Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Jehova Na-echeta Ndị Ọrịa Na Ndị Agadi
    Ụlọ Nche—1993 | Ọgọst 1
    • Jehova Na-echeta Ndị Ọrịa Na Ndị Agadi

      ỊBỤ onye na-eche “mgbe ihe ọjọọ” ihu pụrụ ịbụ ihe siri oké ike. (Abụ Ọma 37:​18, 19) Oge dị otú ahụ pụrụ ịbịa n’ụdị nke ime agadi na adịghị ike ndị na-eso ya abịa. Ụfọdụ na-abanye n’oge ihe ọjọọ mgbe ha na-arịa ọrịa dị oké njọ, nke na-ewe ogologo oge. Ha pụrụ inwe mmetụta dị ka à ga-asị na ọrịa ha na-eduzi ndụ ha, na-achị echiche na omume ha nile.

      Otú ọ dị, ọ na-emesi obi ike icheta na Jehova na-elekwasị anya ya n’ahụ ndị ohu ya nile. Ọ na-eme ka obi ya ṅụrịa mgbe ndị ohu ya raara onwe ha nye ya nọgidere na-egosipụta ịnọgidesi ike n’ihe na amamihe n’agbanyeghị ime agadi, ọrịa, ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ na-etinye n’ule. (2 Ihe Emere 16:9a; Ilu 27:11) Eze Devid na-emesi anyị obi ike, sị: “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku ya, . . . ọ bụkwa ntiku ha ka ọ ga-anụ.” Ee, ọ maara banyere ndọlị ha; ọ na-agba ha ume site ná mmụọ ya. ‘O wee zọpụta ha.’ Ọ na-echeta ha ma na-enyere ha aka ịtachi obi. (Abụ Ọma 145:​18, 19) Ma gịnị banyere anyị? Dị ka Jehova, ànyị na-echeta ndị ọrịa na ndị agadi?

      Adịghị ike n’ihi ọrịa ma ọ bụ ime agadi bụ ihe ndị a na-ahụ ná ndụ n’usoro ihe dị ugbu a. Ha bụ eziokwu ndị anyị na-aghaghị iche ihu ruo mgbe Jehova mezuru nzube ya maka elu ala na ihe a kpọrọ mmadụ. Taa, ọtụtụ ndị mmadụ na-aka nnọọ nká, ya mere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu maara banyere adịghị ike ndị dị otú ahụ. Tụkwasị na nke ahụ, mgbe ha ka na-eto eto, ọtụtụ na-abụ ndị ihe ọghọm ma ọ bụ ọrịa ndị na-eyi ndụ egwu ma ọ bụ na-akpata ọrụsị dakwasịrị. Ruo mgbe ụwa ochie nke a gabigara, ọrịa na ime agadi ga-anọgide na-abụ ihe ịma aka ndị bụ isi.

      Lee ka anyị si enwe ekele inwe ndị ọrịa na ndị agadi bụ́ ndị nọgidere dị ka ihe ilereanya nke “ịhụju anya na nke ogologo ntachi obi”! Ee, “anyị na-akpọ ha ndị ngọzi dịịrị, bụ́ ndị tachiri obi.” (Jemes 5:​10, 11) Ọtụtụ ndị meworo agadi bụ́ ndị ike ha belataworo ekerewo òkè ruo ọtụtụ iri afọ n’izi ihe, inye ọzụzụ, nakwa ịkpụzi ndị na-edu ndú ugbu a n’ọgbakọ. Ọtụtụ n’ime ndị meworo agadi na-enwekwa ọṅụ ịhụ na ụmụ ha ekerewo òkè n’ije ozi oge nile.​—⁠Abụ Ọma 71:17, 18; 3 Jọn 4.

