Isi nke 16
Otú Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso
1. Olee ihe ndị yiri ibe ha na-apụta ìhè n’ọtụtụ okpukpe?
OTU onye na-eme njem nleta letara otu mba Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nwere ijuanya n’ihi ememe okpukpe ndị o kiriri n’otu ụlọ nsọ ndị Buddha. Ọ bụ ezie na ihe oyiyi ndị ahụ abụghị nke Meri ma ọ bụ Kraịst, ọtụtụ n’ime ememe ndị ahụ yiri ndị nke chọọchị ya n’ebe o si. Dị ka ihe atụ, ọ hụrụ iji rosarị eme ihe na ịgụ ekpere ka abụ. Ndị ọzọ ekwuwokwa ihe ndị yiri nke ahụ. N’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ma ọ bụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ụzọ ndị raara onwe ha nye na-esi agbalị ịbịaru Chineke ma ọ bụ ihe ndị ha na-efe ofufe nso yiri ibe ha nke ukwuu.
2. Olee otú e siworo kọwaa ekpere, n’ihi gịnịkwa ka ọtụtụ ndị ji ekpe ekpere?
2 Ọtụtụ na-agbalịkarị ịbịaru Chineke nso site n’ikpegara ya ekpere. A kọwawo ekpere dị ka “ihe omume nke mmadụ ikwunyere ihe dị nsọ—Chineke, chi dị iche iche, ógbè ndị a na-adịghị ahụ anya, ma ọ bụ ike ndị karịrị mmadụ—okwu.” (The New Encyclopædia Britannica) Otú ọ dị, mgbe a na-agakwuru Chineke n’ekpere, ụfọdụ na-eche echiche nanị n’akụkụ nke ihe ha pụrụ irite na ya. Dị ka ihe atụ, ọ dị mgbe otu nwoke jụrụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, sị: “Ọ bụrụ na i kpeere m ekpere, à ga-agwọta nsogbu ndị m nwere n’ezinụlọ m, n’ebe ọrụ, na banyere ahụ ike m?” O doro anya na nwoke ahụ chere otú ahụ, ma ọtụtụ ndị na-ekpe ekpere ma chọpụta na nsogbu ha na-adịgide. Ya mere anyị pụrụ ịjụ sị, ‘Gịnị mere anyị kwesịrị iji nnọọ bịaruo Chineke nso?’
IHE MERE E KWESỊRỊ IJI BỊARUO CHINEKE NSO
3. Ònye ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere, n’ihi gịnịkwa?
3 Ekpere abụghị ememe okpukpe na-enweghị isi, nke o ji abụkwanụ nanị ụzọ isi rite ihe. Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ mere e ji agakwuru Chineke bụ iji soro ya nwee mmekọrịta chiri anya. N’ihi nke ahụ ekpere anyị kwesịrị ịgara Jehova Chineke. “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku Ya,” ka ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru. (Abụ Ọma 145:18) Jehova na-akpọ anyị òkù ka anyị soro ya nwee mmekọrịta dị n’udo. (Aịsaịa 1:18) Ndị na-aza òkù a na-ekwenyere ọbụ abụ ahụ sịrị: “Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma.” N’ihi gịnị? N’ihi na ndị na-abịaru Jehova Chineke nso ga-enwe ezi obi ụtọ na udo nke uche.—Abụ Ọma 73:28.
4, 5. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ikpegara Chineke ekpere? (b) Mmekọrịta dị aṅaa ka anyị pụrụ iso Chineke wulite site n’ekpere?
4 Gịnị mere a ga-eji kpekuo Chineke ekpere maka enyemaka ma ọ bụrụ na ọ ‘matara ihe nile dị anyị mkpa, mgbe anyị a ka arịọghị’? (Matiu 6:8; Abụ Ọma 139:4) Ekpere na-egosi na anyị nwere okwukwe na Chineke ma na-ele ya anya dị ka Isi Iyi nke “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye.” (Jemes 1:17; Ndị Hibru 11:6) Ekpere anyị na-atọ Jehova ụtọ. (Ilu 15:8) Ọ na-eme ya obi ụtọ ịnụ okwu ekele na otuto anyị ndị bara uru, dị nnọọ ka nna na-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ nụrụ ka nwatakịrị ya kwuru okwu ekele ndị sitere n’ezi obi. (Abụ Ọma 119:108) Mgbe e nwere mmekọrịta dị mma nke nna na nwa, a na-enwe nkwurịta okwu na-ekpo ọkụ. Nwa nke a hụrụ n’anya na-achọ ikwunyere nna ya okwu. Otu ihe ahụ bụ eziokwu mgbe a bịara ná mmekọrịta anyị na Chineke. Ọ bụrụ na anyị nwere ekele n’ezie maka ihe anyị na-amụta banyere Jehova na ịhụnanya o gosiworo anyị, anyị ga-enwe ọchịchọ siri ike ikwupụta obi anyị n’ekpere nye ya.—1 Jọn 4:16-18.
5 Mgbe anyị na-agakwuru Chineke Kachasị Elu, anyị kwesịrị iji nkwanye ùgwù, ọ bụ ezie na ọ dịghị mkpa ichegbubiga onwe anyị ókè banyere kpọmkwem okwu ndị anyị ji eme ihe. (Ndị Hibru 4:16) Anyị nwere ohere mgbe nile ijekwuru Jehova. Leekwa aha ihe ùgwù ọ bụ na anyị nwere ike ‘ịwụsị obi anyị’ n’ihu Chineke n’ekpere! (Abụ Ọma 62:8) Obi ekele maka Jehova na-eduba n’iso ya nwee mmekọrịta na-ekpo ọkụ, dị ka nke ahụ nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Abraham nwere dị ka enyi Chineke. (Jemes 2:23) Ma mgbe anyị na-ekpegara Eze Onyenwe eluigwe na ala ekpere, anyị aghaghị ikwekọ n’ihe ndị ọ chọrọ maka ịbịakwute ya.
IHE NDỊ A CHỌRỌ MAKA ỊBỊARU CHINEKE NSO
6, 7. Ọ bụ ezie na Chineke adịghị achọ ka a kwụọ ụgwọ ka o wee nụ ekpere anyị, gịnị ka ọ na-achọ n’aka anyị mgbe anyị na-ekpe ekpere?
6 Ego ọ̀ dị mkpa iji gakwuru Chineke? Ọtụtụ ndị na-akwụ ndị ụkọchukwu ụgwọ ka e kpeere ha ekpere. Ọbụna na ụfọdụ kwere na a ga-anụ ekpere ha ná ndabere nke otú onyinye ha nyere hà. Otú ọ dị, Okwu Chineke ekwughị na a chọrọ onyinye ego ka anyị wee gakwuru Jehova n’ekpere. A na-enweta ihe ime mmụọ ndị ọ na-enye na ngọzi nile nke iso ya nwee mmekọrịta n’ekpere n’akwụghị ụgwọ.—Aịsaịa 55:1, 2.
7 Mgbe ahụ, gịnị ka a chọrọ? Ọnọdụ obi ziri ezi bụ otu ihe dị mkpa. (2 Ihe Emere 6:29, 30; Ilu 15:11) N’ime obi anyị anyị aghaghị igosipụta okwukwe na Jehova Chineke dị ka “Onye na-anụ ekpere” na “Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” (Abụ Ọma 65:2; Ndị Hibru 11:6) Anyị aghaghịkwa inwe obi dị umeala. (2 Ndị Eze 22:19; Abụ Ọma 51:17) N’otu ihe atụ ya, Jisọs Kraịst gosiri na mgbe ha na-abịakwute Chineke otu ọna ụtụ dị obi umeala nke nwere ọnọdụ obi dị ala bụ onye a gụrụ n’onye ezi omume karịa onye Farisii obi ya dị elu. (Luk 18:10-14) Mgbe anyị naagakwuru Chineke n’ekpere, ka anyị cheta na “ihe arụ n’anya Jehova ka onye ọ bụla bụ nke obi ya dị elu.”—Ilu 16:5.
8. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke zaa ekpere anyị, gịnị ka anyị na-aghaghị ime onwe anyị ka anyị dị ọcha pụọ na ya?
8 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke zaa ekpere anyị, ọ dị anyị mkpa ịsachapụ onwe anyị àgwà mmehie. Mgbe Jemes onye na-eso ụzọ gbara ndị ọzọ ume ka ha bịaruo Chineke nso, ọ gbakwụnyere: “Meenụ ka aka unu dị ọcha, unu ndị mmehie; meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị nwere uche abụọ.” (Jemes 4:8) Ọbụna ndị mmehie pụrụ ịbata ná mmekọrịta dị n’udo ha na Jehova ma ọ bụrụ na ha echegharịa ma hapụ ụzọ ndụ ha na mbụ. (Ilu 28:13) Jehova apụghị ịṅa anyị ntị ma ọ bụrụ na nanị ihe anyị na-eme bụ ime ka a ga-asị na anyị emewo ka ụzọ anyị dị ọcha. “Anya abụọ nke Onyenwe anyị dị n’ahụ ndị ezi omume, ntị ya abụọ dịkwa n’ebe arịrịọ ha dị: ma ihu nke Onyenwe anyị dịgidere ndị na-eme ihe ọjọọ,” ka Okwu Chineke na-ekwu.—1 Pita 3:12.
9. Site n’ònye ka anyị kwesịrị ịgakwuru Jehova, n’ihi gịnịkwa?
9 Bible na-asị: “Ọ dịghị onye ezi omume n’ụwa, nke na-eme ezi ihe, na-adịghị emehiekwa.” (Eklisiastis 7:20) Ya mere ị pụrụ ịjụ sị: ‘Mgbe ahụ, olee otú anyị pụrụ isi gakwuru Jehova Chineke?’ Bible na-aza: “Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emehie, anyị nwere otu Onye na-ekwu ọnụ anyị n’ebe Nna anyị nọ, Ya bụ Jisọs Kraịst, bụ́ Onye ezi omume.” (1 Jọn 2:1) Ọ bụ ezie na anyị bụ ndị mmehie, anyị pụrụ ịgakwuru Chineke ná nkwuwa okwu site na Jisọs Kraịst, onye nwụrụ dị ka ihe mgbapụta maka anyị. (Matiu 20:28) Ọ bụ ụzọ e nwere nanị ya nke anyị pụrụ isi gakwuru Jehova Chineke. (Jọn 14:6) Anyị agaghị ma ọlị eji uru nke àjà mgbapụta Jisọs kpọrọ ihe nkịtị ma mara ụma na-eme mmehie. (Ndị Hibru 10:26) Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị na-eme ihe nile anyị pụrụ ime iji zere ihe ọjọọ ma n’agbanyeghị nke ahụ na-ehie ụzọ mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ ichegharị ma rịọ Chineke maka mgbaghara. Mgbe anyị gakwuuru ya n’obi dị umeala, ọ ga-anụ olu anyị.—Luk 11:4.
OHERE DỊ ICHE ICHE IJI GWA CHINEKE OKWU
10. Mgbe a bịara n’ekpere, olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jisọs, oleekwa oge ụfọdụ maka ekpere onwe onye nanị?
10 Jisọs Kraịst ji mmekọrịta ya na Jehova kpọrọ oké ihe. Ya mere, Jisọs wepụtara oge iji gwa Chineke okwu n’ekpere onwe onye. (Mak 1:35; Luk 22:40-46) Anyị ga-eme nke ọma iṅomi ihe nlereanya Jisọs ma na-ekpegara Chineke ekpere mgbe mgbe. (Ndị Rom 12:12) O kwesịrị ekwesị iji okwu ekpere malite ụbọchị, tupu a lakpuokwa ụra, anyị pụrụ n’izi ezi ikele Jehova maka ọrụ ndị a rụrụ n’ụbọchị ahụ. Mgbe ụbọchị na-aga, kpebisie ike ịgakwuru Chineke “n’oge nile.” (Ndị Efesọs 6:18) Anyị pụrụ ọbụna ikpe ekpere n’ime obi anyị n’ekwupụtaghị okwu, na-amara na Jehova pụrụ ịnụ olu anyị. Ịgwa Chineke okwu mgbe mmadụ nọ nanị ya na-enyere anyị aka ime ka mmekọrịta anyị na ya sie ike, ikpegakwara Jehova ekpere kwa ụbọchị na-enyere anyị aka ịdị na-abịarukwu ya nso karị.
11. (a) N’ihi gịnị ka ezinụlọ kwesịrị iji na-ekpekọ ekpere ọnụ? (b) Gịnị ka ọ pụtara mgbe i kwuru “Amen” ná ngwụsị ekpere?
11 Jehova na-egekwa ntị n’ekpere ndị e kpere n’isi ìgwè mmadụ. (1 Ndị Eze 8:22-53) Anyị pụrụ ịbịaru Chineke nso dị ka ezinụlọ, ebe onye isi ezinụlọ ahụ na-edu n’ekpere. Nke a na-eme ka njikọ ezinụlọ siwanye ike, Jehova na-abụkwa onye dị adị n’ezie nye ndị na-eto eto ka ha na-anụ ka ndị mụrụ ha na-eji obi dị umeala na-ekpegara Chineke ekpere. Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ na-anọchite anya ìgwè mmadụ n’ekpere, ma eleghị anya ná nzukọ Ndịàmà Jehova? Ọ bụrụ na anyị nọ n’ebe ahụ, ka anyị ṅaa ntị nke ọma ka ọ ga-abụ na mgbe ekpere ahụ gwụrụ, anyị pụrụ iji obi anyị dum kwuo “Amen,” nke pụtara “Ka ọ dị otú ahụ.”—1 Ndị Kọrint 14:16.
EKPERE NDỊ JEHOVA NA-ANỤ
12. (a) N’ihi gịnị ka Chineke na-adịghị aza ekpere ụfọdụ? (b) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ịtụkwasị uche nanị ná mkpa onwe onye mgbe anyị na-ekpe ekpere?
12 Ụfọdụ pụrụ iche na Chineke adịghị aza ekpere ha n’agbanyeghị na ha na-ekpegara ya ekpere n’aha Kraịst. Otú ọ dị, Jọn onyeozi sịrị: “Ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọ bụla dị ka ọchịchọ [Chineke] si dị, Ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịrịọ dị ka ọchịchọ Chineke si dị. Ebe o nwere mmasị n’ọdịmma ime mmụọ anyị, ihe ọ bụla na-emetụta ọnọdụ ime mmụọ anyị bụ isiokwu kwesịrị ikpe n’ekpere. Anyị aghaghị iguzogide ọnwụnwa nke ịtụkwasị uche kpam kpam ná mkpa anụ ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na o kwesịrị ekwesị ikpe ekpere maka nghọta na obi ike iji nagide ọrịa, nchekasị maka ahụ ike ekwesịghị ikpuchi mmasị n’ihe ime mmụọ. (Abụ Ọma 41:1-3) Mgbe ọ mataworo na o nwere nchegbu gabigara ókè banyere ahụ ike ya, otu nwanyị bụ́ onye Kraịst rịọrọ Jehova maka enyemaka inwe echiche ziri ezi banyere ọrịa ya. N’ihi ya, nsogbu ahụ ike ya ghọrọ okwu dị nta karị, o nwekwara mmetụta nke na e nyere ya “ọkịka nke ike.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Ọchịchọ ya ịbụ ihe enyemaka ime mmụọ nye ndị ọzọ siwanyere ike, ọ ghọkwara onye nkwusa oge nile nke Alaeze.
13. Dị ka e gosiri na Matiu 6:9-13, olee isiokwu ụfọdụ kwesịrị ekwesị anyị pụrụ itinye n’ekpere anyị?
13 Gịnị ka anyị pụrụ itinye n’ekpere anyị ka Jehova wee nwee obi ụtọ ịnụ ha? Jisọs Kraịst kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ụzọ isi kpee ekpere. N’ekpere ihe atụ ahụ e dekọrọ na Matiu 6:9-13, o setịpụrụ ụkpụrụ nke isiokwu dị iche iche ndị anyị pụrụ ikpe ekpere n’izi ezi banyere ha. Gịnị kwesịrị ịbụ isi nchegbu n’ekpere anyị? Aha na Alaeze Jehova Chineke aghaghị ibute nnọọ ụzọ. Ịrịọ maka mkpa ihe onwunwe anyị kwesịrị ekwesị. Ọ dịkwa mkpa ịrịọ maka mgbaghara mmehie anyị na maka mgbapụta pụọ n’ọnwụnwa na n’aka ajọ onye ahụ, bụ́ Setan Ekwensu. Jisọs achọghị ka anyị na-agụ ekpere a ka egwú ma ọ bụ na-ekpeghachi ya ugboro ugboro, na-agụ ya n’echeghị echiche banyere ihe ọ pụtara. (Matiu 6:7) Olee ụdị mmekọrịta ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na nwatakịrị ejiri otu okwu ndị ahụ na-eme ihe kwa oge ọ na-agwa nna ya okwu?
14. E wezụga arịrịọ dị iche iche, ekpere dịgasị aṅaa ka anyị kwesịrị ikpe?
14 E wezụga arịrịọ dị iche iche sitere n’obi na ndị e ji ịkwa ákwá kpee, anyị kwesịrị ikpe ekpere otuto na ekele. (Abụ Ọma 34:1; 92:1; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:18) Anyị pụkwara ikpere ndị ọzọ ekpere. Ekpere banyere ụmụnna ime mmụọ anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị a na-emekpa ahụ ma ọ bụ na-akpagbu na-egosi mmasị anyị n’ebe ha nọ, Jehova na-enwekwa obi ụtọ ịnụ ka anyị kwupụtara nchegbu dị otú ahụ. (Luk 22:32; Jọn 17:20; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:25) N’ezie, Pọl onyeozi dere, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.
NỌGIDESIE IKE N’EKPERE
15. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na ekpere anyị eyie ka ọ bụ na a zaghị ha?
15 Ọ bụ ezie na ị na-enweta ihe ọmụma banyere Chineke, ọ pụrụ ịdị gị ka ọ bụ na a dịghị aza ekpere gị mgbe ụfọdụ. Nke a pụrụ ịdị otú ahụ n’ihi na ọ pụrụ ịbụ na ọ bụghị oge Chineke ịza otu ekpere kpọmkwem. (Eklisiastis 3:1-9) Jehova pụrụ ikwere ka otu ọnọdụ dịruo oge ụfọdụ, ma ọ na-aza nnọọ ekpere, marakwa oge kasị mma ime otú ahụ.—2 Ndị Kọrint 12:7-9.
16. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-anọgidesi ike n’ekpere, oleekwa otú ime nke ahụ pụrụ isi metụta mmekọrịta anyị na Chineke?
16 Nnọgidesi ike anyị n’ekpere na-ekpughe mmasị anyị sitere n’obi n’ihe anyị na-agwa Chineke. (Luk 18:1-8) Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịrịọ Jehova maka enyemaka imeri otu adịghị ike. Site n’ịnọgidesi ike n’ekpere na ime ihe kwekọrọ n’arịrịọ anyị, anyị na-egosi ezi obi anyị. Anyị kwesịrị ịdị na-akpọ okwu aha ma na-ekwu eziokwu n’arịrịọ anyị. Ọ dị mkpa karịsịa ikpesi ekpere ike mgbe anyị na-eche ọnwụnwa ihu. (Matiu 6:13) Ka anyị nọgidere na-ekpe ekpere mgbe anyị na-agbalị ịchịkwa mkpali ime mmehie anyị, anyị ga-ahụ ụzọ Jehova si enyere anyị aka. Nke a ga-ewulite okwukwe anyị ma mee ka mmekọrịta anyị na ya siwanye ike.—1 Ndị Kọrint 10:13; Ndị Filipaị 4:13.
17. Olee otú anyị ga-esi rite uru n’àgwà ikpe ekpere n’ijere Chineke ozi?
17 Site n’ịzụlite àgwà ikpe ekpere n’ijere Jehova Chineke ozi dị nsọ, anyị ga-aghọta na anyị adịghị ejere ya ozi n’ike aka anyị. Ọ bụ Jehova bụ onye na-ahụ na e mere ihe. (1 Ndị Kọrint 4:7) Ịmata nke a ga-enyere anyị aka ịdị obi umeala, meekwa ka mmekọrịta anyị na ya ka mma. (1 Pita 5:5, 6) Ee, anyị nwere ihe ndị siri ike mere anyị ga-eji na-anọgidesi ike n’ekpere. Ekpere anyị ndị sitere n’ala ala obi na ihe ọmụma dị oké ọnụ ahịa nke ụzọ anyị pụrụ isi bịaruo Nna eluigwe anyị na-ahụ n’anya nso ga-eme ka ndụ anyị bụrụ nke obi ụtọ n’ezie.
ISO JEHOVA EKWURỊTA OKWU ADỊGHỊ AGA OTU AKỤKỤ
18. Olee otú anyị pụrụ isi ṅaa Chineke ntị?
18 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nụ ekpere anyị, anyị aghaghị ige ntị n’ihe ọ na-ekwu. (Zekaraịa 7:13) Ọ nakwaghị ezite ozi ya site ná ndị amụma Chineke nyere ike mmụọ nsọ, ọ dịghịkwa ma ọlị eji ụzọ mgbaasị dị iche iche eme ihe. (Deuterọnọmi 18:10-12) Ma anyị pụrụ ige Chineke ntị site n’ịmụ Okwu ya, bụ́ Bible. (Ndị Rom 15:4; 2 Timoti 3:16, 17) Dị nnọọ ka anyị pụrụ inwe mkpa ịzụlite akpịrị maka nri nkịtị nke dị anyị mma, a na-agba anyị ume “ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi [anyị] ike.” Zụlite akpịrị maka nri ime mmụọ site n’ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị.—1 Pita 2:2, 3; Ọrụ 17:11.
19. Olee uru ịtụgharị uche n’ihe ị na-agụta na Bible bara?
19 Tụgharịa uche n’ihe ị na-agụta na Bible. (Abụ Ọma 1:1-3; 77:11, 12) Nke ahụ pụtara ịchịgharị ihe ahụ n’uche. Ị pụrụ iji ya tụnyere igweri nri. Ị pụrụ igweri nri ime mmụọ site n’iji ihe ị gụtara tụnyere ihe ị matawororịị. Tụlee ụzọ ihe ahụ si emetụta ndụ gị, ma ọ bụ chee banyere ihe ọ na-ekpughe banyere àgwà na mmeso dị iche iche nke Jehova. Otú a site n’ọmụmụ ihe onwe onye, ị pụrụ iri nri ime mmụọ nke Jehova na-enye. Nke a ga-adọta gị nso n’ebe Chineke nọ ma nyere gị aka iche nsogbu ndị a na-enwe kwa ụbọchị ihu.
20. Olee otú ịga nzukọ ndị Kraịst si enyere anyị aka ịbịaru Chineke nso?
20 Ị pụkwara ịbịaru Chineke nso site n’ige ntị n’Okwu ya mgbe a na-atụle ya ná nzukọ ndị Kraịst, dị nnọọ ka ndị Israel gere ntị nke ọma mgbe ha zukọrọ ịnụ ngụpụta ihu ọha nke Iwu Chineke. Ndị nkụzi n’oge ahụ tinyere nghọta n’ọgụgụ ha nke Iwu ahụ, si otú ahụ na-enyere ndị na-ege ha ntị aka ịghọta ma bụrụ ndị a kwaliri itinye ihe ha nụrụ n’ọrụ. Nke a dugara n’ọṅụ dị ukwuu. (Nehemaịa 8:8, 12) Ya mere mee ya omenala gị ịga nzukọ Ndịàmà Jehova. (Ndị Hibru 10:24, 25) Nke a ga-enyere gị aka ịghọta na itinyezi ihe ọmụma Chineke n’ọrụ ná ndụ gị, ọ ga-ewetakwara gị obi ụtọ. Ịbụ akụkụ nke òtù ụmụnna ndị Kraịst nke zuru ụwa ọnụ ga-enyere gị aka ịnọ Jehova nso. Dịkwa ka anyị ga-ahụ, ị pụrụ ịchọta ezi ịnọ ná ntụkwasị obi n’etiti ndị Chineke.
NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ
N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji bịaruo Jehova nso?
Olee ụfọdụ n’ihe ndị a chọrọ maka ịbịaru Chineke nso?
Gịnị ka ị pụrụ itinye n’ekpere gị?
N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji nọgidesie ike n’ekpere?
Olee otú ị pụrụ isi gee Jehova ntị taa?
[Foto dị na peeji nke 157]