Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?
    Ụlọ Nche—2015 | Eprel 1
    • Nwoke a weere Baịbụl dị n’ọ́bá akwụkwọ a na-ele

      ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị̀ GA-ACHỌ ỊMỤ BAỊBỤL?

      Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

      • Gịnị ka m kwesịrị iji ndụ m eme?

      • Gịnị mere ndị mmadụ ji na-ata ahụhụ ma na-anwụ anwụ?

      • Olee otú ihe ga-adị n’ọdịnihu?

      • Ihe banyere m ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi?

      Ò nwetụla mgbe ị jụrụ onwe gị ụdị ajụjụ ndị a? Ọ bụrụ na o nwetụla, ọ bụghị naanị gị ka ụdị ajụjụ ndị a na-echu ụra. Ọtụtụ ndị nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa na-ajụ ajụjụ ndị a. Ma, ị̀ ga-amatali azịza ha?

      A jụọ ọtụtụ ndị, ha ga-asị “ee.” Olee ihe mere ha ga-eji asị “ee”? Ọ bụ n’ihi na ha amatala ọtụtụ azịza ajụjụ ndị na-echu ha ụra na Baịbụl. Ị̀ ga-achọ ịma ihe Baịbụl na-akụzi? Ọ bụrụ na ị ga-achọ, gbalịa ka gị na Ndịàmà Jehova malite ịmụ Baịbụl.a Ha agaghị ana gị ego maka ihe unu ga-amụ.

      Ma, a sị ụfọdụ ndị bịa mụọ Baịbụl, ha asị na ha ji ihe n’aka, ma ọ bụ na Baịbụl siri ike ọmụmụ, ma ọ bụkwanụ na ike Baịbụl adịghị ha. Ma, o nwere ndị na-anaghị ekwu otú ahụ. A sị ha bịa mụọ Baịbụl, ha abịa ozugbo. Lee ihe ụfọdụ n’ime ha kwuru:

      • Otu nwaanyị onye Ingland aha ya bụ Gill kwuru, sị: “Ekpeela m Katọlik, kpee Anglịkan, kpee okpukpe ndị Sik, kpee nke ndị Buda, gụọkwa gbasara okpukpe na mahadum. Ma, amatalighị m azịza ajụjụ ndị m na-ajụ gbasara Chineke. Ma, otu ụbọchị, otu nwaanyị Onyeàmà Jehova bịara ozi ọma n’ụlọ m. Otú o si jiri Baịbụl zaa m ajụjụ niile m jụrụ ya mere ka m kweta ka mụ na ya mụwa Baịbụl.”

      • Otu nwoke onye Bene Ripọblik aha ya bụ Koffi kwuru, sị: “Ajụrụ m pastọ anyị ọtụtụ ajụjụ ndị na-echu m ụra, ma ihe ọ zara m ejughị m afọ. Ma, mgbe m jụrụ otu Onyeàmà Jehova ajụjụ ndị ahụ, o ji naanị Baịbụl zaa m ha niile. Mgbe ọ jụrụ m ma m̀ ga-achọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ dị na Baịbụl, ekwetara m ozugbo.”

      • Otu nwoke onye Brazil aha ya bụ José sịrị: “M chọsiri ike ịma ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Ekweere m na ndị nwụrụ anwụ nwere ike imesi ndị dị ndụ ike, ma achọrọ m ịma ihe Baịbụl kwuru. M bidoziri soro otu enyi m bụ́ Onyeàmà Jehova mụwa Baịbụl.”

      • Otu nwaanyị onye Meksiko aha ya bụ Dennize kwuru na ya agbalịala ịgụ Baịbụl, ma o kweghị ya nghọta. Mana ọ sịrị na otu ụbọchị Ndịàmà Jehova bịara ozi ọma na nke ya, ha kọwaara ya ụfọdụ amụma ndị dị na Baịbụl, ha edoo ya anya, nakwa na o mere ka ya chọwa ịmata ihe ndị ọzọ dị na Baịbụl.

      • Otu nwaanyị onye Nepal aha ya bụ Anju kwuru, sị: “Ọ na-eme m obi abụọ ma ihe banyere m ọ̀ na-emetụkwa Chineke n’obi. M gwara ya Chineke n’ekpere. N’echi ya, Ndịàmà Jehova bịara na nke m. Mgbe ha gwara m na ha ga-achọ ka mụ na ha mụwa Baịbụl, m kwetakwara.”

      Ihe a niile ndị mmadụ kwuru na-echetara anyị otu ihe Jizọs kwuru na Baịbụl. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) N’eziokwu, Chineke kere anyị ka ọ na-agụ anyị agụụ ịma gbasara ya. Ọ bụkwa naanị ya ga-emeli ka anyị mata onye ọ bụ. O ji Okwu ya bụ́ Baịbụl eme ka anyị mata ya.

      Oleezi otú Ndịàmà Jehova na ndị mmadụ si amụ Baịbụl? Olee uru ịmụ Baịbụl ga-abara gị? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-eso nke a.

      a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

      IHE ỤFỌDỤ GBASARA BAỊBỤL

      Baịbụl e meghere emeghe
      • AHA YA: E si n’okwu Grik bụ́ bi·bliʹa, nke pụtara “akwụkwọ nta dị iche iche,” nweta okwu ahụ bụ́ Baịbụl

      • AKWỤKWỌ NDỊ DỊ N’IME YA: Baịbụl nwere akwụkwọ iri atọ na itoolu e dere n’asụsụ Hibru (mana, e nwekwara ebe ụfọdụ e dere n’asụsụ Arameik), nweekwa akwụkwọ iri abụọ na asaa e dere n’asụsụ Grik

      • NDỊ DERE YA NA OGE O WERE HA: Ọ bụ ihe dị ka mmadụ iri anọ dere ya. O were ihe dị ka otu puku afọ na narị isii iji dechaa ya. A malitere ide ya n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst ma dechaa ya n’ihe dị ka n’afọ 98 Oge Ndị Kraịst

      • ASỤSỤ OLE A SỤGHARỊRỊLA YA: A sụgharịala akwụkwọ niile dị na ya nakwa akwụkwọ ụfọdụ dị na ya n’ihe karịrị puku asụsụ abụọ na narị ise

      • OLE E KESARALA YA: E kesaala ihe dị ka ijeri Baịbụl anọ. O nweghị akwụkwọ ọzọ e kesarurula otú ahụ

  • Otú Ndịàmà Jehova na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl
    Ụlọ Nche—2015 | Eprel 1
    • Ebe a na-amụrụ mmadụ Baịbụl

      ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị̀ GA-ACHỌ ỊMỤ BAỊBỤL?

      Otú Ndịàmà Jehova na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl

      E ji ịgbasa ozi ọma mara Ndịàmà Jehova. Ma, ị̀ ma na n’ebe niile n’ụwa, anyị na ndị mmadụ na-amụ Baịbụl?

      Ebe a na-amụrụ otu nwoke Baịbụl n’ebe ọ na-arụ ọrụ

      N’afọ 2014, Ndịàmà Jehova dị ihe karịrị nde mmadụ asatọ, ha bikwa n’ihe karịrị narị mba abụọ na iri anọ. Ha na ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ nde mmadụ itoolu na narị puku mmadụ ise mụrụ Baịbụl kwa ọnwa.a E nwere ihe dị ka otu narị mba na iri anọ ọnụ ọgụgụ ndị anyị na ha na-amụ Baịbụl karịrị ndị bi na nke ọ bụla n’ime ha.

      N’afọ ọ bụla, Ndịàmà Jehova na-ebipụta Baịbụl, akwụkwọ, magazin, na ihe ndị ọzọ ha ji akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ha na-ebipụta ihe ndị a ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu ijeri na narị nde ise. Ha na-ebipụtakwa ha n’ihe dị ka narị asụsụ asaa. Otú a ha si agba mbọ ebipụta ọtụtụ akwụkwọ n’ọtụtụ asụsụ na-eme ka ọ dịrị ọtụtụ ndị mfe ịmụ Baịbụl n’asụsụ ọ bụla ha chọrọ.

      Otu nwoke onye Saụt Afrịka aha ya bụ Katlego kwuru, sị: “Mgbe m na-aga akwụkwọ, anaghị m enwe mmasị ịmụ ihe. Ma, ihe mụ na Ndịàmà Jehova na-amụ na-atọ m ezigbo ụtọ. Ihe ndị m na-amụta na-emekwa ka obi ruo m ala.”

      Otu nwaanyị onye Meksiko aha ya bụ Bertha kwuru, sị: “Ọ bụ mgbe mụ na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl ka m matara azịza ajụjụ m niile, matakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.”

      Otu nwoke onye Brazil aha ya bụ Eziquiel kwuru, sị: “Ndịàmà Jehova na-abịa n’ụlọ m amụrụ m ihe n’oge dị mụ mma. Otú a ha si eme ya na-eme m ezigbo obi ụtọ.”

      Otu nwaanyị onye Ọstrelia aha ya bụ Viniana sịrị: “Mgbe ụfọdụ, anyị na-eji ihe dị ka nkeji iri na ise ma ọ bụ nkeji iri atọ amụ ihe. Mgbe ụfọdụkwa, anyị na-anọfe nkeji iri atọ. Ma, ọ bụ mgbe ọ bụla dị mụ mma ka anyị na-anọru.”

      Otu nwoke onye Bene Rịpọblik aha ya bụ Aimé kwuru na ‘ya akwụghị ụgwọ ọ bụla maka ọmụmụ ihe ahụ, nakwa na ọ tụrụ ya n’anya.’

      Otu nwaanyị onye Nọtan Ayaland aha ya bụ Karen kwuru, sị: “Onye kụziiri m Baịbụl nweere m ndidi, dịrịkwa obiọma. O mere ka mụ na ya dịrị n’ezigbo mma.”

      Otu nwoke onye Ịngland aha ya bụ Denton sịrị na “o nwere ọtụtụ ndị na-amụcha Baịbụl ma ha anaghị aghọ Ndịàmà Jehova.”

      AZỊZA AJỤJỤ NDỊ MMADỤ NA-AJỤKARỊ GBASARA OTÚ NDỊÀMÀ JEHOVA SI AMỤ BAỊBỤL

      Olee otú unu na ndị mmadụ si amụ Baịbụl?

      Anyị na-ahọrọ otu isiokwu ma leba anya n’amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara isiokwu ahụ. Iji maa atụ, Baịbụl zara ajụjụ ndị dị ka: Ònye bụ Chineke? Olee ụdị onye ọ bụ? Ò nwere aha? Ebee ka o bi? Anyị na Chineke ò nwere ike ịdị ná mma? Ihe na-esiri ụfọdụ ndị ike bụ ịmata ebe azịza ajụjụ ndị a dị na Baịbụl.

      Anyị na-ejikarị akwụkwọ a na-akpọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? enyere ndị mmadụ aka ịmata azịza ajụjụ ndị a na Baịbụl.b A haziri akwụkwọ a otú ọ ga-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe ndị dị na Baịbụl. E dere ihe gbasara Chineke, Jizọs Kraịst, mbilite n’ọnwụ, ihe mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ, otú e si ekpe ekpere, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ n’akwụkwọ a.

      Olee ebe a na-anọ amụ ihe a, oleekwa oge a na-amụ ya?

      A ga-anọ n’ebe ọ bụla dị gị mma nakwa n’oge ị chọrọ.

      Awa ole ka ọmụmụ ihe a na-ewe?

      Anyị na ọtụtụ ndị na-eji ihe dị ka otu awa amụ Baịbụl kwa izu. Ma, ọ bụghị iwu na ọ ga-eru otu awa. Ọ bụ mgbe ị chọrọ ka a mụruo ya ka anyị ga-amụru ya. Anyị na ụfọdụ ndị na-amụ ihe naanị nkeji iri ma ọ bụ nkeji iri na ise kwa izu.

      Ego ole ka a na-akwụ maka ọmụmụ ihe a?

      Anyị anaghị ana mmadụ ego maka ịmụrụ ya ihe, o nweghịkwa onye anyị na-asị kwụọ ụgwọ akwụkwọ anyị na ya ji amụ ihe. Ihe a anyị na-eme dabara n’ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya. Ọ gwara ha, sị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.”—Matiu 10:8.

      Afọ ole ka ọmụmụ ihe a na-ewe?

      E nweghị afọ ole a kapịrị ọnụ. Ọ bụ gịnwa ga-ekpebi mgbe ị chọrọ ka anyị na gị mụruo ya. E nwere isiokwu iri na itoolu n’akwụkwọ anyị bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ị chọọ, i nwere ike ịmụcha isiokwu ahụ niile ma ọ bụkwanụ gị amụọ ụfọdụ n’ime ha. Anyị na gị ga-eji nwayọọ nwayọọ na-amụ isiokwu nke ọ bụla otú ọ na-agaghị enye gị nsogbu.

      Ọ̀ bụ iwu na m ga-ekweta ịghọ Onyeàmà Jehova?

      Mba. Anyị anaghị amanye onye ọ bụla ikweta n’ihe anyị na ya na-amụ. Ma, ọ bụrụ na mmadụ aghọta ihe Baịbụl na-akụzi, ọ ga-enyere onye ahụ aka ịma ihe o kwesịrị ime.

      Olee otú m ga-esi matakwuo ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi?

      Ị gaa na www.pr418.com/ig, ị ga-ahụ ọtụtụ ihe Ndịàmà Jehova kweere nakwa ihe dị iche iche ha na-eme.

      Olee otú m ga-esi agwa unu na m chọrọ ka unu bịa mụwara m Baịbụl?

      • Ndị a na-agwa anyị ka anyị mụwara ha Baịbụl. Otu onye na-edejupụta fọm n’Ịntanet, onye nke ọzọ na-edetara anyị akwụkwọ ozi, onye nke ọzọ na-achọ akara ekwentị ọ ga-eji nweta Ndịàmà Jehova ga-abịa mụwara ya Baịbụl

        Gaa na www.pr418.com/ig. I lee anya n’ala ala, ị ga-ahụ ebe e dere “Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl.” Ị pịa ya, ị ga-ahụ fọm ị ga-eji gwa anyị ka anyị na gị mụwa Baịbụl.

      • I nwekwara ike iji adres anyị dị na peeji nke abụọ n’Ụlọ Nche a detara anyị akwụkwọ ozi. Jiri nke kacha dị nso n’ebe i bi deta ya.

      • I nwekwara ike ịgwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ na ị ga-achọ ka a bịa mụwara gị Baịbụl.

      a Anyị na-amụrụ ndị mmadụ ihe n’otu n’otu. Ma, o nwekwara mgbe anyị na-amụrụ mmadụ abụọ ma ọ bụ karịa ihe n’otu mgbe.

      b Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. E bipụtala ya ihe karịrị narị nde abụọ na nde iri atọ nakwa n’asụsụ narị abụọ na iri isii.

      OTÚ ỊMỤ BAỊBỤL SI ABARA EZINỤLỌ URU

      Eziquiel

      Eziquiel sịrị: “Mgbe nwunye m na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, achọpụtara m na àgwà ya gbanwere. Ihe bịara na-agakwu ọfụma n’ezinụlọ anyị. Mụ na Ndịàmà Jehova malitekwara ịmụ Baịbụl ka m mata ihe nwunye m na-amụta mere o ji gbanwee. Ihe m mụtara mekwara ka mụnwa bụrụkwuo ezigbo mmadụ. Ịmụ Baịbụl emeela ka ezinụlọ anyị na-emekọkwu ihe ọnụ.”

      Karen

      Karen kwuru, sị: “Mgbe m malitere ịmụ Baịbụl, akwụsịrị m ịṅụ ọgwụ ike, kwụsị ịṅụbiga mmanya ókè, mụtakwa ịna-ejide onwe m ma a kpasuo m iwe. Ụlọ m anaghịzi adị ghaa ghaa ghaa. Ahụkwuola m ndị ezinụlọ m n’anya, m na-agbalịkwa eme ha obi ụtọ. Obi na-abụzi m sọ aṅụrị ugbu a.”

      Viniana

      Viniana kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị gwawara m okwu ọjọọ maka na mụ na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Ma, di m sị m mụwa Baịbụl m na-amụ, ihe ọ sọrọ ndị mmadụ ha kwuo. Ọ sịrị na ihe ọ ma bụ na otú m si akpa àgwà ugbu a amaka. Ezinụlọ anyị adịkwala n’udo ugbu a karịa otú ọ dịbu.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya