Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 10/1 p. 9
  • Eziokwu Nwere Ike Ịgbanwe Ndụ Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eziokwu Nwere Ike Ịgbanwe Ndụ Gị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ò Nwere Ihe Jikọrọ Okwukwe na Ichebara Ihe Echiche?
    Teta!—2011
  • Eziokwu Ọ̀ Ka Dị Mkpa?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Eziokwu ahụ nke M?
    Teta!—1998
  • Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 10/1 p. 9

Eziokwu Nwere Ike Ịgbanwe Ndụ Gị

O NWERE ike ịbụ na ị nụtụla otu n’ime ụgha ndị ahụ e kwuru okwu ha n’isiokwu ndị bu ụzọ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na a kụzierela gị ya. Ma, ọ ka nwere ike ịna-esiri gị ike ịgbanwe ihe ndị i kweere, nke ka nke ma ọ bụrụ na ọ dịla anya i kweere ha.

O doro anya na o nweghị onye ọ na-adịrị mfe ịgbanwe ihe o kweere. Na chọọchị ụfọdụ, a na-agwadị ndị mmadụ na ha ekwesịghị ilebawa anya na Baịbụl iji mara ma ihe a na-akụziri ha ọ̀ bụkwa eziokwu. Chọọchị ndị ọzọ na-achọrọ ụzọ ha ga-esi egosi na nkụzi ụgha ha na-akụzi enweghị ihe o mere. Ha na-asị na Baịbụl bụ oké ọhịa, na a naghị epiocha ya epiocha, nakwa na e deghị ya ka mmadụ niile ghọta ya. Ma, o sighịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs ike ịghọta ihe Jizọs kụziiri ha, n’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ha bụ ndị nkịtị na ndị na-agụghị oké akwụkwọ.—Ọrụ 4:13.

O nwekwara ike ị gaghị achọ ịmụ Baịbụl iji mara ma ihe ndị i kweere hà bụkwa eziokwu n’ihi na ọ ga-adị ka ọ̀ bụ na okwukwe gị esighịzi ike. Ma ì chere na Chineke ga-ewe iwe na ị mụrụ Baịbụl, bụ́ Okwu ya o nyere ụmụ mmadụ, ka i wee mụta ihe ọ chọrọ ka i mee? Mbanụ, kama nke ahụ, Okwu ya na-agba gị ume ka i jiri aka gị nyochaa Akwụkwọ Nsọ. Baịbụl sịrị: “Chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.”—Ndị Rom 12:2.

Ihe mere o ji dị mkpa ka ị mata eziokwu banyere Chineke abụghị naanị ka ị mụta ihe ọhụrụ, kama ọ bụ n’ihi na o nwere ike ime ka ndụ gị ka mma. (Jọn 8:32) Deanne, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya n’isiokwu nke mbụ, emeela ka okwukwe ya sie ike n’Okwu Chineke. Ọ sịrị: “Ọ bụ mgbe m bidoro mụwa Akwụkwọ Nsọ ka m matara na ihe niile e dere na ya doro anya ma dị mfe nghọta. Ugbu a amatala m na Jehova bụ Nna m nke eluigwe, onye hụrụ m n’anya, ọ bụghị onye ihe gbasara m na-anaghị emetụ n’obi. Ndụ m enweela isi ugbu a.”

O nwere ike ịbụ na o nweela mgbe ị mụrụ Baịbụl, ma ya adị gị ka o nweghị ihe ị mụtara. Ọ bụrụ otú ahụ, ike agwụla gị. Ọ bụrụ na ihe a kụziiri gị banyere Chineke bụ ụgha, mbọ ị na-agba ịghọta Baịbụl ga-adị ka ịga ebe ị na-agatụbeghị mbụ, ya abụrụkwa na ụzọ onye ị jụrụ ajụjụ gosiri gị abụghị ụzọ e si aga ebe ahụ. I biligodị n’isi ụtụtụ gawa, ị ga-efugide ụzọ ruo mgbe ike ga-agwụ gị. Ọ bụrụ na ị chọrọ iru ebe ị na-aga, ihe ị ga-eme bụ ịgba mbọ mata nke bụ́ ụzọ e si aga ebe ahụ.

Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ịmata eziokwu banyere Chineke? Anyị na-agba gị ume ka ị kpọtụrụ Ndịàmà Jehova bi n’ógbè gị ma ọ bụ ka i jiri adres nke kwesịrị ekwesị n’ime adres ndị e depụtara na peeji nke 4 na magazin a detara anyị akwụkwọ ozi na ị chọrọ ka mmadụ bịa mụwara gị Baịbụl n’ụlọ gị n’efu.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.”—NDỊ ROM 12:2

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya