Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 3/15 p. 28-30
  • Ònye Bụ Theophilus nke Antiọk?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Bụ Theophilus nke Antiọk?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akụkọ Onwe Onye
  • Ileba Anya n’Ihe Odide Ya Nile
  • Akaebe Bara Uru
  • Luk Onye Ndị Ọrụ Ibe Ya Hụrụ n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • ‘Unu Ga-abụ Ndị Àmà M’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Mkpagbu Akpalie Mmụba n’Antiọk
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ì Chetara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 3/15 p. 28-30

Ònye Bụ Theophilus nke Antiọk?

“ỊNA-AKPỌ m onye Kraịst, dị ka a ga-asị na ọ bụ aha na-adịghị mma ịza, mụ onwe m, na-ekwusi ike na m bụ onye Kraịst, na-azakwa aha a iji bụrụ onye Chineke hụrụ n’anya, na-enwe olileanya ịbara Chineke uru.”

Theophilus si otú a malite akwụkwọ ya nwere akụkụ atọ nke a kpọrọ Theophilus to Autolycus. Ọ bụ mmalite nke mgbachitere ya megide ndapụ n’ezi ofufe nke narị afọ nke abụọ. Theophilus ji anya ike mee ka a mata ya dị ka onye na-eso ụzọ Kraịst. O yiri ka o kpebisiri ike ime ihe nile ọ na-eme iji ghọọ onye “Chineke hụrụ n’anya,” n’ikwekọ n’ihe aha ya pụtara n’asụsụ Grik. Ònyedị bụ Theophilus? Olee mgbe o biri ndụ? Gịnịkwa ka ọ rụzuru?

Akụkọ Onwe Onye

A maara ihe dị nta banyere akụkọ onwe onye nke Theophilus. Ọ bụ nne na nna na-abụghị ndị Kraịst zụlitere ya. E mesịrị tọghata Theophilus gaa n’Iso Ụzọ Kraịst ma ọ bụ nanị mgbe o jisịrị nlezianya mụọ Akwụkwọ Nsọ. Ọ ghọrọ bishọp nke ọgbakọ dị n’Antiọk nke Siria, nke a maara taa dị ka Antakya, dị na Turkey.

N’ikwekọ n’iwu Jisọs, ndị Kraịst narị afọ mbụ mere nkwusa n’etiti ọha mmadụ ndị Antiọk. Luk dere banyere ihe ịga nke ọma ha, na-asị: “Aka Onyenwe anyị wee soo ha: oké ìgwè ndị kwere wee chigharịkwute Onyenwe anyị.” (Ọrụ 11:20, 21) Dị ka Chineke tụziri, ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst ghọọrọ ndị a maara dị ka ndị Kraịst. E ji okwu a mee ihe nke mbụ ya na Antiọk nke Siria. (Ọrụ 11:26) Na narị afọ mbụ O.A., Pọl onyeozi gara Antiọk nke Siria, ọ ghọkwara ebe o ji mere ebe obibi. Banabas na Pọl, bụ́ ndị Jọn Mak sonyeere, malitere njem ozi ala ọzọ ha nke mbụ n’Antiọk.

Ndị Kraịst oge mbụ nọ n’Antiọk aghaghị ịbụworị ndị a gbara ume nke ukwuu site n’ọbịbịa ndị ozi na-abịa n’obodo ukwu ha. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nzaghachi ịnụ ọkụ n’obi ha n’ebe eziokwu nke Okwu Chineke dị bụ n’otu akụkụ n’ihi nleta na-ewusi okwukwe ike nke ndị nnọchiteanya narị afọ mbụ nke òtù na-achị isi. (Ọrụ 11:22, 23) Lee ka ọ na-aghaghị isiworị bụụrụ ha ihe na-agba ume ịhụ ka ọtụtụ ndị bi n’Antiọk na-arara ndụ ha nye Jehova Chineke! Otú ọ dị, ọ bụ ihe karịrị 100 afọ n’ihu ka Theophilus biri ndụ n’Antiọk.

Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Eusebius kwuru na Theophilus bụ bishọp nke isii nke Antiọk, ma a malite n’oge ndị ozi Kraịst gụwa ya. Theophilus deturu ọtụtụ mkparịta ụka na mgbagha megide ịjụ okwukwe. A gụnyere ya ná ndị mgbachitere okwukwe iri na abụọ ma ọ bụ karịa bụ́ ndị Kraịst n’oge ya.

Ileba Anya n’Ihe Odide Ya Nile

N’ịzaghachi ná mkparịta ha nwere na mbụ, Theophilus ji okwu mmeghe ndị a wee degara Autolycus bụ́ onye ọgọ mmụọ akwụkwọ, sị: “Ire na-aga were were na okwu ire ụtọ na-eweta obi ụtọ na ụdị otuto nke na-atọ mpako onwe onye ụtọ, nye ndị ikom ọnọdụ ha jọrọ njọ bụ́ ndị e metọworo n’uche.” Theophilus na-eme ka o doo anya na-asị: “Onye hụrụ eziokwu n’anya adịghị aṅa ntị n’okwu ire ụtọ, kama ọ na-enyocha isi ihe dị n’okwu ahụ . . . I jiriwo okwu na-enweghị isi gwakasịa m ahụ, jiri chi osisi na nkume gị nile na-etu ọnụ, ndị a kpụrụ akpụ na ndị a wụrụ awụ, ndị a tụrụ atụ na ndị a pịrị apị, bụ́ ndị na-adịghị ahụ ụzọ ma ọ bụkwanụ na-anụ ihe, n’ihi na ha bụ arụsị, bụrụkwa ọrụ aka mmadụ.”—Tụlee Abụ Ọma 115:4-8.

Theophilus na-ekpughe aghụghọ nke ikpere arụsị. N’ụdị ọ na-ejikarị ede ihe, n’ụzọ na-aga were were, ọ bụ ezie na ọ bụ n’ụzọ ikwu ọtụtụ okwu, ọ na-agbalị ịkọwa ọdịdị nke ezi Chineke ahụ n’ezie. Ọ na-akọwa, sị: “Ọdịdị Chineke bụ nke a na-apụghị ịkọwa akọwa, a pụghịkwa iji anya mmadụ hụ ya. N’ihi na n’ebube a pụghị ịghọta Ya, n’ịdị ukwuu a pụghị ịtụpụta ya atụpụta, n’ịdị elu ọ karịrị uche mmadụ, n’ike o nweghị atụ, n’amamihe o nweghị onye na-ama ya aka, n’ịdị mma o nweghị o yiri, n’obi ọma a pụghị iji ọnụ kwuo ya.”

N’ịtụkwasị ihe ná nkọwa a nke Chineke, Theophilus gara n’ihu, sị: “Ma ọ bụ Onyenwe anyị, n’ihi na Ọ na-achị eluigwe na ala; Nna, n’ihi na ọ dị tupu ihe nile; Onye Mmepụta Ihe na Onye Mere Ihe, n’ihi na Ọ bụ onye okike na onye mere eluigwe na ụwa; Onye Kachasị Elu, n’ihi Ya ịdị elu karịa ihe nile; na Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, n’ihi na Ya Onwe Ya na-achị ma na-achịkọta ihe nile.”

Ọzọ, n’ilekwasị anya n’ihe ụfọdụ kpọmkwem ndị Chineke rụzuru, Theophilus gara n’ihu n’otu ụdị ịtọ anya n’ala ahụ na ikwughachi ihe ugboro ugboro e ji mara ide ihe ya, na-asị: “N’ihi na eluigwe bụ ihe Ọ rụrụ, ụwa bụ ihe okike Ya, osimiri bụ aka ọrụ Ya; mmadụ bụ ihe Ọ kpụrụ na onyinyo Ya; anyanwụ, ọnwa, na kpakpando bụ ihe ndị O kere, ndị o mere maka ihe ịrịba ama, na oge, na ụbọchị, na afọ, ka ha wee nwee ike jeere mmadụ ozi ma bụụrụ ya ohu; Chineke sitekwara n’ihe ndị na-adịghị adị mee ihe nile ka ha ghọọ ihe ndị dị adị, ka e wee nwee ike site n’ọrụ Ya nile mara ma ghọta ịdị ukwuu Ya.”

Ihe atụ ọzọ nke nkatọ Theophilus katọrọ chi ụgha nile nke oge ya bụ nke a pụrụ ịhụ n’okwu ndị na-esonụ o degaara Autolycus: “Aha ndị ahụ ị sị na ị na-efe ofufe, bụ aha ndị ikom nwụrụ anwụ. . . . Ụdị ndị ikom dịkwa aṅaa ka ha bụ? Ọ̀ bụ na a chọpụtabeghị na Saturn na-eri anụ ibe ya, na-ebibi ma na-adọgbu ụmụ nke ya? Ọ bụrụkwa na ị kpọọ nwa ya nwoke Jupiter, . . . lee ka o si bụrụ ewu nyere ya ara . . . Omume ya ndị ọzọkwa,—mmekọahụ ahụ ya na ndị ikwu ya, na ịkwa iko, na agụụ ịkwa iko.”

N’ịgbasapụ ịrụ ụka ya, Theophilus na-emesi nguzo ya megide ikpere arụsị nke ndị ọgọ mmụọ ike. Ọ na-ede, sị: “M ga-aga n’ihu ịkpọ ọtụtụ anụmanụ nke ndị Ijipt na-efe ofufe, ma ihe ndị na-akpụ akpụ, ma ehi, ma anụ ọhịa, ma nnụnụ, ma azụ nke osimiri . . . Ndị Gris na mba ndị ọzọ, ha na-efe nkume na osisi, na ụdị ihe ndị ọzọ a na-ahụ anya.” “Ma Chineke, ezi Chineke ahụ nke dịkwa ndụ, ka m na-efe ofufe,” ka Theophilus na-ekwu.—Tụlee 2 Samuel 22:47; Ọrụ 14:15; Ndị Rom 1:22, 23.

Akaebe Bara Uru

Ndụmọdụ na agbamume ndị dị n’akwụkwọ nwere akụkụ atọ nke Theophilus dere bụ́ ndị na-agbagha Autolycus nwere ọtụtụ akụkụ ma gụnye ọtụtụ ihe. Ihe odide ndị ọzọ nke Theophilus bụ nke e dere megide Hermogenes na Marcion. O dekwara ọtụtụ akwụkwọ nke ntụziaka na mwuli elu, na-agbakwụnye okwu nkọwa n’Oziọma ndị ahụ. Otú ọ dị, nanị akwụkwọ atọ ahụ e degaara Autolycus, nke bụ otu ihe odide, bụ nke e chebeworo.

Akwụkwọ nke mbụ bụ akwụkwọ mgbachitere okwukwe nke e degaara Autolycus n’ịgbachitere okpukpe ndị Kraịst. Akwụkwọ nke abụọ e degaara Autolycus na-arụ ụka megide okpukpe ịgọ mmụọ zuru ebe nile, ịkọ nkọ, ndị ọkà ihe ọmụma, na ndị na-agụ uri. N’akwụkwọ nke atọ nke Theophilus e ji akwụkwọ ọgụgụ ndị ọgọ mmụọ tụnyere Akwụkwọ Nsọ.

Ná mmalite nke akwụkwọ nke atọ nke Theophilus, o doro anya na Autolycus ka nwere echiche bụ na Okwu nke eziokwu ahụ bụ akụkọ nrafu. Theophilus na-akatọ Autolycus, na-azọrọ, sị: “Ị na-eji obi ụtọ atachiri ndị nzuzu obi. Ma ọ bụghị ya, ndị na-enweghị uche agaghị emeworị ka i kwenye n’okwu efu nile, ma kweta n’asịrị jupụtara ebe nile.”

Gịnị bụ ‘asịrị ahụ jupụtara ebe nile’? Theophilus na-ekpughe ebe o sitere. Ndị nkwutọ “ndị nwere egbugbere ọnụ na-adịghị asọpụrụ Chineke na-ebo anyị ebubo ụgha, [anyị] bụ́ ndị na-efe Chineke ofufe, ndị a na-akpọkwa ndị Kraịst, na-ekwu na anyị na-alụkọta ndị nwunye anyị nile ọnụ ma sorokwa ha na-enwekọta mmekọahụ; nakwa na anyị ọbụna na-edina ụmụnne anyị ndị nwanyị, na, nke kasị bụrụ ihe ihere ma jọkarịsịa njọ na ha nile, na anyị na-eri anụ mmadụ.” Theophilus rụsiri ọrụ ike ịlụ ọgụ megide echiche ọgọ mmụọ a na-ezighị ezi ma ọlị nke e nwere banyere ndị sị na ha bụ ndị Kraịst na narị afọ nke abụọ. O jiri ìhè eziokwu nke dị n’ime Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ mee ihe.—Matiu 5:11, 12.

Ihe na-agba akaebe banyere ọmụma Theophilus maara Okwu Chineke nke ọma bụ ojiji o ji na aka o zoro n’ebe ma ihe odide Bible Hibru ma nke Grik nọ ọtụtụ ugboro. Ọ bụ otu n’ime ndị mbụ nyere nkọwa n’Oziọma ndị ahụ. Ọtụtụ izo aka nke Theophilus zoro n’ebe Akwụkwọ Nsọ dị na-enye nghọta dị ukwuu banyere echiche jupụtara ebe nile n’oge ya. O ji ọmụma ọ maara ihe odide ndị sitere n’ike mmụọ nsọ nke ọma mee ihe n’igosipụta nkarị dị ukwuu ha karịrị nkà ihe ọmụma ndị ọgọ mmụọ.

Nhazi nke ihe odide Theophilus, ụzọ o si dee ya n’ụdị iji zie ihe, na ọdịdị ikwughachi ihe ya pụrụ ime ka ọ bụrụ nke na-amasịghị ụfọdụ ndị. Ruo n’ókè ndapụ n’ezi ofufe ahụ e buru n’amụma pụrụ imetụtaworị echiche ya nile, anyị apụghị ikwu ugbu a. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3-12) Ka o sina dị, ka ọ na-erule oge ọnwụ ya, n’ihe dị ka na 182 O.A., o doro anya na Theophilus aghọọla onye mgbachitere okwukwe ike na-adịghị agwụ agwụ, bụ́ onye ihe odide ya nile na-adọrọ mmasị nke ezi ndị Kraịst nke oge anyị.

[Foto dị na peeji nke 30]

Theophilus ji anya ike gbaghaa ịrụ ụka nile nke Autolycus

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 28]

Foto ndị dị na peji nke 28 na 30 ndị e si na Illustrirte Pracht - Bibel/Heilige Schrift des Alten und Neuen Testaments, nach der deutschen Uebersetzung D. Martin Luther’s sere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya