Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • kl isi 5 p. 43-52
  • Ofufe Ole Ndị Ka Chineke Na-anakwere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ofufe Ole Ndị Ka Chineke Na-anakwere?
  • Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • FEE OFUFE N’IME MMỤỌ NA EZIOKWU
  • IME IHE NNA ANYỊ NA-ACHỌ
  • EZI IHE ỌMỤMA​—⁠IHE NCHEBE
  • IHE MMADỤ NYERE N’IWU DỊ KA OZIZI
  • NỌRỌ NA NCHE MEGIDE IMEJỌ CHINEKE
  • DEBE ỤKPỤRỤ NDỊ DỊ ELU NKE CHINEKE
  • OFUFE SI N’OBI DUM
  • Otú E Kwesịrị Isi Na-efe Chineke
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ife Jehova Otú Ọ Chọrọ Ga-eme Ka Anyị Na-enwekwu Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ṅomie Jizọs Site n’Ife Chineke Otú Dị Ya Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
kl isi 5 p. 43-52

Isi nke 5

Ofufe Ole Ndị Ka Chineke Na-anakwere?

1. Gịnị ka otu nwanyị Sameria chọrọ ịmata banyere ofufe?

Ọ̀ DỊWO mgbe ị jụrụ sị, ‘Ofufe ònye ka Chineke na-anakwere?’ Ajụjụ dị otú a pụrụ ịbatawo n’uche otu nwanyị mgbe ya na Jisọs Kraịst kwurịtara okwu na nso Ugwu Geraịzim na Sameria. N’ịdọrọ uche gaa n’ọdịiche dị n’etiti ofufe ndị Sameria na nke ndị Juu, ọ sịrị: “Nna anyị ha nile kpọrọ isiala nye Chineke n’ugwu a; ma unu onwe unu sị, na ebe mmadụ aghaghị ịkpọ isiala nye Chineke dị n’ime Jerusalem.” (Jọn 4:20) Jisọs ọ̀ gwara nwanyị Sameria ahụ na Chineke na-anakwere ofufe nile? Ka ò kwuru na a chọrọ ihe ụfọdụ kpọmkwem iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ?

2. N’ịzaghachi nwanyị Sameria ahụ, gịnị ka Jisọs kwuru?

2 Nzaghachi na-eju anya nke Jisọs bụ: “Oge hour na-abịa, mgbe unu na-agaghị akpọ isiala nye Nna m, ma ọ bụ n’ugwu a, ma ọ bụ na Jerusalem.” (Jọn 4:21) Eri ogologo oge ndị Sameria atụwo egwu Jehova ma fee chi ndị ọzọ n’Ugwu Geraịzim. (2 Ndị Eze 17:33) Ugbu a Jisọs Kraịst kwuru na ma ebe ahụ ma Jerusalem enweghị nke ga-adị mkpa n’ezi ofufe.

FEE OFUFE N’IME MMỤỌ NA EZIOKWU

3. (a) N’ihi gịnị ka ndị Sameria ji ghara ịma Chineke n’ezie? (b) Olee otú ndị Juu na-ekwesị ntụkwasị obi na ndị ọzọ pụrụ isi bịa mara Chineke?

3 Jisọs gara n’ihu ịgwa nwanyị Sameria ahụ, sị: “Unu onwe unu na-akpọ isiala nye ihe unu na-amataghị: anyị onwe anyị na-akpọ isiala nye ihe anyị matara: n’ihi na nzọpụta si n’etiti ndị Juu pụta.” (Jọn 4:22) Ndị Sameria nwere echiche okpukpe ndị bụ ụgha ma nakwere nanị akwụkwọ ise mbụ nke Bible dị ka ndị sitere n’ike mmụọ nsọ​—⁠ndị a bụkwa nanị n’ụdị nke ha hazigharịrị bụ́ nke a maara dị ka Pentateuch nke ndị Sameria. Ya mere, ha amaghị Chineke n’ezie. Otú ọ dị, e nyewo ndị Juu ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ n’aka idebe. (Ndị Rom 3:​1,2) Akwụkwọ Nsọ nyere ndị Juu na-ekwesị ntụkwasị obi na ndị ọ bụla ọzọ ga-aṅa ntị ihe dị ha mkpa iji mara Chineke.

4. Dị ka Jisọs kwuru, gịnị ka ọ dị ma ndị Juu ma ndị Sameria mkpa ime ma ọ bụrụ na Chineke ga-anakwere ofufe ha?

4 N’ezie, Jisọs gosiri na ma ndị Juu ma ndị Sameria gaje ịgbanwe ụzọ ofufe ha iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ. Ọ sịrị: “Oge hour na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye Ya. Chineke bụ Mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye Ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:​23, 24) Ọ dị anyị mkpa ife Chineke “n’ime mmụọ,” bụrụ ndị obi jupụtara n’okwukwe na ịhụnanya na-akpali. O kwere omume ife Chineke ‘n’eziokwu’ site n’ịmụ Okwu ya, bụ́ Bible, na site n’ife ya n’ikwekọ n’eziokwu ya e kpughere ekpughe. Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ime nke ahụ?

5. (a) Gịnị ka “ofufe” pụtara? (b) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nakwere ofufe anyị?

5 Jisọs kwusiri ike na Chineke na-achọ ezi ofufe. Nke a na-egosi na e nwere ụdị ofufe ndị Jehova na-adịghị anakwere. Ife Chineke ofufe pụtara inye ya nsọpụrụ okpukpe na ijere ya ozi dị nsọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ inye onye ọchịchị dị ike nsọpụrụ, o yikarịrị ka ị ga-anụ ọkụ n’obi ijere ya ozi na ime ihe ga-atọ ya ụtọ. Mgbe ahụ, n’ezie, anyị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. Kama ikwu nanị n’ọnụ sị, ‘Okpukpe m dị mụ mma,’ n’ihi ya ọ dị anyị mkpa ijide n’aka na ofufe anyị ruru ihe Chineke chọrọ.

IME IHE NNA ANYỊ NA-ACHỌ

6, 7. N’ihi gịnị ka Jisọs ji sị na ya amaghị ụfọdụ na-azọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya?

6 Ka anyị gụọ Matiu 7:​21-23 wee lee ma anyị pụrụ ịchọpụta otu ihe dị oké mkpa nke na-ekpebi ma Chineke ọ̀ na-anakwere ofufe nile. Jisọs sịrị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ga-aba n’alaeze eluigwe; kama ọ bụ onye na-eme ihe Nna m nke bi n’eluigwe na-achọ. Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ànyị ejighị aha Gị buo amụma, ànyị ejighịkwa aha Gị chụpụ ndị mmụọ ọjọọ [ndị ajọ mmụọ e kere eke], ànyị ejighịkwa aha Gị rụọ ọtụtụ ọrụ dị ike? Ma mgbe ahụ ka M ga-ekwupụtara ha, sị, Ọ dịghị mgbe ọ bụla M maara unu: si n’ebe M nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.”

7 Ịnakwere Jisọs Kraịst dị ka Onyenwenụ dị mkpa n’ezi ofufe. Ma ọ dị ihe na-agaghị adị ya n’ofufe nke ọtụtụ ndị na-azọrọ na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs. Ọ sịrị na ụfọdụ ga-arụ “ọtụtụ ọrụ dị ike,” dị ka ihe ndị a sị na ha bụ ọgwụgwọ ọrụ ebube. Ma, ha ga-ada ada n’ime ihe Jisọs sịrị na ọ dị oké mkpa. Ha agaghị “na-eme ihe Nna [ya] . . . na-achọ.” Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, anyị aghaghị ịmụta ihe Nna anyị na-achọ wee na-eme ya.

EZI IHE ỌMỤMA​—⁠IHE NCHEBE

8. Ọ bụrụ na anyị ga-eme uche Chineke, gịnị ka a chọrọ, echiche dịgasị aṅaa hiere ụzọ ka anyị na-aghaghịkwa izere?

8 Ime ihe Chineke na-achọ chọrọ ezi ihe ọmụma banyere ma Jehova Chineke ma Jisọs Kraịst. Ihe ọmụma dị otú ahụ na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Mgbe ahụ, n’ezie, anyị nile ga-achọ iji okwu nke inweta ezi ihe ọmụma site n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, kpọrọ ihe. Ụfọdụ na-asị na ọ dịghị mkpa inwe nchegbu ọ bụrụhaala na anyị na-efe ofufe n’ezi obi na n’ịnụ ọkụ n’obi. Ndị ọzọ na-azọrọ sị, ‘Ị mara ihe nta, a tụọ anya ihe nta n’aka gị.’ Ma, Bible na-agba anyị ume ịmụba n’ihe ọmụma banyere Chineke na nzube ya nile.​—⁠Ndị Efesọs 4:13; Ndị Filipaị 1:9; Ndị Kọlọsi 1:⁠9.

9. Olee otú ezi ihe ọmụma si echebe anyị, n’ihi gịnịkwa ka ihe nchebe dị otú ahụ ji dị anyị mkpa?

9 Ihe ọmụma dị otú ahụ bụ ihe nchebe megide mmetọ nke ofufe anyị. Pọl onyeozi kwuru banyere otu mmụọ e kere eke nke na-aghọgharị ka ọ bụ “mmụọ ozi nke ìhè.” (2 Ndị Kọrint 11:14) N’ịbụ onye zoro ezo otú a, mmụọ nke a e kere eke​—⁠Setan⁠—​na-anwa iduhie anyị gaa n’ime ihe ndị megidere ihe Chineke na-achọ. Ndị mmụọ ọzọ e kere eke ha na Setan na-arụkọ ọrụ anọwokwa na-emerụ ofufe ụmụ mmadụ, n’ihi na Pọl sịrị: “Ihe ndị mba ọzọ na-achụ n’àjà, ha na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ bụghịkwa Chineke ka ha na-achụrụ.” (1 Ndị Kọrint 10:20) Ma eleghị anya, ọtụtụ echewo na ha na-efe ofufe n’ụzọ nke ziri ezi, ọ bụ ezie na ha adịghị eme ihe Chineke chọrọ. A nọ na-eduhie ha gaa n’ofufe ụgha na-adịghị ọcha. Anyị ga-amụtakwu banyere Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ma e mesịa, ma ndị iro a nke Chineke anọwo nnọọ na-emerụ ofufe ihe a kpọrọ mmadụ.

10. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ dị onye ma ụma tinye nsí n’ebe i si enweta mmiri, gịnịkwa ka ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke na-akwadebe anyị ime?

10 Ọ bụrụ na ị maara na ọ dị onye ma ụma tinye nsí n’ebe i si enweta mmiri, ị ga-anọgide na-aṅụ mmiri sitere n’ebe ahụ? N’ezie, ị ga-eme ihe ozugbo ịchọta isi iyi mmiri na-adịghị ize ndụ, nke dị ọcha. Mgbe ahụ, ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke na-akwadebe anyị ịmata ezi okpukpe na ịjụ unyi nile na-eme ka ofufe bụrụ nke Chineke na-adịghị anakwere.

IHE MMADỤ NYERE N’IWU DỊ KA OZIZI

11. Gịnị dị njọ n’ofufe nke ọtụtụ ndị Juu?

11 Mgbe Jisọs nọ n’elu ụwa, ọtụtụ ndị Juu emeghị ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ezi ihe ọmụma nke Chineke. N’ihi ya ha tụfuru ohere nke inwe nguzo dị ọcha n’ihu Jehova. Banyere ha, Pọl dere, sị: “Ana m agbara ha àmà na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ebe Chineke nọ, ma ọ bụghị dị ka mmazu si dị.” (Ndị Rom 10:12) Ha kpebiiri onwe ha ụzọ isi fee Chineke kama ịṅa ntị n’ihe o kwuru.

12. Gịnị metọrọ ofufe ndị Israel, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?

12 Na mbụ ndị Israel kpere okpukpe dị ọcha nke Chineke nyere, ma e ji nkụzi na nkà ihe ọmụma dị iche iche nke ụmụ mmadụ metọọ ya. (Jeremaịa 8:​8, 9; Malakaị 2:​8, 9; Luk 11:52) Ọ bụ ezie na ndị ndú okpukpe ndị Juu ndị a maara dị ka ndị Farisii chere na Chineke na-anakwere okpukpe ha, Jisọs gwara ha, sị: “Aịsaịa buru amụma nke ọma n’isi unu ndị ihu abụọ, dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ndị nke a na-asọpụrụ m n’egbugbere ọnụ ha, ma obi ha dị anya n’ebe M nọ. Ma ha na-ebiri m isiala n’efu, na-ezi ihe mmadụ nyere n’iwu ka ha bụrụ ozizi ha.”​—⁠Mak 7:​6, 7.

13. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ndị Farisii?

13 Ọ̀ pụrụ ikwe omume na anyị pụrụ ime dị ka ndị Farisii ahụ mere? Nke a pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị agbasoo ọdịnala okpukpe e nyefere anyị enyefe kama inyocha ihe Chineke kwuworo banyere ofufe. N’ịdọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ a dị adị n’ezie, Pọl dere, sị: “Mmụọ Nsọ na-ekwuwa okwu, sị, na n’oge ikpeazụ ụfọdụ ga-ewezụga onwe ha n’ebe okwukwe anyị dị, na-aṅa ntị ndị mmụọ na-eduhie eduhie na ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Timoti 4:⁠1) Ya mere o zughị ezu nanị iche na ofufe anyị na-atọ Chineke ụtọ. Dị ka nwanyị Sameria ahụ zutere Jisọs, anyị pụrụ iketawo ụzọ ofufe anyị site n’aka nne na nna anyị. Ma ọ dị anyị mkpa ijide n’aka na anyị na-eme ihe ndị nwere nnwapụta Chineke.

NỌRỌ NA NCHE MEGIDE IMEJỌ CHINEKE

14, 15. Ọbụna ma ọ bụrụ na anyị nwere ihe ọmụma ụfọdụ nke ihe Chineke na-achọ, n’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ilezi anya?

14 Ọ gwụla ma anyị na-elezi anya, anyị pụrụ ime ihe Chineke na-adịghị anakwere. Dị ka ihe atụ, Jọn onyeozi dara n’ụkwụ otu mmụọ ozi “ịkpọ isiala nye ya.” Ma mmụọ ozi ahụ dọrọ aka ná ntị, sị: “Lezie anya ka ị ghara ime ya: abụ m ohu ibe gị, bụrụkwa ohu ibe nke ụmụnna gị nke nwere àmà nke Jisọs: kpọọ isiala nye Chineke.” (Mkpughe 19:10) Ya mere ị̀ na-ahụ mkpa ọ dị ijide n’aka na e metọghị ofufe gị site n’ụdị ọ bụla nke ikpere arụsị?​—⁠1 Ndị Kọrint 10:⁠14.

15 Mgbe ndị Kraịst ụfọdụ malitere ime omenala okpukpe ndị na-adịghị atọ Chineke ụtọ, Pọl jụrụ, sị: “Ùnu si aṅaa chigharịa ọzọ n’ihe ozizi mbụ na-adịghị ike na-enweghịkwa ihe ọ bụla, nke unu na-achọ ịbụ ohu ha ọzọ ọhụrụ? Unu na-elezi anya idebe ụbọchị, na ọnwa, na oge, na afọ. Ana m atụ egwu unu, ma ò nwere ụzọ ọ bụla m dọgbuworo onwe m n’ọrụ n’ahụ unu n’efu.” (Ndị Galetia 4:​8-11) Ndị ahụ enwetawo ihe ọmụma Chineke ma mesịa hie ụzọ site n’idebe omenala okpukpe na ụbọchị ndị e doro nsọ bụ́ ndị Jehova na-adịghị anakwere.. Dị ka Pọl kwuru, ọ dị anyị mkpa ịdị “na-anwapụta ihe dị Onyenwe anyị ezi mma.”​—⁠Ndị Efesọs 5:10.

16. Olee otú Jọn 17:16 na 1 Pita 4:3 si enyere anyị aka ịmata ma ụbọchị ezumike na omenala dị iche iche hà na-atọ Chineke ụtọ?

16 Anyị aghaghị ijide n’aka na anyị zeere ụbọchị ezumike okpukpe nile na omenala ndị ọzọ na-emebi ụkpụrụ Chineke. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:21) Dị ka ihe atụ, Jisọs kwuru banyere ụmụazụ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:16) Okpukpe gị ọ̀ na-etinye aka n’ememe na ụbọchị ezumike ndị na-emebi ụkpụrụ nke nnọpụiche n’ebe ihe omume nile nke ụwa a dị? Ka ndị nọ n’okpukpe gị hà na-ekere òkè mgbe ụfọdụ n’omenala na ememe ndị pụrụ ịgụnye àgwà nke kwekọrọ na nke Pita onyeozi kọwara? O dere, sị: “Oge nke gasịworo ezuwo ịrụpụta ihe ndị mba ọzọ na-ezube, na ijegharị n’ime agụụ ịkwa iko, agụụ ihe ọjọọ nile, mmanya ogbugbu nile, [oriri oké mkpọtụ, NW], ịṅụbiga mmanya ókè nile, na ikpere arụsị nile jọgburu onwe ha.”​—⁠1 Pita 4:⁠3.

17. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zeere ihe ọ bụla na-egosipụta mmụọ nke ụwa?

17 Jọn onyeozi mesiri okwu ike banyere mkpa ọ dị izere ihe omume ọ bụla na-egosipụta mmụọ nke ụwa asọpụrụghị Chineke dị anyị gburugburu. Jọn dere, sị: “Unu ahụla ụwa, ma ọ bụ ihe nke dị n’ụwa, n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya nke Nna anyị adịghị n’ime ya. N’ihi na ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi, esiteghị na Nna anyị, kama o sitere n’ụwa. Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:​15-17) Ị̀ rịbara ama na ndị “na-eme ihe Chineke na-achọ” ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi? Ee, ọ bụrụ na anyị emee ihe Chineke na-achọ ma zeere ihe omume ndị na-egosipụta mmụọ nke ụwa a, anyị pụrụ inwe olileanya nke ndụ ebighị ebi!

DEBE ỤKPỤRỤ NDỊ DỊ ELU NKE CHINEKE

18. Olee otú ụfọdụ ndị Kọrint si hie ụzọ n’okwu banyere omume, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịmụta site na nke a?

18 Chineke chọrọ ndị na-ekwekọ n’ụkpụrụ ya ndị dị elu nke omume dị ka ndị na-efe ya ofufe. Ụfọdụ na Kọrint oge ochie hiere ụzọ n’iche na Chineke ga-agbachi àgwà rụrụ arụ nkịtị. Anyị pụrụ ịhụ otú ha si sihie ụzọ site n’ịgụ 1 Ndị Kọrint 6:​9, 10. Ọ bụrụ na anyị ga-efe Chineke n’ụzọ ọ na-anakwere, anyị aghaghị ime ihe na-atọ ya ụtọ n’okwu na n’omume. Ụdị ofufe gị ọ̀ na-eme ka i nwee ike ime nke ahụ?​—⁠Matiu 15:8; 23:​1-⁠3.

19. Olee otú ezi ofufe si emetụta ụzọ anyị si emeso ndị ọzọ?

19 Ụzọ anyị si na-emeso ndị ọzọ kwesịkwara igosipụta ụkpụrụ Chineke. Jisọs Kraịst gbara anyị ume imeso ndị ọzọ dị ka anyị ga-achọ ka ha mesoo anyị, n’ihi na nke a bụ akụkụ nke ezi ofufe. (Matiu 7:12) Rịba ama ihe o kwukwara banyere igosipụta ịhụnanya ụmụnna: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Ndị na-eso ụzọ Jisọs aghaghị ịhụrịta ibe ha n’anya ma mesoo ndị ofufe ibe ha na ndị ọzọ ihe ọma.​—⁠Ndị Galetia 6:⁠10.

OFUFE SI N’OBI DUM

20, 21. (a) Ụdị ofufe dị aṅaa ka Chineke na-achọ? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ji jụ ofufe Israel n’ụbọchị Malakaị?

20 N’ime obi gị, ị pụrụ ịchọ ife Chineke n’ụzọ ọ na-anakwere. Ọ bụrụ otú ahụ, ị ghaghị inwe echiche Jehova banyere ofufe. Jemes onye na-eso ụzọ kwusiri ike na ọ bụ echiche nke Chineke bụ ihe dị mkpa, ọ bụghị nke anyị. Jemes sịrị: “Okpukpe Chineke nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, bụ nke a, ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha, na idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.” (Jemes 1:27) Site n’ọchịchọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, ọ dị anyị nile mkpa inyocha ofufe anyị iji jide n’aka na e jighị omume dị iche iche nke asọpụrụghị Chineke metọọ ya ma ọ bụ na anyị adịghị ahapụ ihe ọ bụla ọ na-ewere dị ka ihe dị mkpa.​—⁠Jemes 1:26.

21 Nanị ofufe dị ọcha, nke si n’obi dum na-atọ Jehova ụtọ. (Matiu 22:37; Ndị Kọlọsi 3:23) Mgbe mba Israel nyere Chineke ihe na-erughị nke ahụ, ọ sịrị: “Nwa na-asọpụrụ nna ya, ohu na-asọpụrụkwa onye nwe ya: ọ bụrụkwa na nna ka M bụ, olee ebe nsọpụrụ m di? ọ bụrụkwa na onye nwe mmadụ ka M bụ, olee ebe egwu m dị?” Ha na-emejọ Chineke site n’ịchụrụ ya anụmanụ ndị kpuru ìsì, ndị dara ngwụrọ, na ndị na-arịa ọrịa n’àjà. (Malakaị 1:​6-8) Jehova ruru eru inweta ụdị ofufe nke kasị dị ọcha, ọ dịghịkwa anara ihe na-erughị ofufe a na-ekewaghị ekewa.​—⁠Ọpụpụ 20:5; Ilu 3:9; Mkpughe 4:11.

22. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nakwere ofufe anyị, gịnị ka anyị ga-ezere, gịnịkwa ka anyị ga-eme?

22 Nwanyị Sameria ahụ ya na Jisọs kwurịtara okwu yiri ka o nwere mmasị n’ife Chineke n’ụzọ Chineke nwapụtara. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ ihe anyị na-achọ, anyị ga-ezere nkụzi na omume nile na-emetọ emetọ. (2 Ndị Kọrint 6:​14-18) Kama nke ahụ, anyị ga-adọgbu onwe anyị n’ọrụ iji nweta ezi ihe ọmụma Chineke ma mee uche ya. Anyị ga-arapagidesi ike n’ihe ndị ọ chọrọ maka ofufe a na-anakwere. (1 Timoti 2:​3, 4) Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ime nke ahụ kpọmkwem, ha jikwa obi ụtọ na-akpọ gị òkù iso ha na-ekere òkè n’ife Chineke “n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) Jisọs sịrị: “Ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye Ya.” (Jọn 4:23) E nwere olileanya na ị bụ onye dị otú ahụ. Dị ka nwanyị Sameria ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-achọ inweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 4:​13-15) Ma ị na-ahụ ka ndị mmadụ na-aka nka ma na-anwụ anwụ. Isiakwụkwọ nke na-esonụ na-akọwa ihe kpatara ya.

NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ

Dị ka e gosiri na Jọn 4:​23, 24, olee ofufe Chineke na-anakwere?

Olee otú anyị pụrụ isi mata ma Chineke ò nwere mmasị n’omenala ma ọ bụ ememe ụfọdụ kpọmkwem?

Olee ihe ụfọdụ a chọrọ ka ofufe wee bụrụ nke a na-anakwere?

[Foto dị na peeji nke 44]

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya