Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Nọgidenụ Na-ewuli Ibe Unu Elu
    Ụlọ Nche—1992 | Ọgọst 15
    • ha nwe ndị bụ ihe nketa Chineke.’ (1 Pita 5:2, 3) Mgbe ha na-arụ ọrụ ịhụnanya ha, ajụjụ pụrụ ibilite n’ihe ndị a pụrụ inwe mmasị dị iche iche na ha. Ma eleghị anya ọ pụrụ ịbụ omume ọgbakọ unu iguzo ọtọ gụpụta paragraf n’oge Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ndokwa ìgwè maka ije ozi ubi na ọtụtụ ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ banyere ije ozi n’onwe ya pụrụ ịbụ ndị a na-eme dị ka omenala ógbè ahụ si dị. Ma, ọ̀ ga-abụ ọdachi ma ọ bụrụ na onye ọzọ enwee ụzọ dịtụ iche? Ndị nlekọta na-ahụ n’anya na-achọ “ka e mee ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro,” bụ́ okwu Pọl ji mee ihe banyere onyinye ọrụ ebube dị iche iche. Ma ihe a na-atụle na-egosi na ihe bụ mmasị Pọl n’ụzọ bụ isi bụ “ka e wee wulie nzukọ Kraịst elu.” (1 Ndị Kọrint 14:12, 40) O gosipụtaghị ọchịchọ ọ bụla ime ọtụtụ ụkpụrụ na-adịghị agwụ agwụ, dị ka à ga-asị na nkwekọ zuru ezu ma ọ bụ ịdị irè zuru ezu bụ nzube bụ isi o nwere. O dere, sị: “Onyenwe anyị nyere [anyị ikike] iwuli unu elu dị ka ụlọ, ọ bụghịkwa iweda unu.”—2 Ndị Kọrint 10:8.

      23. Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Pọl nke iwuli ndị ọzọ elu?

      23 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Pọl rụrụ ọrụ iji wulie ndị ọzọ elu site n’okwu ndị ziri ezi na ndị na-agba ume. Kama inwe mkpakọrịta n’etiti nanị ndị enyi ole na ole, o tinyekwuru mgbalị ileta ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị, ma ndị dị ike n’ime mmụọ na ndị nọ ná mkpa karịsịa ịbụ ndị e wuliri elu. O mesiri inwe ịhụnanya ike—kama ọtụtụ ụkpụrụ—n’ihi na “ịhụnanya na-ewuli elu.”—1 Ndị Kọrint 8:1.

  • Nnọkọ Ntụrụndụ—Rie Uru Ndị Dị na Ya, Zere Ọnyà Ndị Dị na Ya
    Ụlọ Nche—1992 | Ọgọst 15
    • Nnọkọ Ntụrụndụ—Rie Uru Ndị Dị na Ya, Zere Ọnyà Ndị Dị na Ya

      “Ọ dịghị ihe ọ bụla dị mma karịa na [mmadụ] ga-eri ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, meekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ezi ihe n’ime ndọgbu nke ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ.”—EKLISIASTIS 2:24, New World Translation.

      1. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka nduzi Chineke si enyere ndị ya aka n’ihe banyere ntụrụndụ?

      NDUZI Jehova na-ewetara ndị ohu ya ọtụtụ abamuru. Anyị pụrụ ịhụ nke a n’ihe omume ntụrụndụ. Ntụziaka ya na-enyere ndị Kraịst aka izere imebiga ihe ókè n’ụzọ ọ bụla e si ele ihe anya. Ụfọdụ ndị okpukpe, bụ́ ndị na-emebiga ihe ókè n’uwe oyiyi na omume, na-ele ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ụtọ ọ bụla anya dị ka mmehie. N’aka nke ọzọ, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-achụso ihe ụtọ dị iche iche ọbụna ma ọ bụrụ na ihe ndị dị otú ahụ na-emegide iwu na ụkpụrụ nile nke Jehova.—Ndị Rom 1:24-27; 13:13, 14; Ndị Efesọs 4:17-19.

      2. Gịnị nyere ihe àmà mbụ nke echiche Chineke nwere banyere ntụrụndụ?

      2 Otú ọ dị, gịnị banyere ndị Chineke? Ọtụtụ ndị malitere ịmụ Bible na-enwe ihe ijuanya ịmụta na Chineke kere ụmụ mmadụ n’ezie inwe ikike ịma ụtọ nke ndụ. O nyere nne na nna anyị mbụ ọrụ ha ga-arụ—ma ọ bụghị ọrụ ndọlị na-egbu mmụọ nke kaworo ndụ nke ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-ezughị okè akara. (Jenesis 1:28-30) Chee echiche banyere ọtụtụ ụzọ dị mma nke ndị nile bi n’elu ala bụ́ paradaịs pụrụ isi chọta ihe na-enye ọṅụ. Cheedị echiche ihe ga-abụ ọṅụ ha ikiri ụmụ anụ ọhịa ndị na-agaghị eyi ha egwu na anụ ụlọ dị iche iche ndị pụrụ ịbụ akụkụ nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị! Leekwa aha ihe oriri ha ga-enwe site ‘n’osisi ọ bụla a na-achọsi ike ile anya na nke dị mma oriri’!—Jenesis 2:9; Eklisiastis 2:24.

      3-5. (a) Nzube dị aṅaa ka ntụrụndụ kwesịrị imezu? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Chineke agbaghị ndị Israel ume ka ha ghara ime ihe ga-enye ha ọṅụ?

      3 A pụrụ ile ihe omume ndị ahụ anya, n’ezie, dị ka ntụrụndụ, nke nzube ha n’ime Paradaịs ga-abụ otu ihe ahụ ọ bụ ugbu a: inye mmadụ ume ọhụrụ na ike ọhụrụ maka ịga n’ihu imepụta (ịrụpụta) ihe. Mgbe ntụrụndụ mezuru nke a, ọ bara uru. Nke ahụ ọ̀ pụtara na ndị na-efe ezi ofufe pụrụ iwepụta ohere ná ndụ ha maka ntụrụndụ ọbụna ma à sị na ha ebiwebeghị na Paradaịs? Ee. Akwụkwọ bụ Insight on the Scriptures kwuru banyere ntụrụndụ nke ndị Jehova oge ochie, sị:

      4 “Ihe ọchị na ndọpụ uche nke ndị Israel apụtachaghị ìhè n’ihe ndekọ Bible. Otú o sina dị, ọ na-egosi na e lere ha anya dị ka ma ihe ziri ezi ma ihe kwesịrị ekwesị mgbe ha kwekọrọ n’ụkpụrụ okpukpe nke mba ahụ. Ụdị bụ isi nke ntụrụndụ bụ ịkụ ngwá egwú, ịbụ abụ, ịgba egwú, nkwurịta okwu, tinyekwara egwuregwu ụfọdụ. Ịjụ gwam gwam gwam na ajụjụ ndị siri ike bụ nke e weere n’ihe dị oké ọnụ ahịa.—Ndị Ikpe 14:12.”—Mpịakọta 1, peji nke 102.

      5 Mgbe Devid latara ná mmeri, ụmụ nwanyị ndị Hibru ji ụbọ na obere ịgbà mee ihe ka ha na-aṅụrị ọṅụ (Hibru, sa·chaqʹ). (1 Samuel 18:6, 7) Okwu Hibru ahụ pụtara n’ụzọ bụ isi “ịchị ọchị,” nsụgharị ụfọdụ na-ekwukwa banyere “ndị inyom na-eme oriri.” (Byington, Rotherham, The New English Bible) Mgbe a na-akwagharị Igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ‘Devid na ụlọ Israel nile na-ete egwú n’ihu Jehova, na-eji ụdị ngwá egwu nile ọ bụla.’ Maịkal, bụ́ nwunye Devid, nwere echiche na-ezighị ezi, n’ihi na o megidere òkè Devid keere n’ihe omume ntụrụndụ ahụ. (2 Samuel 6:5, 14-20) Chineke buru amụma na ndị na-alaghachi site ná ndọta n’agha gaa na Babilọn ga-ekere òkè n’ihe omume ndị yiri nke ahụ na-enye obi ụtọ.—Jeremaịa 30:18, 19; 31:4; tụlee Abụ Ọma 126:2.

