Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • kl isi 10 p. 90-97
  • Alaeze Chineke Na-achị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Alaeze Chineke Na-achị
  • Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ALAEZE NKE NWERE NZUBE
  • ỊBỤ EZIE NKE ALAEZE CHINEKE
  • ỊCHỊISI ALAEZE​—⁠OLEE MGBE?
  • Alaeze Chineke Karịrị Ọchịchị Ndị Ọzọ n’Ụzọ Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Alaeze “nke A Gaghị Emebi Emebi”
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
kl isi 10 p. 90-97

Isi nke 10

Alaeze Chineke Na-achị

1, 2. Olee otú ọchịchị nile nke mmadụ siworo nwapụta na ha erughị eru?

MA ELEGHỊ anya i nwewo ahụmahụ nke ịzụta otu ngwá ọrụ, nanị ịchọpụta na ọ dịghị arụ ọrụ. Ka anyị were ya na ị kpọrọ onye na-edozi ya. Ma, ngwa ngwa ka o “dozisịrị” ngwá ọrụ ahụ, o mebiri. Lee aha ihe na-agbawa obi nke ahụ bụ!

2 Otú ahụ ka ọ dị banyere ọchịchị ụmụ mmadụ. Ihe a kpọrọ mmadụ achọwo mgbe nile ọchịchị nke ga-ahụ na e nwere udo na obi ụtọ. Ma, oké mgbalị nile iji dozie ihe ndị mebisịrị n’usoro ọha na eze agabeghị nke ọma n’ezie. E mewo ọtụtụ nkwekọrịta udo​—⁠mebiekwa ha. Karịakwa nke ahụ, olee ọchịchị nweworo ike ikpochapụ ịda ogbenye, ịkpa ókè, mpụ, ọrịa, na mbibi mbara ebe obibi? Ịchịisi mmadụ enweghị ndozi. Ọbụna Eze Solomọn onye amamihe nke Israel jụrụ, sị: “Mmadụ ga-esikwa aṅaa ghọta ụzọ ya?”​—⁠Ilu 20:24.

3. (a) Gịnị bụ isiokwu nke nkwusa Jisọs? (b) Olee otú ụfọdụ ndị si akọwa Alaeze Chineke?

3 Obi ekoropụla gị! Ọchịchị kwụsiri ike nke ụwa abụghị nrọ nkịtị. Ọ bụ isiokwu nke nkwusa Jisọs. Ọ kpọrọ ya “alaeze Chineke,” ọ kụzikwaara ụmụazụ ya ikpe ekpere maka ya. (Luk 11:2; 21:31) Ee, mgbe ụfọdụ a na-ezo aka n’Alaeze Chineke n’okwu okpukpe. N’ezie, ọtụtụ nde mmadụ na-ekpe ekpere maka ya kwa ụbọchị mgbe ha na-ekpeghachi Ekpere Onyenwe Anyị (nke a na-akpọkwa Nna Anyị Bi n’Eluigwe ma ọ bụ ekpere ihe atụ). Ma ndị mmadụ na-aza ihe dị iche iche mgbe a jụrụ ha sị, “Gịnị bụ Alaeze Chineke?” Ụfọdụ na-asị, “Ọ dị n’obi gị.” Ndị ọzọ na-akpọ ya eluigwe. Bible na-enye azịza doro anya, dị ka anyị ga-ahụ.

ALAEZE NKE NWERE NZUBE

4, 5. N’ihi gịnị ka Jehova ji họrọ iwepụta ngosipụta ọhụrụ nke ọkaaka ya, gịnịkwa ka ọ ga-arụzu?

4 Jehova Chineke abụwo Eze, ma ọ bụ Ọkaaka Na-achị Isi, nke eluigwe na ala mgbe nile. Eziokwu bụ na o kere ihe nile na-ebuli ya gaa n’ọkwá ahụ dị elu. (1 Ihe Emere 29:11; Abụ Ọma 103:19; Ọrụ 4:24) Ma Alaeze nke Jisọs kwusara banyere ya na-esote, ma ọ bụ nọ n’ọkwá nke abụọ n’ebe ọkaaka eluigwe na ala nke Chineke dị. Alaeze Mesaịa ahụ nwere otu nzube kpọmkwem, ma gịnị ka ọ bụ?

5 Dị ka a kọwara n’Isi nke 6, mmadụ abụọ mbụ nupụụrụ ikike Chineke isi. N’ihi ihe iseokwu ndị e welitere, Jehova họọrọ ime ka e nwee ngosipụta ọhụrụ nke ọkaaka ya. Chineke mara ọkwa nzube ya iwepụta otu “mkpụrụ” nke ga-echifịa Agwọ ahụ, bụ́ Setan, ma wepụ mmetụta nile nke mmehie e ketara eketa nke ihe a kpọrọ mmadụ. “Mkpụrụ” ahụ nke bụ́ isi bụ Jisọs Kraịst, “alaeze Chineke” bụkwa ngwá ọrụ ga-emeri Setan kpam kpam. Site n’Alaeze a, Jisọs Kraịst ga-eweghachi ịchịisi n’elu ụwa n’aha Jehova, wepụkwa ọkaaka ziri ezi nke Chineke n’ụta ruo mgbe nile.​—⁠Jenesis 3:15; Abụ Ọma 2:​2-⁠9.

6, 7. (a) Olee ebe Alaeze ahụ dị, oleekwa ndị bụ Eze ya na ndị ga-eso ya chịa? (b) Olee ndị bụ ndị Alaeze ahụ ga-achị?

6 Dị ka otu nsụgharị nke okwu Jisọs gwara ndị Farisii dị obi ọjọọ na-agụ, ọ sịrị: “Alaeze Chineke dị n’ime unu.” (Luk 17:21, King James Version) Jisọs ò bu n’uche na Alaeze ahụ dị n’ime obi jọrọ njọ nke ndị ikom ahụ rụrụ arụ? Ee e. Nsụgharị ka zie ezi nke Grik mbụ ahụ na-agụ, sị: “Alaeze Chineke dị n’etiti unu.” (Bible Nsọ nke Union Version, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Jisọs, onye nọ n’etiti ha, si otú ahụ zoo aka n’ebe ya onwe ya nọ dị ka Eze ọdịnihu ya. N’abụtụghị ihe mmadụ nwere n’obi ya, Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị, nke na-arụ ọrụ na-enwe onye na-achị isi na ndị ọ na-achị. Ọ bụ ọchịchị eluigwe, n’ihi na a kpọrọ ya ma “alaeze eluigwe” ma “alaeze Chineke.” (Matiu 13:11; Luk 8:10) N’ọhụụ, Daniel onye amụma hụrụ Onye Ọchịchị ya dị ka “otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ” nke a kpọtara n’ihu Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ma nye ya “ọchịchị, na ebube, na alaeze” na-adịgide adịgide, “ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee fee Ya.” (Daniel 7:​13, 14) Ònye bụ Eze nke a? Ọ dị mma, Bible na-akpọ Jisọs Kraịst “Nwa nke mmadụ.” (Matiu 12:40; Luk 17:26) Ee, Jehova họpụtara Ọkpara ya, Jisọs Kraịst, ịbụ Eze.

7 Jisọs adịghị achị nanị ya. Ndị so ya bụ 144,000 mmadụ ndị “a gbatararịị n’ụwa” iso ya bụrụ eze na ndị nchụàjà. (Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3; Luk 22:​28-⁠30) Ndị Alaeze Chineke ga-achị ga-abụ ezinụlọ ụmụ mmadụ nke zuru ụwa ọnụ bụ́ ndị na-edo onwe ha n’okpuru idu ndú Kraịst. (Abụ Ọma 72:​7, 8) Ma, olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Alaeze ahụ ga-ewepụ ọkaaka Chineke n’ụta n’ezie ma weghachi ọnọdụ paradaịs n’ụwa anyị?

ỊBỤ EZIE NKE ALAEZE CHINEKE

8, 9. (a) Olee otú anyị pụrụ isi mee ihe atụ nke ikwesị ndabere nke nkwa nile nke Alaeze Chineke? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide ịdị adị nke Alaeze ahụ n’aka?

8 Weregodị na ọkụ gbapịara ụlọ gị. Ugbu a otu enyi gị nke nwere ego ekwee nkwa inye aka wughachi ụlọ gị na inye ezinụlọ gị nri. Ọ bụrụ na enyi ahụ na-agwa gị eziokwu mgbe nile, ị́ gaghị ekwere ya? Ka e were ya na i si ọrụ lata n’echi ya ma hụ na ndị ọrụ amaliteworị ikpopụsị mkpọmkpọ ihe ndị ahụ ọkụ ahụ gbapịara nakwa na e wetaworo ezinụlọ gị nri. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na obi ga-esi gị ike n’ụzọ zuru ezu na ka oge na-aga, ọ bụghị nanị na a ga-eweghachi ọnọdụ kamakwa na ọbụna na ihe ga-aka mma.

9 N’otu aka ahụ, Jehova na-emesi anyị obi ike na Alaeze ahụ dị adị n’ezie. Dị ka e gosiri n’akwụkwọ Bible bụ́ Ndị Hibru, ọtụtụ akụkụ nke Iwu ahụ mere ihe atụ nke ndokwa Alaeze ahụ. (Ndị Hibru 10:1) Ihe atụ amụma dị iche iche nke Alaeze Chineke pụtakwara ìhè n’alaeze elu ala nke Israel. Nke ahụ abụghị ọchịchị nkịtị, n’ihi na ndị ọchịchị ya nọkwasịrị “n’ocheeze Jehova.” (1 Ihe Emere 29:23) Ọzọkwa, e buwo ụzọ kwuo, sị: “Mkpanaka eze agaghị esi n’ebe Juda nọ wezụga onwe ya, mkpanaka onye na-enye ụkpụrụ agaghị esikwa n’etiti ụkwụ ya abụọ wezụga onwe ya, ruo mgbe Shaịlo ga-abịa; ọ bụkwa ya ga-enwe ịṅa ntị ndị dị iche iche.” (Jenesis 49:10)a Ee, ọ bụ n’ahịrị ndị eze nke a nke Juda ka a mụnyere Jisọs, Eze na-anọgide anọgide nke ọchịchị Chineke.​—⁠Luk 1:​32, 33.

10. (a) Olee mgbe a tọrọ ntọala nke Alaeze Mesaịa nke Chineke? (b) Ọrụ dị aṅaa dị mkpa ka ndị ga-eso Jisọs chịa achịa ga na-ebute ụzọ na ya n’elu ụwa?

10 A tọrọ ntọala nke Alaeze Mesaịa nke Chineke site ná nhọrọ nke ndị ozi Jisọs. (Ndị Efesọs 2:​19, 20; Mkpughe 21:14) Ndị a bụ ndị mbụ so na 144,000 ahụ ga-achị achị n’eluigwe dị ka ndị so Jisọs Kraịst bụrụ eze. Mgbe ha nọ n’ụwa, ndị a ga-eso chịa achịa ga-ebute ụzọ n’otu ọrụ ịgba àmà, n’ikwekọ n’iwu Jisọs nyere: “Gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.”​—⁠Matiu 28:19.

11. Olee otú e si na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ taa, gịnịkwa ka ọ na-arụzu?

11 A na-erubere iwu ahụ bụ ka e mee ndị na-eso ụzọ isi ugbu a n’ụzọ a na-emetụbeghị mbụ. Ndịàmà Jehova na-akpọsa ozi ọma nke Alaeze ahụ gburugburu ụwa, n’ikwekọ n’okwu amụma Jisọs: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Dị ka otu akụkụ nke ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, a na-arụ otu nnukwute ọrụ nkụzi. Ndị na-edo onwe ha n’okpuru iwu na ụkpụrụ nile nke Alaeze Chineke amaliteworị inwe udo na ịdị n’otu nke ọ na-adịghị ọchịchị ọ bụla nke mmadụ pụrụ iweta. Ihe a dum na-enye ihe àmà doro anya na Alaeze Chineke dị adị n’ezie!

12. (a) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ịkpọ ndị nkwusa Alaeze ahụ Ndịàmà Jehova? (b) Olee otú Alaeze Chineke si dị iche n’ebe ọchịchị nile nke mmadụ dị?

12 Jehova gwara ndị Israel: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m, . . . na ohu m nke m họpụtara.” (Aịsaịa 43:​10-⁠12) Jisọs, “onyeàmà kwesịrị ntụkwasị obi,” ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Mkpughe 1:5; Matiu 4:17) Ya mere o kwesịrị ekwesị na ndị nkwusa Alaeze ahụ n’oge a na-aza aha ahụ Chineke họpụtara bụ́ Ndịàmà Jehova. Ma n’ihi gịnị ka Ndịàmà ji etinye oge na mgbalị dị nnọọ ukwuu n’ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke? Ha na-eme nke a n’ihi na Alaeze ahụ bụ olileanya ihe a kpọrọ mmadụ nwere nanị ya. Ọchịchị nile nke mmadụ na-emesị mebie, ma Alaeze Chineke agaghị emebi mgbe ọ bụla. Aịsaịa 9:​6, 7 na-akpọ Onye Ọchịchị ya, bụ́ Jisọs, “Onyeisi Udo” ma na-agbakwụnye: “Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onye isi Ya na udo Ya ga-agwụ.” Alaeze Chineke adịghị ka ọchịchị ụmụ mmadụ​—⁠bụ́ ọbịara taa laa echi. N’ezie, Daniel 2:44 na-asị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; . . . ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”

13. (a) Olee nsogbu ụfọdụ Alaeze Chineke ga-edozi n’ụzọ gara nke ọma? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na a ga-emezu nkwa nile nke Chineke?

13 Olee eze bụ́ mmadụ nke pụrụ iweta mkpochapụ nke agha, mpụ, ọrịa, agụụ ngụgbu, na enweghị ebe obibi? Ọzọkwa, olee onye ọchịchị bi n’ụwa nke pụrụ ịkpọlite ndị nwụworo anwụ? Alaeze Chineke na Eze ya ga-ahụ maka okwu ndị a. Alaeze ahụ agaghị abụ nke gbara ọrụ, dị ka ngwá ọrụ nke na-adịghị arụzi ọrụ nke na-anọgide na-achọ ndozi. Kama nke ahụ, Alaeze Chineke ga-enwe ihe ịga nke ọma, n’ihi na Jehova na-ekwe nkwa, sị: “Okwu m . . . nke na-esi n’ọnụ m pụta . . . ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.” (Aịsaịa 55:11) Nzube Chineke agaghị akụ afọ n’ala, ma olee mgbe ịchịisi Alaeze gaje ịmalite?

ỊCHỊISI ALAEZE​—⁠OLEE MGBE?

14. Nghọtahie dị aṅaa ka ndị na-eso ụzọ Jisọs nwere banyere Alaeze ahụ, ma gịnị ka Jisọs maara banyere ịchịisi ya?

14 “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ n’oge a ka Ị na-enyeghachi Israel alaeze?” Ajụjụ a ndị na-eso ụzọ Jisọs jụrụ kpughere na ka ọ dị na mgbe ahụ ha amaghị nzube nke Alaeze Chineke na oge a kara aka ka ịchịisi ya wee malite. N’ịdọ ha aka ná ntị ka ha ghara ịdị na-akọ nkọ banyere okwu ahụ, Jisọs sịrị: “Ọ bụghị ihe dịịrị unu ịma oge ma ọ bụ ụbọchị, nke Nna m debere n’ike nke aka Ya.” Jisọs maara na ịchịisi ya n’elu ụwa bụ nke e debere maka ọdịnihu, ogologo oge mgbe mbilite n’ọnwụ ya na nrịgo n’eluigwe gasịrị. (Ọrụ 1:​6-⁠11; Luk 19:​11, 12, 15) Akwụkwọ Nsọ ebuwo ụzọ kwuo nke a. N’ụzọ dị aṅaa?

15. Olee otú Abụ Ọma 110:1 si amụkwasị ìhè n’oge nke ịchịisi Jisọs?

15 Na-ezo aka n’ụzọ amụma n’ebe Jisọs nọ dị ka “onyenwe m,” Eze Devid sịrị: “Ihe si n’ọnụ Jehova pụta na-asị onyenwe m, Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe M ga-edo ndị iro gị ka ihe mgbakwasị dịịrị ụkwụ gị abụọ.” (Abụ Ọma 110:1; tụlee Ọrụ Ndị Ozi 2:​34-⁠36.) Amụma a na-egosi na ịchịisi Jisọs agaghị amalite ozugbo ọ rịgosịrị n’eluigwe. Kama nke ahụ, ọ ga-echere n’aka nri Chineke. (Ndị Hibru 10:​12, 13) Ogologo oge hà aṅaa ka nchere nke a ga-aga n’ihu? Olee mgbe ịchịisi ya ga-amalite? Bible na-enyere anyị aka ịchọta azịza ha.

16. Gịnị mere na 607 T.O.A., oleekwa ụzọ nke a si metụta Alaeze Chineke?

16 Nanị obodo Jehova tụkwasịrị aha ya n’elu ya n’ụwa nile bụ Jerusalem. (1 Ndị Eze 11:36) Ọ bụkwa isi obodo nke otu alaeze dị n’ụwa nke Chineke nwapụtara nke nọchitere anya Alaeze eluigwe Chineke. Ya mere, mbibi ndị Babilọn biri Jerusalem na 607 T.O.A. dị nnọọ ịrịba ama. Ihe omume nke a kara akara mmalite nke nkwụsị dị ogologo n’ịchịisi sitere n’aka Chineke kpọmkwem n’elu ndị ya n’ụwa. Ihe dị ka narị afọ isii ka e mesịrị, Jisọs gosiri na oge a nke ịchịisi a kwụsịtụrụ ka dị irè, n’ihi na ọ sịrị: “Ndị mba ọzọ ga-azọda Jerusalem n’ala, ruo mgbe oge nke mba ọzọ ga-emezu.”​—⁠Luk 21:24.

17. (a) Gịnị bụ “oge nke mba ọzọ,” ogologo oge hà aṅaa ka ha gajekwa iwe? (b) Olee mgbe “oge nke mba ọzọ” malitere ma gwụsịa?

17 N’ime “oge nke mba ọzọ,” a ga-enye ọchịchị dị iche iche nke ụwa ohere ịkwụsịtụ ịchịisi Chineke nwapụtara. Oge ahụ malitere ná mbibi nke Jerusalem na 607 T.O.A., Daniel gosikwara na ọ ga-aga n’ihu ruo “oge asaa.” (Daniel 4:​23-⁠25) Olee otú nke ahụ hà n’ogologo? Bible na-egosi na “oge” atọ na nkera hà ka 1,260 ụbọchị. (Mkpughe 12:​6, 14) Okpukpu abụọ nke oge ahụ, ma ọ bụ oge asaa, ga-abụ 2,520 ụbọchị. Ma ọ dịghị ihe dị ịrịba ama mere n’ọgwụgwụ nke oge ahụ dị mkpụmkpụ. Ma, site n’iji “otu ụbọchị otu afọ” mee ihe n’amụma Daniel na ịgụ 2,520 afọ bido na 607 T.O.A., anyị na-erute n’afọ ahụ bụ 1914 O.A.​—⁠Ọnụ Ọgụgụ 14:34; Ezikiel 4:6.

18. Gịnị ka Jisọs mere ngwa ngwa ọ natasịrị ike Alaeze, oleekwa otú nke a si metụta ụwa?

18 Jisọs ọ̀ malitere ịchị achị n’eluigwe n’oge ahụ? A ga-atụle ihe ndị Akwụkwọ Nsọ kwadoro maka ikwu na o mere otú ahụ n’isiakwụkwọ nke na-eso. Otú ọ dị, a gaghị eji udo n’elu ụwa ozugbo kaa mmalite nke ịchịisi Jisọs akara. Mkpughe 12:​7-⁠12 na-egosi na kpọmkwem ka ọ natasịrị Alaeze ahụ, Jisọs ga-achụpụ Setan na ndị mmụọ ozi ọjọọ ya site n’eluigwe. Nke a ga-apụtara ụwa ahụhụ, ma ọ na-enye obi ụtọ ịgụ na Ekwensu nwere nanị “nwa oge” fọdụrụnụ. N’isi nso, anyị ga-enwe ike ịṅụrị ọṅụ ọ bụghị nanị n’ihi na Alaeze Chineke na-achị kamakwa n’ihi na ọ ga-eweta ngọzi dị iche iche n’ụwa na nye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. (Abụ Ọma 72:​7, 8) Olee otú anyị si mara na nke a ga-eme n’isi nso?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Aha ahụ bụ́ Shaịlo pụtara “Onye Ọ Bụ nke Ya; Onye Ọ Dịịrị.” Ka oge na-aga, o doro anya na “Shaịlo” bụ Jisọs Kraịst, “Ọdụm ahụ Nke si n’ebo Juda pụta.” (Mkpughe 5:5) Nsụgharị Targum ụfọdụ nke ndị Juu ji “Mesaịa” ma ọ bụ “eze Mesaịa” dochie nnọọ okwu ahụ bụ́ “Shaịlo.”

NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ

Gịnị bụ Alaeze Chineke, oleekwa ebe o si na-achị?

Ònye na-achị isi n’Alaeze ahụ, ole ndị kwa ka ọ na-achị?

Olee otú Jehova siworo mesie anyị obi ike na Alaeze ya dị adị n’ezie?

Olee mgbe “oge nke mba ọzọ” malitere, oleekwa mgbe ọ gwụsịrị?

Igbe dị na peeji nke 94]

IHE OMUME ỤFỌDỤ DỊ MKPA E JIKỌRỌ HA NA ALAEZE CHINEKE

• Jehova amaa ọkwa nzube ya iwepụta otu “mkpụrụ” nke ga-echifịa isi Agwọ ahụ, bụ́ Setan Ekwensu.​—⁠Jenesis 3:15.

• Na 1943 T.O.A., Jehova egosipụta na “mkpụrụ” a ga-abụ mmadụ nke sitere n’eriri Abraham.​—⁠Jenesis 12:1-⁠3, 7; 22:18.

• Ọgbụgba ndụ Iwu e nyere Israel na 1513 T.O.A. na-enye “onyinyo nke ezi ihe ahụ nile gaje ịbịa.”​—⁠Ọpụpụ 24:​6-⁠8; Ndị Hibru 10:1.

• Alaeze dị n’ụwa nke Israel amalite na 1117 T.O.A., o mesịkwara gaa n’ihu n’eriri Devid.​—⁠1 Samuel 11:15; 2 Samuel 7:​8, 16.

• E bibiri Jerusalem na 607 T.O.A., “oge nke mba ọzọ” wee malite.​—⁠2 Ndị Eze 25:​8-10, 25, 26; Luk 21:⁠24.

• Na 29 O.A., e tere Jisọs mmanụ dị ka Eze A Họpụtara, o wee gaa n’ihu n’ozi elu ụwa ya.​—⁠Matiu 3:16, 17; 4:17; 21:9-⁠11.

• Na 33 O.A., Jisọs arịgoo n’eluigwe, ichere n’ebe ahụ n’aka nri Chineke ruo mgbe ịchịisi ya ga-amalite.​—⁠Ọrụ 5:​30, 31; Ndị Hibru 10:​12, 13.

• E chiri Jisọs eze n’Alaeze eluigwe na 1914 O.A. mgbe “oge nke mba ọzọ” gwụsịrị.​—⁠Mkpughe 11:15.

• A chụdatara Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na gburugburu ụwa, ha wee na-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ahụhụ ka ukwuu.​—⁠Mkpughe 12:​9-⁠12.

• Jisọs na-elekọta nkwusa zuru ụwa ọnụ nke ozi ọma Alaeze Chineke.​—⁠Matiu 24:14; 28:19, 20.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya