Ọgbakọ Dị Anyị Mkpa
1 Ụmụ ndị ikom Kora n’otu oge kwupụtara ekele ha maka ọgbakọ Jehova n’ụzọ dị otú a: “Otu ụbọchị n’ogige Gị nile, dị mma karịa [otu puku] ụbọchị n’ebe ọzọ.” (Abụ Ọma 84:10) Nye ha, n’iji ụwa tụnyere ya ọ dịghị ihe ọma ụwa pụrụ inye. Ọ bụrụ na echiche ndị ahụ bụ nke gị, i kwesịrị ime ọgbakọ ebe bụ isi nke mmasị ná ndụ gị.
2 Site ná mmalite ya, ọgbakọ ndị Kraịst egosipụtawo na o nwere ngọzi Jehova. (Ọrụ 16:4, 5) Onye ọ bụla n’ime anyị ekwesịghị iwere ọgbakọ dị ka ihe na-adịghị oké mkpa ma ọ bụ chee na ọ bụ nanị otu ụzọ nke ime ka anyị bịakọta ọnụ n’anụ ahụ. Ọgbakọ bụ ebe Ndịàmà Jehova na-anata agbamume na ume n’ógbè nile. Ọ na-eme ka e nwee mkpakọrịta dị n’otu ka anyị wee bụrụ ndị Jehova ziri ihe na ndị a haziri maka ọrụ Alaeze.—Aịsa. 2:2.
3 Ọgbakọ ndị Kraịst bụ usoro bụ isi maka izi anyị eziokwu ahụ. (1 Tim. 3:15) Ụmụazụ Jisọs dum aghaghị ‘ịbụ otu’—ndị ha na Chineke, Kraịst, na otu onye na ibe ya dị n’otu. (Jọn 17:20, 21; tụlee Aịsaịa 54:13.) N’agbanyeghị ebe anyị pụrụ ịga n’ụwa, ụmụnna anyị kwenyere n’ozizi na ụkpụrụ Bible nile, ha na-emekwa omume kwekọrọ na ha.
4 A na-enye anyị ọzụzụ, na-akwadebekwa anyị ịrụzu ọrụ e kenyere anyị bụ́ ime ndị na-eso ụzọ. Kwa ọnwa, Ụlọ Nche, Teta!, na Ozi Alaeze Anyị na-enye ihe ọmụma na-enye aka iji nyere anyị aka n’ịmalite mkparịta ụka ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ. A na-ahazi nzukọ dị iche iche iji gosi anyị ụzọ e si achọta ma na-azụlite mmasị. Ịba ụba anyị na-ahụ gburugburu ụwa na-anwapụta na anyị nwere nkwado sitere n’eluigwe n’ọrụ a.—Mat. 28:18-20.
5 Site n’ọgbakọ, anyị na-anata agbamume kwa ụbọchị ‘nke na-akpasu anyị inwe ịhụnanya na ịrụ ọrụ ọma dị iche iche.’ (Hib. 10:24, 25) A na-ewusi anyị ike iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi. Ndị nlekọta na-ahụ n’anya na-enyere anyị aka ịnagide nrụgide na nchekasị dị iche iche. (Ekli. 4:9-12) A na-enye anyị ndụmọdụ dị anyị mkpa mgbe anyị nọ n’ihe ize ndụ nke ịkpafu. Olee nzukọ ọzọ nke na-enye nlekọta ịhụnanya dị otú ahụ?—1 Tesa. 5:14.
6 Ọ bụ nzube Jehova ka anyị nọrọ ọgbakọ ya nso iji chebe ịdị n’otu anyị. (Jọn 10:16) Otu ụzọ ọgbakọ si enyere anyị aka ịnọgide na-esoro òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi na-akpachi anya bụ site n’izipụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị maka agbamume anyị. Anyị imeghachi omume ná ntụziaka ịhụnanya na-adọta anyị nso n’otu n’ichi anya nke na-enyere anyị aka ịnọgide na-adị ike n’ụzọ ime mmụọ.
7 Ọgbakọ dị mkpa maka nlanarị ime mmụọ anyị. Ọ gaghị ekwe omume ijere Jehova ozi n’ụzọ ọ na-anara ma e wezụga ya. Mgbe ahụ, ka anyị nọrọ ihe Jehova nyeworo anyị nso. Ka anyị rụọ ọrụ kwekọrọ n’ihe mgbaru ọsọ ya ma jiri ezi obi tinye ndụmọdụ anyị na-anata n’ebe ahụ n’ọrụ. Ọ bụ nanị n’ụzọ a ka anyị pụrụ isi gosi ókè anyị ji ọgbakọ kpọrọ ihe.—Abụ Ọma 27:4.