Bible na ụtụ magazin Ụlọ Nche na Teta! Mgbe nke ahụ gasịrị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile bi n’obodo ahụ ṅara ntị nke ọma ná nkwa Bible nke ahụ ike zuru okè n’ọdịnihu dị nso.”—Mkpughe 21:4.
Mmadụ anọ ndị na-eje ozi oge nile chọrọ isite San Joaquín gaa San Ramón, ma nanị usoro ịga njem e nwere bụ ụgbọ oké ehi na-adọkpụ. Ha ji katọn akwụkwọ mere oche. N’oge na-adịghị anya ndị a nyapịara n’ihi ndagharị na mmagharị nke ụgbọ ịnyịnya ahụ, nke nwere wheel osisi dị elu. Ọbụna ọkụkọ ndị so na njem ahụ dara ọrịa site ná ndagharị ahụ.
Mgbe hour iri nke ịgbagharị n’ime ọhịa nta gasịrị, ha rutere n’ebe ọ na-adịghị otu ihe mgbaàmà na-egosi ụzọ, chi amalitewokwa iji. Onye na-anya ụgbọ ahụ mere ka ndị so ya mara ihe na-aga site n’ikwu, sị, “Echere m na anyị efuwo ụzọ!” Ha ka malitere ịtụgharị uche, sị, ‘Olee otú anyị ga-esi nọrọ n’oké ọhịa nke a jupụtara n’agwọ na anụ ọhịa ndị dị ize ndụ?’ mgbe onye ahụ na-anya ụgbọ kwukwara, sị, “Ma unu echegbula onwe unu. Ụmụ anụmanụ ndị a agawo njem nke a mbụ.” Otú ahụ ka o si mee. N’ime otu hour ha si n’oké ọhịa ahụ pụta kpọmkwem na San Ramón!
N’ebe a kwa, e jiri ọtụtụ ụbọchị mee ihe ịkpọsa ọbịbịa nke Paradaịs ná ntị ndị na-anụtụbeghị ya mbụ. Ọ dịghị Ndịàmà bi n’ebe a; ma ọ dị otu ihe mere nke gbanwere ọnọdụ ahụ.
Otu onye Katọlik na-eje ozi ala ọzọ anọgidewo na-eso Ndịàmà ahụ n’azụ ka ha na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ ha gahiekọrọ ụzọ ma zute ya n’ebe obibi nke ọzọ ha bịarutere. N’ịbụ ndị omume enyi ya juru anya, ha hapụụrụ ya akwụkwọ ahụ bụ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. Ọ bụ ezie na ya onwe ya enweghị ezi mmasị, o nyere nwunye nwanne ya akwụkwọ ahụ, bụ́ onye gụchapụrụ ihe ndị dị n’ime ya, nwekwuo ọmụmụ ihe, ma mesịa bụrụ Onyeàmà mere baptism.
Ihe Isi Ike n’Osimiri Ndị Dị n’Ebe Okpomọkụ
Ugbu a tinye onwe gị n’ọnọdụ nke onye nọ n’ime ụgbọ mmiri na-aga na mmiri dị ize ndụ, nke na-amagharị amagharị. Nkume ndị zoro ezo, ikpó ájá ndị bụ ụrọ, na úkwù osisi, tinyere mpụta mberede nke ebe mmiri sụkpuru n’ime, bụ nnọọ ihe ize ndụ ole na ole e nwere. Azụ piranha, azụ electric eel, na anụ mmiri bụ stingray jupụtara na mmiri ndị a. Ndị a bụ ihe ịma aka na-eche ụmụnna ahụ na Riberalta, bụ́ ndị nwere ọrụ nke ịgba àmà nye mmadụ ndị bi n’ógbè ebe ahụ osimiri dị.
Iji wee rute n’ebe ndị a dịpụrụ adịpụ, ha wuru otu ụgbọ mmiri a kpọrọ Luz de los Ríos (Ìhè nke Osimiri Ndị ahụ). N’oge nleta nke ndị nlekọta distrikti na sekit, e kpebiri ijiri ụgbọ mmiri ahụ gaa mee nnwale. Ihe nile gara nke ọma ruo mgbe elu ụgbọ mmiri ahụ kogidere n’elu otu alaka osisi. Otu ebili mmiri siri ike buuru ụgbọ mmiri ahụ kwaga n’otu osisi dara ada. Dị ka mma agha, otu alaka osisi ọnụ ya pịrị apị mapuru akụkụ ahụ ụgbọ mmiri ahụ—na-afọ nke nta ka ọ kpọgbuo nwunye onye nlekọta distrikti ahụ! Mmiri nubatara n’ime ya, ụgbọ mmiri ahụ wee kpuo, na-awụnye ndị o bu n’ime mmiri ahụ na-ekwo ekwo. Onye nlekọta distrikti ahụ na nwunye ya amaghịkwa ka e si egwu mmiri! Site n’enyemaka ndị maara ka e si egwu, ha rịpụtara n’elu ala n’emerụghị ahụ. Ma a hụghịkwa ụgbọ mmiri ahụ anya ọzọ kpam kpam. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, a chọtara ya na maịlụ atọ [5 kilomita] n’ebe mgbada mmiri. Ihe onwunwe nile, tinyere 20 katọn akwụkwọ, efuwo.
Ndị agha ụgbọ mmiri Bolivia nyere aka ịdọlite ya n’elu mmiri, mgbe ọtụtụ izu nke nrụzigharị gasịrị, ụgbọ mmiri ahụ dịkwa njikere ọzọ ijezu njem mbụ ya. Njem nsogbu ahụ ji ihu igwe na-adịghị mma na nsogbu injin malite.
N’ebe mbụ ụmụnna ahụ kwụsịrị ụgbọ mmiri ha, ha zutere otu òtù nke Ndị Okwuchukwu, bụ́ ndị kwara emo, sị: “Obere ụgbọ mmiri unu adịghị mma ịgba n’osimiri nke a!” Otu mgbalị e mere igosi ihe nkiri n’ebe ahụ bụ nke na-agaghị nke ọma n’ihi ígwè ọkụ generator nke nwere nsogbu. Mgbe ha lọghachiri n’osimiri ahụ ọzọ, e mere ka Ndịàmà ahụ mata na ụgbọ mmiri ndị ọzọ abịawo na-eji ngwá ígwè na-eme ka okwu daa ụda na-adọ aka ná ntị banyere ọbịbịa nke “ndị amụma ụgha.” N’ụzọ doro anya, nke a bụ aka ọrụ nke Ndị Okwuchukwu ahụ. Otú ọ dị, o mere nanị ka ọchịchọ ịmata ihe nke ndị ahụ siwanye ike.
Ọ bụ ezie na ọbịbịa nke a kwụsịrị mkpọsa ụgha site n’ọnụ ndị bụ ndị amụma ụgha n’ezie, ahụ erughị ụmụnna ahụ ala, n’ihi na ha ka nwere njem ga-ewe 21 ụbọchị iji rute Fortaleza.
Mgbe ha nọ n’ụzọ, ha gbaara chiifu nke otu agbụrụ dịpụrụ adịpụrụ àmà; ọ ṅara ntị nke ọma. Site n’otu okwu Bible otu onye n’ime ndị ọsụ ụzọ ahụ kwuru, otu ndị na-eru újú n’otu ebe dịpụrụ adịpụ nwetara nkasi obi site n’ezi olileanya ahụ dịịrị ndị nwụrụ anwụ. Otu nwoke meworo okenye nke afụ ọnụ ya na-acha ọcha kwupụtara obi ekele ya, ọ jụkwara otú ya ga-esi tụọ ụtụ magazin anyị ruo afọ iri! Na Fortaleza, 120 ndị mmadụ ritere uru site n’usoro ihe omume ihe nkiri nke Society.
Lee aha afọ ojuju ndị ọsụ ụzọ ndị a nwere iweta ìhè nke eziokwu n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ! N’ezie, ọ dịghị ụzọ e ji n’aka nke na-enyekwa afọ ojuju mmadụ pụrụ iji ndụ ya mee ihe karịa ijere Onye Okike nke ndụ n’onwe ya ozi, bụ́ Jehova Chineke.—Abụ Ọma 63:3, 4.
[Map/Foto ndị dị na peeji nke 26]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
BOLIVIA
Guayaramerín
Riberalta
Fortaleza
San Joaquín
San Ramón
Trinidad
San Antonio