Lee Anya Gabiga Ihe Ndị Ị Na-ahụ!
ỌHỤHỤ ụzọ nkịtị dị mma bụ ngọzi. N’ezie, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ga-asị na ọ bụ ihe ole na ole ha nwere karịrị ya n’ịdị oké ọnụ ahịa. Otú ọ dị, nye ndị Kraịst, e nwere ụdị ọhụhụ ụzọ nke Pọl onyeozi kwuru banyere ya bụ́ nke bara uru karịa ọbụna ọhụhụ ụzọ nkịtị dị mma. ‘Anyị adịghị ele ihe a na-ahụ anya, kama ihe a na-adịghị ahụ anya,’ ka Pọl dere. (2 Ndị Kọrint 4:18) Ọ ghaghị ịbụ ụdị ịhụ ụzọ pụrụ iche nke na-eme ka mmadụ nwee ike ịhụ ihe ndị a na-adịghị ahụ anya! Anyị pụrụ ịkpọ ya ụdị ịhụ ụzọ ime mmụọ bụ ịgba.
N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Mkpa Ahụ?
Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ nọ n’ezigbote mkpa nke inwe ụdị ọhụhụ ụzọ ime mmụọ a. Ha nọ na-eje ozi ndị Kraịst ha n’okpuru oké ihe isi ike. Pọl si otú a tinye ya: “A na-akpagbu anyị n’akụkụ nile, ma a dịghị akpagbubiga anyị ókè; anyị nwere obi abụọ, ma anyị adịghị enwebiga obi abụọ ókè; a na-esogbu anyị, ma a dịghị ahapụ nanị anyị; a na-atụda anyị n’ala, ma a dịghị ala anyị n’iyi.”—2 Ndị Kọrint 4:8, 9.
N’agbanyeghị ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ndị ahụ na-eso ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi guzosiri ike. N’inwe okwukwe siri ike na Chineke, ha pụrụ ikwu dị ka Pọl kwuru, sị: “Ike agwụghị anyị n’obi; kama a sị na ọ bụ ezie na mmadụ elu ahụ anyị na-ere ure, ma a na-eme ka mmadụ ime anyị bụrụ ihe ọhụrụ kwa ụbọchị.” Otú ọ dị, gịnị kpatara ndịghachi ọhụrụ a kwa ụbọchị? Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “N’ihi na mkpagbu anyị nke dị mfe, nke dị na nwa oge a, na-arụpụtara anyị ebube nke ukwuu hie nne kachasị ihe nile, bụ́ ebube nke dị arọ dịkwa ebighị ebi; ebe anyị na-adịghị ele ihe a na-ahụ anya, kama ihe a na-adịghị ahụ anya: n’ihi na ihe a na-ahụ anya na-adịru nwa oge; ma ihe a na-adịghị ahụ anya dị ebighị ebi.”—2 Ndị Kọrint 4:16-18.
Pọl na-agba ụmụnna ime mmụọ ya ume ka ha ghara ikwe ka nsogbu, ihe isi ike, mkpagbu—mkpagbu n’ụdị ọ bụla—kpuchie ọhụhụ ha na-ahụ nkwụghachi ụgwọ ahụ dị ebube nke e debeworo n’ihu ha. Ha kwesịrị ile anya gabiga ọnọdụ ha nile n’oge ahụ, na-elekwasị anya ha n’ihe obi ụtọ ga-esi n’ụzọ ndị Kraịst pụta. Ọ bụ ihe nyeere ha aka ime ka mkpebisi ike ha ịga n’ihu n’agha ahụ na-adị ọhụrụ kwa ụbọchị. Ndị Kraịst taa n’otu aka ahụ nọ ná mkpa nke inwe ụdị ọhụhụ ụzọ ime mmụọ dị mma otú ahụ.
Were Mkpagbu Ndị Dị Ugbu A Dị Ka Ihe Na-adịru Nwa Oge!
Ma ọ sọrọ gị ma ọ sọghị gị, kwa ụbọchị anyị na-ahụ ihe ndị ọ ga-aka masị anyị ka anyị ghara ịhụ. Ọ bụrụ na anyị elee otu nle anya n’enyo, anyị ga-ahụrịrị ntụpọ nke anụ ahụ ndị anyị na-enweghị mmasị na ha, ihe ndị na-egosi ezughị okè nke anụ ahụ. Mgbe anyị nyobara anya n’enyo nke Okwu Chineke, anyị na-ahụ ntụpọ ime mmụọ dị iche iche ma n’ime onwe anyị ma n’ime ndị ọzọ. (Jemes 1:22-25) Mgbe anyị lebakwara anya n’akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa ụbọchị ma ọ bụ n’ihe nkiri telivishọn, a na-adọrọ uche anyị gaa n’akụkọ dị iche iche nke ikpe na-ezighị ezi, mmekpọ ọnụ, na ọdachi, ha na-ewutekwa anyị.
Setan ga-achọ ịkpatara anyị obi nkoropụ n’ihi ihe ndị anyị na-ahụ ma ọ bụ ghọọ ndị a dọpụrụ uche ha wee malite ịzọjọgharị ụkwụ n’okwukwe. Ànyị pụrụ isi aṅaa gbochie nke a ime? Anyị ga-agbasorịrị ihe nlereanya Jisọs Kraịst setịpụrụ, dị ka Pita onyeozi tụrụ aro ya mgbe ọ sịrị: “N’ihi na a kpọrọ unu ime nke a: n’ihi na Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka unu wee soo ijeụkwụ Ya nile.” (1 Pita 2:21) N’akụkụ nile nke ndụ ndị Kraịst, Jisọs bụ ihe nlereanya zuru okè.
N’izo aka n’ebe Jisọs nọ dị ka ihe ilereanya anyị, Pita kwuru kpọmkwem na Jisọs hụrụ ahụhụ. N’ezie, Jisọs hụrụ ahụhụ dị ukwuu mgbe ọ nọ n’elu ala. Dị ka “onye ọkà” Jehova nke nọ ya mgbe e kere ihe a kpọrọ mmadụ, ọ maara kpọmkwem ihe Chineke zubere ka mmadụ bụrụ. (Ilu 8:30, 31) Ma ugbu a ọ hụrụ n’onwe ya ihe mmehie na ezughị okè meworo ka ha ghọọ. Kwa ụbọchị ọ hụrụ ma gbasoo ezughị okè na adịghị ike ndị mmadụ mgba. Ọ ghaghị ịbụworo ya ule siri ike.—Matiu 9:36; Mak 6:34.
E wezụga mkpagbu nke ndị ọzọ, Jisọs nwetakwara nke ya. (Ndị Hibru 5:7, 8) Ma site n’ọhụhụ ụzọ ime mmụọ zuru okè, o lere anya gabiga ha iji hụ nkwụghachi ụgwọ nke ịbụ onye e buliri gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’ihi ụzọ nguzosi ike n’ezi ihe ya. Mgbe ahụ dị ka Eze Mesaịa, ọ ga-enwe ihe ùgwù nke ịdọpụta ihe a kpọrọ mmadụ nọ ná nsogbu site n’ọnọdụ ya e wedara n’ala baghachi n’izu okè ahụ nke Jehova zubere na mbụ. Ilekwasị anya ya n’olileanya ọdịnihu ndị a anya na-adịghị ahụ nyeere ya aka ịnọgide na-enwe ọṅụ n’ozi Chineke n’agbanyeghị mkpagbu ndị ọ hụrụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị. Pọl mesịrị dee, sị: “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya na-atachi obi [n’elu osisi ịta ahụhụ, NW] Ya, na-elelị ihere anya, O wee nọdụ n’aka nri nke ocheeze Chineke.”—Ndị Hibru 12:2.
Jisọs adịghị mgbe o kwere ka ihe isi ike nile na ọnọdụ ndị na-etinye mmadụ n’ule kpatara ya obi nkoropụ, ghọọ onye a dọpụrụ uche ya, ma ọ bụ zọjọgharịa ụkwụ n’okwukwe ya. Dị ka ndị na-eso ụzọ ya, anyị ga-agbasorịrị ihe nlereanya ya magburu onwe ya n’ụzọ chiri anya.—Matiu 16:24.
Lekwasị Anya n’Ihe Ndị Na-adịru Ebighị Ebi Ndị A Na-adịghị Ahụ Anya!
N’ikwu okwu banyere ihe mere ka Jisọs nwee ike ịtachi obi, Pọl gosipụtakwara ụzọ anyị ga-agbaso mgbe o dere, sị: “Ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, na-elegide Jisọs anya, bụ́ onye ndú na onye mmezu nke okwukwe anyị.” (Ndị Hibru 12:1, 2) Ee, iji gbaa ọsọ ndị Kraịst nke ọma na n’ọṅụ, anyị aghaghị ile anya gabiga ihe ndị dị anyị nnọọ n’ihu. Ma olee otú anyị si ‘elegide’ Jisọs anya, gịnịkwa ka nke ahụ ga-emere anyị?
Otu bụ na, na 1914, e chiri Jisọs echichi dị ka Eze nke Alaeze Chineke, ọ na-achịkwa site n’eluigwe. N’ezie, anya nkịtị anyị adịghị ahụ ihe a nile. Ma, ọ bụrụ na anyị ‘elegide’ Jisọs anya, ọhụhụ ụzọ ime mmụọ anyị ga-enyere anyị aka ịhụ na o jikerela ugbu a ime ihe iji weta ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe nke dị ugbu a na ịtụnye Setan na ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ya n’agbụ nke arụghị ọrụ. N’ilepụkwu anya n’ihu, ọhụhụ ụzọ ime mmụọ anyị ga-eme ka anyị hụ ụwa ọhụrụ ahụ dị ebube ebe “ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 19:11-16; 20:1-3; 21:4.
Ya mere, kama ịbụ ndị mkpagbu na-adịru nwa oge ndị anyị pụrụ ịdị na-eche ihu kwa ụbọchị nyịdara, gịnị ma anyị lekwasị anya anyị n’ihe ndị na-adịru ebighị ebi? N’iji anya nke okwukwe, gịnị ma i lee anya gabiga ọrịa na anyaukwu dị n’ụwa a e metọrọ emetọ iji hụ paradaịs nke jupụtara ná ndị ahụ siri ike, na-enwe obi ụtọ, ndị na-eche banyere ndị ọzọ? Gịnị ma i lee anya gabiga ntụpọ anyị nile, ma nke anụ ahụ ma nke ime mmụọ, wee hụ ka a tọpụrụ anyị pụọ na ha ruo mgbe ebighị ebi site n’uru àjà mgbapụta Kraịst? Gịnị ma i lee anya gabiga mbibi nke agha, mpụ, na ime ihe ike kpatara wee hụ ka a na-ezi ndị ọhụrụ a kpọlitere n’ọnwụ ihe n’udo na ezi omume Jehova?
Tụkwasị, ‘ilegide’ Jisọs anya ga-agụnyekwa ilekwasị anya ime mmụọ anyị n’ihe Alaeze ahụ, ọ bụ ezie na a dịghị ahụ ya anya, mezuwororị n’etiti ndị Chineke n’elu ala: ịdị n’otu, udo, ịhụnanya, ịhụnanya ụmụnna, na ọganihu ime mmụọ. Otu nwanyị onye Kraịst na Germany, mgbe o kirisịrị vidio bụ́ United by Divine Teaching, dere, sị: “Vidio ahụ ga-enyere m aka n’ụzọ na-ebuwanye ibu iburu n’uche na ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị bụ́ ndị Kraịst n’ụwa nile ji iguzosi ike n’ihe na-ejere Jehova ozi ugbu a—na-emekwa otú a n’agbanyeghị mmeghachi omume ọha na eze. Lee ka ịdị n’otu ụmụnna anyị n’ime ụwa nke ime ihe ike na ịkpọasị si dị oké ọnụ ahịa!”
Gị onwe gị kwa, ị̀ “na-ahụ” Jehova, Jisọs, ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi, na ọtụtụ nde ndị Kraịst ibe anyị ka ha guzo gị n’akụkụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ị gaghị echegbubiga onwe gị ókè banyere “nchegbu nke oge a” bụ́ nke pụrụ ime ka ị tọkịrị ná nkụda obi wee mee ka ị ghọọ onye “na-amịghị mkpụrụ” n’ozi ndị Kraịst. (Matiu 13:22) Ya mere ‘legide’ Jisọs anya site n’ilekwasị anya ime mmụọ gị n’Alaeze Chineke e guzobeworo na ngọzi ya nile, ma ndị dị ugbu a ma nke ọdịnihu.
Dịrị Ndụ Iji Hụ Ihe A Na-adịghị Ahụ Anya!
N’ịhụ ọdịiche doro anya dị n’agbata ụwa ọhụrụ ebighị ebi nke Chineke na ụwa ochie na-adakpọ adakpọ nke taa, e kwesịrị ịkpali anyị ịkpa àgwà n’ụzọ ga-eme ka a gụọ anyị ná ndị ruru eru ịdị ndụ hụ n’ụzọ nkịtị ihe ndị anyị pụrụ nanị iji anya nke okwukwe hụ taa. Ọ ga-esiri ọtụtụ ìgwè mmadụ ndị e si n’ọnwụ kpọlite ike ikweta ihe anya ha ga-ahụ mgbe ha bilitere ịhụ elu ala paradaịs ezi omume nke dị nnọọ iche n’ụwa ha hụrụ tupu ha anwụọ. Cheedị echiche ọṅụ anyị ga-enwe n’ịdị ndụ iji zute ha ma kọwaara ha ihe Chineke meworo!—Tụlee Joel 2:21-27.
Ee, lee ka ọhụhụ ụzọ dị mma nke ime mmụọ si bụrụ ihe dị oké ọnụ ahịa, ka o sikwa dị mkpa ịnọgide na-eme ka ọ dị nkọ! Anyị pụrụ ime nke a site n’ịdị na-amụchi ọmụmụ Bible onwe onye anya, ije nzukọ ndị Kraịst, ịgwa ndị ọzọ banyere olileanya anyị dabeere na Bible, na karịsịa, ikpe ekpere maka nduzi Chineke. Nke a ga-eme ka ọhụhụ ụzọ ime mmụọ anyị nọgide na-adị nkọ ma na-ahụ ụzọ nke ọma, na-eme ka anyị nwee ike ile anya gabiga ihe ndị anyị na-ahụ!