-
Otú Baịbụl Si Ghara IrekasịỤlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 4
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE?
Otú Baịbụl Si Ghara Irekasị
NSOGBU E NWERE: Ndị mbụ dere Baịbụl na ndị ji aka depụtaghachi ya n’oge ochie ji papaịrọs na akpụkpọ anụ e ji ede ihe dee ha.a (2 Timoti 4:13) Olee otú ihe ndị a ha ji dee Baịbụl si mee ka o sie ike ichekwa Baịbụl?
Papaịrọs anaghị ara ahụ́ adọwa. Ọ na-achagharị ma na-emebi ngwa ngwa. Richard Parkinson na Stephen Quirke, bụ́ ndị ọkachamara na-amụ gbasara Ijipt oge ochie, kwuru na “papaịrọs nwere ike iji nwayọọ nwayọọ gbarie ma ghọọ ntụ. A pịakọtachaakwa ha, dowe ha n’ebe jụrụ oyi, ha na-ebido mawa ebu ma ọ bụ rekasịwa.” Ha sịkwara na “òké ma ọ bụ ahụhụ ndị ọzọ nwere ike ịta ha ma e lie ha n’ala.” Mgbe a chọtara ụfọdụ papaịrọs, e dowere ha n’ebe anwụ ma ọ bụ mmiri mere ka ha mebie ngwa ngwa.
Akpụkpọ anụ e ji ede ihe na-anọte aka karịa papaịrọs. Ma ọ na-emebikwa ma ọ bụrụ na e jizighị ya ejizi ma ọ bụ dowe ya n’ebe dị́ mmiri mmiri ma ọ bụ n’anwụ.b Ụmụ ahụhụ na-atakwa ya. Ọ bụ ya mere na ọtụtụ akwụkwọ ndị e nwere n’oge ochie adịghịzi taa. Á sị na Baịbụl rekasịrị, anyị agaraghị amata ihe e dere na ya.
OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE: N’oge ochie, Chineke nyere ndị Juu iwu na onye ọ bụla e chiri eze “ga-edepụtara onwe ya” akwụkwọ ise mbụ dị́ na Baịbụl. (Diuterọnọmi 17:18) Ka ọ na-erukwala n’oge ndịozi Jizọs, ndị ọkachamara n’idepụta ihe ejirila ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta depụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ, nke mere e ji nwee Akwụkwọ Nsọ n’ụlọ nzukọ dị iche iche n’Izrel nakwa n’obodo Masedonia dị́ anya ma e si Izrel gawa ya. (Luk 4:16, 17; Ọrụ Ndịozi 17:11) Olee otú e si chekwaa ụfọdụ akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ ha adịrị ruo taa?
Ọtụtụ Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ dịgidere ruo ọtụtụ narị afọ n’ihi na e tinyere ha n’ite ụrọ ma dowe ha n’ime ọgba n’ọzara
Otu ọkachamara aha ya bụ Philip W. Comfort, onye na-amụ gbasara Agba Ọhụrụ, kwuru na “ndị Juu na-etinyekarị akwụkwọ mpịakọta n’ime ite ụrọ ka ọ ghara imebi.” Ọ ga-abụ na Ndị Kraịst nọ́ n’oge ahụ mewekwara otu ihe ahụ. Ọ bụ ya mere e ji hụ ụfọdụ akwụkwọ mpịakọta Baịbụl n’ime ite ụrọ dị iche iche, nakwa n’ebe gbara itiri a na-edowe ákwà, n’ọgba nakwa n’ọzara.
URU Ọ BARA: E nwere ọtụtụ puku akwụkwọ mpịakọta Baịbụl ka dịnụ taa. Ụfọdụ n’ime ha adịwala kemgbe ihe karịrị puku afọ abụọ. O nweghị akwụkwọ mpịakọta ọzọ dịrurula afọ ole a a ka nwere ọtụtụ n’ime ha otú a.
-
-
Baịbụl Dịgidere n’Agbanyeghị na A Gbara Mbọ Ibibi YaỤlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 4
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE?
Baịbụl Dịgidere n’Agbanyeghị na A Gbara Mbọ Ibibi Ya
NSOGBU E NWERE: Ọtụtụ ndị ọchịchị na ndị isi okpukpe achọghị ka ndị mmadụ na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ha gbalịrị iji ikike ha nwere kwụsị ndị mmadụ inweta Baịbụl, ibipụta ya na ịsụgharị ya. Ka anyị lee ihe atụ abụọ:
N’ihe dị ka n’afọ 167 Tupu Oge Ndị Kraịst: E nwere otu eze Siria aha ya bụ Antiochus Epiphanes. O si n’ezinụlọ Seleucus. Ọ gbara mbọ ịmanye ndị Juu ka ha kpewe okpukpe ndị Grik. O nyere iwu ka e bibie Akwụkwọ Nsọ Hibru niile. Heinrich Graetz, onye na-akọ akụkọ ihe mere eme, kwuru na ndị na-ejere eze a ozi dọwara akwụkwọ mpịakọta Baịbụl niile ha hụrụ ma gbaa ha ọkụ, gbuokwa ndị niile ha hụrụ na-agụ Baịbụl.
N’ihe dị ka narị afọ asatọ gara aga: Ụfọdụ ndị isi okpukpe Katọlik were iwe na ndị nkịtị bidoro ịna-akụzi Baịbụl kama ịna-akụzi ihe ndị Katọlik kweere. Ha kwuru na onye nkịtị ọ bụla ha hụrụ jí akwụkwọ Baịbụl ọzọ na-abụghị akwụkwọ Abụ Ọma nke e dere n’asụsụ Latịn bụzi onye na-ekweghị ekwe. Otu kansụl chọọchị Katọlik gbara mbọ ka e mee ihe a ndị isi ha kwuru. Ha gwara ụmụ nwoke ndị chọọchị ha ka ha na-aga achọ ndị na-ekweghị ekwe. Ha ga-aga n’ụlọ ọ bụla e chere na Baịbụl dị, saa anya ná mmiri chọọ ma hà ga-ahụ Baịbụl. Ha ga-agbakwa ụlọ ọ bụla ha hụrụ Baịbụl ọkụ.
Á sị na ihe gaziiri ndị a chọrọ ka Baịbụl gharazie ịdị, anyị agaaraghị ama ihe dị n’ime ya.
Baịbụl Bekee William Tyndale sụgharịrị dịgidere n’agbanyeghị na ndị ọchịchị achọghị ka ọ dịrị, a gbakwara ọtụtụ Baịbụl ọkụ, mechaakwa gbuo Tyndale n’afọ 1536
OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE: N’oge ahụ Eze Antiochus na-agba mbọ ka a kwụsị ịgụ Baịbụl n’Izrel, e nweela ọtụtụ ndị Juu bizi n’obodo ndị ọzọ. Otu nchọpụta e mere gosidịrị na ka ọ na-erule n’oge ndịozi Jizọs, e kee ndị Juu ụzọ iri, ihe karịrị ụzọ isii ebighịzi n’Izrel. N’ebe ndị ahụ ha bizi, ha dowere Akwụkwọ Nsọ n’ụlọ nzụkọ ha dị iche iche. Ọ bụkwa ya ka ụmụ ụmụ ha nakwa Ndị Kraịst mechara gụọ.—Ọrụ Ndịozi 15:21.
N’agbata afọ 476 na afọ 1453, ọtụtụ ndị jí Baịbụl kpọrọ ihe gbara mbọ sụgharịa ya, jirikwa aka depụtaghachi ha n’agbanyeghị na o nwere ike ịta isi ha. Mbọ a ha gbara mere ka Baịbụl dịrị n’ihe dị ka n’asụsụ iri atọ na atọ tupudị e mepụta ígwè pụrụ iche na-ebi akwụkwọ n’afọ 1450. Ka oge na-aga, ịsụgharị Baịbụl biiri ọkụ, ana-ebipụtakwa ọtụtụ Baịbụl.
URU Ọ BARA: N’agbanyeghị na ndị eze a na-anụ aha ha na ụfọdụ ndị isi okpukpe gbalịrị ka Baịbụl ghara ịdị, Baịbụl ka bụ akwụkwọ a kacha asụgharị ma na-ekesa n’ụwa. Ụfọdụ mba si na Baịbụl nweta iwu ndị ha tiri nakwa ihe ụfọdụ ha na-ekwu n’asụsụ ha. Baịbụl a gbanweekwala ndụ imirikitimi ụmụ mmadụ.
-
-
Mbọ A Gbara Ịgbanwe Ihe Dị na Baịbụl Kụrụ Afọ n’AlaỤlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 4
-
-
Ndị Masoret sara anya na mmiri depụtaghachi Akwụkwọ Nsọ
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE?
Mbọ A Gbara Ịgbanwe Ihe Dị na Baịbụl Kụrụ Afọ n’Ala
NSOGBU E NWERE: Baịbụl dịgidere n’agbanyeghị na o nwere ike irekasị nakwa na ọtụtụ ndị chọrọ ka ọ ghara ịdị. Ma, ụfọdụ ndị sụgharịrị Baịbụl na ndị depụtaghachiri ya gbara mbọ ịgbanwe ihe dị na Baịbụl. N’ụfọdụ Baịbụl ndị ha sụgharịrị ma ọ bụ depụtaghachi, ha gbanwere ihe ụfọdụ na Baịbụl ka o kwekọọ n’ihe ha na-akụzi, kama ịgbanwe ihe ha na-akụzi ka o kwekọọ n’ihe Baịbụl kwuru. Legodị ihe atụ ụfọdụ:
Ebe a na-anọ efe Chineke: N’ihe dị ka n’agbata afọ 400 na afọ 101 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị Samerịa só sụgharịa akwụkwọ ise mbụ na Baịbụl gbakwunyere ihe n’Ọpụpụ 20:17 ná nsụgharị ha a na-akpọ Pentetuk nke Ndị Samerịa. Okwu ha gbakwunyere bụ, “n’Ugwu Gerizim. N’ebe ahụkwa ka ị ga-arụ ebe ịchụàjà.” Ndị Samerịa ahụ chọrọ ka e nwee ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ gosiri na ụlọ nsọ ha rụrụ n’Ugwu Gerizim kwesịrị ekwesị.
Ozizi Atọ n’Ime Otu: N’ihe na-erughị narị afọ atọ e dechara Baịbụl, otu nwoke, onye na-ede akwụkwọ gbasara Atọ n’Ime Otu, gbakwunyere ihe na 1 Jọn 5:7. Okwu ndị ọ gbakwunyere bụ, “n’eluigwe, Nna ahụ, Okwu ahụ, na Mmụọ Nsọ ahụ: ha atọ bụkwa otu.” Okwu ndị a adịghị na Baịbụl mbụ e dere. Otu ọkachamara nke na-amụ gbasara Baịbụl, onye aha ya bụ Bruce Metzger, kwuru na “sí n’afọ 501 gawa, a bịara na-edenyekwu okwu ndị ahụ n’akwụkwọ mpịakọta Baịbụl dị́ na Latịn Ochie nakwa na Baịbụl Latịn a na-akpọ Vulgate.”
Aha Chineke: Ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl kpebiri iwepụ aha Chineke na Baịbụl n’ihi na ndị Juu kweere na aha Chineke dị nsọ nke na e kwesịghị ịna-akpọ ya. Ha dere “Chineke” ma ọ bụ “Onyenwe Anyị” n’ebe ha kwesịrị ide aha Chineke.a
OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE: Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị depụtaghachiri Baịbụl elezighị anya, ụfọdụkwa ji aghụghọ gbakwunye ihe ndị masịrị ha, e nwere ọtụtụ ndị sara anya na mmiri depụtaghachi ihe niile otú ọ dị na Baịbụl mbụ. N’agbata afọ 501 na afọ 1000, ndị Masoret depụtaghachiri Akwụkwọ Nsọ Hibru. E kwuru na ha gụrụ mkpụrụokwu na mkpụrụ akwụkwọ ole ha depụtara ọnụ iji hụ na ha na nke dị n’ebe ha si depụta ha hà otu. E nwee ebe ha chere na ihe e dere na nke ha ji na-edepụtaghachi Baịbụl dị iche n’ihe e dere na Baịbụl mbụ, ha na-ede ihe n’akụkụ peeji ahụ iji gosi na obi akachaghị ha na ihe e dere ebe ahụ ziri ezi. Ha agbanweghị ihe ọ bụla e dere na Baịbụl. Otu prọfesọ aha ya bụ Moshe Goshen-Gottstein kwuru na ndị Masoret “weere na ha kpachara anya gbanwee ihe na Baịbụl, na ha emeela mmehie kachanụ mmadụ nwere ike ime.”
Ihe ọzọkwa bụ na ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta Baịbụl ndị e nwere taa na-enyere ndị na-amụ gbasara Baịbụl aka ịchọpụta ndị nke e dehiere ihe na ha. Dị ka ihe atụ, kemgbe ọtụtụ afọ, ndị isi okpukpe na-ekwu na ihe dị na Baịbụl Latịn ha bụ kpọmkwem ihe dị na Baịbụl mbụ. Ma, ha gbakwunyere okwu ndị ha na-ekwesịghị ịgbakwunye na 1 Jọn 5:7 anyị kwuru gbasara ya ná mmalite isiokwu a. Ndị sụgharịrị Baịbụl Bekee King James Version gbakwunyedịrị okwu ndị ahụ na ya. Ma, mgbe a hụrụ akwụkwọ mpịakọta Baịbụl ndị ọzọ, gịnị ka a chọpụtara? Bruce Metzger kwuru, sị: “Okwu ndị ahụ a gbakwunyere [na 1 Jọn 5:7] adịghị n’akwụkwọ mpịakọta Baịbụl ochie niile (n’asụsụ Siriak, asụsụ ndị Ijipt, Aminian, Itiopik, Arabik, Slavonik), e wezụga nke Latịn.” Ọ bụ ya mere e jizi wepụ okwu ndị ahụ na Baịbụl King James Version ndị e degharịrị edegharị nakwa na Baịbụl ndị ọzọ.
Otu n’ime akwụkwọ papaịrọs e ji dee Baịbụl n’ihe dị ka n’afọ 200. Aha ya bụ Chester Beatty P46
È nwere akwụkwọ mpịakọta ochie ndị ọzọ gosiri na a gbanwebeghị ihe e dere na Baịbụl mbụ? Mgbe a hụrụ Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ n’afọ 1947, ndị na-amụ gbasara Baịbụl jizi akwụkwọ mpịakọta ndị a e dere ihe karịrị otu puku afọ tupu afọ 1947 lee ma ihe e dere na ha na ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị Masoret depụtaghachiri hà bụ otu. Otu n’ime ha kwuru na otu n’ime akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ gosiri na n’ime ihe karịrị otu puku afọ ndị Juu ji aka depụtaghachi Baịbụl, ha sara anya na mmiri hụ na ha agbanweghị ihe ọ bụla na Baịbụl.
N’ọ́bá akwụkwọ a na-akpọ Chester Beatty Library, nke dị́ na Dọblịn, n’Ayaland, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e nwere akwụkwọ papaịrọs nke akwụkwọ niile dị́ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. E nwekwara akwụkwọ mpịakọta ndị e dere malite n’afọ 101 gawa. Ọ pụtara na e dere ha naanị ihe dị ka otu narị afọ e dechara Baịbụl. Akwụkwọ a na-akpọ The Anchor Bible Dictionary kwuru na “ihe ndị e dere n’akwụkwọ papaịrọs ndị a na-eme ka a ghọtakwuo okwu ụfọdụ e dere na Baịbụl, na-emekwa ka o doo anya na a gbanwebeghị ihe dị na Baịbụl.”
“Anyị nwere ike ikwu na e wezụga ya, e nweghị akwụkwọ ọzọ merela ochie e depụtaghachiri kpọmkwem ihe dị na ya”
URU Ọ BARA: Akwụkwọ mpịakọta ndị a nọrọla ọtụtụ afọ emeela ka a ghọta na a gbanwebeghị ihe dị na Baịbụl. Mgbe otu nwoke a na-akpọ Sir Frederic Kenyon na-ekwu gbasara Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ọ sịrị na “e nweghị akwụkwọ ọ bụla ọzọ merela ochie nke e nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị mekwarala ochie na-egosi na a gbanwebeghị ihe e dere n’ime ya. E nwekwaghị onye na-ekwu eziokwu, nke na-amụ gbasara Baịbụl, ga-ekwu na ihe ndị e dere na Baịbụl ndị anyị nwere ugbu a abụghị ihe dị na Baịbụl mbụ.” Otu nwoke aha ya bụ William Henry Green, onye na-amụ gbasara Baịbụl, kwukwara banyere Akwụkwọ Nsọ Hibru, sị: “Anyị nwere ike ikwu na e wezụga ya, e nweghị akwụkwọ ọzọ merela ochie e depụtaghachiri kpọmkwem ihe dị na ya.”
-