      6. Olee ụzọ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst si enyere anyị aka n’echiche anyị banyere ntụrụndụ?

      6 Anyị onwe anyị ga-achọkwa inwe echiche ziri ezi banyere ntụrụndụ. Dị ka ihe atụ, ànyị na-aghọta na Jisọs abụghị onye na-anapụ onwe ya ihe ụtọ nile? O wepụtara oge iji rie nri ndị dị mma n’ahụ, dị ka ‘oké oriri nnabata’ ahụ nke Livaị kpọrọ. Mgbe ndị bụ ndị ezi omume n’anya onwe ha katọkwara ya maka iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, Jisọs jụrụ echiche na ụzọ ha. (Luk 5:29-31; 7:33-36) Chetakwa na o jere agbamakwụkwọ ma tụnye ụtụ n’ihe omume ndị ahụ. (Jọn 2:1-10) Nwanne Jisọs otu nne ji ya na ya bụ́ Jud hotara na ndị Kraịst mere ‘oriri ịhụnanya,’ nke o doro anya na ọ bụ oriri ebe ndị nọ ná mkpa nwetara ihe oriri na mkpakọrịta na-enye obi ụtọ, nke dị mma n’ahụ.—Jud 12.

      Nnọkọ Ntụrụndụ n’Oge na n’Ọnọdụ Ya

      7. Olee ụzọ Okwu Chineke si agba ume inwe echiche ziri ezi banyere ntụrụndụ?

      7 Eklisiastis 10:19 na-ekwu okwu dị mma banyere ‘nri e siri maka ịchị ọchị nke ndị ọrụ na mmanya na-eme ka ndụ ṅụrịa.’ Nke ahụ adaghị ná ntị ka à ga-asị na ntụrụndụ bụ ihe na-ezighị ezi ma ọ bụ ihe dị njọ n’onwe ya, ọ̀ dị otú ahụ? Ma, otu akwụkwọ ahụ na-ekwu, sị: “Ihe ọ bụla nwere oge, . . . mgbe ịkwa ákwá, na mgbe ịchị ọchị; mgbe iru újú, na mgbe ite egwú.” (Eklisiastis 3:1, 4) Ee, ọ bụ ezie na ọ dịghị akatọ ntụrụndụ kwesịrị ekwesị, Bible na-enye anyị ịdọ aka ná ntị. Ndị a gụnyere ndụmọdụ metụtara idebe nnọkọ ntụrụndụ n’ọnọdụ ya n’ihe banyere oge na ókè. Ọ na-adọkwa aka ná ntị banyere ihe ize ndụ na-adịkarị ná nnọkọ oriri ndị buru ibu.—2 Timoti 3:4.

      8, 9. N’ihi gịnị ka oge anyị bi n’ime ya na ọrụ nke Chineke nyeworo anyị kwesịrị iji metụta ntụrụndụ?

      8 Anyị rịbara ama na ndị Juu si Babilọn na-alaghachi—bụ́ ndị nwere ọrụ siri ike ha ga-arụ—ga-ekere òkè ná ntụsara ahụ na-enye ọṅụ. Ma, Jeremaịa bu ụzọ kwuo na ya agaghị ‘anọdụ ala n’izu nzuzo nke ndị na-achị ọchị ma ọ bụ malite ịṅụrị ọṅụ.’ (Jeremaịa 15:17) Chineke nyere ya ọrụ izi ozi banyere ntaramahụhụ gaje ịbịa, ya mere ọ bụghị oge kwesịrị ekwesị maka ya ịdị na-aṅụrị ọṅụ.

      9 E kenyere ndị Kraịst taa ọrụ ịkpọsa ozi olileanya nke Chineke tinyekwara ikwupụta ikpe ya megide ajọ usoro ihe Setan. (Aịsaịa 61:1-3; Ọrụ 17:30, 31) Otú a, o kwesịrị ịpụta ìhè na anyị ekwesịghị ikwe ka ntụrụndụ ghọọ oké ihe ná ndụ anyị. Anyị pụrụ ịkọwa ihe anyị na-ekwu site n’iji otu ntasa nnú ma ọ bụ ihe pụrụ iche nke na-eme ka nri tọọ ụtọ mee ihe. Ị̀ ga-awụnye ihe ahụ na-eme ka nri tọọ ụtọ n’ókè buru ibu nke na ọ ga-aṅa ọbụna ihe oriri ahụ? N’ezie, ee e. N’ikwekọ n’okwu Jisọs kwuru na Jọn 4:34 na Matiu 6:33, nchegbu anyị bụ isi—ihe oriri anyị kpọmkwem—kwesịrị ịbụ ime uche Chineke. Ya mere, ntụrụndụ yiri ime ka ihe tọọ ụtọ. O kwesịrị inye ume ọhụrụ, meekwa ka ihe dị mma, ọ bụghị iweta ike ọgwụgwụ ma ọ bụ ịnyịgbu mmadụ.

      10. N’ihi gịnị ka anyị nile kwesịrị iji nyochagharịa oge ntụrụndụ na-ewe anyị?

      10 Otú ọ dị, kwụsịtụ ma chee echiche: Ọ̀ bụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ agaghị asị na oge na ntụkwasị uche ha na-etinye ná ntụrụndụ bụ imeru ihe n’ókè? Ọ bụrụ na ha echeghị otú ahụ, ha gaara eme mgbanwe. Ọ̀ bụ na nke a adịghị atụ aro na onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịkwụsịtụ ma jiri obi eziokwu mee nnyocha miri emi banyere ọnọdụ ntụrụndụ nwere n’ezie ná ndụ anyị? Ọ̀ pụrụ ịbụ na o jiriwo nwayọọ nwayọọ ghọọ oké ihe? Dị ka ihe atụ, ànyị na-agbanye TV ozugbo mgbe ọ bụla anyị latara n’ebe obibi anyị? Ànyị esetịpụwo usoro nke iwepụta oge gbara ọkpụrụkpụ maka ntụrụndụ kwa izu, dị ka kwa uhuruchi Friday ma ọ bụ uhuruchi Saturday? Ànyị ga-enwe nkụda aka ma ọ bụrụ na oge ahụ eruo, anyị wee nọrọ n’ụlọ n’enweghị ntụrụndụ ọ bụla anyị mere atụmatụ ya? Ajụjụ abụọ ọzọkwa: N’ụbọchị na-esote nnọkọ ahụ, ànyị na-achọpụta na anyị nọruru n’ime abalị ma ọ bụ mee njem dị anya nke na ike na-agwụ anyị, ma eleghị anya anyị agaghị enwe otu mkpụrụ ike iji kere òkè n’ije ozi ndị Kraịst ma ọ bụ rụọrọ onye were anyị n’ọrụ ọrụ dị mma n’ụbọchị ahụ? Ọ bụrụ na ntụrụndụ anyị na-enwe mmetụta dị otú ahụ mgbe ụfọdụ, ma ọ bụ mgbe mgbe, ọ̀ bụ nke kwesịrị ekwesị n’ezie na ihe na-enye ọṅụ ziri ezi?—Tụlee Ilu 26:17-19.

      11. N’ihi gịnị ka ịtụleghachi ọdịdị nke ntụrụndụ anyị ji kwesị ekwesị?

      11 Ọ pụkwara ịdị mma anyị ịtụleghachikwa ọdịdị nke ntụrụndụ anyị. Anyị ịbụ ndị ohu Chineke abụghị ihe mgbakwasị ụkwụ na ntụrụndụ anyị bụ nke kwesịrị ekwesị. Tụlee ihe Pita onyeozi degaara ndị Kraịst e tere mmanụ: “Oge nke gasịworo ezuwo ịrụpụta ihe ndị mba ọzọ na-ezube, na ijegharị n’ime agụụ ịkwa iko, agụụ ihe ọjọọ nile, mmanya ogbugbu nile, ite egwu nile [“oriri oké mkpọtụ,” NW], ịṅụbiga mmanya ókè nile, na ikpere arụsị nile jọgburu onwe ha.” (1 Pita 4:3) Ọ dịghị atụ mkpụrụ aka ya n’iwe, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-ebo ụmụnna ya ebubo nke iṅomi ihe ndị nọ n’ụwa na-eme. Ma, ịmụrụ anya dị mkpa nye ndị Kraịst (n’oge ahụ na ugbu a) n’ihi na ọ pụrụ ịdị mfe mmadụ ịdaba n’ọnyà nke ntụrụndụ na-emerụ ahụ.—1 Pita 1:2; 2:1; 4:7; 2 Pita 2:13.

      Mụrụ Anya Maka Ọnyà Ndị Dị na Ya

      12. Pita nke Mbụ 4:3, amaokwu nke atọ na-emesi ụdị ọnyà dị aṅaa ike?

      12 Maka ụdị ọnyà dị aṅaa ka anyị kwesịrị iji mụrụ anya? Pita hotara ‘mmanya ogbugbu, oriri oké mkpọtụ, ịṅụbiga mmanya ókè.’ Otu onye Germany na-akọwa amaokwu ahụ kọwara na okwu Grik ndị e ji mee ihe “metụtara n’ụzọ bụ isi nnọkọ ịṅụ ihe ọṅụṅụ n’oge oriri.” Otu onye prọfesọ mba Switzerland dere na omume ndị ahụ jupụtara n’ebe nile laa azụ n’oge ahụ: “Nkọwa ahụ aghaghị imetụta nnọkọ a haziri ahazi ma ọ bụ ọbụna ìgwè nke ndị maara onwe ha nke a na-anọ n’ime ha na-eme ihe omume ndị ahụ na-eme ihere a kọwara n’ebe a.”

      13. Olee ụzọ iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-eme ihe ná nnọkọ siworo bụrụ ọnyà? (Aịsaịa 5:11, 12)

      13 Inwe ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya ná nnọkọ oriri ndị buru ibu emewo ka ọtụtụ ma n’ọnyà. Ọ bụghị dị ka à ga-asị na Bible na-amachibido iji ihe ọṅụṅụ ndị dị otú ahụ eme ihe n’ụzọ dị mma, n’ihi na ọ dịghị eme otú ahụ. Dị ka ihe na-egosi nke a, Jisọs mere mmanya n’oriri agbamakwụkwọ e mere na Kena. Ọ ghaghị ịbụ na e nweghị ịṅụbiga mmanya ókè, n’ihi na Jisọs ga-aṅa ntị na ndụmọdụ Chineke izere ịnọ n’etiti ndị na-aṅụ oké mmanya. (Ilu 23:20, 21) Ma tụlee ụmụ irighiri ihe ndị a: Onye isi oriri ahụ sịrị na n’oriri ndị ọzọ a na-ebu ụzọ kee mmanya dị mma ‘ma mgbe ndị mmadụ ṅụbigasịrị mmanya ókè, a na-eke nke dị njọ.’ (Jọn 2:10) Ya mere ọ bụ ihe ndị Juu na-emekarị bụ ịṅụbiga mmanya ókè n’agbamakwụkwọ bụ́ ebe a na-enwe mmanya buru ibu maka mmadụ nile.

      14. Olee ụzọ ndị ndị Kraịst kpọrọ oriri pụrụ isi merie ọnyà nke ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya na-ewepụta?

      14 N’ikwekọ na nke ahụ, ndị Kraịst ụfọdụ kpọrọ oriri ekpebiwo iwepụta mmanya wine, beer, na ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ na-aba n’anya nanị ma ọ bụrụ na ha onwe ha pụrụ iji aka ha lekọta ihe a na-ekere ndị ọbịa ha ma ọ bụ ihe ha na-aṅụ. Ọ bụrụ na ìgwè ahụ buru ibu karịa nke onye ahụ kpọrọ oriri pụrụ iji aka ya lekọta, dị ka agbamakwụkwọ ndị Juu ndị ahụ e hotaworo, ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya bara ụba pụrụ ịbụ ọnyà dị ize ndụ. Onye lụworo ọgụ ma merie nsogbu nke ịṅụ mmanya pụrụ ịnọ n’ebe ahụ. Ị pụrụ ịghọta na ịhapụ ka onye ọ bụla gaa were ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’ụzọ a na-akpaghịrị ókè pụrụ itinye ya n’ọnwụnwa nke ịṅụbịga mmanya ókè na imebiri mmadụ nile ihe omume ahụ. Otu onye nlekọta bụkwa nna na Germany kwuru na ezinụlọ ya na-erite uru site ná mkpakọrịta dị mma n’oge nnọkọ oriri nke ha na ndị kwere ekwe ibe ha. Otú ọ dị, o kwukwara na ohere e nwere maka nsogbu ịdapụta na-adị ukwu karị kpọmkwem mgbe mmanya beer dị mfe inweta.

      15. Olee ụzọ a pụrụ isi nwee ike duzie nnọkọ oriri nke ọma?

      15 Agbamakwụkwọ ahụ e mere na Kena nwere “onye isi oriri.” (Jọn 2:8) Nke a apụtaghị na ezinụlọ nke kpọrọ otu ìgwè n’ụlọ ha maka ihe oriri ma ọ bụ oge mkpakọrịta ga-ahọpụta onye isi. Onye bụ di ga-enwe ibu ọrụ nke ilekọta ihe omume ahụ. Ma ìgwè ahụ ọ̀ bụ nanị ezinụlọ abụọ ma ọ bụ karịa nke ahụ nke nta, o kwesịrị ido anya na ọ dị onye na-elekọta ihe na-aganụ. Ọtụtụ ndị nne na nna na-ajụ banyere nke a mgbe a kpọrọ nwa ha nwoke ma ọ bụ nwanyị òkù ná nnọkọ oriri. Ha na-akpọtụrụ onye ahụ kpọrọ oriri ịjụta onye ga-elekọta ihe omume ahụ nile, gụnyere ịnọ ruo mgbe ọ gwụrụ. Ndị Kraịst mụrụ ụmụ emewo mgbanwe ọbụna n’usoro ihe omume ha iji nọrọ ya ka ma ndị toworo eto ma ndị ka na-eto eto wee nwee ike inwe mkpakọrịta n’etiti onwe ha.

      16. Gịnị bụ echiche kwesịrị ekwesị banyere ọnụ ọgụgụ nke ndị ga-abịa ná nnọkọ?

      16 Alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Canada dere, sị: “Ndị okenye ole na ole aghọtawo ndụmọdụ ndị metụtara ịkpa ókè n’ọnụ ọgụgụ nke ndị a na-akpọ ná nnọkọ oriri ịpụta ná nnọkọ ndị buru ibu n’oge oriri agbamakwụkwọ bụ imebi ndụmọdụ ahụ. Ha ekwubiwo na ọ bụrụ na e nye anyị ndụmọdụ ime ka ndị ga-abịa nnọkọ oriri anyị dịrị n’ọnụ ọgụgụ dị nta, nke a pụrụ ịchịkwata, ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi inwe 200 ma ọ bụ 300 mmadụ n’oriri agbamakwụkwọ.”a Kama imesi ike ọnụ ọgụgụ nke mmadụ chere na ọ dị mma, e kwesịrị ilekwasị anya n’ụzọ bụ isi ná nlekọta ziri ezi, n’agbanyeghị mmadụ ole ga-anọ n’ebe ahụ. Otú mmanya ahụ Jisọs wepụtara hà na-egosi na ọnụ ọgụgụ buru ibu bịara agbamakwụkwọ ahụ e mere na Kena, ma o doro anya na e lekọtara ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. E lekọtaghị oriri ndị ọzọ laa azụ n’oge ahụ; ọnụ ọgụgụ pụrụ ịbụworị isi ihe dugara ná nlekọta na-ezughị ezu. Ọ bụrụ na nnọkọ ebuo ibu karị, ihe ịma aka na-adị na ya na-adị ukwuu karị, n’ihi na ọ na-adị mfe ndị na-adịghị ike karị, bụ́ ndị na-emebigakarị ihe ókè, igosipụta onwe ha. Ná nnọkọ ndị a na-elekọtaghị elekọta, ha pụrụ ịmalite ihe omume ndị na-ezighị ezi.—1 Ndị Kọrint 10:6-8.

      17. Olee ụzọ a pụrụ isi gosipụta echiche ndị Kraịst ziri ezi mgbe a na-eme atụmatụ maka nnọkọ?

      17 Ezi nlekọta nke nnọkọ oriri gụnyere ime atụmatụ na nkwadebe ya. Nke a agaghị achọ ka e chepụta isiokwu na-akpali akpali iji mee ka ọ bụrụ nke pụrụ iche ma ọ bụ nke a na-agaghị echefu echefu ma bụrụ nke ga-eṅomi nnọkọ ndị ụwa, dị ka òtù ndị kwara otu ụdị uwe ma ọ bụ nnọkọ nke mmanwụ bịara na ha. Ị̀ pụrụ iche echiche ihe ọ ga-adị ka ya ndị Israel kwesịrị ntụkwasị obi n’Ala Nkwa ahụ ime atụmatụ maka nnọkọ nke ndị nile bịara ya ga-eyi uwe dị ka ndị ọgọ mmụọ nọ n’Ijipt ma ọ bụ ala ọzọ? Hà ga-eme atụmatụ egwú ọgbụgba ndị na-akpali mmekọahụ ma ọ bụ ịkpọ egwú ndị na-ada oké ụda, bụ́ ndị pụrụ ịdị na-ewu ewu n’etiti ndị ọgọ mmụọ? Laa azụ n’Ugwu Saịnaị, ha dabara n’ọnyà nke egwú otiti na egwú ọgbụgba, dị ka ndị pụrụ ịbụworị nke ọtụtụ ndị maara na ndị na-ewu ewu n’Ijipt. Anyị maara ụzọ Chineke na ohu ya tozuru etozu bụ́ Mosis si lee ntụrụndụ ahụ anya. (Ọpụpụ 32:5, 6, 17-19) Ya mere, onye ahụ kpọrọ oriri ma ọ bụ onye nlekọta nke nnọkọ oriri kwesịrị ịtụle ma à ga-enwe ịbụ abụ ma ọ bụ ịgba egwú ọ bụla; ya bụrụkwa otú ahụ, o kwesịrị ijide n’aka na o kwekọrọ n’ụkpụrụ nile nke ndị Kraịst.—2 Ndị Kọrint 6:3.

      18, 19. Gịnị ka anyị pụrụ ịghọta site n’ọkpụkpọ a kpọrọ Jisọs ịbịa agbamakwụkwọ, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi jiri nke a mee ihe?

      18 N’ikpeazụ, anyị na-echeta na ‘a kpọrọ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya bịa n’ọlụlụ nwunye ahụ.’ (Jọn 2:2) N’ikwu eziokwu, onye Kraịst ma ọ bụ ezinụlọ pụrụ nnọọ ileta ndị ọzọ maka oge na-enye ọṅụ, nke na-ewuli elu. Ma banyere nnọkọ oriri ndị e mere atụmatụ ya, ahụmahụ na-egosi na ibu ụzọ kpebie ndị ga-anọ na ya na-enye aka igbochi nsogbu. E mesiri mkpa nke a dị ike site n’ihe otu onye okenye na Tennessee, U.S.A. mere, bụ́ onye zụlitere ụmụ ndị ikom na ndị inyom ndị nọ n’ozi oge nile. Tupu ya ma ọ bụ nwunye ya anakwere ịkpọ òkù, ma ọ bụ nye ụmụ ha ikike ije, ọ kpọtụụrụ onye ahụ kpọrọ oriri iji jide n’aka na e bu ụzọ kpebie ndị ga-abịanụ. E chebere ezinụlọ ya pụọ n’ọnyà ndị dakwasịworo ụfọdụ ndị ná nnọkọ ndị onye ọ bụla pụrụ ịbịa, ma ọ̀ bụ maka ihe oriri, mkpapụ, ma ọ bụ mmega ahụ, dị ka ịgba bọọlụ.

      19 Jisọs agbaghị ume ịkpọ nanị ndị ikwu, ndị enyi ochie, ma ọ bụ ndị ha na mmadụ bụ otu ọgbọ ma ọ bụ nọrọ n’otu ọnọdụ akụ na ụba ná nnọkọ oriri. (Luk 14:12-14; tụlee Job 31:16-19; Ọrụ Ndị Ozi 20:7-9.) Ọ bụrụ na i jiri nlezianya họrọ ndị ị ga-akpọ, ọ dị mfe karị ịgụnye ndị Kraịst nọ n’afọ ndụ na ọnọdụ dị iche iche. (Ndị Rom 12:13; Ndị Hibru 13:2) Ole na ole n’ime ha pụrụ ịbụ ndị na-adịghị ike n’ime mmụọ ma ọ bụ ndị ọhụrụ bụ́ ndị pụrụ irite uru site ná mkpakọrịta nke ha na ndị Kraịst tozuru etozu.—Ilu 27:17.

      Ntụrụndụ n’Ọnọdụ Ya

      20, 21. N’ihi gịnị ka ntụrụndụ pụrụ iji nwee ọnọdụ kwesịrị ekwesị ná ndụ anyị?

      20 Ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị nye anyị dị ka ndị na-atụ egwu Chineke inwe mmasị ná ntụrụndụ anyị na inwe nchegbu na nke ahụ ziri ezi, na anyị nwekwara echiche ziri ezi banyere ọnụ ọgụgụ oge anyị na-eji eme ihe maka ya. (Ndị Efesọs 2:1-4; 5:15-20) Onye ahụ ji ike mmụọ nsọ dee Eklisiastis chere otú ahụ: “Mụ onwe m wee jaa ọṅụ, n’ihi na ọ dịghị ezi ihe mmadụ nwere n’okpuru anyanwụ ma ọ bụghị iri ihe, na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na ịṅụrị ọṅụ: n’ihi na nke ahụ ga-arapara n’ahụ ya n’ime ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ ụbọchị nile nke ndụ ya nke Chineke nyeworo ya n’okpuru anyanwụ.” (Eklisiastis 8:15) Ihe ụtọ ndị dị otú ahụ ziri ezi pụrụ ime ka ahụ nwee ume ọhụrụ, nyekwa aka ibelata nsogbu na nkụda mmụọ ndị jupụtara n’usoro ihe dị ugbu a.

      21 Iji mee ihe atụ, otu onye Austria bụ́ onye ọsụ ụzọ degaara otu enyi ya ochie akwụkwọ, sị: “Anyị mere mkpapụ dị mma n’ụbọchị gara aga. Ihe dị ka 50 n’ime anyị kpapụrụ n’otu obere ọdọ mmiri dị nso na Ferlach. Nwanna B—— bu mmadụ nile na bọs ya, na-ebukwa osi ite atọ, oche ndị a na-apịachi apịachi, table, na ọbụna table e ji apịa bọọlụ. Ọ tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu. Otu nwanna nwanyị jikwa ngwá egwú accordion wee bịa, ya mere a bụrụ ọtụtụ abụ Alaeze. Ụmụnna ndị ahụ, ndị na-eto eto na ndị agadi, nwere ọṅụ ná mkpakọrịta ahụ.” O ji obi ụtọ na-echeta ntụrụndụ ahụ e lekọtara nke ọma nke e mere ka ọnyà ndị dị ka ịṅụbiga mmanya ókè ma ọ bụ omume rụrụ arụ ghara ịdị na ya.—Jemes 3:17, 18.

      22. Mgbe a na-anọ ná nnọkọ ntụrụndụ, ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iburu n’uche?

      22 Pọl gbara anyị ume ilezi anya ka anyị ghara ịdaba n’ọchịchọ nile nke anụ ahụ na-ezughị okè, gharakwa ọbụna ime atụmatụ ndị na-ekpughe anyị nye ọnwụnwa dị iche iche. (Ndị Rom 13:11-14) Nke ahụ gụnyere atụmatụ maka nnọkọ oriri. Mgbe anyị ji ndụmọdụ ya mee ihe na nke ahụ, anyị ga-enwe ike izere ọnọdụ ndị dugaworo ụfọdụ ná ndakpọ ime mmụọ. (Luk 21:34-36; 1 Timoti 1:19) Kama nke ahụ, anyị ga-eji amamihe họrọ ntụrụndụ ndị dị mma nke ga-enyere anyị aka ijigide mmekọrịta anyị na Chineke. Anyị ga-esi otú a rite uru site ná nnọkọ oriri nke a pụrụ ile anya dị ka otu n’ime onyinye nile dị mma nke Chineke.—Eklisiastis 5:18.

      [Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

      a Ụlọ Nche nke October 15, 1984, nwere ndụmọdụ ziri ezi banyere agbamakwụkwọ na oriri agbamakwụkwọ. Nwoke na-achọ ịlụ nwanyị na nwanyị ọ na-alụ, tinyekwara ndị ọzọ ga-enyere ha aka, pụrụ ịtụleghachi ihe odide nke a n’ụzọ ga-abara ha uru tupu ha emee atụmatụ agbamakwụkwọ ha.

      Gịnị Ka Anyị Mụtaworo?

      ◻ Echiche ziri ezi dị aṅaa ka anyị na-achọta na Bible banyere inwe nnọkọ ntụrụndụ?

      ◻ N’ihi gịnị ka e kwesịrị iji cheba echiche n’ihe metụtara oge na ọdịdị nke ntụrụndụ ahụ?

      ◻ Ihe ụfọdụ dị aṅaa ka onye Kraịst kpọrọ oriri pụrụ ime iji nọrọ na nche megide ọnyà dị iche iche?

      ◻ Ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị, bụrụkwa nke ziri ezi, gịnị ka ntụrụndụ pụrụ imezuru ndị Kraịst?

      [Foto dị na peeji nke 18]

      Onye kpọrọ oriri ma ọ bụ onye nduzi n’oge nnọkọ nwere ibu ọrụ nke ịhụ na ndị ọbịa adabaghị n’ọnyà

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya