Mmeri Ikpeazụ Nke Maịkael, Onye Isi Ukwu Ahụ
“Na mgbe ahụ ka Maịkael ga-eguzo ọtọ, bụ́ onye isi ukwu ahụ nke na-eguzo n’akụkụ ụmụ ndị gị.”—DANIEL 12:1.
1. Omume dị aṅaa ka ndị ọchịchị ụwa gosipụtaworo n’ebe ọkaaka Jehova dị, oleekwa otú eze ugwu ahụ na-esibeghị dị iche?
“ÒNYE bụ Jehova, na m ga-ege ntị n’olu ya izipụ Israel?” (Ọpụpụ 5:2) Ndị a bụ okwu ịkwa emo Fero gwara Mosis. N’ịjụ ịnakwere ịbụ Chineke kasị elu nke Jehova, Fero kpebisiri ike idebe Israel n’ịbụ ohu. Ndị ọchịchị ndị ọzọ elelịwo Jehova n’ụzọ yiri nke a, a gụpụghịkwa ndị eze nke amụma Daniel. (Aịsaịa 36:13-20) N’ezie, eze ugwu emewo karịa. Mmụọ ozi ahụ na-ekwu, sị: “Ọ ga-ebulikwa onwe ya, mee onwe ya ukwuu n’elu chi nile ọ bụla, ọ bụkwa Chineke nke chi nile ka ọ ga-ekwu oké okwu dị iche iche megide. . . . Ma ọ gaghị atụgharị uche na chi nile nke nna ya hà, ma ọ bụ n’ihe ahụ ndị inyom na-achọsi ike, ọ bụkwa na chi nile ọ bụla ka ọ na-agaghị atụgharị uche: n’ihi na n’elu ihe nile ka ọ ga-eme onwe ya ukwuu.”—Daniel 11:36, 37.
2, 3. N’ụzọ dị aṅaa ka eze ugwu ahụ siworo jụ “chi nile nke nna ya hà” ma họrọ ife “chi” ọzọ?
2 N’imezu okwu amụma ndị a, eze ugwu jụrụ “chi nile nke nna ya hà” (ma ọ bụ, “chi dị iche iche nna ya hà fere,” The New English Bible), ọ sọ ya bụrụ chi ndị ọgọ mmụọ nke Rom ma ọ bụ chi Atọ n’Ime Otu nke Krisendọm. Hitler jiri Krisendọm mee ihe maka nzube ya dị iche iche ma ihe àmà na-egosi na o mere atụmatụ iji chọọchị Germany ọhụrụ dochie ya. Onye nọchiri ya kwalitere ekweghị na Chineke pụtara ìhè. Otú a, eze ugwu emewo onwe ya ka ọ bụrụ chi, ‘na-eme onwe ya ka ọ dị ukwuu n’elu ihe nile.’
3 Amụma ahụ na-aga n’ihu, sị: “Ọ bụ chi nke ebe nile siri ike ka ọ ga-asọpụrụ n’ọnọdụ ya: ọ bụkwa chi nke nna ya hà na-amaghị ka ọ ga-eji ọlaedo, jikwa ọlaọcha, jikwa nkume dị oké ọnụ ahịa, jikwa ihe dị iche iche a na-achọsi ike, sọpụrụ.” (Daniel 11:38) N’ezie, eze ugwu tinyere ntụkwasị obi ya ná ngwá agha sayensị ọgbara ọhụrụ, “chi nke ebe nile siri ike.” N’ime oge nile nke mgbe ọgwụgwụ, ọ chọwo nzọpụta site n’aka “chi” nke a, na-achụ nnukwu akụ na ụba n’àjà n’elu ebe ịchụ àjà ya.
4. Ihe ịga nke ọma dị aṅaa ka eze ugwu ahụ nweworo?
4 “Ọ ga-emesokwa ebe nile e wusiri ike nke ebe nile siri ike site n’inyeaka chi ala ọzọ: onye ọ matara ga-eme ka nsọpụrụ ya baa ụba; ọ ga-emekwa ka ha chịa ọha mmadụ, ọ bụkwa ala ka ọ ga-eke n’ọnụ ahịa.” (Daniel 11:39) N’ịtụkwasị obi na “chi ala ọzọ” ya nke hụrụ ngwá agha n’anya, eze ugwu ‘emewo ihe’ n’ụzọ kasị ukwuu, na-egosi onwe ya ịbụ dike na-atụ egwu ná ngwá agha na “mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1) E ji nkwado ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ego, na mgbe ụfọdụ ngwá agha kwụghachi ndị kwadoro echiche ya ụgwọ.
“Na Mgbe nke Ọgwụgwụ Ihe Ndị A”
5, 6. Olee otú eze ndịda siworo ‘sọọ mpi,’ oleekwa otú eze ugwu siworo meghachi omume?
5 Daniel 11:40a na-agụ, sị: “Ná mgbe nke ọgwụgwụ ihe ndị a eze ndịda ga-amalite ịsọ ya mpi.” E lewo nke a na amaokwu ndị na-esonụ anya dị ka ndị ga-emezu n’ọdịnihu anyị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na “mgbe nke ọgwụgwụ ihe ndị a” n’ebe a pụtara otu ihe ọ bụ na Daniel 12:4, 9, anyị ga-achọ mmezu nke okwu ndị a n’ime mgbe ikpeazụ dum. Eze ndịda ọ ‘sọwo’ eze ugwu mpi n’ime oge nke a? Ee, n’ezie. Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, nkwekọrịta udo nke ntaramahụhụ ahụ bụ n’ezie ‘ịsọ mpi,’ ihe mkpali iji megwara. Mgbe mmeri ya n’Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, eze ndịda lekwasịrị anya ná ngwá agha nuklia na-atụ ụjọ nke onye ya na ya na-asọ mpi ma hazie mmekọrịta ngwá agha dị ike megide ya, bụ́ NATO. Ka afọ na-agafe, ‘ịsọ mpi’ ya gụnyere iji ngwá ọrụ nkà na ụzụ ndị dị ike nke ukwuu na-enyochapụta atụmatụ ndị ọzọ tinyere mwakwasị akọ na nke ngwá agha.
6 Olee otú eze ugwu si meghachi omume? “Eze ugwu ewee dakwasị ya dị ka oké ifufe, chịrị ụgbọ ala, chịrịkwa ndị ịnyịnya, chịrịkwa ọtụtụ ụgbọ; ọ ga-abakwa n’ala ya nile, rubiga ókè dị ka mmiri, gabiga.” (Daniel 11:40b) Akụkọ ihe mere eme nke mgbe ikpeazụ egosipụtawo ụkpụrụ mgbasapụ ókèala nke eze ugwu. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, “eze” Nazi ahụ rubigara ókèala ya banye n’ala ndị gbara gburugburu. Ná ngwụsị nke agha ahụ, “eze” nọchiri ya wuru alaeze ukwu dị ike n’ebe na-abụghị ókèala ya. N’oge Agha Nzuzo ahụ, eze ugwu ahụ lụrụ ọgụ megide onye iro ya n’agha mba ndị ọzọ, nke ha abụọ kwadoro otu akụkụ na n’agha nnupụisi dị iche iche megide ọchịchị n’Africa, Esia, nakwa na Latin America. Ọ kpagburu ezi ndị Kraịst, na-akpara (ma n’ezie n’akwụsịghị) ọrụ ha ókè. Mwakwasị ngwá agha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya kwa webatara ọtụtụ mba n’okpuru ọchịchị ya. Nke a bụ kpọmkwem dị ka mmụọ ozi ahụ buru n’amụma: “Ọ ga-abakwa n’ala ahụ mara mma [ógbè ime mmụọ nke ndị Chineke], ọ dịkwa ọtụtụ ala ga-asụ ngọngọ.”—Daniel 11:41a.
7. Olee ihe ịkpa ókè e nwere n’ebe ụkpụrụ mgbasapụ ókèala nke eze ugwu?
7 Otú o sina dị, ọbụna na ọ bụ ezie na—site n’echiche nke onye iro ya na-asọ mpi—eze ugwu anọwo dị ka ọnụnọ nke ihe na-akpata ịtụ egwu, o meribeghị ụwa nile. “Ndị a ka a ga-eme ka ha wepụga onwe ha n’aka ya: Edọm, na Moab, na ndị isi n’ụmụ Amọn.” (Daniel 11:41b) N’oge ochie, Edọm, Moab, na Amọn fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na ha nọcha n’agbata Ijipt na Syria. A pụrụ iwere ha dị ka ndị na-anọchi anya mba na nzukọ dị iche iche taa nke eze ugwu lekwasịrị anya ma daa n’iwebata ha n’okpuru ikike ya.
‘Ijipt Agaghị Agbapụ’
8, 9. Olee otú e siworo nwee mmetụta nke ikike eze ugwu ahụ, ọbụna onye iro ya bụ isi?
8 Mmụọ ozi ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ma ọ ga-enwe ike n’akụ nile nke ọlaedo na ọlaọcha, na n’ihe nile a na-achọsi ike nke Ijipt: ndị Libia na ndị Etiopia ga-esokwa na nzọụkwụ ya nile.” (Daniel 11:42, 43) Ọbụna eze ndịda, “Ijipt,” agbanahụghị mmetụta nke ụkpụrụ dị iche iche nke mgbasawanye ókèala nke eze ugwu. Dị ka ihe atụ, e meriri ya n’ụzọ dị ịrịba ama na Vietnam. Gịnịkwa banyere “ndị Libia na ndị Etiopia”? Ndị agbata obi ndị a nke Ijipt oge ochie pụkwara ise onyinyo nke mba dị iche iche, n’ikwu ya n’ụzọ nke ókèala ebe ha dị, bụ́ ndị agbata obi nke “Ijipt” nke oge a, ndị bụworo mgbe ụfọdụ ndị na-eso ụzọ, “na nzọụkwụ” nke eze ugwu.
9 Eze ugwu ahụ ọ̀ chịwo isi n’elu ‘ihe nile a na-achọsi ike nke Ijipt’? Otú ọ dị, n’ezie o meribeghị eze ndịda, ruokwa 1993 ọnọdụ ụwa emewo ka o yie ihe a na-ejighị n’aka na ọ ga-emeri. Ma o nwewo mmetụta dị ike n’ụzọ eze ndịda siworo jiri ego ya mee ihe. N’ihi egwu nke onye iro ya, eze ndịda etinyewo ego buru oké ibu kwa afọ n’ilekọta oké ndị agha ala, nke mmiri, na nke ụgbọ elu. N’ókè nke a, a pụrụ ikwu na eze ugwu ‘achịwo,’ chịkwaa, mmefu nke akụ na ụba nke eze ndịda.
Obubu Agha Ikpeazụ nke Eze nke Ebe Ugwu
10. Olee otú mmụọ ozi ahụ si kọwaa ọgwụgwụ nke ịsọ mpi ahụ dị n’etiti ndị eze abụọ ahụ?
10 Ịsọ mpi ahụ dị n’etiti ndị eze abụọ ahụ ọ̀ ga-adịru ebighị ebi? Ee e. Mmụọ ozi ahụ gwara Daniel: “Ihe dị iche iche a nụrụ site n’ọwụwa anyanwụ, sitekwa n’ugwu, ga-eme ka ọ [eze ugwu] maa jijiji: ọ ga-ejikwa oké ọnụma pụọ ikpochapụ na iwezụga ọtụtụ mmadụ ka e bibie ha. Ọ ga-amakwa ụlọ ikwuu nile nke ụlọ ukwu ya n’etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahụ mara mma; ma ọ ga-abịaru ọgwụgwụ ya, ọ dịghịkwa onye ga na-enyere ya aka.”—Daniel 11:44, 45.
11, 12. Ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị aṅaa mere n’oge na-adịghị anya metụtara ịsọ mpi dị n’etiti eze ugwu na eze ndịda, gịnịkwa ka anyị ka ga-amụta?
11 Ihe omume ndị a ka dị n’ihu, ya mere anyị apụghị ikwu hoo haa ụzọ a ga-esi mezuo amụma ahụ. N’oge na-adịbeghị anya ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke eze abụọ ahụ agbanwewo. Ịsọ mpi ahụ dị ilu n’etiti United States na mba ndị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe ajụwo oyi. Ọzọkwa, e kposara Soviet Union na 1991, ọ dịghịkwa ọzọ.—Lee mbipụta March 1, 1992, nke Ụlọ Nche, peji nke 4, 5.
12 Ya mere, ònye bụ eze ugwu ugbu a? À pụrụ ịmata ya dị ka otu n’ime mba ndị bụ akụkụ nke Soviet Union ochie ahụ? Ka ọ̀ na-agbanwe ihe ọ bụ kpam kpam, dị ka o meworo ọtụtụ mgbe n’oge gara aga? Anyị apụghị ikwu. Ònye ga-abụ eze ugwu mgbe a ga-emezu Daniel 11:44, 45? Ịsọ mpi ahụ nke dị n’etiti ndị eze abụọ ahụ ọ̀ ga-amalitekwa ọzọ? Gịnịkwa banyere nkwakọba ngwá agha nuklia nke ka dị n’ọtụtụ mba? Ọdịnihu ga-aza ajụjụ ndị a.
13, 14. Gịnị ka anyị maara banyere ọdịnihu nke ndị eze abụọ ahụ?
13 Ọ dị otu ihe anyị maara. N’oge na-adịghị anya, eze ugwu ga-ebu agha nke ihe ga-akpali ya bụ “ihe a nụrụ site n’ọwụwa anyanwụ, sitekwa n’ugwu.” Mbuso agha nke a ga-ebute “ọgwụgwụ” ya ụzọ ozugbo ahụ. Anyị ga-amụtakwu banyere “ihe dị iche iche a nụrụ” ma ọ bụrụ na anyị atụlee amụma ndị ọzọ nke Bible.
14 Otú ọ dị, nke mbụ rịba ama na e kwughị na omume ndị a nke eze ugwu bụ megide eze ndịda. Ọ bụghị n’aka oké onye iro ya ka ọ bịaruru ọgwụgwụ ya. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụghị eze ugwu ga-ebibi eze ndịda. E bibiri eze nke ebe ndịda (nke e gosipụtara n’amụma ndị ọzọ dị ka mpi ikpeazụ nke ga-epute n’anụ ọhịa ahụ) “n’ejighị aka [mmadụ]” site n’aka Alaeze Chineke. (Daniel 7:26; 8:25) N’ezie, n’ikpeazụ ọ bụ Alaeze Chineke ga-ebibi ndị eze nile nke ụwa n’agha Amagedọn, ihe àmà na-egosikwa na ọ bụkwa nke a ga-eme eze ugwu. (Daniel 2:44; 12:1; Mkpughe 16:14, 16) Daniel 11:44, 45 na-akọwa ihe omume ndị na-eduje n’agha ikpeazụ ahụ. Ka a sịkwa ihe mere na “ọ dịghịkwa onye ga na-enyere ya aka” mgbe eze ugwu ga-ezute ọgwụgwụ ya!
15. Ajụjụ ndị dị aṅaa dị mkpa ka a ka ga-atụle?
15 Mgbe ahụ, olee amụma ndị ọzọ ahụ na-eme ka a ghọta “ihe dị iche iche a nụrụ” nke kpaliri eze ugwu ịmalite “iwezụga ọtụtụ mmadụ ka e bibie ha”? Oleekwa “ọtụtụ mmadụ” ahụ ọ ga-achọ ibibi?
Ihe A Nụrụ Site n’Ọwụwa Anyanwụ
16. (a) Olee ihe omume pụrụ iche nke na-aghaghị iwere ọnọdụ tupu Amagedọn? (b) Olee ndị bụ “ndị eze ahụ ndị si n’ọwụwa anyanwụ bịa”?
16 Tupu agha ikpeazụ ahụ, bụ́ Amagedọn, aghaghị ibibi oké onye iro nke ezi ofufe—Babilọn Ukwu ahụ yiri nwanyị na-akwa iko, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 18:3-8) E sere onyinyo nke mbibi ya site ná mwụsị nke ọkwá nke isii nke ọnụma Chineke n’elu osimiri Yufretis ihe atụ ahụ. Osimiri ahụ tasịrị “wee dozie ụzọ ndị eze ahụ ndị si n’ọwụwa anyanwụ bịa.” (Mkpughe 16:12) Olee ndị ka ndị eze a bụ? Ọ dịghị ndị ọzọ ọ bụ ma ọ́ bụghị Jehova Chineke na Jisọs Kraịst!a
17. (a) Gịnị ka Bible na-agwa anyị banyere mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ? (b) Gịnị ka ihe a nụrụ “site n’ọwụwa anyanwụ” pụrụ ịbụ?
17 A kọwara n’ụzọ pụtara ìhè n’akwụkwọ Mkpughe mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ: “Mpi iri ahụ ị hụrụ [ndị ‘eze’ na-achị ná mgbe ọgwụgwụ], ha na anụ ọhịa ahụ [anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie, nke na-anọchi anya òtù United Nations], ndị a ga-akpọ nwanyị ahụ na-akwa iko asị, ha ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ.” (Mkpughe 17:16) N’ezie, mba dị iche iche ‘na-ebibi ọtụtụ anụ’! (Daniel 7:5) Ma n’ihi gịnị ka ndị ọchịchị, tinyere eze ugwu, ga-eji bibie Babilọn Ukwu ahụ? N’ihi na “Chineke tinyere n’obi ha ime izu ya.” (Mkpughe 17:17) Ihe a nụrụ “site n’ọwụwa anyanwụ” pụrụ izo aka n’ọrụ nke a nke Jehova, mgbe o tinyere ya n’ime obi ndị ndú bụ mmadụ, n’ụzọ nke ọ họọrọ, ikpochapụ oké nwanyị okpukpe ahụ na-akwa iko.—Daniel 11:44.
Ihe A Nụrụ Site n’Ugwu
18. Gịnị ọzọ ka eze ugwu ahụ lekwasịrị anya, oleekwa ebe nke a ga-eme ka ọ nọrọ mgbe ọ bịaruru ọgwụgwụ ya?
18 Ma e nwere ihe ọzọ iwe nke eze ugwu lekwasịrị anya. Mmụọ ozi ahụ na-ekwu na ọ “ọ ga-amakwa ụlọ ikwuu nile nke ụlọ ukwu ya n’etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahụ mara mma.” (Daniel 11:45) N’oge Daniel, oké osimiri ahụ bụ Mediterranean, ugwu nsọ ahụ bụ Zaịọn, ebe bụbu ebe ụlọ nsọ Chineke dị. N’ihi ya, ná mmezu nke amụma ahụ, eze ugwu ahụ iwe ji zọliri njem agha megide ndị Chineke! N’echiche ime mmụọ taa, “n’etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahụ” na-eme ka ọ nọrọ n’ógbè ime mmụọ nke ndị ohu Chineke e tere mmanụ, bụ́ ndị siworo ‘n’oké osimiri’ nke ihe a kpọrọ mmadụ siworo n’ebe Chineke nọ pụọ ma nwee olileanya nke isoro Jisọs Kraịst chịa ọchịchị n’Ugwu Zaịọn nke eluigwe.—Aịsaịa 57:20; Ndị Hibru 12:22; Mkpughe 14:1.
19. Dị ka amụma Ezikiel gosiri, olee otú anyị pụrụ isi mata ihe ahụ a nụrụ nke ga-akpali mwakwasị Gọg? (Lee ntụaka ala ala peji.)
19 Ezikiel, onye ya na Daniel dịrị ndụ n’otu mgbe, bukwara amụma banyere mwakwasị a ga-awakwasị ndị Chineke “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” Ọ sịrị na ọ bụ Gọg nke Magọg, bụ́ nke na-anọchi anya Setan bụ́ Ekwensu ga-amalite ya. (Ezikiel 38:16) N’ụzọ ihe atụ, olee akụkụ ebe Gọg ga-esi bịa? Site n’ọnụ Ezikiel, Jehova kwuru, sị: “Ị ga-esikwa n’ebe gị, n’akụkụ nile nke ugwu dịkarịsịrị anya.” (Ezikiel 38:15) N’ihi ya, ihe a nụrụ ‘site n’ugwu’ pụkwara ịbụ mkpọsa atụmatụ aghụghọ Setan na-akpali eze ugwu na ndị eze ndị ọzọ ịwakwasị ndị Jehova.b—Tụlee Mkpughe 16:13, 14; 17:14.
20, 21. (a) N’ihi gịnị ka Gọg ga-eji kpalie mba nile, tinyere eze ugwu, ịwakwasị ndị Chineke? (b) Mwakwasị ya ọ̀ ga-enwe ihe ịga nke ọma?
20 Gọg na-ahazi mbuso agha nke a zuru ezu n’ihi ịba ụba nke “Israel nke Chineke,” ndị ha na oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ na-abụghịzi akụkụ nke ụwa ya. (Ndị Galetia 6:16; Jọn 10:16; 17:15, 16; 1 Jọn 5:19) Gọg na-ele “otu ndị nke a chịkọpụtaworo ná mba dị iche iche, nke lụtaworo anụ ụlọ na ihe ahịa [ime mmụọ] n’ọrụ” anya ọjọọ. (Ezikiel 38:12; Mkpughe 5:9; 7:9) Ná mmezu nke okwu ndị a, ndị Jehova na-aba ụba taa otú ha na-abatụbeghị na mbụ. N’ọtụtụ ala na Europe, Africa, na Esia ebe ndị a machibidoburu ha iwu, ha na-efe ofufe ná nnwere onwe ugbu a. N’agbata 1987 na 1992, ihe karịrị nnọọ otu nde “ihe a na-achọsi ike” siri ná mba dị iche iche pụta wee banye n’ụlọ Jehova nke ezi ofufe. N’ụzọ ime mmụọ, ha bụ ndị bara ụba na ndị nọ n’udo.—Hagaị 2:7; Aịsaịa 2:2-4; 2 Ndị Kọrint 8:9.
21 N’ile ógbè ime mmụọ nke ndị Kraịst dị ka “obodo na-enweghị mgbidi” nke dị mfe mmeri, Gọg ga-eme oké mgbalị ikpochapụ ihe a na-egbochi ya ịchịkwa ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ zuru ezu. (Ezikiel 38:11) Ma ọ ga-ada. Mgbe ndị eze nke ụwa wakwasịrị ndị Jehova, ha ‘ga-abịaru ọgwụgwụ ha.’ N’ụzọ dị aṅaa?
Eze nke Atọ
22, 23. Mgbe Gọg wakwasịrị, ònye ga-eguzo ọtọ maka ndị Chineke, gịnịkwa ga-esi n’ime ya pụta?
22 Ezikiel na-ekwu na mwakwasị nke Gọg bụ ihe ịrịba ama maka Jehova Chineke ibili n’ihi ndị ya ma bibie ndị agha Gọg “n’elu ugwu nile nke Israel.” (Ezikiel 38:18; 39:4) Nke a na-echetara anyị ihe mmụọ ozi ahụ gwara Daniel: “Ná mgbe ahụ ka Maịkael ga-eguzo ọtọ, bụ́ onye isi ukwu ahụ nke na-eguzo n’akụkụ ụmụ ndị gị: mgbe ahụhụ ga-adịkwa, nke mgbe dị otú ahụ na-adịghị site ná mgbe mba ọ bụla malitere ịdị ruo mgbe ahụ: ma ná mgbe ahụ ka a ga-eme ka ndị gị wepụga onwe ha, bụ́ onye ọ bụla a ga-ahụ na e deworo aha ya n’akwụkwọ.”—Daniel 12:1.
23 Na 1914, Jisọs—onye agha eluigwe ahụ bụ́ Maịkael—ghọrọ Eze nke Alaeze eluigwe nke Chineke. (Mkpughe 11:15; 12:7-9) Kemgbe ahụ, ọ nọwo na-eguzo ‘n’akụkụ ụmụ ndị Daniel.’ Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ọ “ga-eguzo ọtọ” n’aha Jehova dị ka Eze Onye Agha a na-adịghị emeri emeri, na-eweta “ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs.” (2 Ndị Tesalọnaịka 1:8) Mba nile nke ụwa, tinyere ndị eze nke amụma Daniel, “ga-etikwa aka n’obi.” (Matiu 24:30) Ebe ha ka nwere echiche ọjọọ n’obi ha n’ebe ‘ndị Daniel’ nọ, ha ga-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi n’aka ‘Maịkael, onye isi ukwu ahụ.’—Mkpughe 19:11-21.
24. Mmetụta dị aṅaa ka ihe ọmụmụ a banyere amụma Daniel kwesịrị inwe n’ebe anyị nọ?
24 Ọ̀ bụ na anyị adịghị atụ anya ịhụ oké mmeri nke Maịkael na nke Chineke ya, bụ́ Jehova? N’ihi na mmeri ahụ ga-apụta ‘mwepụga,’ nlanarị, maka ezi ndị Kraịst. (Tụlee Malakaị 4:1-3.) N’ihi ya, n’ilepụ anya n’ọdịnihu site n’inwe ezi olileanya, anyị na-echeta okwu ndị ahụ nke Pọl onyeozi: “Kwusaa okwu ya; tụkwasị uche n’ọrụ gị n’oge kwesịrị, ma ọ bụ n’oge na-ekwesịghị.” (2 Timoti 4:2) Ka anyị jidesie Okwu nke ndụ ike ma dịrị uchu n’ịchọ atụrụ Jehova ka oge kwesịrị ekwesị ka nọgidere na-aga n’ihu. Anyị nọ n’akụkụ ikpeazụ nke ọsọ ndụ ahụ. Ụgwọ ọrụ dị nso. Ka mmadụ nile kpebisie ike ịtachi obi ruo ọgwụgwụ wee si otú a soro n’etiti ndị ahụ a ga-azọpụta.—Matiu 24:13; Ndị Hibru 12:1.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Revelation—Its Grand Climax At Hand! nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, peji nke 229-230.
b N’ụzọ nke ọ bụla, ihe a nụrụ ‘site n’ugwu’ pụrụ ịbụ nke sitere n’ebe Jehova nọ, n’ihi okwu ndị ahụ ọ gwara Gọg, sị: “[M ga-etinye] mgba aka imi n’agba gị abụọ.” “[M ga-eme] ka i si n’akụkụ nile dịkarịsịrị anya nke ugwu rịgota; m ga-emekwa ka ị bịa n’elu ugwu nile nke Israel.”—Ezikiel 38:4; 39:2; tụlee Abụ Ọma 48:2.
Ị̀ Na-aghọta?
◻ Olee otú eze ndịda siworo sọọ eze ugwu mpi n’ime oge nile nke mgbe ọgwụgwụ?
◻ Gịnị ka anyị ka ga-amụta banyere ihe si n’ime ịsọ mpi dị n’etiti ndị eze abụọ ahụ pụta?
◻ Ihe omume abụọ dị aṅaa tupu Amagedọn ga-emetụta eze ugwu ahụ n’ezie?
◻ Olee otú ‘Maịkael, onye isi ukwu ahụ’ ga-esi chebe ndị Chineke?
◻ Olee otú anyị ga-esi meghachi omume n’ebe ihe ọmụmụ nke amụma Daniel dị?
[Foto dị na peeji nke 19]
Eze ugwu efewo chi dị iche na ndị ndị bu ya ụzọ bụrụ eze fere
[Ebe E Si Nweta Foto]
Aka ekpe n’elu na etiti: UPI/Bettmann; aka ekpe ná ndịda: Reuters/Bettmann; aka nri ná ndịda: Jasmin/Gamma Liaison