Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Otú Sayensị Si Abara Gị Uru
    Ụlọ Nche—2015 | Jun 1
    • Ihe ndị sayensị mepụtarala, dị ka ụgbọala, ụgbọelu, GPS, ígwè e ji enyocha ụbụrụ, na satịlaịtị

      ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | SAYENSỊ Ọ̀ BAZIRI URU KARỊA BAỊBỤL?

      Otú Sayensị Si Abara Gị Uru

      Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na ọrụ ndị sayensị bụ “ịsa anya ná mmiri mụọ gbasara otú ihe ndị dị na mbara igwe na n’ụwa si arụ ọrụ, ime ezigbo nchọnchọ, nwalee ihe ọ bụla ha chọpụtara, leruo ha anya ma gbakọọ ihe ụfọdụ gbasara ihe ndị ahụ.” Ime ihe a niile adịghị mfe, ọ na-agwụkarịkwa ike. Ọ na-ewe ndị sayensị ọtụtụ izu, ma ọ bụ ọtụtụ ọnwa, ma ọ bụdị ọtụtụ afọ tupu ha achọpụta ihe. Mgbe ụfọdụ, mbọ ha na-agba ịchọpụta ihe na-akụ afọ n’ala. Ma ọtụtụ mgbe, ha na-achọpụta ihe na-abara ndị mmadụ uru. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

      Otu ụlọ ọrụ Yurop emepụtala ọkpọka ngwá ọrụ e ji aza mmiri ka onye ṅụrụ mmiri e ji ya zaa ghara ibute ọrịa ịṅụ mmiri ọjọọ na-akpata. Ụdị ngwá ọrụ a abaarala ndị mmadụ ezigbo uru n’ebe ndị e nwere ọdachi ndị na-emere onwe ha, dị ka mgbe ala ọma jijiji mere na Heiti n’afọ 2010.

      Ndị sayensị emepụtakwala ngwá ọrụ na-agwa mmadụ ebe ọ nọ, nke a na-akpọ GPS n’olu Bekee. Ọ bụ ndị agha ka e bubu n’obi mepụta ngwá ọrụ a. Ma ugbu a, ọ na-abara ọtụtụ ndị uru, dị ka ndị ọkwọ ụgbọ mmiri, ndị ọkwọ ụgbọala, ndị ọkwọ ụgbọelu, ndị dinta, na ndị na-eji ụkwụ aga ebe dị iche iche elegharị anya. Ọ na-enyere ha aka ịmata ụzọ. O doro anya na ihe a ndị sayensị mepụtara na-abara anyị ezigbo uru.

      Ọ bụrụ na i nwere ekwentị, kọmputa, na-aga n’Ịntanet, ma ọ bụ na-eji ụgbọelu eme njem, ma ọ bụkwanụ na o nweela mgbe ị rịara ọrịa, ṅụọ mkpụrụ ọgwụ, ahụ́ adị gị mma, mara na ihe ndị sayensị mepụtara na-abara gị ezigbo uru.

      IHE NDỊ SAYENSỊ NA-ENWEGHỊ IKE IME

      Ndị sayensị na-emekwu nchọnchọ iji mata ọtụtụ ihe ha na-amaghị gbasara ụwa anyị a. Ndị nke na-amụ banyere ụmụ irighiri ihe a na-akpọ atọm na-agba mbọ ka ha mata otú ihe ndị dị n’ime atọm si arụ ọrụ, ebe ndị nke na-amụ banyere ihe ndị dị na mbara igwe na-agba mbọ ka ha mata ihe ndị mere ọtụtụ ijeri afọ gara aga ka ha si otú ahụ mata mgbe eluigwe na ụwa bidoro dịwa. Otú a ha si aga n’ime ime mbara igwe achọpụta ihe dị iche iche emeela ka ụfọdụ n’ime ha kwuo na á sị na Chineke e kwuru okwu ya na Baịbụl dị adị, na ha gaara ahụla ya.

      Otu onye sayensị a na-akpọ Amir D. Aczel kwuru na ụfọdụ ndị sayensị na ndị ọzọ gụrụ oké akwụkwọ ‘na-ekwu na Chineke adịghị.’ Dị ka ihe atụ, otu onye sayensị a ma ama kwuru na “ebe ọ bụ na ha ahụbeghị ihe gosiri na e nwere Chi kere eluigwe na ụwa, o doro anya na ụdị chi ahụ adịghị.” Ndị ọzọ na-ekwu na ihe ndị e dere na Baịbụl na Chineke mere bụ “majik” na “ihe ndị e ji aghọgbu ndị mmadụ.”a

      Ma, ihe anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị bụ, ihe ndị a niile ndị sayensị mụtarala gbasara ụwa anyị a, ò zuola ha iji ya kpebie ma Chineke ọ̀ dị ma ọ bụ na ọ dịghị? Anyị ma na azịza ya bụ mba. Ndị sayensị achọpụtala ọtụtụ ihe. Ma, ọtụtụ ndị sayensị kwetakwara na e nwere ọtụtụ ihe ha na-amaghị, nakwa ihe ndị o nwere ike ịbụ na ha agaghị amatali. Otu onye sayensị a ma ama aha ya bụ Steven Weinberg kwuru, sị; “Anyị enweghị ike ịmatacha ihe niile gbasara ihe ndị dị n’eluigwe na n’ụwa.” Otu prọfesọ a ma ama aha ya bụ Martin Rees dere, sị: “E nwere ike inwe ihe ndị ụmụ mmadụ na-agaghị amatali ná ndụ ha niile.” Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ihe ndị sayensị na-enwebeghị ike ịmata gbasara ihe ndị dị n’eluigwe na n’ụwa. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha:

      • DNA

        Ndị sayensị amatachabeghị ihe ndị na-eme n’ime mkpụrụ ndụ, otú o si eji ike ya arụ ọrụ, otú o si emepụta protin, na otú o si emepụta mkpụrụ ndụ ndị ọhụrụ.

      • Ebe nwata nwoke na-atụsa bọl n’ala

        E nwere ikike ji ihe ndị dị na mbara igwe na ihe ndị dị n’ụwa. O nweghị onye ọ bụla n’ime anyị ikike a na-anaghị emetụta. Ma, ndị sayensị amatachabeghị otú o si arụ ọrụ. Ha amatachabeghị otú ikike a si adọtu onye wụliri elu na otú o si eme ka ọnwa na-agba ụwa gburugburu.

      • Mbara igwe

        Ndị na-amụ gbasara ụwa na mbara igwe kwuru na e kee ihe ndị dị n’ụwa na mbara igwe ụzọ iri, ihe ndị sayensị ga-ejili onyokomita ha hụ erudịghị otu ụzọ. Ha amatabeghị otú ihe ndị ahụ ha na-anaghị ahụli dị na otú ha si arụ ọrụ.

      E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ndị sayensị na-enwebeghị ike ịchọpụta. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Otu onye sayensị a ma ama kwuru na ihe ha ma enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ihe ha na-amaghị. O kwukwara na ihe ndị sayensị na-achọpụta kwesịrị ime ka ọ na-agụ ha agụụ ịmata ihe ndị ha na-amatabeghị, ọ bụghị ime ka ha kwubie na ihe ndị ahụ ha na-amatabeghị adịghị adị.

      N’ihi ya, ọ bụrụ na i chere na sayensị baziri uru karịa Baịbụl, na-achọkwa ime ka i chewe na Chineke adịghị, chebara ihe a echiche: Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ntakịrị ihe ka ndị sayensị a ụbụrụ na-aghọ nkọ nwerela ike iji ọkpọka ngwá ọrụ ha chọpụta, ọ̀ dabara adaba ikwu na ihe ndị nke ha na-achọpụtabeghị adịghị adị? Ị manụ na ọ dabaghị adaba. Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ a na-akpọ Encyclopedia Britannica ji kwuo, sị: “Kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ anọ gara aga e nyochawara mbara igwe, malite n’oge ndị Babịlọn ruokwa taa, ọtụtụ ihe gbasara ya ka na-agbagwoju ndị na-enyocha ya anya.”

      Anyịnwa bụ́ Ndịàmà Jehova ma na ọ bụ onye ọ bụla ga-eji aka ya ekpebi ebe ọ kwụ n’okwu a. Ma, anyị na-agbalị eme ihe Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche.” (Ndị Filipaị 4:5) Ọ bụ ya mere anyị ji agba gị ume ka ị gụọ isiokwu na-eso nke a ka ị hụ na e nwere ihe ndị Baịbụl na sayensị nwere otu olu na ha.

      a Ụfọdụ ndị anaghịzi ekwere ihe Baịbụl kwuru n’ihi ihe ndị chọọchị na-akụzi. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ha na-akụzi bụ na ụwa nọ n’etiti, ihe ndị dị na mbara igwe a na-agba ya gburugburu, ma ọ bụ na Chineke ji abalị isii nkịtị kee ihe niile.—Gụọ ihe e dere n’igbe bụ́ “Ihe Baịbụl Kwuru na Ihe Ndị Sayensị Chọpụtara.”

      Ihe Baịbụl Kwuru na Ihe Ndị Sayensị Chọpụtara

      O nweghị ebe Baịbụl kwuru na ya bụ akwụkwọ sayensị. Ma, ndị dere ya dere ihe ndị bụ́ eziokwu kwesịrị ịmasị ndị sayensị. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

      • Mbara igwe

        Afọ ole ụwa na mbara igwe nọrọla

        Ndị sayensị kwuru na ụwa anọọla ihe dị ka ijeri afọ anọ nakwa na mbara igwe anọọla ihe dị ka ijeri afọ iri na atọ ma ọ bụ ijeri afọ iri na anọ. Baịbụl ekwughị ụbọchị e kere eluigwe na ụwa. O kwughịkwa na ụwa anyị a anọọla naanị puku afọ ole na ole. Amaokwu mbụ dị na Baịbụl kwuru, sị: “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1) Ihe a Baịbụl kwuru emegideghị ihe ndị sayensị na-achọpụta banyere mgbe ụwa anyị a malitere dịwa.

      • Ugwu, ahịhịa, na mmiri

        Oge o were iji kee ụwa

        Na Jenesis isi mbụ, a kpọrọ oge dị iche iche e ji kee ihe “ụbọchị.” E keziri mmadụ n’ụbọchị nke ikpeazụ. Ma, Baịbụl ekwughị otú “ụbọchị” isii ndị ahụ e ji kee ihe hà n’ogologo. N’ihi ya, o megideghị ihe ndị sayensị na-achọpụta gbasara oge o were iji kee ụwa. Anyị ma na “ụbọchị” nke ọ bụla n’ime ụbọchị ndị ahụ e ji kee ihe karịrị awa iri abụọ na anọ.

      • Ụwa

        Ihe jidere ụwa

        Baịbụl kwuru na ‘ọ dịghị ihe e kokwasịrị ụwa na ya.’ (Job 26:7) Ma, otu akụkọ ifo ndị oge ochie kwuru na e nwere otu dike bu ụwa n’ubu ya, e nwekwara nke kwuru na ọ bụ enyí ndị guzo n’elu mbe bu ya. Ma, Baịbụl ekwughị ụdị ihe ahụ. Ihe Baịbụl kwuru bụ ihe ndị sayensị mechara chọpụta. Ndị sayensị aha ha bụ Nicolaus Copernicus na Johannes Kepler chọpụtara na o nwere ikike na-eme ka ụwa na ihe ndị ahụ dị na mbara igwe na-agba anyanwụ gburugburu. Onye sayensị ọzọ aha ya bụ Isaac Newton mechakwara kọwaa otú ikike ahụ si achịkwa ihe niile dị na mbara igwe.

      • Nje

        Ihe banyere igbochi ọrịa na ime ọcha

        N’akwụkwọ Levitikọs, a gwara ụmụ Izrel ihe ndị ha ga-eme ka ha ghara ibute ọrịa na-efe efe. A gwakwara ha ka ha kpọpụ onye na-arịa ọrịa na-efe efe iche. Na Diuterọnọmi 23:12, 13, a gwakwara ha ka ha na-eje mposi ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu, nakwa ka ha gwuo ala, nyụba nsị ha n’ime ya ma “kpochie” ya. Ma, ọ bụ na narị afọ abụọ gara aga ka ndị sayensị na ndị dọkịta chọpụtara na ime ihe ndị a dị mkpa.

      E dere ihe ndị a Baịbụl kwuru kemgbe ihe karịrị puku afọ atọ gara aga. Oleezi otú ndị ahụ dere ha si mara gbasara ha, ma ndị kacha gụọ akwụkwọ n’oge ahụ amaghị gbasara ha? Onye e dere uche ya na Baịbụl kwuru, sị: “Dị ka eluigwe dị elu karịa ụwa, otú ahụ ka ụzọ m dị elu karịa ụzọ unu, otú ahụkwa ka echiche m dị elu karịa echiche unu.”—Aịzaya 55:9.

  • E Nwere Ọtụtụ Ihe Ndị Sayensị Na-agaghị Amatali
    Ụlọ Nche—2015 | Jun 1
    • Ebe onye sayensị na-enyocha ihe

      ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | SAYENSỊ Ọ̀ BAZIRI URU KARỊA BAỊBỤL?

      E Nwere Ọtụtụ Ihe Ndị Sayensị Na-agaghị Amatali

      Na nso nso a, ndị na-ekweghị na Chineke dị ekesaarala ọtụtụ ndị akwụkwọ ndị ha ji akọwa ihe mere ha ji kwere na Chineke adịghị. Ọtụtụ ndị agụọkwala akwụkwọ ndị ahụ, e nweekwa ndị kwe na ndị ekweghị. Otu onye sayensị aha ya bụ David Eagleman sịrị na ‘ụfọdụ ndị gụrụ akwụkwọ ndị ahụ na-eche na ndị sayensị macha ihe niile.’ O kwuziri na “ezigbo ndị sayensị na-achọ ịmata ihe ndị ha na-amaghị. Ka oge na-agakwa, ha na-achọpụtakarị ihe ndị ha na-amabughị.”

      Ebe onye na-amụ gbasara mbara igwe ji onyokomita na-ele mbara igwe

      Ọtụtụ ndị sayensị ụbụrụ na-aghọ nkọ agbaala mbọ mata ụfọdụ ihe ndị ha na-amabughị gbasara ụwa anyị a. Ihe ndị ha chọpụtara tụkwara ha n’anya. Ma, o nweekwala ndị nke nọ n’ịchọ ịmata ihe ndị ha na-amaghị tinye aka n’ihe ndị na-adịghị mma. Dị ka ihe atụ, otu onye sayensị a na-anụ aha ya, bụ́ Isaac Newton, kọwara otú ikike ahụ ji ihe ndị dị na mbara igwe si jigide ihe ndị ahụ niile. Ọ bụkwa ya wepụtara usoro mgbakọ na mwepụ a na-akpọ kalkụlọs n’olu Bekee. E ji ụdị mgbakọ na mwepụ a arụpụta kọmputa nakwa ụgbọelu ndị e ji aga na mbara igwe. E jikwa ya amụ gbasara atọm. Ma, Isaac Newton tinyekwara aka n’iji anwansi eme ka ihe na-abụghị ọlaedo ghọọ ọlaedo.

      Ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ ise tupu a mụọ Newton, otu onye Grik aha ya bụ Ptolemy ji naanị anya nkịtị mụọ gbasara ihe ndị dị na mbara igwe. Ọ na-apụta n’abalị na-ele ihe ndị ahụ dị na mbara igwe ma na-agbakọ otú ha si aga, ọ bụkwa aka ochie n’ise map. Ma, o kwuru na ụwa nọ n’etiti, ihe ndị ọzọ niile a na-agba ya gburugburu. Otu onye na-amụ gbasara ihe ndị dị na mbara igwe aha ya bụ Carl Sagan kwuru gbasara ihe a Ptolemy kwuru, sị: “Mgbe otu puku afọ na narị afọ ise gachara, ndị mmadụ chọpụtara na ihe ahụ o kwuru gbasara ụwa ịnọ n’etiti abụghị eziokwu. Nke a gosiri na onye ụbụrụ na-aghọ nkọ nwere ike ịsị na ihe dị otú a na otú a, ma e mechaa, ya abụrụ na ihe ahụ adịghị otú ahụ.”

      Ebe onye sayensị na-agụ Baịbụl

      Ụdị ihe ahụ mere Ptolemy na-emekwa ndị sayensị taa. Ò nwere mgbe ndị sayensị ga-amatacha ihe niile gbasara ụwa na mbara igwe? Ọ bụ eziokwu na ndị sayensị achọpụtala ọtụtụ ihe baara anyị uru, ma, anyị kwesịkwara ịma na e nwere ọtụtụ ihe ha na-agaghị amatali. Otu onye sayensị aha ya bụ Paul Davies kwuru, sị: “A sị ka anyị kọwawa ihe niile gbasara mbara igwe na ụwa, anyị agaghị akọwali ha, ya aghara inwe ebe ọ ga-eri mperi.” Ihe a onye a kwuru gosiri na ụmụ mmadụ agaghị amatachali ihe niile gbasara ụwa anyị a. N’ihi ya, ọ bụrụ na a gwa anyị na ndị sayensị ga-akọwaliri anyị ihe niile, anyị kwesịrị iche echiche nke ọma tupu anyị ekwere.

      O doro anya na Baịbụl na-emere anyị ọtụtụ ihe sayensị na-enweghị ike imere anyị

      E nwere ihe Baịbụl kwuru banyere ihe ndị dị ịtụnanya dị na mbara igwe nakwa n’ụwa anyị a. Ọ sịrị: “Lee! Ihe ndị a bụ ntakịrị ihe n’ọrụ [Chineke] niile; leekwa ka ihe a nụworo banyere ya si dị ntakịrị!” (Job 26:14) Ihe a gosiri na e nwere ọtụtụ ihe ụmụ mmadụ na-agaghị amatali. Ihe Pọl onyeozi dere kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga ka bụ eziokwu. O dere, sị: “Lee otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi! Lee otú a na-apụghị ịchọpụtacha ikpe ya, na otú a na-apụghị ịchọpụtacha ụzọ ya!”—Ndị Rom 11:33.

      Ihe Sayensị Na-enweghị Ike Imere Anyị

      Anyị ma na anyị nwere ike isi n’aka ndị sayensị mata ihe ụfọdụ gbasara ụwa anyị a. Ma, ọ bụ Baịbụl na-agwa anyị otú anyị na ndị ọzọ ga-esi na-adị n’udo, nakwa otú anyị ga-esi na-ebi ndụ, anyị ana-enwe ezigbo obi ụtọ. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ndị a Baịbụl na-agwa anyị.

      • Akara e ji asị mmadụ kwụsị

        Ihe Ga-egbochi Mmadụ Ịkpa Arụ

        Ejila ndụ egwu egwu

        “Egbula ọchụ.”—Ọpụpụ 20:13.

        “Onye ọ bụla nke kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ.”—1 Jọn 3:15.

        Na-eme udo

        “Si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị, mee ihe ọma; chọọ udo, chụsookwa ya.”—Abụ Ọma 34:14.

        “A na-aghakwa mkpụrụ nke ezi omume n’ebe udo dị maka ndị na-eme udo.”—Jems 3:18.

        Emela ihe ike

        “Jehova na-enyocha ma onye ezi omume ma onye ajọ omume; mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.”—Abụ Ọma 11:5.

        “Enwerela onye na-eme ihe ike anyaụfụ, ahọrọkwala ụzọ ya ọ bụla. N’ihi na onye aghụghọ bụ ihe arụ n’anya Jehova.”—Ilu 3:31, 32.

      • Ezinụlọ

        Ihe Ga-eme Ka Ezinụlọ Na-enwe Obi Ụtọ

        Na-erubere ndị mụrụ gị isi

        “Ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ime Onyenwe anyị, n’ihi na nke a bụ ezi omume: ‘Sọpụrụ nna gị na nne gị’; nke bụ́ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nwere nkwa: ‘Ka ihe wee gaziere gị, ka i wee dị ogologo ndụ n’elu ụwa.’”—Ndị Efesọs 6:1-3.

        Na-akụziri ụmụ gị ihe otú kwesịrị ekwesị

        “Unu emela ụmụ unu ihe iwe, kama na-azụlitenụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.”—Ndị Efesọs 6:4.

        “Unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.”—Ndị Kọlọsi 3:21.

        Na-ahụ di gị ma ọ bụ nwunye gị n’anya, na-akwanyekwara ya ùgwù

        “Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.”—Ndị Efesọs 5:33.

      • Osisi

        Ime ka a kwụsị imebi ụwa

        E nwere ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị mebiri obodo Izrel n’oge ochie. Ọ sịrị: “Ndị bi n’ala a emerụwo ya . . . Ikpe amawokwa ndị bi na ya.” (Aịzaya 24:5, 6) Chineke ga-ekpe ndị niile na-emebi ụwa a ikpe. Ọ ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Ha ga-atarịrị ahụhụ ihe ha mere.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya