-
Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
-
-
ISI NKE ATỌ
Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
Gịnị bụ nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ?
Olee ụzọ e siworo maa Chineke aka?
Ụdị ndụ dị aṅaa ka a ga-ebi n’ụwa n’ọdịnihu?
1. Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa?
NZUBE Chineke maka ụwa magburu nnọọ onwe ya. Jehova chọrọ ka ndị nwere obi ụtọ, ndị ahụ́ siri ike, jupụta n’ụwa. Bible na-ekwu na ‘Chineke kụrụ ubi nke a gbara ogige n’Iden’ nakwa na ‘o mere ka osisi nile ọ bụla puo, bụ́ nke a na-achọsi ike n’ile anya, nke dịkwa mma ihe oriri.’ Mgbe Chineke kesịrị nwoke na nwanyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, O debere ha n’ebe obibi ahụ mara mma ma gwa ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” (Jenesis 1:28; 2:8, 9, 15) N’ihi ya, ọ bụ nzube Chineke ka ụmụ mmadụ mụọ ụmụ, mee ka ókèala nke ebe obibi ahụ bụ́ ubi gbasaruo ụwa nile, ma na-elekọta ụmụ anụmanụ.
2. (a) Olee otú anyị si mara na nzube Chineke maka ụwa ga-emezu? (b) Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ụmụ mmadụ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?
2 Ì chere na nzube Jehova Chineke bụ́ ka ụmụ mmadụ biri na paradaịs elu ala ga-emezu? “Ekwuwo m,” ka Chineke na-asị, “M ga-emekwa ya.” (Aịsaịa 46:9-11; 55:11) Ee, ihe ọ bụla Chineke zubere, ọ ga-emerịrị ya! Ọ na-ekwu na “ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere [ụwa]” kama “ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” (Aịsaịa 45:18) Ụdị ndị dị aṅaa ka Chineke chọrọ ka ha biri n’ụwa? Ruokwa ogologo oge hà aṅaa ka ọ chọrọ ka ha biri n’ebe a? Bible na-aza, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4.
3. Ọnọdụ ndị dị aṅaa dị mwute ka e nwere n’ụwa ugbu a, oleekwa ajụjụ ndị nke a na-ewelite?
3 O doro anya na nke a emebeghị. Ugbu a, ndị mmadụ na-ada ọrịa, na-anwụkwa anwụ; ọbụna ha na-alụ ọgụ ma na-egburịta ibe ha. Ihe agaghịzi ka e si chee ya. Otú ọ dị, n’ezie, Chineke ezubeghị na ụwa ga-adị otú ọ dị taa! Oleezi otú mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ? Gịnị mere nzube Chineke emezubeghị? Ọ dịghị akwụkwọ akụkọ ihe mere eme mmadụ dere nke pụrụ ịgwa anyị, n’ihi na nsogbu ahụ malitere n’eluigwe.
MMALITE NKE OTU ONYE IRO
4, 5. (a) Ònye n’ezie jiri agwọ mee ihe n’ịgwa Iv okwu? (b) Olee otú onye na-akpabu ezi àgwà pụrụ isi ghọọ onye ohi?
4 Akwụkwọ mbụ nke Bible kwuru banyere onye na-emegide Chineke bụ́ onye kparutere n’ogige Iden. A kọwara ya dị ka “agwọ,” ma onye mmegide ahụ abụghị anụmanụ nkịtị. Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-eme ka a mata ya dị ka “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” A na-akpọkwa ya “agwọ ochie ahụ.” (Jenesis 3:1; Mkpughe 12:9) Mmụọ ozi a nke dị ike, ma ọ bụ mmụọ a e kere eke nke a na-adịghị ahụ anya, jiri agwọ mee ihe n’ịgwa Iv okwu, dị nnọọ ka onye nwere nkà pụrụ ime ka o yie ka ọ̀ bụ nwa bebi nke dịdebere ya na-ekwu ihe ọ bụ ya onwe ya na-ekwu. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na onye ahụ bụ́ mmụọ nọ ya mgbe Chineke kwadebere ụwa maka ụmụ mmadụ.—Job 38:4, 7.
5 Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ihe nile Jehova kere zuru okè, ònye mere “Ekwensu” a, “Setan” a? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, otu n’ime ụmụ ndị ikom dị ike nke Chineke mere onwe ya Ekwensu. Olee otú nke a pụrụ isi mee? N’ezie, taa, onye na-akpabu ezi àgwà pụrụ ịghọ onye ohi. Olee otú nke ahụ si eme? Onye ahụ pụrụ ikwe ka ọchịchọ na-ezighị ezi sie ike n’obi ya. Ọ bụrụ na ọ nọgide na-eche banyere ya, ọchịchọ ahụ na-ezighị ezi pụrụ isi nnọọ ike. Ọ bụrụzie na o nwee ohere, ọ pụrụ imezu ọchịchọ ọjọọ ahụ o bu n’obi kemgbe.—Jems 1:13-15.
