-
Inwe Mmekọahụ Ọ̀ Ga-eme Ka Anyị Dịkwuo ná Mma?Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
-
-
ISI NKE 24
Inwe Mmekọahụ Ọ̀ Ga-eme Ka Anyị Dịkwuo ná Mma?
Mgbe Sera na Devid kpara naanị ọnwa abụọ, ọ dị Sera ka ò ruola ọtụtụ afọ ha kpawara. Ha na-eji ekwe ntị edegara ibe ha ozi ọtụtụ ugboro, na-anọkwa ọtụtụ awa ma ha kwurịtawa okwu n’ekwe ntị. Otu onye kwuwe okwu, onye nke ọzọ na-amadị ihe ọ chọrọ ikwu! Ma n’otu abalị ha nọ n’ụgbọala a dọwara n’otu ebe, ihe Devid chọrọ abụghị naanị ịkparịta ụka.
N’ime ọnwa abụọ ahụ ha kpawara, ihe ha na-eme bụ naanị ijide ibe ha aka na isusutụ ọnụ. Sera achọghị ka ọ gafee otú ahụ. Ma ọ chọghị ihe ga-eme ka ya na Devid gbasaa. E nweghị nwa okorobịa ọzọ na-eme ya obi ụtọ otú Devid si eme ya, na-emekwa ya ka ọ̀ bụ àkwá ugo. Sera gwara onwe ya, sị: ‘Ihe ọzọ bụ na Devid hụrụ m n’anya, mụnwa ahụkwa ya n’anya.’
OBI gị nwere ike ịgwa gị ihe ga-emecha mee n’akụkọ a. Ma o nwere ike obi gị agaghị agwa gị ụdị nsogbu Devid na Sera ga-enwe ma ọ bụrụ na ha enwee mmekọahụ. Chegodị ihe a:
Chineke mere iwu dị iche iche na-achị ihe ndị o kere. N’ihi ya, mmadụ si n’ebe dị oké elu wụtuo, o nwere ike ịgbaji ụkwụ. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ga-eme ma mmadụ mebie iwu Chineke nyere banyere omume, dị ka iwu ahụ sịrị: “Zere ịkwa iko.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:3) Gịnị ga-eme onye dara iwu ahụ? Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.” (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Olee otú o si bụrụ eziokwu? N’okpuru ebe a, lee ma ị̀ ga-edeli nsogbu atọ nwoke na nwaanyị nwere ike inwe ma ha nwee mmekọahụ tupu ha alụọ.
1 ․․․․․
2 ․․․․․
3 ․․․․․
Leruo ihe ndị ahụ i dere anya. Ì dere ọrịa a na-ebute ná mmekọahụ, ịtụrụ ime ọkwà ma ọ bụ ịkpasu Chineke iwe? Ihe ndị ahụ so ná nnukwu nsogbu mmadụ nwere ike inwe ma onye ahụ mebie iwu Chineke nyere gbasara ịkwa iko.
Ma ọnwụnwa nwere ike ịbịara gị, gị ana-eche, sị, ‘O nweghị ihe ga-eme mụnwa.’ Ọ̀ bụ na mmadụ niile anaghị enwe mmekọahụ? Ụmụ akwụkwọ ibe gị na-ejikarịkwa inwe mmekọahụ etu ọnụ, o yikwara ka o nweghị ihe na-eme ha. I nwere ike iche na inwe mmekọahụ ga-eme ka gị na onye gị na ya na-akpa dịkwuo ná mma otú ahụ Sera anyị kọrọ akụkọ ya ná mmalite chere. Ònyekwanụ chọrọ ka a na-akọ ya ọnụ na ọ mabeghị nwoke ma ọ bụ na ọ mabeghị nwaanyị? Ọ́ kaghị mma ime ihe ndị ọzọ na-eme?
Chetụgodị echiche! Mara na ọ bụghị mmadụ niile na-eme ya. N’eziokwu, i nwere ike ịgụ ebe e dere na ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwe mmekọahụ. Dị ka ihe atụ, otu nchọpụta e mere n’Amerịka gosiri na e kee ndị eto eto ụzọ atọ, ụzọ abụọ enwewela mmekọahụ tupu ha agachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Nchọpụta ahụ pụtakwara na otu ụzọ n’ime ha anaghị eme ya. O gosiri na e nwere ọtụtụ ndị na-anaghị eme ya. Gịnị na-eme ndị ahụ na-enwe mmekọahụ? A chọpụtala na ọtụtụ ndị na-eto eto nwerela mmekọahụ na-emecha nwee ụfọdụ nsogbu ndị a.
NSOGBU NKE MBỤ OBI ERUGHỊ ALA. Ọtụtụ ndị na-eto eto, bụ́ ndị nwere mmekọahụ mgbe ha na-alụbeghị, kwuru na ha mechara kwaa mmakwaara.
NSOGBU NKE ABỤỌ ATỤKWASỊGHỊ IBE HA OBI. Nwoke na nwaanyị nwee mmekọahụ mgbe ha na-akpa, ihe onye ọ bụla n’ime ha ga-echewe bụ, ‘Ònye makwanụ onye ọzọ ya na ya nwerela mmekọahụ?’
NSOGBU NKE ATỌ ỊKWA MMAKWAARA. N’eziokwu, ọtụtụ ụmụ agbọghọ chọrọ ka ụmụ okorobịa ha na ha na-akpa na-elekọta ha, ọ bụghị imebi ha. Ọtụtụ ụmụ okorobịa na-achọpụtakwa na ụmụ agbọghọ ndị kwere ka ha na ha nwee mmekọahụ anaghịzi amasịcha ha.
E wezụga ihe ndị a anyị kwurula, ọtụtụ ụmụ okorobịa ekwuola na o nweghị ihe ga-eme ka ha lụọ nwa agbọghọ ha na ya nwetụrụla mmekọahụ. Gịnị mere ha ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ha chọrọ ịlụ onye na-emebibeghị!
Ọ bụrụ na ị bụ nwaanyị, ihe ahụ ha kwuru ò juru gị anya ma ọ bụdị wee gị iwe? Cheta na ihe ndị na-eme ma nwa okorobịa na nwa agbọghọ nwee mmekọahụ mgbe ha na-alụbeghị dị iche n’ihe a na-egosi na fim nakwa na tiivi. Ndị na-eme fim na-eme ka ndị na-eto eto chee na mmadụ inwe mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye bụ ezigbo ihe nakwa na ọ bụ otú e si egosi ezigbo ịhụnanya. Ma ekwela ka a ghọgbuo gị! Ndị chọrọ ịrata gị ka i nwee mmekọahụ na-achọ naanị ọdịmma nke ha. (1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5) A sị ka e kwuwe, onye hụrụ gị n’anya n’eziokwu ọ̀ ga-eme ihe nwere ike ịkpatara gị nsogbu ọ bụla? (Ilu 5:3, 4) Onye na-echere gị echiche ọma n’eziokwu ọ̀ ga-anwa gị ọnwụnwa ka i mee ihe ga-eme ka gị na Chineke ghara ịdị ná mma?—Ndị Hibru 13:4.
Ọ bụrụ na ị bụ nwa okorobịa nwere nwa agbọghọ ya na ya na-akpa, ihe e kwuru n’isiokwu a kwesịrị ime ka i chebara adịm ná mma gị na onye ahụ echiche. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ hụrụ ya n’anya n’eziokwu?’ Ọ bụrụ na ị hụrụ ya n’anya, olee otú kacha mma i nwere ike isi gosi ya? Ihe ị ga-eme bụ ịkata obi na-edebe iwu Chineke, inwe amamihe nke ga-eme ka i zere ọnwụnwa, na ịhụnanya nke ga-eme ka ị na-eme ihe ga-abara onye ahụ uru. I nwee àgwà ndị ahụ, obi nwere ike ịdị nwa agbọghọ ahụ otú ọ dị nwa agbọghọ Shulem ahụ na-emebighị onwe ya, bụ́ onye kwuru, sị: “Onye m hụrụ n’anya bụ nke m, abụkwa m nke ya.” (Abụ Sọlọmọn 2:16) N’eziokwu, ọ ga-eji gị na-eme ọnụ!
Ma ị̀ bụ nwoke ma ị̀ bụ nwaanyị, i nwee mmekọahụ mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, i reela ùgwù gị n’ihi na ị tụfuola ihe bara ezigbo uru i nwere. (Ndị Rom 1:24) Ka a sịkwa ihe mere obi ji ajọ ọtụtụ ndị na-eto eto njọ ma ha nwechaa mmekọahụ, ya adị ha ka ha abaghịzi uru, dịkwa ha ka hà mere iberiibe tụfuo ihe bara ezigbo uru ha nwere! Ekwela ka ụdị ihe ahụ mee gị. Mmadụ chọọ ịrata gị ka gị na ya nwee mmekọahụ ma sị gị, “Ọ bụrụ na ị hụrụ m n’anya, ị ga-ekwe,” gwa ya hoo haa, sị, “Ọ bụrụ na ị hụrụ m n’anya, ị gaghị agwa m mee ya!”
Ahụ́ gị bara ezigbo uru. I kwesịghị ikwe ka e mebie ya. Gosi na i kpebisiri ike irube isi n’iwu ahụ Chineke nyere ka anyị zere ịkwa iko. I mechaa lụọ di ma ọ bụ nwunye, ị ga-enwezi ike inwe mmekọahụ. Obi ga-adị gị ụtọ inwe ya mgbe ahụ n’ihi na ị gaghị na-echegbu onwe gị, na-akwa mmakwaara, ma ọ bụ nwee nsogbu ndị ọzọ ịkwa iko na-akpatakarị.—Ilu 7:22, 23; 1 Ndị Kọrịnt 7:3.
GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A N’ISI NKE 4 NA NKE 5 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2
Mmadụ iji aka ya egbo onwe ya agụụ mmekọahụ ọ̀ dị njọ?
AMAOKWU BAỊBỤL
“Gbaaranụ ịkwa iko ọsọ. . . . Onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.”—1 Ndị Kọrịnt 6:18.
NDỤMỌDỤ
Ihe i kwesịrị ikpebi ịna-eme mgbe gị na onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nọ bụ: Emela ihe ọ bụla ị na-achọghị ka ndị mụrụ gị hụ ka ị na-eme ya.
Ị̀ MA NA . . . ?
Nwoke na nwaanyị kpawa ma nwee mmekọahụ, nke nwoke nwere ike ịhapụ nke nwaanyị, chọrọ nwa agbọghọ ọzọ.
IHE M GA-EME!
Ebe mụ na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m na-ekwesịghị ịnọ naanị anyị bụ ․․․․․
Onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m chọọ ka anyị nọrọ naanị anyị, ihe m ga-ekwu bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịna-agụsi gị ike ka i nwee mmekọahụ tupu ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, gịnị mere na i kwesịghị ime ya?
● Gịnị ka ị ga-eme ma mmadụ gwa gị ka i nwee mmekọahụ?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 176]
“Ebe ị bụ Onye Kraịst, i nwere àgwà ọma ndị ga-eme ka ihe gị na-amasị ndị ọzọ. N’ihi ya, i kwesịrị ịsa anya ná mmiri ma gbaara onye ọ bụla chọrọ ka gị na ya mee omume rụrụ arụ ọsọ. Jiri àgwà ọma ndị ahụ kpọrọ ihe. Ekwela ka onye ọ bụla mebie ha!”—Jọshụa
[Foto dị na peeji nke 176, 177]
Mmadụ inwe mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye yiri iji foto mara mma mere ihe e ji ehicha ụkwụ
-
-
Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Igbo Onwe M Agụụ Mmekọahụ?Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
-
-
ISI NKE 25
Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Igbo Onwe M Agụụ Mmekọahụ?
“Amalitere m igbo onwe m agụụ mmekọahụ mgbe m dị afọ asatọ. M mechara mụta otú Chineke si ele omume ahụ anya. O wutere m nke ukwuu mgbe ọ bụla m mere ya. M na-ajụ onwe m, sị, ‘Olee otú Chineke ga-esi hụ onye dị ka m n’anya?’”—Luiz.
MGBE ị ghọwara okorobịa ma ọ bụ agbọghọ, mmekọahụ nwere ike ịgụsiwe gị ike, mee ka ị malite igbo onwe gị agụụ mmekọahụ.a Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụghị ihe ọjọọ. Ha na-asị: “O nweghị onye ọ na-akpatara nsogbu.” Ma, e nwere ezi ihe mere ị ga-eji zere ya. Pọl onyeozi dere, sị: “Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu . . . nwụọ n’ihe banyere . . . agụụ mmekọahụ.” (Ndị Kọlọsi 3:5) Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ anaghị eme ka agụụ mmekọahụ ya nwụọ, kama ọ na-afụnye ya ọkụ. Ihe ndị ọzọ ị ga-echebara echiche bụ:
● Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ na-eme ka onye ahụ na-eche banyere naanị onwe ya. Dị ka ihe atụ, mgbe mmadụ na-egbo onwe ya agụụ mmekọahụ, naanị ihe dị ya mkpa bụ otú ihe ahụ ọ na-eme si atọ ya ụtọ.
● Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ na-eme ka ọ na-ele onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya anya ka ihe e ji enwe mmekọahụ.
● Ebe ọ bụ na onye na-egbo onwe ya agụụ mmekọahụ na-eche banyere naanị onwe ya, o nwere ike ime ka mmekọahụ ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya na-enwe ghara ịna-eju ya afọ.
Kama igbo onwe gị agụụ mmekọahụ na-agụ gị, gbalịa ịna-ejide onwe gị. (1 Ndị Tesalonaịka 4:4, 5) Iji nyere gị aka ime otú ahụ, Baịbụl kwuru na i kwesịrị izere ihe ọ bụla ma ọ bụ ebe ọ bụla nwere ike ime ka agụụ mmekọahụ gụwa gị. (Ilu 5:8, 9) Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na igbo onwe gị agụụ mmekọahụ eriela gị isi? O nwere ike ịbụ na ị gbalịala ịkwụsị ya, ma o kwebeghị gị. I nwere ike iche ozugbo na ị gaghị akwụsịli ya, na i nweghị ike ime ihe Chineke chọrọ. Otú ahụ ka otu nwa okorobịa aha ya bụ Pedro si na-ele onwe ya anya. O kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m mere ya, ọ na-ewute m nke ukwuu. M chere na o nweghị ihe ga-eme ka Chineke gbaghara m. O siiri m ike ikpe ekpere.”
Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, adala mbà. Olileanya ka dị. Ọtụtụ ndị, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto, akwụsịla àgwà ọjọọ ahụ. I nwekwara ike ịkwụsị ya!
Ihe Ị Ga-eme Mgbe Obi Na-ama Gị Ikpe
Dị ka anyị kwurula, obi na-amakarị ndị na-egbo onwe ha agụụ mmekọahụ ikpe. O doro anya na ọ bụrụ na ị na-enwe “mwute dị ka uche Chineke si dị,” o nwere ike ime ka ị kwụsị àgwà ahụ. (2 Ndị Kọrịnt 7:11) Ma obi gị mawa gị ikpe gafee ókè, o nwere ike imebiri gị ihe. O nwere ike ime ka ị daa mbà, nke ga-eme ka ị chọọ ịkwụsị ịgbalị imeri àgwà ahụ.—Ilu 24:10.
N’ihi ya, gbalịsie ike ile nsogbu ahụ anya otú kwesịrị ekwesị. Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ bụ adịghị ọcha. O nwere ike ime ka ị “bụrụ ohu nke ọchịchọ na ihe ụtọ dị iche iche.” Ọ na-emekwa ka mmadụ na-eche echiche na-ezighị ezi. (Taịtọs 3:3) Ma, àgwà a abụghị mmekọahụ jọgburu onwe ya dị ka ịkwa iko. (Jud 7) N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-egbo onwe gị agụụ mmekọahụ, i kwesịghị iche na i meela mmehie Chineke na-agaghị agbaghara. Ihe i kwesịrị ime bụ ịrụ ahụ́ gị ụka ma na-agbalị mgbe niile izere ya!
Mgbe ọ bụla i mere omume ahụ, o nwere ike ime ka obi daa gị mbà. Mgbe ụdị ihe ahụ mere, cheta ihe e kwuru n’Ilu 24:16, nke bụ́: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha; ma ọdachi ga-eme ka ndị ajọ omume sụọ ngọngọ.” Ime ya ọzọ apụtaghị na ị bụ onye ajọ omume. N’ihi ya, adala mbà. Kama, chọpụta ihe mere i ji mee ya ọzọ. Gbalịakwa ka i zere ihe ahụ.
Na-atụgharị uche n’ịhụnanya Chineke na ebere ya. E nwere mgbe ọbụ abụ bụ́ Devid mehiere n’ihi ezughị okè. O kwuru, sị: “Jehova emeworo ndị na-atụ egwu ya ebere dị ka nna si emere ụmụ ya ebere. N’ihi na ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.” (Abụ Ọma 103:13, 14) N’eziokwu, Jehova ghọtara na anyị ezughị okè. Ọ “dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5) Ma ọ chọrọ ka anyị na-agbalị imekwu nke ọma. N’ihi ya, gịnị ka i nwere ike ime iji kwụsị àgwà ọjọọ a?
Chebara ihe i ji atụrụ ndụ echiche. Ihe ị na-ele na tiivi ma ọ bụ na fim ma ọ bụ ebe ị na-aga n’Ịntanet ọ̀ na-eme ka mmekọahụ gụwa gị? Ọbụ abụ kpegaara Chineke ekpere gosiri na ọ ma ihe, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru.”b—Abụ Ọma 119:37.
Jisie ike chewe ihe ndị ọzọ. Otu nwanna nwoke aha ya bụ William kwuru, sị: “Tupu ị lakpuo ụra, gụọ Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ọ dị mkpa ka ihe ikpeazụ ị ga-eche n’ụbọchị bụrụ ihe gbasara ofufe Chineke.”—Ndị Filipaị 4:8.
Gwa mmadụ nsogbu ị na-enwe. Ihere nwere ike ime ka o siere gị ike ịkọrọ ya onye ị tụkwasịrị obi. Ma, ịkọrọ ya mmadụ nwere ike inyere gị aka ịkwụsị àgwà a! Otu nwanna nwoke aha ya bụ Devid chọpụtara na ọ bụ eziokwu. O kwuru, sị: “M gara gwa papa m nsogbu m nwere. Agaghị m echefu ihe ọ gwara m. Ọ mụmụrụ ọnụ ọchị, sị m: ‘Eji m gị eme ọnụ n’ihi omume gị.’ Ọ ma na o siiri m ike ịkata obi gwa ya ihe ahụ. Ihe o kwuru gbara m ume, nyekwara m aka ikpebisi ike ịkwụsị àgwà ahụ.
“Papa m gosiri m ebe ụfọdụ n’Akwụkwọ Nsọ iji nyere m aka ịghọta na abụghị m onye ọjọọ, gosikwa m ebe ndị ọzọ iji chọpụta ma m̀ ghọtara na ihe m mere bụ ihe ọjọọ. Ọ gwara m mgbe ọzọ mụ na ya ga-ekwu banyere ya, sịkwa m jisie ike ka m ghara ime ya ruo mgbe ahụ. Ọ sịrị m adala mbà ma m mee ya ọzọ, sịkwa m nọtee aka n’emeghị ya.” Gịnị ka Devid mechara kwuo? O kwuru, sị: “Ihe baara m ezigbo uru bụ ịgwa mmadụ nsogbu m nwere, onye ahụ ana-enyekwara m aka.”c
Chọpụta ihe mere na e kwesịghị iji inwe mmekọahụ na-egwuri egwu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ na mmekọahụ ịnọkata gụwa mmadụ abụghị otu ihe. Dị ka ihe atụ, nwa okorobịa nwere ike iteta n’ụra, mmekọahụ agụwa ya ma ọ bụ ya achọpụta na ọbara ọcha gbapụrụ ya n’ahụ́ mgbe ọ na-arahụ ụra. Otú ahụkwa ka agụụ mmekọahụ nwere ike ịnọkata gụwa nwa agbọghọ mgbe nsọ ya chọrọ ịmalite ma ọ bụ mgbe nsọ ya kwụsịchara. Ma, onye na-egbo onwe ya agụụ mmekọahụ na-eji aka ya eme ka mmekọahụ gụsiwe ya ike.
b Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 33 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2.
c Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ peeji nke 239 ruo 241 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2.
AMAOKWU BAỊBỤL
“Gbaara ọchịchọ a na-enwe n’oge ntorobịa ọsọ, kama chụsoo ezi omume, okwukwe, ịhụnanya, udo, gị na ndị ji obi dị ọcha na-akpọku Onyenwe anyị.”—2 Timoti 2:22.
NDỤMỌDỤ
Kpee ekpere tupu mmekọahụ na-agụ gị agụsiwe gị ike. Rịọ Jehova ka o nye gị “ike karịrị ike nkịtị” ị ga-eji merie ọnwụnwa.—2 Ndị Kọrịnt 4:7.
Ị̀ MA NA . . . ?
Onye ọ bụla na-adịghị ike nwere ike iji aka ya gboo onwe ya agụụ mmekọahụ na-agụ ya. Ma onye bụ́ dimkpa na-ejide onwe ya ọ bụrụgodị na ọ nọ naanị ya.
IHE M GA-EME!
Ihe m ga na-eme ka m nwee ike ịna-eche banyere ihe dị ọcha bụ ․․․․․
Kama igbo onwe m agụụ mmekọahụ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Gịnị mere o ji dị mkpa ka i cheta na Jehova ‘dị njikere ịgbaghara mmehie’?—Abụ Ọma 86:5.
● Ebe Chineke, bụ́ onye kere mmadụ ka ọ na-enwe mmekọahụ, kwuru na i kwesịrị ịna-ejide onwe gị, gịnị ka obi siri Chineke ike na ị ga-eme?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 182]
“Kemgbe m meriri nsogbu ahụ, ejizi m akọnuche dị ọcha efe Jehova. O nweghị ihe m ga-eji tụnyere ya!”—Sera
[Foto dị na peeji nke 180]
Ị daa ada mgbe ị na-agba ọsọ, ọ pụtaghị na ị ga-ebido n’isi—ọ bụrụ na ị na-agbalị ka ị kwụsị igbo onwe gị agụụ mmekọahụ, ime ya ọzọ apụtaghị na ị kụọla afọ n’ala ná mbọ ị na-agba
-
-
Gịnị Mere Ịkwa Iko Ji Dị Njọ?Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
-
-
ISI NKE 26
Gịnị Mere Ịkwa Iko Ji Dị Njọ?
“Ndị na-eto eto na-eme enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwaanyị naanị ka ha mara ma onye ahụ ọ̀ ga-ekwe ka ha nwee mmekọahụ, nakwa ka ha chọpụta mmadụ ole ha na ha nwere ike inwe mmekọahụ.”—Penny.
“Ụmụ okorobịa anaghị ezo ọnụ ekwu ya. Ha na-etu ọnụ na ha nwere enyi nwaanyị, ha na ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị ọzọ ana-enwekwa mmekọahụ.”—Edward.
TAA, ọtụtụ ndị na-eto eto na-etu ọnụ na ha na mmadụ nwere mmekọahụ n’agbanyeghị na o nweghị ihe jikọrọ ha na onye ahụ. Ụfọdụ nwere ndị ha na-agakwuru ka ha na ha nwee mmekọahụ n’enyeghị onwe ha “nsogbu” maka ihe gbasara ịhụnanya nwoke na nwaanyị.
Ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na ọ na-agụ gị agụụ ime otú ahụ! (Jeremaya 17:9) Edward ahụ e dere ihe o kwuru ná mmalite sịrị: “Ọtụtụ ụmụ agbọghọ agwala m ka mụ na ha nwee mmekọahụ. Imeri ọnwụnwa ahụ bụ ihe kacha siere m ike kemgbe m bụ Onye Kraịst. Ọ na-esiri m ike ịsị mba!” Mmadụ gwa gị ka gị na ya nwee mmekọahụ, olee ihe Baịbụl kwuru i kwesịrị icheta?
Mata Ihe Mere Ịkwa Iko Ji Dị Njọ
Ịkwa iko bụ mmehie dị oké njọ nke na ndị na-eme ya “agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10) Ọ bụ mmehie, ma mmadụ abụọ ahụ hà sịrị na ha hụrụ ibe ha n’anya ma ọ bụ na o nweghị ihe jikọrọ ha. Ihe ga-enyere gị aka imeri ụdị ọnwụnwa ahụ bụ ile ịkwa iko anya otú Jehova si ele ya.
“Obi siri m ike na ọ bụ ibi ndụ otú Jehova chọrọ kacha mma.”—Karen, bi na Kanada.
“Cheta na i nwere papa na mama, nwee ndị enyi, nakwa ndị gị na ha nọ n’otu ọgbakọ. Ị ga-emechu ha niile ihu ma ị kwaa iko!”—Pita, bi na Briten.
Ọ bụrụ na ị na-ele ịkwa iko anya otú Jehova si ele ya, ị ga-enwe ike ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị,’ ọ bụrụgodị na ọ na-agụ gị agụụ.—Abụ Ọma 97:10.
Ebe i nwere ike ịgụ: Jenesis 39:7-9. Ghọta na Josef ji obi ike merie ọnwụnwa a nwara ya ka ọ kwaa iko. Ghọtakwa ihe nyeere ya aka imeri ya.
Jiri Ihe I Kweere Na-eme Ọnụ
Ndị na-eto eto na-ejikarị ihe ha kweere eme ọnụ. Ọ bụụrụ gị ihe ùgwù ịna-akpa àgwà gosiri na iwu Chineke dị mma. Ka otú i si ele ịkwa iko anya ghara ịna-eme gị ihere.
“Mee ka o doo anya ozugbo na ị naghị eme omume rụrụ arụ.”—Allen, bi na Jamanị.
“Ụmụ okorobịa mụ na ha gakọrọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ma onye m bụ, ha makwa na ịgbalị inweta m bụ igbu oge.”—Vicky, bi n’Amerịka.
Ịnọsi ike n’ihe i kweere na-egosi na ị ghọwala Onye Kraịst tozuru okè.—1 Ndị Kọrịnt 14:20.
Ebe i nwere ike ịgụ: Ilu 27:11. Ghọta na omume ọma gị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa!
Kpebisie Ike na Ị Gaghị Akwa Iko!
Ọ dị mkpa ka ị sị mba. Ma ụfọdụ nwere ike iche na ihe mere i ji jụ bụ ka a sị na ị chọghị.
“Ihe niile ị na-eme, ma ejiji gị ma okwu gị ma ụdị ndị gị na ha na-akparịta ụka ma otú i si emeso ndị mmadụ, kwesịrị igosi na ị chọghị ịkwa iko.”—Joy, bi na Naịjirịa.
“I kwesịrị ime ka o doo anya na o nweghị ihe ga-eme ka i kwe. Anatala ụmụ okorobịa na-achụ gị ihe ọ bụla. Ha nwere ike iji ya nweta gị, ka à ga-asị na i ji ha ụgwọ.”—Lara, bi na Briten.
Jehova ga-enyere gị aka ma i kpebisie ike na ị gaghị akwa iko. Ihe Jehova meere Devid mere ka Devid kwuo banyere ya, sị: “Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe.”—Abụ Ọma 18:25.
Ebe i nwere ike ịgụ: 2 Ihe E Mere 16:9. Ghọta na Jehova chọsiri ike inyere ndị chọrọ ime ihe ziri ezi aka.
Mara Ihe
Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:3) Olee otú ị ga-esi mee ya? Ọ bụ igosi na ị ma ihe!
“Zere ndị na-ekwukarị banyere ụdị ihe ahụ.”—Neomi, bi na Japan.
“Ọ bụghị onye ọ bụla ị hụrụ ka i kwesịrị inye adres gị ma ọ bụ nọmba ekwe ntị gị.”—Diana, bi na Briten.
Chee echiche banyere okwu gị, omume gị, na ndị gị na ha na-akpa, na ebe ndị ị na-agakarị. Jụzie onwe gị, sị, ‘Ò nwere otú ọ bụla m si eme ka ndị ọzọ chewe na m chọrọ ka mụ na ha nwee mmekọahụ?’
Ebe i nwere ike ịgụ: Jenesis 34:1, 2. Ị ga-ahụ otú otu nwa agbọghọ aha ya bụ Daịna si baa ná nsogbu n’ihi na ọ gara ebe ọ na-ekwesịghị ịga.
Cheta na ịkwa iko abụghị ihe egwuregwu n’anya Jehova Chineke; i kwesịghị iwere ya ka ihe egwuregwu. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ziri ezi, ị ga-eji akọnuche dị ọcha na-ejere Chineke ozi, ị gaghịkwa ere ùgwù gị. Dị ka otu nwa agbọghọ aha ya bụ Carly si kwuo, “gịnị mere ị ga-eji kwe ka onye ọzọ jiri gị gboo onwe ya agụụ mmekọahụ na-agụ ya? Lezie anya ka ị ghara imebi ihe ị tara ahụhụ nweta!”
Olee ụdị ụmụ agbọghọ ụmụ okorobịa kwuru na-amasị ha n’eziokwu? O nwere ike iju gị anya ma ị chọpụta!
AMAOKWU BAỊBỤL
‘Gbalịsienụ ike ka Chineke wee hụ unu n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-enweghị mmerụ na ndị nọ n’udo.’—2 Pita 3:14.
NDỤMỌDỤ
Mee ka àgwà gị ka mma. (1 Pita 3:3, 4) Ọ bụrụ na ị na-akpa àgwà ọma, ndị ị ga-emeta enyi ga-abụ ndị na-akpakwa àgwà ọma.
Ị̀ MA NA . . . ?
Jehova chọrọ ka i nwee mmekọahụ otú kwesịrị ekwesị, ya bụ, mgbe ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Ọ ga-eme gị obi ụtọ mgbe ahụ. Obi agaghị ekoro gị n’elu, ị gaghịkwa akwa mmakwaara, bụ́ nsogbu ịkwa iko na-akpatakarị.
IHE M GA-EME!
Otú m nwere ike isi gbaara ịkwa iko ọsọ otú ahụ Josef mere bụ ․․․․․
Ihe m ga-eme iji zere nzuzu Daịna zuzuru bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịna-agụsi gị ike ka i nwee mmekọahụ tupu ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, gịnị mere na i kwesịghị ime ya?
● Gịnị ka ị ga-eme ma mmadụ gwa gị ka i nwee mmekọahụ?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 185]
“Emela anya ụra! Mgbe otu nwa okorobịa konyere m aka n’olu, agwara m ya, sị, ‘Wepụ aka gị n’olu m!’ M gbarụrụ ihu, si ebe ahụ pụọ.”—Ellen
[Foto dị na peeji nke 187]
Ị kwaa iko, i reela ùgwù gị
-