-
Nọgide Na-enwe Udo n’Ezinụlọ GịIsi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
-
-
ISI NKE IRI NA OTU
Nọgide Na-enwe Udo n’Ezinụlọ Gị
1. Olee ihe ụfọdụ pụrụ ịkpata nkewa n’ezinụlọ?
OBI ụtọ na-adịrị ndị nọ n’ezinụlọ ebe e nwere ịhụnanya, nghọta, na udo. Anyị nwere olileanya na nke gị bụ ezinụlọ dị otú ahụ. Ọ bụ ihe mwute ikwu na ọtụtụ ezinụlọ adịghị ekwekọ ná nkọwa ahụ, e kewakwara ha ekewa n’ihi otu ihe ma ọ bụ ọzọ. Gịnị na-ekewa ezinụlọ? N’isiakwụkwọ nke a anyị ga-atụle ihe atọ. N’ezinụlọ ụfọdụ, ndị òtù ha anọghị n’otu okpukpe. Ná ndị ọzọ, ụmụ nwere ike ha agaghị enwe otu nne na nna mụrụ ha. Ná ndị ọzọ kwa, mgba inweta ihe ndị e ji ebi obi ma ọ bụ ọchịchọ inwetakwu ihe onwunwe yiri ka ha na-amanye ndị òtù ezinụlọ ịga iche iche. Ka o sina dị, ihe ndị kewara otu ezinụlọ nwere ike ha agaghị emetụta ọzọ. Gịnị na-akpata ọdịiche?
2. Olee ebe ụfọdụ na-elegara anya maka nduzi ná ndụ ezinụlọ, ma gịnị bụ isi iyi kasị mma nke nduzi dị otú ahụ?
2 Ụzọ e si eche echiche bụ otu ihe. Ọ bụrụ na i jiri ezi obi gbalịa ịghọta echiche onye nke ọzọ, o yikarịrị ka ị ga-ahụ ụzọ isi chebe ezinụlọ dị n’otu. Ihe nke abụọ bụ isi iyi gị maka nduzi. Ọtụtụ ndị na-agbaso okwu ndụmọdụ ndị ọrụ ibe ha, ndị agbata obi, ndị na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ, ma ọ bụ ndị nduzi ọzọ bụ́ mmadụ. Ma, ụfọdụ achọpụtawo ihe Okwu Chineke na-ekwu banyere ọnọdụ ha, ha etinyewokwa ihe ha mụtara n’ọrụ. Olee otú ime nke a pụrụ isi nyere ezinụlọ aka ịnọgide na-enwe udo n’ụlọ?—2 Timoti 3:16, 17.
Ọ BỤRỤ NA DI GỊ NỌ N’OKPUKPE DỊ ICHE
Gbalịa ịghọta ụzọ onye nke ọzọ si eche echiche
3. (a) Gịnị bụ ndụmọdụ Bible banyere ịlụ onye nọ n’okpukpe dị iche? (b) Olee ụkpụrụ ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ na-abata n’ọrụ ma ọ bụrụ na otu onye n’ime di na nwunye kwere ekwe ma onye nke ọzọ ekweghị?
3 Bible na-adụsi anyị ọdụ ike megide ịlụ onye nwere okwukwe okpukpe dị iche. (Deuterọnọmi 7:3, 4; 1 Ndị Kọrint 7:39) Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na ị mụtara eziokwu ahụ site na Bible mgbe agbamakwụkwọ gị gasịrị ma di gị amụtaghị ya. Mgbe ahụ gịnị ga-eme? N’ezie, nkwa ọlụlụ ahụ ka dị irè. (1 Ndị Kọrint 7:10) Bible na-emesi ndịgide nke nkekọ alụmdi na nwunye ike ma na-agba ndị di na nwunye ume idozi ndịrịta iche ha nile kama isi na ha gbalaga. (Ndị Efesọs 5:28-31; Taịtọs 2:4, 5) Ma, gịnị ma ọ bụrụ na di gị na-emegidesi gị ike ikpe okpukpe nke Bible? Ọ pụrụ ịnwa igbochi gị ịga nzukọ ọgbakọ, ma ọ bụ ọ pụrụ ikwu na ọ chọghị ka nwunye ya na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-ekwu banyere okpukpe. Gịnị ka ị ga-eme?
4. N’ụzọ dị aṅaa ka nwanyị pụrụ isi gosi ọmịiko ma ọ bụrụ na di ya anọghị n’okpukpe ya?
4 Jụọ onwe gị, ‘N’ihi gịnị ka o ji dị di m otú ahụ?’ (Ilu 16:20, 23) Ọ bụrụ na ọ ghọtaghị n’ezie ihe ị na-eme, ọ pụrụ ịdị na-echegbu onwe ya banyere gị. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịnọ ná nrụgide site n’aka ndị ikwu n’ihi na ị dịkwaghị ekere òkè n’omenala ụfọdụ dị mkpa nye ha. “N’ịnọ nanị m n’ụlọ, ọ dị m ka a gbahapụrụ m,” ka otu di kwuru. Nwoke a chere na okpukpe na-anapụ ya nwunye ya. Ma nganga ekweghị ya kweta na owu na-ama ya. Di gị pụrụ inwe mkpa mmesighachi obi ike nke na ịhụnanya gị maka Jehova apụtaghị na ugbu a i nwere ịhụnanya ka nta maka di gị karịa ka ọ dị n’oge gara aga. Hụ na i wepụtara oge nọnyere ya.
5. Nguzozi dị aṅaa ka nwanyị di ya nọ n’okpukpe dị iche na-aghaghị idebe?
5 Otú ọ dị, a ghaghị ịtụle ihe dị mkpa ọbụna karị ma ọ bụrụ na ị gaje iji amamihe chee ọnọdụ ahụ ihu. Okwu Chineke na-agba ndị nwunye ume, sị: “Na-edonụ onwe unu n’okpuru di unu, dị ka ọ na-ekwesị unu n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Kọlọsi 3:18) Otú a, ọ na-adọ aka ná ntị megide mmụọ nke nnwere onwe. Tụkwasịkwa, site n’ịsị “dị ka ọ na-ekwesị unu n’ime Onyenwe anyị,” akụkụ akwụkwọ nsọ a na-egosi na ido onwe onye n’okpuru di kwesịkwara ịgụnye ido onwe onye n’okpuru Onyenwe anyị. A ghaghị inwe nguzozi.
6. Ụkpụrụ dịgasị aṅaa ka nwunye bụ́ onye Kraịst kwesịrị iburu n’uche?
6 Nye onye Kraịst, ịga nzukọ ọgbakọ na mmadụ ịgbara ndị ọzọ àmà banyere okwukwe ya dabeere na Bible bụ akụkụ ndị dị mkpa nke ezi ofufe, nke a na-agaghị eleghara anya. (Ndị Rom 10:9, 10, 14; Ndị Hibru 10:24, 25) Ya mere, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ enye gị iwu kpọmkwem ka ị ghara ikwere n’ihe doro anya Chineke chọrọ? Ndị ozi Jisọs Kraịst kwupụtara, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) Ihe nlereanya ha na-esetịpụ ụkpụrụ nke dị irè n’ọtụtụ ọnọdụ ná ndụ. Ịhụnanya maka Jehova ọ̀ ga-akwali gị inye ya ofufe ruuru ya? N’otu oge ahụ, ịhụnanya na nkwanye ùgwù gị maka di gị ọ̀ ga-eme gị ka ị nwaa ime nke a n’ụzọ nke ọ na-anakwere?—Matiu 4:10; 1 Jọn 5:3.
7. Mkpebisi ike dị aṅaa ka nwunye bụ́ onye Kraịst na-aghaghị ime?
7 Jisọs rịbara ama na nke a agaghị ekwe omume mgbe nile. Ọ dọrọ aka ná ntị na n’ihi mmegide a na-emegide ezi ofufe, ọ ga-adị ndị òtù kwere ekwe nke ezinụlọ ka e kewapụrụ ha iche, dị ka a ga-asị na mma agha abịawo n’etiti ha na ndị ọzọ n’ezinụlọ ahụ. (Matiu 10:34-36) Otu nwanyị na Japan nwere ahụmahụ nke a. Di ya megidere ya ruo afọ 11. O mekpọrọ ya ọnụ nke ukwuu, kpọchibidokwa ya ụzọ n’èzí ọtụtụ ugbo. Ma ọ tachiri obi. Ndị enyi n’ọgbakọ ndị Kraịst nyeere ya aka. Ọ nọgidesiri ike n’ekpere ma nweta agbamume dị ukwuu site na 1 Pita 2:20. Nwanyị a bụ́ onye Kraịst kwenyere na ọ bụrụ na o guzosie ike, otu ụbọchị di ya ga-esonyere ya n’ijere Jehova ozi. O sonyekwaara ya.
8, 9. Olee otú nwunye kwesịrị isi mee ihe iji zere itinye ihe mgbochi ndị na-enweghị isi n’ihu di ya?
8 E nwere ọtụtụ ihe dị irè ị pụrụ ime iji nwee mmetụta n’àgwà di ma ọ bụ nwunye gị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na di gị na-ajụ okpukpe gị, enyela ya ezi ihe ndị ọ ga-emere mkpesa n’akụkụ ndị ọzọ. Na-edebe ụlọ ọcha. Lekọta otú ị na-adị n’anya. Na-ekwu ọtụtụ okwu ịhụnanya na ekele. Kama ịdị na-akatọ akatọ, na-enye nkwado. Gosi na ị na-elegara ya anya maka ịbụisi. Emegwarala ma ọ bụrụ na ọ dị gị ka e mejọrọ gị. (1 Pita 2:21, 23) Nye ohere maka ezughị okè mmadụ, ọ bụrụkwa na esemokwu ebilite, n’obi umeala bụrụ onye mbụ ịrịọ mgbaghara.—Ndị Efesọs 4:26.
9 Ekwela ka gị ịga nzukọ bụrụ ihe na-eme ka nri ya bụrụ n’azụ oge. Ị pụkwara ịhọrọ ikere òkè n’ozi ndị Kraịst n’oge dị iche iche mgbe di gị na-anọghị n’ụlọ. Ọ bụ ihe amamihe ka nwunye bụ́ onye Kraịst ghara imere di ya nkwusa mgbe ọ na-adịghị anabata nke a. Kama nke ahụ, ọ na-agbaso ndụmọdụ Pita onyeozi, bụ́: “Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu; ka, ọbụna a sị na ụfọdụ ekwenyeghị okwu Chineke, ka e wee site n’ibi obi nwunye ha rite ha n’uru n’ebe a na-ekwughị okwu; mgbe ha na-ele ibi obi unu dị ọcha, ya na egwu.” (1 Pita 3:1, 2) Ndị nwunye bụ́ ndị Kraịst na-arụ ọrụ igosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke n’ụzọ zuru ezu karị.—Ndị Galetia 5:22, 23.
MGBE NWUNYE NA-EJIGHỊ ISO ỤZỌ KRAỊST KPỌRỌ IHE
10. Olee otú di kwere ekwe kwesịrị isi meso nwunye ya ma ọ bụrụ na nkwenkwe ya dị iche?
10 Gịnị ma ọ bụrụ na ọ bụ di bụ onye ji iso ụzọ Kraịst kpọrọ ihe ma nwunye abụghị? Bible na-enye nduzi maka ọnọdụ ndị dị otú ahụ. Ọ na-asị: “Ọ bụrụ na nwanna ọ bụla nwere nwunye na-ekweghị ekwe, ọ bụrụkwa na ọ dị nwanyị ahụ ezi mma ka ya na ya biri, ka di ya ghara ịhapụ ya.” (1 Ndị Kọrint 7:12) Ọ na-adụkwa ndị bụ di ọdụ, sị: “Hụnụ nwunye unu n’anya.”—Ndị Kọlọsi 3:19.
11. Olee otú di pụrụ isi gosi nghọta ma jiri akọ bụụrụ nwunye ya isi ma ọ bụrụ na o jighị Iso Ụzọ Kraịst kpọrọ ihe?
11 Ọ bụrụ na ị bụ di nke nwunye ya nọ n’okpukpe dị iche na nke gị, lezie anya karịsịa iji kwanyere nwunye gị ùgwù, na-echebakwara mmetụta ya echiche. Dị ka onye toro eto, o ruru eru inweta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnwere onwe ime ihe kwekọrọ na nkwenkwe okpukpe ya, ọbụna ma ọ bụrụ na i kwenyeghị na ha. Mgbe mbụ ị gwara ya banyere okpukpe gị, atụla anya na ọ ga-agbakụta nkwenkwe ndị o nweworo eri ogologo oge azụ ma nara ihe ọhụrụ. Kama ikwu ngwa ngwa na ihe omume ndị ya na ezinụlọ ya jiworo kpọrọ oké ihe eri ogologo oge bụ ụgha, jiri ndidi gbalịa iso ya tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ pụrụ ịbụ na ọ na-adị ya ka a na-eleghara ya anya ma ị na-etinye oge dị ukwuu n’ihe omume dị iche iche nke ọgbakọ. Ọ pụrụ iguzogide mgbalị gị ijere Jehova ozi, ma ozi bụ isi ọ na-ezipụ pụrụ ịbụ nanị: “Achọkwuru m oge gị!” Nwee ndidi. Site ná nchebara echiche gị nke ịhụnanya, mgbe oge na-aga a pụrụ inyere ya aka ịnakwere ezi ofufe.—Ndị Kọlọsi 3:12-14; 1 Pita 3:8, 9.
ỊZỤLITE ỤMỤAKA
12. Ọbụna ma ọ bụrụ na di na nwunye ya nọ n’okpukpe dị iche iche, olee otú e kwesịrị isi tinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ná nzụlite nke ụmụ ha?
12 N’ezinụlọ nke na-adịghị n’otu n’ofufe, izi ụmụaka ihe okpukpe na-abụ ihe iseokwu mgbe ụfọdụ. Olee otú e kwesịrị isi tinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ? Bible na-ekenye nna ibu ọrụ bụ isi nke izi ụmụaka ihe, ma nne nwekwara òkè dị mkpa ikere. (Ilu 1:8; tụlee Jenesis 18:19; Deuterọnọmi 11:18, 19.) Ọbụna ma ọ bụrụ na ọ dịghị anakwere ịbụisi nke Kraịst, nna ahụ ka bụkwa isi ezinụlọ.
13, 14. Ọ bụrụ na di amachibido nwunye ya ịkpọrọ ụmụaka gaa nzukọ ndị Kraịst ma ọ bụ ịmụrụ ha ihe, gịnị ka ọ pụrụ ime?
13 Ndị nna ụfọdụ na-ekweghị ekwe adịghị ajụ ma ọ bụrụ na nne na-ezi ụmụaka ihe n’okwu okpukpe. Ndị ọzọ na-ajụ. Gịnị ma ọ bụrụ na di gị ajụ inye gị ikike ịkpọrọ ụmụaka ahụ gaa nzukọ ọgbakọ ma ọ bụ ọbụna machibido gị ịmụrụ ha Bible n’ụlọ? Ugbu a ị ghaghị itinye ibu ọrụ dị iche iche n’ezi nguzo—ibu ọrụ gị n’ebe Jehova Chineke nọ, nye di bụ́ isi gị, na nye ụmụ gị ị hụrụ n’anya. Olee otú ị pụrụ isi mee ka ndị a kwekọọ?
14 N’ezie ị ga-ekpe ekpere banyere okwu ahụ. (Ndị Filipaị 4:6, 7; 1 Jọn 5:14) Ma n’ikpeazụ, ọ bụ gị bụ onye ga-ekpebi ụzọ ị ga-agbaso. Ọ bụrụ na i jiri akọ mee ihe, na-eme ka o doo di gị anya na ị dịghị ama ịbụisi ya aka, mmegide ya nwere ike imesị belata. Ọbụna ma ọ bụrụ na di gị amachibido gị ịkpọrọ ụmụ gị gaa nzukọ ma ọ bụ iduziri ha ọmụmụ Bible a haziri ahazi, ị ka pụrụ ịkụziri ha ihe. Site ná nkwurịta okwu gị kwa ụbọchị na ihe nlereanya ọma gị, gbalịa ịkụnye n’ime ha ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịhụnanya maka Jehova, okwukwe n’Okwu ya, nkwanye ùgwù maka nne na nna—gụnyere nna ha—nchegbu ịhụnanya maka ndị ọzọ, na iji àgwà ịdị uchu n’ọrụ kpọrọ ihe. Mgbe oge na-aga, nna ahụ pụrụ ịhụta mkpụrụ ọma ndị a na-amịpụta ma jiri uru nke mgbalị gị nile kpọrọ ihe.—Ilu 23:24.
15. Gịnị bụ ibu ọrụ nke nna kwere ekwe n’ọzụzụ ụmụaka?
15 Ọ bụrụ na ị bụ di kwere ekwe ma nwunye gị abụghị, mgbe ahụ ị ghaghị ibu ibu ọrụ nke ịzụlite ụmụ gị “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Ka ị na-eme nke ahụ, i kwesịrị, n’ezie, ịdị obi ọma, na-ahụ n’anya, nweekwa ezi uche n’imeso nwunye gị ihe.
Ọ BỤRỤ NA OKPUKPE GỊ ABỤGHỊ NKE NDỊ MỤRỤ GỊ
16, 17. Ụkpụrụ dịgasị aṅaa nke Bible ka ụmụaka na-aghaghị icheta ma ọ bụrụ na ha anakwere okpukpe dị iche na nke ndị mụrụ ha?
16 Ọ bụkwaghị ihe ọhụrụ ka ọbụna ụmụntakịrị nakwere echiche okpukpe ndị dị iche na nke ndị mụrụ ha. Ì mewo nke ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, Bible nwere ndụmọdụ maka gị.
17 Okwu Chineke na-asị: “Na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị: n’ihi na nke a bụ ihe ziri ezi. Sọpụrụ nna gị na nne gị.” (Ndị Efesọs 6:1, 2) Nke ahụ na-agụnye nkwanye ùgwù dị mma maka ndị nne na nna. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na nrubeisi nye nne na nna dị mkpa, ọ dịghị ihe ga-eme ka e nye ya n’echebaraghị ezi Chineke ahụ echiche. Mgbe nwatakịrị toruru ịmalite ime mkpebi, ọ na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ ibu ọrụ ka elu maka ihe ndị ọ na-eme. Nke a bụ eziokwu ọ bụghị nanị n’ihe banyere iwu ndị ọchịchị kamakwa karịsịa n’ihe banyere iwu Chineke. “Onye ọ bụla n’etiti anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya nye Chineke,” ka Bible na-ekwu.—Ndị Rom 14:12.
18, 19. Ọ bụrụ na ụmụaka nọ n’okpukpe dị iche na nke ndị mụrụ ha, olee otú ha pụrụ isi nyere ndị mụrụ ha aka ịghọtakwu okpukpe ha?
18 Ọ bụrụ na nkwenkwe gị emee gị ka i mee mgbanwe ná ndụ gị, gbalịa ịghọta ụzọ nne na nna gị si eche echiche. O yikarịrị ka ọ ga-amasị ha ma ọ bụrụ na, dị ka ihe sitere na gị ịmụta na itinye nkụzi Bible n’ọrụ, ị na-akwanyekwu ùgwù, na-erubekwu isi, na-adịkwu uchu n’ihe ha na-achọ gị n’aka. Otú ọ dị, ọ bụrụ na okpukpe ọhụrụ gị emeekwa ka ị jụ nkwenkwe na omenala ndị ha onwe ha ji kpọrọ oké ihe, ọ pụrụ ịdị ha ka ị na-elelị ihe nketa ha na-achọsi ike inye gị. Ha pụkwara ịtụ egwu maka ọdịmma gị ma ọ bụrụ na ihe ị na-eme abụghị ihe a na-anabata n’ógbè ahụ ma ọ bụ ọ bụrụ na ọ na-adọpụ uche gị ná nchụso ndị ha chere pụrụ inyere gị aka ịga n’ihu n’ụzọ ihe onwunwe. Nganga pụrụ ịbụkwa ihe mgbochi. Ha pụrụ iche na gị, n’ụzọ a na-ahụ anya, na-asị na i ziri ezi nakwa na ha ezighị ezi.
19 Ya mere, ngwa ngwa o kwere omume, gbalịa idokwa ka nne na nna gị zute ụfọdụ n’ime ndị okenye ma ọ bụ Ndịàmà ọzọ tozuru okè site n’ọgbakọ ị nọ. Gbaa ndị mụrụ gị ume ileta Ụlọ Nzukọ Alaeze iji nụrụ n’onwe ha ihe a na-atụle ma jiri anya ha hụ ụdị mmadụ Ndịàmà Jehova bụ. Mgbe oge na-aga, àgwà nne na nna gị pụrụ ịdị nro. Ọbụna mgbe nne na nna kwesiri olu ike ná mmegide ha, bibie akwụkwọ Bible, ma machibido ụmụaka iwu ịga nzukọ ndị Kraịst, a na-enwekarị ohere ịgụ akwụkwọ n’ebe ọzọ, ikwunyere ndị Kraịst ọzọ okwu, na ịgbara ndị ọzọ àmà na inyere ha aka n’ụzọ a na-ebughị ụzọ mee ndokwa ya. Ị pụkwara ikpegara Jehova ekpere. Ụfọdụ ndị na-eto eto aghaghị ichere ruo mgbe ha toruru ịhapụ ebe obibi ezinụlọ tupu ha enwee ike imekwu ihe. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ọnọdụ dị n’ụlọ, echefula ‘ịsọpụrụ nna gị na nne gị.’ Mee òkè gị n’itinye ihe n’udo dị n’ụlọ. (Ndị Rom 12:17, 18) Karịsịa ihe nile, gbalịa iso Chineke dị n’udo.
IHE ỊMA AKA NKE ỊBỤ NNE MA Ọ BỤ NNA NKUCHI
20. Mmetụta dịgasị aṅaa ka ụmụaka pụrụ inwe ma ọ bụrụ na nna ma ọ bụ nne ha bụ nke nkuchi?
20 N’ọtụtụ ezinụlọ ọnọdụ nke na-eweta ihe ịma aka kasịnụ abụghị okpukpe kama nke isi n’otu ọbara. Ọtụtụ ezinụlọ taa gụnyere ụmụ sitere n’alụmdi na nwunye ndị gara aga nke otu n’ime nne na nna ma ọ bụ ha abụọ. N’ezinụlọ dị otú ahụ, ụmụaka pụrụ inwe ekworo na iwe ma ọ bụ ma eleghị anya nsogbu nke amaghị onye a ga-egosi nnọgidesi ike n’ihe. N’ihi ya, ha pụrụ iguzogide mgbalị ndị sitere n’ezi obi nke nne ma ọ bụ nna nkuchi ịbụ ezi nne ma ọ bụ nna. Gịnị pụrụ inye aka ime ezinụlọ nkuchi nke na-aga nke ọma?
Ma ị bụ nne ma ọ bụ nna mụrụ ụmụ ma ọ bụ nke nkuchi, dabere na Bible maka nduzi
21. N’agbanyeghị ọnọdụ ha pụrụ iche, n’ihi gịnị ka ndị nne ma ọ bụ nna nkuchi kwesịrị iji lega anya n’ụkpụrụ ndị a na-achọta na Bible maka enyemaka?
21 Mata na n’agbanyeghị ọnọdụ ndị pụrụ iche, ụkpụrụ Bible ndị na-eweta ihe ịga nke ọma n’ezinụlọ ndị ọzọ dịkwa irè n’ebe a. Ileghara ụkpụrụ ndị ahụ anya pụrụ, ruo nwa oge, iyi ka ọ na-ebelata otu nsogbu ma o yikarịrị ka ọ ga-eduba n’obi mgbu ma e mesịa. (Abụ Ọma 127:1; Ilu 29:15) Zụlite amamihe na nghọta—amamihe itinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ na-eburu abamuru ndị na-adịte anya n’uche, na nghọta ịmata ihe mere ndị òtù ezinụlọ ji ekwu ma ọ bụ eme ihe ụfọdụ. E nwekwara mkpa maka ọmịiko.—Ilu 16:21; 24:3; 1 Pita 3:8.
22. N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji siere ụmụaka ike ịnakwere nne ma ọ bụ nna nkuchi?
22 Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nkuchi, ị pụrụ icheta na dị ka enyi ezinụlọ ahụ, ụmụaka ahụ ma eleghị anya nabatara gị. Ma mgbe ị ghọrọ nne ma ọ bụ nna nkuchi ha, àgwà ha nwere ike ịgbanwewo. N’icheta nne ma ọ bụ nna mụrụ ha bụ́ onye na-ebinyekwaraghị ha, ụmụaka ahụ pụrụ ịdị na-agbaso nsogbu nke onye ha ga-egosi nnọgidesi ike n’ihe mgba, ma eleghị anya na-eche na ị na-achọ iwepụ ịhụnanya ha nwere maka nne ma ọ bụ nna ahụ nke na-anọkwaghị ya. Mgbe ụfọdụ, ha pụrụ ịsaghepụ ọnụ chetara gị na ị bụghị nna ha ma ọ bụ nne ha. Okwu dịgasị otú ahụ na-etiwa obi. Otú ọ bụla o si dị, “ekwela ka a kpasuo gị iwe ọsọ ọsọ n’ime mmụọ gị.” (Eklisiastis 7:9) Nghọta na ọmịiko dị mkpa iji nagide mmetụta uche ụmụaka ahụ.
23. Olee otú a pụrụ isi dọọ aka ná ntị n’ezinụlọ nwere ụmụ nkuchi?
23 Àgwà ndị ahụ dị oké mkpa mgbe mmadụ na-enye ịdọ aka ná ntị. Ịnọgidesi ike n’ịdọ aka ná ntị dị mkpa. (Ilu 6:20; 13:1) Ebe ọ bụkwa na ụmụaka nile abụghị otu, ịdọ aka ná ntị pụrụ ịdị iche site n’otu ọnọdụ gaa n’ọzọ. Ụfọdụ ndị nne ma ọ bụ nna nkuchi na-achọpụta na, ma ọ dịghị ihe ọzọ ná mmalite, ọ pụrụ ịka mma ka onye nke mụrụ ya lekọta akụkụ nke a nke ịbụ nne ma ọ bụ nna. Ma, ọ dị mkpa na nne na nna ahụ kwekọtara n’ịdọ aka ná ntị ahụ ma jigide ya, hapụ imelara nwa afọ mmadụ karịa nwa nkuchi. (Ilu 24:23) Nrubeisi dị mkpa, ma ọ dị mkpa inye ohere maka ezughị okè. Emeghachila omume gabiga ókè. Dọọ aka ná ntị n’ịhụnanya.—Ndị Kọlọsi 3:21.
24. Gịnị pụrụ inye aka igbochi nsogbu omume n’etiti ndị nwoke na nwanyị n’ezinụlọ nkuchi?
24 Nkwurịta okwu ezinụlọ pụrụ ime ihe dị ukwuu iji gbochie nsogbu. Ndị a pụrụ inyere ezinụlọ aka ilegide okwu ndị ka mkpa ná ndụ anya. (Tụlee Ndị Filipaị 1:9-11.) Ha pụkwara inyere onye ọ bụla aka ịhụ ụzọ ọ pụrụ isi soro mee ka e nweta ihe mgbaru ọsọ dị iche iche nke ezinụlọ. Tụkwasịkwa, nkwurịta okwu ezinụlọ n’obi eziokwu pụrụ igbochi nsogbu omume. Ọ dị ndị inyom mkpa ịghọta ụzọ isi jie ejiji ma kpaa àgwà n’ebe nna nkuchi na ụmụnne nwoke nkuchi ha nọ, ndị ikom nwekwara mkpa ndụmọdụ n’àgwà kwesịrị ekwesị n’ebe nne nkuchi na ụmụnne nwanyị nkuchi ọ bụla nọ.—1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-8.
25. Àgwà dịgasị aṅaa pụrụ inye aka idebe udo n’ezinụlọ nkuchi?
25 N’izute ihe ịma aka pụrụ iche nke ịbụ nne ma ọ bụ nna nkuchi, nwee ndidi. Ọ na-ewe oge iji zụlite mmekọrịta ndị ọhụrụ. Inweta ịhụnanya na nkwanye ùgwù nke ụmụaka ndị gị na ha na-enweghị nkekọ ọmụmụ bụ oké ọrụ. Ma ọ na-ekwe omume. Obi nke maara ihe ma na-aghọta ihe, tinyere ọchịchọ siri ike ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, bụ ugodi na-eduje n’udo n’ezinụlọ nkuchi. (Ilu 16:20) Àgwà ndị dị otú ahụ pụkwara inyere gị aka ịnagide ọnọdụ ndị ọzọ.
NCHỤSO IHE ONWUNWE HÀ NA-EKEWA EZINỤLỌ GỊ?
26. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka nsogbu na àgwà dị iche iche banyere ihe onwunwe pụrụ isi kewaa ezinụlọ?
26 Nsogbu na àgwà dị iche iche banyere ihe onwunwe pụrụ ikewa ezinụlọ n’ọtụtụ ụzọ. N’ụzọ dị mwute, esemokwu banyere ego na ọchịchọ ịba ọgaranya—ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ ịbatụkwu ọgaranya—na-akpaghasị ezinụlọ ụfọdụ. Nkewa pụrụ ibilite mgbe ma di ma nwunye na-arụ ọrụ ego ma zụlite àgwà nke “ego m, ego gị.” Ọbụna ma ọ bụrụ na e zere arụmụka, mgbe ma di ma nwunye na-arụ ọrụ ha pụrụ ịhụta na ha nwere usoro ihe omume nke na-ahapụ oge dị nta maka ibe ha. Omume na-arị elu n’ụwa bụ ka ndị nna biri n’ebe ezinụlọ ha na-ebighị ruo ogologo oge—ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ afọ—iji kpatakwuo ego karịa ka ha ga-akpata mgbe ọ bụla n’ebe obibi ha. Nke a pụrụ iduba ná nsogbu ndị siri ike nke ukwuu.
27. Olee ụkpụrụ ụfọdụ pụrụ inyere ezinụlọ nọ ná nrụgide ego aka?
27 A pụghị iti iwu maka ilekọta ọnọdụ ndị a, ebe ọ bụ na ezinụlọ dị iche iche na-eche nrụgide na mkpa dịgasị iche iche ihu. Ka o sina dị, ndụmọdụ Bible pụrụ inye aka. Dị ka ihe atụ, Ilu 13:10 na-egosi na a pụrụ igbochi esemokwu na-enweghị isi mgbe ụfọdụ site ‘n’ịdụkọrịta ọdụ.’ Nke a adịghị agụnye nanị ikwu echiche onwe onye kama ịchọ okwu ndụmọdụ na ịchọpụta ụzọ onye nke ọzọ si ele okwu anya. Ọzọ, ime atụmatụ mmefu ego ezi uche dị na ya pụrụ inye aka ijikọta mgbalị nile ezinụlọ na-eme ọnụ. Mgbe ụfọdụ ọ dị mkpa—ikekwe ruo nwa oge—ka ma di ma nwunye na-arụ ọrụ n’èzí ebe obibi iji lekọta mmefu ndị a gbakwụnyere, karịsịa mgbe e nwere ụmụaka ma ọ bụ ndị ọzọ a ga-elekọta. Mgbe nke a bụ ọnọdụ dịnụ, di pụrụ imesi nwunye ya obi ike na ya ka nwere oge maka ya. Ya na ụmụaka pụrụ iji ịhụnanya nye aka n’ụfọdụ ọrụ ọ pụrụ ịdị na-arụbu nanị ya.—Ndị Filipaị 2:1-4.
28. Ihe ncheta ndị dị aṅaa, ma ọ bụrụ na e debe ha, ga-enyere ezinụlọ aka ịrụ ọrụ iji dị n’otu?
28 Otú ọ dị, buru n’uche na ọ bụ ezie na ego bụ ihe dị mkpa n’usoro ihe a, ọ dịghị eweta obi ụtọ. Ọ dịghị enye ndụ. (Eklisiastis 7:12) N’ezie, ikwubiga okwu ókè banyere ihe onwunwe pụrụ ịkpata mbibi ime mmụọ na nke omume. (1 Timoti 6:9-12) Lee ka o si ka mma nke ukwuu ibu ụzọ chọọ Alaeze Chineke na ezi omume ya, na-enwe obi ike inweta ngọzi ya ná mgbalị anyị nile iji nweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ! (Matiu 6:25-33; Ndị Hibru 13:5) Site n’ibute ọdịmma ime mmụọ ụzọ na site n’ibu ụzọ chụsoo udo n’ebe Chineke nọ, ị pụrụ ịchọpụta na ezinụlọ gị, ọ bụ ezie na ikekwe ọnọdụ ụfọdụ kewara ya, ga-abụ nke dị n’otu n’ezie n’ụzọ ndị kasị mkpa.
-
-
Ị Pụrụ Imeri Nsogbu Ndị Na-ebibi EzinụlọIsi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
-
-
ISI NKE IRI NA ABỤỌ
Ị Pụrụ Imeri Nsogbu Ndị Na-ebibi Ezinụlọ
1. Olee nsogbu ndị zoro ezo dị n’ezinụlọ ụfọdụ?
AKA sapụrụ ụgbọ ala ochie ahụ ma tee ya mmanụ. Nye ndị na-agafenụ ọ na-egbuke egbuke, dị nnọọ ka nke ọhụrụ. Ma e wepụ ihe a na-ahụ anya, ahụ ụgbọ ala ahụ na-erichapụsị n’ịta nchara. Otú ahụ ka ọ dị n’ezinụlọ ụfọdụ. Ọ bụ ezie na n’ile anya n’elu ahụ ihe nile dị ka ọ dị mma, ihu ọchị na-ezochi egwu na ihe mgbu. N’ime ụlọ ihe ndị na-akpata ịta nchara na-erichapụ udo ezinụlọ. Nsogbu abụọ pụrụ inwe mmetụta a bụ aṅụrụma na ime ihe ike.
MBIBI NKE AṄỤRỤMA NA-AKPATA
2. (a) Gịnị bụ echiche Bible banyere ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya? (b) Gịnị bụ aṅụrụma?
2 Bible adịghị amachibido ịṅụru ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’ókè, ma ọ na-amachibido ịṅụbiga mmanya ókè. (Ilu 23:20, 21; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 1 Timoti 5:23; Taịtọs 2:2, 3) Ma, aṅụrụma karịrị ịṅụbiga mmanya ókè; ọ bụ itinyebiga uche ókè n’ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya mgbe nile na enweghị nchịkwa n’ịṅụ ha. Ndị aṅụrụma pụrụ ịbụ ndị toworo eto. N’ụzọ dị mwute, ha pụkwara ịbụ ndị ntorobịa.
3, 4. Kọwaa mmetụta dị iche iche nke aṅụrụma n’ahụ di ma ọ bụ nwunye na n’ahụ ụmụ.
3 Ogologo oge gara aga Bible mere ka a mata na iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma pụrụ ịkpaghasị udo ezinụlọ. (Deuterọnọmi 21:18-21) Ezinụlọ dum na-enweta mmetụta nrichapụ nke aṅụrụma. Di ma ọ bụ nwunye pụrụ imikpu ná mgbalị ịkwụsị ọṅụṅụ mmanya nke onye aṅụrụma ahụ ma ọ bụ n’ịnagide àgwà ya a na-apụghị ịka aka. Ọ na-agbalị izochi mmanya ahụ, na-atụfu ya, na-ezo ego ya, na-arịọkwa maka ịhụnanya ya maka ezinụlọ, maka ndụ, ọbụna maka Chineke—ma onye aṅụrụma ahụ anọgide na-aṅụ. Ka mgbalị ya ịchịkwa ọṅụṅụ mmanya ya na-ada ugboro ugboro, ọ na-enwe nkụda mmụọ na mmetụta nke erughị eru. Ọ pụrụ ịmalite ịtụ egwu, iwe iwe, inwe obi amamikpe, ahụ erughị ala, nchekasị, na enweghị ùgwù onwe onye.
4 Ụmụaka adịghị agbanarị mmetụta nke aṅụrụma nne ma ọ bụ nna. A na-awakpo ụfọdụ n’ụzọ anụ ahụ. A na-emerụ ndị ọzọ n’ụzọ mmekọahụ. Ha pụrụ ọbụna ịta onwe ha ụta maka aṅụrụma nne ma ọ bụ nna ahụ. Ọtụtụ mgbe àgwà a na-ejighị n’aka nke onye aṅụrụma ahụ na-akpaghasị ikike ha ịtụkwasị ndị ọzọ obi. N’ihi na ha apụghị ịtụsara ahụ kwuo banyere ihe na-eme n’ụlọ, ụmụaka ahụ pụrụ ịmụta ịbịada mmetụta ha, bụ́ nke na-enwe ajọ mmetụta n’ahụ ọtụtụ mgbe. (Ilu 17:22) Ụmụaka dị otú ahụ pụrụ iburu ụkọ a nke obi ike onwe onye ma ọ bụ ùgwù onwe onye banye n’oge ịbụ okenye.
GỊNỊ KA EZINỤLỌ PỤRỤ IME?
5. Olee otú a pụrụ isi chịkwaa aṅụrụma, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji sie ike?
5 Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ọkachamara na-asị na a pụghị ịgwọta aṅụrụma, ọtụtụ kwetara na ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnwetaghachi onwe kwere omume site n’usoro ihe omume nke akpaghị aka ma ọlị. (Tụlee Matiu 5:29.) Otú ọ dị, ime ka onye aṅụrụma nara enyemaka dị mfe okwukwu karịa ime ya eme, ebe ọ na-adịghị ekwekarị na ya nwere nsogbu. Ka o sina dị, mgbe ndị òtù ezinụlọ weere nzọụkwụ ụfọdụ iji hụ maka ụzọ aṅụrụma ahụ siworo metụta ha, onye aṅụrụma ahụ pụrụ ịmalite ịmata na ya nwere nsogbu. Otu dibịa nweworo ahụmahụ n’inyere ndị aṅụrụma na ezinụlọ ha aka sịrị: “Echere m na ihe kasị mkpa bụ ka ezinụlọ gaa n’ihu n’ibi ndụ ha n’ụzọ kasị mma ha pụrụ. Ịdị ukwuu nke ọdịiche dị n’etiti ya na ndị ọzọ n’ezinụlọ ahụ ga na-echekwu onye aṅụrụma ahụ ihu.”