6. Olee otú otu nwa Chineke bụ́ mmụọ nke dị ike si ghọọ Setan bụ́ Ekwensu?
6 Ihe a ka Setan bụ́ Ekwensu mere. O doro anya na ọ nụrụ mgbe Chineke na-agwa Adam na Iv ka ha mụjupụta ụwa. (Jenesis 1:27, 28) Ihe àmà na-egosi na Setan chere, sị, ‘Ụmụ mmadụ nile a pụdịrị ife m ofufe kama ife Chineke!’ N’ihi ya, ọchịchọ ọjọọ batara ya n’obi. N’ikpeazụ, o mere ihe iji ghọgbuo Iv site n’ịgwa ya ihe na-abụghị eziokwu banyere Chineke. (Jenesis 3:1-5) O si otú ahụ ghọọ “Ekwensu,” nke pụtara “Onye Nkwutọ.” N’otu oge ahụ, ọ ghọrọ “Setan,” nke pụtara “Onye Mmegide.”
7. (a) N’ihi gịnị ka Adam na Iv ji nwụọ? (b) N’ihi gịnị ka ụmụ Adam nile ji aka nká, na-anwụkwa anwụ?
7 Site n’iji ụgha na aghụghọ mee ihe, Setan bụ́ Ekwensu mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi. (Jenesis 2:17; 3:6) N’ihi ya, ha mesịrị nwụọ, dị ka Chineke kwuru na ha ga-anwụ ma ọ bụrụ na ha enupụ isi. (Jenesis 3:17-19) Ebe ọ bụ na Adam ghọrọ onye na-ezughị okè mgbe o mehiere, ụmụ ya nile ketara mmehie site n’aka ya. (Ndị Rom 5:12) A pụrụ iji pan e ji eme bred mee ihe atụ nke a. Ọ bụrụ na ọ dị ebe pan ahụ kụkpọrọ akụkpọ, olee otú ogbe bred nke ọ bụla e ji pan ahụ mee ga-adị? Ogbe bred nke ọ bụla ga-enwe ebe bara ime. N’otu aka ahụ, mmadụ ọ bụla ketara “nkụkpọ” nke ezughị okè site n’aka Adam. Ọ bụ ya mere mmadụ nile ji aka nká, na-anwụkwa anwụ.—Ndị Rom 3:23.
8, 9. (a) Ihe ịma aka dị aṅaa ka ihe àmà na-egosi na Setan welitere? (b) N’ihi gịnị ka Chineke na-ejighị gbuo ndị nnupụisi ahụ ozugbo?
8 Mgbe Setan dubara Adam na Iv imehie megide Chineke, ọ na-akpali nnupụisi n’ezie. Ọ nọ na-ama ụzọ Jehova si achị isi aka. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Setan na-ekwu, sị: ‘Chineke amaghị achị. Ọ na-ekwu okwu ụgha, na-egbochikwa ihe ọma ịbịara ndị ọ na-achị. Ọ dịghị ndị mmadụ mkpa ka Chineke na-achị ha. Ha pụrụ ikpebiri onwe ha ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ. Ihe ga-adịrị ha mma ma m chịwa.’ Olee ihe Chineke ga-eme banyere ịma aka mkparị dị otú ahụ? Ụfọdụ na-eche na Chineke gaara egbu ndị nnupụisi ahụ. Ma nke ahụ ọ̀ gaara enye azịza banyere ihe ịma aka Setan? Ọ̀ gaara egosi na ụzọ Chineke si achị ziri ezi?
9 Ebe Jehova bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi n’ụzọ zuru okè, o gbughị ndị nnupụisi ahụ ozugbo. O kpebiri na ọ ga-adị mkpa ka oge ụfọdụ gafee iji nye azịza banyere ihe ịma aka Setan n’ụzọ na-eju afọ nakwa iji gosi na Ekwensu bụ onye ụgha. N’ihi ya, Chineke kpebiri na ya ga-ekwe ka ụmụ mmadụ chịa onwe ha ruo oge ụfọdụ n’okpuru nduzi Setan. N’Isi nke 11 nke akwụkwọ a, a ga-atụle ihe mere Jehova ji mee otú ahụ na ihe mere o jiworo kwe ka ogologo oge gafee tupu ya edozie ihe iseokwu ndị a. Otú ọ dị, ọ dị mma ugbu a ichebara nke a echiche: Adam na Iv hà mere ihe ziri ezi n’ikwere ihe Setan, bụ́ onye na-emetụbereghị ha ihe ọma ọ bụla, gwara ha? Ò ziri ezi ha ikwere na Jehova, bụ́ onye nyere ha ihe nile ha nwere, bụ onye ụgha obi tara mmiri? Gịnị ka ị gaara eme?
10. Olee otú ị pụrụ isi dụnyere Jehova úkwù n’inye azịza banyere ihe ịma aka Setan?
10 Ọ dị mma ichebara ajụjụ ndị a echiche n’ihi na onye ọ bụla n’ime anyị na-eche ihe iseokwu ndị yiri ha ihu taa. Ee, i nwere ohere ịdụnyere Jehova úkwù n’inye azịza banyere ihe ịma aka Setan. Ị pụrụ ịnakwere Jehova dị ka Onye Ọchịchị gị ma nye aka n’igosi na Setan bụ onye ụgha. (Abụ Ọma 73:28; Ilu 27:11) N’ụzọ dị mwute, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole n’ime ọtụtụ ijeri ndị mmadụ n’ụwa a na-eme mkpebi dị otú ahụ. Nke a na-ewelite ajụjụ dị mkpa, Bible ọ̀ na-akụzi n’ezie na Setan na-achị ụwa a?
ÒNYE NA-ACHỊ ỤWA A?
Setan ọ̀ gaara enye Jizọs alaeze nile nke ụwa ma a sị na ha abụghị nke ya?
11, 12. (a) Olee otú ọnwụnwa a nwara Jizọs si gosi na ọ bụ Setan na-achị ụwa a? (b) Olee ihe ọzọ na-egosi na ọ bụ Setan na-achị ụwa a?
11 Ọ dịghị mgbe Jizọs rụrụ ụka na ọ bụghị Setan na-achị ụwa. Ọ dị mgbe Setan ji ụzọ ọrụ ebube gosi Jizọs “alaeze nile nke ụwa na ebube ha.” Mgbe nke ahụ gasịrị, Setan kwere Jizọs nkwa, sị: “Ihe ndị a nile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala kpọọ isiala nye m.” (Matiu 4:8, 9; Luk 4:5, 6) Cheedị banyere nke a. Nkwa ahụ ọ̀ gaara abụrụ Jizọs ọnwụnwa ma ọ bụrụ na ọ bụghị Setan na-achị alaeze ndị a. Jizọs ekwughị na ọchịchị ndị a nile nke ụwa abụghị nke Setan. N’ezie, Jizọs gaara ekwu otú ahụ ma a sị na ọ bụghị Setan na-enye ha ike.
12 N’ezie, Jehova bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, Onye Okike nke eluigwe na ala nke dị ịtụnanya. (Mkpughe 4:11) Ma, ọ dịghị ebe Bible kwuru na ọ bụ Jehova Chineke ma ọ bụ Jizọs Kraịst na-achị ụwa a. N’eziokwu, Jizọs zoro aka kpọmkwem n’ebe Setan nọ dị ka “onye na-achị ụwa a.” (Jọn 12:31; 14:30; 16:11) Ọbụna Bible zoro aka n’ebe Setan bụ́ Ekwensu nọ dị ka “chi nke usoro ihe a.” (2 Ndị Kọrint 4:3, 4) Banyere onye mmegide a, ma ọ bụ Setan, Onye Kraịst bụ́ Jọn onyeozi dere, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19.
OTÚ A GA-ESI EWEPỤ ỤWA SETAN
13. N’ihi gịnị ka ụwa ọhụrụ ji dị mkpa?
13 Ka afọ na-agafe, ụwa na-adịwanye ize ndụ. O jupụtara ná ndị na-eburịta agha, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-adịghị akwụwa aka ọtọ, ndị ndú okpukpe ihu abụọ, na ndị omekome obi tara mmiri. Ụwa n’ozuzu ya enwekwaghị mmekwata. Bible na-ekpughe na o ruwela mgbe Chineke ga-ekpochapụ ajọ ụwa a n’agha Amagedọn. A ga-eji ụwa ọhụrụ ezi omume dochie ya.—Mkpughe 16:14-16.
14. Ònye ka Chineke họrọwooro ịbụ Onye Ọchịchị nke Alaeze Ya, oleekwa otú e si buo nke a n’amụma?
14 Jehova Chineke họọrọ Jizọs Kraịst ịbụ Onye Ọchịchị nke Alaeze, ma ọ bụ ọchịchị, eluigwe Ya. Mgbe dị anya gara aga, Bible buru amụma, sị: “A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya . . . Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ.” (Aịsaịa 9:6, 7) Banyere ọchịchị a, Jizọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Dị ka anyị ga-ahụ n’akwụkwọ a, n’oge na-adịghị anya Alaeze Chineke ga-ewepụ ọchịchị nile nke ụwa a, a ga-ejikwa ya dochie ha nile. (Daniel 2:44) Mgbe ahụ, Alaeze Chineke ga-eweta paradaịs n’elu ala.
ỤWA ỌHỤRỤ DỊ NSO!
15. Gịnị bụ “ụwa ọhụrụ” ahụ?
15 Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ndị anyị na-echere dị ka nkwa [Chineke] si dị, ezi omume gajekwa ibi n’ime ha.” (2 Pita 3:13; Aịsaịa 65:17) Oge ụfọdụ, mgbe Bible na-ekwu banyere “ụwa,” ọ pụtara ndị bi n’ụwa. (Jenesis 11:1) N’ihi ya, “ụwa ọhụrụ” ezi omume bụ ọha ụmụ mmadụ nwere ihu ọma Chineke.
16. Gịnị bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa Chineke ga-enye ndị nwere ihu ọma ya, gịnịkwa ka anyị na-aghaghị ime iji nweta ya?
16 Jizọs kwere nkwa na n’ụwa ọhụrụ ahụ na-abịanụ, ndị nwere ihu ọma Chineke ga-enweta onyinye nke “ndụ ebighị ebi.” (Mak 10:30) Biko sapeta Jọn 3:16 na 17:3, ma gụọ ihe Jizọs kwuru na anyị aghaghị ime iji nweta ndụ ebighị ebi. Ugbu a, jiri Bible tụlee ngọzi ndị ahụ ruru eru ịnata onyinye ahụ magburu onwe ya nke sitere n’aka Chineke ga-enweta na Paradaịs elu ala ahụ na-abịanụ.
17, 18. Olee otú anyị ga-esi jide n’aka na a ga-enwe udo ma nọrọ ná nchebe n’ebe nile n’ụwa?
17 Mmebi iwu, agha, ime mpụ, na ime ihe ike agaghịzi adị. “Onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala.” (Abụ Ọma 37:10, 11) Udo ga-adị n’ihi na ‘Chineke ga-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.’ (Abụ Ọma 46:9; Aịsaịa 2:4) Mgbe ahụ ‘onye ezi omume ga-ama akwụkwọ dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa na-agaghị adị’—nke ahụ pụtakwara ruo mgbe ebighị ebi!—Abụ Ọma 72:7.
18 Ndị na-efe Jehova, ga-anọ ná ntụkwasị obi. Ruo ogologo oge ndị Izrel nke oge Bible rubeere Chineke isi, ha nọrọ ná nchebe. (Levitikọs 25:18, 19) Lee ka ọ ga-esi magbuo onwe ya ịnọ ná nchebe otú ahụ na Paradaịs!—Aịsaịa 32:18; Maịka 4:4.
19. Olee otú anyị si mara na ihe oriri ga-ejupụta n’ụwa ọhụrụ nke Chineke?
19 A gaghị enwe ụkọ nri. Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 72:16) Jehova Chineke ga-agọzi ndị ya na-eme ezi omume, ‘ala ga-emekwa ihe omume ya.’—Abụ Ọma 67:6.
20. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee obi ike na ụwa nile ga-aghọ paradaịs?
20 Ụwa nile ga-aghọ paradaịs. A ga-ewu ebe obibi ndị ọhụrụ ma nwee gburugburu ebe ndị mara mma n’ala nke ụmụ mmadụ na-eme mmehie mebiri na mbụ. (Aịsaịa 65:21-24; Mkpughe 11:18) Ka oge na-aga, akụkụ ụwa ndị e budaworo n’okpuru ga na-agbasa ruo mgbe ụwa nile ghọrọ ebe mara mma, nke na-emepụtakwa ihe dị ka ogige Iden. Chineke agaghị ahapụ ma ọlị ‘ịsaghe aka Ya na iwere ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’—Abụ Ọma 145:16.
21. Gịnị na-egosi na udo ga-adị n’etiti mmadụ na anụmanụ?
21 Udo ga-adị n’etiti mmadụ na anụmanụ. Anụ ọhịa na anụ ụlọ ga-atakọ nri. Ọbụna obere nwatakịrị agaghị atụ anụmanụ ndị dị ize ndụ ugbu a ụjọ.—Aịsaịa 11:6-9; 65:25.
22. Gịnị ga-eme ọrịa?
22 Ọrịa agaghịzi adị. Dị ka Onye Ọchịchị nke Alaeze eluigwe nke Chineke, Jizọs ga-agwọ ọrịa n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu karịa otú ọ gwọrọ mgbe ọ nọ n’ụwa. (Matiu 9:35; Mak 1:40-42; Jọn 5:5-9) Mgbe ahụ “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24; 35:5, 6.
23. N’ihi gịnị ka mbilite n’ọnwụ ga-eji mee ka anyị ṅụrịa?
23 A ga-eme ka ndị a hụrụ n’anya nwụrụ anwụ dịghachi ndụ ma nwee atụmanya nke anwụghị anwụ ma ọlị. A ga-eme ka ndị nile nọ n’ụra ọnwụ, bụ́ ndị nọ ná ncheta Chineke, dịghachi ndụ. N’eziokwu, “a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Ọrụ 24:15; Jọn 5:28, 29.
24. Olee otú atụmanya nke ibi na Paradaịs elu ala dị gị n’obi?
24 Lee ọdịnihu magburu onwe ya na-echere ndị họọrọ ịmụta banyere Onye Okike Ukwu anyị, bụ́ Jehova Chineke, na ijere ya ozi! Ọ bụ Paradaịs elu ala nke na-abịanụ ka Jizọs zoro aka na ya mgbe o kwere onye mmebi iwu ahụ nke nwụrụ n’akụkụ ya nkwa, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Ọ dị mkpa ka anyị mụtakwuo banyere Jizọs Kraịst, bụ́ onye a ga-esite n’aka ya mee ka ngọzi ndị a nile kwe omume.
-
-
Gịnị Bụ Alaeze Chineke?Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
-
-
ISI NKE ASATỌ
Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
Gịnị ka Bible na-agwa anyị banyere Alaeze Chineke?
Gịnị ka Alaeze Chineke ga-eme?
Olee mgbe Alaeze ahụ ga-emezu uche Chineke n’ụwa?
1. Ekpere dị aṅaa, nke a ma ama, ka a ga-atụle ugbu a?
ỌTỤTỤ nde mmadụ n’ụwa nile maara ekpere ahụ ọtụtụ ndị na-akpọ Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, ma ọ bụ Ekpere Onyenwe Anyị. Okwu abụọ ndị a na-ezo aka n’otu ekpere a ma ama nke Jizọs Kraịst n’onwe ya kụziri dị ka ihe nlereanya. Ọ bụ ekpere pụtara ihe dị ukwuu, ịtụlekwa arịrịọ atọ mbụ ndị dị na ya ga-enyere gị aka ịmatakwu ihe Bible na-akụzi n’ezie.
2. Gịnị bụ atọ n’ime ihe ndị Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere maka ha?
2 Ná mmalite nke ekpere ihe nlereanya a, Jizọs kụziiri ndị na-ege ya ntị, sị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’” (Matiu 6:9-13) Gịnị ka arịrịọ atọ ndị ahụ pụtara?
3. Olee ihe ọ dị mkpa ka anyị mata banyere Alaeze Chineke?
3 Anyị amụtaworị ọtụtụ ihe banyere aha Chineke, bụ́ Jehova. Anyị atụlewokwa uche Chineke ruo n’ókè ụfọdụ—ihe o mewooro ihe a kpọrọ mmadụ na ihe ndị ọ ka ga-emere ha. Otú ọ dị, gịnị ka Jizọs na-ezo aka na ya mgbe ọ gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa”? Gịnị bụ Alaeze Chineke? Olee otú ọbịbịa ya ga-esi doo aha Chineke nsọ? Oleekwa ihe jikọrọ ọbịbịa nke Alaeze ahụ na ime uche Chineke?
IHE ALAEZE CHINEKE BỤ
4. Gịnị bụ Alaeze Chineke, ònyekwa bụ Eze ya?
4 Alaeze Chineke bụ ọchịchị nke Jehova Chineke guzobere, bụ́ nke nwere Eze nke Chineke họpụtara. Ònye bụ Eze nke Alaeze Chineke? Ọ bụ Jizọs Kraịst. Dị ka Eze, Jizọs ka ndị ọchịchị nile bụ́ mmadụ ukwuu, a na-akpọkwa ya “Eze nke ndị na-achị achị dị ka ndị eze na Onyenwenụ nke ndị na-achị achị dị ka ndị nwenụ.” (1 Timoti 6:15) O nwere ikike nke ime ihe dị mma karịa onye ọchịchị ọ bụla bụ́ mmadụ, ọbụna onye nke kasị mma n’ime ha.
5. Ebee ka Alaeze Chineke ga-esi na-achị, ebeekwa ka ọ ga na-achị?
5 Ebee ka Alaeze Chineke ga-esi na-achị? Ọ dị mma, ebee ka Jizọs nọ? Ọ̀ kwa i chetara na e gburu ya n’elu osisi ịta ahụhụ, e mesịakwa kpọlite ya n’ọnwụ. Nwa obere oge ka nke ahụ gasịrị, ọ rịgooro n’eluigwe. (Ọrụ 2:33) N’ihi ya, ọ bụ ebe ahụ ka Alaeze Chineke dị—n’eluigwe. Ọ bụ ya mere Bible ji akpọ ya “alaeze eluigwe.” (2 Timoti 4:18) Ọ bụ ezie na Alaeze Chineke dị n’eluigwe, ọ ga na-achị ụwa.—Mkpughe 11:15.
6, 7. Gịnị mere Jizọs ji bụrụ Eze pụrụ iche?
6 Gịnị mere Jizọs ji bụrụ Eze pụrụ iche? Otu ihe mere o ji bụrụ Eze pụrụ iche bụ na ọ gaghị anwụ anwụ. N’iji Jizọs tụnyere ndị eze bụ́ mmadụ, Bible na-akpọ ya “onye nanị ya nwere anwụghị anwụ, onye bi n’ìhè a na-apụghị iru nso.” (1 Timoti 6:16) Nke ahụ pụtara na ihe ọma nile Jizọs na-eme ga-adịgide adịgide. Ọ ga-emekwa ọtụtụ ihe ọma.
7 Tụlee amụma a Bible buru banyere Jizọs: “Mmụọ nke Jehova ga-enwekwa ọnọdụ Ya n’ahụ́ ya, bụ́ Mmụọ nke amamihe na nghọta, Mmụọ nke ndụmọdụ na ịdị ike, Mmụọ nke ihe ọmụma na egwu Jehova; ọzọ, ihe na-atọ ya ụtọ bụ egwu Jehova: ọ bụghịkwa dị ka anya ya abụọ si ahụ ka ọ ga-ekpe ikpe, ọ bụghịkwa dị ka ntị ya abụọ si anụ ka ọ ga-aba mba: kama ọ ga-eji ezi omume kpee ndị na-enweghị ike ikpe, ọ ga-ejikwa izi ezi baa mba banyere ndị dị umeala n’obi n’ụwa.” (Aịsaịa 11:2-4) Nke a na-egosi na Jizọs gaje ịbụ Eze ezi omume nke nwere ọmịiko, bụ́ onye ga-achị ndị nọ n’ụwa. Ị̀ ga-achọ inwe onye ọchịchị dị otú ahụ?
8. Ole ndị ga-eso Jizọs chịa?
8 Ọ dị ihe ọzọ bụ́ eziokwu banyere Alaeze Chineke: Jizọs agaghị achị nanị ya. Ọ dị ndị ha na ya ga-achị. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi gwara Timoti, sị: “Ọ bụrụ na anyị anọgide na-atachi obi, anyị ga-achịkọkwa achị dị ka ndị eze.” (2 Timoti 2:12) Ee, Pọl, Timoti, na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị Chineke họpụtara, ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze eluigwe. Mmadụ ole ga-enwe ihe ùgwù ahụ?
9. Mmadụ ole ga-eso Jizọs chịa, oleekwa mgbe Chineke malitere ịhọpụta ha?
9 Dị ka a kọwara n’Isi nke 7 nke akwụkwọ a, n’ọhụụ, Jọn onyeozi hụrụ “nwa Atụrụ ahụ [Jizọs Kraịst] ka ọ na-eguzo n’elu Ugwu Zaịọn [ọnọdụ ya dị ka eze n’eluigwe], ya na narị puku na iri puku anọ na anọ, bụ́ ndị e dekwasịrị aha ya na aha Nna ya n’egedege ihu ha.” Ole ndị bụ 144,000 ahụ? Jọn n’onwe ya na-agwa anyị, sị: “Ndị a bụ ndị nọgidere na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’agbanyeghị ebe ọ na-eje. E si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ zụta ndị a dị ka mkpụrụ mbụ nye Chineke nakwa nye Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 14:1, 4) Ee, ha bụ ụmụazụ kwesịrị ntụkwasị obi nke Jizọs Kraịst, bụ́ ndị a họpụtara n’ụzọ pụrụ iche iso ya chịa n’eluigwe. Mgbe a kpọlitesịrị ha n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe, ha ga-esoro Jizọs ‘chịa ụwa dị ka ndị eze.’ (Mkpughe 5:10) Kemgbe oge ndịozi, Chineke anọwo na-ahọpụta Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi iji mee ka ọnụ ọgụgụ ahụ zuo 144,000.
10. N’ihi gịnị ka ime ndokwa ka Jizọs na 144,000 chịa ihe a kpọrọ mmadụ ji bụrụ ndokwa ịhụnanya?
10 Ime ndokwa ka Jizọs na 144,000 chịa ihe a kpọrọ mmadụ bụ ihe na-egosipụta nnọọ ịhụnanya. Otu ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na Jizọs abụtụwo mmadụ, taakwa ahụhụ. Pọl kwuru na Jizọs ‘abụghị onye na-apụghị imetara anyị ebere n’adịghị ike anyị, kama ọ bụ onye a nwaleworo n’ụzọ nile dị ka anyị onwe anyị, ma o nweghị mmehie.’ (Ndị Hibru 4:15; 5:8) Ndị ha na ya ga-eso achị atawokwa ahụhụ ma tachie obi n’oge ha bụ mmadụ. Tụkwasị na nke ahụ, ha alụsowokwa ezughị okè ọgụ ma nagide ụdị ọrịa dị iche iche. N’ezie, ha ga-aghọta nsogbu ndị ụmụ mmadụ na-eche ihu!
GỊNỊ KA ALAEZE CHINEKE GA-EME?
11. Gịnị ka Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ikpe ekpere maka ya n’ihe banyere uche Chineke?
11 Mgbe Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, o kwukwara na ha kwesịrị ikpe ekpere ‘ka e mee uche Chineke n’ụwa, dị ka a na-eme n’eluigwe.’ Chineke nọ n’eluigwe, ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi anọwokwa na-eme uche ya n’ebe ahụ. Otú ọ dị, n’Isi nke 3 nke akwụkwọ a, anyị mụtara na otu ajọ mmụọ ozi kwụsịrị ime uche Chineke ma mee ka Adam na Iv mehie. N’Isi nke 10, anyị ga-amụkwu ihe Bible na-akụzi banyere ajọ mmụọ ozi ahụ, bụ́ onye anyị maara dị ka Setan bụ́ Ekwensu. A hapụrụ Setan na ndị mmụọ ozi e kere eke bụ́ ndị kpebiri iso ya—ndị a na-akpọ ndị mmụọ ọjọọ—ka ha nọtụ n’eluigwe. N’ihi ya, ọ bụghị ndị nile nọ n’eluigwe mgbe ahụ na-eme uche Chineke. Nke ahụ gbanwere mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị. Onye ahụ e chiri eze ọhụrụ, bụ́ Jizọs Kraịst, busoro Setan agha.—Mkpughe 12:7-9.
12. Ihe abụọ ndị dị aṅaa, dị mkpa, ka a kọwara ná Mkpughe 12:10?
12 Okwu amụma ndị na-esonụ na-akọwa ihe merenụ: “M wee nụ oké olu n’eluigwe ka ọ na-asị: ‘Nzọpụta na ike na alaeze nke Chineke anyị na ikike nke Kraịst ya aghọwo ihe weere ọnọdụ ugbu a, n’ihi na a chụdawo onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo [Setan], bụ́ onye na-ebo ha ebubo ehihie na abalị n’ihu Chineke anyị!’” (Mkpughe 12:10) Ị̀ hụrụ ihe abụọ ndị dị nnọọ mkpa a kọwara n’amaokwu Bible ahụ? Nke mbụ, Alaeze Chineke nke dị n’aka Jizọs Kraịst malitere ịchị. Nke abụọ, e si n’eluigwe chụdata Setan n’ụwa.
13. Gịnị siworo ná nchụpụ a chụpụrụ Setan n’eluigwe pụta?
13 Gịnị siworo n’ihe abụọ ndị ahụ merenụ pụta? Banyere ihe mere n’eluigwe, anyị na-agụ, sị: “N’ihi nke a na-aṅụrịnụ ọṅụ, unu eluigwe nile na unu ndị bi n’ime ha!” Ee, ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị nọ n’eluigwe, na-aṅụrị ọnụ n’ihi na, ebe ọ bụ na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya anọghịzi ebe ahụ, ndị nile nọ n’eluigwe na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova Chineke. N’ebe ahụ, e nwere udo na ịdị n’otu zuru ezu, nke na-adịgide adịgide. A na-emezi uche Chineke n’eluigwe.
Nchụpụ a chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe kpatara ahụhụ n’ụwa. Nsogbu ndị dị otú ahụ ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya
14. Gịnị ka nchụda a chụdatara Setan n’ụwa na-akpata?
14 Otú ọ dị, gịnị banyere ụwa? Bible na-ekwu, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa, dịkwara oké osimiri, n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpughe 12:12) Iwe ji Setan n’ihi nchụpụ a chụpụrụ ya n’eluigwe nakwa n’ihi oge dị mkpirikpi o nwere. N’iwe, ọ na-akpata nhụjuanya, ma ọ bụ “ahụhụ,” n’ụwa. Anyị ga-amụkwu banyere “ahụhụ” ahụ n’isiakwụkwọ na-esonụ. Ma, n’ihi ọnọdụ a e nwere, anyị pụrụ ịjụ, sị, Olee otú Alaeze ahụ ga-esi mezuo uche Chineke n’ụwa?
15. Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa?
15 Ọ dị mma, cheta ihe bụ́ nzube Chineke maka ụwa. Ị gụrụ ya n’Isi nke 3 n’akwụkwọ a. N’Iden, Chineke gosiri na nzube ya bụ ka ụwa a bụrụ paradaịs nke agbụrụ ụmụ mmadụ bụ́ ndị ezi omume, ndị na-agaghị anwụ anwụ, jupụtara. Setan mere ka Adam na Iv mehie, nke ahụ mere ka nzube Chineke maka ụwa ghara imezu ozugbo ma o meghị ka ọ gbanwee. Nzube Jehova ka bụ na “ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Alaeze Chineke ga-emezu nke ahụ. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?
16, 17. Gịnị ka Daniel 2:44 na-agwa anyị banyere Alaeze Chineke?
16 Tụlee amụma dị na Daniel 2:44. N’ebe ahụ, anyị na-agụ, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” Gịnị ka nke a na-agwa anyị banyere Alaeze Chineke?
17 Nke mbụ, ọ na-agwa anyị na a gaje iguzobe Alaeze Chineke “n’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a,” ma ọ bụ mgbe alaeze ndị ọzọ ka na-achị. Nke abụọ, ọ na-agwa anyị na Alaeze ahụ ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ọ dịghị ọchịchị ọzọ ga-emeri ma ọ bụ nọchie ya. Nke atọ, anyị hụrụ na Alaeze Chineke na alaeze ndị dị n’ụwa a ga-alụ agha. Alaeze Chineke ga-emeri ha. N’ikpeazụ, ọ ga-abụ nanị ọchịchị ga-achị ihe a kpọrọ mmadụ. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-anụ ụtọ ọchịchị kasị mma.
18. Gịnị ka a na-akpọ agha ikpeazụ ahụ Alaeze Chineke na ọchịchị nke ụwa a ga-alụ?
18 Bible nwere ọtụtụ ihe ikwu banyere agha ikpeazụ ahụ Alaeze Chineke na ọchịchị dị iche iche nke ụwa a ga-alụ. Dị ka ihe atụ, ọ na-akụzi na ka ọgwụgwụ na-eru nso, ndị ajọ mmụọ ga-agbasa ụgha iji duhie “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi.” Maka nzube dị aṅaa? “Ịchịkọta ha [ndị eze ahụ] ọnụ gaa n’agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” A ga-achịkọta ndị eze nke elu ụwa a ọnụ “n’ebe a na-akpọ Ha-Magedọn n’asụsụ Hibru.” (Mkpughe 16:14, 16) N’ihi ihe e kwuru n’amaokwu abụọ ndị ahụ, a na-akpọ agha ikpeazụ ọchịchị ụmụ mmadụ na Alaeze Chineke ga-alụ agha Ha–Magedọn, ma ọ bụ Amagedọn.
19, 20. Gịnị mere na a dịghị eme uche Chineke n’ụwa ugbu a?
19 Gịnị ka Alaeze Chineke ga-arụzu site n’Amagedọn? Cheedị ọzọ ihe bụ́ nzube Chineke maka ụwa. Jehova Chineke zubere ka agbụrụ ụmụ mmadụ zuru okè, bụ́ ndị ezi omume, ndị na-ejere ya ozi na Paradaịs, jupụta ụwa. Gịnị mere na nke ahụ emezubeghị ugbu a? Nke mbụ, anyị na-eme mmehie, na-ada ọrịa, na-anwụkwa anwụ. Otú ọ dị, anyị mụrụ n’Isi nke 5 n’akwụkwọ a na Jizọs nwụrụ n’ihi anyị ka anyị wee dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma eleghị anya, ị na-echeta ihe e dere n’Oziọma Jọn: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.
20 Nsogbu ọzọ e nwere bụ na ọtụtụ ndị na-eme ihe ọjọọ. Ha na-agha ụgha, na-egwu wayo, na-emekwa omume rụrụ arụ. Ha achọghị ime uche Chineke. A ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ n’agha Chineke bụ́ Amagedọn. (Abụ Ọma 37:10) Ihe ọzọkwa mere na a dịghị eme uche Chineke n’ụwa bụ na gọọmentị dị iche iche adịghị akpali ndị mmadụ ime ya. Ọtụtụ gọọmentị abụwo ndị na-adịghị ike, ndị na-emekpọ ndị mmadụ ọnụ, ma ọ bụ ndị na-adịghị akwụwa aka ọtọ. Bible na-ekwu, hoo haa, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.”—Eklisiastis 8:9.
21. Olee otú Alaeze ahụ ga-esi mezuo uche Chineke n’ụwa?
21 Amagedọn gasịa, ihe a kpọrọ mmadụ ga-anọ n’okpuru nanị otu ọchịchị, Alaeze Chineke. Alaeze ahụ ga-emezu uche Chineke, ọ ga-ewetakwa ngọzi ndị magburu onwe ha. Dị ka ihe atụ, ọ ga-ewepụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Mkpughe 20:1-3) A ga-eji uru nke àjà Jizọs mee ihe iji mee ka ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi gharazie ịdị na-arịa ọrịa na ịdị na-anwụ anwụ. Kama nke ahụ, n’okpuru ọchịchị Alaeze ahụ, ha ga-enwe ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 22:1-3) A ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. N’ihi ya, Alaeze ahụ ga-emezu uche Chineke n’ụwa, ọ ga-edokwa aha Chineke nsọ. Gịnị ka nke a pụtara? Ọ pụtara na n’ikpeazụ, mgbe Alaeze Chineke bịara, onye ọ bụla nọ ndụ ga-eto aha Jehova.
OLEE MGBE ALAEZE CHINEKE GA-EME IHE?
22. Olee otú anyị si mara na Alaeze Chineke abịaghị mgbe Jizọs nọ n’ụwa ma ọ bụ ozugbo a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ?
22 Mgbe Jizọs gwara ụmụazụ ya ka ha kpee ekpere, sị, “Ka alaeze gị bịa,” o doro anya na Alaeze ahụ abịabeghị mgbe ahụ. Ọ̀ bịara mgbe Jizọs rịgooro n’eluigwe? Ee e, n’ihi na ma Pita ma Pọl kwuchara na mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, amụma ahụ dị n’Abụ Ọma 110:1 mezuru n’ebe ọ nọ: “Ihe nke si n’ọnụ Jehova pụta na-asị onyenwe m, Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe M ga-edo ndị iro gị ka ihe mgbakwasị dịrị ụkwụ gị abụọ.” (Ọrụ 2:32-34; Ndị Hibru 10:12, 13) E nwere oge nchere.
N’okpuru ọchịchị Alaeze ahụ, a ga-eme uche Chineke n’ụwa dịkwa ka n’eluigwe
23. (a) Olee mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiakwụkwọ na-esonụ?
23 Ọ̀ hà aṅaa n’ogologo? Na narị afọ nke 19, ndị ji ezi obi na-amụ Bible gụkọtara oge ma kwubie na oge nchere ahụ ga-ejedebe n’afọ 1914. (Banyere afọ a, lee Ihe Odide Ntụkwasị, peeji nke 215-218.) Ihe ndị malitere ime n’ụwa n’afọ 1914 gosiri na ngụkọta oge nke ndị ahụ ji ezi obi na-amụ Bible mere ziri ezi. Mmezu nke amụma Bible na-egosi na n’afọ 1914, Kraịst ghọrọ Eze, Alaeze eluigwe nke Chineke malitekwara ịchị. N’ihi ya, anyị na-ebi n’oge ahụ “dị mkpirikpi” nke fọdụụrụ Setan. (Mkpughe 12:12; Abụ Ọma 110:2) Anyị pụkwara ikwu hoo haa na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-eme ihe iji mezuo uche Chineke n’ụwa. Ị̀ hụrụ nke a dị ka akụkọ dị mma? Ì kwere na nke ahụ bụ eziokwu? Isiakwụkwọ na-esonụ ga-enyere gị aka ịhụ na Bible na-akụzi ihe ndị a n’ezie.
-