      N’otu ụzọ ahụ, anyị na-enwe ekele maka ndị ahụ nọ n’etiti anyị bụ́ ndị nọ n’oké ọrịa, ma n’agbanyeghị ahụhụ ha na-ata, na-enwe ike ịgba anyị ume site n’ikwesị ntụkwasị obi ha. Mgbe ndị a nyere ihe àmà banyere olileanya ha na-adịghị ada ada, ihe na-esi na ya apụta na-akpali akpali nke ukwuu ma na-agba okwukwe ume. Udo nke uche na afọ ojuju ha na-ekpughe okwukwe nke kwesịrị nṅomi n’ezie.

      Ọ bụ ihe na-alọ obi mmiri mmadụ ịbụ onye ọrịa cancer, ahụ mkpọnwụ, ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ nke na-agbanwe ndụ mmadụ kpam kpam dakwasịrị na mberede. Ọ bụkwa ule siri ike nye ndị mụrụ ụmụ ịhụ ka ụmụ ha na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-ata ahụhụ n’ihi ihe ọghọm. Gịnị ka ndị ọzọ pụrụ ime iji nye aka? Oge ọ bụla dị otú ahụ nke ihe ọjọọ bụ ule nye òtù ụmụnna ndị Kraịst. Ọ bụ ohere nke iji gosipụta na ‘enyi na-ahụ n’anya bụ nwanne nke a mụrụ maka mgbe ahụhụ.’ (Ilu 17:17) Dị ka a tụrụ anya ya, ọ bụghị ndị ọrịa na ndị agadi nile pụrụ ịtụ anya inweta enyemaka onwe onye site n’aka onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ. Ma Jehova ga-ahụ na site ná mmụọ ya, ọtụtụ ga-enwe mmetụta ịbụ ndị a kpaliri inye aka n’ụzọ dị iche iche. Ndị okenye pụrụ ilekwasị anya ha n’ihe ndị na-emenụ iji jide n’aka na ọ dịghị onye e leghaara anya.​—⁠Lee Ọpụpụ 18:​17, 18.

      Gbalịa Ịghọta

      N’ịgbalị inyere mmadụ aka, ọ dị mkpa inwe ezi nkwurịta okwu, nke ahụ na-ewekwa oge, ndidi, na ọmịiko. Dị ka onye inyeaka, ị ga-achọkarị ‘ịgba ume site n’okwu ọnụ’; ma gee ntị nke ọma tupu i kwuo okwu ma ọ bụ mee ihe, ma ọ bụghị otú ahụ ị pụrụ ịghọ ‘onye nkasi obi na-eweta ọnọdụ ọjọọ.’​—⁠Job 16:​2, 5.

      Mgbe ụfọdụ ọ ga-esiri ndị ọrịa na ndị agadi ike izochi nkụda mmụọ ha. Ọtụtụ ejiwo olileanya nke ịdị ndụ lanarị oké mkpagbu ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu, ugbu a ha na-enwekwa mmetụta ịbụ ndị ha na oge na-agba ọsọ, ọsọ nke ha na-ejighị n’aka na ha ga-enwe mmeri na ya. Ọzọkwa, ọnọdụ ha na-emekarị ka ha nwee ike ọgwụgwụ na nchegbu. Ime ka okwukwe ha na-arụ ọrụ ma sie ike bụ ọgụ na mgba, karịsịa mgbe mmadụ na-apụkwaghị imezu ọchịchọ obi ya nke ikere òkè zuru ezu n’ije ozi ndị Kraịst. Otu onye okenye ndị Kraịst letara otu nwanna nwanyị meworo agadi; mgbe ya na ya na-ekpe ekpere, ọ rịọrọ ka Jehova gbaghara anyị mmehie anyị. Mgbe e kpesịrị ekpere ahụ, ọ chọpụtara na nwanna nwanyị ahụ na-ebe ákwá. Ọ kọwara na ya nwere mmetụta ịbụ onye nwere mkpa mgbaghara pụrụ iche nke Jehova n’ihi enweghị ike ikere òkè n’ikwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ ọzọ. Ee, mmetụta nke ịbụ onye na-enweghị ike ma ọ bụ onye na-erughị eru, ọ bụ ezie na ọtụtụ mgbe o kwesịghị ịdị otú ahụ, pụrụ ime ka mmadụ nwee mwute n’obi.

      Ka o doo gị anya na nchegbu na ike ọgwụgwụ pụrụ imetụta ọnọdụ uche. N’ihi adịghị ike nile nke ime agadi ma ọ bụ ihe isi ike nke ọrịa na-eweta ike ọgwụgwụ, mmadụ pụrụ iche na Jehova agbahapụwo ya, eleghị anya na-asị: “Gịnị ka m meworo? N’ihi gịnị ka o ji bụrụ m?” Cheta okwu ndị dị n’Ilu 12:25: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi ruru ala; ma okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa.” Gbalịa ịchọta okwu ọma nke ga-akasi obi. Ndị meworo agadi bụ́ ndị nọ n’ihe mgbu pụrụ ọbụna, dị ka Job, ikwupụta ọchịchọ ịnwụ anwụ. Nke a ekwesịghị ịbụ ihe na-alọ obi mmiri; gbalịa ịghọta. Mkpesa ndị dị otú ahụ abụchaghị ihe àmà nke enweghị okwukwe ma ọ bụ ntụkwasị obi. Job kpere ekpere ka e ‘zobe ya na sheol,’ ma ihe ndị o kwuru kpọmkwem mgbe o kwusịrị nke ahụ na-ekpughe okwukwe siri ike o nwere na Jehova ga-emesị kpọlite ya. Okwukwe siri ike na-eme ka o kwe omume ịgabiga oge ihe mgbu na ịda mbà n’obi ma ka nọrọ Jehova nso.​—⁠Job 14:​13-⁠15.

      Igosi Ndị Ọrịa na Ndị Agadi Nsọpụrụ

      Ọ bụ ihe dị oké mkpa imeso ndị ọrịa na ndị agadi omume site ná nsọpụrụ na nkwanye ùgwù. (Ndị Rom 12:10) Ọ bụrụ na ha emeghachighị omume ngwa ngwa dị ka ha sibu eme ma ọ bụ na ha apụghị ime ihe dị ukwuu, ekwela ka iwe wee gị. Adịla ngwa n’itinye ọnụ n’okwu ha ma na-emere ha mkpebi. N’agbanyeghị otú nzube anyị sị dịrị mma, ọ bụrụ na anyị akpaa àgwà n’ụzọ ịchị ọchịchị ma ọ bụ iti iwu, ọ dịghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịnapụ onye nke ọzọ ùgwù onwe onye. N’otu ihe odide onye dọkịta nke e bipụtara na 1988, otu onye na-eme nchọpụta, bụ́ Jette Ingerslev, kọwara ihe otu ìgwè ndị dị 85 afọ n’onwe ha lere anya dị ka ihe kasị dịrị mkpa maka ụdị ndụ ha na-adị: “Ha nyere akụkụ atọ ọnọdụ kasị mkpa: ịnọnyere ndị ikwu; ezi ahụ ike; nakwa nke ikpeazụ nke dịkwa mkpa, inwe ike ime mkpebi nke onwe ha.” Rịba ama na nna ochie ahụ bụ́ Jekọb abụghị onye ụmụ ya mere akaje mgbe o meworo agadi; a kwanyeere ọchịchọ ya nile ùgwù.​—⁠Jenesis 47:29, 30; 48:17-⁠20.

      A ghaghị imesokwa ndị na-arịa ọrịa omume n’ụzọ nkwanye ùgwù. Otu onye okenye tụfuru ikike ya ikwu okwu, ịgụ ihe, na ide ihe n’ihi otu mmehie ihe e mere n’oge ịwa ahụ. Nke a bụ ihe otiti dị oké njọ, ma ndị okenye ibe ya kpebiri ime ihe ọ bụla ha pụrụ ime iji gbochie ya inwe mmetụta onye na-abaghị n’ihe. Ugbu a ha na-agụrụ ya akwụkwọ ozi nile nke ọgbakọ ma na-agụnye ya n’atụmatụ ihe ndị ọzọ a na-eme n’ọgbakọ. Ná nnọkọ ndị okenye, ha na-agbalị ịchọpụta ihe bụ uche ya. Ha na-ekwe ka ọ mara na ha ka na-ele ya anya dị ka onye okenye ibe ha ma na-enwe ekele maka ọnụnọ ya. N’ọgbakọ ndị Kraịst, anyị nile pụrụ ime mgbalị ka a ghara inwe onye ọrịa ma ọ bụ onye agadi ọ bụla nke na-eche na ya bụ onye ‘a tụfuru’ ma ọ bụ hapụ.​—⁠Abụ Ọma 71:9.

      Enyemaka Iji Nweta Ume Ime Mmụọ

      Anyị nile nwere mkpa maka nri ime mmụọ iji mee ka okwukwe anyị na-arụ ọrụ ma sie ike. Nke ahụ mere e ji agba anyị ume ịgụ Bible na akwụkwọ Bible dị iche iche kwa ụbọchị na iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè ná nzukọ nile nke ndị Kraịst nakwa n’ọrụ nkwusa. Ọtụtụ mgbe, ndị ọrịa na ndị agadi chọrọ enyemaka iji mezuo nke a, ọ dịkwa mkpa ime ihe ezi uche dị na ya n’ọnọdụ ha kpọmkwem. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọtụtụ ka pụrụ ịbịa nzukọ ma ọ bụrụ na e buga ha ma nyekwa ha obere enyemaka n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha ịbịa nzukọ ndị dị otú ahụ bụ agbamume dị ukwuu nye ọgbakọ. Ntachi obi ha na-akpali akpali ma na-agba okwukwe ume.

      N’ọtụtụ ọnọdụ ndị ọrịa na ndị agadi pụkwara ikere òkè pụtara ìhè n’ije ozi ndị Kraịst. A pụrụ ịgụnye ụfọdụ n’ìgwè ndị ji ụgbọ ala na-agba àmà, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ha ga-enwe mmetụta ịbụ ndị nwere ume ọhụrụ site n’inwe ike ime nleta ole na ole. Mgbe nke a na-ekwekwaghị omume, ha pụrụ inweta ọṅụ n’ịgba àmà mberede nye ndị ha na-ezute. Otu nwanna nwanyị ọrịa cancer dakwasịrị kpebiri iji afọ ọ bụla fọrọ afọ nke ndụ ya mee mgbalị pụrụ iche iji gbasaa ozi ọma ahụ. Nkwusa obi ike ya bụ agbamume nye mmadụ nile. Ọbụna na ọ haziri ememe olili ozu ya ka e wee gbaa ezi àmà nye ndị ikwu, ndị ọrụ ibe ya, na ndị agbata obi na-ekweghị ekwe. Ọnọdụ ihe isi ike ya si otú a ‘mee ka ozi ọma ahụ gaa n’ihu,’ mkpebi o mekwara ikwupụta okwukwe na obi ike ya mere ka ụbọchị ya ndị ikpeazụ nwee nzube pụrụ iche.​—⁠Ndị Filipaị 1:​12-⁠14.

      Ọ dị mma inyere ndị ọrịa na ndị agadi aka ịdị ike n’ụzọ ime mmụọ. Ezinụlọ dị iche iche pụrụ ịkpọ ha òkù isoro ezinụlọ ha nọkọrịta n’otu uhuruchi, ma ọ bụ a pụrụ ibuga akụkụ nke ọmụmụ ihe ezinụlọ ha mgbe ụfọdụ n’ụlọ nke onye na-apụghị ịpụ apụ. Otu onye bụ nne kpọtara ụmụ ya ndị kasị nta n’ụlọ nke otu nwanna nwanyị meworo agadi ka ha wee nwee ike ịgụkọ Akwukwọm nke Akukọ Bible ọnụ. Nke a mere nwanna nwanyị ahụ meworo agadi obi ụtọ, ụmụaka ahụ nwekwara ọṅụ n’ụzọ e si lebara ha anya.

      Otú ọ dị, e nwere oge mgbe a na-ekwesịghị inye onye ọrịa nsogbu nke ukwuu, ọ pụkwara ịkasị mma mgbe ụfọdụ nanị ịgụrụ ha akwụkwọ ụfọdụ ka ha nụ. Otú ọ dị, cheta na ọ bụrụ na mmadụ adịghị nnọọ ike n’anụ ahụ ikere òkè ná nkwurịta okwu, onye dị otú a ka pụrụ ịnọ ná mkpa ma chọọ mkpakọrịta ime mmụọ ụfọdụ. Anyị pụrụ iso ndị dị otú a kpee ekpere, gụọrọ ha ihe, ma ọ bụ kọọrọ ha ahụmahụ; ma anyị kwesịrị ilezi anya ka anyị ghara ịnọ ogologo oge karịa ka ha pụrụ ịchọ.

      E nwere otu ozi dị nsọ nke ihe ka ọtụtụ ná ndị ọrịa na ndị agadi ka pụrụ ije: ikpe ekpere n’ihi ndị ọzọ. Ndị na-eso ụzọ n’oge gboo weere ije ozi a dị ka ihe dị mkpa. N’otu oge ha kesara ibu ọrụ dị n’ọgbakọ n’ụzọ ga-eme ka ndị ozi nwee ike ịtụkwasị uche n’ekpere. E hotara Epafras kwesịrị ntụkwasị obi dị ka onye ‘na-agbasi mgba ike n’ihi ndị ọzọ n’ekpere ya.’ (Ndị Kọlọsi 4:12; Ọrụ 6:4) Ekpere dị otú ahụ dị mkpa ma baa uru nke ukwuu.​—⁠Luk 2:​36-⁠38; Jemes 5:16.

      Jehova na-echeta ndị ọrịa na ndị agadi ma na-elekọta ha anya n’oge ha nọ n’ihe isi ike. Ọ na-atụ anya n’ụzọ ziri ezi ka anyị onwe anyị tụlee ihe anyị pụrụ ime iji nyere ha aka ma kwadoo ha. Nchegbu anyị na-egosi na-ekpughe mkpebi anyị siri ike ijigide ịnọgidesi ike n’ezi ihe anyị. Anyị na-enwekwa obi ụtọ iche echiche banyere okwu nke Eze Devid: “Jehova maara ụbọchị nile nke ndị zuru okè: ihe nketa ha ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi.”​—⁠Abụ Ọma 37:18.

      [Igbe dị na peeji nke 28]

      Inye Enyemaka Bara Uru Site ná Nghọta

      NDỊ enyi na ndị ikwu kwesịrị inweta ihe ọmụma bụ isi ma zie ezi banyere ụzọ isi lekọta ndị ọrịa na ndị agadi. Karịsịa, a pụrụ ịgba ha ume inwe àgwà ziri ezi n’ebe ndụ dị, inwe mmetụta ịbụ ndị dị mkpa na ndị e nwere mmasị n’ebe ha nọ, nakwa inwe mmetụta nke ịba uru onwe onye. Otú a ụdị ndụ ha na-adị ga-anọ n’ọdịdị nke ga-echebe ọṅụ ha nwere na Jehova, n’agbanyeghị ihe mgbu ha nile. A rịbawo ama na ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova na-adị ndụ kaa nká. Otu isi ihe dị ike nke na-akpata ya bụ mmasị ha dị ndụ n’olileanya ahụ nke dị n’ihu, ọnọdụ uche ha mara mma, na òkè ha na-ekere n’ọrụ Alaeze ruo n’ókè o kwere omume. Onye isi oche ahụ nwụworo anwụ nke Watch Tower Society, bụ́ Frederick W. Franz, bụ́ onye nwụrụ n’udo n’oge ọ banyere na 100 afọ ya mgbe o bisịrị ndụ na-enye ọṅụ nke mịpụtara mkpụrụ, bụ ihe atụ mara mma banyere nke a.​—⁠Tụlee 1 Ihe Emere 29:28.

      N’ozuzu ya, ịtụkwasị uche n’isi ihe ndị metụtara nlekọta dịịrị ụbọchị ọ bụla pụrụ ịgụnye ọtụtụ ihe: ịdị ọcha dị mma, iri ezigbo nri, ihe ọṅụṅụ na nnu zuru ezu, mmega ahụ ezi uche dị na ya, ikuku dị ọcha, ịhịa aka dị nro, na nkwurịta okwu na-akpali akpali. Iri ezigbo nri pụrụ inye aka imeziwanye ọnụnụ ihe, ọhụhụ ụzọ, ịrụ ọrụ nke ụbụrụ, na ọdịmma anụ ahụ, tinyekwara ahụ inwe ike dị elu ịlụso ọrịa ọgụ. Nye ndị meworo agadi ntakịrị ihe dị ka iri ezigbo nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ hiri nne pụrụ ịkpata ọdịiche dị n’etiti ọnọdụ dị mma na adịghị ike ndị agadi. Ọ pụrụ ịchọ iche echiche iji chọta ụdị mmega anụ ahụ nke kwesịrị onye ahụ. Otu nwanna nwanyị nke na-abịa agụrụ otu nwanna nwanyị meworo agadi, nke fọrọ ntakịrị ka o kpuo ìsì ihe, na-amalite ma na-emechi nleta ọ na-eme kwa izu site n’isoro nwanna nwanyị ahụ gbaa egwú na gburugburu ime ụlọ ya n’ụzọ dị nro. Tepu ahụ e ji akpọ egwú na-adị mgbe nile na-enwekwa egwú a họtara ahọta n’ime ya, “Ihe ngwọta” nke a na-adịkwa ha abụọ mma n’ahụ.

      N’ọtụtụ mba, nzukọ ndị na-enye aka pụrụ inye enyemaka dị irè nke bara uru ma nyekwa ihe ọmụma na ndụmọdụ banyere ọnọdụ ụfọdụ kpọmkwem na ụzọ isi nagide ha. (Otú ọ dị, onye Kraịst kwesịrị ilezi anya mgbe nile ka a ghara ịdọpụ uche ya gaa n’ihe omume ndị na-eme ka uche anyị ghara ịdị n’ezi ije ozi ndị Kraịst anyị.) Mgbe ụfọdụ a na-enye enyemaka n’ụdị nke ịgbaziri àkwà ụlọ ọgwụ, mkpara nkwagide, ihe nkwụnye ụkwụ, oche nkwagharị, ihe e ji anụ ihe, na ihe ndị ọzọ. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị agadi na-eche na ihe ọ bụla adịghị ha mkpa ma ọ bụ na ọ baghị uru inweta ihe ọhụrụ ndị dị otú ahụ, ndị ikwu aghaghị inye ndụmọdụ ziri ezi ọtụtụ mgbe ma ọ bụ ọbụna jiri ire ụtọ mee ihe. Aka ụzọ dị mma iji na-emepe ụlọ ịsa ahụ pụrụ ịkpata ezi ọṅụ karịa ite okooko osisi.

      Ilekọta ndị agadi anya pụrụ ịkpali oké ihe isi ike nke uche, karịsịa ma ọ bụrụ na onye ahụ enwee ịda mbà nke uche. Ịda mbà nke uche na-eji ụzọ nzuzo abịa. Mmadụ pụrụ ịgbalị imerụ ya site n’igbochi onye ọrịa ahụ ka ọ ghara ịnọ n’emeghị ihe ọ bụla n’ụzọ na-adịchaghị mkpa. Onye nwere ịda mbà nke uche pụrụ iwesa mmadụ iwe na mberede bụ́ onye ya na ya na-adịbu ná mma nke ukwuu. Ndị ikwu aghaghị ịghọta na onye na-eme agadi pụrụ ọbụna ichezọ ihe ọ bụla nke metụtara eziokwu​—⁠ihe mwute na-esi ná ndakpọ anụ ahụ apụta, ọ bụghị ihe àmà nke enweghị okwukwe.

      Ọ bụrụ na onye ọrịa ahụ nọ n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ụlọ nlekọta, isoro ndị na-arụ n’ebe ahụ nwee nkwurịta okwu dị mkpa ka ndị ọrụ ahụ wee mara ihe a ga-eme n’ihe banyere ememe ụbọchị ọmụmụ, Krismas, ma ọ bụ ezumike ụwa ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ịwa ahụ dị mkpa, ndị ikwu pụrụ ịkọwa na idekọ echiche onye ọrịa ahụ banyere mmịnye ọbara.

  • Nzukọ Kwa Afọ
    Ụlọ Nche—1993 | Ọgọst 1
    • Nzukọ Kwa Afọ

      OCTOBER 2, 1993

      A GA-EME NZUKỌ KWA AFỌ nke ndị nọ n’òtù Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania n’October 2, 1993, n’ụlọ nzukọ Assembly Hall of Jehovah’s Witnesses, 2932 Kennedy Boulevard, Jersey City, New Jersey. Nzukọ bu ụzọ nke nanị ndị nọ n’òtù ahụ ga-amalite n’elekere 9:30 ụtụtụ, nzukọ kwa afọ nke ọha mmadụ ga-esochikwa ya n’elekere 10:00 ụtụtụ.

      Ndị so n’Òtù Ọrụ ahụ kwesịrị ime ka Ọfịs Odeakwụkwọ òtù ahụ mara ugbu a banyere mgbanwe ọ bụla e nweworo n’adres ha ji anata akwụkwọ ozi n’ime afọ gara aga ka akwụkwọ ịma ọkwa na akwụkwọ nnọchianya ndị a na-ezitere ha mgbe nile nwee ike iru ha n’oge na-adịghị anya mgbe August 1 gasịrị.

      E kwesịrị izighachi akwụkwọ nnọchianya ndị ahụ, ndị a ga-ezitere ndị òtù ahụ n’otu mgbe ahụ a na-ezitere ha akwụkwọ ịma ọkwa maka nzukọ kwa afọ ahụ n’Ọfịs Odeakwụkwọ nke Society tupu ọ gafee August 15. Onye ọ bụla so n’òtù ahụ kwesịrị idejupụta ma ziteghachi akwụkwọ nnọchianya nke ya ngwa ngwa, na-egosi ma ọ̀ ga-abịa nzukọ ahụ n’onwe ya ma ọ bụ na ọ gaghị abịa. Ihe e dere n’akwụkwọ nnọchianya nke ọ bụla kwesịrị ikwu ihe a chọrọ kpọmkwem, ebe ọ bụ na ya ka a ga-adabere iji mara ndị ga-anọ ebe ahụ n’onwe ha.

      A na-atụ anya na a ga-emecha ihe nile, tinyere nzukọ metụtara ọrụ ha na inye akụkọ ozi n’ihe dị ka elekere 1:00 ehihie ma ọ bụ n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị. A gaghị enwe nnọkọ nke ehihie. N’ihi ohere na-ebughị ibu e nwere, ọ bụ nanị ndị nwere tiketi ka a ga-anabata na ya. Ọ dịghị ndokwa ọ bụla a ga-eme iji eriri telifon jikọta nzukọ kwa afọ a na ebe nzukọ ndị ọzọ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya