Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 3/15 p. 21-23
  • Jehova—Onye Na-ahụ Ezi Omume na Ezi Ikpe n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova—Onye Na-ahụ Ezi Omume na Ezi Ikpe n’Anya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebere na Ikpe Ziri Ezi nke Jehova
  • Ṅomie Ikpe Ziri Ezi nke Jehova
  • Ghaa Mkpụrụ n’Ezi Omume
  • Jehova—Isi Iyi nke Ezi Ikpe na Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ṅomie Jehova—Gosipụta Ikpe Ziri Ezi na Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • “Ụzọ Ya Nile Bụ Ikpe Ziri Ezi”
    Bịaruo Jehova Nso
  • ‘Na-eme Ihe n’Ikpe Ziri Ezi’ n’Iso Chineke Na-eje Ije
    Bịaruo Jehova Nso
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 3/15 p. 21-23

Jehova—Onye Na-ahụ Ezi Omume na Ezi Ikpe n’Anya

OTU nwatakịrị nwanyị na Sarajevo na-ajụ onwe ya ihe mere ụmụaka ndị nọ n’obodo ukwu ọ nọ ji bụrụ ndị na-aghaghị ịtachi obi n’ahụhụ dị nnọọ ukwuu. “Anyị emeghị ihe ọ bụla. Aka anyị dị ọcha,” ka ọ na-asị. Ndị nne iwe na-ewe bụ́ ndị Argentina emewo ngagharị iwe n’ámá dị na Buenos Aires ruo ihe dị ka afọ 15, ná mkpesa banyere ofufu nke ụmụ ha ndị nwoke. Onye Africa aha ya bụ Emmanuel, bụ́ onye e gburu nne ya na ụmụnne ya nwanyị atọ n’ụzọ obi ọjọọ n’oge ime ihe ike agbụrụ tiwapụrụ, na-ekwusi ike, sị: “Onye ọ bụla aghaghị ịnata ụgwọ ọrụ kwesịrị ya . . . Anyị chọrọ ikpe ziri ezi.”

Ikpe ziri ezi bụ otu n’ime àgwà bụ isi nke Jehova Chineke. “Ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi,” ka Bible na-ekwu. N’ezie, Jehova “na-ahụ ezi omume na ezi ikpe n’anya.” (Deuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 33:5) Iji mara Chineke nke ọma, anyị aghaghị ịghọta echiche ya banyere ikpe ziri ezi ma mụta iṅomi ya.—Hosea 2:19, 20; Ndị Efesọs 5:1.

Eleghị anya ihe ndị mmadụ chere na àgwà a bụ akpụziwo echiche anyị nwere banyere ikpe ziri ezi. N’ụfọdụ akụkụ nke ụwa, a na-egosikarị ikpe ziri ezi dị ka nwanyị e kechiri anya nke bu mma agha na ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ikpe ziri ezi ụmụ mmadụ kwesịrị ịbụ nke na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu, ya bụ, ịbụ onye akụ̀ na ụba ma ọ bụ ikike na-agaghị emetụta. O kwesịrị iji nlezianya tụọ ịbụ onye ikpe mara ma ọ bụ aka ịdị ọcha nke onye ahụ e boro ebubo n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. N’iji mma agha ya eme ihe, ikpe ziri ezi kwesịrị ichebe ndị aka ha dị ọcha ma nye ndị mere ihe ọjọọ ntaramahụhụ.

Akwụkwọ bụ́ Right and Reason—Ethics in Theory and Practice na-asị na “e jikọtara ikpe ziri ezi na iwu, ibu ọrụ, ihe ndị ruuru mmadụ, na ọrụ dị iche iche, ma na-enye ụgwọ ọrụ ya n’ịha nhata ma ọ bụ dị ka ihe kwesịrị mmadụ.” Ma ikpe ziri ezi Jehova na-agabiga nnọọ nke ahụ. Anyị pụrụ ịhụ nke a site n’ịtụle ihe omume na àgwà nile nke Jisọs Kraịst, bụ́ onye dị nnọọ ka Nna ya nke eluigwe.—Ndị Hibru 1:3.

Onye so dee Oziọma ahụ bụ́ Matiu, bụ́ onye kwuru, sị: “Ọ gaghị akpaji amị a pịara apịa, Ọ gaghị emenyụkwa ogho oriọna na-akwụ anwụrụ ọkụ, ruo mgbe Ọ ga-atụpụ ikpe Ya ruo ná mmeri,” ji okwu dị n’Aịsaịa 42:3 mee ihe n’ebe Jisọs nọ. Jisọs kwusara ozi na-akasi obi gwa ndị mmadụ bụ́ ndị yiri amị a pịara apịa nke a rọjiri arọji, na-azọkwa ụkwụ. Ha dị nnọọ ka ogho na-akwụ anwụrụ ọkụ nke oriọna, dị ka a ga-asị na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a fụnyụọla ọkụ ikpeazụ ha. Kama ịkpaji amị a pịara apịa na imenyụ ogho oriọna na-akwụ anwụrụ ọkụ n’ụzọ ihe atụ, Jisọs meere ndị a na-akpagbu akpagbu ebere, zie ha ihe ma gwọọ ha ọrịa, meekwa ka ikpe ziri ezi nke Jehova Chineke doo ha anya. (Matiu 12:10-21) Dị ka amụma Aịsaịa bụ ụzọ kwuo, ụdị ikpe ziri ezi ahụ na-akpali olileanya.

Ebere na Ikpe Ziri Ezi nke Jehova

Ebere bụ akụkụ bụ isi nke ikpe ziri ezi Chineke. Nke a pụtara ìhè mgbe Jisọs nọ n’elu ala. O gosipụtara ụkpụrụ Chineke nke ikpe ziri ezi na ezi omume n’ụzọ zuru okè. Otú ọ dị, ndị odeakwụkwọ ndị Juu na ndị Farisii chọrọ ịbụ ndị ezi omume site n’ịgbaso ụkpụrụ siri ike nke iwu dị iche iche—nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha bụ nke ha mere n’onwe ha. Ikpe ziri ezi ha nke dabeere n’iwu na-ewepụkarị ebere. Ọtụtụ nsọkọrịta isi n’etiti Jisọs na ndị Farisii hiwere isi n’okwu a bụ́: Gịnị bụ ezigbo ikpe ziri ezi na ezi omume?—Matiu 9:10-13; Mak 3:1-5; Luk 7:36-47.

Jisọs mere ihe atụ otú e si emeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi na ezi omume. N’otu mgbe otu nwoke nke maara Iwu ahụ nke ọma jụrụ Jisọs ihe dị mkpa iji keta ndụ ebighị ebi. Ná nzaghachi Jisọs jụrụ ya ajụjụ ma jaa ya mma mgbe ọ zara na iwu abụọ kasị mkpa bụ mmadụ ịhụ Chineke n’anya site n’obi, mkpụrụ obi, uche, na ume dum nakwa ịhụ onye agbata obi mmadụ n’anya dị ka onwe ya. Mgbe ahụ nwoke ahụ jụrụ, sị: “Ònye bụkwa onye agbata obi m?” Jisọs zaghachiri site n’ịkọ ihe atụ nke onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi.—Luk 10:25-37.

E mere ihe atụ ezi omume na ikpe ziri ezi nke obi ebere Jehova n’ihe atụ Jisọs nke onye Sameria ahụ. Site n’iji achọghị ọdịmma onwe onye nanị nyere nwoke ọ na-amaghị ama nke e merụrụ ahụ aka, onye Sameria ahụ mere ihe ziri ezi, ihe ikpe ziri ezi, na ihe obi ebere. Jisọs n’onwe ya gosiri otu ụdị mmụọ ahụ mgbe ọ nọ n’elu ala. Ọ bụ onye ezi omume na onye na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọzọkwa, o nyere ndụ ya maka ndị nọ ná mkpa, maka ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie na ndị na-ezughị okè bụ́ ndị na-ata ahụhụ, na-arịa ọrịa, ma na-anwụ anwụ. Pọl onyeozi jikọrọ ezi omume na ndokwa ihe mgbapụta ahụ. O dere, sị: “Dị ka ikpe ahụ sitere n’otu ndahie bịa ruo mmadụ nile iwetara ha amamikpe; ọbụna otú a ka onyinye amara ahụ sitere n’otu ọrụ ezi omume bịa ruo mmadụ nile ịgụ ha ná ndị ezi omume ka ha nata ndụ.” (Ndị Rom 5:18) ‘Otu ọrụ ezi omume’ a bụ ụzọ Chineke si azọpụta ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi n’aka ihe ndị dị njọ nke mmehie Adam kpatara, bụ́ nke ọ na-abụghị ha ka ụta dịịrị kpọmkwem.

Ikpe ziri ezi nke Chineke chọrọ ịgbapụta ụmụ mmadụ na-eme mmehie nakwa ịkwado ụkpụrụ ezi omume n’otu mgbe ahụ. Ileghara mmehie anya gaara abụworị ma ihe ikpe na-ezighị ezi ma nke enweghị ịhụnanya, n’ihi na ọ ga-akwadoworị mmebi iwu. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na a kpaara ikpe ziri ezi Chineke ókè n’inye ụgwọ ọrụ ma ọ bụ ntaramahụhụ, ọnọdụ nke ihe a kpọrọ mmadụ gaara abụworị nke enweghị olileanya. Dị ka Bible si kwuo, “ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ,” ‘ọ dịghịkwa onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị otu onye ma ọlị.’ (Ndị Rom 3:10; 6:23) Ná mfu onwe onye dị ukwuu nye onwe ya na nye Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, Jehova nyere àjà mgbaghara maka mmehie.—1 Jọn 2:1, 2.

Ihe mgbapụta ahụ na-egosi na e jikọtara ikpe ziri ezi nke Chineke na ịhụnanya nke ụkpụrụ na-eduzi (Grik, a·gaʹpe). N’ezie, ikpe ziri ezi nke Chineke bụ mmezu nke ụkpụrụ ezi omume ya nile—ngosipụta nke ụkpụrụ omume ọma ya. Ya mere, mgbe Chineke gosiri ya, a·gaʹpe bụ ịhụnanya nke ikpe ziri ezi Chineke dabeere na ya. (Matiu 5:43-48) Ya mere ọ bụrụ na anyị aghọta ikpe ziri ezi Jehova n’ezie, anyị ga-atụkwasị obi kpam kpam n’ihe nile o kpere n’ikpe. Dị ka “Onyeikpe ụwa nile,” ọ na-eme ihe ziri ezi mgbe nile.—Jenesis 18:25; Abụ Ọma 119:75.

Ṅomie Ikpe Ziri Ezi nke Jehova

Bible na-agba anyị ume ka anyị ‘bụrụ ndị na-eṅomi Chineke.’ (Ndị Efesọs 5:1) Nke a pụtara iṅomi ikpe ziri ezi ya nakwa ịhụnanya ya. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, ụzọ anyị adịchaghị elu dị ka nke Jehova Chineke. (Aịsaịa 55:8, 9; Ezikiel 18:25) Ya mere olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị bụ ndị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya? Site n’iyikwasị ‘mmadụ ọhụrụ ahụ, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.’ (Ndị Efesọs 4:24) Mgbe ahụ anyị ga-ahụ n’anya ihe Chineke na-ahụ n’anya ma kpọ asị ihe ọ na-akpọ asị. “Ezi omume” na-ajụ ime ihe ike, omume rụrụ arụ, adịghị ọcha, na ndapụ n’ezi ofufe, n’ihi na ihe ndị a na-emerụ ihe dị nsọ. (Abụ Ọma 11:5; Ndị Efesọs 5:3-5; 2 Timoti 2:16, 17) Ikpe ziri ezi nke Chineke na-akpalikwa anyị igosi ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ.—Abụ Ọma 37:21; Ndị Rom 15:1-3.

Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị aghọta ọdịdị obi ebere nke ikpe ziri ezi Chineke, anyị agaghị enwe ọchịchọ ikpe ụmụnna nwoke na nwanyị ime mmụọ anyị ikpe. Olee otú anyị pụrụ isi nwee ike ịghọta ha dị ka Jehova na-aghọta ha? Ọ̀ bụ na anyị agaghị ekpe ha ikpe site n’ụzọ na-ezighị ezi anyị si ele ihe anya? N’ihi ya, Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Unu ekpela ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. N’ihi na ikpe unu ji kpee ka a ga-eji kpee unu: ọ bụkwa ihe unu ji tụọ ihe ka a ga-eji tụọrọ unu. Ma gịnị mere i ji lee irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma ị tụgharịghị uche ná ntụhie nke dị n’anya nke gị? Ma ọ bụ ị̀ ga-esi aṅaa sị nwanna gị, Kwe ka m tụpụ irighiri ahịhịa ahụ n’anya gị: ma lee, ntụhie ahụ dị n’anya nke gị? Onye ihu abụọ, buru ụzọ tụpụ ntụhie ahụ n’anya nke gị; mgbe ahụ ka ị ga-elegide anya ịtụpụ irighiri ahịhịa ahụ n’anya nwanna gị.” (Matiu 7:1-5) Inyocha ezughị okè nke onwe anyị n’ụzọ eziokwu ga-egbochi anyị ikpe ikpe ndị Jehova ga-ele anya dị ka ajọ omume.

Ọ bụ iwu na ndị okenye a họpụtara ahọpụta ga-ekpe ikpe n’okwu nke mmehie dị oké njọ. (1 Ndị Kọrint 5:12, 13) Mgbe ha na-eme nke a, ha na-echeta na ikpe ziri ezi nke Chineke na-achọ ime ebere n’ebe o kwere mee. Ọ bụrụ na e nweghị ebe ndabere maka ya—dị ka n’ọnọdụ nke onye mmehie na-enweghị nchegharị—a gaghị eme ebere. Ma ndị okenye adịghị achụpụ onye mmehie dị otú ahụ n’ọgbakọ iji megwara. Ha na-enwe olileanya na omume nchụpụ ahụ n’onwe ya ga-eme ka ọ mata onwe ya. (Tụlee Ezikiel 18:23.) N’okpuru ịbụisi Kraịst, ndị okenye na-eje ozi n’ihi ikpe ziri ezi, nke a na-agụnyekwa ịdị ka “ebe izonarị oké ifufe.” (Aịsaịa 32:1, 2) Ya mere ha aghaghị ịbụ ndị na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu na ndị nwere ezi uche.—Deuterọnọmi 1:16, 17.

Ghaa Mkpụrụ n’Ezi Omume

Ka anyị nọ na-echere ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke, anyị aghaghị ‘ịchọ ezi omume’ iji nweta ihu ọma Chineke. (Zefanaịa 2:3; 2 Pita 3:13) E kwupụtara echiche a n’ụzọ mara mma n’okwu ndị a, ndị dị na Hosea 10:12: “Ghaaranụ onwe unu mkpụrụ n’ezi omume, weenụ ihe ubi dị ka ebere si dị; rụchaaranụ onwe unu ubi: n’ihi na ọ bụ mgbe ịchọ Jehova, ruo mgbe Ọ ga-abịa, zokwasị unu ezi omume dị ka mmiri.”

Ná ndụ anyị na-ebi kwa ụbọchị, anyị nwere ọtụtụ ohere ‘ịgha mkpụrụ n’ezi omume,’ dị nnọọ ka Jisọs ji ilu nke onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi mee ihe atụ ya. Jehova ga-ahụ na anyị ‘weere ihe ubi dị ka ebere si dị.’ Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eje ije “n’okporo ụzọ ikpe,” anyị ga-anọgide na-anata ntụziaka n’ezi omume n’okpuru ọchịchị Alaeze. (Aịsaịa 40:14) Ka oge na-agafe, obi abụọ adịghị ya na anyị ga-abịa ghọtakwuo n’ụzọ zuru ezu na Jehova bụ onye na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya.—Abụ Ọma 33:4, 5.

[Foto dị na peeji nke 23]

Onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi mere ihe atụ ikpe ziri ezi nke Jehova

[Foto dị na peeji nke 23]

Jisọs meere ndị a na-akpagbu akpagbu ebere, bụ́ ndị yiri amị a pịara apịa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya