‘E Welitere Anụ Ahụ Nke Ọtụtụ Ndị Nsọ’
“ALA mara jijiji; oké nkume dị iche iche tiwasịkwara. Ili meghesịkwara; e wee welite anụ ahụ ọtụtụ ndị nsọ ndị dawororị n’ụra ọnwụ, (ndị mmadụ, ndị si n’ebe a na-eli ozu na-apụta mgbe a kpọlitesịrị ha n’ọnwụ, wee banye n’obodo nsọ ahụ,) ọtụtụ ndị hụkwara ha anya.” (Matiu 27:51-53, NW) Onyeọkà mmụta ndị Katọlik bụ Karl Staab kpọrọ ihe nke a merenụ mgbe Jisọs nwụrụ “ihe dị omimi nke ukwuu.” Ọ̀ bụ gịnị mere?
Epiphanius na ndị ọzọ bụ ndị Nna Chọọchị nke oge mbụ kuziri na ndị nsọ ahụ dịghachiri ndụ n’ụzọ nkịtị, sorokwa Jisọs ahụ e mere ka o bilite n’ọnwụ rịgoo n’eluigwe. Augustine, Theophylactus, na Zigabenus kweere na ndị a nwụrụ anwụ nwetara mbilite n’ọnwụ ruo nwa oge ma mesịa laghachikwa n’ili ha. Otú ọ dị, onyeọkà mmụta bụ Erich Fascher kwuru na echiche nke abụọ ahụ, “enwetaghị nnakwere dị ukwuu.” Mgbe ha na-asụgharị Matiu 27:52, 53, ọtụtụ nsụgharị Bible ndị nke oge a na-enye echiche nke bụ na e nwere mbilite n’ọnwụ n’oge ahụ. Nsụgharị New World Translation, bụ́ nke na-ezo aka ná mmetụta ala ọma jijiji ahụ nwere, emeghị otú ahụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?
Nke mbụ, n’agbanyeghị ndị “ndị nsọ ahụ” bụ, Matiu ekwughị na a kpọlitere ha. 0 kwuru na ọ bụ anụ ahụ, ma ọ bụ ozu ha, ka e welitere. Nke abụọ, o kwughị na anụ ahụ ndị a dịghachiri ndụ. 0 kwuru na e welitere ha, ọ bụghịkwa mgbe nile ka ngwaa Grik ahụ bụ egeïro, nke pụtara ‘iwelite’ na-ezo aka ná mbilite n’ọnwụ. Gụnyere ihe ndị ọzọ, ọ pụkwara ịpụta “ịdọgopụta” site n’ime olulu ma ọ bụ ‘ibilite’ site n’ala. (Matiu 12:11; 17:7; Luk 1:69) Ọgba aghara ahụ nke mere mgbe Jisọs nwụrụ meghesịrị ili dị iche iche, na-atụpụtasị anụ ahụ ndị na-adịghị ndụ ebe a ga-ahụ ha anya. Aelius Aristides, bụ́ onye Grik na-ede edemede, kọrọ na ihe ndị dị otú ahụ mere n’oge ndị e nwere ala ọma jijiji n’ime narị afọ nke abụọ O.A., o mekwara n’oge na-adịghị oké anya gara aga na 1962, na Colombia.
Ile ihe ahụ merenụ anya n’ụzọ dị otu a kwekọrọ ná nkuzi Bible. Ná 1 Ndị Kọrint isi 15, Pọl onyeozi nyere ihe àmà doro anya iji kwadoo mbilite n’ọnwụ, ma o lefuuru Matiu 27:52, 53 anya kpam kpam. Otú ahụkwa ka ndị ọzọ so dee Bible mere. (Ọrụ 2:32, 34) Ozu ndị ahụ e welitere mgbe Jisọs nwụrụ apụghị ịbịaghachiworịị ná ndụ n’ụzọ ahụ Epiphanius chere, n’ihi na mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jisọs ghọrọ “onye e buru ụzọ mụọ site ná ndị nwụrụ anwụ.” (Ndị Kọlọsi 1:18) E kwere ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị a na-akpọkwa “ndị nsọ” nkwa ikere òkè ná mbilite n’ọnwụ nke mbụ n’oge ọnụnọ Kraịst, ọ bụghị n’ime narị afọ mbụ ahụ.—1 Ndị Tesalọnaịka 3:13; 4:14-17.
Ọ na-esiri ihe ka ọtụtụ ná ndị na-akọwa Bible ike ịkọwa amaokwu 53, ọ bụ ezie na ụfọdụ n’ime ha na-atụ aro na amaokwu 52 kọwara mmeghe ala ọma jijiji meghesịrị ili na mkpughesị nke ozu ndị e liri ọhụrụ. Dị ka ihe atụ, onyeọkà mmụta bụ onye Germany, bụ́ Theobald Daechsel sụgharịrị ya n’ụzọ dị otú a: “Ili dị iche iche meghesịkwara, e bulitekwara ọtụtụ ozu ndị senti ndị tọgbọ na-ezuru ike.”
Òle ndị bụ ndị ahụ ‘banyere n’ime obodo nsọ ahụ’ mgbe ogologo oge ụfọdụ gasịrị, ya bụ mgbe e mesịworo ka Jisọs bilite n’ọnwụ? Dị ka a hụworo sịte n’ihe e dere n’elu ebe a, ozu ndị ahụ nọgidere n’adịghi ndụ, ya mere ọ ghaghị ịbụ na Matiu na-ekwu banyere ndị jere ileta ili ndị ahụ ma were akụkọ banyere ihe ahụ merenụ banye na Jerusalem. Ya mere, nsụgharị New World Translation mere ka nghọta Bible dịkwuo omimi, ọ naghị emekwa ka ndị na-agụ ya nwee ihe mgbagwoju anya banyere mbilite n’ọnwụ ahu.