Abụ nke 121
Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume
1. K’anyị n’agbarịt’ibe anyị ume
Ịnọs’ike n’ofufe Jaa,
Ịhụnany’anyị n’esikwu ike;
Ezi ọrụ n’ewet’udo.
Ịhụnany’anyị hụr’ibe anyị
N’agb’anyị ume ịtachi obi.
Ọgbakọ bụ ebe mgbab’anyị,
Ebe obi g’eru anyị ala.
2. Okwu e kwuru n’oge dị mma
N’akasi anyị niile obi!
Anyị n’anụ okwu nkasi obi ndị a
N’ọnụ ezigbo ndị enyi anyị.
Ọ dị mma k’anyị n’ụmụnn’anyị
N’arụk’ọrụ n’ịdị n’otu!
Anyị n’agba ụmụnn’anyị ume,
Nyere h’aka ná nsogbu ha.
3. K’anyị ji anya okwukwe n’ahụ
N’ụbọchị Jehova dị nso,
Anyị kwesịrị ịn’ezukọ,
K’anyị nọsi’ike n’ozi ya.
Anyị niile bụ́ ndị Jehova
Chọr’ife ya ru’ebigh’ebi.
Anyị n’agbarịt’ibe anyị ume
Ijisi okwukwe anyị ike.
(Gụọkwa Luk 22:32; Ọrụ 14:21, 22; Gal. 6:2; 1 Tesa. 5:14.)