Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eji Ihe Oyiyi Efe Ofufe?
N’ụwa niile, ndị Hindu, ndị Buddha, ndị Katọlik, na ndị na-ekpe Chọọchị Ọtọdọks weere ihe oyiyi dị iche iche dị ka ihe dị mkpa n’ofufe ha. N’ebe ụfọdụ n’Africa, ndị mmadụ na-eji ihe e ji osisi pịa ma ọ bụ ihe e ji nkume tụọ efe ofufe n’ihi na ha kweere na e nwere chi ma ọ bụ mmụọ nọ n’ime ha.
Ma, Ndịàmà Jehova anaghị eji ụdị ihe oyiyi ọ bụla efe ofufe. Ọ bụrụ na ị gaa n’ebe ha na-amụ ihe, nke a na-akpọ Ụlọ Nzukọ Alaeze, ị gaghị ahụ ihe oyiyi nke ndị a sị na ha bụ ndị nsọ, ihe oyiyi Jizọs ma ọ bụkwanụ nke Meri.a Ọ̀ bụ maka gịnị? Legodị ihe Baịbụl kwuru banyere ya.
Gịnị Ka Chineke Gwara Ụmụ Izrel Ka Ha Mee?
Mgbe Jehova Chineke mechara ka ụmụ Izrel pụọ n’Ijipt, ọ gwara ha hoo haa otú ọ chọrọ ka ha si na-efe ya. Iwu nke abụọ n’ime iwu ahụ a na-akpọkarị Iwu Iri, sịrị: “Emerela onwe gị ihe oyiyi a pịrị apị ma ọ bụ ọdịdị nke yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ nke dị n’elu ụwa ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa. Akpọrọla ha isiala, ekwekwala ka a rata gị ife ha ofufe, n’ihi na mụ onwe m bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.”—Ọpụpụ 20:4, 5.
N’oge Chineke nọ na-enye Mozis iwu ndị ahụ, ụmụ Izrel ji ọlaedo na-akpụ nwa ehi. Ọ ga-abụ ndị Ijipt, ndị na-efe ụmụ anụmanụ, ka ha nọ na-eṅomi. Ha akpọghị ihe oyiyi ahụ aha chi ndị Ijipt. Kama nke ahụ, ha weere ya na ọ bụ ihe ha ji efe Jehova ofufe. (Ọpụpụ 32:5, 6) Ma, gịnị ka Chineke mere? O wesoro ndị sọpụụrụ ihe oyiyi ahụ iwe dị ọkụ, Mozis kụrikwara ihe oyiyi ahụ.—Ọpụpụ 32:9, 10, 19, 20.
Mgbe e mechara, Jehova bụ́ Chineke tinyekwuru ihe n’iwu nke abụọ ahụ. O si n’ọnụ Mozis chetara ụmụ Izrel ka ha ghara imere onwe ha “ihe oyiyi a pịrị apị, ọdịdị nke ihe oyiyi ọ bụla, ihe yiri nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ihe yiri anụ ọhịa ọ bụla nke nọ n’ụwa, ihe yiri anụ ufe ọ bụla nke nwere nku nke na-efe n’eluigwe, ihe yiri ihe ọ bụla na-agagharị n’ala, ihe yiri azụ̀ ọ bụla nke nọ na mmiri n’okpuru ụwa.” (Diuterọnọmi 4:15-18) O doro anya na ụmụ Izrel ekwesịghị iji ụdị ihe oyiyi ọ bụla na-efe Chineke ofufe.
Ma, mba Izrel mechara kpewere arụsị. Iji gbazie ha, Jehova dunyere ndị amụma ya ka ha dọọ ha aka ná ntị na Ọ ga-ata ha ahụhụ maka arụsị ha na-ekpere. (Jeremaya 19:3-5; Emọs 2:8) Mba Izrel leghaara ịdọ aka ná ntị Chineke anya. N’ihi ya, n’afọ 607 tupu a mụọ Kraịst, Jehova kwere ka ndị Babịlọn bibie Jeruselem ma dọrọ mba ahụ n’agha.—2 Ihe E Mere 36:20, 21; Jeremaya 25:11, 12.
Olee Ihe Ndị Kraịst Oge Gboo Kweere?
Mgbe ndị na-abụghị ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst n’oge gboo, ha kwụsịrị iji ihe oyiyi na-efe Chineke. Legodị ihe Dimitriọs, onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe oyiyi n’Efesọs, kwuru banyere ozi ọma Pọl onyeozi nọ na-ekwusa: “Unu maara nke ọma na ọ bụ ọrụ a na-eme ka anyị na-enwe ọganihu. Unu hụkwara ma nụ otú Pọl a si mee ka ìgwè mmadụ dị ukwuu kweta, meekwa ka ha nwee echiche dị iche, ọ bụghị naanị n’Efesọs kama n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ógbè Eshia dum, na-asị na chi ndị e ji aka mee abụghị chi.”—Ọrụ 19:25, 26.
Okwu Pọl gosiri na ihe Dimitriọs kwuru na Pọl mere bụ eziokwu. Mgbe Pọl na-agwa ndị Gris nọ n’Atens okwu, ọ sịrị: “Anyị ekwesịghị iche na Chineke yiri ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ nkume, dị ka ihe a kpụrụ akpụ site na nkà na nchepụta nke mmadụ. N’eziokwu, Chineke elefuruwo oge amaghị ihe dị otú ahụ anya, ma ugbu a ọ na-agwa ihe a kpọrọ mmadụ na ha niile kwesịrị ichegharị n’ebe niile.” (Ọrụ 17:29, 30) N’otu oge, Pọl kwukwara ihe yiri nke ahụ n’akwụkwọ ozi o degaara ndị bi na Tesalonaịka ma jaa ha mma, sị: ‘Unu hapụrụ arụsị unu wee bịakwute Chineke.’—1 Ndị Tesalonaịka 1:9.
Ọ bụghị naanị Pọl bụ onye dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị ka ha ghara iji ihe oyiyi na-efe ofufe, Jọn onyeozi mekwara otú ahụ. N’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga, Jọn gwasiri Ndị Kraịst ike, sị: “Kpacharanụ anya ka unu ghara ikpere arụsị.”—1 Jọn 5:21.
Ndịàmà Jehova na-erubere iwu doro anya Chineke nyere isi nke bụ́ ka a ghara iji ụdị ihe oyiyi ọ bụla na-efe ya ofufe. Ha kweere ihe Jehova Chineke kwuru, bụ́ onye sịrị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m; agaghị m enye onye ọzọ nsọpụrụ m, agaghịkwa m enye ihe oyiyi a pịrị apị otuto m.”—Aịzaya 42:8.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a N’Ụlọ Nzukọ Alaeze ụfọdụ, e sere ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Ma, ihe mere e ji see ha abụghị na ha bụ ihe oyiyi a na-akwanyere ùgwù, kama e ji ha chọọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ahụ mma. Ndịàmà Jehova anaghị ekpeku ihe osise ndị ahụ ekpere, ha anakwaghị akpọrọ ha isiala.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 31]
“Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m; agaghị m enye onye ọzọ nsọpụrụ m, agaghịkwa m enye ihe oyiyi a pịrị apị otuto m.”—Aịzaya 42:8