6. Gịnị bụ isi iyi kasị mma nke ndụmọdụ maka ezinụlọ ndị nwere onye aṅụrụma?
6 Ọ bụrụ na e nwere onye aṅụrụma n’ezinụlọ gị, ndụmọdụ Bible sitere n’ike mmụọ nsọ pụrụ inyere gị aka ibi ndụ n’ụzọ kasị mma a pụrụ inwe. (Aịsaịa 48:17; 2 Timoti 3:16, 17) Tụlee ụkpụrụ ụfọdụ nyewooro ezinụlọ dị iche iche aka iche aṅụrụma ihu nke ọma.
7. Ọ bụrụ na onye òtù ezinụlọ bụ onye aṅụrụma, ònye ga-aza ajụjụ ya?
7 Kwụsị ịnara ụta nile. Bible na-asị: “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha,” na, “onye ọ bụla n’etiti anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya nye Chineke.” (Ndị Galetia 6:5; Ndị Rom 14:12) Onye aṅụrụma ahụ pụrụ ịnwa inye echiche nke na ndị òtù ezinụlọ kpatara ya. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịsị: “Unu mesoo m nke ọma karị, m gaghị aṅụ mmanya.” Ọ bụrụ na ndị ọzọ eyie ka ha kwenyeere ya, ha na-agba ya ume ịnọgide na-aṅụ mmanya. Ma ọbụna ma ọ bụrụ na ọnọdụ dị iche iche ma ọ bụ ndị mmadụ ọzọ emetụta anyị, anyị nile—gụnyere ndị aṅụrụma—ga-aza ajụjụ maka ihe ọ bụla anyị mere.—Tụlee Ndị Filipaị 2:12.
8. Olee ụzọ ụfọdụ a pụrụ isi nyere onye aṅụrụma aka iche ihe ndị na-esi na nsogbu ya apụta ihu?
8 Echela na ị ghaghị ikpuchi onye aṅụrụma ahụ mgbe nile pụọ n’ihe ndị na-esite n’ọṅụṅụ mmanya ya. Otu ilu Bible banyere onye nọ n’ọnụma pụkwara imetụta onye aṅụrụma ahụ: “Ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-emekwa ya ọzọ.” (Ilu 19:19) Hapụ onye aṅụrụma ahụ ka ọ taa ahụhụ ihe ndị si n’ọṅụṅụ mmanya ya apụta. Hapụ ya ka o hichasịa ihe o metọrọ ma ọ bụ kpọtụrụ onye were ya n’ọrụ n’ụtụtụ na-eso ụbọchị ọ ṅụrụ mmanya.
Ndị okenye ndị Kraịst pụrụ ịbụ isi iyi ukwu nke enyemaka n’idozi nsogbu ezinụlọ
9, 10. N’ihi gịnị ka ezinụlọ ndị aṅụrụma kwesịrị iji nara enyemaka, enyemaka ònye karịsịakwa ka ha kwesịrị ịchọ?
9 Nakwere enyemaka site n’aka ndị ọzọ. Ilu 17:17 na-asị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” Mgbe e nwere onye aṅụrụma n’ezinụlọ gị, e nwere ahụhụ. Enyemaka dị gị mkpa. Egbula oge n’ịdabere n’ahụ ‘ezi ndị enyi’ maka nkwado. (Ilu 18:24) Iso ndị ọzọ ghọtara nsogbu ahụ ma ọ bụ ndị cheworo ọnọdụ dị otú ahụ ihu kwurịta okwu pụrụ inye gị aro ụfọdụ dị irè banyere ihe ị ga-eme na ihe ị na-agaghị eme. Ma nwee nguzozi. Kwunyere ndị ị tụkwasịrị obi, ndị ga-edebe “izu nzuzo” gị, okwu.—Ilu 11:13.
10 Mụta ịtụkwasị ndị okenye ndị Kraịst obi. Ndị okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst pụrụ ịbụ isi iyi dị ukwuu nke enyemaka. Ndị ikom a tozuru okè bụ ndị e ji Okwu Chineke nye ọzụzụ ma nwee ahụmahụ n’itinye ụkpụrụ ya dị iche iche n’ọrụ. Ha pụrụ ịdị “ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara ná mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndo nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” (Aịsaịa 32:2) Ọ bụghị nanị na ndị okenye ndị Kraịst na-echebe ọgbakọ n’ozuzu ya pụọ ná mmetụta ọjọọ kama ha na-akasikwa ndị nwere nsogbu obi, na-enye ha ume ọhụrụ, na-enwekwa mmasị onwe onye n’ebe ndị ahụ nọ. Nweta abamuru zuru ezu nke enyemaka ha.
11, 12. Ònye na-enye enyemaka kachasịnụ maka ezinụlọ ndị aṅụrụma, oleekwa ụzọ e si na-enye nkwado ahụ?
11 Karịsịa ihe nile, nweta ume site n’aka Jehova. Bible na-emesi anyị obi ike n’ụzọ na-ekpo ọkụ, sị: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) Ọ bụrụ na ọ dị gị ka obi gị tiwara etiwa ma ọ bụ mmụọ gị abụrụ nke e gwepịara egwepịa n’ihi nrụgide nke ibinyere onye òtù ezinụlọ nke bụ onye aṅụrụma, mara na “Jehova nọ nso.” Ọ na-aghọta otú ọnọdụ ezinụlọ gị siruru n’ike.—1 Pita 5:6, 7.
12 Ikwere ihe Jehova na-ekwu n’Okwu ya pụrụ inyere gị aka ịnagide nchekasị. (Abụ Ọma 130:3, 4; Matiu 6:25-34; 1 Jọn 3:19, 20) Ịmụ Okwu Chineke na ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya nile na-etinye gị n’ahịrị ịnata enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke, nke pụrụ iji “ọkịka nke ike” kee gị ekike ịnagide ọnọdụ kwa ụbọchị.—2 Ndị Kọrint 4:7.a
13. Gịnị bụ nsogbu nke abụọ na-ebibi ọtụtụ ezinụlọ?
13 Iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi pụrụ iduba ná nsogbu ọzọ na-ebibi ọtụtụ ezinụlọ—ime ihe ike n’ebe obibi.
MBIBI NKE IME IHE IKE N’EBE OBIBI NA-AKPATA
14. Olee mgbe ime ihe ike n’ebe obibi malitere, gịnị bụkwa ọnọdụ dị taa?
14 Ime ihe ike mbụ weere ọnọdụ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ bụ ime ihe ike n’ebe obibi nke metụtara ụmụnne ndị ikom abụọ, bụ́ Ken na Ebel. (Jenesis 4:8) Eri mgbe ahụ, ụdị nile nke ime ihe ike n’ebe obibi etiwo ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti. E nwere ndị di na-eti nwunye ha ihe, ndị nwunye na-awakpo di ha, ndị nne na nna ji obi ọjọọ eti ụmụntakịrị ha ihe, na ụmụ toro eto na-akụ nne na nna ha meworo agadi ihe.
15. Olee otú ime ihe ike n’ebe obibi si emetụta ndị òtù ezinụlọ n’ụzọ mmetụta uche?
15 Mbibi nke ime ihe ike n’ebe obibi na-akpata na-agabiga ọnyá elu ahụ. Otu nwunye a na-eti ihe sịrị: “E nwere obi amamikpe na ihere dị ukwuu ị na-aghaghị iche ihu. N’ọtụtụ ụtụtụ, ị na-achọ nnọọ ịnọrọ n’elu àkwà, ọ na-adị gị ka ya bụrụ nanị nrọ ọjọọ.” Ụmụaka na-ekiri, ma ọ bụ na-enwe ahụmahụ, nke ime ihe ike n’ebe obibi pụrụ n’onwe ha ime ihe ike mgbe ha toro ma nwee ezinụlọ ndị nke ha.
16, 17. Gịnị bụ iti ihe nke mmetụta uche, oleekwa ụzọ o si emetụta ndị òtù ezinụlọ?
16 Ime ihe ike n’ebe obibi abụghị nanị nke iti ihe nkịtị. Ọtụtụ mgbe mwakpo ahụ bụ nke okwu ọnụ. Ilu 12:18 na-asị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha.” “Ndụpu” ndị a e ji amata ime ihe ike n’ebe obibi gụnyere ịkpọ iyi na iti mkpu, nakwa ịnọgide na-akatọ akatọ, mkparị ndị na-eweda n’ala, na iyi egwu nke ime ihe ike nkịtị. A dịghị ahụ ọnyá ndị nke ime ihe ike nke mmetụta uche anya, ndị ọzọ adịkebeghịkwa ahụta ya.
17 Ihe dị mwute karịsịa bụ iti nwata ihe n’ụzọ mmetụta uche—ịnọgide na-akatọ akatọ na iwetu ikike, ọgụgụ isi, ma ọ bụ abamuru nwata ahụ nwegasịrị dị ka mmadụ ala. Otiti ihe dị otú ahụ n’okwu ọnụ pụrụ ibibi mmụọ nke nwata. N’eziokwu, ịdọ aka ná ntị dị ụmụaka nile mkpa. Ma Bible na-agwa ndị nna, sị: “Akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.”—Ndị Kọlọsi 3:21.
ỤZỌ ISI ZERE IME IHE IKE N’EBE OBIBI
Di na nwunye bụ́ ndị Kraịst hụrụ onwe ha n’anya ma na-akwanyere onwe ha ùgwù ga-eme ihe ngwa ngwa idozi ihe isi ike
18. Olee ebe ime ihe ike n’ebe obibi na-amalite, gịnịkwa ka Bible na-egosi na ọ bụ ụzọ isi kwụsị ya?
18 Ime ihe ike n’ebe obibi na-amalite n’obi na uche; ụzọ anyị si akpa àgwà na-amalite n’ụzọ anyị si eche echiche. (Jemes 1:14, 15) Iji kwụsị ime ihe ike ahụ, ọ dị onye mmetọ ahụ mkpa ịgbanwe ụzọ o si eche echiche. (Ndị Rom 12:2) Nke ahụ ọ̀ pụrụ ikwe omume? Ee. Okwu Chineke nwere ike ịgbanwe mmadụ. Ọ pụrụ ọbụna ifopụ echiche na-ebibi ebibi bụ́ ndị “e wusiri ike.” (2 Ndị Kọrint 10:4; Ndị Hibru 4:12) Ezi ihe ọmụma nke Bible pụrụ inye aka iweta mgbanwe zuru ezu n’ebe ndị mmadụ nọ nke na a na-asị na ha yikwasịrị mmadụ ọhụrụ.—Ndị Efesọs 4:22-24; Ndị Kọlọsi 3:8-10.
19. Olee otú onye Kraịst kwesịrị isi lee di ma ọ bụ nwunye ya anya, mesookwa ya ihe?
19 Ụzọ isi lee di ma ọ bụ nwunye anya. Okwu Chineke na-asị: “Ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya. Onye na-ahụ nwunye nke aka ya n’anya na-ahụ onwe ya n’anya.” (Ndị Efesọs 5:28) Bible na-ekwukwa na di kwesịrị ikenye nwunye “nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị.” (1 Pita 3:7) A gwara ndị nwunye okwu ịdọ aka ná ntị ka ha “na-ahụ di ha n’anya” nakwa ịdị “na-atụ egwu” ha. (Taịtọs 2:4; Ndị Efesọs 5:33) N’ezie ọ dịghị di na-atụ egwu Chineke nke pụrụ ịrụ ụka n’eziokwu na ya na-asọpụrụ nwunye ya n’ezie ma ọ bụrụ na ọ na-awakpo ya n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ n’okwu ọnụ. Ọ dịghịkwa nwunye nke na-etikwasị di ya mkpu, na-agwa ya okwu n’ụzọ mkparị, ma ọ bụ na-abara ya mba mgbe nile nke pụrụ ikwu na ya hụrụ ya n’anya n’ezie ma na-atụ egwu ya.
20. N’ihu ònye ka ndị nne na nna nwere ibu ọrụ n’ebe ụmụ ha nọ, n’ihi gịnịkwa ka ndị nne na nna kwesịrị iji ghara ịtụ anya ihe ezi uche na-adịghị na ha n’aka ụmụ ha?
20 Ụzọ kwesịrị ekwesị isi lee ụmụ anya. O ruuru ụmụaka, ee, ọ dị ha mkpa, inweta ịhụnanya na nlekọta site n’aka ndị mụrụ ha. Okwu Chineke na-akpọ ụmụaka “ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa” na “ụgwọ ọrụ.” (Abụ Ọma 127:3) Ọ bụ ibu ọrụ nne na nna n’anya Jehova ilekọta ihe nketa ahụ. Bible na-ekwu banyere “omume nwa ọhụrụ” na “uche gbagọrọ agbagọ” nke nwata. (1 Ndị Kọrint 13:11; Ilu 22:15) Nne na nna ekwesịghị inwe ijuanya ma ha zute uche gbagọrọ agbagọ n’ụmụ ha. Ndị na-eto eto abụghị ndị okenye. Nne na nna ekwesịghị ịchọ ihe karịrị afọ ndụ, ọnọdụ ezinụlọ, na ikike nwatakịrị n’aka ya.—Lee Jenesis 33:12-14.
21. Gịnị bụ ụzọ nke Chineke isi lee nne na nna meworo agadi anya na imeso ha ihe?
21 Ụzọ isi lee nne na nna meworo agadi anya. Levitikọs 19:32 na-asị: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye.” Iwu Chineke si otú a na-emesi ike ịkwanyere ndị agadi ùgwù na iji ha kpọrọ oké ihe. Nke a pụrụ ịbụ ihe ịma aka mgbe nne ma ọ bụ nna meworo agadi yiri ka ọ̀ na-achọ ihe gabiga ókè ma ọ bụ na-arịa ọrịa na ma eleghị anya ghara ịdị na-emegharị ahụ ma ọ bụ na-eche echiche ngwa ngwa. Ka o sina dị, a na-echetara ụmụaka “inyeghachi ndị mụrụ ha ihe.” (1 Timoti 5:4) Nke a ga-apụta imeso ha n’ụzọ dị ùgwù na ná nkwanye ùgwù, eleghị anya ọbụna na-elekọta ha n’ụzọ ego. Imejọ ndị nne na nna meworo agadi n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ na-emegide kpọmkwem ụzọ Bible na-agwa anyị isi kpaa àgwà.
22. Gịnị bụ otu àgwà gbara ọkpụrụkpụ n’imeri ime ihe ike n’ebe obibi, oleekwa ụzọ a pụrụ isi gosipụta ya?
22 Zụlite njide onwe onye. Ilu 29:11 na-asị: “Mmụọ nile nke onwe ya ka onye nzuzu na-eme ka ọ pụta ìhè: ma onye maara ihe na-egbochi mmụọ ya, na-emekwa ka ọ dajụọ.” Olee otú ị pụrụ isi chịkwaa mmụọ gị? Kama ikwere ka nkụda mmụọ wulite n’ime, mee ihe ngwa ngwa iji dozie esemokwu biliterenụ. (Ndị Efesọs 4:26, 27) Si n’ebe ahụ pụọ ma ọ dị gị ka mmụọ gị ọ̀ na-arị elu. Kpee ekpere maka mmụọ nsọ Chineke iji zụlite njide onwe onye n’ime gị. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ime mkpagharị ma ọ bụ ime ụdị mmega ahụ ndị ọzọ pụrụ inyere gị aka ịchịkwa mmetụta uche gị. (Ilu 17:14, 27) Gbalịa ịbụ “onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.”—Ilu 14:29.
IKEWA KA Ọ̀ BỤ ỊNỌGIDE NA-EBIKỌ
23. Gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na onye òtù ọgbakọ ndị Kraịst adaba n’ọnụma ime ihe ike ugboro ugboro ma ghara ichegharị, ma eleghị anya na-agụnye iti ezinụlọ ya ihe nkịtị?
23 Bible na-etinye “ibu iro, esemokwu, . . . ọnụma” n’ọrụ ndị Chineke machibidoro iwu ma na-ekwu na “ndị na-eme ihe dị otú a agaghị eketa alaeze Chineke.” (Ndị Galetia 5:19-21) Ya mere, a pụrụ ịchụpụ onye ọ bụla na-azọrọ ịbụ onye Kraịst nke na-adaba ugboro ugboro n’ọnụma ime ihe ike, ma eleghị anya na-agụnye ịkụ nwunye ma ọ bụ di ma ọ bụ ụmụaka ihe nkịtị ma ghara ichegharị, n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Tụlee 2 Jọn 9, 10.) N’ụzọ dị otú a a na-edebe ọgbakọ ọcha megide ndị mmetọ.—1 Ndị Kọrint 5:6, 7; Ndị Galetia 5:9.
24. (a) Olee ụzọ ndị di ma ọ bụ nwunye a na-eti ihe pụrụ ịhọrọ isi mee ihe? (b) Olee otú ndị enyi na ndị okenye na-enwe nchegbu pụrụ isi kwado di ma ọ bụ nwunye a na-eti ihe, ma gịnị ka ha na-ekwesịghị ime?
24 Olee banyere ndị Kraịst ndị di ma ọ bụ nwunye arụrụala na-adịghị egosi ihe àmà ọ bụla nke mgbanwe na-eti ihe ugbu a? Ụfọdụ ahọrọwo iso di ma ọ bụ nwunye arụrụala ahụ biri n’ihi otu ihe ma ọ bụ ọzọ. Ndị ọzọ ahọrọwo ịpụ, na-eche na ahụ ike anụ ahụ, nke uche, na nke ime mmụọ ha—eleghị anya ọbụna ndụ ha—dị n’ihe ize ndụ. Ihe onye a na-emeso ihe ike n’ebe obibi họọrọ ime n’ọnọdụ ndị a bụ mkpebi onwe onye n’ihu Jehova. (1 Ndị Kọrint 7:10, 11) Ndị enyi, ndị ikwu, ma ọ bụ ndị okenye ndị Kraịst bu ezi ihe n’obi pụrụ ịchọ inye aka na ndụmọdụ, ma ha ekwesịghị ịrụgide mmadụ ịgbaso ụzọ nke ọ bụla kpọmkwem. Nke ahụ bụ mkpebi nke ya ime.—Ndị Rom 14:4; Ndị Galetia 6:5.
ỌGWỤGWỤ NYE NSOGBU NDỊ NA-EBIBI IHE
25. Gịnị bụ nzube Jehova maka ezinụlọ?
25 Mgbe Jehova jikọtara Adam na Iv ọnụ n’alụmdi na nwunye, ọ dịghị mgbe o zubere na nsogbu ndị na-ebibi ihe dị ka aṅụrụma ma ọ bụ ime ihe ike ga-erichapụ ezinụlọ. (Ndị Efesọs 3:14, 15) Ezinụlọ gaje ịbụ ebe ịhụnanya na udo ga-eto na ebe a ga-elekọta mkpa nke uche, mmetụta uche, na nke ime mmụọ nke onye òtù nke ọ bụla. Ma, site ná mbata nke mmehie, ndụ ezinụlọ ji ọsọ retọọ.—Tụlee Eklisiastis 8:9.
26. Olee ọdịnihu na-echere ndị na-agbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe nile Jehova chọrọ?
26 N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Jehova agbahapụbeghị nzube ya maka ezinụlọ. Ọ na-ekwe nkwa iwebata ụwa ọhụrụ nke udo ebe ndị mmadụ “ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ dịghịkwa onye ga na-eme ka ha maa jijiji.” (Ezikiel 34:28) N’oge ahụ, aṅụrụma, ime ihe ike n’ebe obibi, na nsogbu ndị ọzọ nile na-ebibi ezinụlọ taa ga-abụ ihe ndị oge ha gafeworo. Ndị mmadụ ga-amụmụ ọnụ ọchị, ọ bụghị iji zochie egwu na ihe mgbu, kama n’ihi na ‘ịba ụba nke udo na-atọ ha ụtọ.’—Abụ Ọma 37:11.
a N’ala ụfọdụ, e nwere ebe ọgwụgwọ, ụlọ ọgwụ, na usoro ihe omume nnwetaghachi onwe bụ́ ndị na-ahụ kpọmkwem maka inyere ndị aṅụrụma na ezinụlọ ha aka. Ma à ga-achọ ịnara enyemaka dị otú ahụ ma ọ bụ na a gaghị achọ bụ mkpebi onwe onye. Watch Tower Society adịghị akwado ụdị ọgwụgwọ ọ bụla kpọmkwem. Otú ọ dị, a ghaghị ilezi anya ka, n’ịchọ enyemaka, mmadụ ghara itinye aka n’ihe omume ndị na-emebi ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ.
-
-
Ọ Bụrụ na Alụmdi na Nwunye Na-achọ ItisaIsi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
-
-
ISI NKE IRI NA ATỌ
Ọ Bụrụ na Alụmdi na Nwunye Na-achọ Itisa
1, 2. Mgbe alụmdi na nwunye nọ ná nrụgide, ajụjụ dị aṅaa ka e kwesịrị ịjụ?
NA 1988 otu nwanyị Itali aha ya bụ Lucia nwere oké ịda mba n’obi.a Mgbe afọ iri gasịrị alụmdi na nwunye ya na-abịaru njedebe. Ọtụtụ mgbe ọ gbalịwo ime ka ya na di ya dịghachi ná mma, ma o nweghị nnọọ isi. Ya mere o kewapụrụ n’ihi ekwekọghị ekwekọ ma na-eche ihu ugbu a ịzụlite ụmụ ada abụọ nanị ya. Ileghachi anya azụ n’oge ahụ, Lucia na-echeta: “O doro m anya na ọ dịghị ihe pụrụ ịzọpụta alụmdi na nwunye anyị.”
2 Ọ bụrụ na ị na-enwe nsogbu alụmdi na nwunye, ị pụrụ ịghọta ọnọdụ Lucia. Alụmdi na nwunye gị pụrụ ịnọ ná nsogbu, ị pụkwara ịdị na-eche ma à ka pụrụ ịzọpụta ya. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, ị ga-ahụ na ọ bụ ihe enyemaka ịtụle ajụjụ a: Àgbasowo m okwu ndụmọdụ ọma nile Chineke nyeworo n’ime Bible iji nye aka ime ka alụmdi na nwunye gaa nke ọma?—Abụ Ọma 119:105.
3. Ọ bụ ezie na ịgba alụkwaghịm na-ewuzi ewu, mmeghachi omume dị aṅaa ka a kọrọ n’etiti ọtụtụ ndị gbara alụkwaghịm na ezinụlọ ha?
3 Mgbe ọnọdụ tara akpụ n’etiti di na nwunye, ịtọsa alụmdi na nwunye ahụ pụrụ iyi ụzọ kasị mfe isi mee ihe. Ma, ọ bụ ezie na ọtụtụ mba enwewo ịrị elu dị egwu n’ezinụlọ ndị tisara etisa, ihe ọmụmụ ndị ọhụrụ na-egosi na pasent dị ukwuu nke ndị ikom na ndị inyom gbara alụkwaghịm na-akwa ụta maka ntisa ahụ. Ụfọdụ na-enwe nsogbu ahụ ike ka ukwuu, ma n’anụ ahụ ma n’uche, karịa ndị nọgidere n’alụmdi na nwunye ha. Mgbagwoju anya na enweghị obi ụtọ nke ụmụ nke ndị gbara alụkwaghịm na-adịgidekarị ruo ọtụtụ afọ. Nne na nna na ndị enyi ezinụlọ ahụ tisara etisa na-atakwa ahụhụ. Gịnịkwa banyere ụzọ Chineke, Onye Mmalite nke alụmdi na nwunye, si ele ọnọdụ ahụ anya?
4. Olee otú e kwesịrị isi dozie nsogbu dị iche iche n’ezinụlọ?
4 Dị ka a rịbara ama n’isiakwụkwọ ndị bu ụzọ, Chineke zubere na alụmdi na nwunye kwesịrị ịbụ nkekọ na-adịru ogologo ndụ dum. (Jenesis 2:24) Mgbe ahụ, n’ihi gịnị ka ọtụtụ alụmdi na nwunye ji na-etisa? O nwere ike ọ gaghị eme n’otu ntabi anya. A na-enwekarị ihe mgbaàmà ịdọ aka ná ntị. Nsogbu ndị dị nta n’alụmdi na nwunye pụrụ ịnọ na-ebuwanye ibu ruo mgbe ha yiri ihe a na-apụghị imeri emeri. Ma ọ bụrụ na e doziri nsogbu ndị a ngwa ngwa site n’enyemaka Bible, a pụrụ igbochi ọtụtụ ntisa alụmdi na nwunye.
NWEE EZI UCHE
5. Olee ọnọdụ bụ ezie e kwesịrị iche ihu n’alụmdi na nwunye ọ bụla?
5 Otu ihe na-eduba mgbe ụfọdụ ná nsogbu bụ atụmanya ezi uche na-adịghị ya nke otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ahụ nọ n’alụmdi na nwunye pụrụ inwe. Akwụkwọ ọgụgụ ịhụnanya, magazin ndị a ma ama, usoro ihe omume telivishọn, na sinima pụrụ ime ka e nwee olileanya na nrọ ndị na-apụghị ime eme. Mgbe nrọ ndị a na-emezughị, ọ pụrụ ịdị mmadụ ka a ghọgburu ya, ọ ghara inwe afọ ojuju, ọbụna nwee obi ilu. Ma, olee otú mmadụ abụọ na-ezughị okè pụrụ isi chọta obi ụtọ n’alụmdi na nwunye? Ọ na-ewe ọrụ iji nweta mmekọrịta na-aga nke ọma.
6. (a) Echiche ziri ezi dị aṅaa banyere alụmdi na nwunye ka Bible na-enye? (b) Olee ihe ụfọdụ na-akpata esemokwu n’alụmdi na nwunye?
6 Bible dị irè. Ọ na-akwado ọṅụ nke alụmdi na nwunye, ma ọ na-adọkwa aka ná ntị na ndị lụrụ “ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ ha.” (1 Ndị Kọrint 7:28) Dị ka a rịbawororịị ama, ma di ma nwunye ezughị okè, ha na-adabakwa ná mmehie. Ọdịdị uche na mmetụta uche na nzụlite nke onye nke ọ bụla dị iche. Di na nwunye na-ese okwu mgbe ụfọdụ banyere ego, ụmụ, na ndị ọgọ. Oge na-ezughị ezu imekọ ihe ọnụ na nsogbu mmekọahụ pụkwara ịbụ isi iyi nke esemokwu.b Ọ na-ewe oge idozi okwu dịgasị otú ahụ, ma obi sie gị ike! Ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị di na nwunye na-enwe ike iche nsogbu ndị dị otú ahụ ihu ma wepụta ihe ngwọta e kwekọrịtara ọnụ.
KPARỊTA ESEMOKWU
Dozie nsogbu ngwa ngwa. Ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu
7, 8. Ọ bụrụ na e nwere mmejọ ma ọ bụ nghọtahie n’etiti di na nwunye, olee ụzọ Akwụkwọ Nsọ isi dozie ha?
7 Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịnọgide jụụ mgbe ha na-akparịta mkpasu iwe, nghọtahie, ma ọ bụ ọdịda onwe onye. Kama ikwu n’ụzọ kwụ ọtọ sị: “Ọ dị m ka a ghọtahiere m,” di ma ọ bụ nwunye pụrụ inwe oké mmetụta uche ma mee ka okwu ahụ gabiga otú ọ dị. Ọtụtụ ga-asị: “Ị na-echere nanị onwe gị,” ma ọ bụ, “Ị hụghị m n’anya.” N’achọghị ịbanye n’arụmụka, onye nke ọzọ pụrụ ịjụ ịzaghachi.
8 Ụzọ ka mma ịgbaso bụ ịṅa ntị na ndụmọdụ Bible bụ́: “Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe: ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.” (Ndị Efesọs 4:26) Otu di na nwunye na-enwe obi ụtọ, mgbe ha na-eru ememe 60 afọ nke agbamakwụkwọ ha, ka a jụrụ isi ihe dị n’alụmdi na nwunye ha na-aga nke ọma. Di ahụ kwuru, sị: “Anyị mụtara ịhapụ ịlakpu ụra n’edozighị esemokwu anyị, n’agbanyeghị otú ha si dị nta.”
9. (a) Gịnị ka a kọwara n’Akwụkwọ Nsọ dị ka akụkụ dị mkpa nke nkwurịta okwu? (b) Gịnị na-adị di na nwunye mkpa ime ọtụtụ mgbe, ọbụna ma a sị na nke a na-ewe obi ike na obi umeala?
9 Mgbe di na nwunye sere okwu, ọ dị onye nke ọ bụla mkpa ‘ịnụ ihe ọsọ ọsọ, ghara ịdị ngwa ikwu okwu, gharakwa ịdị ngwa iwe iwe.’ (Jemes 1:19) Mgbe e gesịrị ntị nke ọma, ha abụọ pụrụ ịhụ mkpa ịrịọ mgbaghara. (Jemes 5:16) Iji obi eziokwu sị, “Ndo maka imejọ gị,” na-ewe obi umeala na obi ike. Ma idozi esemokwu nile n’ụzọ a ga-eme ihe dị ukwuu n’inyere di na nwunye aka ọ bụghị nanị idozi nsogbu ha kamakwa iwulite ikpo ọkụ na ịdị nso nke ga-eme ka ha nwetakwuo ihe ụtọ n’ịnọnyere ibe ha.
ỊKWỤ ỤGWỌ ALỤMDI NA NWUNYE
10. Olee ihe nchebe Pọl tụụrụ ndị Kraịst na Kọrint aro ya nke pụrụ imetụta onye Kraịst taa?
10 Mgbe Pọl onyeozi degaara ndị Kọrint akwụkwọ, ọ tụrụ aro alụmdi na nwunye “n’ihi ịkwa iko nile.” (1 Ndị Kọrint 7:2) Ụwa taa dị njọ ka, ma ọ bụ ọbụna karịa, Kọrint oge ochie. Isiokwu omume rụrụ arụ ndị ụwa na-asaghepụ ọnụ na-akparịta, ụzọ na-adịghị mma ha si eji ejiji, na akụkọ ndị na-akpali akpali a na-ewepụta na magazin na akwụkwọ, na TV, na na sinima, ha nile jikọrọ aka na-akpalite agụụ mmekọahụ iwu na-akwadoghị. Nye ndị Kọrint bi n’ọnọdụ yiri nke ahụ, Pọl onyeozi sịrị: “Ịlụ di na nwunye ka ire ọkụ n’agụụ ahụ mma.”—1 Ndị Kọrint 7:9.
11, 12. (a) Gịnị ka di na nwunye ji ibe ha ụgwọ ya, ná mmụọ dị aṅaa ka e kwesịkwara ịkwụ ya? (b) Olee otú e kwesịrị isi dozie ọnọdụ ahụ ma ọ bụrụ na a gaje ịhapụtụ ụgwọ alụmdi na nwunye ahụ ruo nwa oge?
11 Ya mere, Bible na-enye ndị Kraịst lụrụ di na nwunye iwu, sị: “Ka di kwụghachi nwunye ya ụgwọ o ji ya: otú a kwa ka nwunye kwụghachikwa di ya ụgwọ o ji ya.” (1 Ndị Kọrint 7:3) Rịba ama na ihe e mesiri ike bụ inye ihe—ọ bụghị ịnara ihe. Ịdị nso anụ ahụ n’alụmdi na nwunye na-eju afọ n’ezie nanị ma onye nke ọ bụla na-echegbu banyere ọdịmma onye nke ọzọ. Dị ka ihe atụ, Bible na-enye ndị bụ di iwu imeso nwunye ha “n’ụzọ ihe ọmụma.” (1 Pita 3:7) Nke a bụ nnọọ eziokwu n’inye na ịnara ụgwọ alụmdi na nwunye. Ọ bụrụ na e mesoghị nwunye n’ụzọ dị nro, ọ pụrụ isiri ya ike ịnụ ụtọ akụkụ a nke alụmdi na nwunye.
12 E nwere oge mgbe ọ pụrụ ịdị di na nwunye mkpa ịnapụ onwe ha ụgwọ alụmdi na nwunye. Nke a pụrụ ịbụ eziokwu banyere nwunye n’oge ụfọdụ kpọmkwem n’ime ọnwa ma ọ bụ mgbe oké ike gwụrụ ya. (Tụlee Levitikọs 18:19.) Ọ pụrụ ịbụ eziokwu banyere di mgbe ọ na-eche nsogbu siri ike n’ụlọ ọrụ ihu ma ọ bụ bụrụ onye ike gwụkasịrị ahụ ná mmetụta uche. A na-ahụ maka oge ndị ahụ nke nkwụsịtụ nwa oge n’ịkwụ ụgwọ alụmdi na nwunye n’ụzọ kasị mma ma ọ bụrụ na mmadụ abụọ ahụ ejiri obi eziokwu tụlee ọnọdụ ahụ ma nwee “otu olu.” (1 Ndị Kọrint 7:5) Nke a ga-egbochi nke ọ bụla n’ime ha ịmaga ná nkwubi okwu na-ezighị ezi. Ma, ọ bụrụ na nwunye akpachara anya na-awọ ya di ya ma ọ bụ di amara ụma na-ajụ ịkwụ ụgwọ alụmdi na nwunye n’ụzọ ịhụnanya, a pụrụ ikpughepụ onye nke ọzọ ahụ nye ọnwụnwa. N’ọnọdụ dị otú ahụ, nsogbu pụrụ ibilite n’alụmdi na nwunye.
13. Olee otú ndị Kraịst pụrụ isi rụọ ọrụ iji debe echiche ha ọcha?
13 Dị ka ndị Kraịst nile, ndị di na nwunye na-ejere Chineke ozi aghaghị izere ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, bụ́ ndị pụrụ ime ka e nwee ọchịchọ ndị na-adịghị ọcha na ndị na-ekwekọghị n’okike. (Ndị Kọlọsi 3:5) Ha aghaghịkwa iche echiche na omume ha nche mgbe ha na-emeso ndị nile na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha ihe. Jisọs doro aka ná ntị, sị: “Nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.” (Matiu 5:28) Site n’itinye ndụmọdụ Bible banyere mmekọahụ n’ọrụ, ndị di na nwunye kwesịrị inwe ike izere ịdaba n’ọnwụnwa na ịkwa iko. Ha pụrụ ịnọgide na-enwe ịnọ nso na-atọ ụtọ n’alụmdi na nwunye ebe e ji mmekọahụ kpọrọ ihe dị ka onyinye ọma sitere n’aka Onye Mmalite alụmdi na nwunye, bụ́ Jehova.—Ilu 5:15-19.
IHE NDABERE BIBLE MAKA ỊGBA ALỤKWAGHỊM
14. Ọnọdụ dị aṅaa dị mwute na-apụta mgbe ụfọdụ? N’ihi gịnị?
14 Ọ bụ ihe obi ụtọ na n’ọtụtụ alụmdi na nwunye ndị Kraịst, a pụrụ idozi nsogbu ọ bụla bilitere. Ma, mgbe ụfọdụ, ọ naghị adị otú ahụ. N’ihi na ụmụ mmadụ ezughị okè ma biri n’ụwa mmehie nke nọ n’okpuru nchịkwa Setan, alụmdi na nwunye ụfọdụ na-eru ebe ọ ga-ekewa. (1 Jọn 5:19) Olee otú ndị Kraịst kwesịrị isi chee ọnọdụ dị otú ahụ siri ike ihu?
15. Olee nanị ndabere Akwụkwọ Nsọ e nwere maka ịgba alụkwaghịm nke na-enye ohere nlụgharị? (b) N’ihi gịnị ka ụfọdụ jiworo kpebie megide ịgba di ma ọ bụ nwunye na-ekwesịghị ntụkwasị obi alụkwaghịm?
15 Dị ka e kwuru n’Isi nke 2 nke akwụkwọ a, ịkwa iko bụ nanị ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka ịgba alụkwaghịm na-enye ohere maka nlụgharị.c (Matiu 19:9) Ọ bụrụ na i nwere ihe nnwapụta doro anya na di ma ọ bụ nwunye gị abụwo onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi, mgbe ahụ ị na-eche mkpebi siri ike ihu. Ị̀ ga-anọgide n’alụmdi na nwunye ahụ ka ị̀ ga-agba alụkwaghịm? Ọ dịghị iwu e tiri. Ụfọdụ ndị Kraịst agbagharawo kpam kpam di ma ọ bụ nwunye nke chegharịrịnụ n’ezie, alụmdi na nwunye ahụ e chebere agawokwa nke ọma. Ndị ọzọ ekpebiwo megide ịgba alụkwaghịm n’ihi ụmụaka.
16. (a) Olee ihe ụfọdụ kpaliworo ụfọdụ ịgba di ma ọ bụ nwunye ha mehierenụ alụkwaghịm? (b) Mgbe di ma ọ bụ nwunye aka ya dị ọcha mere mkpebi ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ ịhapụ ịgba, n’ihi gịnị ka ọ na-adịghị onye kwesịrị ịkatọ mkpebi onye ahụ?
16 N’aka nke ọzọ, omume mmehie ahụ pụrụ ịkpatawo ntụrụ ime ma ọ bụ ọrịa a na-ebufe ná mmekọahụ. Ma ọ bụ ikekwe ọ pụrụ ịdị mkpa ichebe ụmụaka pụọ n’aka nne ma ọ bụ nna na-emetọ emetọ n’ụzọ mmekọahụ. O doro anya na e nwere ihe dị ukwuu ịtụle tupu e mee mkpebi. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị mata banyere ekwesịghị ntụkwasị obi nke di ma ọ bụ nwunye gị ma mesịa maliteghachi iso ya nwee mmekọahụ, i si otú ahụ egosi na ị gbagharawo di ma ọ bụ nwunye gị na ị chọkwara ịnọgide n’alụmdi na nwunye ahụ. Ihe ndabere maka ịgba alụkwaghịm nke na-enye ohere Akwụkwọ Nsọ ịlụgharị adịkwaghị. Ọ dịghị onye kwesịrị ịbụ onye na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ya ma na-agbalị ịgwa gị ihe ị ga-ekpebi, ọ dịghịkwa onye kwesịrị ịkatọ mkpebi gị mgbe i mere ya. Ị gaje iburu ihe ndị sitere n’ihe i kpebiri. “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.”—Ndị Galetia 6:5.
IHE NDABERE MAKA NKEWA
17. Ma e nweghị ịkwa iko, olee ókè Akwụkwọ Nsọ kpaara nkewa ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm?
17 È nwere ọnọdụ ndị pụrụ ịkwado nkewa ma ọ bụ ma eleghị anya ịgba di ma ọ bụ nwunye alụkwaghịm ọbụna ma onye ahụ akwabeghị iko? Ee, ma n’ọnọdụ dị otú ahụ, onye Kraịst enwereghị onwe ya ịchọrọ onye ọzọ na-eburu nlụgharị n’uche. (Matiu 5:32) Bible, ọ bụ ezie na o nyere ohere maka nkewa dị otú ahụ, setịpụrụ na onye nke na-ekewapụ kwesịrị ‘ịnọgide n’enweghị di; ma o meghị otú a, ka e mee ka ya na di ya dị n’otu.’ (1 Ndị Kọrint 7:11) Olee ọnọdụ ụfọdụ jọgburu onwe ha pụrụ ime ka nkewa yie ihe amamihe dị na ya?
18, 19. Olee ọnọdụ ụfọdụ gabigara ókè nke pụrụ iduba di ma ọ bụ nwunye ịtụle amamihe nke nkewa ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm nke iwu kwadoro, ọ bụ ezie na nlụgharị agaghị ekwe omume?
18 Ezinụlọ pụrụ ịghọ nke ọ na-enweghị ka ọ hà ya n’ihi umengwụ na àgwà ọjọọ nke di.d Ọ pụrụ ịgbafusi ihe ezinụlọ na-akpata na chaa chaa ma ọ bụ jiri ya na-akwado iri ahụ nke ọgwụ ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya. Bible na-asị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere . . . ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) Ọ bụrụ na nwoke dị otú ahụ ajụ ịgbanwe ụzọ ya, ikekwe ọbụna na-akwụ ụgwọ àgwà ọjọọ ya site n’iwere ego nwunye ya na-arụta, nwunye ahụ pụrụ ịhọrọ ichebe ọdịmma ya na nke ụmụ ya site n’inweta nkewa nke iwu kwadoro.
19 A pụkwara ịtụle ime ihe usoro iwu dị otú ahụ ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye na-emeso onye nke ọzọ ihe ike gabiga ókè, ikekwe na-eti onye ahụ ihe ruo n’ókè nke na ahụ ike na ọbụna ndụ nọ n’ihe ize ndụ. Tụkwasịkwa, ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye na-anwa ugboro ugboro ịmanye di ma ọ bụ nwunye imebi iwu Chineke n’ụzọ ụfọdụ, onye nke a na-eyi egwu pụrụ ịtụle nkewa, karịsịa ma ọ bụrụ na okwu eruo n’ókè nke na ndụ ime mmụọ nọ n’ihe ize ndụ. Onye nke nọ n’ihe ize ndụ pụrụ ikpebi na nanị ụzọ e nwere isi ‘kwenyere Chineke karịa mmadụ’ bụ inweta nkewa nke iwu kwadoro.—Ọrụ 5:29.
20. (a) N’ọnọdụ nke ntisa ezinụlọ, gịnị ka ndị enyi tozuru okè na ndị okenye pụrụ inye, gịnịkwa ka ha na-ekwesịghị inye? (b) Ndị di na nwunye ekwesịghị iji aha Bible kpọtụgasịrị nkewa na ịgba alụkwaghịm dị ka ihe ngọpụ ime gịnị?
20 N’ọnọdụ nile nke itibiga di ma ọ bụ nwunye ihe ókè, ọ dịghị onye kwesịrị ịrụgide onye nke aka ya dị ọcha ikewapụ ma ọ bụ iso onye nke ọzọ nọgide. Ọ bụ ezie na ndị enyi tozuru okè na ndị okenye pụrụ inye nkwado na ndụmọdụ dabeere na Bible, ndị a apụghị ịma ihe nile na-aga n’etiti di na nwunye. Nanị Jehova pụrụ ịhụ nke ahụ. N’ezie, nwunye bụ́ onye Kraịst agaghị na-asọpụrụ ndokwa alụmdi na nwunye nke Chineke ma o jiri ihe ngọpụ na-enweghị isi hapụ alụmdi na nwunye. Ma ọ bụrụ na ọnọdụ dịbigara ize ndụ ókè adịgide, ọ dịghị onye kwesịrị ịkatọ ya ma ọ họrọ ikewapụ. A pụrụ ikwu otu ihe ahụ kpọmkwem banyere di bụ́ onye Kraịst nke na-achọ nkewa. “Anyị nile ga-eguzo n’ihu oche ikpe Chineke.”—Ndị Rom 14:10.
ỤZỌ E SI ZỌPỤTA ALỤMDI NA NWUNYE TISARA ETISA
21. Olee ahụmahụ na-egosi na ndụmọdụ Bible maka alụmdi na nwunye dị irè?
21 Ọnwa atọ mgbe Lucia, nke a kpọtụrụ aha na mbụ, kewapụsịrị n’ebe di ya nọ, o zutere Ndịàmà Jehova ma malite iso ha na-amụ Bible. “N’oké ijuanya nye m,” ka ọ na-akọwa, “Bible nyere ihe ngwọta ndị dị irè maka nsogbu m. Mgbe nanị otu izu nke ọmụmụ ihe gasịrị, m chọrọ ozugbo iso di m birikwa. Taa apụrụ m ikwu na Jehova maara ụzọ isi zọpụta alụmdi na nwunye ndị nọ n’ọgba aghara n’ihi na nkụzi ya na-enyere ndị di na nwunye aka ịmụta ụzọ isi were ibe ha n’onye dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụghị eziokwu, dị ka ụfọdụ na-ekwu, na Ndịàmà Jehova na-ekewa ezinụlọ. N’ọnọdụ nke m, kpọmkwem ihe megidere nke ahụ mere.” Lucia mụtara itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ya.
22. Na gịnị ka ndị di na nwunye nile kwesịrị inwe obi ike?
22 Ọnọdụ Lucia apụghị iche. Alụmdi na nwunye kwesịrị ịbụ ngọzi, ọ bụghị ibu arọ. N’ihi nke ahụ, Jehova ewepụtawo isi iyi kachasị mma nke ndụmọdụ alụmdi na nwunye e detụworo—Okwu ya dị oké ọnụ ahịa. Bible pụrụ ime ka “onye na-enweghị uche mara ihe.” (Abụ Ọma 19:7-11) Ọ zọpụtawo ọtụtụ alụmdi na nwunye na-achọ itisa, o mewokwa ka ọtụtụ ndị ọzọ nwere nsogbu ndị siri ike ka mma. Ka ndị di na nwunye nile nwee obi ike zuru ezu na ndụmọdụ alụmdi na nwunye Jehova Chineke na-enye. Ọ dị irè n’ezie!
a A gbanwewo aha ya.
b A tụlere ụfọdụ n’ime akụkụ ndị a n’isiakwụkwọ ndị bu ụzọ.
c Okwu Bible a sụgharịrị “ịkwa iko” gụnyere ịkwa iko di na nwunye, ndina ụdị onwe, ndina anụmanụ, na ihe ndị ọzọ megidere iwu a kpachara anya mee nke metụtara iji akụkụ ahụ mmekọahụ eme ihe.
d Nke a agụnyeghị ọnọdụ ebe di, ọ bụ ezie na o bu ezi ihe n’uche, enweghị ike igbo mkpa ezinụlọ ya n’ihi ihe ndị karịrị ya ike, dị ka ọrịa ma ọ bụ ụkọ nke ohere ọrụ.
-
-
Imekọ Agadi ỌnụIsi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
-
-
ISI NKE IRI NA ANỌ
Imekọ Agadi Ọnụ
1, 2. (a) Mgbanwe dịgasị aṅaa na-ewere ọnọdụ ka oge agadi na-eru nso? (b) Olee otú ndị ikom na-asọpụrụ Chineke n’oge Bible si nweta afọ ojuju n’oge agadi?
ỌTỤTỤ mgbanwe na-ewere ọnọdụ ka anyị na-emekwu agadi. Ike ọgwụgwụ anụ ahụ na-amịkọrọ ume anyị. Ile anya n’enyo na-ekpughe ahụ ndọlị ndị ọhụrụ na nchanwụ nwayọọ nwayọọ nke ntutu—ọbụna mfu nke ntutu. Anyị pụrụ inwe nsogbu ụfọdụ n’icheta ihe. Mmekọrịta ndị ọhụrụ na-etolite ka ụmụ na-alụ di ma ọ bụ nwunye, ọzọkwa mgbe a malitere inwe ụmụ ụmụ. Nye ụfọdụ, ịla ezumike nkà na-akpata usoro dị iche nke ibi ndụ.
2 N’ikwu eziokwu, ime agadi pụrụ iweta ule. (Eklisiastis 12:1-8) Ka o sina dị, tụlee ndị ohu Chineke n’oge Bible. Ọ bụ ezie na ha mesịrị nwụọ, ha nwetara ma amamihe ma nghọta, bụ́ ndị wetaara ha nnukwute afọ ojuju n’oge agadi. (Jenesis 25:8; 35:29; Job 12:12; 42:17) Olee otú ha si nwee ihe ịga nke ọma n’iji obi ụtọ na-eme agadi? N’ezie ọ bụ site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị anyị na-ahụ taa na e dekọrọ na Bible.—Abụ Ọma 119:105; 2 Timoti 3:16, 17.
3. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere maka agadi ndị ikom na ndị inyom?
3 N’akwụkwọ ozi o degaara Taịtọs, Pọl onyeozi nyere ndị na-eme agadi nduzi ọma. O dere, sị: “Ka agadi ndị ikom nwee anya udo, kwesịrị nsọpụrụ, nwee uche zuru okè, nwee ezi ndụ n’ime okwukwe anyi, n’ime ịhụnanya, n’ime ntachi obi: otú ahụ ka agadi ndị inyom dị nsọ n’omume ha, ghara ịbụ ndị na-ebo ebubo ụgha, gharakwa ịbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya ókè, ka ha bụrụ ndị na-ezi ihe ọma.” (Taịtọs 2:2, 3) Ịṅa ntị n’okwu ndị a pụrụ inyere gị aka iche ihe ịma aka dị iche iche nke ime agadi ihu.
KWEKỌỌ NÁ NNWERE ONWE NKE ỤMỤ GỊ
4, 5. Olee otú ọtụtụ nne na nna si emeghachi omume mgbe ụmụ ha na-ahapụ ụlọ, oleekwa ụzọ ụfọdụ si ahazigharị ihe ikwekọ n’ọnọdụ ọhụrụ ahụ?
4 Ọnọdụ ndị na-agbanwe agbanwe na-achọ ime nkwekọ. Lee ka nke a si abụ eziokwu mgbe ụmụ toworo eto na-ahapụ ụlọ ma banye n’alụmdi na nwunye! Nye ọtụtụ nne na nna nke a bụ ihe ncheta mbụ nke na ha na-eme agadi. Ọ bụ ezie na obi dị ha ụtọ na ụmụ ha etopụtawo mmadụ, ndị nne na nna na-enwekarị nchekasị banyere ma hà mere ihe nile ha pụrụ ime iji kwadebe ụmụaka ahụ maka nnwere onwe. Agụụ ụmụ ahụ ịnọ gburugburu ha pụkwara ịdị na-agụ ha.
5 N’ụzọ kwere nghọta, ndị nne na nna na-anọgide na-echegbu onwe ha banyere ọdịmma ụmụ ha, ọbụna mgbe ụmụ ahụ hapụrụ ụlọ. “A sị nnọọ na m pụrụ ịdị na-enweta ozi ha ọtụtụ mgbe, iji mesie onwe m obi ike na ahụ dị ha—nke ahụ ga-eme m obi ụtọ,” ka otu nne kwuru. Otu nna na-akọ, sị: “Mgbe ada anyị hapụrụ ụlọ, ọ bụ oge siri oké ike. O gbuwara oghere dị ukwuu n’ezinụlọ anyị n’ihi na anyị emekọwo ihe ọnụ mgbe nile.” Olee otú ndị nne na nna a siworo nagide anọghị n’ụlọ nke ụmụ ha? N’ọtụtụ ọnọdụ, site n’iwepụta onwe ha ma nyere ndị ọzọ aka.
6. Gịnị na-enye aka idebe mmekọrịta ezinụlọ n’ọnọdụ ha kwesịrị ekwesị?
6 Mgbe ụmụ banyere n’alụmdi na nwunye, ọnọdụ ndị nne na nna na-agbanwe. Jenesis 2:24 na-asị: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Nghọta nke ụkpụrụ Chineke ndị metụtara ịbụisi na usoro ọma ga-enyere ndị nne na nna aka idebe ihe nile n’ọnọdụ kwesịrị ha.—1 Ndị Kọrint 11:3; 14:33, 40.
7. Àgwà ọma dị aṅaa ka otu nna zụlitere mgbe ụmụ ya ndị inyom hapụrụ ụlọ gaa di?
7 Mgbe ụmụ ndị inyom abụọ nke otu di na nwunye gasịrị di ma kwapụ, o yiri di na nwunye ahụ ka ndụ ha ọ̀ tọgbọ chakoo. Na mbụ, di ahụ wesoro ndị bụ di ụmụ ya iwe. Ma ka ọ tụgharịrị uche n’ụkpụrụ ịbụisi, ọ ghọtara na ndị bụ di ụmụ ya bụ ndị ezinụlọ ha dị iche iche dị n’ubu ugbu a. Ya mere, mgbe ụmụ ya ndị inyom chọrọ okwu ndụmọdụ, ọ na-ajụ ha ihe di ha chere, mgbe ahụ ọ na-ejide n’aka na o nyere nkwado ruo ókè o nwere ike. Ndị bụ di ụmụ ya na-ele ya anya ugbu a dị ka enyi ma na-anabata ndụmọdụ ya.
8, 9. Olee otú ụfọdụ nne na nna siworo hazigharịa ihe iji kwekọọ ná nnwere onwe nke ụmụ ha toworo eto?
8 Gịnị ma ọ bụrụ na ndị gbara akwụkwọ ọhụrụ, ọ bụ ezie na ha adịghị eme ihe ọ bụla megidere Akwụkwọ Nsọ, ajụ ime ihe nne na nna ha chere kasị mma? “Anyị na-enyere ha aka mgbe nile ịhụ echiche Jehova,” ka otu di na nwunye nwere ụmụ banyeworo n’alụmdi na nwunye na-akọwa, “ma ọ bụrụ na anyị ekwenyeghị ná mkpebi ha, anyị na-anakwere ya ma nye ha nkwado na agbamume anyị.”
9 N’ala ụfọdụ nke Esia, ọ na-esiri ndị nne ụfọdụ ike nke ukwuu ịnakwere nnwere onwe nke ụmụ ha ndị ikom. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha na-akwanyere usoro na ịbụisi ndị Kraịst ùgwù, ha na-achọpụta na esemokwu ha na ndị nwunye ụmụ ha na-ebelata. Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst na-achọpụta na ọpụpụ ụmụ ya ndị ikom site n’ebe obibi ezinụlọ ahụ abụwo “isi iyi nke obi ekele na-ehiwanye nne.” Ọ na-atọgbu ya atọgbu ịhụ ikike ha ilekọta ezinụlọ ha ndị ọhụrụ. N’aka nke ọzọ, nke a apụtawo mbelata nke ibu nkịtị na nke uche ndị ya na di ya na-aghaghị ibu ka ha na-eme agadi.
IMESIWANYE IHE NKEKỌ ALỤMDI NA NWUNYE GỊ IKE
Ka unu na-eme agadi, mesighachi ịhụnanya maka ibe unu ike
10, 11. Ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ dị aṅaa ga-enyere ndị mmadụ aka izere ọnyà ụfọdụ a na-enwe mgbe a na-akatatụ ahụ?
10 Ụmụ mmadụ na-emeghachi omume n’ụzọ dị iche iche ka ha na-akatatụ ahụ. Ndị ikom ụfọdụ na-eyi ákwà n’ụzọ dị iche ná mgbalị iji yie ndị na-eto eto. Ọtụtụ ụmụ nwanyị na-enwe nchekasị banyere mgbanwe ndị nkwụsị ịhụ nsọ na-eweta. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị na-eme agadi na-akpasu di ma ọ bụ nwunye ha iwe na ekworo site n’iso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha bụ́ ndị ka ha nwata na-eme mfegharị. Ma, agadi ndị ikom na-atụ egwu Chineke “nwere uche zuru okè,” na-egbochi ọchịchọ ndị na-ekwesịghị ekwesị. (1 Pita 4:7) Ndị inyom tozuru okè n’otu aka ahụ na-arụ ọrụ ijigide nkwụsi ike nke alụmdi na nwunye ha, n’ihi ịhụnanya maka di ha na ọchịchọ ime Jehova obi ụtọ.
11 N’ike mmụọ nsọ, Eze Lemuel dekọrọ otuto maka “nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma” nke ji ‘ezi ihe, ọ bụghịkwa ihe ọjọọ, ụbọchị nile nke ndụ ya’ na-enye di ya ụgwọ ọrụ. Di bụ́ onye Kraịst agaghị ahapụ igosi ekele maka ụzọ nwunye ya si na-agbalịsi ike ịnagide nsogbu mmetụta uche ọ bụla ọ na-enwe ka ọ na-eme agadi. Ịhụnanya ya ga-akpali ya ịdị “na-etokwa ya.”—Ilu 31:10, 12, 28.
12. Olee otú ndị di na nwunye si adịwanye nso ka ọtụtụ afọ na-agafe?
12 N’afọ ndị ahụ nke iji ọrụ n’aka n’ịzụlite ụmụ, unu abụọ nwere ike ijiwo ọṅụ wezụga ọchịchọ onwe unu n’akụkụ iji hụ maka mkpa ụmụ unu. Mgbe ha pụsịrị ọ bụ oge ileghachi anya ná ndụ alụmdi na nwunye unu. “Mgbe ụmụ m ndị inyom hapụrụ ụlọ,” ka otu di na-ekwu, “amalitere m n’isi iso nwunye mee mbedo ọzọkwa.” Di ọzọ na-asị: “Anyị na-elekwasị anya n’ahụ ike ibe anyị ma na-echetara ibe anyị banyere mkpa inwe mmega ahụ.” Iji ghara inwe owu ọmụma, ya na nwunye ya na-ele ndị ọzọ n’ọgbakọ ọbịa. Ee, igosi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ na-eweta ngọzi. Ọzọkwa, ọ na-eme Jehova obi ụtọ.—Ndị Filipaị 2:4; Ndị Hibru 13:2, 16.
13. Òkè dị aṅaa ka ezoghị ọnụ na ikwu eziokwu na-emezu ka di na nwunye na-emekọ agadi ọnụ?
13 Ekwela ka ụkọ nke nkwurịta okwu tolite n’etiti gị na onye ị lụrụ. Kwurịtanụ okwu nke ọma. (Ilu 17:27) “Anyị na-eme ka nghọta anyị banyere ibe anyị miwanye emi site n’igosi nchegbu na nchebara echiche,” ka otu di na-ekwu. Nwunye ya kwenyere, na-asị: “Ka anyị meworo agadi, anyị abịawo na-anụ ụtọ ịṅụkọ tii ọnụ, ịkparịta nkata, na imekọ ihe ọnụ.” Ezoghị ọnụ na ikwu eziokwu nke gị pụrụ inye aka ime ka ihe nkekọ alụmdi na nwunye unu sie ike, na-enye ya ike nguzogide nke ga-echigharị mwakpo nile nke Setan, onye ntisa alụmdi na nwunye ihu.
NWEE ỌṄỤ N’ỤMỤ ỤMỤ GỊ
14. Òkè dị aṅaa ka nne ochie Timoti keere dị ka ihe àmà na-egosi ná ntolite ya dị ka onye Kraịst?
14 Ụmụ ụmụ bụ “okpueze” ndị agadi. (Ilu 17:6) Mkpakọrịta nke ụmụ ụmụ pụrụ ịbụ nnọọ ihe ụtọ—na-ekpo ọkụ ma na-enye ume ọhụrụ. Bible na-ekwu nke ọma banyere Lọịs, otu nne ochie bụ́ onye, ya na nwa ya nwanyị bụ́ Yunaịsi, sooro nwa nwa ọhụrụ ya bụ́ Timoti, kerịta ihe ndị o kwenyere. Nwatakịrị a tolitere na-amara na ma nne ya ma nne ya ochie ji eziokwu Bible kpọrọ ihe.—2 Timoti 1:5; 3:14, 15.
15. Banyere ụmụ ụmụ, ụtụ dị aṅaa bara uru ka ndị nne na nna ochie pụrụ ịtụnye, ma gịnị ka ha kwesịrị izere?
15 Ya mere, nke a bụ akụkụ ebe ndị nne na nna ochie pụrụ ịtụnye ụtụ bara oké uru. Ndị nne na nna ochie, unu esoroworị ụmụ unu kerịta ihe ọmụma nke nzube Jehova. Ugbu a unu pụrụ ime otu ihe ahụ n’ebe ọgbọ ọzọkwa nọ! Ọ na-atọgbu ọtụtụ ụmụntakịrị atọgbu ịnụ ka nne na nna ochie ha na-akọ akụkọ Bible. Ma, ị dịghị eweghara ibu ọrụ nke nna nke izi ụmụ ya eziokwu Bible. (Deuterọnọmi 6:7) Kama nke ahụ, ị na-akwado nke a. Ka ekpere gị bụrụ nke ọbụ abụ ahụ: “Ọbụna ruo agadi na isi awọ ahapụla m, Chineke; ruo mgbe m ga-egosi ọgbọ ọzọ ogwe aka Gị, gosikwa onye ọ bụla nke ga-abịa ịdị ike Gị.”—Abụ Ọma 71:18; 78:5, 6.
16. Olee otú ndị nne na nna ochie pụrụ isi zere ịbụ ihe na-akpata ihe isi ike na-ebilite n’ezinụlọ ha?
16 Ọ bụ ihe mwute na ụfọdụ nne na nna ochie na-azụtọ ụmụntakịrị nke ukwuu nke na esemokwu na-ebilite n’etiti ndị nne na nna ochie na ụmụ ha toworo eto. Otú ọ dị, obi ọma gị sitere n’obi pụrụ ma eleghị anya mee ya ka ọ dị mfe ụmụ ụmụ gị ikpughere gị izu nzuzo ha mgbe ha na-adịghị achọ ikpughere nne na nna ha ihe. Mgbe ụfọdụ ụmụaka na-enwe olileanya na nne na nna ochie ha na-anabata ihe nile ga-adọnyere ha úkwù megide ndị mụrụ ha. Mgbe ahụ gịnị? Gosi amamihe ma gbaa ụmụ ụmụ gị ume ịhapụ izo ọnụ n’ebe ndị mụrụ ha nọ. Ị pụrụ ịkọwa na nke a na-atọ Jehova ụtọ. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ị pụrụ iwepụta onwe gị imeghe ụzọ maka ụmụntakịrị ahụ ijekwuru ndị mụrụ ha site n’ikwunyere nne na nna ha okwu. Na-agwa ụmụ ụmụ gị eziokwu banyere ihe ị mụtaworo n’ọtụtụ afọ. Ikwu eziokwu na ịkwụwa aka ọtọ gị pụrụ ịbara ha uru.
MEE NHAZIGHARỊ KA Ị NA-AKA NKÁ
17. Mkpebisi ike dị aṅaa nke ọbụ abụ ahụ kwesịrị ka ndị Kraịst na-eme agadi ṅomie?
17 Ka ọtụtụ afọ na-agafe, ị ga-ahụta na ị pụghị imeli ihe nile ị na-emebu ma ọ bụ ihe nile ị chọrọ ime. Olee otú mmadụ si eche usoro ịka nká ihu? N’uche gị ị pụrụ inwe mmetụta nke ịdị 30 afọ, ma ileru anya n’enyo na-egosi izi ezi dị iche. Enwela nkụda obi. Ọbụ abụ ahụ kpọkuru Jehova, sị: “Etufula m na mgbe agadi; mgbe ike m gwụsịrị ahapụla m.” Zubesie ike iṅomi mkpebisi ike nke ọbụ abụ ahụ. Ọ sịrị: “Mgbe nile ka m ga na-eche Gị, wee tụkwasị otuto n’otuto Gị nile.”—Abụ Ọma 71:9, 14.
18. Olee otú onye Kraịst tozuru okè pụrụ isi jiri ezumike nká mee ihe bara uru?
18 Ọtụtụ emewo nkwadebe n’oge iji welite otuto ha na-eto Jehova mgbe ha lara ezumike nká. “Emere m atụmatụ n’oge banyere ihe m ga-eme mgbe ada anyị gụsịrị akwụkwọ,” ka otu nna laworo ezumike nká ugbu a na-akọwa. “Ekpebisiri m ike na m ga-amalite ozi nkwusa oge nile, m rekwara azụmahịa m iji nwere onwe m ijere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu karị. Ekpere m ekpere maka nduzi Chineke.” Ọ bụrụ na ị na-eru nso afọ ndụ nke ịla ezumike nká, nweta nkasi obi site ná nkwupụta nke Onye Okike Ukwu anyị, bụ́: “Ruo agadi Mụ onwe m bụ Onye ahụ, ruokwa isi awọ Mụ onwe m ga-eku unu n’aka.”—Aịsaịa 46:4.
19. Ndụmọdụ dị aṅaa ka e nyere maka ndị na-eme agadi?
19 Imezigharị ihe iji kwekọọ n’ezumike nká nwere ike ọ gaghị adị mfe. Pọl onyeozi dụrụ agadi ndị ikom ọdụ ka ha “nwee anya udo.” Nke a na-achọ njighachi azụ n’ihe nile, n’adabaghị n’ọchịchọ nke ịchụso ndụ dị mfe. A pụrụ inwe mkpa ọbụna nke ka ukwuu maka ịdị n’usoro na ịrụ ahụ onwe onye ụka mgbe a lara ezumike nká karịa ka ọ dị na mbụ. Ya mere, jide ọrụ n’aka, “na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile, ebe unu matara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 15:58) Gbasapụ ihe ndị ị na-eme iji nyere ndị ọzọ aka. (2 Ndị Kọrint 6:13) Ọtụtụ ndị Kraịst na-eme nke a site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ a hazigharịrị ahazigharị. Ka ị na-eme agadi, “nwee ezi ndụ n’ime okwukwe anyị, n’ime ịhụnanya, n’ime ntachi obi.”—Taịtọs 2:2.
ỊNAGIDE ỌNWỤ DI MA Ọ BỤ NWUNYE
20, 21. (a) N’usoro ihe dị ugbu a, gịnị ga-emesị kewaa di na nwunye? (b) Olee ụzọ Ana si setịpụ ihe atụ ọma nye ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ?
20 Ọ bụ eziokwu dị mwute na n’usoro ihe dị ugbu a, ọnwụ na-emesị kewaa ndị di na nwunye. Ndị Kraịst di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ maara na ndị ha hụrụ n’anya na-arahụ ụra ugbu a, obi sikwara ha ike na ha ga-ahụ ha ọzọ. (Jọn 11:11, 25) Ma ọnwụ ahụ ka na-akpata iru újú. Olee otú onye nke nọ ndụ pụrụ isi nagide ya?a
21 Iburu n’uche ihe otu onye n’ime Bible mere ga-enye aka. Di Ana nwụrụ mgbe nanị afọ asaa nke alụmdi na nwunye ya gasịrị, mgbe anyị gụkwara banyere ya, ọ dị 84 afọ. Anyị pụrụ ijide n’aka na o ruru újú mgbe di ya nwụnahụrụ ya. Olee otú o si nagide ya? O jeere Jehova Chineke ozi dị nsọ n’ụlọ nsọ ahụ ehihie na abalị. (Luk 2:36-38) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndụ Ana nke iji ekpere na-eje ozi bụ nnukwu ihe ngwọta nke obi ilu na owu ọmụma o nwere dị ka nwanyị di ya nwụrụ.
22. Olee otú ụfọdụ ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ siworo nagide owu ọmụma?
22 “Ihe ịma aka kasịnụ nye m abụwo enweghị onye ibe m ga-ekwunyere okwu,” ka otu nwanyị dị 72 afọ nke di ya nwụrụ iri afọ gara aga na-akọwa. “Di m ma ka e si ege ntị. Anyị ga-ekwurịta banyere ọgbakọ na òkè anyị na-ekere n’ozi ndị Kraịst.” Nwanyị ọzọ di ya nwụrụ na-asị: “Ọ bụ ezie na oge na-ebelata obi ọjọọ, achọpụtawo m na o ziri ezi karị ikwu na ọ bụ ihe mmadụ ji oge ya na-eme na-enyere ya aka inwetaghachi onwe ya. Ị nọ n’ọnọdụ ka mma inyere ndị ọzọ aka.” Otu nwanyị dị 67 afọ nke di ya nwụrụ kwenyere, na-asị: “Ụzọ magburu onwe ya isi nagide ọnwụ bụ iwepụta onwe gị ịkasi ndị ọzọ obi.”
ỊBỤ ONYE CHINEKE JI KPỌRỌ IHE N’OGE NKÁ
23, 24. Nnukwu nkasi obi dị aṅaa ka Bible na-enye ndị agadi, karịsịa ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụworo?
23 Ọ bụ ezie na ọnwụ na-ewere di ma ọ bụ nwunye a hụrụ n’anya, Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe nile, a na-eji ya n’aka mgbe nile. “Otu ihe ka m rịọworo n’aka Jehova,” ka Eze Devid oge ochie bụrụ n’abụ, “nke ahụ ka m na-achọ; ọ bụ ka m biri n’ụlọ Jehova ụbọchị nile nke ndụ m, ịhụ ịdị ụtọ Jehova, na ịjụta ihe n’ụlọ ukwu Ya.”—Abụ Ọma 27:4.
24 “Na-asọpụrụ ndị inyom di ha nwụrụ, bụ́ ndị nọ n’ezie n’ọnọdụ ndị inyom di ha nwụrụ,” ka Pọl onyeozi na-agba ume ya. (1 Timoti 5:3) Ndụmọdụ nke na-eso ntụziaka a na-egosi na ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị ruru eru na-enweghị ndị ikwu dị nso pụrụ inwewo mkpa nkwado ihe onwunwe site n’ọgbakọ. Ka o sina dị, nghọta dị ná ntụziaka ahụ bụ́ “na-asọpụrụ” gụnyere echiche nke iji ha kpọrọ ihe. Lee aha nkasi obi ndị na-asọpụrụ Chineke di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ pụrụ inweta site n’ihe ọmụma nke na Jehova ji ha akpọrọ ihe, na ọ ga-akwagidekwa ha!—Jemes 1:27.
25. Ihe mgbaru ọsọ dị aṅaa ka na-echere ndị agadi?
25 “Ihe nsọpụrụ ndị okenye ka isi awọ bụkwa,” ka Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee na-ekwu. Ọ bụ “okpueze nke mara mma . . . , n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.” (Ilu 16:31; 20:29) Ya mere, ma ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ị nọ nanị gị ọzọkwa, nọgide na-edebe ijere Jehova ozi n’ọnọdụ mbụ ná ndụ gị. Ị ga-esi otú ahụ nwee aha ọma n’ebe Chineke nọ ugbu a na atụmanya nke ndụ agwụghị agwụ n’ụwa ebe ihe mgbu nile nke ịka nká na-agaghị adịkwa.—Abụ Ọma 37:3-5; Aịsaịa 65:20.
a Maka nkọwa zuru ezu karị n’isiokwu a, lee broshuọ ahụ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
-
-
Ịsọpụrụ Ndị Nne na Nna Anyị Meworo AgadiIsi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
-
-
ISI NKE IRI NA ISE
Ịsọpụrụ Ndị Nne na Nna Anyị Meworo Agadi
1. Ụgwọ dịgasị aṅaa ka anyị ji nne na nna anyị, n’ihi ya kwa olee otú anyị kwesịrị isi lee ha anya ma mesoo ha?
“GEE nna gị, bụ́ onye mụrụ gị, ntị, eledakwala nne gị anya mgbe o mere agadi,” ka onye amamihe nke ogologo oge gara aga dụrụ n’ọdụ. (Ilu 23:22) ‘M gaghị eme nke ahụ ma ọlị!’ ka ị pụrụ ikwu. Kama ileda ndị nne anyị anya—ma ọ bụ ndị nna anyị—ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-enwe ịhụnanya miri emi maka ha. Anyị na-aghọta na anyị ji ha ụgwọ dị ukwuu. Na nke mbụ ya, nne na nna anyị nyere anyị ndụ. Ọ bụ ezie na Jehova bụ Isi Iyi nke ndụ, anyị agaraghị nnọọ adị adị ma ọ bụghị nne na nna anyị. Ọ dịghị ihe anyị pụrụ inye ndị nne na nna anyị dị oké ọnụ ahịa karịa ndụ n’onwe ya. Mgbe ahụ, cheedị nnọọ banyere ịchụ onwe onye n’àjà, oké nchekasị, mmefu, na nlebara anya ịhụnanya nke inyere nwata aka site na nwa ọhụrụ gaa n’okenye gụnyere. Ya mere, lee ka o si bụrụ ihe ezi uche dị na ya na Okwu Chineke na-adụ ọdụ, sị: “Sọpụrụ nna gị na nne gị . . . ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa”!—Ndị Efesọs 6:2, 3.
ỊMATA MKPA NDỊ NKE MMETỤTA UCHE
2. Olee otú ụmụ toworo eto pụrụ isi ‘na-enyeghachi’ ndị mụrụ ha ihe?
2 Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst akwụkwọ, sị: “Ka [ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ] buru ụzọ mụta ịsọpụrụ Chineke n’ahụ ndị ezinụlọ nke aka ha, na inyeghachi ndị mụrụ ha ihe: n’ihi na nke a bụ ihe a na-anara nke ọma n’ihu Chineke.” (1 Timoti 5:4) Ụmụ toworo eto ‘na-enyeghachi ihe’ nke a site n’igosi ekele maka ọtụtụ afọ nke ịhụnanya, ọrụ, na nlekọta nne na nna ha na nne na nna ochie ha tinyere n’ebe ha nọ. Otu ụzọ ụmụaka pụrụ isi mee nke a bụ site n’ịmata na dị ka onye ọ bụla ọzọ, ndị agadi nwere mkpa ịhụnanya na mmesi obi ike—ọtụtụ mgbe ọ na-agụgbu ha agụgbu. Dị ka anyị nile, ọ dị ha mkpa inwe mmetụta nke ịbụ ndị e ji kpọrọ ihe. Ọ dị ha mkpa inwe mmetụta nke na ndụ ha bara uru.
3. Olee otú anyị pụrụ isi sọpụrụ ndị nne na nna na ndị nne na nna ochie?
3 Ya mere anyị pụrụ ịsọpụrụ nne na nna anyị na nne na nna ochie anyị site n’ime ka ha mara na anyị hụrụ ha n’anya. (1 Ndị Kọrint 16:14) Ọ bụrụ na anyị na ndị mụrụ anyị ebighị, anyị kwesịrị icheta na ha ịnata ozi site n’aka anyị pụrụ ịbụrụ ha oké ihe. Akwụkwọ ozi na-enye obi ụtọ, òkù fon, ma ọ bụ nleta pụrụ itinye ihe dị ukwuu n’ọṅụ ha. Miyo, onye bi na Japan, dere mgbe ọ gbara 82 afọ, sị: “Nwa m nwanyị [nke di ya bụ onye ozi na-ejegharị ejegharị] na-agwa m: ‘Mama, biko soro anyị “mee njem.”’ Ọ na-ezitere m ndepụta usoro njegharị na nọmba telifon ha kwa izu. Apụrụ m ịsaghe map m ma sị: ‘Ehee. Ugbu a ha nọ ebe a!’ Ana m ekele Jehova mgbe nile maka ngọzi nke inwe nwa dị otú a.”
INYE AKA NÁ MKPA IHE ONWUNWE
4. Olee otú ọdịnala okpukpe ndị Juu si gbaa ume inwe afọ ịta mmiri n’ebe nne na nna meworo agadi nọ?
4 Mmadụ ịsọpụrụ nne na nna ya ọ̀ pụrụ ịgụnyekwa ilekọta mkpa ihe onwunwe ha? Ee. Ọ na-agụnyekarị ya. N’ụbọchị Jisọs ndị ndú okpukpe ndị Juu kwadoro ọdịnala nke na ọ bụrụ na mmadụ ekwuo na ego ma ọ bụ ihe onwunwe ya bụ “ihe e nyere Chineke,” o nweere onwe ya pụọ n’ibu ọrụ nke iji ya lekọta ndị mụrụ ya. (Matiu 15:3-6) Lee aha afọ ịta mmiri nke ahụ bụ! Ya bụ na ndị ndú okpukpe ahụ na-agba ndị ahụ ume ịhapụ ịsọpụrụ nne na nna ha kama na-emeso ha n’ụzọ nlelị site n’iji ọchịchọ onwe onye nanị na-ahapụ igbo mkpa ha. Ọ dịghị ihe ga-eme ka anyị chọọ ime nke ahụ!—Deuterọnọmi 27:16.
5. N’agbanyeghị ndokwa ndị gọọmenti mere n’ala ụfọdụ, n’ihi gịnị ka mmadụ ịsọpụrụ nne na nna ya ji agụnye enyemaka ego mgbe ụfọdụ?
5 N’ọtụtụ ala taa, usoro ihe omume enyemaka gọọmenti na-akwado na-ahụ maka ụfọdụ n’ime mkpa ihe onwunwe nke ndị agadi, dị ka nri, uwe, na ebe obibi. Tụkwasị na nke ahụ, ndị agadi n’onwe ha pụrụ inwewo ike ime ndokwa ụfọdụ maka oge agadi ha. Ma ọ bụrụ na ndokwa ndị a agwụsịa ma ọ bụ ghara izu ezu, ụmụ na-asọpụrụ nne na nna ha site n’ime ihe ha pụrụ ime iji gboo mkpa ndị nne na nna. N’ezie, ilekọta ndị nne na nna meworo agadi bụ ihe àmà nke nsọpụrụ Chineke, ya bụ, ofufe mmadụ na-enye Jehova Chineke, Onye Mmalite nke ndokwa ezinụlọ.
ỊHỤNANYA NA IJI ONWE ONYE ACHỤ ÀJÀ
6. Ndokwa ibi obi dịgasị aṅaa ka ụfọdụ meworo iji gboo mkpa ndị mụrụ ha?
6 Ọtụtụ ụmụ toworo eto ejiwo ịhụnanya na iji onwe onye achụ àjà zaghachi ná mkpa dị iche iche nke nne na nna ha ahụ na-adịkwaghị ike. Ụfọdụ akpọbatawo nne na nna ha n’ụlọ ha ma ọ bụ kwaga nso ebe ha bi. Ndị ọzọ ebinyeworo nne na nna ha. Mgbe mgbe, ndokwa dịgasị otú ahụ aghọwo ngọzi nye ma nne na nna ma ụmụaka.
7. N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị mma ime ihe ọkụ ọkụ n’ime mkpebi banyere nne na nna meworo agadi?
7 Ma, mgbe ụfọdụ, nkwagharị dị otú ahụ adịghị aga nke ọma. N’ihi gịnị? Ikekwe n’ihi na e mere mkpebi oké ọkụ ọkụ ma ọ bụ dabere nanị ná mmetụta uche. “Onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya,” ka Bible ji amamihe dọọ aka ná ntị ya. (Ilu 14:15) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nne gị bụ́ agadi na-enwe ihe isi ike ibi nanị ya, i wee chee na ya ịkwabatakwuru gị pụrụ ịbara ya uru. N’iji amamihe ghọta ijeụkwụ gị, ị pụrụ ịtụle ihe na-esonụ: Gịnị bụ mkpa ya n’ezie? È nwere usoro ozi nkwado onwe onye ma ọ bụ nke ndị gọọmenti bụ́ ndị na-enye ihe ngwọta ọzọ a pụrụ ịnakwere? Ọ̀ chọrọ ịkwabata? Ọ bụrụ na ọ chọrọ, n’ụzọ dịgasị aṅaa ka ọ ga-esi metụta ndụ ya? Ọ̀ gaje ịhapụ ndị enyi? Olee otú nke a pụrụ isi metụta ya ná mmetụta uche? Ì sorowo ya kwurịta ihe ndị a? Olee otú nkwagharị dị otú ahụ pụrụ isi metụta gị, onye ị na-alụ, ụmụ ndị nke gị? Ọ bụrụ na nne gị chọrọ nlekọta, ònye ga-enye ya? À pụrụ ike ibu ọrụ ahụ eke? Ì sorowo ndị nile okwu ahụ metụtara kpọmkwem tụlee ya?
8. Ole ndị ka ị pụrụ inwe ike iso kwurịta okwu mgbe a na-ekpebi ụzọ isi nyere nne na nna gị meworo agadi aka?
8 Ebe ibu ọrụ inye nlekọta dịịrị ụmụ nile nọ n’ezinụlọ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe inwe nnọkọ nkwurịta okwu ezinụlọ ka mmadụ nile wee kere òkè n’ime mkpebi. Ikwunyere ndị okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst ma ọ bụ ndị enyi cheworo ọnọdụ yiri nke ahụ okwu pụkwara ịbụ ihe enyemaka. “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị,” ka Bible na-adọ aka ná ntị, “ma n’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ ka ha na-eguzosi ike.”—Ilu 15:22.
NA-EGOSI ỌMỊIKO NA NGHỌTA
Ọ bụ ihe amamihe na-adịghị ya imere nne ma ọ bụ nna mkpebi n’ebughị ụzọ kwunyere onye ahụ okwu
9, 10. (a) N’agbanyeghị ha imewanye agadi, nchebara echiche dị aṅaa ka e kwesịrị ichebara ndị agadi? (b) N’agbanyeghị nzọụkwụ nwa toworo eto pụrụ iwere n’ihi nne na nna ya, gịnị ka o kwesịrị inye ha mgbe nile?
9 Ịsọpụrụ nne na nna anyị bụ́ ndị agadi na-achọ ọmịiko na nghọta. Ka afọ ndị na-agafe na-akpa ike n’ahụ ha, ọ pụrụ isiwanyere ndị agadi ike ịga ije, iri nri, na icheta ihe. Enyemaka pụrụ ịdị ha mkpa. Mgbe mgbe ụmụ na-enye nchebe ma na-anwa inye nduzi. Ma ndị agadi bụ ndị toworo eto nwere ogologo ndụ nke amamihe na ahụmahụ, ogologo ndụ nke ilekọta onwe ha na imere onwe ha mkpebi. Njimara ha na ùgwù onwe ha pụrụ ịdabere n’ọkwá ha dị ka ndị nne na nna na ndị toworo eto. Ndị nne na nna na-eche na ha aghaghị ịhapụrụ ụmụ ha nchịkwa nke ndụ ha pụrụ inwe ịda mbà n’obi ma ọ bụ iwe. Ụfọdụ na-ajụ ma na-eguzogide ihe ha pụrụ ile anya dị ka mgbalị ịnapụ ha nnwere onwe ha.
10 E nweghị ihe ngwọta ọ bụla dị mfe nye nsogbu dịgasị otú ahụ, ma ọ bụ ihe obi ọma ikwere ka nne na nna bụ́ ndị agadi lekọta onwe ha ma mee mkpebi ndị nke ha ruo n’ókè o kwere omume. Ọ bụ ihe amamihe ịghara ime mkpebi banyere ihe kasị mma nye nne na nna gị n’ebughị ụzọ kwunyere ha okwu. Ihe dị ukwuu pụrụ ifunarịwo ha. Kwe ka ha debe ihe ha ka nwere. Ị pụrụ ịchọpụta na ka ị na-etinye mgbalị ka nta n’ịchịkwa ndụ nne na nna gị, otú ahụ ka mmekọrịta gị na ha ga-aka mma. Ha ga-enwe obi ụtọ karị, otú ahụkwa ka ị ga-enwe. Ọbụna ma ọ dị mkpa isi ọnwụ n’ihe ụfọdụ maka ọdịmma ha, ịsọpụrụ nne na nna gị chọrọ ka i nye ha ùgwù na nsọpụrụ ruuru ha. Okwu Chineke na-adụ ọdụ, sị: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye.”—Levitikọs 19:32.
ỊNỌGIDE NA-ENWE ÀGWÀ ZIRI EZI
11-13. Ọ bụrụ na mmekọrịta n’etiti nwa toworo eto na nne na nna ya adịbughị mma n’oge gara aga, olee otú ọ pụrụ isikwarị hụ maka ihe ịma aka nke ilekọta ha n’oge ha kataworo ahụ?
11 Mgbe ụfọdụ nsogbu ụmụ toworo eto na-eche ihu n’ịsọpụrụ nne na nna ha meworo agadi gụnyere mmekọrịta ha na ndị mụrụ ha n’oge ndị gara aga. Ikekwe nna gị dị obi ọjọọ ma ghara ịdị na-ahụ n’anya, nne gị dị aka ike ma kpọọ obi nkụ. Ị ka pụrụ inwe nkụda mmụọ, iwe, ma ọ bụ obi ilu n’ihi na ha abụghị ụdị nne na nna ị chọrọ ka ha bụrụ. Ị̀ pụrụ imeri mmetụta dịgasị otú ahụ?a
12 Basse, onye tolitere na Finland, na-akọ, sị: “Nna nkuchi m abụwo onye agha SS na Nazi Germany. Ọ na-ewekarị iwe ọkụ, mgbe ahụ ọ na-adịkwa ize ndụ. O tiri nne m ihe ọtụtụ mgbe n’ihu m. Otu mgbe o wesoro m iwe, o fegharịrị belt ya ma jiri isi ígwè ya kụọ m n’ihu. Ọ kụsiri m ike nke ukwuu nke na m si n’elu àkwà daa.”
13 Ma, e nwekwararịị akụkụ ọzọ nke omume ya. Basse na-ekwukwasị: “N’aka nke ọzọ, ọ na-arụsi ọrụ ike, gharakwa ịdị na-emere onwe ya ebere n’ilekọta ezinụlọ n’ụzọ ihe onwunwe. Ọ dịghị mgbe o gosiri m ịhụnanya nke nna, ma amaara m na o nwere ọnyá nke mmetụta uche. Nne ya chụpụrụ ya n’ụlọ mgbe ọ bụ obere nwa nwoke. O ji ọgụ na mgba tolite ma banye n’agha n’oge okorobịa. Apụrụ m ịghọta ya ruo ókè ụfọdụ, ataghịkwa m ya ụta. Mgbe m tolitekwuru, achọrọ m inyere ya aka ruo otú m nwere ike ruo ọnwụ ya. Ọ dịghị mfe, ma emere m ihe m pụrụ. Agbalịrị m ịbụ ezi nwa ruo ná ngwụsị, echekwara m na ọ nakweere m dị ka nke ahụ.”
14. Olee akụkụ akwụkwọ nsọ dị irè n’ọnọdụ nile, gụnyere ndị ahụ na-ebilite n’ilekọta nne na nna meworo agadi?
14 N’ọnọdụ ezinụlọ, dị ka n’okwu ndị ọzọ, ndụmọdụ Bible a na-adị irè: “Yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi; na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.”—Ndị Kọlọsi 3:12, 13.
NLEKỌTA DỊKWA NDỊ NLEKỌTA MKPA
15. N’ihi gịnị ka ilekọta nne na nna ji abụ ihe na-egbu mmụọ mgbe ụfọdụ?
15 Ilekọta nne ma ọ bụ nna ahụ na-adịkwaghị ike bụ ọrụ siri ike, na-agụnye ọtụtụ ọrụ, ọtụtụ ibu ọrụ, na ogologo hour. Ma akụkụ kasị sie ike na-abụkarị nke mmetụta uche. Ọ na-egbu mmụọ ikiri ka ahụ ike, ike ncheta, na nnwere onwe nne na nna gị na-efunarị ha. Sandy, onye si Puerto Rico, na-akọ, sị: “Nne m bụ onye na-ejikọta ezinụlọ anyị. Ọ bụ oké ihe mgbu ilekọta ya. Nke mbụ ọ malitere ite ụkwụ; o mesịa nwee mkpa iji mkpọrọ, e mesịa ihe ndị ngwụrọ ji aga ije, e mesịa oche nkwagharị. Mgbe nke ahụ gasịrị ọ nọ nnọọ na-aka njọ ruo mgbe ọ nwụrụ. O butere ọrịa cancer ọkpụkpụ ma chọọ nlekọta mgbe nile—ehihie na abalị. Anyị sara ya ahụ ma nye ya nri ma gụọrọ ya ihe. O siri ike nke ukwuu—karịsịa ná mmetụta uche. Mgbe m chọpụtara na nne m na-anwụ, ebere m ákwá n’ihi na ahụrụ m ya n’anya nke ukwuu.”
16, 17. Okwu ndụmọdụ dị aṅaa pụrụ inyere onye na-enye nlekọta aka inwe nguzozi n’ihe dị iche iche?
16 Ọ bụrụ na ị chọta onwe gị n’ọnọdụ yiri nke ahụ, gịnị ka ị pụrụ ime iji nagide ya? Ige Jehova ntị site n’ọgụgụ Bible na ikwunyere ya okwu n’ekpere ga-enyere gị aka nke ukwuu. (Ndị Filipaị 4:6, 7) N’ụzọ dị irè, hụ na ị na-eri nri na-edozi ahụ ma gbalịa ịrahụ ụra zuru ezu. Site n’ime nke a, ị ga-anọ n’ọnọdụ ka mma, ma ná mmetụta uche ma n’anụ ahụ, ilekọta onye ị hụrụ n’anya. Ma eleghị anya ị pụrụ ime ndokwa maka izurutụ ike site n’usoro ihe omume kwa ụbọchị. Ọbụna ma ọ bụrụ na oge ezumike agaghị ekwe omume, ọ ka bụkwa ihe amamihe idokwa maka oge ụfọdụ maka ntụrụndụ. Iji nweta oge ntụrụndụ, ị pụrụ inwe ike idokwa ka onye ọzọ nọnyere nne ma ọ bụ nna gị ahụ na-adịghị.
17 Ka ndị toworo eto na-enye nlekọta tụọ anya ihe ezi uche na-adịghị na ha n’aka onwe ha abụghị ihe na-adịghị emekebe. Ma enwela obi amamikpe maka ihe ị na-apụghị ime. N’ọnọdụ ụfọdụ ọ pụrụ ịdị gị mkpa itinye onye ị hụrụ n’anya n’aka nlekọta nke ebe a na-elekọta ndị agadi. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-enye nlekọta, setịpụ atụmanya ezi uche dị na ha maka onwe gị. Ị ghaghị inwe nguzozi ná mkpa dị iche iche ọ bụghị nanị ndị nke nne na nna gị kamakwa ndị nke ụmụ gị, di ma ọ bụ nwunye gị, na ndị nke onwe gị.
ỌKỊKA NKE UME
18, 19. Nkwa nkwado dị aṅaa ka Jehova kweworo, ahụmahụ dịkwa aṅaa na-egosi na ọ na-edebe nkwa a?
18 Site n’Okwu ya, bụ́ Bible, Jehova ji ịhụnanya enye nduzi nke pụrụ inyere mmadụ aka nke ukwuu n’ilekọta nne na nna na-eme agadi, ma ọ bụghị nke ahụ nanị bụ enyemaka ọ na-enye. “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku Ya,” ka ọbụ abụ ahụ dere n’ike mmụọ nsọ. “Ọ bụkwa ntiku ha ka Ọ ga-anụ, wee zọpụta ha.” Jehova ga-azọpụta, ma ọ bụ chebe, ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị sie ike.—Abụ Ọma 145:18, 19.
19 Myrna, na Philippines, mụtara nke a mgbe ọ na-elekọta nne ya, onye ahụ mkpọnwụ mere ka ọ ghara ịbakwa uru. “Ọ dịghị ihe na-egbu mmụọ ka ịhụ onye ị hụrụ n’anya ka ọ na-ata ahụhụ, n’enweghị ike ịgwa gị ebe ọ na-afụ ya ụfụ,” ka Myrna na-ede. “Ọ dị nnọọ ka ịhụ ka mmiri na-eri ya nwayọọ nwayọọ, ọ dịghịkwa ihe m pụrụ ime. Ọtụtụ mgbe m ga-egbu ikpere m n’ala ma gwa Jehova otú ike gwụruru m. Ebere m ákwá ka Devid, onye kpọkuru Jehova ka o debe anya mmiri ya n’ime karama ma cheta ya. [Abụ Ọma 56:8] Dịkwa ka Jehova kwere ná nkwa, o nyere m ume nke m chọrọ. ‘Jehova bụụrụ m ihe ndabere.’”—Abụ Ọma 18:18.
20. Nkwa Bible dịgasị aṅaa na-enyere ndị na-enye nlekọta aka ịdị na-ele anya ihe ọma, ọbụna ma ọ bụrụ na onye ha na-elekọta anwụọ?
20 E kwuwo na ilekọta nne na nna na-eme agadi bụ “akụkọ na-enweghị ngwụsị obi ụtọ.” N’agbanyeghị mgbalị ndị kasị mma n’inye nlekọta, ndị agadi pụrụ ịnwụ, dị ka nne Myrna nwụrụ. Ma ndị tụkwasịrị Jehova obi maara na ọnwụ abụghị ngwụsị nke akụkọ ahụ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) Ndị nne na nna ha meworo agadi nwụnahụworo na-enweta nkasi obi n’olileanya mbilite n’ọnwụ ya na nkwa nke ụwa ọhụrụ mara mma nke Chineke na-eke ebe “ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 21:4.
21. Ihe ọma dịgasị aṅaa ka ịsọpụrụ nne na nna meworo agadi na-arụpụta?
21 Ndị ohu Chineke nwere nkwanye ùgwù miri emi maka nne na nna ha, ọ bụ ezie na ndị a nwere ike imewo agadi. (Ilu 23:22-24) Ha na-asọpụrụ ha. N’ime nke ahụ, ha na-enwe ahụmahụ nke ihe ilu ahụ si n’ike mmụọ nsọ na-ekwu: “Ka nna gị na nne gị ṅụrịa, ka nwanyị mụworo gị tegharịakwa egwú ọṅụ.” (Ilu 23:25) Nke kasịkwanụ, ndị na-asọpụrụ nne na nna ha meworo agadi na-eme Jehova Chineke obi ụtọ, na-asọpụrụkwa ya.
a Anyị adịghị atụle n’ebe a ọnọdụ ebe ikpe iji ike na ntụkwasị obi mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi mara nne na nna, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ a pụrụ ile anya dị ka mpụ.
-
-
Nwetara Ezinụlọ Gị Ọdịnihu Na-adịgide AdịgideIsi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
-
-
ISI NKE IRI NA ISII
Nwetara Ezinụlọ Gị Ọdịnihu Na-adịgide Adịgide
1. Gịnị bụ nzube Jehova maka ndokwa ezinụlọ?
MGBE Jehova jikọrọ Adam na Iv n’alụmdi na nwunye, Adam kwupụtara ọṅụ ya site n’ịbụ abụ uri Hibru mbụ e dekọrọ edekọ. (Jenesis 2:22, 23) Otú ọ dị, Onye Okike ahụ bu ihe karịrị nanị iwetara ụmụ ya bụ́ mmadụ ihe ụtọ n’uche. Ọ chọrọ ka ndị di na nwunye na ezinụlọ na-eme uche ya. Ọ gwara mmadụ abụọ mbụ ahụ, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ azụ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” (Jenesis 1:28) Lee aha oké ọrụ, na-akwụ ụgwọ nke ahụ bụ! Lee ka ha na ụmụ ha n’ọdịnihu gaara esiworị nwee obi ụtọ a sị na Adam na Iv mere uche Jehova ná nrubeisi zuru ezu!
2, 3. Olee otú ezinụlọ pụrụ isi nweta obi ụtọ kasị ukwuu taa?
2 Taakwa, ezinụlọ na-enwekarịsị obi ụtọ mgbe ha rụkọrọ ọrụ ọnụ n’ime uche Chineke. Pọl onyeozi dere: “Nsọpụrụ Chineke bara uru nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndụ, ma nke ndụ ugbu a, ma nke gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8) Ezinụlọ nke ji nsọpụrụ Chineke na-ebi ndụ ma na-agbaso nduzi Jehova dị ka ọ dị n’ime Bible ga-enweta obi ụtọ ná “ndụ ugbu a.” (Abụ Ọma 1:1-3; 119:105; 2 Timoti 3:16) Ọbụna ma ọ bụrụ nanị otu onye òtù ezinụlọ na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, ihe na-aka mma karịa ma ọ bụrụ na ọ dịghị otu onye na-etinye ya.
3 Akwụkwọ a atụlewo ọtụtụ ụkpụrụ Bible na-etinye ihe n’obi ụtọ ezinụlọ. Eleghị anya ị rịbawo ama na ụfọdụ n’ime ha pụtara ugboro ugboro n’akwụkwọ a dum. N’ihi gịnị? N’ihi na ha bụ eziokwu ndị dị ike na-ewetara mmadụ nile ihe ọma n’akụkụ dị iche iche nke ndụ ezinụlọ. Ezinụlọ nke na-agbalịsi ike itinye ụkpụrụ Bible ndị a n’ọrụ na-achọpụta na nsọpụrụ Chineke nwere n’ezie ‘nkwa nke ndụ ugbu a.’ Ka anyị leekwa anya ọzọ n’anọ n’ime ụkpụrụ ndị a dị mkpa.
URU NKE IMERU IHE N’ÓKÈ
4. N’ihi gịnị ka imeru ihe n’ókè ji dị oké mkpa n’alụmdi na nwunye?
4 Eze Solomọn sịrị: “Obodo e tikpọrọ etikpọ nke mgbidi na-adịghị ka onye ọ bụla nke na-adịghị egbochi mmụọ ya bụ.” (Ilu 25:28; 29:11) ‘Mmadụ igbochi mmụọ ya,’ imeru ihe n’ókè, dị mkpa maka ndị chọrọ alụmdi na nwunye obi ụtọ. Ịdaba ná mmetụta uche ndị na-eweta mbibi, dị ka ọnụma ma ọ bụ oké agụụ maka ihe rụrụ arụ, ga-akpata mbibi nke na-ewe ọtụtụ afọ idozi—ma ọ bụrụ na a ga-edozili ya ma ọlị.
5. Olee otú mmadụ na-ezughị okè pụrụ isi zụlite imeru ihe n’ókè, na-enwekwa abamuru ndị dị aṅaa?
5 N’ezie, ọ dịghị nwa Adam nke pụrụ ịchịkwa anụ ahụ ya na-ezughị okè n’ụzọ zuru ezu. (Ndị Rom 7:21, 22) Ma, imeru ihe n’ókè bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Ndị Galetia 5:22, 23) N’ihi ya, mmụọ Chineke ga-amịpụta imeru ihe n’ókè n’ime anyị ma ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka àgwà a, ma ọ bụrụ na anyị etinye ndụmọdụ kwesịrị ekwesị nke a na-achọta n’Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ, na ma ọ bụrụ na anyị na-eso ndị ọzọ na-egosipụta ya na-akpakọrịta ma na-ezere ndị na-adịghị egosipụta ya. (Abụ Ọma 119:100, 101, 130; Ilu 13:20; 1 Pita 4:7) Ụzọ dị otú ahụ ga-enyere anyị aka ‘ịgbanarị ịkwa iko,’ ọbụna mgbe a nwara anyị. (1 Ndị Kọrint 6:18) Anyị ga-ajụ ime ihe ike, zerekwa ma ọ bụ merie aṅụrụma. Anyị ga-echekwa mkpasu iwe na ọnọdụ ndị siri ike ihu n’ụzọ dị jụụ karị. Ka anyị nile—gụnyere ụmụaka—mụta ịzụlite mkpụrụ a dị mkpa nke mmụọ nsọ.—Abụ Ọma 119:1, 2.
ỤZỌ KWESỊRỊ EKWESỊ ISI LEE ỊBỤISI ANYA
6. (a) Gịnị bụ usoro ịbụisi nke Chineke hiwere? (b) Gịnị ka nwoke na-aghaghị icheta ma ọ bụrụ na ịbụisi ya gaje iwetara ezinụlọ ya obi ụtọ?
6 Ụkpụrụ nke abụọ dị mkpa bụ ịnakwere ịbụisi. Pọl kọwara usoro kwesịrị ekwesị mgbe ọ sịrị: “Ana m achọ ka unu mata na Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Nke a pụtara na nwoke na-edu ndú n’ezinụlọ, nwunye ya na-eji nnọgidesi ike n’ihe na-enye nkwado, ụmụ na-eruberekwa ndị mụrụ ha isi. (Ndị Efesọs 5:22-25, 28-33; 6:1-4) Ma, rịba ama na ịbụisi na-eduba n’obi ụtọ nanị mgbe e ji ya mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ndị bụ di ji nsọpụrụ Chineke na-ebi ndụ maara na ịbụisi abụghị ọchịchị aka ike. Ha na-eṅomi Jisọs, bụ́ Isi ha. Ọ bụ ezie na Jisọs gaje ịbụ “isi n’elu ihe nile,” ọ ‘bịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi.’ (Ndị Efesọs 1:22; Matiu 20:28) N’ụzọ yiri nke ahụ, nwoke bụ́ onye Kraịst na-abụ isi, ọ bụghị iji meere onwe ya uru, kama iji hụ maka ọdịmma ndị nke nwunye na ụmụ ya.—1 Ndị Kọrint 13:4, 5.
7. Ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ dịgasị aṅaa ga-enyere nwunye aka imezu òkè Chineke kenyere ya n’ime ezinụlọ?
7 N’akụkụ nke ya, nwunye nke ji nsọpụrụ Chineke ebi ndụ adịghị ama di ya aka ma ọ bụ na-achọ ịchị ya. Ọ na-enwe obi ụtọ ịdị na-enye ya nkwado na iso ya rụkọọ ọrụ. Bible na-ekwu mgbe ụfọdụ banyere nwunye dị ka onye di ya “nwe” enwe, ghara ịhapụ obi abụọ ọ bụla na di bụ isi ya. (Jenesis 20:3, NW) Site n’ọlụlụ di ọ na-abata n’okpuru ‘iwu nke di ya.’ (Ndị Rom 7:2) N’otu oge ahụ, Bible na-akpọ ya “onye inyeaka kwesịrị.” (Jenesis 2:20) Ọ na-enye àgwà na ikike ndị di ya na-enweghị, ọ na-enyekwa ya nkwado dị mkpa. (Ilu 31:10-31) Bible na-ekwukwa na nwunye bụ “onye ibe,” onye so di ya na-arụkọ ọrụ ọnụ. (Malakaị 2:14, NW) Ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-enyere di na nwunye aka ịghọta ọnọdụ ibe ha na iji mesoo onwe ha n’ụzọ nkwanye ùgwù na nsọpụrụ kwesịrị ekwesị.
“NA-ANỤ IHE ỌSỌ ỌSỌ”
8, 9. Kọwaa ụkpụrụ ụfọdụ ga-enyere mmadụ nile n’ime ezinụlọ aka iji meziwanye nkà nkwurịta okwu ha.
8 N’ime akwụkwọ a e mere ka mkpa nke nkwurịta okwu pụta ìhè mgbe mgbe. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe na-aga nke ọma karị mgbe ndị mmadụ na-ekwu okwu ma na-aṅa ibe ha ntị n’ezie. E mesiwo ya ike ugboro ugboro na nkwurịta okwu bụ nke inye enye na ịnara anara. Jemes onye na-eso ụzọ tinyere ya otú a: “Mmadụ ọ bụla bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu.”—Jemes 1:19.
9 Ọ dịkwa mkpa ịkpachara anya banyere ụzọ anyị si ekwu okwu. Okwu a na-echeghị eche, nke ise okwu, ma ọ bụ nke oké nkatọ adịghị adaba ná nkwurịta okwu na-aga nke ọma. (Ilu 15:1; 21:9; 29:11, 20) Ọbụna mgbe ihe anyị kwuru ziri ezi, ọ bụrụ na e kwuru ya n’ụzọ obi ọjọọ, nganga, ma ọ bụ enweghị mmetụta, o yikarịrị ka ọ ga-emerụ ahụ kama ime ihe ọma. Okwu ọnụ anyị kwesịrị ịdị ụtọ, “ihe e ji nnú mee ka ọ dị ụtọ.” (Ndị Kọlọsi 4:6) Okwu anyị kwesịrị ịdị ka “mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha.” (Ilu 25:11) Ezinụlọ ndị mụtara ikwurịta okwu nke ọma ewerewo nzọụkwụ gbara ọkpụrụkpụ n’inweta obi ụtọ.
ÒKÈ DỊ MKPA ỊHỤNANYA NA-EKERE
10. Ụdị ịhụnanya dị aṅaa dị oké mkpa n’alụmdi na nwunye?
10 Okwu ahụ bụ “ịhụnanya” pụtara ugboro ugboro n’akwụkwọ a dum. Ì chetara ụdị ịhụnanya e zoro aka na ya karịsịa? Ọ bụ ezie na ịhụnanya nwoke na nwanyị (Grik, eʹros) na-ekere òkè dị mkpa n’alụmdi na nwunye, n’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma kwa, mmetụta miri emi na ọbụbụenyi (Grik, phi·liʹa) na-etolite n’etiti di na nwunye. Ma nke dị mkpa ọbụna karị bụ ịhụnanya nke okwu Grik bụ́ a·gaʹpe na-anọchite anya ya. Nke a bụ ịhụnanya anyị na-azụlite maka Jehova, maka Jisọs, na maka ndị agbata obi anyị. (Matiu 22:37-39) Ọ bụ ịhụnanya Jehova na-egosipụtara ihe a kpọrọ mmadụ. (Jọn 3:16) Lee ka o si bụrụ ihe dị ebube na anyị pụrụ igosipụta otu ụdị ịhụnanya a maka di ma ọ bụ nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị!—1 Jọn 4:19.
11. Olee otú ịhụnanya si arụ ọrụ maka ọdịmma nke alụmdi na nwunye?
11 N’ime alụmdi na nwunye ịhụnanya a e buliri elu bụ n’ezie “ihe nkekọ nke izu okè.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Ọ na-ekekọ di na nwunye ma na-eme ha ka ha chọọ ime ihe kasị mma maka ibe ha na maka ụmụ ha. Mgbe ezinụlọ na-eche ọnọdụ ndị siri ike ihu, ịhụnanya na-enyere ha aka imekọ ihe n’ịdị n’otu. Ka di na nwunye na-eme agadi, ịhụnanya na-enyere ha aka ịkwado na ịnọgide na-enwe ekele maka ibe ha. “Ịhụnanya . . . , ọ dịghị achọ ihe nke aka ya. . . . Ọ na-anagide ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-ele anya ihe nile, na-enwe ntachi obi n’ihe nile. Ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.”—1 Ndị Kọrint 13:4-8.
12. N’ihi gịnị ka ịhụnanya maka Chineke n’akụkụ nke di na nwunye ji eme ka alụmdi na nwunye ha sie ike?
12 Njikọ alụmdi na nwunye na-esi ike karịsịa mgbe ọ na-abụghị nanị ịhụnanya n’etiti di na nwunye kama n’ụzọ bụ isi ịhụnanya maka Jehova nyagidere ya. (Eklisiastis 4:9-12) N’ihi gịnị? Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu.” (1 Jọn 5:3) N’ihi ya, di na nwunye kwesịrị ịzụlite ụmụ ha ná nsọpụrụ Chineke ọ bụghị nanị n’ihi na ha hụrụ ụmụ ha n’anya nke ukwuu kama n’ihi na nke a bụ iwu Jehova. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ha kwesịrị izere omume rụrụ arụ ọ bụghị nanị n’ihi na ha hụrụ onwe ha n’anya kama karịsịa n’ihi na ha hụrụ Jehova n’anya, onye “ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.” (Ndị Hibru 13:4) Ọbụna ma ọ bụrụ na onye ibe mmadụ akpata nsogbu ndị siri ike n’alụmdi na nwunye, ịhụnanya maka Jehova ga-akwali onye nke ọzọ ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ Bible. Ezinụlọ ebe ndị e ji ịhụnanya maka Jehova na-eme ka ngosirịta ịhụnanya sie ike bụ ndị nke obi ụtọ n’ezie!
EZINỤLỌ NKE NA-EME UCHE CHINEKE
13. Olee otú mkpebisi ike ime uche Chineke ga-esi nyere ndị mmadụ aka ilekwasị anya n’ihe ndị dị mkpa n’ezie?
13 Ndụ nile nke onye Kraịst dabeere n’ime uche Chineke. (Abụ Ọma 143:10) Nke a bụ ihe nsọpụrụ Chineke pụtara n’ezie. Ime uche Chineke na-enyere ezinụlọ aka ilekwasị anya ha n’ihe ndị dị mkpa n’ezie. (Ndị Filipaị 1:9, 10) Dị ka ihe atụ, Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Abịara m ikewa nwoke megide nna ya, na nwa nwanyị megide nne ya, na nwunye nwa megide nne di ya: ọ bụkwa ndị ezinụlọ mmadụ ga-abụ ndị iro ya.” (Matiu 10:35, 36) Dị ka Jisọs dọrọ aka ná ntị, ọtụtụ ụmụazụ ya abụwo ndị ndị òtù ezinụlọ ha kpagburu. Lee ọnọdụ dị mwute, nke obi mgbu ọ bụ! Ka o sina dị, nkekọ ezinụlọ ekwesịghị ịkarị ịhụnanya anyị maka Jehova Chineke na maka Jisọs Kraịst. (Matiu 10:37-39) Ọ bụrụ na mmadụ edie mmegide ezinụlọ, ndị mmegide ahụ pụrụ ịgbanwe mgbe ha hụrụ mmetụta ọma dị iche iche nke nsọpụrụ Chineke. (1 Ndị Kọrint 7:12-16; 1 Pita 3:1, 2) Ọbụna ma ọ bụrụ na nke ahụ emeghị, ọ dịghị ihe ọma ọ bụla na-adịgide adịgide a na-arụzu site n’ịkwụsị ijere Chineke ozi n’ihi mkpagbu.
14. Olee otú ọchịchọ ime uche Chineke ga-esi nyere nne na nna aka ime ihe maka ọdịmma kasịnụ nke ụmụ ha?
14 Ime uche Chineke na-enyere ndị nne na nna aka ime mkpebi ndị ziri ezi. Dị ka ihe atụ, n’ógbè ụfọdụ nne na nna na-elekarị ụmụ anya dị ka ego e tinyere n’azụmahịa, ha na-adaberekwa n’ụmụ ha ilekọta ha n’oge agadi ha. Ọ bụ ezie na o ziri ezi, kwesịkwa ekwesị ka ụmụ toworo eto lekọta nne na nna na-eme agadi, echiche dị otú ahụ ekwesịghị ime ka nne na nna chigharịa ụmụ ha ihu gaa n’ụzọ ndụ nke nchụso ihe onwunwe. Ndị nne na nna adịghị emere ụmụ ha ihe ọma ọ bụla ma ọ bụrụ na ha azụlite ha iji ihe onwunwe kpọrọ ihe karịa ihe ime mmụọ.—1 Timoti 6:9.
15. Olee otú nne Timoti, bụ́ Yunaịsi, si bụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya nke nne mere uche Chineke?
15 Ihe nlereanya ọma n’akụkụ nke a bụ Yunaịsi, nne enyi Pọl nke na-eto eto bụ́ Timoti. (2 Timoti 1:5) Ọ bụ ezie na di ya bụ onye na-ekweghị ekwe, Yunaịsi, na nne ochie Timoti bụ́ Lọịs, nwere ihe ịga nke ọma n’ịzụlite Timoti ịgbaso nsọpụrụ Chineke. (2 Timoti 3:14, 15) Mgbe Timoti topụtara, Yunaịsi kwere ka ọ hapụ ụlọ ma were ọrụ nkwusa Alaeze dị ka onye ibe Pọl n’ozi ala ọzọ. (Ọrụ 16:1-5) Lee ka ọ na-aghaghị isiwo nwee obi ụtọ mgbe nwa ya nwoke ghọrọ onye ozi ala ọzọ pụtara ìhè! Nsọpụrụ Chineke ya dị ka onye toworo eto gosipụtara nke ọma ọzụzụ e nyere ya na nwata. N’ezie, Yunaịsi nwetara afọ ojuju na ọṅụ n’ịnụ akụkọ banyere ozi ikwesị ntụkwasị obi nke Timoti, ọ bụ ezie na ọ ghaghị ịbụ na ya ịdị na-anọnyere ya gụsiri ya ike.—Ndị Filipaị 2:19, 20.
EZINỤLỌ NA ỌDỊNIHU GỊ
16. Dị ka nwa nwoke, nchegbu kwesịrị ekwesị dị aṅaa ka Jisọs gosiri, ma gịnị bụ ebumnobi ya bụ isi?
16 A zụlitere Jisọs n’ezinụlọ na-atụ egwu Chineke, dịkwa ka onye toworo eto, o gosiri nchegbu kwesịrị ekwesị nke nwa maka nne ya. (Luk 2:51, 52; Jọn 19:26) Otú ọ dị, ebumnobi bụ isi nke Jisọs bụ imezu uche Chineke, nyekwa ya nke a gụnyere imepe ụzọ ka ụmụ mmadụ nwee ndụ ebighị ebi. Nke a ka o mere mgbe o nyere ndụ mmadụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie.—Mak 10:45; Jọn 5:28, 29.
17. Olileanya ndị dị aṅaa dị ebube ka ụzọ ikwesị ntụkwasị obi nke Jisọs na-emepere ndị na-eme uche Chineke?
17 Mgbe Jisọs nwụsịrị, Jehova kpọlitere ya gaa ná ndụ eluigwe ma nye ya ike dị ukwuu, mesịa na-eguzobe ya dị ka Eze n’Alaeze eluigwe ahụ. (Matiu 28:18; Ndị Rom 14:9; Mkpughe 11:15) Àjà Jisọs mere ka o kwe omume ịhọrọ mmadụ ụfọdụ iso ya chịa n’Alaeze ahụ. O mepekwara ụzọ ka mmadụ nile ọzọ nwere ezi obi nwee ndụ zuru okè n’ụwa nke e weghachiri n’ọnọdụ paradaịs. (Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 4; 21:3-5; 22:1-4) Otu n’ime ihe ùgwù kasị ukwuu anyị nwere taa bụ ịkọrọ ndị agbata obi anyị ozi ọma nke a dị ebube.—Matiu 24:14.
18. Ihe ncheta dị aṅaa na agbamume dị aṅaa ka a na-enye ma ezinụlọ ma ndị mmadụ n’otu n’otu?
18 Dị ka Pọl onyeozi gosiri, ibi ndụ nsọpụrụ Chineke na-ekwe nkwa na ndị mmadụ pụrụ iketa ngọzi ndị ahụ ná ndụ “nke gaje ịbịa.” N’ezie, nke a bụ ụzọ kasị nnọọ mma isi nweta obi ụtọ! Cheta, “ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) N’ihi ya, ma ị bụ nwa ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna, di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụ onye toworo eto nọ nanị ya nke nwere ma ọ bụ ghara inwe ụmụ, gbalịsie ike ime uche Chineke. Ọbụna mgbe ị nọ n’okpuru nrụgide ma ọ bụ na-eche ọnọdụ ndị sibigara ike ókè ihu, echezọla ma ọlị na ị bụ ohu nke Chineke ahụ dị ndụ. Otú a, ka ihe nile ị na-eme wetara Jehova ọṅụ. (Ilu 27:11) Ka àgwà gị rụpụtakwara gị obi ụtọ ugbu a na ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ gaje ịbịa!
-